Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Netan Ji Obi Ya Niile Mee Ka E Fee Chineke

Netan Ji Obi Ya Niile Mee Ka E Fee Chineke

Netan Ji Obi Ya Niile Mee Ka E Fee Chineke

Ọ dịghị mfe ime ka nwoke nọ n’ọkwá ukwu kweta na ya emehiela ihe nakwa na ya kwesịrị ịgbanwe àgwà ọjọọ ya. Ọ bụrụ na ị ma na ụdị onye a gburu otu nwoke iji kpuchie ihe ọjọọ o mere, ị̀ ga-agali gwa ya na ihe o mere adịghị mma?

Eze Devid, onye chịrị Izrel n’oge ochie, na Bat-shiba kwara iko, Bat-shiba adịrị ime. Ihe Devid mere iji kpuchie mmehie ya na Bat-shiba mere bụ igbu di ya ma kpọrọ ya ka ọ bụrụ nwunye ya. Devid nọ na-ebi ndụ ihu abụọ ruo ọtụtụ ọnwa, na-arụkwa ọrụ onye na-achị achị na-arụ. Ma, Jehova ekweghị ka e kpuchie mmehie ahụ eze mere. O zigara Netan, bụ́ onye amụma ya, ka ọ gaa tụọ Devid mmehie ya n’anya.

Ozi a adịghị mfe ọgịga. Were ya na ọ bụ gị ka e ziri ozi a e ziri Netan. Ebe ọ bụ na Netan kwụsiri ike n’akụkụ Jehova, kpebisiekwa ike ime ihe Chineke kwuru, ọ gawara ka ọ tụọ Devid mmehie ya n’anya. Olee otú onye amụma a ga-esi tụọ Eze Devid mmehie ya n’anya ma mee ka ọ ghọta na o kwesịrị ichegharị?

ONYE NKỤZI NKE DỊ AKỌ

Gbalịa jiri nkeji ole na ole gụọ 2 Samuel 12:1-25. Were ya na ọ bụ gị bụ Netan onye na-akọrọ Devid akụkọ a, sị: “E nwere ndị ikom abụọ nọ n’otu obodo, otu bụ ọgaranya, nke ọzọ bụ onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya. Ọgaranya ahụ nwere ọtụtụ atụrụ na ehi; ma nwoke ahụ ọ na-enweghị ka ọ hà ya nwere naanị otu nne atụrụ dị nta, nke ọ zụtara azụta. Ọ hapụrụ ya ndụ, ọ nọkwa n’ụlọ nwoke ahụ na ụmụ ya na-eto. Ọ na-esokwa ya eri ntakịrị nri ya, ọ na-aṅụ mmiri dị n’iko ya, ọ na-edinakwa n’obi ya, o wee were ya dị ka nwa ya nwaanyị. Mgbe nwa oge gasịrị, ọgaranya ahụ nwere onye ọbịa, ma o sighị n’atụrụ na ehi ya were ụfọdụ gbuoro onye ije ahụ bịara n’ụlọ ya. O wee were obere nne atụrụ nke nwoke ahụ ọ na-enweghị ka ọ hà ya gbuoro nwoke ahụ bịara n’ụlọ ya.”—2 Sam. 12:1-4.

O doro anya na Devid, onye nwere mgbe ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ, weere na akụkọ a mere eme. Otu nwoke nke na-akọwa ihe e dere na Baịbụl, sịrị: “Ọ ga-abụ na Netan na-agakarị na nke Devid ekpesara ya maka ndị e megburu emegbu ka o nwee ike mezie ihe e mehiere, Devid chekwara na ọ bụ ihe o kwo bịa ugbu a.” Ọ bụrụgodị na ọ bụ ihe merenụ, ọ bụ n’ihi na Netan nwere obi ike nakwa na ọ kwụsiri ike n’akụkụ Chineke mere o ji gwa eze a okwu otú o si gwa ya. Ihe ahụ Netan kọrọ mere ka ezigbo iwe jide Devid. Devid sịrị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ, nwoke nke mere ihe a kwesịrị ịnwụ!” Netan gwaziri ya hoo haa, sị: “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ!”—2 Sam. 12:5-7.

Cheedị ihe mere Netan ji si otú a zie ozi e ziri ya. Ọ naghị adị mfe mmadụ iche echiche nke ọma ma e nwee okwu gbasara ya na onye na-eri ya obi. Onye ọ bụla n’ime anyị na-achọkarị ịzọwa isi ya ma a jụwa ya ajụjụ maka ihe o mere. Ma, akụkọ ahụ Netan kọrọ mere ka Devid ma onwe ya ikpe n’amaghị ama. Eze chọpụtara nke ọma na àgwà onye Netan kọrọ akụkọ ya kpara jọgburu onwe ya. Ma, ọ bụ naanị mgbe Devid n’onwe ya kwuru na àgwà ahụ jọgburu onwe ya ka Netan mere ka ọ mara na ọ bụ yanwa bụ́ eze ka akụkọ ahụ kụrụ n’isi. Mgbe ahụ ka Devid hụrụ otú mmehie ya jọruru ná njọ. Nke a mere ka ọ dịrị ya mfe ịnabata mba a baara ya. O kwetara na ya “ledara” Jehova anya n’ihi ihe ahụ ya na Bat-shiba mere, ọ nabatakwara mba a baara ya, bụ́ nke kwesịịrị ya.—2 Sam. 12:9-14; Ọma 51, okwu mmeghe.

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe a merenụ? Onye na-akụzi Baịbụl na-ebu n’obi inyere ndị ọ na-akụziri ihe aka iji aka ha kpebie ihe dị mma. Netan kwanyeere Devid ùgwù, ọ bụ ya mere o ji jiri akọ gwa ya okwu. Netan ma na n’ala ala obi Devid, Devid hụrụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya. Onye amụma ahụ ji akụkọ ya mee ka eze gosi na ya nwere àgwà ndị a. Anyị nwekwara ike ime ka ndị chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu ghọta otú Jehova si ele ihe anya. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ndị mmadụ nwere ihe ndị ha na-ewere ka ihe ziri ezi. Anyịnwa nwekwara ike inyere hanwa aka inyocha onwe ha ma hà na-eme ihe ziri ezi n’eziokwu n’emeghị ka ànyị ka ha akpa àgwà ọma ma ọ bụkwanụ na ọ bụ anyị ga-agwa ha ihe ha ga-eme. Ọ bụ Baịbụl na-agwa anyị ihe dị mma na ihe na-adịghị mma, anyị anaghị ekpebi ya n’onwe anyị.

Ihe kacha nyere Netan aka ịbara Eze a onye ọ bụla na-asọpụrụ mba bụ otú Netan si kwụsie ike n’akụkụ Chineke. (2 Sam. 12:1) Ọ bụrụkwa na anyị akwụsie ike n’akụkụ Jehova, anyị ga-enwe ike iji obi ike mee ihe ziri ezi n’anya ya.

ONYE NA-EJIGHỊ EZI OFUFE EGWU EGWU

Ebe Devid gụrụ otu n’ime ụmụ ya Netan, ọ ga-abụ na ya na Netan bụ ezigbo enyi. (1 Ihe 3:1, 5) N’ebe mbụ a kọrọ banyere Netan na Baịbụl, ọ bụ ya na Devid nọ na-akparịta. Ha abụọ hụrụ Jehova n’anya. O doro anya na eze na-ekweta ihe ọ bụla Netan kwuru. Ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ bụ n’ihi na ọ gwara onye amụma ahụ na ya chọrọ iwuru Jehova ụlọ nsọ. Devid sịrị: “‘Lee, m bi n’ụlọ e ji osisi sida wuo ma igbe ezi Chineke dọrọ n’etiti ákwà ụlọikwuu.’ Netan wee gwa eze, sị: ‘Ihe ọ bụla dị gị n’obi—gaa mee ya, n’ihi na Jehova nọnyeere gị.’”—2 Sam. 7:2, 3.

Ebe Netan bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi nke na-efe Jehova, o ji obi ya dum kweta ka Devid bido iwu ụlọ ọ chọrọ iwu, nke bụ́ ụlọ mbụ a ga-anọ na-efe Jehova ofufe n’ụwa. Ma, na nke ugbu a, o doro anya na Netan kwuru ihe o chere kama ikwuchitere Jehova. N’abalị ahụ, Chineke gwara onye amụma a na-ejere ya ozi ka ọ gaa gwa eze ihe dị iche, ya bụ: na Devid agaghị ewuru Jehova ụlọ nsọ. Onye ga-ewu ya bụ otu n’ime ụmụ Devid. Ma, Netan kwukwara na Chineke ekwela Devid nkwa na ocheeze Devid ‘ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.’—2 Sam. 7:4-16.

Uche Chineke n’okwu gbasara iwu ụlọ nsọ dị iche n’uche Netan. Ma, onye amụma a dị umeala n’obi atamughị ntamu, o kweere ihe a Jehova zubere ime, ọ kwadokwara ya. Anyị kwesịrị ime ka Netan ma ọ bụrụ na e nwee otú Chineke si gbazie anyị. Ihe ndị Netan onye amụma mechara mee gosiri na o nweghị mgbe Chineke jụrụ ya. O yikarịrị ka Jehova ò jidị mmụọ nsọ ya mee ka Netan, na Gad, bụ́ onye ọhụụ, duzie Devid ya ahọpụta puku mmadụ anọ ndị ga na-eji ngwá egwú eto Jehova n’ụlọ nsọ.—1 Ihe 23:1-5; 2 Ihe 29:25.

Ọ HỤRỤ NA ONYE KWESỊRỊ ỊBỤ EZE GHỌRỌ EZE

Netan ma na ọ bụ Sọlọmọn kwesịrị ịbụ eze ma Devid, bụ́ onye merela agadi, nwụọ. N’ihi ya, mgbe Netan chọpụtara na Adọnaịja chọrọ ịnaghara ọchịchị n’ike n’oge ike na-adịghịzi Devid, o mere ihe ngwa ngwa ka ihe a ghara ime. N’oge a kwa, Netan gosiri na ya bụ nwoke dị akọ na onye kwụsiri ike n’ezi ihe. Ihe o bu ụzọ mee bụ ịgba Bat-shiba ume ka o chetara Devid na ọ ṅụrụ iyi na ọ ga-echi Sọlọmọn nwa ya eze. Mgbe ahụzi, Netan gakwuziiri eze n’onwe ya ka ọ jụọ ya ma ò nyela Adọnaịja ikike ịbụ eze ga-anọchi ya. Mgbe eze a merela agadi chọpụtara na agwọ nọ n’akịrịka, ọ gwara Netan na ndị ọzọ na-ejere ya ozi, bụ́ ndị ka na-erubere ya isi, ka ha tee Sọlọmọn mmanụ ma kpọsaa na ọ bụ eze. Nkata Adọnaịja kpara ịnaghara ọchịchị n’ike kụrụ afọ n’ala.—1 Eze 1:5-53.

ỌKỌ AKỤKỌ IHE MERE EME NKE NA-ACHỌGHỊ IMERE ONWE YA AHA

E kwuru na ọ bụ Netan na Gad dere 1 Samuel isi 25 ruo isi 31 nakwa 2 Samuel. Ihe e dere banyere akụkọ ndị ahụ e ji ike mmụọ nsọ dee bụ: “Ma ihe ndị metụtara Devid bụ́ eze, ma ndị mbụ ma ndị ikpeazụ, e dere ha n’okwu Samuel onye ọhụ ụzọ nakwa n’okwu Netan onye amụma nakwa n’okwu Gad onye ọhụụ.” (1 Ihe 29:29) E kwukwara na Netan dere banyere ‘ihe ndị metụtara Sọlọmọn.’ (2 Ihe 9:29) Nke a gosiri na ọ ga-abụrịrị na Netan akwụsịghị inye aka n’obí eze mgbe Devid nwụrụ.

Ọ ga-abụ Netan onye amụma ji aka ya dee ọtụtụ n’ime ihe ndị anyị maara banyere ya. Ma, otú o si ghara ịkọ ihe ụfọdụ na-akụziri anyị ezigbo ihe banyere ụdị onye ọ bụ. O doro anya na Netan bụ ọkọ akụkọ ihe mere eme nke na-achọghị imere onwe ya aha. Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru na n’ihe niile a kọrọ banyere ya na Baịbụl ekwughị ebe o si ma ọ bụ ezinụlọ o si. Anyị amaghị ebe Netan si ma ọ bụ ezinụlọ o si.

ỊKWỤSI IKE N’AKỤKỤ JEHOVA KWALIRI YA IME IHE DỊ MMA

Anyị nwere ike isi n’ihe ole na ole a kọrọ n’Akwụkwọ Nsọ banyere Netan kwuo na ọ dị umeala n’obi, nakwa na ọ na-anụ ya ọkụ n’obi ịhụ na e mere ihe niile otú Chineke si chọọ. Jehova Chineke nyere ya nnukwu ọrụ. Chebara àgwà dị iche iche Netan nwere echiche, ma otú o si kwụsie ike n’akụkụ Chineke ma otú o si jiri obi ya niile mee ihe Chineke kwuru. Gbalịsie ike ịna-eme ka ya.

E nwere ike a gaghị agwa gị ka ị gaa baara eze kwasoro nwaanyị onye ọzọ iko mba ma ọ bụ ka ị gaa meghasịa nkata mmadụ kpara ịnaghara ọchịchị. Ma, aka Chineke ga-enyere gị nwere ike ime ka ị kwụsie ike n’akụkụ ya ma na-eme ihe o kwuru mgbe niile. I nwekwara ike iji obi ike na-akụzi eziokwu, jiri akọ na-eme otú ahụ, na-akwadosikwa ezi ofufe ike.

[Foto dị na peeji nke 25]

Ebe Netan chọsiri ike ịhụ na onye kwesịrị ịbụ eze ghọrọ eze, o ji akọ gwa Bat-shiba okwu