Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma

Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma

Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma

“Kwusaa okwu Chineke, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ya.”—2 TIM. 4:2.

Ì NWERE IKE ỊKỌWA?

․․․․․

Gịnị mere Ndị Kraịst narị afọ mbụ ji jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma?

․․․․․

Olee ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ichefu na oge agwụla agwụ?

․․․․․

Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ?

1, 2. Olee ajụjụ ndị e kwesịrị ịtụle banyere ‘iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma’?

NDỊ chọrọ ịzọ ndụ ndị mmadụ na-ejikarị ịnụ ọkụ n’obi arụ ọrụ. Dị ka ihe atụ, onye ụlọ enyi ya na-agba ọkụ na-eji ọsọ aga enyere ya aka n’ihi na ọ ma na ọkụ ahụ nwere ike ịgbagbu mmadụ.

2 Ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị chọrọ inyere ndị mmadụ aka ka a zọpụta ha. N’ihi ya, anyị anaghị eji ozi ọma Alaeze Chineke nke Jizọs gwara anyị kwusaa egwuri egwu. Ma anyị anaghị apụ na-agbagharị n’echeghị echiche. Gịnịzi ka Pọl onyeozi bu n’obi mgbe ọ dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Kwusaa okwu Chineke, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ya”? (2 Tim. 4:2) Olee otú anyị ga-esi jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma? Gịnị mere o ji dị mkpa ka e jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ya?

GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ IJI ỊNỤ ỌKỤ N’OBI NA-EKWUSA OZI ỌMA?

3. Gịnị nwere ike ime ndị gere ntị na ndị na-egeghị ntị n’ozi ọma Alaeze Chineke?

3 I cheta na ozi ọma ga-eme ka a zọpụta ndị mmadụ, o nwere ike ime ka ị ghọta na i kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ya. (Rom 10:13, 14) Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe m sịkwara onye ajọ omume: ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ o wee hapụ mmehie ya, mewe ihe ziri ezi na ezi omume, . . . ọ ga-anọgide na-adị ndụ. Ọ gaghị anwụ. A gaghị echeta mmehie ya ọ bụla wee mee ya ihe n’ihi ya.” (Ezik. 33:14-16) N’eziokwu, Baịbụl kwuru na ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ‘ga-azọpụta onwe ha, zọpụtakwa ndị na-ege ha ntị.’—1 Tim. 4:16; Ezik. 3:17-21.

4. Gịnị mere o ji dị mkpa ka e jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaa okwu Chineke na narị afọ mbụ n’ihi ndị si n’ezi ofufe dapụ?

4 Ihe ga-eme ka anyị ghọta ihe mere Pọl ji dụọ Timoti ọdụ ka o jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwu okwu Chineke bụ ịtụle ihe o kwuru na 2 Timoti 4:2-4. O kwuru, sị: “Kwusaa okwu Chineke, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ya n’oge dị mma, n’oge nsogbu, jiri ogologo ntachi obi niile na nkà izi ihe dọọ aka ná ntị, baa mba, gbaakwa ndị mmadụ ume. N’ihi na a ga-enwe oge mgbe ha na-agaghị anabata ozizi ahụ na-enye ezi ndụ, kama, dị ka ha si chọọ, ha ga-akpọkọtara onwe ha ndị ozizi ka ha wee na-anụ ihe na-atọ ha ụtọ ná ntị; ha ga-ewepụkwa ntị ha ka ha ghara ịnụ eziokwu ahụ.” (2 Tim. 4:2-4) Jizọs buru amụma na ụfọdụ ga-amalite ịkụzi ozizi ụgha n’ọgbakọ. (Mat. 13:24, 25, 38) Ka oge ahụ na-eru, Timoti kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi kụzie “okwu Chineke” ma n’ime ọgbakọ ka a ghara iji ozizi ụgha duhie Ndị Kraịst. Okwu ahụ bụ okwu ọnwụ na ndụ. Ọ̀ gbasara anyị taa?

5, 6. Olee ihe ọtụtụ ndị anyị na-ezi ozi ọma kweere?

5 N’oge anyị a, e nweela ọtụtụ ndị si n’ezi ofufe dapụ n’ebe dị iche iche. (2 Tesa. 2:3, 8) Olee ozizi ụgha ndị na-atọ ndị mmadụ ụtọ taa? N’ọtụtụ ebe, a na-ezi ozizi evolushọn otú e si ezi ozizi chọọchị. N’agbanyeghị na a na-ewere evolushọn ka ozizi ndị ọkà mmụta sayensị, ọ fọrọ obere ka ọ ghọọ okpukpe. Ozizi ahụ emeela ka ndị mmadụ na-ele Chineke na ndị ọzọ anya otú na-ekwesịghị ekwesị. Ihe ọzọ a na-akụziri ọtụtụ ndị bụ na ihe banyere anyị anaghị emetụ Chineke n’obi, n’ihi ya, na anyị ekwesịghị ịna-eche banyere ya. Gịnị mere ozizi ndị a ji atọ ọtụtụ nde mmadụ ụtọ, nke mere ha ji ehi ụra ime mmụọ? Ọ bụ n’ihi na ozizi ndị a na-eme ka ha chee na ha nwere ike ime ihe ọ bụla masịrị ha n’ihi na ọ dịghị onye ga-ajụ ha ajụjụ. Ọ bụ ụdị ozizi a na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ.—Gụọ Abụ Ọma 10:4.

6 E nwere ozizi ndị ọzọ na-atọ ndị mmadụ ụtọ. Ụfọdụ ndị chọọchị chọrọ ka ndị pastọ ha na-agwa ha, sị, ‘Chineke hụrụ gị n’anya n’agbanyeghị ụdị ndụ ị na-ebi.’ Ndị isi chọọchị na-agwa ndị òtù ha ihe na-atọ ha ụtọ ná ntị, mee ka ha kweta na ime ememme okpukpe, ịga Mas, na iji ihe oyiyi efe ofufe ga-eme ka Chineke gọzie ha. Ndị ha na-agwa amaghị na isi otú ahụ efe ofufe nwere ike ịkpatara ha ọnwụ. (Ọma 115:4-8) Ma ọ bụrụ na anyị akpọtee ha n’ụra ime mmụọ ka ha ghọta eziokwu Baịbụl, ha nwere ike iketa Alaeze Chineke.

GỊNỊ KA IJI ỊNỤ ỌKỤ N’OBI EKWUSA OZI ỌMA PỤTARA?

7. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị ji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma?

7 Dọkịta anya ruru ala agaghị ekwe ka ihe ọ bụla dọpụ uche ya mgbe ọ na-awa mmadụ ahụ́ n’ihi na ọ ma na ndụ onye ahụ dị ya n’aka. Otú anyị ga-esi gosi na anyị ji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma bụ ilekwasị anya n’ihe anyị na-eme. Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ịna-eche banyere isiokwu, ajụjụ, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ nwere ike ịmasị ndị anyị na-ezi ozi ọma. Ịnụ ọkụ n’obi nwekwara ike ime ka anyị hazigharịa oge anyị iji gaa ozi ọma mgbe ndị mmadụ ga-akacha anabata anyị.—Rom 1:15, 16; 1 Tim. 4:16.

8. Olee ihe ọzọ onye ji ịnụ ọkụ n’obi eme ihe na-eme?

8 Ihe ọzọ onye ji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma na-eme bụ ibu ụzọ eme ihe ndị ka mkpa. (Gụọ Jenesis 19:15.) Dị ka ihe atụ, ka e were ya na dọkịta lechara gị ahụ́, sị gị: “N’eziokwu, i kwesịrị ilebara ọrịa gị anya ozugbo. Naanị otu ọnwa ka i nwere iji mee ihe ọ bụla ị ga-eme.” Ị gaghị esi n’ọfis ya tipụ ozugbo ka onye ụlọ ya na-agba ọkụ. Ị ga-ebu ụzọ jụọ ya ihe i kwesịrị ime, gị alazie, kpebie ihe ị ga-eme.

9. Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na Pọl ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma n’Efesọs?

9 Anyị ga-aghọta otú Pọl si jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma ma anyị gụọ ihe ọ gwara ndị okenye si Efesọs banyere ozi ọma o kwusara n’Eshia. (Gụọ Ọrụ 20:18-21.) Malite n’ụbọchị mbụ o ruru ebe ahụ, o ji oge ya niile na-aga n’ụlọ n’ụlọ na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma. Ruo afọ abụọ, “ọ na-ekwukwa okwu kwa ụbọchị n’ụlọ mgbakọ nke dị n’ụlọ akwụkwọ Tiranọs.” (Ọrụ 19:1, 8-10) O doro anya na ihe mere Pọl ji mee otú ahụ bụ na o ji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ya. Ihe mere e ji agba anyị ume ka anyị ‘jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma’ abụghị ka anyị rụgbuo onwe anyị n’ọrụ. Ma, ikwusa ozi ọma kwesịrị ịbụ ọrụ kacha mkpa anyị na-arụ.

10. Gịnị mere obi ji kwesị ịdị anyị ụtọ na Ndị Kraịst ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma n’ihe dị ka otu narị afọ gara aga?

10 Otú obere ìgwè Ndị Mmụta Baịbụl si malite ikwusa ozi ọma tupu afọ 1914 kụziiri anyị ihe ịnụ ọkụ n’obi pụtara. N’agbanyeghị na ha dị puku ole na ole mgbe ahụ, ha matara na ha kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, ha mekwara otú ahụ. Ha bipụtara ozi ọma n’ihe karịrị puku akwụkwọ akụkọ abụọ, gosikwa ndị mmadụ ihe nkiri a kpọrọ “Photo-Drama of Creation.” Ha si otú ahụ zie ọtụtụ nde mmadụ ozi ọma. Ọ bụrụ na ha ejighị ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke, olee otú ọtụtụ n’ime anyị gaara esi nụ ya?—Gụọ Abụ Ọma 119:60.

KPACHARA ANYA KA Ị GHARA ICHEFU NA OGE AGWỤLA AGWỤ

11. Gịnị mere ụfọdụ ejighịzi ịnụ ọkụ n’obi eje ozi ọma?

11 E nwee ihe na-emegharị Onye Kraịst anya, o nwere ike ichefu na ozi ọma anyị na-ekwusa dị ezigbo mkpa. Setan na-agbalị iji ụwa ya emegharị anyị anya ka anyị jiri obi anyị niile na-achụ ihe dị anyị mma na ihe ndị ọzọ na-adịghị mkpa. (1 Pita 5:8; 1 Jọn 2:15-17) E nwere ụfọdụ ndị jibu ozi Jehova kpọrọ ihe, ma ha mechara chefuo na oge agwụla agwụ. Were Dimas dị ka ihe atụ. Ya na Pọl onyeozi so rụkọọ ọrụ na narị afọ mbụ. Ma o mechara kwe ka ụwa Setan megharịa ya anya. Mgbe Pọl nọ ná nsogbu, Dimas hapụrụ ya, kama ịna-agba ya ume otú ọ na-emebu.—Faị. 23, 24; 2 Tim. 4:10.

12. Olee ohere anyị nwere ugbu a, oleekwa ihe ndị anyị ga-enwe ike ime ruo mgbe ebighị ebi?

12 Ọ bụrụ na anyị chọrọ iji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Chineke ozi, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike zere ihe ọ bụla ga-eme ka uche anyị pụọ n’ozi ọma anyị na-ekwusa. Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị “jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” (1 Tim. 6:18, 19) O doro anya na i kweere na ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe Alaeze Chineke ga na-achị ga-eme ka anyị nwee ike ime ọtụtụ ihe na-atọ anyị ụtọ. Ma, ọ bụ naanị ugbu a ka anyị nwere ike inyere ndị mmadụ aka ka ha ghara ịnwụ n’agha Amagedọn.

13. Ugbu a anyị ghọrọla Ndị Kraịst, olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ghọtara na oge agwụla agwụ?

13 Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị gbara anyị gburugburu n’ụwa a na-ehi ụra ime mmụọ, gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ichefu na oge agwụla agwụ? Anyị kwesịrị icheta na anyị na-ehibu ụra ime mmụọ. Ma, a kpọtere anyị. Dịkwa ka Pọl kwuru, Kraịst nwukwasịrị anyị. Ọ bụ ya mere anyị ji bụrụ ndị na-enye ìhè. (Gụọ Ndị Efesọs 5:14.) Mgbe Pọl kwuchara ihe ahụ, o dere, sị: “Na-echesinụ nche ike ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.” (Efe. 5:15, 16) N’ụwa ọjọọ a, anyị kwesịrị ‘ịzụta oge’ anyị ga-eji na-eme ihe ndị ga-eme ka anyị mụrụ anya.

ANYỊ BI N’OGE DỊ EZIGBO MKPA

14-16. Gịnị mere anyị ji kwesị iji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ?

14 Kemgbe ụwa, Ndị Kraịst na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma. Ma, iji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma adịla mkpa ugbu a karịa ka ọ dịtụrụla. Kemgbe afọ 1914, ihe ịrịba ama ahụ e buru amụma ya na Baịbụl na-emezu. (Mat. 24:3-51) E nwetụbeghị mgbe ụjọ na-atụ ndị mmadụ otú ọ na-atụ ha ugbu a na e nwere ike igbukpọ ndị niile bi n’ụwa. N’agbanyeghị na mba ndị kacha ike n’ụwa kwekọrịtara ime udo, ngwá agha ọgwụrụ mba ndị ha ka nwere dị ihe dị ka puku abụọ. E nwekwara ike ịgbapụ ha mgbe ọ bụla. Ndị ọkachamara ekwuola ọtụtụ mgbe na ihe ha ji akpụ ngwá agha ọgwụrụ mba efuola, na ha amaghị ndị weere ha. Ọ̀ ga-abụ na ụfọdụ ihe ndị ahụ abaala n’aka ndị na-eyi ọha egwu? Ụfọdụ ndị na-ekwu na agha otu onye na-eyi ọha egwu malitere nwere ike igbukpọ ndị bi n’ụwa. Ma, ọ bụghị naanị agha nwere ike igbu mmadụ niile.

15 N’afọ 2009, Mahadum dị na Lọndọn na otu akwụkwọ akụkọ bụ́ The Lancet bipụtara akụkọ banyere oge anyị a, sị: “Oké okpomọkụ na oké mmiri ozuzo bụ ihe kacha njọ nwere ike ịkpatara mmadụ niile bi n’ụwa ọrịa.” Akụkọ ahụ kwuru, sị: “Oké okpomọkụ na oké mmiri ozuzo ga-akpatara ọtụtụ ndị ọrịa n’ime afọ ndị na-abịanụ. O nwere ike ịta isi ọtụtụ ijeri mmadụ.” O nwekwara ike ịkpata ihe ndị ga-ebibi ọtụtụ obodo, ya bụ, ihe ndị dị ka oké osimiri itobiga ókè, ụkọ mmiri ozuzo, idei mmiri, ọrịa na-efe efe, oké ifufe, na agha a na-alụ n’ihi na akụnụba ezukwaghị ndị mmadụ. N’eziokwu, o yiri ka agha na ọdachi hà ga-egbu mmadụ niile bi n’ụwa.

16 Ụfọdụ ndị nwere ike iche na agha ọgwụrụ mba nwere ike ime ka “ihe ịrịba ama” ahụ Jizọs buru n’amụma mezuo. Ma, ọtụtụ ndị aghọtaghị ihe amụma ahụ Jizọs buru pụtara. Kemgbe ọtụtụ afọ, anyị ahụla ihe dị iche iche na-egosi na Kraịst anọrọla n’ocheeze ya nakwa na ọgwụgwụ ụwa ochie a adịla ezigbo nso. (Mat. 24:3) O nwebeghị mgbe ihe ndị ahụ Jizọs buru n’amụma mezurula otú ha si na-emezu ugbu a. Ndị mmadụ kwesịrị iteta n’ụra ime mmụọ ugbu a. Ozi ọma anyị na-ekwusa nwere ike ịkpọte ha.

17, 18. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ebe ọ bụ na anyị bi n’oge ikpeazụ? (b) Olee ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ malite ige ntị n’ozi ọma Alaeze Chineke?

17 Ọ bụ naanị obere oge ka anyị nwere ugbu a iji gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya ma kwusachaa ozi ọma ọ gwara anyị kwusaa n’oge ikpeazụ a. Ihe Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Rom baara anyị uru taa karịa otú ọ baara Ndị Kraịst n’oge ahụ. O kwuru, sị: “Unu maara oge ahụ a kara aka, na oge awa ahụ eruwo ka unu teta n’ụra, n’ihi na nzọpụta anyị dị nso ugbu a karịa mgbe anyị ghọrọ ndị kwere ekwe.”—Rom 13:11.

18 Ihe ndị e buru n’amụma banyere oge ikpeazụ a nwere ike ime ka ụfọdụ ndị mata na ha kwesịrị ime ka ha na Chineke dị ná mma. Ụfọdụ ndị chechaa otú ọchịchị ụmụ mmadụ sirila kụọ afọ n’ala, ha aghọta na mmadụ kwesịrị ịchọ ka Chineke nyere ya aka. Ha na-ahụ na ike adịghị ndị ọchịchị iwepụ ihe isi ike, ụjọ a na-atụ ngwá agha ọgwụrụ mba, mpụ, ime ihe ike, na mmetọ a na-emetọ ụwa. E nwekwara ndị na-amalite ige ntị n’ozi ọma n’ihi nsogbu ezinụlọ, dị ka ọrịa, ịgba alụkwaghịm, ma ọ bụ ọnwụ onye ha hụrụ n’anya. Anyị nwere ike inyere ndị dị otú ahụ aka ma ọ bụrụ na anyị na-ekwusa ozi ọma.

IHE ỤFỌDỤ NDỊ MERE MGBE HA GHỌTARA NA OGE AGWỤLA AGWỤ

19, 20. Gịnị ka ọtụtụ ụmụnna mere mgbe ha ghọtara na oge agwụla agwụ?

19 Ọtụtụ Ndị Kraịst ewepụtakwuola oge na-ekwusa ozi ọma n’ihi na ha ghọtara na oge agwụla agwụ. Dị ka ihe atụ, otu di na nwunye na-akatabeghị ahụ́ bi n’Ekwedọọ kpebiri ịkwụsị ibi ndụ okomoko mgbe ha gechara okwu ndị e kwuru n’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche nke afọ 2006, nke isiokwu ya bụ “Legide Anya Otu Ebe.” Ha depụtara ihe ndị ha nwere na-adịghị ha mkpa. N’ime ọnwa atọ, ha si n’ụlọ ha bibu nke nwere ọnụ ụlọ ihi ụra atọ kwaga n’ụlọ ọzọ nke nwere naanị otu ọnụ ụlọ ihi ụra, ree ụfọdụ ngwongwo ha, kwụchaakwa ụgwọ ha ji. N’oge na-adịghị anya, ha malitere ịsụ ụzọ inyeaka. Ha gafekwara n’ọgbakọ ebe e nwere mkpa ka ukwuu mgbe onye nlekọta sekit ha tụụrụ ha aro ka ha mee otú ahụ.

20 Otu nwanna nwoke bi n’Amerịka dere, sị: “Mgbe mụ na nwunye m gara mgbakọ sekit n’afọ 2006, o ruola afọ iri atọ e mere anyị baptizim. Mgbe anyị nọ n’ụgbọala na-alọta, anyị malitere ịtụle otú anyị ga-esi eme ihe e kwuru ná mgbakọ ahụ, ya bụ, itinyekwu oge n’ozi Jehova. (Mat. 6:19-22) Anyị nwere ụlọ atọ, ala, ụgbọala ndị oké ozu, otu ụgbọ mmiri, na otu ụgbọala nwere ihe ndị e ji ebi n’ụlọ. Anyị kpebiri ịmalite ozi oge niile n’ihi na anyị chọpụtara na anyị anaghị eme ihe anyị kwesịrị ịna-eme. N’afọ 2008, anyị sonyeere nwa anyị nwaanyị n’ọrụ ịsụ ụzọ oge niile. Obi dị anyị ezigbo ụtọ ugbu a na anyị na ụmụnna anyị na-arụkọkwu ọrụ. Anyị ekwusaala ozi ọma n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Anyị abịarukwuola Jehova nso n’ihi na anyị na-ewepụtakwu oge ejere ya ozi. Ihe kacha eme anyị obi ụtọ bụ na anyị na-ahụ ụdị obi ụtọ ndị mmadụ na-enwe ma ha ghọta eziokwu Baịbụl a kụziiri ha.”

21. Gịnị ka anyị ma nke mere anyị ji ekwusasi ozi ọma ike?

21 Anyị ma na “ụbọchị ikpe na ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” ga-abịakwasị ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya. (2 Pita 3:7) Anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa oké mkpagbu na-abịanụ na ụwa ọhụrụ nke ga-esochi ya n’ihi na anyị ma ihe Baịbụl kwuru. Anyị ka ji ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke, bụ́ ozi ga-eme ka ha nwee ezigbo olileanya. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-arụ ọrụ a, ọ ga-egosi na anyị hụrụ Chineke na ndị mmadụ n’anya n’eziokwu.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]