Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-eme Ka Ndị Nọ N’ọgbakọ Na-eme Nke Ọma

Na-eme Ka Ndị Nọ N’ọgbakọ Na-eme Nke Ọma

Na-eme Ka Ndị Nọ N’ọgbakọ Na-eme Nke Ọma

“Ka obiọma Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-erughịrị mmadụ dịnyere mmụọ unu na-egosi.”—FIL. 4:23.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI NYE AKA NA-EME KA NDỊ NỌ N’ỌGBAKỌ NA-EME NKE ỌMA . . .

․․․․․

mgbe anyị na ụmụnna anyị nọ?

․․․․․

ma anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-aga ozi ọma?

․․․․․

ma anyị kọọrọ ndị okenye mmehie dị oké njọ nwanna mere?

1. Gịnị mere e ji jaa ọgbakọ Filipaị na ọgbakọ Tayataịra mma?

NDỊ Kraịst nọ na Filipaị na narị afọ mbụ dara ogbenye. Ma, ha na-emesapụ aka, hụkwa ụmụnna ha n’anya nke ukwuu. (Fil. 1:3-5, 9; 4:15, 16) N’ihi ya, ihe ikpeazụ Pọl onyeozi dere n’akwụkwọ ozi o degaara ha bụ: “Ka obiọma Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-erughịrị mmadụ dịnyere mmụọ unu na-egosi.” (Fil. 4:23) Ndị Kraịst nọ na Tayataịra mere ka ụmụnna ndị nọ na Filipaị. Ọ bụ ya mere Jizọs Kraịst, onye e mere ka ọ dị ebube, ji gwa ha, sị: “Amaara m ihe ndị ị na-eme, na ịhụnanya na okwukwe na ije ozi na ntachi obi gị, amakwaara m na ihe ndị ị na-eme n’oge na-adịbeghị anya karịrị ndị i mere n’oge gara aga.”—Mkpu. 2:19.

2. Olee otú anyị nwere ike isi nye aka mee ka ndị nọ n’ọgbakọ anyị na-eme nke ọma?

2 Taakwa, ọgbakọ ọ bụla nwere àgwà e ji mara ya. Ihe e ji mara ụfọdụ ọgbakọ bụ otú ndị nọ na ha si enwe ihu ọchị, na-ahụkwa ibe ha n’anya. Ihe e ji mara ọgbakọ ndị ọzọ bụ otú ndị nọ na ha si anụ ọkụ n’obi n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na otú ha si egosi na ha ji ozi oge niile kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị na-eme nke ọma, ọ ga-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu, meekwa ka okwukwe onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ na-esikwu ike. (1 Kọr. 1:10) Ma, ọ bụrụ na anyị na-eme ka ndị nọ ọgbakọ na-asụ ngọngọ, o nwere ike ime ka ha daa mbà n’okwukwe, mee ka ha gharazie iji ofufe Jehova kpọrọ ihe, ma ọ bụdị mee ka ha na-elegharazi mmehie ndị nọ n’ọgbakọ na-eme anya. (1 Kọr. 5:1; Mkpu. 3:15, 16) Olee otú ndị nọ n’ọgbakọ unu si eme? Olee otú i nwere ike isi nye aka na-eme ka ọgbakọ unu na-eme nke ọma?

NA-EME KA ỌGBAKỌ UNU NA-EME NKE ỌMA

3, 4. Olee otú anyị ga-esi ‘nọrọ n’ime ọgbakọ buru ibu too Jehova’?

3 Otu ọbụ abụ bụrụ abụ, sị: “M ga-anọ n’ime ọgbakọ buru ibu too gị [Jehova]; m ga-eto gị n’etiti ìgwè mmadụ.” (Ọma 35:18) Ọbụ abụ a hụrụ na o toro Jehova mgbe ya na ndị ohu Chineke ndị ọzọ nọ. N’ọmụmụ ihe ndị anyị na-enwe kwa izu, ma n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, anyị na-enwe ọmarịcha ohere igosi na anyị na-anụ ọkụ n’obi ma anyị zaa ajụjụ ma kwuo ihe anyị kweere. Ọ ga-adị mma ma onye ọ bụla n’ime anyị jụọ onwe ya, sị: ‘M̀ na-agbasi mbọ ike ka m zaa ajụjụ n’ọmụmụ ihe? M̀ na-akwadebe ihe ndị a ga-amụ ma na-aza ezigbo ihe n’ọmụmụ ihe? Ọ bụrụ na m bụ nna, m̀ na-ewepụta oge nyere ụmụ m aka ịkwadebe ihe ha ga-aza ma na-akụziri ha otú ha ga-esi na-aza ajụjụ n’okwu nke aka ha?’

4 Ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru ihe gosiri na otú anyị si abụ abụ nwere ike ime ka a mata ma obi anyị ọ̀ kwụ chịm ime ihe ziri ezi. Ọ sịrị: “Obi m kwụ chịm, Chineke, obi m kwụ chịm. M ga-abụ abụ, meekwa ka ọ bụrụ abụ olu ụtọ.” (Ọma 57:7) Abụ ndị anyị na-abụ n’ọmụmụ ihe na-enyere anyị ezigbo aka iji obi kwụ chịm ‘na-abụku Jehova abụ, na-emekwa ka abụ anyị bụrụ abụ olu ụtọ.’ Ọ bụrụ na anyị amaghị ụfọdụ abụ anyị, ọ ga-adị mma ma anyị na-amụgharị ha n’oge Ofufe Ezinụlọ. Ka anyị kpebisie ike ‘ịbụku Jehova abụ n’oge niile anyị dị ndụ ma bụkuo ya abụ olu ụtọ n’oge ndụ anyị niile.’—Ọma 104:33.

5, 6. Olee otú anyị nwere ike isi na-ele ndị ọzọ ọbịa ma na-emesapụrụ ha aka, gịnịkwa ka ime otú ahụ ga-eme n’ọgbakọ?

5 Otú ọzọ anyị si eme ka ịhụnanya dịrị n’ọgbakọ bụ ịna-ele ụmụnna anyị ọbịa. N’isi iri na atọ nke akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru, ọ gbara ha ume, sị: “Ka ịhụnanya ụmụnna unu dịgide. Unu echefula ile ọbịa.” (Hib. 13:1, 2) Otú pụrụ iche anyị ga-esi egosi na anyị na-ele ndị ọbịa anya nke ọma bụ ịkpọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha ma ọ bụkwanụ ndị ozi oge niile nọ n’ọgbakọ anyị ka ha soro anyị rie ihe. Anyị nwekwara ike ịkpọ ụmụ nwaanyị ndị di ha nwụrụ, ndị nọ n’ezinụlọ naanị nne ma ọ bụ naanị nna na-azụ ụmụ ya, ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ ka ha soro anyị rie ihe ma ọ bụ soro anyị mgbe anyị na-enwe ofufe ezinụlọ.

6 Pọl gwara Timoti ka ọ dụọ ndị ọzọ ọdụ “ka ha na-arụ ọrụ ọma, ka ha bụrụ ọgaranya n’ezi ọrụ, ka ha na-emesapụ aka, ka ha dịrị njikere inye ndị ọzọ ihe, ka ha na-atọrọ onwe ha ezi ntọala maka ọdịnihu dị ka akụ̀ n’ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme ya, ka ha wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” (1 Tim. 6:17-19) Ihe Pọl na-ekwu ebe a bụ ka ndị ya na ha so na-efe Chineke gbalịa na-emesapụ aka. Anyị nwere ike ịna-emesapụ aka ma mgbe ihe siri ezigbo ike. Otú dị mma anyị ga-esi eme ya bụ iburu ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha n’ọgba tum tum anyị ma ọ bụ n’ụgbọala anyị gaa ozi ọma ma ọ bụ ọmụmụ ihe, bulatakwa ha. Gịnịkwanụ ka ndị e meere ihe ọma ndị a kwesịrị ịna-eme? Ha ga-eme ka ọgbakọ na-eme nke ọma ma ọ bụrụ na ha egosi na obi dị ha ụtọ maka ihe e meere ha, ikekwe nye ndị ahụ ego ole ha ji, si otú ahụ nye aka maka ego mmanụ ụgbọala, bụ́kwanụ ihe na-ada ezigbo ọnụ. Ihe ọzọkwa anyị ga-eme bụ iwepụtakwu oge anyị na ụmụnna anyị ga-eji nọkọọ ka ha wee mara na ha dị anyị mkpa nakwa na anyị hụrụ ha n’anya? Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ọma “n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ,” na-ewepụta oge ka anyị na ha nọrịa, na-enyekwa ha ihe, anyị na-egosi ha na anyị hụrụ ha nnọọ n’anya, anyị na-enyekwa aka eme ka ọgbakọ na-eme nke ọma.—Gal. 6:10.

7. Olee otú anyị si eme ka ọgbakọ na-eme nke ọma ma anyị ghara ikpughe okwu nzuzo?

7 Ka anyị leba anya n’ihe ndị ọzọ na-eme ka anyị hụkwuo ụmụnna anyị n’anya, ha bụ: imete ha enyi na ịghara ikpughe okwu nzuzo. (Gụọ Ilu 18:24.) Ezigbo enyi anaghị akọsa ihe gbasara enyi ya, bụ́ nke ndị ọzọ na-ekwesịghị ịma. Ọ bụrụ na ụmụnna anyị agwa anyị ihe ha na-achọghị ka ndị ọzọ mara, anyị agharakwa ime ka ndị ọzọ nụ ya, ọ ga-eme ka anyị na ha dịkwuo ná mma. Anyị ga-egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya, nakwa na anyị dị ka ndị si n’otu ezinụlọ, ma ọ bụrụ na anyị abụrụ ndị enyi a ga-atụkwasali obi ma ghara ịna-ekpughe okwu nzuzo.—Ilu 20:19.

JIRI ỊNỤ ỌKỤ N’OBI NA-EKWUSA OZI ỌMA

8. Olee ndụmọdụ e nyere ndị Leodisia, oleekwa ihe mere e ji nye ha ya?

8 Jizọs gwara ọgbakọ Leodisia, sị: “Amaara m ihe ndị ị na-eme, na ị jụghị oyi, i kpoghịkwa ọkụ. Ọ dị m ka ya bụrụ na ị jụrụ oyi ma ọ bụkwanụ na ị na-ekpo ọkụ. Ya mere, ebe ọ bụ na ị dị ṅaraṅara, i kpoghị ọkụ, ị jụghịkwa oyi, m ga-agbụpụ gị n’ọnụ m.” (Mkpu. 3:15, 16) Ndị Leodisia anaghị eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma. Ọ ga-abụkwa na ozi ọma ha na-ejichaghị kpọrọ ihe bịara na-akpa mmekọrịta ha na ụmụnna ha aka ọjọọ. N’ihi ya, Jizọs ji obiọma gwa ha, sị: “Ndị niile m hụrụ n’anya nke ukwuu ka m na-abara mba, na-adọkwa aka ná ntị. Ya mere, na-anụ ọkụ n’obi, chegharịakwa.”—Mkpu. 3:19.

9. Olee otú otú anyị si eje ozi ọma ga-esi eme ka ọgbakọ na-eme nke ọma?

9 Anyị ga-enye aka na-eme ka ọgbakọ na-eme nke ọma ma ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-aga ozi ọma. Otu n’ime ihe e kwo ehiwe ọgbakọ bụ ka anyị nwee ike ịchọta ndị yiri atụrụ n’ókèala anyị ma nyere ha aka ka ha na Chineke dịrị ná mma. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-enyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs otú ahụ Jizọs mere. (Mat. 28:19, 20; Luk 4:43) Ọ bụrụ na anyị ana-ejikwu ịnụ ọkụ n’obi na-aga ozi ọma, anyị ga-adịkwu n’otu, bụrụ ndị “ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:9) Ka anyị na-ahụ ụmụnna anyị ebe ha na-agwa ndị ọzọ ihe mere ha ji kwere n’ihe ndị ha kweere, nakwa ebe ha na-ekwu okwu ọma banyere ihe ndị gbasara Alaeze Chineke, anyị na-ahụkwu ha n’anya, na-akwanyekwukwara ha ùgwù. Ọgbakọ ga-adịkwa n’otu ma anyị “jiri otu obi” na-eje ozi ọma.—Gụọ Zefanaya 3:9.

10. Ọ bụrụ na anyị emee ka otú anyị si ezi ozi ọma kakwuo mma, olee otú ọ ga-esi abara ndị nọ n’ọgbakọ uru?

10 Mbọ anyị na-agba ịhụ na a ghọtara ihe anyị na-ezi n’ozi ọma ga-enyere ndị ọzọ aka. Anyị ga na-ejikwu ịnụ ọkụ n’obi na-aga ozi ọma ma ọ bụrụ na ihe banyere ndị anyị na-ezi ozi ọma na-emetụkwu anyị n’obi. Anyị ga-ejikwukwa ịnụ ọkụ n’obi na-aga ozi ọma ma ọ bụrụ na anyị ana-agba mbọ ka otú anyị si ezi ozi ọma na-akakwu mma, na-akụzikwara ndị mmadụ ihe otú ọ ga-eru ha n’obi. (Mat. 9:36, 37) Ọ bụrụ na anyị na-anụ ọkụ n’obi, ndị anyị na ha so aga ozi ọma ga-amụtakwa ịna-anụ ọkụ n’obi. Jizọs zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya abụọ abụọ ka ha gaa kwusaa ozi ọma kama izipụ ha otu otu. (Luk 10:1) Nke a mere ka ha gbarịta ibe ha ume, mụta ihe n’aka ibe ha, o mekwara ka ha na-ejikwu ịnụ ọkụ n’obi aga ozi ọma. Ọ̀ bụ na obi anaghị adị anyị ụtọ ma anyị na ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi rụkọọ n’ozi ọma? Otú ha si anụ ọkụ n’obi na-agba anyị ume, na-emekwa ka anyịnwa na-ekwusa ozi ọma n’ike n’ike.—Rom 1:12.

HỤ NA Ị NAGHỊ ATAMU NTAMU NAKWA NA Ị NAGHỊ EKPUCHI IHE ỌJỌỌ

11. Olee ihe ụfọdụ ụmụ Izrel ndị dịrị ndụ n’oge Mozis malitere ime, oleekwa ihe nke ahụ kpataara ha?

11 Naanị izu ole na ole ụmụ Izrel ghọchara mba nọọrọ onwe ha, ha malitere ịtamu ntamu, ihe ndị ha nwere anaghịzi eju ha afọ. Nke a mere ka ha mechaa nupụrụ Jehova na ndị na-anọchite anya ya isi. (Ọpụ. 16:1, 2) Naanị mmadụ ole na ole, bụ́ ndị so ná ndị si Ijipt pụta, bara n’Ala Nkwa ahụ. Ì chetara na Mozis n’onwe ya sodị ná ndị na-abaghị n’ala ahụ n’ihi ihe o mere mgbe ụmụ Izrel kpara àgwà otú na-adịghị mma? (Diut. 32:48-52) Gịnị ka anyị ga-eme taa iji hụ na anyị akpataghị ọgba aghara?

12. Olee otú anyị ga-esi hụ na anyị ebidoghị ịtamu ntamu?

12 Anyị ekwesịghị ịna-atamu ntamu. Ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi ma na-akwanyere ndị na-edu ndú ùgwù, anyị agaghị na-atamu ntamu. Anyị kwesịkwara ịkpachara anya ná ndị anyị na ha na-akpakọrịta. Iji ihe ndị na-adịghị mma atụrụ ndụ ma ọ bụ iwepụta ezigbo oge ka anyị na ndị ọrụ ibe anyị ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị nọrịa, bụ́ ndị na-anaghị eji ihe Chineke kwuru kpọrọ ihe, ga-emebiri anyị ihe. Anyị ga-egosi na anyị ma ihe ma ọ bụrụ na anyị ana-agbara ndị na-akpa àgwà ọjọọ ọsọ ma na-ezere ndị na-ekwu na mmadụ kwesịrị ịna-akpa àgwà otú masịrị ya.—Ilu 13:20.

13. Olee ihe ndị ọzọ jọgburu onwe ha ịtamu ntamu nwere ike ịkpata n’ọgbakọ?

13 Ịtamu ntamu nwere ike imebi ihe n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime ka udo gharazie ịdị n’ọgbakọ, kpatakwa nkewa. Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na nwanna ana-akọsa nsogbu ya na nwanna ọzọ nwere, ọ ga-ewute nwanna ahụ ya na ya nwere nsogbu, onye ahụ na-akọsakwa nsogbu ahụ nwere ike isi otú ahụ kwutọwa nwanna ya, ma ọ bụkwanụ kwujọwa ya. (Lev. 19:16; 1 Kọr. 5:11) Ụfọdụ ndị tamuru ntamu na narị afọ mbụ “na-eleda ndị isi anya, na-ekwujọkwa ndị dị ebube.” (Jud 8, 16) N’eziokwu, Chineke wesara ndị a tamuru ntamu megide ndị na-edu ndú n’ọgbakọ iwe.

14, 15. (a) Ọ bụrụ na anyị agbachi nkịtị mgbe nwanna mere mmehie dị oké njọ, olee otú o nwere ike isi gbasa ndị niile nọ n’ọgbakọ? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na nwanna na-eme mmehie na nzuzo?

14 Gịnị ka anyị ga-eme ma anyị chọpụta na nwanna na-eme mmehie na nzuzo, ikekwe na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, ma ọ bụkwanụ na-ebi ndụ rụrụ arụ? (Efe. 5:11, 12) Ọ bụrụ na anyị agbachi nkịtị mgbe mmadụ na-eme mmehie dị oké njọ, nke a nwere ike ime ka mmụọ nsọ ghara ịna-arụ ọrụ otú o kwesịrị, nweekwa ike ịkpaghasị udo dị n’ọgbakọ. (Gal. 5:19-23) Otú ahụ Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt na narị afọ mbụ si wepụ ihe ọjọọ n’ọgbakọ ha ka anyị kwesịkwara iwepụ ihe ọ bụla nwere ike imebi ọgbakọ. Ihe anyị ga-ekwo eme nke a bụ ka ọgbakọ dị ọcha, ndị nọ na ya ana-emekwa nke ọma. Olee otú i nwere ike isi nye aka mee ka udo dịrị n’ọgbakọ unu?

15 Dị ka anyị kwuburu, anyị kwesịrị ịhụ na anyị anaghị ekpughe okwu nzuzo ndị anyị na-ekwesịghị ikpughe, karịchaa mgbe ndị ọzọ gwara anyị ihe na-enye ha nsogbu n’obi. Ọ dị njọ ịkọsa okwu nzuzo gbasara onye ọzọ, ọ na-agbawakwa obi. Ma, ọ bụrụ na nwanna emee mmehie dị oké njọ, e kwesịrị ime ka ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru na ha kwesịrị ileba okwu ahụ anya mara, ya bụ, ndị okenye ọgbakọ. (Gụọ Levitikọs 5:1.) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị achọpụta na nwanna emeela mmehie dị oké njọ, anyị kwesịrị ịgba ya ume ka ọ kọọrọ ya ndị okenye ka ha nyere ya aka. (Jems 5:13-15) Ma, ọ bụrụ na o meghị otú ahụ ruo oge ụfọdụ, anyị kwesịrị ịkọrọ ya ndị okenye.

16. Olee otú o si bụrụ na anyị na-eme ka ọgbakọ na-eme nke ọma ma anyị kọọrọ ndị okenye mmehie dị oké njọ nwanna mere?

16 Ọgbakọ Ndị Kraịst bụ ebe a na-anọ eme ihe Chineke kwuru nakwa ebe mmadụ na-anọ ahụ́ eruo ya ala. Anyị kwesịrị inye aka hụ na ọ dịghị ihe mere ya. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịkọrọ ndị okenye banyere onye mere mmehie dị oké njọ. Ọ bụrụ na ndị okenye enyere onye ahụ aka ya aghọta otú ihe o mere dịruru ná njọ, chegharịa ma nabata aka ná ntị a dọrọ ya, o nweghịzi ihe ọ ga-emebi n’ọgbakọ. Ma, gịnị ga-eme ma onye na-eme mmehie dị oké njọ echegharịghị, nakwa ma ó nweghị ihe o ji ndụmọdụ ndị okenye nyere ya kpọrọ? Nchụpụ a ga-achụpụ ya n’ọgbakọ ga-eme ka e “bibie,” ma ọ bụ wepụ, ihe na-emebi ihe n’etiti anyị, meekwa ka ọgbakọ na-eme nke ọma. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 5:5.) N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịhụ na ndị okenye maara banyere mmehie dị oké njọ nwanna mere. Anyị kwesịkwara ime ihe ha gwara anyị mee. Ka anyị meere ụmụnna anyị ihe anyị kwesịrị imere ha ma hụ na e mebighị ọgbakọ.

NA-EME KA E NWEE “ỊDỊ N’OTU NKE MMỤỌ NSỌ”

17, 18. Gịnị ga-enyere anyị aka ‘ịnọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ’?

17 Ndị na-eso ụzọ Jizọs nyere aka mee ka e nwee ịdị n’otu nke mmụọ nsọ n’ọgbakọ. Otú ha si mee nke a bụ na ‘ha nọ na-ege ntị n’ozizi ndịozi.’ (Ọrụ 2:42) Ha ji ndụmọdụ na ntụziaka ndị okenye si n’Akwụkwọ Nsọ nye ha kpọrọ ihe. Taa, ọgbakọ na-adị n’otu n’ihi na ndị okenye na-erubere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, isi. (1 Kọr. 1:10) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe si na Baịbụl, bụ́ nke nzukọ Jehova na-agwa anyị ka anyị mee, na-esokwa ntụziaka ndị okenye, anyị na-egosi na anyị “na-agbasi mbọ ike ka [anyị] nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.”—Efe. 4:3.

18 N’ihi ya, ka anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime iji hụ na ọgbakọ dị ọcha ma dịrị n’otu, hụkwa na ndị nọ na ya na-eme nke ọma. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, obi kwesịrị isi anyị ike na ‘obiọma Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-erughịrị mmadụ ga-adịnyere mmụọ anyị na-egosi.’—Fil. 4:23.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 19]

Ị̀ na-akwadebe ihe ị ga-aza n’ọmụmụ ihe, si otú ahụ na-eme ka ọgbakọ na-eme nke ọma?

[Foto dị na peeji nke 20]

Mụta ka e si abụ abụ anyị ka i nwee ike na-eme ka ọgbakọ na-eme nke ọma