Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mụta Ihe ‘n’Ụkpụrụ nke Eziokwu’

Mụta Ihe ‘n’Ụkpụrụ nke Eziokwu’

Mụta Ihe ‘n’Ụkpụrụ nke Eziokwu’

“I nwere ụkpụrụ nke ihe ọmụma na nke eziokwu dị n’Iwu ahụ.” —ROM 2:20.

1. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịghọta ihe ihe ndị e dere n’Iwu Mozis pụtara?

A SỊ na ọ bụghị ihe Pọl onyeozi dere n’ike mmụọ nsọ, ọ gaara esiri anyị ike ịghọta ihe ihe ụfọdụ dị n’Iwu Mozis pụtara. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru, ọ kọwara otú Jizọs, bụ́ ‘nnukwu onye nchụàjà kwesịrị ntụkwasị obi,’ si nwee ike ịchụ “àjà ime udo” naanị otu ugboro ka ndị nwere okwukwe nwee ike inweta “nnapụta nke na-adịru mgbe ebighị ebi.” (Hib. 2:17; 9:11, 12) Pọl kwuru na ụlọikwuu ahụ bụ naanị “onyinyo nke ihe ndị dị n’eluigwe” nakwa na Jizọs ghọrọ Onye Ogbugbo nke “ọgbụgba ndụ ka” nke ahụ Mozis bụ onye ogbugbo ya mma. (Hib. 7:22; 8:1-5) Ihe a Pọl kọwara banyere Iwu ahụ baara Ndị Kraịst nọ n’oge ya ezigbo uru, ha ka na-abakwara anyị uru taa. Ha na-enyere anyị aka ịghọta nke ọma uru ihe niile Chineke na-enye anyị na-abara anyị.

2. Olee ihe mere ndị Juu ji mara banyere Chineke na ihe mere o ji nye iwu ya karịa ndị Jentaịl?

2 Mgbe Pọl degaara Ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ ozi, ọ bụ ndị Juu nọ n’ọgbakọ dị na Rom, bụ́ ndị a kụziiri Iwu Mozis, ka ọ gwara ọtụtụ n’ime ihe ndị o kwuru n’akwụkwọ ozi ya. O kwuru na ndị Juu ahụ bụ́ Ndị Kraịst maara “ụkpụrụ nke ihe ọmụma na nke eziokwu” banyere Jehova na ihe mere o ji nye ha iwu n’ihi na ha ma Iwu ahụ Chineke nyere. Ha ghọtara ‘ụkpụrụ nke eziokwu’ banyere Jehova, jirikwa ya kpọrọ ihe. Nke a mere ka ha nwee ike ịkụziri ya ndị ọzọ otú ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị bu ha ụzọ, mere.—Gụọ Ndị Rom 2:17-20.

ONYINYO NKE ÀJÀ JIZỌS

3. Olee uru ịmụ banyere àjà ndị Juu chụrụ n’oge ochie ga-abara anyị?

3 Ụkpụrụ nke eziokwu Pọl kwuru okwu ya ka ga-enyere anyị aka ịghọta ihe dị iche iche Jehova zubere ime. Ihe Jehova ji Iwu Mozis kụziere ndị Izrel ka na-abara anyị uru taa. Ugbu a, ka anyị tụlee otú àjà na onyinye dị iche iche e kwuru okwu ha n’Iwu ahụ si duga ndị Juu dị umeala n’obi n’ebe Kraịst nọ ma nyere ha aka ịghọta ihe Chineke chọrọ ka ha mee. Ebe ọ bụkwa na ihe ndị bụ́ isi Jehova chọrọ ka ndị ohu ya mee agbanwebeghị, anyị ga-achọpụta na iwu Chineke nyere ndị Izrel banyere ịchụ àjà na inye onyinye nwere ike inyere anyị aka ichebara otú anyị si ejere Jehova ozi echiche.—Mal. 3:6.

4, 5. (a) Olee ihe Iwu Mozis chetaara ndị Chineke? (b) Àjà ndị a chụrụ n’oge ochie bụ “onyinyo” nke gịnị?

4 Ọtụtụ ihe e dere n’Iwu Mozis mere ka ndị Juu ghọta na ha bụ ndị mmehie. Dị ka ihe atụ, a chọrọ ka onye ọ bụla metụrụ ozu aka mee onwe ya ka ọ dị ọcha. Onye ahụ ga-eweta ehi na-acha ọbara ọbara nke a ga-egbu, kpọọkwa ọkụ. A ga-eji ntụ ya mere “mmiri . . . e ji eme ka mmadụ dị ọcha.” A ga-efesazi onye ahụ a chọrọ ime ka ọ dị ọcha ntụ ahụ n’ụbọchị nke atọ na n’ụbọchị nke asaa o merụchara onwe ya. (Ọnụ Ọgụ. 19:1-13) E chetakwaara ndị Juu na ụmụ mmadụ bụ ndị na-ezughị okè na ndị mmehie n’ihi na nwaanyị na-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị ole na ole ma ọ mụchaa nwa. Ọ bụ ihe mere o ji kwesị ịchụ àjà mkpuchi mmehie ma ụbọchị ole na ole ahụ gachaa.—Lev. 12:1-8.

5 E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ a na-eme kwa ụbọchị, bụ́ ndị e kwesịrị ikwo chụọ àjà mkpuchi mmehie. Ma onye na-eweta ihe ndị a ga-achụ n’àjà ọ̀ ma ma ọ bụ na ọ maghị, àjà ndị ahụ niile, ma ndị nke e mechara chụọ n’ụlọ nsọ Jehova, bụcha “onyinyo” nke àjà zuru okè Jizọs chụrụ.—Hib. 10:1-10.

IHE MERE E JI CHỤỌ ÀJÀ NDỊ AHỤ

6, 7. (a) Olee ihe ndị Izrel kwesịrị icheta mgbe ha na-ahọrọ ihe ha ga-eji achụ àjà, gịnịkwa ka nke a na-egosi? (b) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

6 Jehova chọrọ ka e were naanị anụmanụ “ahụ́ dị mma” chụọrọ ya àjà, ọ bụghị nke kpuru ìsì, nke merụrụ ahụ́, nke nwere nkwarụ, ma ọ bụ nke ahụ́ na-adịghị. (Lev. 22:20-22) Ọ bụrụ na onye Izrel chọrọ inye Jehova mkpụrụ osisi ma ọ bụ ọka, ndị ọ ga-eweta kwesịrị ịbụ “mkpụrụ mbụ,” ya bụ, ihe “kasị mma” n’ihe ndị o wetara n’ubi. (Ọnụ Ọgụ. 18:12, 29) Jehova anaghị anabata ndị nke a jụrụ ajụ. Ụdị anụmanụ Jehova chọrọ ka e jiri chụọrọ ya àjà na-egosi na àjà Jizọs ga-achụ ga-abụ nke na-enweghị mmerụ nakwa nke na-enweghị ntụpọ. Ọ na-egosikwa na Jehova ga-eji ihe kacha mma o nwere, nke bụ́kwa ihe kacha dịrị ya mkpa, chụọ àjà iji napụta ụmụ mmadụ.—1 Pita 1:18, 19.

7 Ọ bụrụ na obi dị onye ahụ na-achụrụ Jehova àjà ụtọ n’eziokwu maka ihe ọma niile Jehova meere ya, ọ ga-eji obi ya dum jiri ihe kacha mma o nwere chụọrọ ya àjà. Ọ bụ onye ọ bụla chọrọ ịchụrụ Jehova àjà ga-ekpebi ụdị nke ọ ga-eji achụ ya. Ma, ọ ma na obi agaghị adị Chineke mma ma o jiri anụmanụ ahụ́ na-adịghị chụọrọ ya àjà n’ihi na nke ahụ ga-egosi na ọ na-achụ àjà ahụ iji mezuo iwu, ma ọ bụdị na o weere ya ka ibu arọ. (Gụọ Malakaị 1:6-8, 13.) Ihe a kwesịrị ime ka onye ọ bụla n’ime anyị chebara ofufe ọ na-efe Chineke echiche ma jụọ onwe ya, sị: ‘Olee ụdị obi m ji na-ejere Jehova ozi? Ọ́ gaghị adị mma ma m chebara otú m si efe Jehova echiche ma chọpụta ihe m bu n’obi na-efe ya?’

8, 9. Olee ihe mere anyị ji kwesị ichebara ụdị obi ndị Izrel ji chụọrọ Chineke àjà echiche?

8 O nwere ike ọ gaghị esiri onye Izrel ike inye Jehova ihe kacha mma o nwere ma ọ bụrụ na o ji obi ya dum na-achụ àjà ahụ iji kelee Jehova maka ihe o meere ya, ma ọ bụkwanụ ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịchụrụ Jehova àjà nsure ọkụ ka o nwee ike ịgọzi ya. Obi na-adị onye na-eme nke a ụtọ inye Jehova ihe kacha mma o nwere. Ndị Kraịst taa anaghị achụ àjà nkịtị otú ahụ e kwuru n’Iwu Mozis ka a na-achụ, ma, otú ha si achụ àjà bụ na ha na-eji oge ha, ume ha, na ihe ndị ha nwere ejere Jehova ozi. Pọl onyeozi kwuru na nkwupụta Ndị Kraịst ‘na-ekwupụta olileanya ha n’ihu ọha’ na “ime ihe ọma na ịdị na-enye ndị ọzọ ihe” bụ àjà ndị na-amasị Chineke. (Hib. 13:15, 16) Obi ndị ohu Jehova ji arụ ọrụ ndị a na-egosi otú obi dịruru ha ụtọ maka ihe Chineke meere ha. N’ihi ya, dị ka ndị Izrel ndị chụụrụ Jehova àjà n’oge ochie mere, Ndị Kraịst kwesịrị ichebara ụdị obi ha ji efe Jehova echiche na ihe mere ha ji efe ya.

9 Iwu Mozis kwuru na onye mere mmehie kwesịrị iweta àjà mmehie ma ọ bụ àjà ikpe ọmụma maka mmehie ya. Ebe ọ bụ iwu na ụmụ Izrel ga-achụrịrị àjà a, ì chere na ọ ga-esiri onye na-eweta àjà a ike iji obi ya dum weta ya? (Lev. 4:27, 28) O kwesịghị isiri ya ike ma ọ bụrụ na ọ chọrọ n’eziokwu ka ya na Jehova na-adị ná mma.

10. Olee “àjà ndị” Onye Kraịst nwere ike ịchụ ka ya na Jehova na ụmụnna ya dịghachi ná mma?

10 Taakwa, anyị nwere ike ikwu ihe ga-ewute nwanna anyị n’amaghị ama ma ọ bụkwanụ n’ihi na anyị echeghị echiche nke ọma kwuo ya. Obi anyị nwere ike ịgwa anyị na ihe anyị mere adịghị mma. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova na-adị ná mma, anyị ga-emerịrị ihe niile anyị nwere ike ime iji mezie ihe ahụ anyị na-emeteghị. Nke a nwere ike ịpụta na anyị ga-eji obi anyị dum rịọ onye ahụ ka ọ gbaghara anyị. Ma, ọ bụrụ mmehie dị oké njọ ka anyị mere, anyị ga-agakwuru ndị okenye ọgbakọ, bụ́ ndị hụrụ anyị n’anya, ka ha nyere anyị aka. (Mat. 5:23, 24; Jems 5:14, 15) Nke a na-egosi na ọ ga-efu anyị ihe iji mezie ihe ọjọọ anyị mere mmadụ ibe anyị ma ọ bụkwanụ iji mezie ihe anyị ji mehie Chineke. N’agbanyeghị nke a, ọ bụrụ na anyị achụọ “àjà ndị” dị mkpa, anyị na Jehova na ụmụnna anyị ga-adịghachi ná mma, anyị enweekwa akọnuche dị ọcha. Ọ ga-emekwa ka obi sie anyị ike na ihe Jehova chọrọ ka anyị mee bụ ihe na-akacha abara anyị uru.

11, 12. (a) Gịnị bụ àjà udo? (b) Olee uru àjà udo bara n’ofufe anyị na-efe Jehova taa?

11 E nwere àjà ndị e kwuru okwu ha n’Iwu Mozis ndị bụ́ àjà udo. Nke a na-eme ka Jehova na onye wetara àjà ahụ dịrị n’udo. Onye wetara àjà ahụ na ezinụlọ ya ga-eri anụ anụmanụ ahụ e ji chụọ àjà. Ha nwere ike ịnọ n’otu n’ime ụlọ ndị a na-anọ eri nri, bụ́ ndị dị n’ụlọ nsọ ahụ, rie ya. Ha na-enye onye nchụàjà chụụrụ ha àjà ahụ na ndị nchụàjà ndị ọzọ na-eje ozi n’ụlọ nsọ ahụ ụfọdụ n’ime anụ ahụ. (Lev. 3:1; 7:31-33) Ihe mere onye wetara àjà ahụ ji weta ya bụ n’ihi na ọ chọrọ ka ya na Chineke dịrị ná mma. Ọ na-adị ka onye wetara àjà ahụ, ezinụlọ ya, ndị nchụàjà, na Jehova hà ji obi ụtọ na-erikọ nri n’udo.

12 È nwere ihe ùgwù karịrị ịkpọ Jehova ụdị oriri a ya ekwe bịa? O doro anya na onye na-eweta àjà ahụ ga-ekwo onye ọbịa a pụrụ iche, ya bụ Jehova, weta nke kacha mma n’ihe ndị o nwere. Àjà udo a, nke so n’ụkpụrụ eziokwu nke dị n’Iwu Mozis, na-egosi na àjà Jizọs chụrụ, nke karịrị àjà udo ahụ, ga-eme ka onye ọ bụla chọrọ ka ya na Onye kere anyị dịrị ná mma nwee ike ime otú ahụ. Taa, anyị na Jehova nwere ike ịdị ná mma ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị dum na-eji ihe ndị anyị nwere na ume anyị ejere ya ozi.

ÀJÀ NDỊ CHINEKE NA-ANABATAGHỊ

13, 14. Olee ihe mere Jehova anabataghị àjà Eze Sọl chọrọ ịchụrụ ya?

13 Jehova na-anabata àjà a chụụrụ ya ma ọ bụrụ na onye wetara ihe e ji chụọ àjà ahụ bu ezigbo ihe n’obi weta ya. Ma, Baịbụl kwuru banyere àjà ndị Chineke na-anabataghị. Gịnị mere ọ nabataghị ha? Ka anyị tụlee àjà abụọ n’ime àjà ndị ọ na-anabataghị.

14 Samuel onye amụma gwara Eze Sọl na oge eruola ka Jehova bibie ndị Amalek. N’ihi ya, a gwara Sọl ka o bibie ndị bi ná mba a ha na ndị Izrel nọ n’iro, bibiekwa anụ ụlọ ha. Ma, mgbe Sọl merichara Amalek, o kwere ka ndị agha ya ghara igbu Egag, bụ́ eze Amalek. Sọl werekwaara anụmanụ ndị kacha mma ka o jiri ha chụọrọ Jehova àjà. (1 Sam. 15:2, 3, 21) Gịnị ka Jehova mere? Ọ jụrụ Sọl n’ihi na o nupụụrụ ya isi. (Gụọ 1 Samuel 15:22, 23.) Olee ihe nke a na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na anyị kwesịrị irubere Chineke isi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ọ nabata àjà anyị na-achụrụ ya.

15. Olee ihe àgwà ọjọọ ụfọdụ ndị Izrel ndị chụụrụ Jehova àjà n’oge Aịzaya gosiri?

15 E nwere ihe atụ ọzọ yiri nke a nke e dere n’akwụkwọ Aịzaya. N’oge Aịzaya, ụmụ Izrel nọ na-achụrụ Jehova àjà naanị iji mezuo iwu. Àgwà ọjọọ ha gosiri na àjà ha chụrụ abaghị uru. Jehova jụrụ ha, sị: “Olee uru ọtụtụ àjà unu na-achụ baara m?” Ọ gwaziri ha, sị: “Àjà ebule a na-esurecha n’ọkụ nakwa abụba nke anụ mara abụba agbụla m; ọbara nwa oké ehi na nke nwa ebule na nke mkpi adịghịkwa atọ m ụtọ. . . . Kwụsịnụ iwebata àjà ọka na-abaghị uru. Ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ unu bụ ihe arụ n’anya m.” Gịnị mere Chineke achọghịzi àjà ha? Ọ gwara ha, sị: “Ọ bụ ezie na unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, adịghị m ege ntị; aka unu jupụtara n’ọbara. Saanụ ahụ́; meenụ onwe unu ka unu dị ọcha; wepụnụ omume ọjọọ unu n’ihu m; kwụsịnụ ime ihe ọjọọ.”—Aịza. 1:11-16.

16. Olee ihe anyị ga-eme ka Chineke nabata àjà anyị na-achụrụ ya?

16 Àjà ndị mmehie na-achọghị ichegharị na-achụ anaghị atọ Jehova ụtọ. Ma, ọ na-anụ ekpere nke ndị ji obi ha niile na-agbasi mbọ ike ime ihe o nyere n’iwu, ọ na-anabatakwa àjà ha na-achụrụ ya. Ụkpụrụ nke Iwu ahụ kụziiri ndị dị otú a na ha bụ ndị mmehie, nakwa na ọ dị ha mkpa ka a gbaghara ha. (Gal. 3:19) Ihe a ha ghọtara mere ka ha nwee mwute. Taakwa, anyị kwesịrị ịghọta na àjà Kraịst dị anyị mkpa n’ihi na ọ bụ naanị ihe nwere ike ikpuchiri anyị mmehie anyị. Ọ bụrụ na anyị aghọta nke a, gosikwa na obi dị anyị ụtọ maka ya, ihe ọ bụla anyị meere Jehova n’ozi anyị na-ejere ya ‘ga-atọ ya ụtọ.’—Gụọ Abụ Ọma 51:17, 19.

GOSI NA I NWERE OKWUKWE N’ÀJÀ JIZỌS CHỤRỤ

17-19. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi gosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka àjà mgbapụta Jizọs? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-eso nke a?

17 Ihe anyị ji kara ndị Izrel mma bụ na anyị nwere ihe karịrị “onyinyo” nke ihe Chineke zubere. (Hib. 10:1) Iwu e nyere ndị Juu banyere àjà ha ga na-achụ chetaara ha ka ha na-eme ihe ndị ga-eme ka ha na Chineke dịrị n’ezigbo mma. O nyeere ha aka igosi na obi dị ha ụtọ maka ihe Chineke meere ha, na inye ya ihe kacha mma ha nwere, nakwa ịghọta na mgbapụta dị ha mkpa. Taakwa, Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst enyerela anyị aka ịghọta na Jehova ga-ekwo maka ihe mgbapụta ahụ wepụ mmehie na ọnwụ kpamkpam. Jehova ga-ekwokwa maka ya gbaghara anyị mmehie anyị ka anyị nwee ike inwe akọnuche dị ọcha. N’eziokwu, àjà mgbapụta Jizọs bụ onyinye na-enweghị atụ Jehova nyere anyị.—Gal. 3:13; Hib. 9:9, 14.

18 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka àjà mgbapụta ahụ baara anyị uru, ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịghọta ihe ọ pụtara. Pọl onyeozi dere, sị: “Iwu ahụ aghọwo onye nduzi anyị nke na-eduru anyị gakwuru Kraịst, ka e wee kpọọ anyị ndị ezi omume n’ihi okwukwe.” (Gal. 3:24) Anyị ga na-arụkwa ọrụ gosiri na anyị nwere okwukwe. (Jems 2:26) Pọl gbara ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst, ndị maara ụkpụrụ nke ihe ọmụma dị n’Iwu Mozis, ume ka ha mee ihe ha mụtara n’Iwu ahụ. Ọ bụrụ na ha emee otú a, ha ga-egosi na ha na-eme ihe Chineke kwuru bụ́kwanụ ihe ha na-akụziri ndị ọzọ.—Gụọ Ndị Rom 2:21-23.

19 Ọ bụ eziokwu na a chọghịzi ka Ndị Kraịst nke oge a na-edebe ihe niile e dere n’Iwu Mozis, ha ka kwesịrị ịna-achụrụ Jehova àjà ndị ga-atọ ya ụtọ. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle otú anyị nwere ike isi na-achụrụ Jehova àjà ndị ga-atọ ya ụtọ.

LEE MA Ị̀ GA-AHỤ AZỊZA AJỤJỤ NDỊ A:

․․․․․

Olee ihe àjà ndị e kwuru okwu ha n’Iwu Mozis na-ese onyinyo ya?

․․․․․

Olee otú àjà ndị Izrel chụrụ si yie nke Ndị Kraịst na-achụ taa?

․․․․․

Olee ihe ga-eme ka Jehova nabata àjà anyị chụụrụ ya ma ọ bụkwanụ jụ ya?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 17]

Ihe bụ́ isi Jehova chọrọ ka ndị ohu ya na-eme agbanwebeghị

[Foto dị na peeji nke 18]

Olee nke ị gaara enye Jehova n’ime anụmanụ abụọ ndị a?

[Foto dị na peeji nke 19]

Jehova na ndị na-achụrụ ya àjà ọ na-anabata na-adị ná mma