Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ikwe Ka Mmụọ Chineke Na-edu Anyị?

Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ikwe Ka Mmụọ Chineke Na-edu Anyị?

Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ikwe Ka Mmụọ Chineke Na-edu Anyị?

“Ị bụ Chineke m. Mmụọ gị dị mma; ka ọ na-edu m.”—ỌMA 143:10.

1. Mee ihe atụ otú o si aba uru ma onye ma ụzọ duru onye na-amaghị ụzọ gaa ebe ọ na-agatụbeghị.

KA E WERE ya na ị na-aga ebe ị na-agatụbeghị. Ma, onye gị na ya so agatụla ebe ahụ, ị tụkwasịkwara ya obi. Ọ bụrụ na ọ ma ụzọ nke ọma, ọ ga-eduzi gị ụzọ. Ị gaghị efu ụzọ ma ọ bụrụ na i soro ntụziaka ya.

2, 3. (a) Olee ike dị egwu Jehova ji rụọ ọrụ ọtụtụ ijeri afọ gara aga? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ịtụ anya ka ike Chineke nke nọ n’ọrụ na-edu anyị taa?

2 E nwere ihe a na-anaghị ahụ anya na-akadị eduzi mmadụ. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ ike ahụ a kọwara n’amaokwu ndị malitere Baịbụl. Na Jenesis, e kwuru ihe Jehova rụrụ ọtụtụ ijeri afọ gara aga, sị: “Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.” Akwụkwọ Nsọ kwuru na Jehova zipụrụ otu ike dị egwu iji mee nke a. Ọ sịrị: “Ike Chineke nke nọ n’ọrụ nọkwa na-erugharị.” (Jen. 1:1, 2) Gịnị bụ ike ahụ nọ n’ọrụ? Ọ bụ mmụọ nsọ, nke bụ́ ike e ji kee ihe. Ọ bụ mmụọ nsọ a Jehova ji arụ ihe niile ọ na-arụ ka o ji kee anyị.—Job 33:4; Ọma 104:30.

3 Ebe anyị dị ndụ, na-eku ume, ànyị kwesịrị ịtụ anya ka ike Chineke nọ n’ọrụ nọrọkwa na-arụ ọrụ ná ndụ anyị? Ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya gosiri na Ọkpara Chineke ma na anyị kwesịrị ịtụ anya nke a. Ọ sịrị: ‘Mmụọ nsọ ga-eduzi unu wee nyere unu aka ịghọta eziokwu niile.’ (Jọn 16:13) Gịnị ka mmụọ nsọ a bụ, oleekwa ihe mere anyị ji kwesị ikwe ka ọ na-edu anyị?

Otú Mmụọ Nsọ Dị

4, 5. (a) Olee ihe na-abụghị eziokwu ndị na-akụzi na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu na-ekwu na mmụọ nsọ bụ? (b) Olee otú ị ga-esi akọwa otú mmụọ nsọ dị n’eziokwu?

4 O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị i zirila ozi ọma kweere ihe dị iche n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere mmụọ nsọ. Ndị na-akụzi na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu na-ekwu na mmụọ nsọ bụ mmụọ nke ya na Chineke bụ́ Nna ha otu. (1 Kọr. 8:6) Ma, ọ na-adị mfe ịchọpụta na ozizi Atọ n’Ime Otu dị iche n’ihe Akwụkwọ Nsọ na-akụzi.

5 Oleezi otú mmụọ nsọ dị n’eziokwu? Otú ahụ ifufe si akpa ike n’agbanyeghị na a na-anaghị ahụ ya anya ka mmụọ nsọ sikwa akpa ike n’agbanyeghị na a naghị ahụ ya anya. Mmụọ nsọ bụ ike Chineke ji arụ ọrụ n’ime mmadụ ma ọ bụ n’ime ihe dị iche iche iji mezuo uche ya. Ò siri ike ikweta na ụdị ike a dị egwu si n’aka Onye dị nsọ, bụ́ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile? Mbanụ!—Gụọ Aịzaya 40:12, 13.

6. Olee arịrịọ dị mkpa Devid rịọrọ Jehova?

6 Jehova ò nwere ike iji mmụọ ya na-edu anyị ná ndụ anyị niile? O kwere ọbụ abụ bụ́ Devid nkwa, sị: “M ga-eme ka i nwee nghọta, zikwa gị ụzọ ị ga-eso.” (Ọma 32:8) Devid ọ̀ chọrọ nke a? Ee, n’ihi na ọ rịọrọ Jehova, sị: “Kụziere m ime uche gị, n’ihi na ị bụ Chineke m. Mmụọ gị dị mma; ka ọ na-edu m.” (Ọma 143:10) Anyị kwesịkwara ịchọ ka mmụọ Chineke na-edu anyị, kwesịkwa ikwe ka ọ na-edu anyị. Maka gịnị? Ka anyị tụlee ihe anọ mere anyị ji kwuo otú ahụ.

Anyị Erughị Eru Idu Onwe Anyị

7, 8. (a) Gịnị mere anyị agaghị eduli onwe anyị ma Chineke edughị anyị? (b) Mee ihe atụ nke na-egosi na anyị ekwesịghị ịnwa iji aka anyị na-edu onwe anyị n’usoro ihe ọjọọ a.

7 Ihe mbụ mere anyị ji kwesị ịchọ ka mmụọ Chineke na-edu anyị bụ n’ihi na anyị agaghị eduli onwe anyị. Iduzi mmadụ pụtara igosi onye ahụ ụzọ ọ ga-eso. Ma, mgbe Jehova kere anyị o nyeghị anyị ikike idu onwe anyị, nke ka nke, otú a anyị bụ ndị na-ezughị okè. Jeremaya onye amụma ya dere, sị: “Jehova, amaara m nke ọma na ụzọ mmadụ adịghị ya n’aka. Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.” (Jere. 10:23) Gịnị mere ọ dịrịghị mmadụ iduzi nzọụkwụ ya? Jeremaya nụrụ ihe Chineke kwuru mere na anyị erughị eru iduzi onwe anyị. Jehova kọwara otú obi anyị dị. O kwuru, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite. Ònye pụrụ ịmara ya?”—Jere. 17:9; Mat. 15:19.

8 Ọ bụrụ na onye na-amaghị ụzọ agawa n’ala ịkpa ọ na-agatụbeghị mbụ n’akpọrọghị onye ma ụzọ nke ọma ka o duru ya, ọ̀ bụ na ọ gaghị adaba ná nsogbu? Ebe ọ bụ na ọ gaghị ama otú ọ ga-esi edi ihe ndị ga-eme ka ahụ́ ghara iru ya ala, ọ maghịkwa ụzọ ọ ga-esi ruo ebe ọ na-eje, njem ahụ nwere ike ịta isi ya. N’otu aka ahụkwa, ọ bụrụ na mmadụ echee na ya nwere ike idu onwe ya n’ụwa ọjọọ n’ekweghị ka Chineke zi ya ụzọ dị mma, onye ahụ ji ndụ ya na-egwu egwu. Naanị ihe ga-eme ka ihe gaara anyị nke ọma n’usoro ihe a bụ ikpe otu ekpere ahụ Devid kpere, bụ́ nke ọ rịọrọ Jehova, sị: “Ka ụkwụ m dịgide n’ụzọ gị, bụ́ ebe a na-agaghị eme ka ụkwụ m maa jijiji.” (Ọma 17:5; 23:3) Olee otú Jehova ga-esi na-edu anyị?

9. Dị ka e gosiri na foto dị na peeji nke 12, olee otú mmụọ Chineke ga-esi na-edu anyị nke ọma?

9 Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi ma chọọ ka Jehova na-edu anyị, ọ ga-enye anyị mmụọ nsọ ka ọ na-eduzi anyị. Olee otú ike ahụ nọ n’ọrụ ga-esi enyere anyị aka? Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, nke Nna m ga-ezite n’aha m, ga-akụziri unu ihe niile ma chetara unu ihe niile m gwara unu.” (Jọn 14:26) Ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere n’oge anyị na-amụ Okwu Chineke, bụ́ nke ihe dị iche iche Kraịst kwuru so na ya, na-amụkwa ya mgbe niile, mmụọ nsọ ga-eme ka anyị ghọtakwuo amamihe na-enweghị atụ nke Jehova, nke ahụ ga-emekwa ka anyị nwee ike ịna-eme uche ya. (1 Kọr. 2:10) Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na e nwee ihe gbagwojuru anyị anya n’ụzọ nke ndụ ahụ, mmụọ nsọ ga-ezi anyị ụzọ anyị ga-eso. Ọ ga-enyere anyị aka icheta ihe Baịbụl kwuru bụ́ ndị anyị mụrụla, nyekwara anyị aka ịghọta ihe anyị ga-eme n’okwu ahụ.

Mmụọ Chineke Duru Jizọs

10, 11. Gịnị ka Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya tụrụ anya ya na mmụọ nsọ ga-emere ya, oleekwa otú o si nyere ya aka?

10 Ihe nke abụọ mere anyị ji kwesị ịchọ ka mmụọ nsọ na-edu anyị bụ n’ihi na Chineke ji ya duo Ọkpara ya. Tupu Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya abịa n’ụwa, ọ ma amụma a eburu, sị: “Mmụọ Jehova ga-adakwasị ya, bụ́ mmụọ amamihe na nke nghọta, mmụọ ndụmọdụ na nke ịdị ike, mmụọ ihe ọmụma na nke egwu Jehova.” (Aịza. 11:2) Ihe ndị Jizọs na-aga ịhụ n’ụwa abụghị obere ihe. Chegodị otú ọ ga-esi chọsie mmụọ nsọ ike ka o nyere ya aka imeri ha dum!

11 Jehova mezuru ihe o kwuru. Luk kwuru ihe mere ozugbo e mechara Jizọs baptizim. Ọ sịrị: “Jizọs jupụtara na mmụọ nsọ wee si na Jọdan pụọ, mmụọ nsọ wee na-edugharị ya n’ala ịkpa.” (Luk 4:1) N’ala ịkpa ahụ, ka Jizọs nọ na-ebu ọnụ, na-ekpe ekpere, na-atụgharịkwa uche, ọ ga-abụ na Jehova mere ka Ọkpara ya mata ihe na-echere ya. Mmụọ nsọ rụrụ ọrụ n’uche na n’obi Jizọs, na-edu otú o si eche echiche nakwa ihe ndị ọ ga-ekpebi ime. Nke a nyeere Jizọs aka ịma ihe ọ ga-eme n’ihe ọ bụla bịaara ya, o mekwara ihe Nna ya chọrọ ka o mee.

12. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-arịọ Chineke ka o nye anyị mmụọ nsọ ga na-edu anyị?

12 Ebe Jizọs ma otú mmụọ Chineke si rụọ ọrụ bara uru ná ndụ ya, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta na ọ dị mkpa ka ha na-arịọ ka e nye ha mmụọ nsọ nakwa ka ọ na-edu ha. (Gụọ Luk 11:9-13.) Gịnị mere mmụọ nsọ ji dị anyị oké mkpa? N’ihi na o nwere ike ịgbanwe otú anyị si eche echiche, mee ka anyị chewezie ka Kraịst. (Rom 12:2; 1 Kọr. 2:16) Ọ bụrụ na anyị ekwe ka mmụọ Chineke na-edu anyị, anyị nwere ike ịna-eche echiche ka Kraịst, na-emekwa ka ya.—1 Pita 2:21.

Mmụọ nke Ụwa Ga-edufu Anyị

13. Gịnị bụ mmụọ nke ụwa, gịnịkwa ka o nwere ike ime ka mmadụ na-eme?

13 Ihe nke atọ mere anyị ji kwesị ịchọ ka mmụọ Chineke na-edu anyị bụ na ọ bụrụ na o dughị anyị, mmụọ nke na-adịghị nsọ, bụ́ nke na-arụ ọrụ n’ime ọtụtụ mmadụ taa, ga-edufu anyị. Ụwa nwere ike dị egwu nke nwere ike ime ka mmadụ kpawa àgwà dị nnọọ iche n’àgwà mmụọ nsọ na-eme ka mmadụ na-akpa. Mmụọ nke ụwa anaghị enyere ndị mmadụ aka inwe uche Kraịst, kama, ọ na-eme ka ha na-eche echiche ka Setan, bụ́ onye na-achị ụwa a, na-emekwa ka ha na-akpa àgwà ka ya. (Gụọ Ndị Efesọs 2:1-3; Taịtọs 3:3.) Ọ bụrụ na mmadụ ekwe ka mmụọ nke ụwa na-achị ya, ya ana-arụ ọrụ nke anụ ahụ́, ọ ga-aba n’ezigbo nso, nke ga-emekwa ka ọ ghara ịba n’Alaeze Chineke.—Gal. 5:19-21.

14, 15. Olee otú anyị nwere ike isi merie n’ọgụ anyị na-alụso mmụọ nke ụwa?

14 Jehova enyela anyị ihe niile anyị ga-eji na-alụso mmụọ nke ụwa ọgụ. Pọl onyeozi gwara anyị ka anyị ‘nọgide na-enweta ike n’ime Onyenwe anyị nakwa n’ịdị ike nke ume ya ka anyị wee nwee ike iguzo n’ajọ ụbọchị ahụ.’ (Efe. 6:10, 13) Jehova na-eji mmụọ ya enye anyị ike imeri Setan ná mbọ ọ na-agba iduhie anyị. (Mkpu. 12:9) Mmụọ nke ụwa dị ike, anyị enweghịkwa ike ịgbara ya ọsọ kpamkpam. Ma, anyị ekwesịghị ikwe ka ọ na-achị anyị. Mmụọ nsọ kadị ya ike, ọ ga-enyekwara anyị aka!

15 O nwere ihe Pita onyeozi kwuru banyere ndị hapụrụ iso ụzọ Kraịst na narị afọ mbụ. Ọ sịrị: “Ha hapụrụ ụzọ kwụ ọtọ, e duhiewo ha.” (2 Pita 2:15) Obi dị anyị ezigbo ụtọ n’ihi na anyị natara, “ọ bụghị mmụọ nke ụwa, kama mmụọ nke si na Chineke”! (1 Kọr. 2:12) Ọ bụrụ na anyị ekwe ka mmụọ nsọ na-akpa ike n’ahụ́ anyị, na-anabatakwa ihe ndị ọzọ Jehova ji enyere anyị aka ịna-eme uche ya, anyị ga-enweli ike imeri n’ọgụ anyị na-alụso mmụọ nke ajọ ụwa a bụ́ nke Setan.—Gal. 5:16.

Mmụọ Nsọ Na-eme Ka Mmadụ Na-amị Ezigbo Mkpụrụ

16. Olee mkpụrụ dị iche iche mmụọ nsọ nwere ike ime ka anyị na-amị?

16 Ihe nke anọ mere anyị ji kwesị ịchọ ka mmụọ Chineke na-arụ ọrụ n’ime anyị bụ n’ihi na ọ na-eme ka ndị ọ na-edu na-amị ezigbo mkpụrụ ná ndụ ha. (Gụọ Ndị Galeshia 5:22, 23.) Ò nwere onye n’ime anyị nke na-agaghị achọ ịna-ahụkwu ndị ọzọ n’anya, na-enwekwu ọṅụ, ma na-emekwu ka ya na ndị ọzọ dịrị n’udo? Olee onye n’ime anyị nke na-agaghị achọ ịna-enwekwu ogologo ntachi obi, obiọma, na ịdị mma? Olee onye ọ na-agaghị abara uru ma ọ bụrụ na o nwekwuo okwukwe, dịrịkwuo nwayọọ ma na-ejidekwu onwe ya? Mmụọ Chineke na-eme ka anyị na-amị ezigbo mkpụrụ bụ́ nke na-abara ma anyị ma ndị anyị na ha bi ma ndị anyị na ha so na-eje ozi uru. Anyị agaghị akwụsị ịna-amịkwu mkpụrụ a n’ihi na o nweghị otú anyị ga-enweru ya ya ezuoro anyị, o nweghịkwa ole a kpọrọ aha ka anyị mịa.

17. Olee otú anyị nwere ike isi na-egosikwu na anyị nwere mkpụrụ nke mmụọ nsọ?

17 Anyị kwesịrị ịtụle onwe anyị nke ọma iji mara ma okwu ọnụ anyị na omume anyị hà na-egosi na mmụọ nsọ na-edu anyị nakwa ma ànyị nwere mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (2 Kọr. 13:5a; Gal. 5:25) Ọ bụrụ na anyị achọpụta na o nwere ihe ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, bụ́ ndị kọrọ anyị, anyị kwesịrị ikwe ka mmụọ nsọ nyere anyị aka inwe ha nnukwu. Otú anyị ga-esi mee ya bụ ịgụ ebe Baịbụl kwuru banyere ihe ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ na ịtụle akwụkwọ anyị dị iche iche kọwara nke ọ bụla n’ime ha. Nke a ga-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi na-egosi kwa ụbọchị na anyị nwere mkpụrụ nke mmụọ nsọ, na-agbalịsikwa ike inwekwu ya. * Ọ bụrụ na anyị ahụ ihe bara uru mmụọ nsọ na-arụ ná ndụ anyị nakwa ná ndụ ụmụnna anyị, anyị ga-aghọta nke ọma ihe mere anyị ji kwesị ikwe ka ọ na-edu anyị.

Ị̀ Na-ekwe Ka Mmụọ Chineke Na-edu Gị?

18. Olee otú Jizọs si bụrụ onye anyị kwesịrị iṅomi ma a bịa n’ikwe ka mmụọ Chineke na-edu anyị?

18 Baịbụl kwuru na mgbe Jizọs bịara n’ụwa, mmụọ nsọ kpara ezigbo ike ná ndụ ya. O kwere ka o duo ya, mgbe ọ gwakwara ya ihe ọ ga-eme, o kwetara ma mee ya. (Mak 1:12, 13; Luk 4:14) Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị?

19. Gịnị ka anyị ga-emerịrị ka mmụọ nsọ bụrụ ike ga na-edu anyị ná ndụ?

19 Ike Chineke nke nọ n’ọrụ ka na-arụ ọrụ n’uche na n’obi ndị chọrọnụ, ọ na-edukwa ha. Olee otú i nwere ike isi kwe ka ọ na-arụ ọrụ n’ime gị ma na-eduzi gị? Na-arịọ Jehova mgbe niile ka o nye gị mmụọ ya nakwa ka o nyere gị aka ikwe ka ọ na-edu gị. (Gụọ Ndị Efesọs 3:14-16.) Na-eme ihe kwekọrọ n’ekpere gị. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịchọ ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl, bụ́ Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee. (2 Tim. 3:16, 17) Na-eme ihe mmụọ nsọ na-agwa gị mee, na-egosikwa na ị chọsiri ike ka ọ na-edu gị. Ị ga-esi otú ahụ gosi na i nwere okwukwe na Jehova ga-eduli gị ka ihe gaara gị nke ọma ná ndụ n’ụwa ọjọọ a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Ị chọọ ịma ebe a kọwara nke ọ bụla n’ihe ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, gụọ w07 7/15 24-25; w03 1/15 11; w02 1/15 17; w95 1/15 16; w01 11/1 14-15; w03 7/1 6; w01 1/1 22; w03 4/1 15, 19-20; w03 10/15 14.

Ị̀ Ghọtara Ihe Ndị Bụ́ Isi Anyị Mụrụ n’Isiokwu A?

• Olee otú mmụọ nsọ si arụ ọrụ ná ndụ anyị?

• Olee ihe anọ mere anyị ji kwesị ịchọ ka mmụọ Chineke na-edu anyị?

• Olee ihe anyị ga-eme ka mmụọ nsọ na-edu anyị, ya abaakwara anyị ezigbo uru?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Mmụọ Chineke bụ ike rụrụ ọrụ ná ndụ Jizọs

[Foto dị na peeji nke 17]

Mmụọ Chineke na-arụ ọrụ n’uche na n’obi ndị mmadụ, ọ na-edukwa ha