Na-eche Nche Ka Jizọs
Na-eche Nche Ka Jizọs
“Na-echenụ nche ma na-ekpe ekpere.” —MAT. 26:41.
OLEE IHE Ị GA-AZA?
․․․․․
Olee otú ekpere anyị nwere ike isi gosi na anyị na-eche nche?
․․․․․
Olee otú otú anyị si ekwusa ozi ọma ga-esi gosi na anyị na-eche nche?
․․․․․
Olee ihe mere anyị ji kwesị ịna-eche nche mgbe ihe na-esiri anyị ike, oleekwa otú anyị ga-esi eme ya?
1, 2. (a) Olee ajụjụ e nwere ike ịjụ banyere otú Jizọs si chee nche? (b) È nwere ihe anyịnwa bụ́ ndị mmehie nwere ike ịmụta n’aka Jizọs bụ́ onye zuru okè? Nye ihe atụ.
INWERE ike na-eche, sị: ‘Ọ̀ ga-ekwe omume n’eziokwu ịna-eche nche ka Jizọs? A sị kwuwe, Jizọs zuru okè! Ihe ọzọkwa bụ na Jizọs nwere ike ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu. Mgbe ọ nọ n’ụwa, o nwedịrị mgbe ọ ma ihe ga-eme ọtụtụ puku afọ n’ihu! È nwere mgbe o kwesịrị iche nche?’ (Mat. 24:37-39; Hib. 4:15) Ka anyị buru ụzọ tụlee ajụjụ ndị a iji nwee ike ịma otú ọ dịruru mkpa ka anyị na-eche nche.
2 Ụmụ mmadụ bụ́ ndị mmehie hà nwere ike ịmụta ihe n’aka onye zuru okè? Ee, n’ihi na mmadụ nwere ike isi n’aka ezigbo onye nkụzi mụta ihe. Ka anyị weregodị onye na-amụ otú e si agba ụta mee ihe atụ. Ọ gaghị agbatali ebe a chọrọ ka ọ gbaa ná mbụ. Ma, ọ ga na-amụ otú e si eme ya, na-agbakwa mbọ imete ya. Ọ bụrụ na ọ chọrọ ịna-agbata ihe a chọrọ ka ọ gbata, ọ ga na-ele otú aka ochie ahụ na-akụziri ya otú e si agba ụta si agba nke ya. Ọ na-ele otú onye nkụzi ya si anọ, otú o si edowe aka ya, na otú o si e ji mkpịsị aka ya adọ ụta ahụ. Ọ ga-eji nwayọọ nwayọọ mụta otú ọ ga-esi adọ ụta ahụ, na-eburukwa n’obi otú ifufe nwere ike isi mee ka o siere ya ike ịgbata ihe ọ na-agba. Ọ bụrụ na ọ na-agbasi mbọ ike ma na-eme ihe ọ hụrụ onye nkụzi ya na-eme, ọ ga-amụta ịgbata ihe a chọrọ ka ọ gbata. Otú ahụkwa ka anyị ga-enwe ike imekwu ka Kraịst ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Jizọs gwara anyị ma na-eṅomi Jizọs.
3. (a) Olee otú Jizọs si gosi na ya kwesịrị ịna-eche nche? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?
3 Jizọs ò kwesịdịrị ịna-eche nche? Ee, o kwesịrị. Dị ka ihe atụ, n’abalị ikpeazụ Jizọs nọrọ n’ụwa, ọ gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Sorokwanụ m na-eche nche.” O kwukwara, sị: “Na-echenụ nche ma na-ekpe ekpere mgbe niile, ka unu wee ghara ịbanye Mat. 26:38, 41) N’agbanyeghị na Jizọs na-eche nche kemgbe, o kwesịrị ichekwu nche karịchaa n’oge ahụ ihe na-esiri ya ezigbo ike, kwesịkwa ịnọ Nna ya nke eluigwe ezigbo nso. Ọ makwa na ndị na-eso ụzọ ya kwesịkwara ịna-eche nche, ọ bụghị naanị n’oge ahụ ha na ya nọ, kamakwa, site mgbe ahụ gawa. N’ihi ya, ka anyị tụlee ihe mere Jizọs ji chọọ ka anyị na-eche nche. E mechaa, anyị ga-atụle ụzọ atọ anyị nwere ike isi na-eche nche kwa ụbọchị ka Jizọs.
n’ọnwụnwa.” (IHE MERE JIZỌS JI CHỌỌ KA ANYỊ NA-ECHE NCHE
4. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịna-eche nche?
4 Jizọs chọrọ ka anyị na-eche nche n’ihi ihe ndị anyị na-amaghị nakwa n’ihi ihe ndị anyị ma. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ̀ ma ihe niile ga-eme n’ọdịnihu? Ee e. O gosiri na ya dị umeala n’obi n’ihi na o kwuru n’otu oge, sị: “Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ na oge awa ahụ, ndị mmụọ ozi nke eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama ọ bụ naanị Nna m maara.” (Mat. 24:36) N’oge ahụ, Jizọs, bụ́ “Ọkpara ahụ,” amaghị kpọmkwem mgbe ụwa ochie a ga-agwụ. Taakwanụ? Ànyị ma ihe niile ga-eme n’ọdịnihu? Anyị amaghị! Anyị amaghị mgbe Jehova ga-ezite Ọkpara ya ka ọ bịa bibie ụwa ochie a. Ọ bụrụ na anyị ma ihe niile ga-eme n’ọdịnihu, anyị ekwesịghịzi ịna-eche nche. Jizọs kwuru na ọgwụgwụ ga-abịa na mberede, ya bụ, mgbe anyị na-atụghị anya ya. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịna-eche nche.—Gụọ Matiu 24:43.
5, 6. (a) Olee otú ihe anyị ma banyere Alaeze Chineke si enyere anyị aka ịna-eche nche? (b) Gịnị mere ihe anyị ma banyere Setan ji kwesị ime ka anyị kpebisikwuo ike ịna-eche nche?
5 Ma, Jizọs ma ọtụtụ ihe ọma ndị ga-eme n’ọdịnihu, bụ́kwanụ ihe ọtụtụ ndị nọ ndụ n’oge ọ nọ n’ụwa na-amaghị. E nwere ọtụtụ ihe Jizọs ma anyị na-amaghị. Ma, ọ kụziiri anyị ọtụtụ ihe banyere Alaeze Chineke na ihe Alaeze Chineke ga-emere anyị n’oge na-adịghị anya. Ọtụtụ ndị anyị na ha na-agakọ akwụkwọ, ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ, ma ọ bụ ndị bi n’ókèala anyị, amaghị ihe ndị a niile anyị ma. Nke a bụ ihe ọzọ mere anyị ji kwesị ịna-eche nche. Anyị kwesịrị ịna-eche nche mgbe niile ka Jizọs iji mata mgbe anyị nwere ike ịgwa ha ihe anyị ma banyere Alaeze Chineke. Anyị ekwesịghị ikwe ka ohere ọ bụla dapụtaranụ iji gwa ha ihe ndị a laa n’iyi. Ọtụtụ ndị ga-anwụ ma á maghị ihe e mere!—1 Tim. 4:16.
6 O nwere ihe ọzọ Jizọs ma nke mere ka ọ na-eche nche. Ọ ma na Setan chọsiri ike ịnwa ya ọnwụnwa, chọọ ịkpagbu ya, chọọkwa ime ka ọ kwụsị ime uche Jehova. Onye iro ọjọọ a mụ anya mgbe niile na-achọ “oge ọzọ ga-adaba adaba” ọ ga-eji nwaa Jizọs ọnwụnwa. (Luk 4:13) Jizọs mụ anya mgbe niile. Ọ chọrọ ichebiri Setan ka ọ ghara inweta ya n’agbanyeghị ihe ọ ga-eji bịa, ma ọ̀ bụ ọnwụnwa, ma ọ bụ mmegide, ma ọ bụkwanụ mkpagbu. Ihe Setan chọrọ ime Jizọs ka ọ chọkwara ime anyị taa. Anyị ma na Setan ka “dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” Ọ bụ ya mere Okwu Chineke ji gwa Ndị Kraịst niile, sị: “Nweenụ uche ziri ezi, na-echenụ nche.” (1 Pita 5:8) Olee otú anyị ga-esi na-eme ihe a?
OTÚ EKPERE SI ENYERE ANYỊ AKA ỊNA-ECHE NCHE
7, 8. Olee ihe Jizọs gwara anyị banyere ekpere, oleekwa ihe mere anyị ji kwesị iṅomi ya?
7 Baịbụl gosiri na ekpere ga-enyere anyị ezigbo aka ịna-eche nche ka ihe ọ bụla ghara ime adịm ná mma anyị na Chineke. (Kọl. 4:2; 1 Pita 4:7) Obere oge ka Jizọs gwachara ndị na-eso ụzọ ya ka ha soro ya na-eche nche, o kwuru, sị: “Na-echenụ nche ma na-ekpe ekpere mgbe niile, ka unu wee ghara ịbanye n’ọnwụnwa.” (Mat. 26:41) Ihe Jizọs na-ekwu ọ̀ bụ na ha kwesịrị ikpe ekpere naanị n’oge ahụ ihe na-esiri ha ezigbo ike? Ee e, ihe ahụ ọ gwara ha bụ ihe anyị kwesịrị ịna-eme mgbe niile.
8 Jizọs bụ onye e kwesịrị iṅomi n’okwu banyere ikpe ekpere. Ì chetara na e nwere mgbe o ji abalị dum kpekuo Nna ya ekpere? Ka anyị weregodị ya na anyị nọ mgbe ihe a a na-aga ịkọ ugbu a na-eme. (Gụọ Luk 6:12, 13.) Ihe a mere n’oge opupu ihe ubi, ọ ga-abụkwa na Jizọs nọ nso Kapaniọm, bụ́ obodo ọ na-anọkarị na Galili. Mgbe chi na-eji, Jizọs gbagoro n’otu n’ime ugwu ndị dị nso Oké Osimiri Galili. Ka ọ nọ ebe ahụ, o nwere ike ịbụ na ọ hụrụ ọkụ oriọna ndị Kapaniọm na ndị obodo ndị ọzọ dị ya nso mụnyere. Ma, ebe uche Jizọs dị bụ n’ekpere ọ na-ekpeku Jehova. Oge na-aga n’ike n’ike. Ọ ga-abụ na ọ maghị mgbe ọkụ ndị ahụ ji nwayọọ nwayọọ nyụchaa, ọnwa ejirikwa nwayọọ lakpuo. Ọ ga-abụkwa na ọ nụghị ube ụmụ anụmanụ ndị nọ nso ebe ahụ. Ọ ga-abụ na ihe ọ na-ekpe n’ekpere bụ ihe dị ezigbo mkpa ọ na-aga ikpebi, ya bụ, ndị ga-eso ná ndịozi iri na abụọ ọ ga-ahọrọ. Chegodị otú Jizọs ga-esi na-akọrọ Nna ya ihe niile ọ ma banyere onye nke ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ ya ma na-arịọsi ya arịrịọ ike ka o nyere ya aka, nyekwa ya amamihe.
9. Olee ihe anyị na-amụta n’otú Jizọs si jiri abalị dum kpee ekpere?
9 Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jizọs? Ọ̀ na-akụziri anyị na anyị kwesịrị iji ogologo awa na-ekpe ekpere? Ee e. Jizọs kwuru ihe gosiri na ọ ghọtara ndị na-eso ụzọ ya nke ọma. Ọ sịrị: “N’ezie, mmụọ dị njikere, ma anụ ahụ́ adịghị ike.” (Mat. 26:41) N’agbanyeghị nke a, anyị ka nwere ike ime ka Jizọs. Dị ka ihe atụ, ànyị na-ebu ụzọ ekpeku Nna anyị nke eluigwe ekpere tupu anyị ekpebiwe ihe ọ bụla anyị chọrọ ime nke nwere ike ịkpa okwukwe anyị, nke ezinụlọ anyị, ma ọ bụ nke ụmụnna anyị, aka ọjọọ? Ànyị na-ekpe ekpere ka Jehova nyere ụmụnna anyị aka ka ha nọsie ike n’okwukwe? Ànyị na-esi n’obi anyị ekpe ekpere ka ihe anyị na-eme ọ̀ bụ ikwughachi ihe ndị anyị na-ekwubu? Ekpere ahụ Jizọs kpere gosikwara na o ji oge ya na Nna ya ji akparịta ụka kpọrọ ihe. N’ụwa taa onye ọ bụla ji ọrụ n’aka, ọ na-adị mfe ichefu ihe ndị ka mkpa ebe a na-achụ ihe e ji ebi ndụ. Ọ bụrụ na anyị ana-ewepụtakwu oge na-ekpe ekpere si anyị n’ala ala obi, ọ ga-enyere anyị aka ịna-eche nche. (Mat. 6:6, 7) Nke a ga-eme ka anyị bịaruo Jehova nso, anyị achọọkwa ime ka mmekọrịta anyị na ya sikwuo ike ma ghara ime ihe ọ bụla nke ga-eme ka anyị na ya ghara ịdị ná mma.—Ọma 25:14.
OTÚ IKWUSA OZI ỌMA GA-ESI ENYERE ANYỊ AKA ỊNA-ECHE NCHE
10. Olee ihe Jizọs mere n’otu oge gosiri na o ji ohere ọ bụla dapụtaranụ kwusaa ozi ọma?
10 Jizọs tinyere uche ya n’ọrụ Jehova nyere ya. E nwere ụfọdụ ọrụ mmadụ nwere ike ịna-arụ, na-eche ihe ọzọ ma ghara ịba ná nsogbu. Ma, e nwere ọtụtụ ọrụ mmadụ ga-etinyerịrị uche ya niile na ha ma ọ rụwa ha. Ikwusa ozi ọma bụ otu n’ime ha. Jizọs ji ozi ọma ọ na-ekwusa kpọrọ ihe, na-achọ ohere ọ bụla ọ ga-eji kwusaa ya. Dị ka ihe atụ, mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya ji ụtụtụ dum gaa ogologo ije rute n’obodo Saịka, ndị na-eso ụzọ ya gawara ịzụta ihe oriri. Jizọs nọdụrụ ọdụ n’akụkụ otu olulu mmiri ka o zuru ike. Ma, o kweghị ka ohere ọ hụrụ ọ ga-eji kwusaa ozi ọma gafenahụ ya. E nwere nwaanyị Sameria nke bịara isere mmiri. Jizọs gaara eji oge ahụ hie ụra ma ọ chọọ. Ọ gaara achọta ihe ọ ga-akụdo aka ghara izi nwaanyị ahụ ozi ọma. Ma, ọ gwara nwaanyị ahụ okwu, ozi ọma o zikwara n’oge ahụ mere ka ọtụtụ ndị bi n’obodo ahụ gbanwee. (Jọn 4:4-26, 39-42) Ànyị nwere ike iṅomikwu Jizọs, ikekwe jirikwuo ohere ọ bụla dapụtaranụ na-ekwusara ndị anyị na-ahụ kwa ụbọchị ozi ọma?
11, 12. (a) Olee ihe Jizọs mere mgbe e nwere ndị chọrọ igbochi ya ịrụ ọrụ ya otú o kwesịrị? (b) Olee otú Jizọs si hụ na ozi ọ na-eje egbochighị ya ileba anya n’ihe ndị ọzọ dị mkpa?
Mat. 15:24) N’ihi ya, ọ gwara ndị Kapaniọm, sị: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.” (Luk 4:40-44) O doro anya na ozi Jizọs bụ ihe kacha mkpa ná ndụ ya. O kweghị ka ihe ọ bụla gbochie ya ije ozi o kwo bịa.
11 E nwere mgbe ndị nwere ezi obi chọrọ igbochi Jizọs ịrụ ọrụ ya otú o kwesịrị. Dị ka ihe atụ, ọrụ ebube Jizọs rụrụ na Kapaniọm metụrụ ìgwè mmadụ nọ ebe ahụ n’ahụ́ nke na ha achọghị ka Jizọs si n’ebe ahụ pụọ. O doro anya ihe mere ha ji mee otú ahụ. Ma, e zitere Jizọs ka ọ bịa kwusaara ‘atụrụ niile furu efu nke ụlọ Izrel’ ozi ọma, ọ bụghị naanị ndị bi n’otu obodo. (12 Nke a ọ̀ pụtara na o nweghịzi ihe ọzọ Jizọs na-arụ ná ndụ ma e wezụga ikwusa ozi ọma? Ò tinyere uche n’ozi ya nke na o leghaara ezinụlọ ya anya? Ee e, o kweghị ka ikwusa ozi ọma gbochie ya ileba anya n’ihe ndị ọzọ dị mkpa. E nwere oge ya na ndị enyi ya kporiri ndụ ma nwee obi ụtọ. O ji ezinụlọ dị iche iche kpọrọ ihe, gosikwa na ihe gbasara ha na-emetụ ya n’obi. O gosikwara ụmụaka na ya hụrụ ha n’anya.—Gụọ Mak 10:13-16.
13. Olee otú anyị nwere ike isi na-eche nche ka Jizọs ma ka ghara ikwe ka ozi ọma anyị na-ekwusa gbochie anyị ileba anya n’ihe ndị ọzọ dị mkpa?
13 Ka anyị na-agba mbọ iche nche ka Jizọs, olee otú anyị ga-esi ghara ikwe ka ozi anyị na-eje gbochie anyị ileba anya n’ihe ndị ọzọ dị mkpa? Anyị ekwesịghị ikwe ka ụwa mee ka anyị leghara ọrụ e nyere anyị rụọ anya. Ndị enyi na ndị ikwu anyị bú ezigbo ihe n’obi nwere ike ịgwa anyị ka anyị jiri ya nwayọọ ma ọ bụkwanụ gwa anyị ka anyị biwe ndụ ka ndị ibe anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị eṅomie Jizọs, anyị ga-ewere ozi anyị ka ihe oriri. (Jọn 4:34) Ọrụ anyị na-arụ na-eme ka anyị na Chineke dịkwuo ná mma, na-emekwa ka anyị nwee obi ụtọ. Ma, anyị ekwesịghị imebiga ihe ókè, na-eme ka ọ̀ bụ anyị kacha bụrụ ndị ezi omume ma ọ bụ na-ata ndụ anyị ahụhụ. Anyị chọrọ ịna-enwe ọṅụ na obi ụtọ ka Jizọs n’ihi na anyị na-efe “Chineke bụ́ onye obi ụtọ.”—1 Tim. 1:11.
OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-ECHE NCHE MGBE IHE NA-ESIRI ANYỊ IKE
14. Olee ihe anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ime mgbe ihe na-esiri anyị ike, oleekwa ihe anyị ji kwesị ime otú ahụ?
14 Anyị ahụla na ọ bụ mgbe ihe na-esiri Jizọs ezigbo ike ka o nyere ụfọdụ ndụmọdụ o nyere anyị ka anyị na-eche nche. (Gụọ Mak 14:37.) Mgbe anyị kacha kwesị ịna-eche nche ka Jizọs bụ mgbe ihe na-esiri anyị ike. E nwere otu ihe a na-anaghị agbagha agbagha ọtụtụ ndị na-echefukarị mgbe ihe na-esiri ha ike. Ihe ahụ dị ezigbo mkpa nke na e kwuru ya ugboro abụọ n’akwụkwọ Ilu. Ebe abụọ ahụ kwuru, sị: “E nwere ụzọ nke ziri ezi n’anya mmadụ, ma ụzọ ọnwụ ka nsọtụ ya ga-emecha bụrụ.” (Ilu 14:12; 16:25) Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe uche anyị gwara anyị, karịchaa n’oge ihe na-esiri anyị ike, anyị nwere ike ime ihe ga-akpatara anyị na ndị anyị hụrụ n’anya nsogbu.
15. Olee ihe onyeisi ezinụlọ nwere ike ịchọ ime ma ọ bụrụ na ihe esiwere ya ike?
15 Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịna-esiri onyeisi ezinụlọ ezigbo ike ịkpa afọ “ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya.” (1 Tim. 5:8) Nke a nwere ike ime ka ọ chọọ ịnara ọrụ ga-eme ka ọ na-agha ọmụmụ ihe, ma ọ bụ ka ọ ghara ịna-eduzi ofufe ezinụlọ ya, ma ọ bụkwanụ ka ọ ghara ịna-ekwusa ozi ọma. Uche ya nwere ike ịna-agwa ya na o nweghị ihe o mere ma ọ nara ọrụ ahụ. Nke a nwere ike imebi adịm ná mma ya na Chineke ma ọ bụdị mee ka ọ hapụ Chineke. Ọ kacha mma ma o mee ihe e kwuru n’Ilu 3:5, 6! Sọlọmọn kwuru n’ebe ahụ, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.”
16. (a) Olee otú Jizọs si gosi na ya dabeere n’amamihe Jehova ọ bụghị na nke yanwa? (b) Olee otú ọtụtụ ndị isi ezinụlọ si atụkwasị Jehova obi ka Jizọs mgbe ihe na-esiri ha ike?
16 Mgbe Jizọs na-ata ahụhụ, o kpebisiri ike na ya agaghị adabere ná nghọta ya. Legodị, nwoke kacha mara ihe n’ụwa adabereghị n’amamihe ya! Dị ka ihe atụ, mgbe Setan nwara ya ọnwụnwa, Jizọs zara ya ugboro ugboro, sị: “E dere, sị.” (Mat. 4:4, 7, 10) Ọ dabeere n’amamihe Nna ya merie ọnwụnwa a nwara ya, si otú ahụ gosi na ya dị umeala n’obi, bụ́kwanụ ihe Setan kpọrọ asị na ihe kọrọ ya. Ànyị na-eme ka Jizọs? Onyeisi ezinụlọ nke na-eche nche ka Jizọs na-ekwe ka Okwu Chineke na-edu ya, karịchaa mgbe ihe na-esiri ya ike. Ọtụtụ puku ndị isi ezinụlọ n’ụwa dum na-eme nke a. Ha jidị ihe ndị gbasara Alaeze Chineke kpọrọ ihe karịa ihe ndị e ji ebi ndụ. Ha si otú a elekọta ezinụlọ ha nke ọma. Jehova na-agọzi mbọ ha na-agba igboro ezinụlọ ha mkpa ha, dị nnọọ ka o kwere nkwa na Baịbụl na ya ga-eme.—Mat. 6:33.
17. Olee ihe mere i ji kwesị ịna-eche nche ka Jizọs?
17 O doro anya na Jizọs bụ onye kachanụ e kwesịrị iṅomi n’okwu gbasara iche nche. Anyị ga-amụta ihe n’aka ya, ihe anyị mụtara n’aka ya ga-abara anyị uru, nweekwa ike ime ka anyị dị ndụ. Cheta na Setan chọsiri ike ime ka anyị na-ehi ụra ime mmụọ nakwa ka okwukwe anyị ghara isi ike. Ọ chọkwara ka anyị ghara iji ofufe anyị na-efe Chineke kpọrọ ihe, ma ọ bụkwanụ ka anyị kwụsị ime uche ya. (1 Tesa. 5:6) Ekwela ka o nweta gị. Na-eche nche ka Jizọs. Na-ekpe ekpere mgbe niile, jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ na-ekwusa ozi ọma, tụkwasịkwa Jehova obi mgbe ihe na-esiri gị ike. Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, ị ga na-enwe obi ụtọ, ọbụna ugbu a anyị nọ ná ngwụcha nke usoro ihe ochie a. Ọ bụrụkwa na anyị na-eche nche, Nna anyị ukwu ga-ahụ anyị na anyị na-eme uche Nna ya mgbe ọ ga-abịa ibibi usoro ihe a. Obi ga-adị Jehova ụtọ ịgọzi gị maka otú i si jeere ya ozi n’adaghị mbà.—Mkpu. 16:15.
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 6]
Jizọs kwusaara otu nwaanyị ozi ọma n’akụkụ olulu mmiri. Ị̀ na-eji ohere ọ bụla dapụtaranụ ezi ndị mmadụ ozi ọma kwa ụbọchị?
[Foto dị na peeji nke 7]
Ọ bụrụ na ị na-enyere ezinụlọ gị aka ka ha na Chineke na-adịkwu ná mma ị na-egosi na ị na-eche nche