Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbanwe Ndị Anyị Mere Baara Anyị Uru

Mgbanwe Ndị Anyị Mere Baara Anyị Uru

Mgbanwe Ndị Anyị Mere Baara Anyị Uru

Dị ka James A. Thompson si kọọ

A mụrụ m n’afọ 1928 n’ebe ndịda Amerịka. N’oge ahụ, e tiri iwu na ndị ọcha na ndị isi ojii agaghị na-emekọ ihe. E nwere ike ịtụ onye dara iwu a mkpọrọ ma ọ bụdị e mee ya ihe ka njọ.

N’OGE ahụ, n’ọtụtụ ebe n’Amerịka, iwu ahụ e tiri mere ka Ndịàmà Jehova bụ́ ndị ọcha na-anọ n’ọgbakọ, sekit na distrikti dị iche na nke ndị isi ojii. N’afọ 1937, a họpụtara papa m ka ọ bụrụ ohu kọmpịnị (nke a na-akpọzi onye na-ahaziri òtù ndị okenye ọrụ) nke ọgbakọ ndị isi ojii dị n’obodo Chatanuga nke dị na steeti Tenesii nke Amerịka. Henry Nichols bụ ohu kọmpịnị nke ọgbakọ ndị ọcha.

E nwere ọtụtụ ihe mere m obi ụtọ mgbe m ka na-eto eto. M na-anọdụ ala n’èzí n’abalị n’akụkụ papa m na Nwanna Nichols na-ege ntị ka ha abụọ na-akparịta ụka. Ọ bụ eziokwu na aghọtachaghị m ihe niile ha na-akpa, obi na-atọ m ụtọ ka m na-anụ ebe ha abụọ na-akparịta otú kacha mma ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị nsogbu ndị dị n’oge ahụ.

N’afọ 1930, njinji jiri n’ezinụlọ anyị. Mama m, bụ́ onye dị naanị iri afọ abụọ mgbe ahụ, nwụrụ. Ọ bụ naanị papa m zụwaziri Doris, bụ́ nwanne m nwaanyị dị afọ anọ, na mụnwa dị naanị afọ abụọ mgbe ahụ. N’agbanyeghị na o tebeghị e mere papa m baptizim, ọ na-eme nke ọma n’ọgbakọ.

Ndị Àgwà Ha Mere Ka M Na-akpa Àgwà Ọma

N’afọ 1933, papa m hụrụ ọmarịcha nwanna nwaanyị aha ya bụ Lillie Mae Gwendolyn Thomas, o teghịkwa aka ha alụọ. Papa m na nwunye ya nọsiri ike n’ozi ha na-ejere Jehova, si otú ahụ gosi mụ na Doris ihe anyị kwesịrị iji ndụ anyị na-eme.

N’afọ 1938, a gwara ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova ka ha kweta ka e si n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin, Niu Yọk, na-ahọpụta ndị okenye kama ọgbakọ iji ịtụli aka elu na-ahọpụta ha. Mgbe ndị ụfọdụ nọ na Chatanuga na-ekwetaghị ka e mee mgbanwe a, papa m kwuru hoo haa na ya kwadoro mgbanwe ọ bụla nzukọ a mere. Otú a o si kwụsie ike nakwa otú nwunye ya si jiri obi ya dum kwado ya, ka na-enyere m aka taa.

Baptizim na Ozi Oge Niile

N’afọ 1940, ụmụnna ole na ole nọ n’ọgbakọ anyị chọtara bọs bu ha gaa mgbakọ e nwere na Ditrọịt, Mishigan. E mere mmadụ ole na ole n’ime ndị nọ na bọs anyị baptizim ná mgbakọ ahụ. Ebe ọ bụ na m na-ekwusa ozi ọma kemgbe m dị afọ ise, na-agachikwa ozi ọma anya, o juru ụfọdụ ndị anya na e meghị m baptizim.

Mgbe ha jụrụ m ihe mere na e meghị m baptizim, m na-agwa ha sị, “Aghọtachabeghị m ihe baptizim pụtara.” Papa m nụpeere ihe m kwuru, ya eju ya anya. Site mgbe ahụ gawa, o wepụtakwuru oge nyere m aka ịghọta ihe baptizim pụtara na ihe mere e ji kwesị ime mmadụ baptizim. Ka ọnwa anọ gachara, ya bụ, n’abalị mbụ nke ọnwa Ọktoba n’afọ 1940, n’ụbọchị oké oyi na-atụ, e mere m baptizim n’otu iyiala dị na Chatanuga.

Mgbe m dị afọ iri na anọ, amalitere m ịsụ ụzọ oge niile n’oge okpomọkụ, bụ́ oge ezumike ụlọ akwụkwọ anyị. Ekwusara m ozi ọma n’obodo nta bụ́ Tenesii nakwa na Jọjia, bụ́ steeti ya na ya gbara agbata obi. M na-ebili n’isi ụtụtụ, buru nri m ga-eri n’ehihie, ma banye n’ụgbọ okporo ígwè ma ọ bụ bọs na-apụta n’elekere isii nke ụtụtụ ọ bụla, ya ebuga m n’ókèala m ga-ekwusa ozi ọma. M na-alọta ma ọ kụọ ihe dị ka elekere isii nke uhuruchi. Ana m erichakarị nri ehihie m bu gaa tupu oge nri ehihie eruo. N’agbanyeghị na m ji ego, enweghị m ike ịga zụrụ nri n’ebe a na-ere ihe n’ihi na abụ m onye isi ojii. O nwere otu oge m banyere n’otu ụlọ ahịa ka m zụrụ aịz-krim, a chụpụ m. Otu nwaanyị onye ọcha ji obiọma wepụtara m otu.

Mgbe m bidoro ịga akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, òtù na-achọ ihe ndị ruuru ha selitewere isi n’ike n’ike n’ebe Ndịda. Òtù ndị dị ka Òtù Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Ndị Isi Ojii n’Amerịka gbara ụmụ akwụkwọ ume ka ha na-akpọsa ka e nye ha ihe ndị ruuru ha. A gbara anyị ume ka anyị soro n’òtù a. Ụlọ akwụkwọ ndị isi ojii ọ bụla, ma nke mụnwa na-aga, kpebiri na nwa akwụkwọ ọ bụla ga-eso n’òtù ahụ. A gwara m na m “ga-akwadorịrị ndị agbụrụ anyị.” Ma, ekweghị m. M gwara ha na Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu, ọ naghịkwa emelara otu ndị ihe. N’ihi ya, ọ bụ Chineke ka m tụkwasịrị obi na ọ ga-eme ka ụdị mmegbu a kwụsị.—Jọn 17:14; Ọrụ 10:34, 35.

Obere oge m gụchara akwụkwọ sekọndrị, ekpebiri m ịkwaga Niu Yọk Siti. Ma, ka m na-aga, ebu m ụzọ kwụsị na Filadelfịa dị na Pensụlvenịa, gaa na nke ndị enyi m bụ́ ndị mụ na ha hụrụ n’otu mgbakọ gara aga anyị gara. Ọgbakọ e nwere ebe ahụ bụ ọgbakọ mbụ m gatụrụla e nwere ma ndị ọcha ma ndị isi ojii. Mgbe onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eleta ọgbakọ ahụ, ọ kpọọrọ m gaa otu akụkụ ma gwa m na e kenyela m ihe omume n’ọmụmụ ihe ọzọ. Ihe a ọ gwara m mere ka m kpebizie ibiri ebe ahụ.

Onye so ná ndị m metere enyi na Filadelfịa bụ nwanna nwaanyị na-eto eto aha ya bụ Geraldine White, bụ́ onye m mechara kpọwa Gerri. Ọ ma Baịbụl nke ọma, ọ makwa ka e si agwa ndị nwe ụlọ okwu n’ozi ụlọ n’ụlọ. Ihe kacha masị m n’ebe ọ nọ bụ na ihe m bu n’obi ịrụ ka o bukwa n’obi ịrụ, ya bụ, ọrụ ịsụ ụzọ oge niile. Anyị lụrụ n’abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Eprel n’afọ 1949.

A Kpọrọ Anyị Ịga Gilied

Ihe na-agụ anyị kemgbe anyị lụrụ bụ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied na ije ozi ala ọzọ. Anyị ji obi ụtọ bido ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu ka anyị nwee ike isi otú ahụ jikere maka Gilied. N’oge na-adịghị anya, a gwara anyị ka anyị kwaga Lọnsaịd dị na Niu Jesi; anyị esi ebe ahụ gaa Chesta dị na Pensụlvenịa; n’ikpeazụkwa, anyị gara Atlantik Siti dị na Niu Jesi. Ka anyị nọ n’Atlantik Siti, anyị mechara ruo eruo itinye akwụkwọ ịga Gilied, ebe o ruola afọ abụọ anyị lụrụ. Ma, a kpọghị anyị ozugbo. Maka gịnị?

N’agbata afọ 1950 na afọ 1955, a manyere ọtụtụ ụmụ okorobịa ka ha soro ná ndị agha ma soro lụọ agha a na-alụ na Koria. O yiri ka òtù ndị na-amanye ndị mmadụ ịga agha na Filadelfịa kpọrọ Ndịàmà Jehova asị n’ihi na ha anaghị adụnyere mba ọ bụla úkwù. N’ikpeazụ, otu ọkàikpe gwara m na ihe ndị uwe ojii a na-akpọ FBI chọpụtara banyere m gosiri na mụ ekwesịghị ịga agha. N’ihi ya, n’abalị iri na otu nke ọnwa Jenụwarị n’afọ 1952, ụlọ ikpe mkpegharị ikpe kwere ka m ghara ịga agha n’ihi na m bụ onye ozi n’okpukpe m na-ekpe.

N’Ọgọst afọ ahụ, a kpọrọ mụ na nwunye m òkù ka anyị bịa klas nke 20 nke Gilied, bụ́ nke malitere na Septemba. Ka anyị na-amụ ihe, anyị nọ na-atụ anya na a ga-eziga anyị ije ozi ná mba ọzọ. Doris nwanne m nwaanyị gụchara nke ya na klas nke 13 nke Gilied, ọ na-ejekwa ozi na Brazil. O juru mụ na nwunye m anya mgbe anyị natara akwụkwọ ozi e ji gwa anyị na m bụzi onye nlekọta sekit, nakwa na m ga na-eleta ọgbakọ ndị isi ojii bụ́ ndị dị n’ebe ndịda steeti Alabama! O nwechara otú o mere anyị mgbe anyị nụrụ ya n’ihi na ihe anyị na-atụ anya ya kemgbe bụ ije ozi n’ala ọzọ.

Ọgbakọ mbụ anyị letara bụ Họntsvil. Mgbe anyị rutere, anyị gara n’ụlọ otu nwanna nwaanyị anyị ga-anọ na nke ya leta ọgbakọ ahụ. Ka anyị na-ebutusị ibu anyị, anyị nụpeere ka ọ na-agwa mmadụ na fon sị, “Ụmụaka ahụ abịala.” Anyị dị naanị afọ iri abụọ na anọ, onye leekwa anyị anya, ọ ga-eche na anyị erubeghị afọ ole ahụ. Ụmụaka nwanna nwaanyị ahụ kpọrọ anyị naara anyị aha anyị na sekit ahụ.

Ihe a na-akpọkarị ebe Ndịda Amerịka bụ Baịbụl Belt n’ihi otú ọtụtụ ndị n’ebe ahụ si jiri Baịbụl kpọrọ ihe. N’ihi ya, anyị na-ejikarị ụzọ ihe atọ a amalite izi ndị mmadụ ozi ọma:

(1) Ikwu ihe ole na ole ndị na-eme n’ụwa.

(2) Ikwu otú Baịbụl kwuru a ga-esi kwụsị ya.

(3) Ikwu ihe Baịbụl kwuru anyị ga-emerịrị.

Ihe ọzọ anyị na-eme bụ inye onye ahụ otu akwụkwọ anyị nke kwuru banyere ihe ndị anyị gwara ya. N’ihi otú nke a si agara anyị n’ozi ọma, e nyere m ihe omume ná mgbakọ a kpọrọ New World Society Assembly (ya bụ, Mgbakọ Òtù Ụwa Ọhụrụ) e nwere n’afọ 1953 na Niu Yọk. N’ihe omume ahụ, emere m ihe ngosi otú anyị si eme ụzọ ihe atọ ndị ahụ n’ozi ọma.

N’oge okpomọkụ n’afọ 1953, a họpụtara m ka m bụrụ onye nlekọta distrikti ga na-elekọta sekit ndị isi ojii nke dị n’ebe Ndịda Amerịka. Anyị na-eleta sekit ndị dị na Vejinia ruo Flọrịda, nakwa ndị nke dị n’Alabama na Tenesii, bụ́ obodo ndị dị n’ebe ọdịda anyanwụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ga-amụtarịrị ịna-anabata otú ọ bụla ihe si kwụrụ n’ebe ọ bụla ha gara. Dị ka ihe atụ, anyị na-anọkarị n’ụlọ na-enweghị paịpụ mmiri ndị na-adị n’ime ụlọ, na-ejikwa ọkwá ịsa ahụ́ asa ahụ́ n’azụ usekwu. Obi na-adị anyị ụtọ ịnọ ebe ahụ asa ahụ́ n’ihi na ọ bụ ebe kacha ekpo ọkụ n’ụlọ ahụ!

Ihe Ndị Ịkpa Ókè Agbụrụ Kpatara

Onye na-eje ozi n’ebe Ndịda ga-akpachapụ anya chebara ihe ndị ọ chọrọ ime echiche tupu ya emee ha. Anaghị ekwe ka ndị isi ojii saa ákwà ha n’ebe a na-eji njin asa ákwà. N’ihi ya, ọ na-abụ nwunye m gaa ebe ahụ ya asị na ákwà ndị ahụ bụ nke “Oriakụ Thompson.” O yiri ka ọtụtụ ndị chere na ọ bụ odibo, ebe “Oriakụ Thompson” bụ nne ya ukwu. N’oge ndị nlekọta distrikti na-egosi fim bụ́ The New World Society in Action, ọ na-abụ m chọọ nnukwu tiivi a ga-eji ele fim ahụ, mụ akpọọ ndị nwere ya n’ụlọ ahịa ha na telefon gwa ha ka ha wepụtara “Maazị Thompson” otu. E mechaa, mụ agaa n’ụlọ ahịa ahụ buru ya. Anyị na-akpaso ndị mmadụ àgwà otú dị mma mgbe ọ bụla, o nweghịkwa onye na-enye anyị nsogbu n’ozi ọma.

O nwere nsogbu ọzọ e nwere ebe ahụ. Ọtụtụ ndị bi na Ndịda kpọrọ ndị si ebe Ugwu asị. E nwere otu oge otu akwụkwọ akụkọ kwuru na James A. Thompson nke Nta, nke Watchtower Bible and Tract Society nke Niu Yọk ga-ekwu okwu n’otu mgbakọ. Nke a mere ka ụfọdụ ndị chee na m si Niu Yọk, e kweghịzi ka anyị nọrọ n’ụlọ ezumezu nke otu ụlọ akwụkwọ anyị na ha kwekọrịtarala ịnọ ebe ahụ nwee mgbakọ. N’ihi ya, m gakwuuru ndị isi ụlọ akwụkwọ ahụ ma gwa ha na m gara akwụkwọ na Chatanuga. Mgbe ahụ ka e kwetaziri ka anyị nọrọ ebe ahụ nwee mgbakọ sekit anyị.

Esemokwu agbụrụ na agbụrụ biiri ọkụ n’ihe dị ka n’agbata afọ 1953 na afọ 1956. Mgbe ụfọdụ, a na-ahụkwa ebe otu ndị na ibe ha na-alụ ọgụ. N’ụfọdụ mgbakọ distrikti anyị nwere n’afọ 1954, ụfọdụ Ndịàmà were iwe na o nweghị onye isi ojii mere ihe omume. Anyị gwara ụmụnna anyị ndị isi ojii ka ha nwee ndidi. N’afọ sochirinụ, e kenyere m ihe omume. Site mgbe ahụ gawa, e nyeweziri ụmụnna ndị isi ojii si ebe Ndịda ihe omume ná mgbakọ.

Ka oge na-aga, ndị ọcha na ndị isi ojii bi n’ebe Ndịda kwụsịlatara ịkpọ ibe ha asị, ụmụnna ndị bụ́ ndị ọcha na ndị bụ́ ndị isi ojii bidokwara nwekọwa ọmụmụ ihe ọnụ. Nke a pụtara na a ga-akpọrọ ụfọdụ ndị nkwusa gafee n’ọgbakọ ọzọ, kegharịa ókèala ọgbakọ nakwa ọrụ ndị okenye dị iche iche na-arụ n’ọgbakọ. Ụfọdụ ndị, ma ndị ọcha ma ndị isi ojii, anabataghị ihe a a hazigharịrị. Ma, ọtụtụ ụmụnna anyị akpaghị ókè dị ka Nna anyị nke eluigwe na-anaghịkwa akpa ókè. N’eziokwu, ọtụtụ n’ime ha ghọrọ ezigbo ndị enyi n’agbanyeghị ma ndị enyi ha hà bụ ndị ọcha ma ọ bụ ndị isi ojii. Kemgbe m dị obere, ya bụ, n’agbata afọ 1930 na afọ 1950, ezinụlọ anyị anaghị akpa ókè.

Ọrụ Ọhụrụ E Nyere Anyị

Na Jenụwarị 1969, mụ na nwunye m nwetara akwụkwọ ozi e ji kenye anyị ịga Gayana, nke dị n’ebe Ndịda Amerịka. Nke ahụ masịkwara anyị. Anyị bu ụzọ gaa Bruklin, dị na Niu Yọk, bụ́ ebe e nyere m ọzụzụ otú m ga-esi na-elekọta ọrụ ikwusa ozi ọma a na-arụ na Gayana. Anyị rutere Gayana na Julaị 1969. Ebe anyị nọ na-ejegharị elekọta ọgbakọ kemgbe afọ iri na isii ugbu a, o siiri anyị ike ịmụta ịnọ otu ebe. Nwunye m bụ onye ozi ala ọzọ, n’ihi ya, ọtụtụ ụbọchị n’izu, ọ na-aga ozi ọma, ma mụnwa na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ.

Ihe ndị so n’ihe m na-arụ bụ ịsụ ahịhịa, izigara isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin ọda ọgbakọ iri abụọ na asatọ na-atụ ka e zitere ha akwụkwọ. M na-arụ ọrụ awa iri na anọ ma ọ bụ awa iri na ise kwa ụbọchị. Ọrụ e nyere onye ọ bụla n’ime anyị abụọ adịghị mfe ọrụrụ, ma anyị ji obi ụtọ rụọ ya. Mgbe anyị bịara Gayana, e nwere narị ndị nkwusa itoolu na iri ise, ma taa, e nwere ihe karịrị puku ndị nkwusa abụọ na narị ise.

Ọ bụ eziokwu na obi dị anyị ụtọ maka na ebe ahụ anaghị ajụbiga oyi ókè, anyị ana-ata mkpụrụ osisi ndị dị ezigbo ụtọ, na-erikwa akwụkwọ nri ndị na-edozi ahụ́, ihe kacha mee anyị obi ụtọ bụ na ndị dị umeala n’obi ọ na-agụ agụụ ịmụ Baịbụl na-amụta eziokwu banyere Alaeze Chineke. Nwunye m na-eduziri mmadụ iri abụọ ihe kwa izu, e mechakwara mee ọtụtụ n’ime ndị anyị duziiri ihe baptizim. Ka oge na-aga, ụfọdụ n’ime ha ghọrọ ndị ọsụ ụzọ oge niile, ndị ọzọ aghọọ ndị okenye, ndị ọzọ agaakwa ụlọ akwụkwọ Gilied, mechaadị bụrụ ndị ozi ala ọzọ.

Nsogbu Ndị Anyị Nwere, Karịchaa, Ọrịa

N’afọ 1983, ndị mụrụ m, bụ́ ndị bi n’Amerịka, bịara chọọ ka e nyere ha aka. Mụ na Doris na nwunye m nọkọrọ ka ezinụlọ ma kparịta ihe anyị ga-eme. Doris, bụ́ onye jerela ozi ala ọzọ na Brazil ruo iri afọ atọ na ise, kwetara ịla gaa lekọta ha. Ọ sịrị na o nweghị uru ọ bara ka mmadụ abụọ hapụ ozi ala ọzọ ha na-eje gaa rụwa ihe naanị otu onye ga-arụli. Ndị mụrụ m mechara nwụọ. Kemgbe ahụkwa, Doris nọ na-arụ ọrụ ịsụ ụzọ pụrụ iche na Chatanuga.

N’afọ 1995, e lere m ahụ́ chọpụta na m nwere ọrịa kansa mkpụrụ amụ, bụ́ nke mere ka anyị laghachi Amerịka. Anyị gara biri na Goldsboro, nke dị na Nọt Karolaịna, n’ihi na isi ebe ahụ ruo Tenesii, bụ́ ebe anyị, na isi ebe ahụ ruo Pensụlvenịa, bụ́ ebe nwunye m, fọrọ obere ka ha hara otu. Ọrịa kansa m nwere anaghị enyechazi m nsogbu, anyị rụwakwara ọrụ ịsụ ụzọ pụrụ iche n’ọgbakọ Goldsboro, na-enye awa ole ọ bụla ọrịa kwere anyị rụta.

Ka m na-echeta ihe karịrị afọ iri isii na ise m jerela ozi oge niile, m na-ekele Jehova maka otú o sirila gọzie mgbanwe ndị mụ na nwunye m mere iji jeere ya ozi. Ihe Devid kwuru bụ eziokwu. “Onye na-eguzosi ike n’ihe ka [Jehova] ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe”!—2 Sam. 22:26.

[Foto ndị dị na peeji nke 3]

Papa m na Nwanna Nichols kpara àgwà otú mere ka m mụta ime ihe dị mma

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Mgbe mụ na nwunye m jikeere ịga Gilied n’afọ 1952

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Mgbe anyị gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Gilied, e zigara anyị ịna-eleta ọgbakọ ndị dị n’ebe Ndịda

[Foto dị na peeji nke 6]

Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha ejikere ịga mgbakọ distrikti ndị ọcha na ndị isi ojii ga-agakọ ọnụ n’afọ 1966

[Foto dị na peeji nke 7]

Ozi ala ọzọ anyị jere na Gayana tọrọ anyị ụtọ