Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Biko, Seenụ Anyị Foto!”

“Biko, Seenụ Anyị Foto!”

“Biko, Seenụ Anyị Foto!”

Mgbe a gbasara n’ụbọchị nke abụọ n’otu mgbakọ distrikti, otu nwanna nwoke aha ya bụ Josué, nke nọ na Betel dị na Meksiko, gara ilegharị anya n’obodo Keretaro. Di na nwunye bụ́ ndị Kolombia, aha ha bụ Javier na Maru, bịakwara ilegharị anya. Ha gwara Josué ka o see ha foto. N’ihi otú Josué na ndị enyi ya bụ́kwa Ndịàmà Jehova si jikere nke ọma ma tinye baajị mgbakọ, di na nwunye ahụ jụrụ ha ma hà gara ememme ngụcha akwụkwọ ma ọ bụ ememme ọzọ pụrụ iche. Josué kọwaara ha na ọ bụ mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova ka ha bịara, kpọọkwa ha ka ha bịa nke ụbọchị Sọnde.

Di na nwunye ahụ kwuru na ha agaghị abịali mgbakọ ahụ n’ihi na ha ejighị ejiji e ji aga ụdị ihe ahụ. N’agbanyeghị ihe ahụ ha kwuru, Josué gwara ha aha ya, nyekwa ha nọmba fon alaka ụlọ ọrụ ebe ọ na-arụ.

Mgbe ọnwa anọ gachara, o juru Josué anya na o nwetara ozi Javier. Di na nwunye ahụ mechara gaa mgbakọ distrikti ahụ. Ugbu a, ha chọrọ ka Ndịàmà Jehova bịa mụwara ha Baịbụl n’ebe ha bi mgbe ahụ na Meksiko Siti. N’oge na-adịghị anya, a malitere ịmụrụ Javier na Maru ihe, ha amalite ịga ọmụmụ ihe ozugbo. Mgbe ọnwa iri gachara, ha ghọrọ ndị nkwusa. N’agbanyeghị na ha kwagara Toronto dị na Kanada, ha akwụsịghị ime nke ọma n’ọgbakọ, e mekwara ha baptizim.

Javier mechara detara Josué akwụkwọ ozi, gwa ya ihe mere ha ji nata eziokwu. O dere, sị: “Tupu mụ na nwunye m agawa mgbakọ ahụ, anyị kwuru na anyị kwesịrị ịmụ Okwu Chineke. Mgbe anyị hụrụ otú unu si jie ejiji dị mma, obi anyị gwara anyị na ọ ga-abụrịrị na unu gara nnọkọ pụrụ iche. Mgbe anyị gara mgbakọ ahụ, obi dị anyị ezigbo ụtọ otú e si jiri obiọma nye anyị oche, nyere anyị aka na-asapeta ebe a na-agụ na Baịbụl, na otú ndị bịara mgbakọ ahụ si kpaa àgwà. Ha achọghịdị ịma na anyị jiri ejiji ka ndị bịara ilegharị anya.”

N’ezie, Josué chọpụtara na ihe ahụ Eze Sọlọmọn maara ihe kwuru bụ eziokwu! Sọlọmọn dere, sị: “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ekwekwala ka aka gị zuo ike ruo n’anyasị; n’ihi na ị maghị ebe ọ ga-eme nke ọma, ma ọ̀ bụ n’ebe a ma ọ bụ n’ebe ahụ, ma ọ̀ bụ na ha abụọ ga-adịcha mma.” (Ekli. 11:6) Ì nwere ike ịgha mkpụrụ, ya bụ, iji ohere ọ bụla i nwere gwa ndị ọzọ banyere mgbakọ distrikti ma ọ bụ okwu ihu ọha a ga-enwe n’oge na-adịghị anya? Jehova nwere ike isi n’aka gị dọta ndị dị ka Javier na Maru, bụ́ ndị agụụ Okwu Chineke na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ ịnụ ya.—Aịza. 55:1.

[Foto dị na peeji nke 32]

Si n’aka ekpe gaa n’aka nri: Alejandro Voeguelin, Maru Pineda, Alejandro Pineda, Javier Pineda, na Josué Ramírez n’alaka ụlọ ọrụ dị na Meksiko