Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nwee Obi Ike, Dịkwa Ike Nke Ukwuu”

“Nwee Obi Ike, Dịkwa Ike Nke Ukwuu”

“Nwee Obi Ike, Dịkwa Ike Nke Ukwuu”

“Nwee obi ike, dịkwa ike nke ukwuu . . . Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị.”—JỌSH. 1:7-9.

OLEE IHE Ị GA-AZA?

․․․․․

Olee otú Inọk na Noa si gosi na ha nwere obi ike?

․․․․․

Olee otú ndị inyom ụfọdụ n’oge ochie si gosi na ha nwere okwukwe na obi ike?

․․․․․

Olee otú ndị na-eto eto ụfọdụ sirila gosi na ha nwere obi ike?

1, 2. (a) Olee ihe anyị kwesịrị inwe mgbe ụfọdụ ka anyị nwee ike ime ihe ziri ezi? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle?

ONYE nwere obi ike abụghị onye ụjọ. Ọtụtụ ndị weere na onye nwere obi ike bụ onye dị ike, nke na-anaghịkwa atụ ụjọ. Ma, mgbe ụfọdụ, naanị uru obi ike na-aba bụ inyere mmadụ aka ka ọ na-eme ihe ziri ezi kwa ụbọchị.

2 Ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ji obi ike mee ihe ndị tara akpụ ime n’oge ha. Ndị ọzọ ji obi ike mee ihe ọtụtụ ndị Jehova na-eme taa. Olee ihe anyị na-amụta n’otú ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl si jiri obi ike mee ihe ndị tara akpụ bịaara ha? Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị nwere obi ike?

NDỊ JI OBI IKE GBAA ÀMÀ N’ỤWA NKE NA-ANAGHỊ ASỌPỤRỤ CHINEKE

3. Olee ihe Inọk buru n’amụma ga-eme ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke?

3 Onye na-enweghị obi ike agaghị agbaliri Jehova àmà tupu Iju Mmiri nke oge Noa n’ihi na ndị juru n’ụwa mgbe ahụ bụ ndị ọjọọ. Ma, Inọk, “bụ́ onye nke asaa n’agbụrụ Adam,” ji obi ike buo amụma, sị: “Lee! Jehova bịara, ya na ọtụtụ iri puku ndị nsọ ya, ime ha niile ihe e kpere n’ikpe, na ịma ndị niile na-adịghị asọpụrụ Chineke ikpe banyere omume ha niile nke asọpụrụghị Chineke, bụ́ ndị ha mere n’ụzọ asọpụrụghị Chineke, nakwa banyere ihe niile na-awụ akpata oyi nke ndị mmehie na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.” (Jud 14, 15) Ihe mere Inọk ji kwuo okwu a ka ihe merela eme bụ n’ihi na ọ ga-emezurịrị. N’eziokwu, iju mmiri zuru ụwa ọnụ bibiri ndị ahụ na-anaghị asọpụrụ Chineke.

4. Olee ihe ndị na-egbochighị Noa ‘iso Chineke jee ije’?

4 Iju Mmiri ahụ bịara n’afọ 2370 T.O.A., mgbe ihe karịrị narị afọ isii na iri afọ ise gachara ka Inọk buru amụma a. Tupu Iju Mmiri ahụ, a mụrụ Noa, ya enwee ezinụlọ, ya na ụmụ ya ewuo ụgbọ. Ndị mmụọ ọjọọ nwoghara, yiri ahụ́ mmadụ, ha na ụmụ nwaanyị ndị mara mma enwee mmekọahụ, ha amụta ndị Nefilim. Omume ọjọọ na ime ihe ike bịakwara ju ebe niile n’ụwa mgbe ahụ. (Jen. 6:1-5, 9, 11) N’agbanyeghị ihe ndị a, “Noa so ezi Chineke jee ije,” o jikwa obi ike ‘kwusaa ezi omume.’ (Gụọ 2 Pita 2:4, 5.) Obi ike dịkwa anyị mkpa n’oge ikpeazụ a.

HA NWERE OKWUKWE NA OBI IKE

5. Olee otú Mozis si gosi na ya nwere okwukwe na obi ike?

5 Mozis nwere ụdị okwukwe na obi ike anyị kwesịrị iṅomi. (Hib. 11:24-27) Malite n’afọ 1513 T.O.A. ruo afọ 1473 T.O.A., Chineke họpụtara ya ka o si n’Ijipt dupụta ụmụ Izrel ma duo ha n’ala ịkpa. Ọ dị Mozis ka o rughị eru ịrụ ọrụ a, ma, o kwere ịrụ ya. (Ọpụ. 6:12) Ya na nwanne ya nwoke, bụ́ Erọn, gara n’ihu onye ọchịchị obi fere azụ bụ́ Fero ugboro ugboro ma jiri obi ike gwa ya banyere Ihe Otiti Iri ndị ahụ Jehova ji menye chi dị iche iche nke ndị Ijipt ihere ma napụta ndị ya. (Ọpụpụ isi 7-12) Mozis nwere okwukwe na obi ike n’ihi na Chineke nyeere ya aka otú o si enyere anyị.—Diut. 33:27.

6. Ọ bụrụ na ndị ọchịchị agbaa anyị ajụjụ, gịnị ga-enyere anyị aka iji obi ike gbaa àmà?

6 Anyị kwesịrị inwe obi ike ka Mozis n’ihi na Jizọs kwuru, sị: “A ga-akpụpụta unu n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze n’ihi m, ka ọ bụrụ àmà nye ha na ndị mba ọzọ. Otú ọ dị, mgbe ha na-enyefe unu, unu echegbula onwe unu banyere otú unu ga-esi ekwu okwu ma ọ bụ ihe unu ga-ekwu; n’ihi na a ga-enye unu ihe unu ga-ekwu n’oge awa ahụ; n’ihi na ọ bụghị unu onwe unu na-ekwu okwu, kama ọ bụ mmụọ nke Nna unu si n’ọnụ unu na-ekwu okwu.” (Mat. 10:18-20) Ọ bụrụ na ndị ọchịchị agbaa anyị ajụjụ, mmụọ Jehova ga-eme ka anyị nwee ike iji okwukwe na obi ike gbaara ha àmà otú ga-egosi na anyị na-akwanyere ha ùgwù.—Gụọ Luk 12:11, 12.

7. Olee ihe mere Jọshụa ji nwee obi ike, ihe agaakwara ya nke ọma?

7 Ihe nyeere Jọshụa, bụ́ onye nọchiri Mozis, aka inwe okwukwe na obi ike bụ na ọ mụrụ Iwu Chineke mgbe niile. N’afọ 1473 T.O.A., mba Izrel na-achọ ịbanye n’Ala Nkwa ahụ. Chineke gwara Jọshụa, sị: “Nwee obi ike, dịkwa ike nke ukwuu.” Ọ bụrụ na Jọshụa emee ihe a e nyere ya n’iwu, ọ ga-eji amamihe mee ihe, ihe agakwaara ya nke ọma. A gwakwara ya, sị: “Amala jijiji, atụkwala ụjọ, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị ebe ọ bụla ị na-aga.” (Jọsh. 1:7-9) Ọ ga-abụrịrị na okwu ndị a mere ka obi sikwuo Jọshụa ike. Chineke nọnyekwaara ya n’eziokwu. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na o meriri ọtụtụ mba ndị bi n’Ala Nkwa ahụ naanị n’afọ isii—n’ihe dị ka n’afọ 1467 T.O.A.

ỤMỤ NWAANYỊ NDỊ JI OBI IKE JEERE CHINEKE OZI

8. Olee otú Rehab si gosi na ya nwere okwukwe na obi ike?

8 Kemgbe ọtụtụ narị afọ, e nweela ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị ji obi ike jeere Jehova ozi. Dị ka ihe atụ, nwaanyị akwụna bụ́ Rehab, bụ́ onye Jeriko, nwere okwukwe na Chineke, kata obi zoo ndị nledo abụọ Jọshụa zigara Jeriko. Mgbe ndị akpụ obi eze obodo ahụ zitere bịara na nke Rehab ịchọ ndị nledọ ahụ, ọ gwara ha ihe ọzọ nke mere ka ha ghara inweta ndị nledo ahụ. E chebere ya na ezinụlọ ya mgbe ndị Izrel bibiri Jeriko. Rehab kwụsịrị àgwà ọjọọ o ji mere aka ọrụ, fee Jehova, ma mechaa ghọọ nne ochie Mesaya ahụ. (Jọsh. 2:1-6; 6:22, 23; Mat. 1:1, 5) Otú a ka Jehova si gọzie ya n’ihi okwukwe na obi ike o nwere!

9. Olee otú Debọra, Berak, na Jeel si gosi na ha nwere obi ike?

9 Mgbe Jọshụa nwụchara n’ihe dị ka n’afọ 1450 T.O.A., a họpụtara ndị ikpe ka ha na-eduzi ndị Izrel. Eze ndị Kenan bụ́ Jebin emegbuola ndị Izrel ruo afọ iri abụọ. Jehova mere ka onye amụma nwaanyị bụ́ Debọra gwa Onyeikpe Berak ka o mee ihe. Berak kpọkọtara puku ndị ikom iri n’Ugwu Tebọ ma jikere ibuso onyeisi ndị agha Jebin, bụ́ Sisera, agha. Sisera akpọrọla ndị agha ya na ụgbọ ịnyịnya ndị agha dị narị itoolu banye na ndagwurugwu Kaịshọn. Mgbe ndị Izrel banyere na ndagwurugwuru ahụ, Chineke mere ka e nwee idei mmiri nke mere ka ọgbọ agha ahụ bụrụ apịtị apịtị ma mee ka o siere ụgbọ ịnyịnya ndị Kenan ike ịgbapụ ọsọ. Berak na ndị agha ya meriri n’agha ahụ, “e wee jiri ihu mma agha gbuo ndị agha Sisera niile.” Sisera gbabara n’ụlọikwuu Jeel, ma Jeel gburu ya mgbe ọ na-ehi ụra. Ihe Debọra gwara Berak mezuru. Ọ bụ Jeel, bụ́ nwaanyị, nwetara “otuto” maka mmeri ha nwere. Debọra, Berak, na Jeel ji obi ike rụọ ọrụ e nyere ha. Nke a mere ka Izrel ghara ‘inwe nsogbu ọzọ ruo afọ iri anọ.’ (Ikpe 4:1-9, 14-22; 5:20, 21, 31) Ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom na-efe Chineke egosila na ha nwere ụdị okwukwe na obi ike a.

IHE ANYỊ GWARA MMADỤ NWERE IKE IME KA O NWEE OBI IKE

10. Olee ihe mere anyị nwere ike iji kwuo na ihe anyị gwara ndị ọzọ nwere ike ime ka ha nwee obi ike?

10 Ihe anyị gwara onye anyị na ya so na-efe Jehova nwere ike ime ka o nwee obi ike. Ihe karịrị puku afọ atọ gara aga, Eze Devid gwara nwa ya bụ́ Sọlọmọn, sị: “Nwee obi ike, dị ike, meekwa ihe. Atụla egwu, atụkwala ụjọ, n’ihi na Jehova Chineke, bụ́ Chineke m, nọnyeere gị. Ọ gaghị agbahapụ gị, ọ gaghịkwa ahapụ gị ruo mgbe a rụchara ọrụ dum metụtara ozi ụlọ Jehova.” (1 Ihe 28:20) Sọlọmọn ji obi ike rụọ ọmarịcha ụlọ nsọ Jehova na Jeruselem.

11. Olee otú ihe otu nwa agbọghọ ji obi ike kwuo si gbanwee ndụ otu nwoke?

11 Ihe dị ka puku afọ atọ gara aga, e nwere otu nwa agbọghọ onye Izrel ndị agha Siria nwụdere, ya aghọọrọ Neaman odibo. Neaman bụ onye ekpenta, bụrụkwa ọchịagha ndị Siria. Otu ụbọchị, nwa agbọghọ ahụ ji obi ike kwuo ihe nyeere Neaman aka. Ebe ọ ma banyere ọrụ ebube ndị Jehova si n’aka Ịlaịsha na-arụ, ọ gwara nwunye Neaman na ọ bụrụ na di ya agaa Izrel, onye amụma Chineke ga-agwọ ya. Neaman gara Izrel, a gwọkwara ya ọrịa ya, ya aghọọ onye na-efe Jehova. (2 Eze 5:1-3, 10-17) Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto nke hụrụ Chineke n’anya ka nwa agbọghọ ahụ, Chineke ga-eme ka ịkata obi gbaara ndị nkụzi gị, ụmụ akwụkwọ ibe gị, na ndị ọzọ àmà.

12. Olee ihe okwu Eze Hezekaya gwara ndị ọ na-achị mere ka ha nwee?

12 Ọ bụrụ na a gwa mmadụ okwu ọma mgbe ihe na-esiri ya ike, o nwere ike ime ka onye ahụ nwee obi ike. Mgbe ndị Asiria bịara ibuso Jeruselem agha n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ asatọ gara aga, Eze Hezekaya gwara ndị ọ na-achị, sị: “Nweenụ obi ike, dịkwanụ ike. Unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ n’ihi eze Asiria nakwa n’ihi ìgwè mmadụ so ya; n’ihi na ndị nọnyeere anyị karịrị ndị nọnyeere ya. Ogwe aka nke nọnyeere ya bụ anụ ahụ́, ma, ọ bụ Jehova bụ́ Chineke anyị nọnyeere anyị inyere anyị aka na iburu anyị agha.” Gịnị ka ha mere mgbe ọ gwachara ha okwu a? ‘Ha malitere inwe obi ike n’ihi ihe Hezekaya eze Juda kwuru.’ (2 Ihe 32:7, 8) N’otu aka ahụ, okwu ọma nwere ike ime ka anyị na Ndị Kraịst ibe anyị nwee obi ike mgbe a na-akpagbu anyị.

13. Olee otú Obedaya bụ́ odibo Eze Ehab si gosi na ya nwere obi ike?

13 Mgbe ụfọdụ, anyị na-egosi na anyị nwere obi ike ma anyị ghara ikwu okwu. Ihe dị ka puku afọ atọ gara aga, Obedaya, bụ́ odibo Eze Ehab, ji obi ike zoo otu narị ndị amụma Jehova, “mmadụ iri ise mmadụ iri ise n’ọgba,” ka Eze Nwaanyị bụ́ Jezebel ghara igbu ha. (1 Eze 18:4) Ọtụtụ ndị ohu Jehova taa echebela ụmụnna ha otú ahụ Obedaya, bụ́ onye na-atụ egwu Chineke, chebere ndị amụma Jehova. Otú ha si mee nke a bụ na ha jụrụ ịgwa ndị na-akpagbu ụmụnna ha otú ha ga-esi enweta ha.

ESTA—NWUNYE EZE, ONYE NWERE OBI IKE

14, 15. Olee otú Esta, bụ́ nwunye eze, si gosi na ya nwere okwukwe na obi ike, gịnịkwa ka nke a rụpụtara?

14 Esta bụ́ nwunye eze gosiri na ya nwere okwukwe siri ike, nweekwa ezigbo obi ike. O gosiri nke a mgbe Heman, bụ́ nwoke obi fere azụ, kpara nkata ka a laa ndị Juu niile nọ n’Alaeze Ukwu Peshia n’iyi ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ ise gara aga. Nkata a a kpara medịrị ka ndị Juu ruo uju, buo ọnụ ma jiri obi ha dum kpee ekpere! (Esta 4:1-3) Obi ezughị Esta ike. Mọdekaị, bụ́ nwa nwanne nna ya, zigaara ya otu akwụkwọ e dere iwu ahụ e nyere ka a laa ha n’iyi. Ọ gwakwara Esta ka ọ gakwuru eze ma rịọ eze ka a ghara igbu ndị Juu. Ma, nsogbu dịnụ bụ na a na-egbu onye ọ bụla bịakwutere eze ma ọ bụrụ na eze agwaghị ya bịa.—Esta 4:4-11.

15 Ma, Mọdekaị gwara Esta, sị: ‘Ọ bụrụ na ị gbachi nkịtị, nnapụta ga-esi n’ebe ọzọ bịa. Ònye ma ma ọ̀ bụ n’ihi oge dị otú a ka i ji ruo n’ọkwá ịbụ nwunye eze?’ Esta gwara Mọdekaị ka ọ kpọkọta ndị Juu nọ na Shushan ka ha na ya buoro ya ọnụ. Esta gwakwara ya, sị: “Mụ onwe m na ụmụ agbọghọ m ga-ebukwa ọnụ, e mesịa, m ga-agakwuru eze, bụ́ ihe iwu na-akwadoghị; ọ bụrụ na m ga-anwụ, ka m nwụọ.” (Esta 4:12-17) Esta mere ihe gosiri na o nwere obi ike, akwụkwọ Esta gosikwara na Chineke napụtara ndị Juu. N’oge anyị a, Ndị Kraịst e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ na-egosikwa na ha nwere obi ike mgbe a na-akpagbu ha. “Onye na-anụ ekpere” nọnyekwaara ha mgbe niile.—Gụọ Abụ Ọma 65:2; 118:6.

“NWEENỤ OBI IKE”

16. Olee ihe ndị na-eto eto nwere ike ịmụta n’aka Jizọs?

16 N’otu oge, mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ, a hụrụ ya n’ụlọ nsọ ka “ọ nọ ọdụ n’etiti ndị nkụzi, na-egekwa ha ntị ma na-ajụ ha ajụjụ.” Ihe ọzọkwa bụ na “nghọta o nwere na ihe ọ na-aza ha nọ na-eju ndị niile na-ege ya ntị anya.” (Luk 2:41-50) N’agbanyeghị na Jizọs dị obere mgbe ahụ, o nwere okwukwe na obi ike nke nyeere ya aka ịjụ ndị nkụzi tọrọ ya ajụjụ n’ụlọ nsọ. Ọ bụrụ na ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ eburu ihe a Jizọs mere n’uche, ọ ga-eme ka ha nwee ike ‘ịzara ọnụ ha n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ ha ihe mere ha ji nwee olileanya ahụ ha nwere.’—1 Pita 3:15.

17. Gịnị mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘nwee obi ike,’ oleekwa ihe mere anyị ji kwesị iji obi ike mee ihe a gwara anyị?

17 Jizọs gwara ndị ọzọ ka ha “nwee obi ike.” (Mat. 9:2, 22) Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Lee! Oge awa na-abịa, n’ezie, ọ bịawo, mgbe a ga-achụsasị unu, onye ọ bụla alaa n’ụlọ ya, unu ga-ahapụkwa naanị m; ma anọghị m naanị m, n’ihi na Nna m nọnyeere m. Agwawo m unu ihe ndị a ka unu wee site na mụ nwee udo. N’ụwa, unu na-enwe mkpagbu, ma nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.” (Jọn 16:32, 33) Ụwa kpọkwara anyị asị otú ọ kpọrọ ndị mbụ soro ụzọ Jizọs. Ma, ka anyị ghara ịdị ka ụwa. Ọ bụrụ na anyị ana-echeta otú Ọkpara Chineke si gosi na ya nwere obi ike, anyị ga-enwe ike ịhụ na ụwa a emerụghị anyị. Jizọs meriri ụwa, anyị nwekwara ike imeri ụwa.—Jọn 17:16; Jems 1:27.

“NWEE OBI IKE!”

18, 19. Olee otú Pọl onyeozi si gosi na ya nwere okwukwe na obi ike?

18 Pọl onyeozi diri ọtụtụ ọnwụnwa. E nwedịrị ụbọchị ndị Juu chọrọ ịdọri ya na Jeruselem ma a sị na ndị agha Rom abịaghị napụta ya. N’abalị ụbọchị ahụ, “Onyenwe anyị guzoro n’akụkụ ya, sị ya: ‘Nwee obi ike! N’ihi na dị ka ị nọworo na-agba àmà nke ọma n’ihe banyere m na Jeruselem, otú ahụkwa ka ị na-aghaghị ịgba àmà na Rom.’” (Ọrụ 23:11) Pọl mere ihe a a gwara ya.

19 Pọl baara “ndịozi ọkasị mma” mba n’atụghị ha egwu. Ndị a chọrọ imerụ ọgbakọ dị na Kọrịnt. (2 Kọr. 11:5; 12:11) Pọl adịghị ka ha, e nwere ọtụtụ ihe ndị gosiri na ọ bụ onyeozi. A tụrụ ya mkpọrọ, tie ya ihe, ya emee njem ndị gaara ata isi ya, kwụọ agụụ, akpịrị akpọọ ya nkụ, ya amụọ anya abalị ọtụtụ ugboro, ihe banyere ụmụnna ya echuokwa ya ụra. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 11:23-28.) Ihe ndị a niile gosiri na o nwere okwukwe na obi ike nakwa na Chineke nyere ya ike.

20, 21. (a) Nye ihe atụ nke ga-egosi na anyị kwesịrị ịna-egosi na anyị nwere obi ike. (b) Olee oge ndị anyị kwesịrị igosi na anyị nwere obi ike, oleekwa ihe obi kwesịrị isi anyị ike na a ga-emere anyị?

20 Ọ bụghị Ndị Kraịst niile ka a ga-akpagbu otú kpụ ọkụ n’ọnụ. Ma, anyị niile kwesịrị inwe obi ike ka anyị nwee ike idi ihe ndị na-abịara anyị ná ndụ. Iji maa atụ: Otu nwa okorobịa nọ na Brazil so n’otu òtù ọjọọ. Mgbe ọ mụwara Baịbụl, ọ chọpụtara na ya kwesịrị ịgbanwe otú o si ebi ndụ. Ma, ndị òtù ya na-egbukarị onye ọ bụla chọrọ ịpụ n’òtù ha. O kpere ekpere ma jiri Akwụkwọ Nsọ gosi onyeisi ha ihe mere na ọ gaghịzi anọ n’òtù ahụ. A hapụrụ ya n’emeghị ya ihe ọ bụla, ọ ghọkwara onye nkwusa Alaeze.

21 Onye na-enweghị obi ike agaghị ekwusali ozi ọma. Ndị Kraịst na-eto eto kwesịrị inwe obi ike ka ha wee nwee ike ịna-eme ihe ziri ezi mgbe niile n’ụlọ akwụkwọ. Ọ bụ onye nwere obi ike ga-enweli ike ịrịọ onye ọ na-arụrụ ọrụ ka o nye ya ohere ka ọ gaa ụbọchị atọ niile a ga-enwe mgbakọ distrikti. E nwere ọtụtụ ihe mmadụ kwesịrị inwe obi ike tupu ya enwee ike ime ha. Ma, n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara anyị, Jehova ga-anụ ‘ekpere anyị ji okwukwe kpee.’ (Jems 5:15) Ọ ga-enyekwa anyị mmụọ nsọ ka anyị nwee ike ‘inwe obi ike, dịkwa ike nke ukwuu’!

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 11]

Inọk ji obi ike kwusaa ozi ọma n’ụwa nke ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke juru

[Foto dị na peeji nke 12]

Jeel nwere obi ike, dịkwa ike