Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ekwela Ka Ọrịa Mee Ka Ị Ghara Ịna-enwe Ọṅụ

Ekwela Ka Ọrịa Mee Ka Ị Ghara Ịna-enwe Ọṅụ

Ekwela Ka Ọrịa Mee Ka Ị Ghara Ịna-enwe Ọṅụ

WEREGODỊ na i tetara ụra n’ụtụtụ ya adị gị ka ya bụrụ na ụbọchị ahụ agaala. Ihe o ji dị gị otú a bụ n’ihi na obi na-amafu gị n’ihi ihe mgbu na obi ọjọọ ị na-aga inwe n’ụbọchị ahụ. O nwedịrị ike ịdị gị otú ọ dị Job, bụ́ onye sịrị: ‘Ka m wee họrọ ọnwụ karịa ndụ a m dị.’ (Job 7:15, Baịbụl Nsọ Ọhụụ) Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ihe na-eme gị ekweghị akwụsị akwụsị, ma ọ bụdị ya anọruo ọtụtụ afọ?

Ụdị ihe a mere Mefiboshet, nwa Jọnatan bụ́ enyi Eze Devid. Mgbe Mefiboshet dị afọ ise, ọ “dara wee daa ngwọrọ.” (2 Sam. 4:4) Ọ ga-abụ na mwute o nwere n’ihi ebubo e boro ya na ọ na-agba eze mgba okpuru nakwa n’ihi ihe ya a naara ya, mere ka ihe mgbu ọ na-enwe maka ngwọrọ ọ dara ka njọ. N’agbanyeghị ihe ndị a, o gosiri na ya ma otú e si edi ọrịa, nkwutọ, na ebubo ụgha, ma ghara ikwe ka ihe ndị a mee ka ọ kwụsị inwe ọṅụ.—2 Sam. 9:6-10; 16:1-4; 19:24-30.

Pọl onyeozi bụ onye ọzọ ụdị ihe a mere. E nwere mgbe o dere na e ‘nwere ogwu dị ya n’anụ ahụ́’ nke nyere ya nsogbu. (2 Kọr. 12:7) Ogwu a nwere ike ịbụ ihe na-enye ya nsogbu kemgbe, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ ndị na-ekwu na ọ bụghị onyeozi. Nke ọ bụla ọ bụ, otu ihe bụ na nsogbu ahụ ekweghị aha ya aka, ọ nọkwa na-edi ihe mgbu ya na ya so.—2 Kọr. 12:9, 10.

E nwere ụfọdụ ndị ohu Chineke taa na-arịa ọrịa na-ekweghị ala ala, nke na-akpakwa ha aka njọ. Mgbe Magdalena dị afọ iri na asatọ, a chọpụtara na ọrịa ọ na-arịa na-eme ka ihe ndị kwesịrị ịlụso ụmụ nje ndị na-akpata ọrịa ọgụ lụsowe ahụ́ ya ọgụ. O kwuru sị: “Ụjọ bịara m. Ka oge na-aga, ọrịa a bịara ka njọ n’ihi na ihe na-agbari nri n’ahụ́ m anaghịzi arụ ọrụ nke ọma, ọnyà eju m n’ọnụ, otito etookwa m n’akpịrị.” Ma, ọrịa Izabela na-arịa abụghị nke ị ga-amata ngwa ngwa ma i lee ya anya. Ọ sịrị: “Kemgbe m dị obere, m na-adakarị mbà n’obi. Nke a na-eme m nọkata mgbe ụfọdụ, ahụ́ ebido mawa m jijiji, iku ume abụrụ ọgụ na mgba, afọ ana-ahịkwa m. Nke a na-eme ka ike na-agwụkarịkwa m.”

Ịma Ebe Ike Anyị Ruru

Ọrịa nwere ike ịghasasị ndụ gị. Ọ bụrụ na nke a emee, ọ ga-adị mma ma ị nọrọ ala tụlee otú ihe si dịrị gị. Ọ gaghị adịrị gị mfe ikweta na o nwere ihe ndị ị na-agaghịzi emeli. Magdalena kwuru, sị: “Ọrịa na-arịa m ji nwayọọ nwayọọ na-aka njọ. Isidị n’ihe ndina m bilie na-abụrụ m ọgụ na mgba. Ebe m na-amaghị ihe chi ga-abọtara m, ọ na-esiri m ezigbo ike ime atụmatụ ihe m ga-eme echi. Ihe kacha agbawa m obi bụ na enweghịzi m ike imeru otú m na-emebu n’ozi Jehova.”

Zbigniew kwuru, sị: “Ka afọ na-aga, ọrịa ogbu na nkwonkwo na-arịa m mere ka ume gwụ m, jiri nwayọọ na-akụjisị nkwonkwo m niile. Mgbe ụfọdụ, o nwere otú ihe na-esi jọruo njọ, anaghịzi m enwe ike ịrụ ọrụ ndị kacha mfe ọrụrụ. Nke a na-emekwa ka obi na-ajọ njọ.”

Afọ ole na ole gara aga, a chọpụtara na e nwere akpụ ji nwayọọ nwayọọ na-agbasa n’ụbụrụ Barbara. Barbara kwuru, sị: “Ahụ́ m agbanweela ná mberede. Ike na-agwụru m n’ọkpụkpụ, isi na-awakarịzi m, ọ na-esikwara m ike ime ka uche m dịgide n’ihe m na-eme. Nsogbu ndị a mere ka m lebagharịa anya n’ihe ndị m na-eme.”

Ndị a niile anyị kọrọ akụkọ ha bụcha ndị ohu Jehova raara onwe ha nye ya. Ime uche Jehova bụkwa ihe mbụ ná ndụ ha. Ha tụkwasịrị Chineke obi kpamkpam, ọ na-enyekwara ha aka.—Ilu 3:5, 6.

Olee Otú Jehova Si Enye Aka?

Ọ bụrụ na anyị enwee nsogbu, anyị ekwesịghị iche na ọ bụ n’ihi na ihe anyị adịghị Chineke mma. (Ákwá 3:33) Cheedị ihe dakwasịrị Job n’agbanyeghị na “ọ bụ nwoke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta, bụrụkwa onye ezi omume.” (Job 1:8) Chineke anaghị eji ihe ọjọọ anwa onye ọ bụla. (Jems 1:13) Ọrịa niile, ma ndị nke na-achọghị ịla ala ma ndị nke na-akpata nchekasị, bụcha nsogbu nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, kpataara anyị.—Rom 5:12.

Ma, Jehova na Jizọs, agaghị agbahapụ ndị ezi omume. (Ọma 34:15) Mgbe ihe siiri anyị ezigbo ike, anyị na-aka achọpụta n’eziokwu na Chineke bụ ‘ebe mgbaba anyị na ebe anyị e wusiri ike.’ (Ọma 91:2) Ya mere, mgbe i nwere nsogbu nke ọ na-enweghị ihe ị ga-eme banyere ya ozugbo, gịnị ga-enyere gị aka ịna-enwe ọṅụ?

Ekpere: I nwere ike ịtụkwasị Nna anyị nke eluigwe ibu arọ gị otú ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie mere. (Ọma 55:22) I mee otú a, ị ga-enwe “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.” Udo a “ga-eche obi [gị] na ike iche echiche [gị] nche.” (Fil. 4:6, 7) Ihe nyeere Magdalena aka idi ọrịa ọ na-arịa bụ otú o si tụkwasị Chineke obi ma na-ekpeku ya ekpere. Ọ sịrị: “Ịgwa Jehova otú obi dị m na-eme ka obi ruo m ala, na-emekwa ka m nweghachi ọṅụ. Ugbu a ka m ghọtara ihe ịtụkwasị Chineke obi kwa ụbọchị pụtara.”—2 Kọr. 1:3, 4.

Ọ bụrụ na ị rịọ Jehova ka o nyere gị aka, o nwere ike iji mmụọ nsọ, Okwu ya, na ụmụnna anyị gbaa gị ume. I kwesịghị ịtụwa anya ka Chineke rụọ ọrụ ebube ga-eme ka ọrịa na-arịa gị kwụsị. Ma, obi sie gị ike na ọ ga-enye gị amamihe na ume ị ga-eji die nsogbu ọ bụla bịaara gị. (Ilu 2:7) O nwere ike ịgba gị ume, nyekwa gị “ike karịrị ike nkịtị.”—2 Kọr. 4:7.

Ezinụlọ: Ọ bụrụ na udo dị n’ezinụlọ gị, ndị ezinụlọ gị abụrụkwa ndị nwere ọmịiko, nke a nwere ike inyere gị aka idi ọrịa ị na-arịa. Ma, echefukwala na ọ dịghịrị ndị ezinụlọ gị mfe otú ahụ ọ na-adịghịrị gị. N’agbanyeghị nke ahụ, ha agaghị agbahapụ gị, karịchaa, ugbu a ihe na-esiri gị ike. Ọ bụrụ na gị na ha ana-ekpekọ ekpere ọnụ, ọ ga-eme ka obi ruo gị ala.—Ilu 14:30.

Barbara kwuru otú nwa ya nwaanyị na ụmụnna nwaanyị ndị ọzọ na-eto eto si enyere ya aka. Ọ sịrị: “Ha na-enyere m aka n’ozi ọma. Otú ha si anụ ọkụ n’obi n’ozi na-eme m obi ụtọ.” Nwunye Zbigniew na-enyere ya aka nke ukwuu. Zbigniew sịrị: “Ọ bụ nwunye m na-arụ ọtụtụ ọrụ ndị e nwere n’ụlọ. Ọ na-enyekwara m aka ijikere ọmụmụ ihe na ozi ọma, na-ebutekwara m akpa m ọtụtụ mgbe.”

Ụmụnna anyị: Anyị na-enweta agbamume na nkasi obi ma anyị na ụmụnna anyị nọrọ. Ma oleekwanụ ma ọ bụrụ na ọrịa anaghị ekwe gị gaa ọmụmụ ihe? Magdalena kwuru, sị: “Ndị ọgbakọ anyị na-ahụ na ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe akwaghị m, ha na-etinyere m ihe a na-amụ na teepụ. Ha na-akpọkarị m na fon iji mara ebe ha ga-enyere m aka. Ha na-edetakwara m akwụkwọ ozi ndị na-agba ume. M cheta otú a ihe banyere m si emetụ ha n’obi, ọ na-eme ka m nwee ike idi ihe bịaara m.”

Izabela, bụ́ onye dara mbà n’obi, kwuru, sị: “Enwere m ọtụtụ ‘nne’ na ‘nna’ n’ọgbakọ, bụ́ ndị na-ege m ntị ma na-agba mbọ ịghọta ihe mụ na ha na-alụ. Ọgbakọ bụ ezinụlọ m, ọ bụ ebe obi na-eru m ala, mụ ana-enwekwa ọṅụ.”

Ndị nwere ọtụtụ ihe ha na ha na-alụ ekwesịghị ‘ịna-akpa iche.’ Kama, ha na ụmụnna ha kwesịrị ịna-akpachi anya. (Ilu 18:1) Ha na-esi otú a agbakwa ndị ọzọ ume. O nwere ike isiri gị ike ná mmalite ịgwa ụmụnna gị ihe gị na ha na-alụ. Ma, ụmụnna gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ma ị gwa ha ihe na-emenụ. Nke a ga-eme ka ha nwee ike igosi gị na ha ‘nwere ịhụnanya ụmụnna nke na-abụghị nke ihu abụọ.’ (1 Pita 1:22) Ọ́ gaghị aka mma ma ị gwa ha na ị chọrọ onye ga-akwọga gị ọmụmụ ihe, ma ọ bụkwanụ na ị chọrọ onye gị na ya ga-arụ n’ozi ọma, ma ọ bụkwanụ onye ị ga-akọrọ ihe na-enye gị nsogbu n’obi? Ma, anyị ekwesịghị ịna-achọ ka ha na-emere anyị ihe niile, kama anyị kwesịrị ikele ha maka ndị nke ha meere anyị.

Ya adịla gị ka ụwa gị ọ̀ gwụla: Ọ bụ gị ga-ekpebi ma ị̀ ga-ekwe ka ọrịa na-arịa gị mee ka ị ghara ịna-enwe ọṅụ ma ọ̀ bụ na ị gaghị ekwe. Ọ bụrụ na anyị ana-amachi ihu mgbe niile, ọ ga-adịwa anyị ka nke anyị na-eme agwụla. Baịbụl kwuru, sị: “Mmụọ mmadụ pụrụ idi ihe na-arịa ya; ma mmụọ dara mbà, ònye pụrụ idi ya?”—Ilu 18:14.

Magdalena kwuru, sị: “M na-agbasi mbọ ike ka nsogbu m ghara ịna-echu m ụra. Ụbọchị ahụ́ dịtụ m, mụ ewere. Akụkọ banyere ụmụnna ndị nọsiri ike na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị ọrịa ndị na-ekweghị aha ha aka na-eme ka okwukwe m sie ike.” Ihe na-agba Izabela ume bụ ma o cheta na Jehova hụrụ ya n’anya, jirikwa ya kpọrọ ihe. Ọ sịrị: “Ọ na-adị m ka m̀ dị mkpa, nakwa na e nwere onye ji m kpọrọ ihe. M na-atụkwa anya mgbe ihe ga-adịrị m mma n’ọdịnihu.”

Zbigniew kwuru, sị: “Ọrịa na-arịa m emeela ka m mụta ịdị umeala n’obi na irube isi. Amụtakwala m otú e si eji amamihe na nghọta eme ihe, nakwa otú e si agbaghara ndị ọzọ kpamkpam. Amụtala m otú m ga-esi na-eme ka ozi m na-ejere Jehova na-atọ m ụtọ n’emetewereghị onwe m ebere. N’eziokwu, nke a emeela ka m chọsikwuo ike ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ.”

Echefula na Jehova maara otú i si na-atachi obi. Ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi. Ọ gaghị ‘echefu ọrụ gị na ịhụnanya i gosiri maka aha ya.’ (Hib. 6:10) Echefula nkwa o kwere ndị niile na-atụ egwu ya. Ọ sịrị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.”—Hib. 13:5.

E nwee mgbe obi na-adịghị gị mma, chewe banyere ihe ọma niile anyị ga-enweta n’ụwa ọhụrụ. Oge eruwela n’ike n’ike mgbe ị ga-eji anya gị hụ ihe ọma niile Alaeze Chineke ga-eweta n’ụwa a!

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 28]

Ọrịa Ha Na-arịa Emeghị Ka Ha Kwụsị Ikwusa Ozi Ọma

“Anaghịzi m agali ije n’enweghị onye nyeere m aka. N’ihi ya, nwunye m na ụmụnna ndị ọzọ na-enyere m aka n’ozi ọma. M bu otú ụfọdụ e si ezi ozi ọma n’isi, burukwa amaokwu Baịbụl ụfọdụ n’isi.”—Jerzy, bụ́ onye na-anaghị ahụcha ụzọ.

“M na-eji telifon ezi ndị mmadụ ozi ọma, na-edegakwara ụfọdụ n’ime ndị nwere mmasị m maara akwụkwọ ozi. Mgbe m nọ n’ụlọ ọgwụ, m na-edebe Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’akụkụ ihe ndina m. Nke a emeela ka m nwee ike ịmalite izi ọtụtụ ndị ozi ọma.”—Magdalena, bụ́ onye e lere ahụ́ ma chọpụta na ihe na-alụso ọrịa ọgụ n’ahụ́ ya na-alụsozi ahụ́ ya ọgụ.

“Ọ na-amasị m ịga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ma, mgbe m na-enweghị ike ịga, m na-eji telifon agbara ndị ọzọ àmà.”—Izabela, bụ́ onye na-adakarị mbà n’obi.

“Ọ na-atọ m ụtọ ịga nletaghachi na iso ndị ọzọ na-aga eduzi ọmụmụ ihe. Ụbọchị ahụ́ dịtụ m, ọ na-amasị m ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ.”—Barbara, bụ́ onye nwere akpụ n’ụbụrụ.

“M na-ebu naanị obere akpa e ji etinye magazin. M na-anọ n’ozi ọma ruo mgbe ogbu na nkwonkwo bidoro inye m nsogbu.”—Zbigniew, bụ́ onye na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo.

[Foto dị na peeji nke 30]

Ma ndị na-eto eto ma ndị agadi nwere ike ịgba ndị na-arịa ọrịa ume