Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Ị Na-amụta N’àgwà Ọma Ya Nakwa N’àgwà Ọjọọ Ya?

Gịnị Ka Ị Na-amụta N’àgwà Ọma Ya Nakwa N’àgwà Ọjọọ Ya?

Gịnị Ka Ị Na-amụta N’àgwà Ọma Ya Nakwa N’àgwà Ọjọọ Ya?

“Chineke nke Jekọb . . . ga-akụziri anyị ụzọ ya, anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”—AỊZA. 2:3.

1, 2. Olee ihe anyị na-amụta n’àgwà ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl kpara?

O DORO anya na i kwere na ihe ndị e dere na Baịbụl nwere ike ịbara gị uru. Na Baịbụl, ị ga-agụta akụkọ banyere ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị ị ga-achọ iṅomi àgwà ha nakwa otú ha si bie ndụ. (Hib. 11:32-34) Ma, ọ ga-abụkwa na ị gụtala banyere ndị kpara àgwà ndị na-adịghị mma, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, bụ́ ndị ị na-ekwesịghị iṅomi àgwà ha na otú ha si bie ndụ.

2 N’eziokwu, e nwere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl bụ́ ndị kpara ma àgwà ndị e kwesịrị iṅomi ma àgwà ndị a na-ekwesịghị iṅomi. Ì chetara Devid, bụ́ onye ọzụzụ atụrụ, onye mechara bụrụ eze na-akpa ike? Ọ hụrụ eziokwu n’anya, tụkwasịkwa Jehova obi. Ma, o nwere mgbe Devid kpara àgwà jọgburu onwe ya. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe ya na Bat-shiba kwara iko, ya akpaa nkata e gbuo Yuraya. O nwekwara mgbe o nyere iwu na-enweghị isi ka a gụọ ndị mmadụ ọnụ. Ma, ka anyị tụlee ihe banyere nwa ya nwoke bụ́ Sọlọmọn, onye mechara bụrụ eze, sorokwa ná ndị dere Baịbụl. Anyị ga-ebu ụzọ tụlee ụzọ abụọ o si bụrụ onye e kwesịrị iṅomi.

“Amamihe Sọlọmọn”

3. Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na anyị kwesịrị iṅomi Sọlọmọn?

3 Jizọs Kraịst, bụ́ Sọlọmọn nke Ka Ukwuu, kwuru okwu ọma banyere Eze Sọlọmọn, si otú ahụ gosi na anyị kwesịrị iṅomi ya. Jizọs gwara ụfọdụ ndị Juu nwere obi abụọ, sị: “A ga-akpọlite eze nwaanyị ndịda n’oge ikpe ya na ọgbọ a, ọ ga-amakwa ha ikpe; n’ihi na o si na nsọtụ ụwa bịa ịnụ amamihe Sọlọmọn, ma, lee! e nwere onye ka Sọlọmọn n’ebe a.” (Mat. 12:42) N’eziokwu, a ma Sọlọmọn ama na o nwere amamihe, ọ gbakwara anyị ume inwe amamihe.

4, 5. Olee otú Sọlọmọn si nweta amamihe, ma olee otú ụzọ anyị si enweta amamihe si dị iche na nke ya?

4 Mgbe Sọlọmọn ghọrọ eze ọhụrụ, Chineke bịakwutere ya ná nrọ ma gwa ya ka ọ rịọ ya ihe bụ mkpa ya. Ebe Sọlọmọn ma na ya amachaghị ka e si achị ọchịchị, ọ rịọrọ Chineke ka o nye ya amamihe. (Gụọ 1 Ndị Eze 3:5-9.) Ebe obi dị Chineke ụtọ na Sọlọmọn rịọrọ ka o nye ya amamihe kama ịrịọ ka o nye ya akụnụba na ebube, Chineke nyere ya “obi nwere amamihe na nke na-aghọta ihe,” nyekwa ya akụnụba. (1 Eze 3:10-14) Dị ka Jizọs kwuru, amamihe Sọlọmọn pụrụ iche nke na eze nwaanyị Shiba nụrụ banyere ya ma si ebe dị anya bịa ka o jiri anya ya hụ.—1 Eze 10:1, 4-9.

5 O nweghị onye n’ime anyị na-atụ anya ka Chineke rụọ ọrụ ebube nye ya amamihe. Sọlọmọn kwuru na “Jehova na-enye amamihe,” ma, o dere na anyị kwesịrị ịgba mbọ nwee amamihe Chineke na-enye. Ọ sịrị: “Gee amamihe ntị, ka i wee jiri obi gị chọọ nghọta.” O kwukwara ka anyị “na-akpọku” amamihe nakwa ka anyị “na-achọ” ya. (Ilu 2:1-6) O doro anya na anyị ga-enwetali amamihe.

6. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na-eme ka Sọlọmọn n’okwu gbasara amamihe?

6 Ọ ga-adị mma ma onye ọ bụla n’ime anyị jụọ onwe ya, sị: ‘Ènwere m mmasị ịchọ amamihe Chineke na-enye otú Sọlọmọn si chọọ ya?’ Ọtụtụ ndị ekworola na ha amaghị ihe echi ga-abụ tinye uche ha dum n’ọrụ ha ji akpata ego, ebe ndị ọzọ na-ekwo ya ekpebi ụdị ihe ha ga-amụ n’ụlọ akwụkwọ nakwa ebe ha ga-agaru akwụkwọ. Gịnwa ma ọ bụ ndị ezinụlọ gị kwanụ? Ihe i kpebiri ime n’okwu gbasara agụmakwụkwọ ò gosiri na ị na-achọ amamihe Chineke na-enye nakwa na i ji ya kpọrọ ihe? Ọ bụrụ na i kpebie ịkwụsịlata ihe ndị ị na-achụ ọ̀ ga-eme ka i nwee ike inwetakwu amamihe? Nke bụ́ eziokwu bụ na i nwee amamihe ma jiri ya na-eme ihe ọ bụla ị na-eme, ọ ga-abara gị uru ruo mgbe ebighị ebi. Sọlọmọn dere, sị: “Mgbe ahụ, ị ga-aghọta ezi omume na ikpe ziri ezi na ịkwụwa aka ọtọ, bụ́ ụzọ dum nke ihe dị mma.”—Ilu 2:9.

Ime Ka Ezi Ofufe Dewe Ude Mere Ka Udo Dị

7. Olee otú Chineke si nwee akatamkpo ụlọ nsọ?

7 Mgbe Sọlọmọn ka malitere amalite ịchị, o bidoro ịrụ akatamkpo ụlọ nsọ nke ga-anọchi ụlọikwuu a na-anọ efe ofufe kemgbe oge Mozis. (1 Eze 6:1) Anyị nwere ike ịkpọ ya ụlọ nsọ Sọlọmọn, ma, Sọlọmọn ebughị n’obi imere onwe ya aha ka a mara na ọ bụ onye na-atụ ụkpụrụ ụlọ ma ọ bụ omepụrụ onye ọ dịịrị. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ Devid bụ onye bu ụzọ rịọ Chineke ka ya wuoro ya ụlọ nsọ, Chineke atụọkwara ya ụkpụrụ doro anya banyere otú a ga-esi wuo ụlọ nsọ ahụ na otú a ga-esi chọọ ya mma. Devid tụkwara ego hiri nne e ji wuo ụlọ nsọ ahụ. (2 Sam. 7:2, 12, 13; 1 Ihe 22:14-16) Ma, ọ bụ Sọlọmọn ka ọ dabaara iwu nnukwu ụlọ nsọ a nke were afọ asaa na ọkara tupu e wuchaa ya.—1 Eze 6:37, 38; 7:51.

8, 9. (a) Olee ihe anyị na-amụta n’otú Sọlọmọn si rụọ ọrụ ndị dị mma n’adaghị mbà? (b) Gịnị mere mgbe Sọlọmọn mere ka ezi ofufe dewe ude?

8 Sọlọmọn bụ onye anyị kwesịrị iṅomi n’ihi na ike agwụghị ya ịrụ ọrụ ndị dị mma, o lekwasịkwara anya n’ihe ndị ka mkpa. Mgbe e wuchara ụlọ nsọ ahụ ma bubata igbe ọgbụgba ndụ n’ime ya, Sọlọmọn kpere ekpere n’ihu ọha. Ihe ụfọdụ ọ gwara Jehova n’ekpere ahụ bụ: “Ka anya gị dịrị n’ebe ụlọ a dị abalị na ehihie, n’ebe i kwuru banyere ya, sị, ‘Aha m ga-adị na ya,’ ka i gee ntị n’ekpere ohu gị chere ihu n’ebe a na-ekpe.” (1 Eze 8:6, 29) Ndị Izrel na ndị ala ọzọ nwere ike iche ihu n’ụlọ nsọ ahụ a kpọkwasịrị aha Chineke kpee ekpere.—1 Eze 8:30, 41-43, 60.

9 Gịnị mere mgbe Sọlọmọn mere ka ezi ofufe dewe ude? Mgbe a rarachaara ụlọ nsọ ahụ nye Chineke, ụmụ Izrel ‘ṅụrịrị ọṅụ ma na-enwe obi ụtọ n’ihi ihe ọma niile Jehova meere Devid bụ́ ohu ya na Izrel.’ (1 Eze 8:65, 66) N’eziokwu, udo na akụnụba ka e ji mara afọ iri anọ Sọlọmọn chịrị. (Gụọ 1 Ndị Eze 4:20, 21, 25.) Abụ Ọma nke 72 gosiri na nke a bụ eziokwu, gosikwa otú a ga-esi agọzi anyị mgbe Sọlọmọn nke Ka Ukwuu, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-achị anyị.—Ọma 72:6-8, 16.

Àgwà Sọlọmọn Ndị Anyị Na-ekwesịghị Iṅomi

10. Olee ihe ọjọọ Sọlọmọn mere nke na-agbatakarị anyị n’obi?

10 Oleezi ihe mere anyị ga-eji kwuo na o nwere àgwà Sọlọmọn ndị anyị na-ekwesịghị iṅomi? Ihe mbụ nwere ike ịgbata gị n’obi bụ ụmụ nwaanyị ndị mba ọzọ ọ lụrụ nakwa ndị iko o nwere. Anyị na-agụ, sị: “Mgbe Sọlọmọn na-eme agadi na ndị nwunye ya mere ka obi ya chigharịa soro chi ọzọ dị iche iche; obi ya dum adịghịkwa n’ebe Jehova bụ́ Chineke ya nọ.” (1 Eze 11:1-6) O doro anya na i kpebisiela ike na i nweghị ike iṅomi ụzọ ọjọọ ya. Ma, ọ̀ gwụla naanị nke ahụ bụ ihe ọjọọ Sọlọmọn mere ná ndụ ya? Tụlegodị ihe ụfọdụ e kwuru banyere ya, bụ́ ndị uche anyị na-anachaghị aga na ha, leekwa ma ò nwere ihe ha ga-akụziri gị.

11. Gịnị ka anyị ga-ekwu banyere nwaanyị mbụ Sọlọmọn lụrụ?

11 Sọlọmọn chịrị afọ iri anọ. (2 Ihe 9:30) N’ihi ya, gịnịzi ka ị ga-ekwu maka ihe e dere na 1 Ndị Eze 14:21? (Gụọ.) Amaokwu ahụ kwuru na mgbe Sọlọmọn nwụrụ, nwa ya bụ́ Rehoboam ghọrọ eze mgbe ọ dị afọ iri anọ na otu, nne Rehoboam bụkwa “Neama, nwaanyị Amọn.” Ihe nke a pụtara bụ na tupu Sọlọmọn aghọọ eze, ọ lụrụ nwaanyị si mba ọzọ bụ́ mba ndị iro ha, bụ́ ndị na-ekpere arụsị. (Ikpe 10:6; 2 Sam. 10:6) Nwunye ya a ò so kpeere arụsị? Ọ bụrụgodị na o nwere mgbe o mere otú ahụ, ọ ga-abụ na ọ kwụsịrị ikpere arụsị ma fewe Chineke otú Rehab na Rut mere. (Rut 1:16; 4:13-17; Mat. 1:5, 6) Ma, ọ ga-abụ na e nwere ndị ọgọ Sọlọmọn nakwa ndị ikwu ya bụ́ ndị Amọn ndị na-efeghị Jehova.

12, 13. Mgbe Sọlọmọn malitere ịchị, olee ihe na-adịghị mma o kpebiri ime, oleekwa ihe ọ ga-abụ na o chere?

12 Nsogbu bịara dị mgbe ọ ghọchara eze. Sọlọmọn ghọrọ “ọgọ Fero, bụ́ eze Ijipt, o wee lụrụ ada Fero ma kpọlata ya n’Obodo Devid.” (1 Eze 3:1) Nwaanyị Ijipt a ò mere ka Rut ma malite ife Chineke? O nweghị ihe gosiri na o mere otú ahụ. Kama nke ahụ, ka oge na-aga, Sọlọmọn wuuru ya ụlọ n’ebe na-abụghị n’Obodo Devid (ikekwe, wuokwara ndị inyom Ijipt ndị na-agbara nwunye ya ahụ odibo). N’ihi gịnị? Akwụkwọ Nsọ kwuru na o mere otú ahụ n’ihi na o kwesịghị ekwesị ka ndị na-efe chi ụgha biri nso n’ebe igbe ọgbụgba ndụ Jehova dị.—2 Ihe 8:11.

13 Ebe Sọlọmọn bụ eze, ọ ga-abụ na o chere na ịlụ adaeze Ijipt ga-abara ya uru, ma, nke ahụ ò kwesịrị ime ka o mee otú ahụ? Tupu oge Sọlọmọn, Chineke enyedịla ndị ya iwu ka ha ghara ịlụ ndị Kenan na-ekpere arụsị, ọ kpọdịrị ụfọdụ obodo aha. (Ọpụ. 34:11-16) Ọ̀ ga-abụ na Sọlọmọn chere na o nweghị ihe o mere ma ya lụọ onye Ijipt n’ihi na Ijipt esoghị n’obodo ndị ahụ a kpọrọ aha? Ya chegodị otú ahụ, ọ̀ ga-eme ka ihe o mere dị Chineke mma? Nke bụ́ eziokwu bụ na o geghị ntị n’ihe Jehova kwuru nke nwere ike ime ma onye Izrel lụọ onye mba ọzọ na-anaghị efe Jehova. Onye mba ọzọ ahụ nwere ike ime ka onye Izrel fewe chi ụgha.—Gụọ Diuterọnọmi 7:1-4.

14. Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị ghọta ihe ọjọọ Sọlọmọn mere?

14 Ànyị ga-amụta ihe n’ihe a na-adịghị mma Sọlọmọn mere? Nwanna nwaanyị nwere ike ịchọ ihe ọ ga-akụdo aka kpebie imebi iwu Chineke nyere ka ọ lụọ “naanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Kọr. 7:39) Nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị nwekwara ike ịsị na o nweghị ihe o mere ma ya soro n’otu òtù egwuregwu ma ọ bụ klọb n’ụlọ akwụkwọ. Ụfọdụ ndị nwere ike iche na ọ dịghị njọ ma ha ghara ịkwụ ụtụ isi n’ego niile ha na-akpata ma ọ bụ ghaa ụgha ma a jụọ ha ma ọ̀ bụ ha mere ihe ọ ga-abụ ha kweta, ndị mmadụ akọwa ha ọnụ. Otu ihe doro anya bụ na Sọlọmọn, bụ́ onye na-ezughị okè, chọtara ihe ọ kụdoro aka mebie iwu Chineke, anyị nwekwara ike ime otu ihe ahụ.

15. Olee otú Jehova si meere Sọlọmọn ebere, ma olee ihe anyị kwesịrị iburu n’obi n’okwu ahụ?

15 Ọ dị mma ịma na mgbe e kwuchara na Sọlọmọn lụrụ adaeze ndị mba ọzọ, Baịbụl kwuru na Chineke nyere ya amamihe ọ rịọrọ ya, nyekwa ya akụnụba. (1 Eze 3:10-13) Sọlọmọn mebiri iwu Chineke, ma, o nweghị ebe e dere ihe gosiri na Jehova jụrụ ya ozugbo ka ọ ghara ịbụ eze ma ọ bụ taa ya ezigbo ahụhụ. Chineke emeghị otú ahụ n’ihi na ọ ghọtara na anyị bụ ndị na-ezughị okè e ji ájá kpụọ. (Ọma 103:10, 13, 14) Ma buru ihe a n’obi: Ihe anyị mere nwere ike ịkpatara anyị nsogbu ugbu a ma ọ bụkwanụ ma e mechaa.

Ọ Lụrụ Ọtụtụ Ụmụ Nwaanyị!

16. Gịnị ka Sọlọmọn leghaara anya mgbe ọ lụrụ ọtụtụ ụmụ nwaanyị?

16 N’Abụ Sọlọmọn, eze Sọlọmọn gwara otu nwa agbọghọ na-amaghị nwoke okwu ire ụtọ na-asị ya na ọ mara mma karịa ndị nwunye eze iri isii na ndị iko nwaanyị iri asatọ. (Abụ Sọlọ. 6:1, 8-10) Ọ bụrụ na Sọlọmọn na-ekwu banyere onwe ya ebe a, ọ pụtara na n’ime afọ ole ọ chịrịla mgbe ahụ, ọ lụọla ọtụtụ ụmụ nwaanyị. A sịgodị na ọtụtụ n’ime ha ma ọ bụkwanụ ha niile bụ ndị Chineke, iwu Chineke si n’aka Mozis nye Izrel kwuru na eze Izrel ọ bụla ekwesịghị ‘ịlụ ọtụtụ ndị inyom, ka obi ya wee ghara ịpụ.’ (Diut. 17:17) Ma, Jehova ekwoghịkwa ihe a Sọlọmọn mere jụ ya. Chineke gọzidịrị Sọlọmọn, nye ya mmụọ nsọ o ji dee akwụkwọ Baịbụl bụ́ Abụ Sọlọmọn.

17. Olee eziokwu anyị na-ekwesịghị ileghara anya?

17 Nke a ọ̀ pụtara na Sọlọmọn mebiri iwu Chineke ma lagbụrụ ma ọ bụkwanụ na anyịnwa nwere ike ịlagbụrụ ma anyị mebie iwu Chineke? Mba. Kama nke ahụ, o gosiri na Chineke nwere ike inwere anyị ndidi ruo oge ụfọdụ. Ma, ọ bụrụ na onye na-efe Chineke adaa iwu Chineke ma ọ ghọtaghị mkpụrụ ọ kụrụ ozugbo ahụ, ọ pụtaghị na ọ gaghị emecha ghọrọ ya. Cheta ihe Sọlọmọn dere, nke bụ́: “Ọ bụ n’ihi emeghị ihe e kpere n’ikpe ngwa ngwa banyere ọrụ ọjọọ mere obi ji kaa ụmụ mmadụ nke ukwuu ime ihe ọjọọ.” O dekwara, sị: “Mụ onwe m makwaara na ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu ezi Chineke mma, n’ihi na ha tụrụ egwu ya.”—Ekli. 8:11, 12.

18. Olee otú ihe gbasara Sọlọmọn si gosi na ihe e kwuru ná Ndị Galeshia 6:7 bụ eziokwu?

18 Ọ gaara akara Sọlọmọn mma ma a sị na o mere ihe ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ! O meela ọtụtụ ihe ọma, Chineke ejirikwala ọtụtụ ihe gọzie ya. Ma, ka oge na-aga, ọ malitere iso ụzọ ọjọọ, ya si ná nke a pụta, ya abanye n’ọzọ. Àgwà ọjọọ bịara mara ya ahụ́. Ihe mere ya gosiri na ihe Pọl onyeozi mechara dee bụ eziokwu. O dere, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu: Chineke abụghị onye a ga-akwa emo. N’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa”! (Gal. 6:7) Sọlọmọn mechara ghọrọ mkpụrụ ọjọọ ọ kụrụ n’ihi na o leghaara ntụziaka Chineke nyere anya. Anyị na-agụ, sị: “Eze Sọlọmọn hụkwara ọtụtụ nwunye si mba ọzọ n’anya, tinyere ada Fero, ndị inyom Moab, Amọn, Idọm, Saịdọn na Het.” (1 Eze 11:1) Ọ ga-abụ na ọtụtụ n’ime ha akwụsịghị ife chi ụgha, Sọlọmọn malitekwara ife chi ụgha. Ọ hapụrụ ife Chineke, Chineke emechaakwa kwụsị inwere ya ndidi.—Gụọ 1 Ndị Eze 11:4-8.

Mụta Ihe n’Àgwà Ọma Ya Nakwa n’Àgwà Ọjọọ Ya

19. Gịnị mere ị ga-eji kwuo na e nwere ọtụtụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl anyị kwesịrị iṅomi?

19 Jehova ji obiọma mee ka Pọl si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” (Rom 15:4) Ihe ndị so n’ihe ndị ahụ e dere bụ akụkọ banyere ndị ikom na ndị inyom ndị anyị kwesịrị iṅomi okwukwe pụrụ iche ha nwere. Pọl kwuziri, sị: “Gịnị ọzọkwa ka m ga-ekwu? N’ihi na oge ga-agwụnahụ m ma ọ bụrụ na m gaa n’ihu ịkọ banyere Gidiọn, Berak, Samsịn, Jefta, Devid na Samuel na ndị amụma ndị ọzọ, bụ́ ndị sitere n’okwukwe merie alaeze dị iche iche n’agha, mezuo ezi omume, nweta nkwa dị iche iche, . . . bụrụ ndị e mere ka ha dị ike mgbe ha na-adịghị ike.” (Hib. 11:32-34) Anyị nwere ike ịmụta ezigbo ihe n’aka ndị kpara àgwà ọma, bụ́ ndị a kọrọ akụkọ ha n’Akwụkwọ Nsọ, anyị kwesịkwara iṅomi ha.

20, 21. Gịnị mere i ji kpebisie ike ịmụta ihe n’àgwà ọjọọ nke ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl kpara?

20 Ma, e nwekwara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl anyị na-ekwesịghị iṅomi. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị nwere mgbe ha bụ ndị ohu Jehova, ndị ha na ya dị ná mma. Ka anyị na-agụ Baịbụl, anyị ga-agụta ebe a kọrọ na ụfọdụ ndị ohu Chineke mehiere ihe, si otú ahụ bụrụ ndị anyị na-ekwesịghị iṅomi. Anyị nwere ike ịchọpụta na ụfọdụ ji nwayọọ nwayọọ mụta ịkpa àgwà ọjọọ, bụ́ nke mechara kpatara ha nsogbu. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ ndị ahụ? Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị dị ka: ‘Olee otú ha si bido ịkpa àgwà ọjọọ ahụ? Ụdị ihe ahụ ò nwere ike ime m? Olee otú m nwere ike isi ghara ikwe ka o mee m, kama, mụ ejiri ya mụta ihe?’

21 Anyị kwesịrị ichebara àgwà ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl echiche nke ọma, n’ihi na Pọl si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ihe ndị a nọ na-adakwasị ha dị ka ihe atụ, e dekwara ha ede ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka ná ntị, anyị ndị ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị a bịakwasịworo.”—1 Kọr. 10:11.

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na e nwere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl bụ́ ndị kpara àgwà anyị kwesịrị iṅomi na ndị kpara àgwà anyị na-ekwesịghị iṅomi?

• Olee otú Sọlọmọn si malite iso ụzọ ọjọọ ná ndụ ya?

• Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe ndị na-adịghị mma Sọlọmọn mere?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Sọlọmọn ji amamihe Chineke nyere ya rụọ ọrụ

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Ị̀ mụtara ihe n’ihe ndị Sọlọmọn mehiere?