Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ịdị Mma Dị n’Aka Nri Gị Ruo Mgbe Ebighị Ebi”

“Ịdị Mma Dị n’Aka Nri Gị Ruo Mgbe Ebighị Ebi”

Akụkọ Ndụ

“Ịdị Mma Dị n’Aka Nri Gị Ruo Mgbe Ebighị Ebi”

Dị ka Lois Didur si kọọ

Ugboro ole ka i kwurula ihe dị ka, ‘A sị na m ma, agaraghị m eme ihe ahụ m mere’? Ka m jerela ozi oge niile ruo afọ iri ise, enweghị m ike icheta nsogbu ọ bụla na-adịte aka ịnọ n’aka nri Jehova kpataara m. Ka m kọọrọ gị ihe mere m ji kwuo otú ahụ.

A MỤRỤ m n’afọ 1939. Enwere m ụmụnne nwaanyị anọ na otu nwanne nwoke. Anyị toro n’obodo Saskachewan nke dị na Kanada. Ebe anyị bi bụ n’ugbo, ibi ebe ahụ tọkwara anyị ụtọ. Otu ụbọchị, Ndịàmà Jehova bịara zie papa m ozi ọma. Ajụrụ m ha ma Chineke ò nwere aha. Ha gosiri anyị aha ya bụ́ Jehova n’Abụ Ọma 83:18, nke mere ka m chọọ ịmatakwu banyere Chineke na Okwu ya, bụ́ Baịbụl.

N’oge ahụ, ụmụaka ndị bi n’ugbo na-aga ụlọ akwụkwọ ndị na-enwe naanị otu ọnụ ụlọ. Ha na-anọ n’otu ọnụ ụlọ ahụ ruo mgbe ha gụchara klas nke abụọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ha na-agba ịnyịnya ma ọ bụ jiri ụkwụ gaa ọtụtụ kilomita tupu ha eruo. Ọ bụ ezinụlọ dị iche iche n’obodo anyị na-elekọta onye nkụzi. Otu afọ, o ruuru nne m na nna m ilekọta onye nkụzi bịara ọhụrụ, nke aha ya bụ John Didur.

Amaghị m na nwa okorobịa a nwekwara mmasị n’Okwu Chineke. Otu ụbọchị, m nọ na-eto ọchịchị Kọmunist na ọchịchị ọhaneze, bụ́ ọchịchị abụọ papa m na-akwado. John ji nwayọọ sị m: “E nweghị mmadụ ọ bula kwesịrị ịchị mmadụ ibe ya. Ọ bụ naanị Chineke kwesịrị ịchị.” Ihe a o kwuru mere ka mụ na ya kwurịta ugboro ugboro banyere Chineke.

Ebe ọ bụ na a mụrụ John n’afọ 1931, ọ nụla otú agha si mee ka ihe siere ndị mmadụ ike. Mgbe Agha Koria malitere n’afọ 1950, ọ jụrụ ndị ụkọchukwu dị iche iche ma Onye Kraịst ò kwesịrị ịga agha. Ha niile kwuru na Ndị Kraịst kwesịrị iso gaa agha. O mesịrị jụọ Ndịàmà Jehova ajụjụ ahụ. Ha ji Baịbụl gosi ya otú Ndị Kraịst mbụ si lee ịga agha anya. E mere John baptizim n’afọ 1955. E mekwara m baptizim n’afọ na-eso ya. Anyị abụọ ma na anyị chọrọ iji ike anyị na ndụ anyị fee Jehova. (Ọma 37:3, 4) N’ọnwa Julaị afọ 1957, mụ na John lụrụ.

Ụbọchị anyị ji echeta agbamakwụkwọ anyị na-adabakarị mgbe anyị nọ ná mgbakọ distrikti. Obi na-adị anyị ụtọ na anyị na ọtụtụ puku ndị na-akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù nọ. Mgbe mbụ anyị gara mgbakọ mba niile bụ n’afọ 1958. Anyị mmadụ ise ji ụgbọala si Saskachewan gawa Niu Yọk Siti. Anyị gbakata, chi jie, anyị arahụ n’ụlọikwuu. Anyị mere otú ahụ ruo otu izu. Otu ụbọchị, anyị hụrụ otu nwanna nwoke na Betlehem dị na Pensụlvenịa. Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ mgbe ọ gwara anyị ka anyị bịa hie n’ụlọ ya n’abalị ahụ! Ihe ọma ahụ o meere anyị mere ka anyị nwee ike ijikere nke ọma ma gawa Niu Yọk Siti. Mgbakọ ukwu ahụ mere ka anyị ghọta na ife Jehova na-atọ ezigbo ụtọ! Dị ka ọbụ abụ ahụ kwuru, “ịdị mma dị n’aka nri [Jehova] ruo mgbe ebighị ebi.”—Ọma 16:11.

ỊSỤ ỤZỌ

Ka otu afọ gachara, ya bụ, n’afọ 1959, anyị malitere ịsụ ụzọ oge niile ma biri n’obere ụlọ ụgbọala na-adọkpụ, nke dị n’elu ugwu n’obodo Saskachewan. I nwere ike ịnọ n’ebe ahụ hụ ebe dị ezigbo anya, ụfọdụ ebe ndị ahụ bụcha ókèala anyị.

Otu ụbọchị, anyị nwetara otu akwụkwọ ozi mere anyị obi ụtọ, nke si n’alaka ụlọ ọrụ. Agbapụrụ m gaa gosi ya John n’ebe ọ na-arụzi traktọ. E ji akwụkwọ ozi ahụ gwa anyị ka anyị gaa bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo Red Lek dị n’Ọnterio. Ebe ọ bụ na anyị amaghị ebe ahụ, anyị weere map ozugbo ka anyị mata ebe obodo ahụ dị.

Ya na ugbo ebe ahụ anyị bibu eyitụdịghị! Ugbu a anyị bi n’ebe e nwere oké ọhịa na obere obodo ndị dị n’akụkụ ebe a na-egwute ọlaedo. Ka anyị na-achọ ụlọ n’ụbọchị mbụ anyị ruru ebe ahụ, otu nwata nwaanyị nụrụ ka anyị na-ajụ onye agbata obi ha ma ò nwere ụlọ ọ ga-enye anyị. Nwatakịrị ahụ gbalara gaa gwa mama ya. Mama ya gosiri anyị ebe anyị ga-ehi n’abalị ahụ. Anyị hiri n’àkwà dị n’ụlọ dị n’okpuru ala nke e ji ájá nkịtị rụọ. N’echi ya, anyị chọtara ụlọ e ji osisi rụọ, nke nwere ọnụ ụlọ abụọ. Pọmpụ na oche adịghị na ya. Naanị ihe e nwere na ya bụ otu drọm e ji mere ekwú, nke na-eme ka ụlọ kpoo ọkụ. Anyị zụtara ihe ole na ole n’ebe a na-ere ihe ochie. N’oge na-adịghị anya, anyị nwetara ihe zuuru anyị.

Ọgbakọ dị anyị nso dị ihe karịrị narị kilomita abụọ na itoolu. Ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ n’ebe ahụ a na-egwute ọlaedo si Yurop. Ha gwara anyị ka anyị wetara ha Baịbụl n’asụsụ nke ha. N’oge na-adịghị anya, anyị malitere ịmụrụ mmadụ iri atọ Baịbụl. Tupu ọnwa isii agafee, a malitere otu obere ọgbakọ n’ebe ahụ.

Di otu nwaanyị anyị na-amụrụ ihe kpọrọ ụkọchukwu ha na fon ka ọ bịa kọwaara nwunye ya na ihe anyị na-akụzi abụghị eziokwu. Mgbe ụkọchukwu ahụ bịara, o kwuru na anyị kwesịrị ịna-akụzi Atọ n’Ime Otu na ozizi ndị ọzọ. Nwaanyị ahụ wetara Baịbụl ndị Katọlik ma gwa ụkọchukwu ahụ ka o gosi ya ebe ihe ndị ọ na-ekwu dị na Baịbụl. Ụkọchukwu ahụ tụpụrụ Baịbụl ahụ n’elu tebụl, kwuo na ọ bụghị iwu na ya ga-egosi ya ebe ọ dị na Baịbụl. Mgbe ọ na-ala, o ji asụsụ Yukrenian gwa ha ka ha chụpụ anyị n’ụlọ ha, kwụsịkwa ịnabata anyị. Ọ maghị na John na-anụ asụsụ ahụ!

Ka obere oge gachara, anyị hapụrụ Red Lek n’ihi na a chọrọ ịzụ John ka ọ bụrụ onye nlekọta sekit. Ma, mgbe ihe dị ka otu afọ gachara, mgbe John na-ekwu okwu baptizim n’otu mgbakọ distrikti, di nwaanyị ahụ so ná ndị a ga-eme baptizim! Ihe ahụ ụkọchukwu ahụ mere mere ka o kpebie iji aka ya chọpụta ihe Baịbụl na-akụzi.

ỌRỤ SEKIT

Mgbe anyị nọ n’ọrụ sekit, obi na-adị anyị ezigbo ụtọ na anyị na ezinụlọ dị iche iche na-ebi. Anyị na ndị ahụ anyị biri na nke ha ghọrọ ezigbo ndị enyi. E nwere mgbe anyị biri n’otu ụlọ elu nke na-enweghị ihe e ji eme ka ụlọ kpoo ọkụ n’oge oyi. Nwanna nwaanyị anyị bi n’ụlọ ha mere agadi. Ma n’isi ụtụtụ, anyị na-anụ mgbe ọ na-eji nwayọọ abata n’ime ụlọ anyị, mụnye ọkụ n’otu obere stovu. Ọ nọtụ, ya ebutere anyị bezin mmiri ọkụ anyị ga-eji saa ahụ́. Amụtara m ọtụtụ ihe n’otú o si eji nwayọọ eme ihe.

Ọrụ sekit nyeere m aka ịbịarukwu Jehova nso. N’otu sekit dị n’Albeta, e nwere otu nwanna nwaanyị bi n’otu obodo nke so n’ebe a na-egwute ọlaedo n’ebe ugwu Kanada. Gịnị ka nzukọ Jehova na-emere nwanna nwaanyị ahụ bi n’ebe ahụ dịpụrụ adịpụ? Ọnwa isii ọ bụla, anyị na-eji ụgbọelu aga ebe ahụ, soro ya jee ozi otu izu, nweekwa ọmụmụ ihe otú ahụ a na-emere ọgbakọ dị ná nnukwu obodo. Ihe ahụ na-echetara anyị na Jehova na-eji obiọma elekọta obere atụrụ ya ọ bụla.

Anyị na ọtụtụ ndị anyị nọrọ n’ụlọ ha na-ezirịta ozi. Ọ na-eme ka m cheta otu n’ime onyinye ndị mbụ John nyere m, nke bụ́ otu igbe mara mma akwụkwọ e ji ede ihe juru. Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ iji akwụkwọ ndị ahụ edegara ndị enyi anyị akwụkwọ ozi. Ruokwa taa, ejighị m igbe akwụkwọ ozi ahụ egwuri egwu.

Mgbe anyị nọ n’otu sekit dị na Toronto, otu nwanna nwoke si na Betel dị na Kanada kpọọ anyị na fon, jụọ anyị ma ànyị ga-achọ ịbịa jewe ozi na Betel. Oleekwanụ mgbe ọ sịrị anyị zaa ya? Ọ sịrị anyị zaa ya n’echi ya ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume! Anyị zakwara ya n’echi ya.

OZI BETEL

Mgbe ọ bụla a gbanweere anyị ọrụ, anyị na-ahụ ụzọ dị iche Jehova si egosi anyị ịdị mma ya. Anyị nọgidere na-ahụ ya mgbe anyị kwagara Betel n’afọ 1977. Mkpakọrịta anyị na ụfọdụ ndị e tere mmanụ nyeere anyị aka ịhụ àgwà dị iche iche ha nwere nakwa otú ha si were Okwu Chineke kpọrọ ihe.

Otú e si hazie ihe na Betel masịrị anyị. Dị ka ihe atụ, anyị na-etinyezi uwe anyị na drọwa kama ịpịanye ha n’igbe, anyị nọkwa n’otu ọgbakọ. E wezụga ọrụ e kenyere m na Betel, ọ na-atọ m ụtọ mgbe niile ịkpọgharị ndị bịara ịhụ Betel. M na-akọwara ha ọrụ anyị na-arụ na Betel, nụ ihe ha nwere ikwu, zaakwa ajụjụ ha.

Afọ gafere ngwa ngwa. N’afọ 1997, a kpọrọ John ka ọ gaa Ụlọ Akwụkwọ Ndị Kọmitii Alaka na Patasịn dị na Niu Yọk. E mechara jụọ anyị ma ànyị ga-achọ ịkwaga Yukren. A gbara anyị ume ka anyị chebara ya echiche nke ọma ma kpee ekpere banyere ya. N’abalị ụbọchị ahụ, anyị matara na anyị ga-ekweta ịga.

E ZIGARA ANYỊ YUKREN

N’afọ 1992, anyị gara mgbakọ mba niile e mere na Sent Pitasbọg dị na Rọshịa, gaakwa nke e mere na Kiev dị na Yukren n’afọ 1993. Mgbakọ ndị ahụ mere ka anyị hụkwuo ụmụnna anyị ndị bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop n’anya. Ebe ọhụrụ anyị bi na Luvif dị na Yukren dị n’okpukpu nke abụọ n’otu ụlọ ochie. Anyị na-anọ na windo ya ahụ otu ụlọ nwere obere ubi, otu nnukwu oké ọkpa, na ọtụtụ nnekwu ọkụkọ. Ọ dị anyị nnọọ ka ànyị nọ n’ugbo anyị dị na Saskachewan. Anyị dị mmadụ iri na abụọ mgbe anyị bi n’ebe ahụ. N’isi ụtụtụ, a na-eji ụgbọala bịa buru anyị gaa ọrụ na Betel, nke dị n’akụkụ nke ọzọ nke obodo ahụ.

Olee otú obi dị anyị mgbe anyị bi na Yukren? Okwukwe ọtụtụ ụmụnna ndị ahụ siri ezigbo ike n’agbanyeghị ọnwụnwa, mmachibido iwu na mkpọrọ a tụrụ ha. Ọnụnọ anyị nọrọ n’etiti ha mere ka anyị mụta ịdị umeala n’obi. Mgbe ọ bụla anyị jara ha mma, ha na-asị, “Anyị meere ya Jehova.” E nweghị mgbe ọ dị ha ka Jehova ọ̀ hapụrụ ha. Ugbu a, i kelee mmadụ maka ihe o meere gị, o nwere ike ịsị gị, “Ekele dịrị Jehova,” iji gosi na ọ bụ n’aka Jehova ka ihe ọma niile si.

Na Yukren, ọtụtụ ndị na-eji ụkwụ aga ọmụmụ ihe. N’ihi ya, ha na-enwe ohere ikwurịta okwu na ịgbarịta ibe ha ume. O nwere ike iwe ha otu awa ma ọ bụ karịa. E nwere ihe karịrị ọgbakọ iri ise na Luvif, iri abụọ na otu n’ime ha na-amụ ihe n’otu nnukwu ụlọ nwere ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ụbọchị Sọnde, obi na-adị m ụtọ ịhụ ka ọtụtụ ụmụnna na-abịa ọmụmụ ihe ma ọ bụ na-ala.

N’oge na-adịghị anya, ahụ́ malitere iru anyị ala mgbe anyị na ụmụnna ndị ebe ahụ nọ. Ha dị umeala n’obi, na-achọkwa inyere ndị ọzọ aka. E nwee ihe siiri m ike ịghọta n’asụsụ ha, dị ka ọ ka na-esiri m, ha na-ewetu obi nyere m aka. Ihu ha na okwu ọma ha na-egosi na ha nwere ndidi.

Mgbakọ mba niile e mere n’afọ 2003 na Kiev gosiri otú ụmụnna anyị si tụkwasị ibe ha obi. Anyị nọ n’otu ọdụ ụgbọ okporo ígwè dị n’okpuru ala nke na-ekwo ekwo. Otu nwata nwaanyị abịakwute anyị ma wetuo obi, sị, “Efuru m efu. Ahụkwaghị m nne nne m.” Nwata nwaanyị ahụ hụrụ baajị anyị, mata na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Obi kara ya, o beghịkwa ákwá. Otu nwunye onye nlekọta sekit anyị na ya nọ ji nwayọọ kpọga nwata nwaanyị ahụ n’Ebe A Na-edebe Ihe Ndị Furu Efu n’ámá egwuregwu ahụ. N’oge na-adịghị anya, nwatakịrị ahụ hụrụ nne nne ya. O metụrụ m n’ahụ́ mgbe m hụrụ otú obi si sie nwatakịrị ahụ ezigbo ike n’agbanyeghị na ọ nọ n’etiti ìgwè mmadụ.

Ụmụnna si n’ọtụtụ mba bịa Yukren na Mee n’afọ 2001 maka ịrara alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ anyị nye Jehova. Mgbe e kwuchara okwu pụrụ iche n’otu ámá egwuregwu n’ụtụtụ ụbọchị Sọnde, ìgwè ụmụnna ji ụkwụ na-agbagote n’okporo ụzọ ịbịa hụ Betel ọhụrụ ahụ. Agaghị m echefu ya echefu! O mere m obi ụtọ ịhụ ka ụmụnna ndị ahụ ji nwayọọ na-abịa. O mere ka m ghọtakwuo na ijere Chineke ozi na-eme ka anyị hụ ịdị mma ya.

NNUKWU MGBANWE

Ọ dị mwute na n’afọ 2004, a chọpụtara na John na-arịa kansa. Anyị gara Kanada ka a gwọọ ya. Ahụ́ ya anabataghị ọgwụ mbụ e nyere ya. N’ihi ya, ọ nọrọ izu ole na ole n’ebe a na-elekọta ndị ọrịa ha siri ike. Obi dị m ụtọ na o mechara mata ebe ọ nọ. N’agbanyeghị na ọ naghị ekwu okwu nke ọma, ihu ya na-egosi na obi dị ya ụtọ maka ndị niile bịara ileta ya.

Ma ọ gbakeghị n’ọrịa ahụ. Ọ nwụrụ na Nọvemba afọ ahụ. Ọ dị m ka nnukwu ihe ọ̀ pụrụ m n’ahụ́. Ozi mụ na John jeere Jehova tọrọ anyị ezigbo ụtọ. Gịnị ka m ga-eme? Ekpebiri m ịlaghachi Yukren. Obi dị m ezigbo ụtọ maka ezi ịhụnanya ezinụlọ Betel na ọgbakọ dị n’ebe ahụ gosiri m.

O nweghị mgbe anyị kwara ụta maka mkpebi ndị anyị mere. Ndụ anyị biri tọrọ anyị ụtọ, meekwa ka anyị nwee ezigbo ndị enyi. Ama m na a ka nwere ọtụtụ ihe m ga-amụta banyere ịdị mma Jehova. Enwekwara m olileanya ịnọgide na-ejere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi n’ihi na, n’eziokwu, ahụla m ‘ịdị mma nke dị n’aka nri Jehova.’

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

“O nweghị mgbe anyị kwara ụta maka mkpebi ndị anyị mere”

[Foto dị na peeji nke 3]

Mgbe mụ na John lụrụ

[Foto dị na peeji nke 4]

Mgbe m bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche na Red Lek dị n’Ọnterio

[Foto dị na peeji nke 5]

Mụ na John na Yukren n’afọ 2002