Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Ji Obi Ike Kwusaa Okwu Chineke!

Ha Ji Obi Ike Kwusaa Okwu Chineke!

Ha Ji Obi Ike Kwusaa Okwu Chineke!

Akwụkwọ bụ́ ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’ na Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom gosiri na ezigbo Ndị Kraịst nwere obi ike mgbe a kpagburu ha, ha atụghịkwa egwu. Anyị na-eme ka ụmụnna anyị ndị dịrị ndụ na narị afọ mbụ, anyị na-ekpeku Jehova ekpere ka mmụọ ya nyere anyị aka ka anyị kwusaa okwu ya n’atụghị egwu.—Ọrụ 4:23-31.

Otu nwanna kwuru otú anyị si kwusaa ozi ọma n’oge agha ụwa nke mbụ. O dere, sị: “Ndị ohu Chineke ji ịnụ ọkụ n’obi kesaa mpịakọta nke asaa nke akwụkwọ bụ́ Studies in the Scriptures, nke a kpọrọ The Finished Mystery. E kesara ya otú na-enweghị atụ. E wepụtara Akụkọ Alaeze nke 1 n’asụsụ Bekee n’afọ 1918. E wepụtakwara Akụkọ Alaeze nke 2 n’asụsụ Bekee, bụ́ ebe a kọwara ihe mere ndị ọchịchị ji sie ọnwụ ka a ghara ikesa akwụkwọ ahụ bụ́ The Finished Mystery. E bipụtakwara Akụkọ Alaeze nke 3 n’asụsụ Bekee. Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, kesara akwụkwọ ndị a n’ọtụtụ ebe. Ọ bụ okwukwe na obi ike ha nwere nyeere ha aka ịkpọsa Akụkọ Alaeze.”

Taa, a na-enyekarị ndị nkwusa ọhụrụ ọzụzụ otú e si ekwusa ozi ọma. Ma, a naghị emecha otú a n’oge gara aga. Otu nwanna nwoke, bụ́ onye Pọland nke bi n’Amerịka, kwuru otú ọ dị ya mgbe ọ malitere ikwusa ozi ọma n’afọ 1922. O dere, sị: “Ebe m na-amaghị otú e si enyefe akwụkwọ, amaghịkwa m asụ Bekee nke ọma, m kwụụrụ n’ihu ọfịs otu dọkịta kụọ aka. Otu nọọsụ meghere ụzọ. Agaghị m echefu ihe mere n’ụbọchị ahụ. N’agbanyeghị na obi tọrọ m ezigbo ụtọ, ezigbo ụjọ jidekwara m. Ka m na-emeghe akpa m, akwụkwọ m niile wụpụrụ, wụsa n’ụkwụ nọọsụ ahụ. Amaghị m ihe m kwuru ekwu, ma ihe m ma bụ na m nyere ya akwụkwọ. Obi bịara sie m ike mgbe m pụrụ, o dokwara m anya na Jehova gọziri m. Enyefere m ọtụtụ akwụkwọ n’ụbọchị ahụ n’okporo ámá ebe a na-azụ ahịa.”

Otu nwanna nwaanyị kwuru, sị: “N’ihe dị ka n’afọ 1933, ọtụtụ ụmụnna na-eji ụgbọala a rụnyere ígwè okwu na-ekwusa ozi ọma.” O kwuru ihe mere otu ụbọchị ya na otu nwanna nwoke na nwunye ya nọ na-ekwusa ozi ọma n’otu obodo bụ́ ugwu ugwu nke dị na Kalịfọnịa n’Amerịka. Ọ sịrị: “Nwanna nwoke ahụ gbaara ụgbọala ahụ a rụnyere ígwè okwu gbagoo n’elu ugwu, anyị anọrọ ná ndagwurugwu nke obodo ahụ. Mgbe ọ malitere ịkpọ ihe ndị e tinyere na teepụ, ya ana-adacha ka o si n’eluigwe. Ndị obodo ahụ mere ihe niile ha nwere ike ime ma hà ga-ahụ nwanna ahụ, ma ha ahụghị ya. Mgbe ọ kpọchara ihe ahụ e tinyere na teepụ, anyị gara na nke ndị mmadụ zie ha ozi ọma. E nwere ugboro abụọ ọzọ m so gaa ozi ọma mgbe e ji ụgbọala a rụnyere ígwè okwu kwusaa ozi ọma. Ịgwa gị eziokwu, ọtụtụ ndị achọghị ịnụ ozi ọma anyị. Ma, ha nụrụ ozi si n’ụgbọala ahụ a rụnyere ígwè okwu na-adapụta, ma hà chọrọ ya ma ha achọghị ya. Nke a na-egosi na Jehova na-eme ka e si otú kwesịrị ekwesị na-ekwusa ozi ọma ahụ n’oge kwesịrị ekwesị. Anyị na-akata obi iji nwee ike isi otú a kwusaa ozi ọma. Ma, ozi ọma anyị kwusara rụpụtara ihe, o mekwara ka e too aha Jehova.”

Malite n’afọ 1930 ruo n’ihe dị ka n’afọ 1944, a na-eji ígwè fonograf na okwu ndị e tinyere na teepụ, ezisara ndị mmadụ ozi ọma. Otu nwanna nwaanyị kwuru, sị: “Otu ụbọchị, otu nwanna nwaanyị na-eto eto ji ígwè fonograf na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ozugbo ọ malitere ịkpọ ya n’otu ụlọ ọ gara, nwoke nwe ụlọ ahụ were ezigbo iwe nke mere ka o were ụkwụ gbapụ ígwè fonograf ahụ na veranda. Ma, e nweghị otu efere egwú kụwara. E nwere ụmụ nwoke atọ hụrụ ihe merenụ. Ha nọ n’otu ụgbọala a dọwara ebe ahụ na-eri nri. Ha kpọrọ nwanna nwaanyị ahụ ka ọ bịa kpọọrọ ha fonograf ahụ, ha mechakwara nata ya akwụkwọ. Nke a mere ka nwanna nwaanyị ahụ die ihe e mere ya.” Onye na-akataghị obi agaghị edili ihe ndị a.

Nwanna nwaanyị kọrọ ihe a kwukwara, sị: “Echetara m mgbe a malitere ịnọ n’okporo ámá na-enyefe magazin n’afọ 1940. Tupu mgbe ahụ, ihe a na-eme bụ ịgagharị na-agbasa ozi. Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị na-akwụrụ n’ahịrị buru kaadị e dere ‘Okpukpe Bụ Ọnyà na Ihe Aghụghọ’ na ‘Jeere Chineke na Kraịst Bụ́ Eze Ozi’ na-agagharị. N’oge ahụkwa, a na-ekesara ndị mmadụ traktị n’anaghị ha ego. Ọ bụ onye obi kara ga-esoli eme ihe ndị a, ma ụzọ ndị a e si zie ozi ọma mere ka ndị mmadụ mara aha Jehova, marakwa ndị ohu ya.”

Nwanna nwaanyị ọzọ kwuru, sị: “Ọ na-esigbu onwe ya n’ike ikesa magazin n’ime ime obodo n’ụbọchị e ji ekesa ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka a na-akpagbu Ndịàmà Jehova otú kpụ ọkụ n’ọnụ. . . . Onye obi na-akaghị agaghị ejili magazin kwụrụ n’okporo ámá na-ekwu ihe a chọrọ ka e kwuo ka ndị mmadụ nwee ike ịnara magazin. Ma, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na e nweghị Satọdee anyị na-agaghị. Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-emeso anyị omume otú dị mma. Oge ndị ọzọ, ìgwè na-eme ihe ike na-achọrọ anyị bịa. Mgbe ụfọdụ ha bịawa, anyị na-eji nwayọọ mie ala iji gbaara nsogbu ọsọ.”

N’agbanyeghị otú e si na-akpagbu Ndịàmà Jehova n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, anyị ji obi ike kwusaa ozi ọma. N’otu oge e ji ụbọchị iri anọ na atọ kesaa otu akwụkwọ nta, malite na Disemba 1, 1940, ruo Jenụwarị 12, 1941, ihe dị ka iri puku ndị nkwusa ise nọ n’Amerịka nyefere ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ nde akwụkwọ nta asatọ.

Ọtụtụ ndị nọterela aka n’ọgbakọ nwere ike icheta oge ndị ha nwere ihe isi ike ndị mere ka ha kwesị ịkata obi. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike icheta na e nwere ihe ha na-agwakarị ibe ha nke gosiri na ha nwere obi ike. Ha na-ekwu ihe dị ka, Jisie ike n’ozi gị, adala mbà! Anyị amaghị otú niile anyị ga-esi ekwusa ozi ọma Chineke gwara anyị kwusaa tupu ụwa ochie a agwụ. Ma, anyị ma na ka Jehova na-enyere anyị aka, anyị agaghị akwụsị iji okwukwe na obi ike na-ekwusa ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

Kemgbe ụwa, mmadụ ga-akatarịrị obi tupu ya enwee ike ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke