Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi N’oge Ochie, Bụ́ Ndị Mmụọ Nsọ Duru

Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi N’oge Ochie, Bụ́ Ndị Mmụọ Nsọ Duru

Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi N’oge Ochie, Bụ́ Ndị Mmụọ Nsọ Duru

“Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ezipụwo m, ọbụna mmụọ ya.”—AỊZA. 48:16.

1, 2. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-egosi na anyị nwere okwukwe, oleekwa otú ịtụle ihe banyere ndị ohu Chineke n’oge ochie ga-esi agba anyị ume?

O DORO anya kemgbe oge Ebel na “ọ bụghị mmadụ niile nwere okwukwe.” (2 Tesa. 3:2) Ya bụrụ otú ahụ, olee ihe mere mmadụ ji enwe okwukwe, oleekwa ihe na-enyere ya aka ịna-ekwesị ntụkwasị obi? Ihe na-akacha enyere mmadụ aka inwe okwukwe bụ ihe ọ nụrụ nke si n’Okwu Chineke. (Rom 10:17) Okwukwe so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22, 23) N’ihi ya, ọ bụ mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka igosi na anyị nwere okwukwe.

2 Onye ọ bụla nke chere na ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe bu ya pụta ụwa, dara ya. Ndị ohu Jehova ndị bụ́ ezigbo ihe nlereanya, bụ́ ndị anyị gụrụ akụkọ ha na Baịbụl, “nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe.” (Jems 5:17) Ha nwere ihe ndị na-eme ha obi abụọ, nweekwa ebe ndị ha na-anaghị eme nke ọma, ma mmụọ Chineke mere ka “ha dị ike” idi ihe ndị bịaara ha. (Hib. 11:34) Ọ bụrụ na anyị atụlee otú mmụọ Jehova si nyere ha aka, nke a ga-agba anyị ume ịna-ekwesị ntụkwasị obi n’oge a e nwere ọtụtụ ihe ndị na-achọ imebi okwukwe anyị.

Mmụọ Chineke Nyere Mozis Ike

3-5. (a) Olee otú anyị si mara na mmụọ nsọ nyeere Mozis aka ịrụ ọrụ e nyere ya? (b) Gịnị ka ihe a kọrọ gbasara Mozis na-akụziri anyị banyere otú Jehova si enye mmụọ nsọ ya?

3 Mozis “dị nnọọ umeala n’obi karịa” mmadụ niile nọ n’ụwa n’afọ 1513 T.O.A. (Ọnụ Ọgụ. 12:3) E nyere ohu Chineke a dị umeala n’obi nnukwu ọrụ ná mba Izrel. Mmụọ Chineke nyere Mozis ike ibu amụma, ikpe ikpe, ide ihe, idu ndú, na ịrụ ọrụ ebube. (Gụọ Aịzaya 63:11-14.) Ma, e nwere mgbe Mozis kpesaara Jehova na ibu o bu na-anyịgbu ya. (Ọnụ Ọgụ. 11:14, 15) N’ihi ya, Jehova wepụrụ “ụfọdụ n’ime mmụọ” dị n’ahụ́ Mozis wụkwasị ya n’ahụ́ iri mmadụ asaa ndị ọzọ ka ha nyere ya aka na-ebu ibu ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 11:16, 17) Ọ bụ eziokwu na ibu Mozis bu yiri ka ọ̀ dị oké arọ, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị naanị ya nọ na-ebu ya. Mmadụ iri asaa ahụ a họpụtara ka ha nyere ya aka agaghịkwa ebu ya naanị ha.

4 E nyere Mozis mmụọ nsọ ga-ezu inyere ya aka ịrụ ọrụ ahụ e nyere ya. Mozis ka nwekwara mmụọ nsọ ga-enyere ya aka ịrụ ọrụ ya mgbe a họpụtachara ndị ọzọ ka ha nyere ya aka. Mmụọ nsọ fọọrọ Mozis adịghị obere, nke e nyekwara ndị ikom iri asaa ahụ akarịghị akarị. Jehova na-enye onye ọ bụla n’ime anyị mmụọ nsọ ga-ezuru ya ime ihe ndị o kwesịrị ime. “Ọ dịghị atụ̀ mmụọ nsọ ọ na-enye atụ̀” kama ọ na-esi “n’ihe o nwejuru enweju” enye anyị ihe.—Jọn 1:16; 3:34.

5 È nwere nsogbu gị na ya na-alụ? Ọ̀ na-adị gị ka ọrụ ndị i kwesịrị ịna-arụ hà na-ewekọrọ oge gị? Ị̀ na-agbasi mbọ ike ka i nye ezinụlọ gị ihe na-akpa ha ma nyere ha aka ka ha na Chineke na-adị ná mma n’agbanyeghị otú ihe si sie ike nakwa ọrịa ndị gị na ha na-alụ? Ì nwere ọtụtụ ọrụ ndị ị na-arụ n’ọgbakọ? Obi sie gị ike na Chineke ga-enyeli gị mmụọ ya ka o nyere gị aka idi ihe ọ bụla bịaara gị.—Rom 15:13.

Mmụọ Nsọ Mere Ka Bezalel Ruo Eruo

6-8. (a) Gịnị ka mmụọ Chineke nyeere Bezalel na Oholiab aka ịrụ? (b) Gịnị gosiri na mmụọ Chineke duru Bezalel na Oholiab? (ch) Gịnị mere ihe a kọrọ banyere Bezalel ji agba anyị ume taa?

6 Akụkọ banyere Bezalel, bụ́ onye dịrị ndụ n’oge Mozis, gosiri nnọọ otú mmụọ nsọ si arụ ọrụ. (Gụọ Ọpụpụ 35:30-35.) A họpụtara Bezalel ka ọ bụrụ onye ndú nke ndị na-emepụta ihe ụfọdụ ga-adị n’ụlọikwuu ahụ. Ọ̀ ma arụ ihe ndị a tupu e nye ya nnukwu ọrụ a? Eleghị anya ọ ma. Ma, o yikarịrị ka ọrụ ikpeazụ ọ rụrụ bụ ịkpụrụ ndị Ijipt brik. (Ọpụ. 1:13, 14) Oleezi otú Bezalel ga-esi arụ ọrụ a tara akpụ? Baịbụl sịrị: “[Jehova] wee mee ka mmụọ Chineke jupụta n’ime ya ka o wee nwee amamihe na nghọta na ihe ọmụma na nkà ịrụ ụdị ọrụ ọ bụla na ịtụ ụkpụrụ ọrụ . . . nakwa n’ọrụ iji osisi arụpụta ụdị ihe ọ bụla chọrọ nkà.” O doro anya na n’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na Bezalel matụ otú e si arụ ọrụ e nyere ya, mmụọ nsọ nyeere aka ịrụ ya nke ọma. Otú ahụ ka ọ dịkwa Oholiab. Ọ ga-abụrịrị na Bezalel na Oholiab mụtara ihe a kụziiri ha nke ọma. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na ha rụrụ ọrụ e nyere ha, kụziekwara ya ndị ọzọ. N’eziokwu, ọ bụ Chineke mere ka ha kụziere ndị ọzọ ọrụ ahụ.

7 Ihe ọzọ gosiri na mmụọ Chineke duru Bezalel na Oholiab bụ na ihe ha rụrụ nọtere ezigbo aka. A ka ji ihe ndị ha rụpụtara na-eme ihe mgbe ihe dị ka narị afọ ise gachara. (2 Ihe 1:2-6) Bezalel na Oholiab adịghị ka ndị na-emepụta ihe n’oge a, bụ́ ndị na-ede aha n’ihe ha mepụtara ka a mara na ọ bụ ha mere ha. Ha kwere ka otuto niile gaara Jehova maka ihe ha mepụtara.—Ọpụ. 36:1, 2.

8 Taa, e nwere ike inye anyị ọrụ ndị tara akpụ, bụ́ ndị chọrọ ndị nwere nkà pụrụ iche, dị ka iwu ụlọ, ibi akwụkwọ, ịhazi mgbakọ, inyere ndị ọdachi dakwasịrị aka, na ịgakwuru ndị dọkịta na ndị na-arụ n’ụlọ ọgwụ ka anyị na ha kparịta ihe anyị kweere banyere ọbara, bụ́ nke Akwụkwọ Nsọ kwadoro. Mgbe ụfọdụ, ọrụ ndị a chọrọ ndị bụ́ aka ochie, ma ọtụtụ mgbe ọ bụ ndị wepụtara onwe ha, bụ́ ndị na-amachaghị otú e si arụ ha, na-arụ ha. Mmụọ Chineke na-eme ka ha rụọ ha nke ọma. Ò nwetụla mgbe o siiri gị ike ịnara ọrụ n’ọgbakọ, n’ihi na i chere na e nwere ndị ka gị ruo eruo ịrụ ọrụ ahụ? Cheta na mmụọ Jehova ga-emeli ka ị mara otú ị ga-esi arụ ọrụ ọ bụla Chineke nyere gị, meekwa ka i nwee ike ịrụ ya nke ọma.

Mmụọ Chineke Nyeere Jọshụa Aka Ya Enwee Ihe Ịga nke Ọma

9. Olee nsogbu bịaara ụmụ Izrel mgbe ha si n’Ijipt pụta, oleekwa ajụjụ kwesịrị ọsịsa?

9 Mmụọ Chineke nyekwaara onye ọzọ ya na Mozis na Bezalel dịrị ndụ n’otu oge aka. Obere oge ka ndị Izrel sichara n’Ijipt pụta, ndị Amalek bịara ịlụso ha agha n’enweghị ihe ha mere ha. Ụmụ Izrel agaghị afanye aka n’ụkwụ n’okwu a. N’agbanyeghị na ịlụ agha edotụghị ha anya, ha ga-alụrịrị agha a bụ́ nke mbụ ha kemgbe ha nweere onwe ha. (Ọpụ. 13:17; 17:8) A chọrọ onye ga-edu ha n’agha ahụ. Ònye ka ọ ga-abụ?

10. Olee ihe mere ndị Izrel ji merie n’agha ha lụrụ mgbe Jọshụa duru ha?

10 A họpụtara Jọshụa. Olee ihe Jọshụa maara banyere ịlụ agha? Naanị ihe ndị o metụrụla bụ ịgba ohu, ịkpụ brik, na ikpokọta mana ọ ga-eri n’ụbọchị. Ọ bụ nna nna Jọshụa bụ́ Elishama bụ onyeisi n’ebo Ifrem, bụ́ onye o nwere ike ịbụ na o duru otu narị puku ndị agha na puku asatọ na otu narị ná mba Izrel. (Ọnụ Ọgụ. 2:18, 24; 1 Ihe 7:26, 27) Ma, ọ bụ Jọshụa ka Jehova gwara Mozis ka ọ họpụta ka o duru ndị agha gaa merie ndị iro ha, ọ bụghị Elishama ma ọ bụ nwa ya bụ́ Nọn. A lụgidere agha ahụ ya afọ obere ka chi jie. Ma, Izrel meriri n’ihi na Jọshụa mere ihe niile a gwara ya, kwerekwa ka mmụọ Chineke duo ya.—Ọpụ. 17:9-13.

11. Olee otú anyị nwere ike isi rụọ ọrụ Jehova chọrọ ka anyị rụọ dị ka Jọshụa rụrụ?

11 Mgbe e mechara, Jọshụa, bụ́ onye “jupụtara na mmụọ amamihe,” nọchiri Mozis. (Diut. 34:9) Mmụọ nsọ emeghị ka Jọshụa nwee ike ibu amụma na ịrụ ọrụ ebube ka Mozis, ma, o mere ka o nwee ike imeri n’agha ndị ha lụrụ, nke mere ka ha nwee ike inweta ala Kenan. Taa, e nwere ọrụ ụfọdụ Jehova chọrọ ka ndị ohu ya rụọ, bụ́ ndị ga-adị anyị ka anyị erughị eru ịrụ ha, ma, ka obi sie anyị ike na Chineke ga-enyere anyị aka ịrụ ha dị ka o nyeere Jọshụa ma ọ bụrụ na anyị emee ihe niile ọ gwara anyị mee.—Jọsh. 1:7-9.

“Mmụọ Jehova Wee Kpuchie Gidiọn”

12-14. (a) Gịnị ka mmeri naanị narị ndị ikom atọ, bụ́ ndị Izrel, meriri ọtụtụ puku ndị agha Midia gosiri? (b) Olee otú Jehova si mesie Gidiọn obi ike? (ch) Olee ihe Chineke ji na-emesi anyị obi ike taa?

12 Mgbe Jọshụa nwụchara, Jehova nọgidere na-eji mmụọ ya enyere ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi aka. Akụkọ banyere ndị “e mere ka ha dị ike mgbe ha na-adịghị ike” juru n’akwụkwọ Ndị Ikpe. (Hib. 11:34) Chineke ji mmụọ nsọ duo Gidiọn ka ọ lụọrọ ụmụ Izrel agha. (Ikpe 6:34) N’otu oge, ụsụụ ndị agha Midia ji okpukpu anọ karịa ndị agha Gidiọn kpọkọtara. N’anya Jehova, ndị agha Izrel a n’ehighị nne karịdịrị akarị. Ọ gwara Gidiọn ugboro abụọ ka o zilaga ụfọdụ ndị agha ya. N’ikpeazụ, ọ bụzi naanị otu onye agha Izrel ga-alụso narị ndị agha Midia anọ na iri ise agha. (Ikpe 7:2-8; 8:10) Jehova gwara ya na o zuola. Ọ bụrụ na Izrel emerie n’agha ahụ, ònye ga-asị na ọ bụ Gidiọn na ndị agha ya mere ka nke a kwe omume?

13 Ugbu a, Gidiọn na ndị agha ya ejikerela ịba n’ọgbọ agha. Ọ bụrụ na i so ná ndị agha a, obi ọ̀ gaara eru gị ala otú a a chụlarala ndị ụjọ ji? Ka obi ọ̀ ka ga na-akụ gị kpum kpum ka ị na-eche ihe nwere ike ime? O doro anya na ụjọ ejighị Gidiọn. O mere ihe a gwara ya mee! (Gụọ Ndị Ikpe 7:9-14.) Jehova abaraghị Gidiọn mba mgbe Gidiọn rịọrọ ya ka o meere ya ihe ga-egosi na ọ nọnyeere ya. (Ikpe 6:36-40) Kama ịbara ya mba, Jehova mere ka okwukwe Gidiọn sikwuo ike.

14 Jehova ga-azọpụtali ndị ya n’ihe niile. O nwedịrị ike iji ndị dị ka hà adịghị ike mee nke a. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị anyị ka ndị na-emegide anyị hà karịrị akarị ma ọ bụkwanụ na nsogbu anyị akarịala. Anyị anaghị atụ anya ka Chineke rụọrọ anyị ọrụ ebube iji gosi na ya ga-azọpụta anyị, dị ka ọ rụụrụ Gidiọn. Ma, Okwu ya na ọgbakọ ya e ji mmụọ nsọ na-edu nwere ike inyere anyị aka ma mee ka obi sie anyị ike. (Rom 8:31, 32) Nkwa Jehova kwere anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya nwere ike ime ka obi sie anyị ike na ọ ga-enyere anyị aka!

“Mmụọ Jehova Wee Dakwasị Jefta”

15, 16. Olee ihe mere ada Jefta ji nwee àgwà ọma, oleekwa otú nke a si agba ndị nne na nna ume?

15 Ka anyị tụlee banyere onye ọzọ mmụọ Chineke duru. Mgbe ụmụ Izrel na-aga ibuso ndị Amọn agha, ‘mmụọ Jehova dakwasịrị Jefta.’ Ebe Jefta chọsiri ike ka Jehova nyere ya aka ka o merie, o kwere Jehova nkwa ga-efu ya ezigbo ihe. O kwere Chineke nkwa na ọ bụrụ na o mee ka ya merie ndị Amọn, na onye mbụ ga-esi n’ụlọ ya abịa izute ya ma ya lọtawa ga-abụ nke Jehova. Mgbe ọ lọtara ka o merisịrị Amọn, nwa ya nwaanyị pụtara izute ya. (Ikpe 11:29-31, 34) Nke a ọ̀ tụrụ Jefta n’anya? O yichaghị ka ò mere ya otú ahụ n’ihi na ọ bụ naanị otu nwa ka o nwere. O mere ihe o kwere Jehova ná nkwa, ya bụ, o nyere Jehova nwa ya nwaanyị ka o jewere ya ozi n’ebe nsọ ya dị na Shaịlo. Ebe ọ bụ na ada Jefta bụ ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, o kwere na nna ya kwesịrị ime ihe o kwere ná nkwa. (Gụọ Ndị Ikpe 11:36.) Mmụọ Jehova nyeere ha abụọ aka imezu nkwa ahụ.

16 Olee ihe mere ada Jefta ji kwere ịhapụ ọtụtụ ihe ndị dị ya mkpa ka o nwee ike ijere Jehova ozi? O doro anya na ịnụ ọkụ n’obi nna ya ji na-ejere Jehova ozi mere ka okwukwe ada Jefta sie ike. Ndị nne na nna, ụmụ unu na-ahụ ihe unu na-eme. Ihe unu na-ekpebi ime na-egosi ụmụ unu ma ùnu kweere n’ihe unu na-ekwu. Ụmụ unu na-anụ ekpere unu si n’ala ala obi ekpeku Chineke, na-ege ntị n’otú unu si akụziri ha ihe ndị na-abara ha uru, na-ahụkwa otú unu si eji obi unu dum ejere Jehova ozi. Ka ha na-ahụ ihe ndị a, o nwere ike ịna-agụsi ha agụụ ike iwepụta onwe ha na-ejere Jehova ozi. Nke a ga-emekwa ka unu nwee ezigbo obi ụtọ.

“Mmụọ Jehova Wee Malite Ịkpa Ike n’Ahụ́” Samsịn

17. Olee ihe mmụọ Chineke nyeere Samsịn aka ime?

17 Ka anyị tụleekwa onye ọzọ mmụọ Chineke duru. O nwere mgbe ndị Filistia na-emekpa ndị Izrel ahụ́. “Ka oge na-aga, mmụọ Jehova malitere ịkpa ike n’ahụ́” Samsịn ka ọ napụta Izrel. (Ikpe 13:24, 25) Jehova nyere Samsịn ike ime ihe ndị na-atụ n’anya, meekwa ka o nwee ike na-enweghị atụ. Mgbe ndị Filistia mere ka ndị Izrel ndị ọzọ nwụde Samsịn, “mmụọ Jehova wee malite ịkpa ike n’ahụ́ ya, ụdọ ndị ahụ e kere ya n’aka wee dị ka eriri ákwà linin a ṅara n’ọkụ, agbụ e kere ya n’aka wee gbazee.” (Ikpe 15:14) Mgbe ike Samsịn gwụrụ n’ihi ihe na-ekwesịghị ekwesị o mere, e ‘sitere n’okwukwe’ mee ka ọ dị ike. (Hib. 11:32-34; Ikpe 16:18-21, 28-30) Mmụọ Jehova kpara ike pụrụ iche n’ahụ́ Samsịn n’ihi otú ihe si dị oge ahụ. Ma, akụkọ a na-agba anyị nnọọ ume. Olee otú o si agba anyị ume?

18, 19. (a) Olee otú akụkọ banyere Samsịn si na-emesi anyị obi ike? (b) Olee otú ihe anyị tụlere n’isiokwu a banyere ndị kwesịrị ntụkwasị obi si baara gị uru?

18 Obi siri anyị ike na otu mmụọ nsọ ahụ nyeere Samsịn aka ga-enyekwara anyị aka. Obi siri anyị ike na ọ ga-enyere anyị aka ịrụ ọrụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, nke bụ́ “ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na ịgba àmà nke ọma.” (Ọrụ 10:42) Ọrụ a nwere ike isiri anyị ike. Ma, obi dị anyị ụtọ na Jehova na-eji mmụọ ya enyere anyị aka ịrụ ọrụ dị iche iche e nyere anyị. N’ihi ya, ka anyị na-arụ ọrụ e nyere anyị, anyị nwere ike ikwu ihe Aịzaya onye amụma kwuru, nke bụ́: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ezipụwo m, ọbụna mmụọ ya.” (Aịza. 48:16) N’eziokwu, ọ bụ mmụọ Chineke zipụrụ anyị. Ka anyị na-arụ ọrụ a, ka obi sie anyị ike na Jehova ga-eme ka anyị ruo eruo otú o mere ka Mozis, Bezalel, na Jọshụa ruo eruo. Anyị na-eji “mma agha nke mmụọ nsọ, ya bụ, okwu Chineke” na-arụ ọrụ a. Obi sikwara anyị ike na Jehova ga-enye anyị ike otú o nyere Gidiọn, Jefta, na Samsịn. (Efe. 6:17, 18) Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere anyị aka imeri ihe isi ike ndị anyị nwere, ọ ga-enye anyị ike anyị ga-eji arụ ọrụ o nyere anyị otú ahụ o mere ka Samsịn dịrị ike.

19 N’eziokwu, Jehova na-agọzi ndị ji obi ike na-ejere ya ozi. Ọ bụrụ na anyị ekwere ka mmụọ nsọ na-edu anyị, okwukwe anyị ga-esi ike. N’ihi ya, ka anyị tụlee ụfọdụ ihe ndị mere na narị afọ mbụ bụ́ ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Anyị ga-ahụ otú mmụọ Jehova si rụọ ọrụ n’ahụ́ ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi ná narị afọ mbụ, ma tupu Pentikọst nke afọ 33 O.A. ma mgbe ọ gachara. Anyị ga-atụle ihe ndị a n’isiokwu na-eso nke a.

Olee otú ịmara na mmụọ Chineke nyeere ndị ikom ndị a aka si agba gị ume?

• Mozis

• Bezalel

• Jọshụa

• Gidiọn

• Jefta

• Samsịn

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

Mmụọ Chineke ga-enye anyị ike anyị ga-eji arụ ọrụ Chineke nyere anyị otú ahụ o mere ka Samsịn dịrị ike

[Foto dị na peeji nke 21]

Ndị nne na nna, ụmụ unu ga-amụta iji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi ma ọ bụrụ na unu na-eji ịnụ ọkụ n’obi ejere Jehova ozi