Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘O Mere Ka Ndị Mmadụ Na-agba M Nkiri’

‘O Mere Ka Ndị Mmadụ Na-agba M Nkiri’

Ihe Si n’Ebe Anyị Na-edebe Ihe Ochie

‘O Mere Ka Ndị Mmadụ Na-agba M Nkiri’

Mgbe onye ozi oge niile aha ya bụ Charlotte White rutere obodo Luwivel, Kentọki dị n’Amerịka, ọtụtụ mmadụ nọ na-ele ya ka ọ kpụ otu igbe nwere ụkwụ na-aga.

N’AFỌ 1908, ndị obodo na-ahụkarị ka Nwanna Nwaanyị White na-akpụgharị otu igbe akwụkwọ nwere ụkwụ. Nwanna nwaanyị ahụ sịrị: “Ọ bụ igbe a ka ndị mmadụ na-ekwu okwu ya mgbe niile, o mekwara ka ha na-agba m nkiri.”

Ndị Mmụta Baịbụl, bụ́ aha a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, chọpụtara na e kwesịrị inyere ndị mmadụ aka ịghọta eziokwu ndị bara uru ha mụtara ka ha na-amụsi Baịbụl ike. Ebe ọtụtụ ndị mụtara ihe Baịbụl na-akụzi bụ ná mpịakọta dị iche iche nke akwụkwọ bụ́ Millennial Dawn (nke e mechara kpọwa Studies in the Scriptures). Ndị Kraịst ndị ahụ, bụ́ ndị dị njikere ịga n’obodo ukwu na n’obodo nta dị iche iche, gara na-ekesara ndị ọzọ chọrọnụ akwụkwọ ahụ. Ihe ọtụtụ ndị na-akpọ akwụkwọ ndị a bụ “Ihe Ndị Na-enyere Ndị Mmụta Baịbụl Aka.”

N’afọ 1908, Nwanna Nwaanyị White na ndị ọzọ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa banyere Alaeze Chineke na-enyefe ndị mmadụ mpịakọta isii nke akwụkwọ a e kwesịrị ire $1.65 (dọla Amerịka). Kama inye ndị mmadụ akwụkwọ ahụ ozugbo, ha na-anara ha ọda ha tụrụ ma lọghachi n’ụbọchị a na-akwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa. A na-enyekarị ha obere ego n’ụbọchị ọ bụla ha butere akwụkwọ ahụ maka ego e mefuru iji bie ya. Otu onye na-ekwugide anyị katọrọ otú anyị si anara obere ego maka akwụkwọ ndị ahụ.

Malinda Keefer chetara mgbe ndị mmadụ na-atụ ọda ka e wetara ha ihe dị ka narị abụọ ma ọ bụ narị atọ n’otu izu. Otú ndị mmadụ si achọ akwụkwọ a n’ike n’ike mere ka o sie ike ịna-enyezu ha ole ha tụrụ ọda ya. Ihe mere o ji esi ike otú a bụ n’ihi na naanị mpịakọta nke isii nke akwụkwọ ahụ dị narị peeji asaa na iri anọ! Ndị na-ebipụta akwụkwọ a kwuru na ibugara ndị mmadụ akwụkwọ a abụghị obere ọrụ, karịchaa ma ọ bụrụ ụmụnna nwaanyị ga-ebuga ya. Ha kwukwara na mkpụrụ iri ise nke akwụkwọ a dị kilogram iri na asatọ n’arọ.

Nwanna James Cole rụpụtara ihe mere ka ọ dị mfe ịna-ebugara ndị mmadụ akwụkwọ ahụ. Ọ rụrụ ihe nwere ụkwụ abụọ e nwere ike ịdọnye igbe ma jiri nọọtụ hịọnye igbe ahụ na ya. Ebe ọ bụ na ọ dịghịzi mkpa ka ọ na-ebu katọn ndị ahụ akwụkwọ ndị dị arọ juru, ọ sịrị: “Anaghịzi m ebo ubu m ibu arọ.” Ná mgbakọ e nwere n’afọ 1908 na Sinsinati, Ohayo ka o gosiri ndị bịara mgbakọ ahụ ihe ọhụrụ a, obi tọkwara ha ụtọ. E biri aha ihe ọhụrụ a, ya bụ Dawn-Mobile, na bọtịn ndị e ji akpọchi igbe ahụ. Ihe mere e ji kpọọ ya aha a bụ n’ihi na ihe a na-ejikarị ya ebu bụ mpịakọta dị iche iche nke akwụkwọ bụ́ Millennial Dawn. Ọ naghị ete aka mmadụ amụta otú e si akpụ igbe a aga ebe dị iche iche ma akwụkwọ ju ya. Ọ dịzi mfe iji otu aka kpụrụ igbe ọtụtụ akwụkwọ juru na-agagharị. E nwere ike ịgbatulata igbe ahụ nwere ụkwụ ma ọ bụ gbalitekwuo ya, e nwekwara ike ịkpụrụ igbe ahụ na-aga n’ụzọ ụgbọala na-agba. Ọ bụrụ na e jiri igbe a nwere ụkwụ gachaa ozi ọma, e nwere ike ịpịakọta ya otú ọ ga-adị mfe ịkpụrụ igbe ahụ akwụkwọ na-adịghịzi na-aga n’okporo ụzọ ma ọ bụ buru ya n’ụgbọala.

E nwere ike inye ụmụnna nwaanyị, ndị bụ́ ndị ozi oge niile, igbe akwụkwọ a nwere ụkwụ na-anaghị ha ego. Ma, a sị ka e rewe ya, a ga-ere ya $2.50 (dọla Amerịka). Nwanna Nwaanyị Keefer, onye foto ya dị na peeji a, ma nnọọ otú e si akpụ igbe akwụkwọ a nwere ụkwụ nke na o nwere ike iji otu aka kpụrụ igbe a ma jiri aka nke ọzọ sere akpa e tinyere akwụkwọ. Ebe ọ bụ na ọ hụrụ ọtụtụ ndị chọrọ ka e wetara ha akwụkwọ ahụ n’otu n’ime ebe ndị a na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ime ala na Pensụlvenịa, dị n’Amerịka, ọ na-agafere àkwà mmiri aga ebugara ha akwụkwọ a ugboro atọ ma ọ bụ ugboro anọ kwa ụbọchị.

N’afọ 1987, otu onye na-anya ụgbọelu rụrụ otu igbe nwere ụkwụ, bụ́ nke a na-ahụkarị taa n’ọdụ ụgbọelu nakwa n’okporo àmà nke obodo ndị na-ekwo ekwo. Ma, ihe dị ka otu narị afọ gara aga, a na-agba Ndị Mmụta Baịbụl nkiri ka ha na-akpụgharị igbe nwere ụkwụ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma si na Baịbụl.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 32]

Nwanna Nwaanyị Keefer na-agafe àkwà mmiri aga ebugara ndị mmadụ akwụkwọ a ihe dị ka ugboro atọ ma ọ bụ ugboro anọ kwa ụbọchị

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 32]

O mere ka ibu akwụkwọ Millennial Dawn dị mfe