Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Elela Anya “n’Ihe Ndị Dị n’Azụ”

Elela Anya “n’Ihe Ndị Dị n’Azụ”

Elela Anya “n’Ihe Ndị Dị n’Azụ”

“Ọ dịghị onye ọ bụla nke jidere aka n’ọ́gụ̀ ma na-ele anya n’ihe ndị dị n’azụ nke kwesịrị nnọọ ekwesị maka alaeze Chineke.”—LUK 9:62.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

․․․․․

Gịnị mere anyị ji kwesị ‘icheta nwunye Lọt’?

․․․․․

Olee ihe atọ anyị na-ekwesịghị ịna-eche banyere ha?

․․․․․

Olee otú anyị ga-esi soro nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ?

1. Gịnị ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, oleekwa ajụjụ e kwesịrị ịjụ?

“CHETANỤ nwunye Lọt.” (Luk 17:32) Okwu a Jizọs Kraịst kwuru ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga iji dọọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị dị mkpa ugbu a karịa ka ọ dịtụrụla. Ma, gịnị mere Jizọs ji kwuo ihe ahụ? Ndị Juu ọ gwara okwu ahụ ghọtara ihe okwu ya pụtara. Ha ma ihe mere nwunye Lọt. Mgbe ya na ndị ezinụlọ ya si obodo Sọdọm na-agbapụ, o nupụụrụ Chineke isi ma lee anya n’azụ, ghọọ ogidi nnu.—Gụọ Jenesis 19:17, 26.

2. Gịnị nwere ike ịbụ ihe mere nwunye Lọt ji lee anya n’azụ, gịnịkwa mere ya n’ihi isi o nupụrụ?

2 Ma gịnị mere nwunye Lọt ji lee anya n’azụ? Ọ̀ ga-abụ na ọ chọrọ ịhụ ihe na-eme? Ka ọ̀ ga-abụ na o kwetaghị na obodo ahụ na-agba ọkụ ka ọ̀ bụ na okwukwe ya esighị ike? Ka ọ̀ bụ na ọ chọrọ ịga were ihe ndị ọ hapụrụ na Sọdọm? (Luk 17:31) Ihe ọ sọkwara ya bụrụ, nnupụisi ahụ tara isi ya. Chegodị echiche! Ọ nwụrụ n’ụbọchị ahụ e gburu ndị na-eme omume rụrụ arụ bi na Sọdọm na Gọmọra. Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji kwuo, sị: “Chetanụ nwunye Lọt”!

3. Gịnị ka Jizọs kwuru iji gosi na anyị ekwesịghị ile anya n’azụ?

3 N’oge anyị a kwa, anyị ekwesịghị ile anya n’azụ dị ka nwunye Lọt. Jizọs mesiri okwu a ike n’ihe ọ gwara otu nwoke gwara ya na ya chọrọ ịga sị ndị ezinụlọ ya ka e mesịa tupu ya abụrụ onye na-eso ụzọ ya. Jizọs sịrị ya: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke jidere aka n’ọ́gụ̀ ma na-ele anya n’ihe ndị dị n’azụ nke kwesịrị nnọọ ekwesị maka alaeze Chineke.” (Luk 9:62) Ihe Jizọs zara nwoke ahụ ọ̀ bụ ihe na-agaghị ekwe omume ka ò gosiri na obi tara Jizọs mmiri? Mba, n’ihi na ọ maara na ihe mere nwoke ahụ ji rịọ arịrịọ ahụ bụ na ọ chọrọ ihe ọ ga-akụgide aka hapụ ime ihe o kwesịrị ime. Jizọs kwuru na ihe ahụ nwoke ahụ chọrọ ime bụ ‘ile anya n’ihe ndị dị n’azụ.’ Ma onye jidere aka n’ọ́gụ̀ ò letụrụ anya n’azụ ma ò dewere ọ́gụ̀ ya tụgharịa, ò nwere ihe dị iche? Nke ọ bụla o mere, uche ya apụọla n’ihe ọ na-eme, ọ gaghịkwa arụ ọrụ ya nke ọma.

4. Olee ebe anyị kwesịrị ilekwasị anya?

4 Kama ilewe anya n’ihe ndị gara aga, anyị kwesịrị ịna-ele anya n’ihe ndị dị n’ihu. Ilu 4:25 mere ka o doo anya, sị: “Anya gị abụọ kwesịrị ilegide n’ihu, ee, anya gị nke na-enwu gbaa kwesịrị ilegide n’ihu gị.”

5. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ile anya n’ihe ndị dị n’azụ?

5 E nwere ezigbo ihe mere na anyị ekwesịghị ile anya n’ihe ndị dị n’azụ. Gịnị ka ọ bụ? Anyị bi “n’oge ikpeazụ.” (2 Tim. 3:1) Ihe a na-aga ibibi abụghị ajọ obodo abụọ, dị ka Sọdọm na Gọmọra, kama ọ bụ ụwa dum nke na-eme ajọ omume. Gịnị ga-enyere anyị aka izere ụdị ihe ahụ mere nwunye Lọt? Anyị kwesịrị ibu ụzọ mata ihe ndị ahụ dị n’azụ, bụ́ ihe ndị anyị nwere ike ịchọ ile anya. (2 Kọr. 2:11) Ka anyị tụlezie ha, matakwa otú anyị nwere ike isi zere ilekwasị ha anya.

ICHE NA OGE GARA AGA KA MMA

6. Gịnị mere na ihe ụfọdụ anyị na-echeta banyere oge gara aga nwere ike ọ gaghị abụcha otú ha dị?

6 Otu ihe nwere ike itinye anyị ná nsogbu bụ iche na ihe niile ka mma n’oge gara aga. Ihe anyị na-echeta banyere oge gara aga nwere ike ọ gaghị abụcha otú ọ dị. E nwere ike anyị agaghị ama mgbe anyị ji chewe na anyị enwechaghị nsogbu n’oge gara aga nakwa na obi dị anyị ụtọ mgbe ahụ karịa ugbu a, ya eyizie ka ihe ọ̀ dịịrị anyị mma n’oge gara aga karịa otú ọ dị. Anyị chewe otú ahụ, o nwere ike ịdị anyị ka ihe dịghachi otú ọ dị n’oge ahụ. Ma Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Asịla: ‘Gịnị mere oge gara aga ji dị mma karịa oge a?’ n’ihi na ọ bụghị amamihe ka i ji jụọ ihe a.” (Ekli. 7:10) Gịnị mere ụdị echiche ahụ ji dị njọ?

7-9. (a) Gịnị mere ndị Izrel n’Ijipt? (b) Olee ihe Jehova meere ndị Izrel kwesịrị ime ka ha nwee obi ụtọ? (ch) Gịnị ka ndị Izrel malitere ịtamu ntamu banyere ya?

7 Chegodị ihe mere ndị Izrel n’oge Mozis. Mgbe ha gara Ijipt, a nabatara ha ka ndị ọbịa. Ma mgbe Josef nwụrụ, ndị Ijipt mere “ka ndị isi ọrụ mmanye bụrụ ndị isi [ndị Izrel] iji na-emegbu ha n’ibu arọ ha na-ebu.” (Ọpụ. 1:11) Fero mechara nye iwu ka e gbuo ụmụ nwoke Izrel niile a mụrụ ọhụrụ n’ihi na ọ chọghị ka ndị Izrel mụbaa. (Ọpụ. 1:15, 16, 22) Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji gwa Mozis, sị: “N’ezie, ahụwo m ahụ́ a na-emekpa ndị m bụ́ ndị nọ n’Ijipt, anụwokwa m mkpu ákwá ha na-eti n’ihi ndị na-amanye ha ịrụ ọrụ; n’ihi na m maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe.”—Ọpụ. 3:7.

8 Chegodị ụdị obi ụtọ ndị Izrel nwere mgbe ha si n’ala Ijipt pụọ ma nwere onwe ha! Ha hụrụ ike Jehova kpara mgbe o tiri Fero dị mpako na ndị ya Ihe Otiti Iri. (Gụọ Ọpụpụ 6:1, 6, 7.) Ndị Ijipt mechara kwe ka ndị Izrel laa. N’eziokwu, ndị Ijipt gwara ndị Izrel ka ha pụọ n’ala ha ọsọ ọsọ, nyekwa ha ọtụtụ ọlaọcha na ọlaedo nke na e nwere ike ikwu na ndị Chineke ‘gbawara ndị Ijipt aka.’ (Ọpụ. 12:33-36) Ndị Izrel ṅụrịkwara ọṅụ mgbe ha hụrụ ka Fero na ndị agha ya nwụrụ n’Oké Osimiri Uhie. (Ọpụ. 14:30, 31) Ihe ọma niile ahụ ha hụrụ Jehova meere ha kwesịrị ime ka okwukwe ha sie ezigbo ike!

9 O siri ike ikweta na obere oge Jehova rụchaara ha ọrụ ebube ahụ, ha malitere ịtamu ntamu. Maka gịnị? Maka nri! Ihe Jehova nyere ha gbụrụ ha, ha ana-ekwu, sị: “Anyị na-echeta azụ̀ anyị na-ata n’Ijipt n’efu, tinyere kukumba na wọtamelọn na lik na yabaasị na galik! Ma ugbu a, ike agwụla mkpụrụ obi anyị. O nweghị ihe ọ bụla ọzọ anya anyị na-ahụ ma ọ bụghị mana.” (Ọnụ Ọgụ. 11:5, 6) Echiche ha gbagọrọ agbagọ nke na ha chọdịrị ịlaghachi n’Ijipt gaa gbawakwa ohu! (Ọnụ Ọgụ. 14:2-4) Ndị Izrel lere anya n’ihe ndị dị n’azụ ma kpasuo Jehova iwe.—Ọnụ Ọgụ. 11:10.

10. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ndị Izrel mere?

10 Gịnị ka ihe ahụ kwesịrị ịkụziri anyị? Mgbe nsogbu bịaara anyị ma ọ bụ mgbe ihe siiri anyị ike, anyị ekwesịghị ichewe na ihe kaara anyị mma n’oge gara aga, ikekwe tupu anyị amụta eziokwu Baịbụl. Ọ bụghị ihe ọjọọ ma anyị tụgharịa uche n’ihe anyị mụtara n’ihe ndị mere anyị n’oge gara aga ma ọ bụ cheta ihe ọma ndị meere anyị. Ma, anyị ekwesịghị iche na ihe niile ka mma n’oge ahụ. Ọ bụrụ na anyị echee otú ahụ, anyị agazighị enwe obi ụtọ n’otú ihe dịịrị anyị ugbu a, ọ ga na-agụsikwa anyị agụụ ike ibiwe ụdị ndụ anyị biri na mbụ.—Gụọ 2 Pita 2:20-22.

IHE NDỊ ANYỊ HAPỤRỤ N’OGE GARA AGA

11. Olee otú ụfọdụ si ele ihe ndị ha hapụrụ n’oge gara aga anya?

11 Ọ dị mwute na ọ na-abụ ụfọdụ ndị cheta ihe ndị ha hapụrụ n’oge gara aga, ha elewe ha anya ka ihe ọma ndị funahụrụ ha. Ikekwe ị gaara aga mahadum, bụrụ onye a ma ama ma ọ bụ aka ji akụ̀, ma i kpebiri ịhapụ ihe ndị ahụ niile. Ọtụtụ ụmụnna anyị na-arụbu ọrụ na-enye ha ezigbo ego ma n’achụmnta ego ma ná ntụrụndụ ma n’agụmakwụkwọ ma n’egwuregwu, ma ha hapụrụ ihe ndị ahụ. Ọtụtụ afọ agafeela, ma ọgwụgwụ abịabeghị. Ị̀ na-eche otú ụwa gaara adịrị gị ma a sị na ị hapụghị ihe ndị ahụ?

12. Olee otú Pọl si lee ihe ndị ọ hapụrụ anya?

12 Pọl onyeozi hapụrụ ọtụtụ ihe mgbe ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ Kraịst. (Fil. 3:4-6) Olee otú o si lee ihe ndị ahụ ọ hapụrụ anya? Ọ gwara anyị, sị: “Ihe ndị bụụrụ m uru, m weere ha dị ka ihe na-abaghị uru n’ihi Kraịst.” Maka gịnị? O kwuru, sị: “Ana m agụ ihe niile n’ezie dị ka ihe na-abaghị uru n’ihi uru na-enweghị atụ nke ihe ọmụma banyere Kraịst Jizọs Onyenwe m bara. N’ihi ya, ekwerewo m ka ihe niile funahụ m, ana m agụkwa ha dị ka nnukwu ihe e kpofuru ekpofu, ka m wee rite uru n’ime Kraịst.” * (Fil. 3:7, 8) Otú ahụ onye kpofuru ihe e kwesịrị ikpofu ekpofu na-anaghị emecha kwawa mmakwaara, Pọl akwaghị ụta mgbe o chetara ihe ndị ahụ ọ hapụrụ n’ụwa. O cheghị na ihe ndị ahụ ka bara uru.

13, 14. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Pọl?

13 Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ma anyị chọpụta na anyị na-echekarị banyere ihe ndị anyị chere na ha bụ ihe ọma anyị gaara enweta? Anyị kwesịrị iṅomi Pọl. Olee otú anyị ga-esi ṅomie ya? Chee banyere ihe ùgwù i nwere ugbu a. Gị na Jehova dị ná mma, Jehova makwa na ị na-ekwesị ntụkwasị obi n’ozi ị na-ejere ya. (Hib. 6:10) Olee ihe ụwa a nwere ike inye anyị nke e nwere ike iji tụnyere ihe ndị Jehova na-enye anyị ugbu a na ndị ọ ga-enye anyị n’ọdịnihu?—Gụọ Mak 10:28-30.

14 Pọl kwuru ihe ọzọ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. O kwuru na ya ‘na-echefu ihe ndị dị n’azụ, na-amatịkwa onwe ya inweta ihe ndị dị n’ihu.’ (Fil. 3:13) Buru n’obi na Pọl kwuru ihe abụọ dị mkpa. Nke mbụ bụ na anyị kwesịrị ichefu ihe ndị dị n’azụ, ghara ịna-eji ike anyị na oge anyị eche banyere ha. Nke abụọ abụrụ na dị ka onye ọsọ ruwerela ebe ọ ga-agbaru, anyị kwesịrị ịna-amatị onwe anyị, ya bụ, ilekwasị anya n’ihe ndị dị n’ihu.

15. Olee uru anyị ga-erite ma anyị na-atụgharị uche n’ihe ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi mere?

15 Ọ bụrụ na anyị na-atụgharị uche n’ihe ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi mere ma n’oge gara aga ma n’oge anyị a, anyị ga-enwe ike ịnọgide n’ozi Jehova n’eleghị anya n’ihe ndị dị n’azụ. Dị ka ihe atụ, a sị na Ebreham na Sera nọgidere na-echeta obodo Ọọ, “ha gaara enwe ohere ịlaghachi.” (Hib. 11:13-15) Ma ha alaghachighị n’ebe ahụ. Mgbe mbụ Mozis hapụrụ Ijipt, ọ hapụrụ ihe dị ukwuu karịa ihe ndị Izrel ndị ọzọ hapụrụ mgbe ha si n’Ijipt pụta. Ma, Baịbụl ekwughị na ihe ndị ahụ ọ hapụrụ nọ na-agụ ya agụụ. Kama, Baịbụl gwara anyị na “o weere nkọcha nke Kraịst dị ka akụ̀ dị ukwuu karịa akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Ijipt; n’ihi na o legidere anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya.”—Hib. 11:26.

IHE NDỊ MERE ANYỊ N’OGE GARA AGA

16. Gịnị ka ihe ndị mere n’oge gara aga nwere ike ime ka anyị mee?

16 O doro anya na ọ bụghị ihe niile mere n’oge gara aga dịcha mma. Ikekwe, anyị na-echegbu onwe anyị banyere mmehie ndị anyị mere n’oge gara aga ma ọ bụ ihe ndị anyị mejọrọ. (Ọma 51:3) Ndụmọdụ e nyere anyị n’oge gara aga ka nwere ike ịna-ewute anyị. (Hib. 12:11) Anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị banyere otú e si megbuo anyị ma ọ bụ ihe anyị chere na ọ bụ mmegbu. (Ọma 55:2) Gịnị ka anyị nwere ike ime ka ihe ndị ahụ ghara ime ka anyị na-elekwasị anya n’ihe ndị dị n’azụ? Ka anyị tụlee ihe atụ atọ.

17. (a) Gịnị mere Pọl ji kwuo na ya bụ “onye dị ala karịa onye kasị nta n’ime ndị nsọ niile”? (b) Gịnị nyeere Pọl aka ka ọ ghara ịna-echegbu onwe ya n’ihi ihe ndị o mejọrọ?

17 Ihe ndị anyị mejọrọ. Pọl onyeozi kwuru na ya bụ “onye dị ala karịa onye kasị nta n’ime ndị nsọ niile.” (Efe. 3:8) Gịnị mere o ji kwuo otú ahụ? O kwuru, sị: “N’ihi na akpagburu m ọgbakọ Chineke.” (1 Kọr. 15:9) Cheedị otú obi ga na-adị Pọl mgbe ọ bụla ọ hụrụ ụmụnna ndị ahụ ọ kpagburu. Ma, kama ikwe ka ihe ahụ na-echegbu ya, o lekwasịrị anya n’obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke meere ya. (1 Tim. 1:12-16) N’ihi ya, o ji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi. Mmehie ndị Pọl mere n’oge gara aga so n’ihe ndị o kpebiri ichefu. Ọ bụrụ na anyịnwa elekwasị anya n’ebere Jehova meere anyị, anyị agaghị na-echegbu onwe anyị banyere ihe ndị gara aga anyị na-agaghị agbanweli, bụ́ ihe ga-eme ka ike gwụ anyị. Anyị ga-eji ike anyị na-arụ ọrụ Jehova nyere anyị.

18. (a) Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na ndụmọdụ e nyere anyị na-enye anyị nsogbu n’obi mgbe ọ bụla anyị chetara ya? (b) Olee otú anyị ga-esi mee ihe Sọlọmọn kwuru banyere ịnabata ndụmọdụ?

18 Ọ bụrụ na ndụmọdụ e nyere anyị wutere anyị. Ọ́ bụrụkwanụ na ndụmọdụ e nyere anyị na-enye anyị nsogbu n’obi mgbe ọ bụla anyị chetara ya? O nwere ike ịna-ewe anyị iwe ma ọ bụ na-ewute anyị, ike ana-agwụ anyị, nke nwere ike ime ka anyị ‘daa mbà.’ (Hib. 12:5) Ma ànyị ‘ledara’ ndụmọdụ ahụ anya n’ihi na anyị jụrụ ya ma ọ bụ na anyị ‘dara mbà’ n’ihi na anyị nabatara ya ma e mechaa, ike agwụ anyị, ọ bụ otu nsogbu ahụ ka ọ ga-akpatara anyị. Anyị agaghị ekwe ka ndụmọdụ ahụ baara anyị uru. Ọ ga-akacha mma ka anyị mee ihe Sọlọmọn kwuru, nke bụ́: “Jisie ịdọ aka ná ntị ike; ahapụla ya. Chekwaa ya, n’ihi na ọ bụ ya bụ ndụ gị.” (Ilu 4:13) Dị ka onye na-anya ụgbọala nke na-erubere iwu okporo ụzọ isi, anyị kwesịrị ịnabata ndụmọdụ, mee ihe a gwara anyị ma lekwasị anya n’ihe ndị dị n’ihu.—Ilu 4:26, 27; gụọ Ndị Hibru 12:12, 13.

19. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie okwukwe Habakọk na Jeremaya?

19 Mmegbu ma ọ bụ ihe anyị chere na ọ bụ mmegbu. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị anyị otú ọ dị onye amụma bụ́ Habakọk. Ọ kpọkuru Jehova ka ọ napụta ndị a na-emegbu emegbu, n’ihi na ọ ghọtaghị ihe mere Jehova ji kwe ka ihe ọjọọ na-eme. (Hab. 1:2, 3) Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị ṅomie okwukwe onye amụma ahụ, bụ́ onye kwuru, sị: “Ma mụ onwe m ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova; m ga-enwe aṅụrị n’ime Chineke nke nzọpụta m.” (Hab. 3:18) Dị ka Jeremaya onye amụma, ọ bụrụ na anyị ejiri okwukwe siri ike ‘na-echere’ Jehova, bụ́ Chineke nke ikpe ziri ezi, obi kwesịrị isi anyị ike na ihe niile ga-adị mma mgbe oge ruru.—Ákwá 3:19-24.

20. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ‘na-echeta nwunye Lọt’?

20 Anyị bi n’oge dị ezigbo mkpa. Ọtụtụ ihe dị mkpa na-eme ugbu a, a ka nwekwara ndị ga-eme n’oge na-adịghị anya. Ka onye ọ bụla n’ime anyị soro nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ. Ka anyị na-eme ihe Baịbụl dụrụ anyị ọdụ ka anyị mee, ya bụ, ile anya n’ihe ndị dị n’ihu kama ile anya n’ihe ndị dị n’azụ. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ ga-egosi na anyị ‘na-echeta nwunye Lọt’!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 N’asụsụ mbụ e ji dee Baịbụl, okwu ahụ e si sụgharịta “ihe e kpofuru ekpofu” pụtakwara “nsị,” na “ihe a tụpụụrụ nkịta.” Otu onye na-akọwa Baịbụl kwuru na ihe ahụ Pọl kwuru “gosiri na o kpebisiri ike ịgbakụta ihe ahụ azụ. O weere ya ka ihe na-abaghị uru na ihe na-asọ oyi. Ọ chọghịkwa ka e nwee ihe jikọrọ ya na ya.”

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]