Ọ Ka Bụ nke A Na-amụ Amụ!
Ọ Ka Bụ nke A Na-amụ Amụ!
Anyị agbanweela ihe ụfọdụ n’otú Ụlọ Nche nke a na-amụ na-adị ka ọ na-amakwu mma, nakwa ka o nyere gị aka ịmụta eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa si n’Okwu Chineke.—Ọma 1:2; 119:97.
Ọ bụ afọ anọ gara aga ka anyị bidoro ibipụta Ụlọ Nche nke ọhaneze na nke anyị na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl na-amụ n’ọmụmụ ihe.
O nwere ihe otu nwanna nwoke jeerela Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ dere banyere Ụlọ Nche nke a na-amụ amụ. O dere, sị: “Obi tọrọ m ụtọ mgbe a malitere ibipụta Ụlọ Nche nke a na-amụ amụ. Ọ magburu onwe ya, ihe ọ na-akụzi na-eru m n’obi. Eziokwu ndị si na Baịbụl ọ na-akọwa anaghị apụ m apụ n’obi. Unu emeela maka ihe ọhụrụ a na-enweghị atụ.” Nwanna nwoke ọzọ dere, sị: “Ọ na-atọ m ụtọ iwepụta ezigbo oge jiri Baịbụl m na-amụ Ụlọ Nche nke a na-amụ amụ.” Anyị ma na ọ dị gị otú ọ dị ụmụnna ndị a.
Ị ma na a na-ebipụta Ụlọ Nche kemgbe afọ 1879. Ihe mere ka nke a kwe omume bụ n’ihi na Jehova na-enye anyị mmụọ ya, na-agọzikwa ihe anyị na-eme. (Zek. 4:6) N’ime otu narị afọ na iri afọ atọ na atọ e bipụtawara Ụlọ Nche, e nweela ihe ụfọdụ anyị gbanwerela n’otú ihu ya na-adị. N’afọ a, bụ́ 2012, a ga na-ese ọmarịcha ihe osise n’ihu Ụlọ Nche nke ọ bụla a na-amụ amụ. Ihe a ga-ese na ya bụ ebe a na-ekwusa ozi ọma. Ọ ga na-echetara anyị ọrụ Chineke nyere anyị, ya bụ, ịgba àmà nke ọma banyere Alaeze Jehova. (Ọrụ 28:23) Na peeji nke 2, ị ga-ahụ foto e si na ya nweta ihe ahụ e sere n’ihu Ụlọ Nche, na ihe ole na ole e dere na-emenụ nakwa ebe ha na-eme. N’afọ a dum, ihe ndị a ga na-ese n’ihu Ụlọ Nche a ga na-echetara anyị na ndị Jehova na-ekwusa ozi ọma “n’elu ụwa dum mmadụ bi.”—Mat. 24:14.
Olee ihe ndị ọzọ a gbanwere na magazin a? Igbe ntụleghachi ga na-adịzi ná mmalite nke isiokwu ọ bụla a ga-amụ n’ọmụmụ ihe. Nke a ga-enyere gị aka ịma ihe ndị ị ga-achọ ịmụta ka ị na-agụ isiokwu ahụ nakwa ka ị na-amụ ya. Ndị na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga na-ejikwa ajụjụ ndị a atụleghachi ihe ndị a mụrụ ma a mụchaa isiokwu nke ọ bụla. Ị ga-achọpụta na akụkụ peeji nke ọ bụla ehikwuola nne, nọmba peeji na nọmba paragraf ndị na-adị na ya agbakwuokwala okpotokpo.
Dị ka a kọwara na nke ọnwa a, e webatara ihe ọhụrụ anyị kpọrọ “Ihe Si n’Ebe Anyị Na-edebe Ihe Ochie” iji nyere anyị aka ịghọta otú ihe si aga kemgbe ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke oge a bidoro. Mgbe ụfọdụkwa, akụkọ ndụ ụmụnna anyị ga na-agba n’isiokwu bụ́ “Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha.” Akụkọ ndụ ụmụnna anyị ndị ga na-agba n’isiokwu a ga-enyere anyị aka ịhụ otú ozi ha jere n’ebe a chọsiri ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze ike si mee ka ha nwee ọṅụ na obi ụtọ.
Ka oge ị na-ewepụta na-eji magazin a amụ Okwu Chineke baara gị ezigbo uru.
Ndị Bipụtara Ya
[Foto dị na peeji nke 3]
1879
[Foto dị na peeji nke 3]
1895
[Foto dị na peeji nke 3]
1931
[Foto dị na peeji nke 3]
1950
[Foto dị na peeji nke 3]
1974
[Foto dị na peeji nke 3]
2008