Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nyere Ndị Mmadụ Aka Ka Ha “Teta n’Ụra”

Nyere Ndị Mmadụ Aka Ka Ha “Teta n’Ụra”

Nyere Ndị Mmadụ Aka Ka Ha “Teta n’Ụra”

“Unu maara oge ahụ a kara aka, na oge awa ahụ eruwo ka unu teta n’ụra.”—ROM 13:11.

Ì NWERE IKE ỊKỌWA?

․․․․․

Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka Ndị Kraịst zere ụra ime mmụọ?

․․․․․

Olee ihe mere anyị kwesịrị iji mụrụ anya ma na-ege ntị nke ọma mgbe anyị nọ n’ozi ọma?

․․․․․

Olee uru obiọma bara n’ozi anyị?

1, 2. Olee ụdị ụra e kwesịrị ịkpọte ndị mmadụ na ya?

KWA afọ, ọtụtụ mmadụ na-anwụ n’ihi na ha roro ụra ma ọ bụkwanụ na ụra buuru ha mgbe ha na-akwọ ụgbọala. A na-achụkwa ụfọdụ ndị n’ọrụ n’ihi na ha etetaghị n’oge gaa ọrụ ma ọ bụ n’ihi na ụra buuru ha mgbe ha na-arụ ọrụ. Ma ụra ime mmụọ nwere ike ịkpata nsogbu karịa ụra nkịtị. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye mụ anya.”—Mkpu. 16:14-16.

2 Ka oké ụbọchị Jehova na-eru nso, ọtụtụ ndị na-ehi ụra ime mmụọ. Ụfọdụ ndị ndú Krisendọm ekwuodịla na ndị chọọchị ha na-ehi ụra. Gịnị bụ ụra ime mmụọ? Gịnị mere o ji dị mkpa ka ezi Ndị Kraịst mụrụ anya? Olee otú anyị ga-esi nyere ndị ọzọ aka iteta n’ụra?

GỊNỊ BỤ ỤRA IME MMỤỌ?

3. Olee otú ị ga-esi kọwaa onye na-ehi ụra ime mmụọ?

3 Ndị nọ n’ụra anaghị arụ ọrụ. Ma ndị na-ehi ụra ime mmụọ nwere ike ịna-arụsi ọrụ ike. Ma ihe ha na-arụ agaghị eme ka ha na Chineke dị ná mma. Ha nwere ike ịna-echegbu onwe ha maka ihe ndị dịịrị ha, otú ha ga-esi kporie ndụ, nweta ọkwá ma ọ bụ akụnụba. Ihe ahụ niile na-eme ka ha ghara inwe efe ife Chineke. Ma ndị mụ anya n’ụzọ ime mmụọ maara na anyị bi “n’oge ikpeazụ.” N’ihi ya, ha na-agbalịsi ike ime uche Chineke.—2 Pita 3:3, 4; Luk 21:34-36.

4. Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o kwuru, sị: “Ka anyị ghara ịnọ na-ehi ụra dị ka ndị ọzọ na-ehi”?

4 Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:4-8. N’ebe a, Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ibe ya ọdụ ka ha ghara “ịnọ na-ehi ụra dị ka ndị ọzọ na-ehi.” Gịnị ka ihe ahụ o kwuru pụtara? Otu ụzọ anyị nwere ike isi “na-ehi ụra” bụ ileghara iwu Jehova anya. Ụzọ ọzọ bụ ichefu na oge Jehova ga-ebibi ndị na-anaghị asọpụrụ ya adịla nso. Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ụdị ndị ahụ na-anaghị asọpụrụ Chineke ghara ime ka anyị mụta iche echiche na ịkpa àgwà ka ha.

5. Olee ihe ndị na-ehi ụra ime mmụọ na-eche?

5 Ụfọdụ ndị na-eche na e nweghị Chineke ga-ajụ ha ajụjụ maka ihe ndị ha na-eme. (Ọma 53:1) Ndị ọzọ chere na Chineke anaghị eche banyere ụmụ mmadụ, n’ihi ya, na ọ baghị uru ka anyị na-eche banyere Chineke. E nwekwara ndị chere na ọ bụ ịga chọọchị ga-eme ka ha bụrụ enyi Chineke. Ndị a niile na-ehi ụra ime mmụọ. Ha kwesịrị iteta. Olee otú anyị ga-esi nyere ha aka?

ANYỊ KWESỊRỊ ỊMỤRỤ ANYA

6. Gịnị mere Ndị Kraịst ji kwesị ịgbalịsi ike izere ụra ime mmụọ?

6 Anyị kwesịrị ịmụrụ anya, ka anyị nwee ike ịkpọte ndị ọzọ n’ụra. Gịnị ka ịmụ anya pụtara? Okwu Chineke kwuru na ndị na-arahụ ụra ime mmụọ na-arụ “ọrụ ndị dịịrị ọchịchịrị.” Ụfọdụ n’ime ọrụ ndị ahụ bụ oriri oké mkpọtụ, ịṅụ oké mmanya, mmekọahụ na-ezighị ezi, omume rụrụ arụ, esemokwu, na ekworo. (Gụọ Ndị Rom 13:11-14.) Izere ụdị omume ahụ nwere ike isiri anyị ike. Ịmụ anya dị anyị ezigbo mkpa. Ọ bụrụ na ọkwọ ụgbọala echee na o nweghị ihe ga-eme ya ma ụra buru ya mgbe ọ na-akwọ ụgbọala, o ji ndụ ya egwuri egwu. N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka Onye Kraịst ghọta na ụra ime mmụọ nwere ike ịkpatara ya ọnwụ!

7. Ọ bụrụ na anyị echee na ndị mmadụ enweghị ike ịgbanwe, olee otú anyị nwere ike isi na-eje ozi anyị?

7 Dị ka ihe atụ, Onye Kraịst nwere ike iche na ndị niile nọ n’ókèala ya enweghịzi mmasị n’ozi ọma nakwa na ha agaghị agbanwe. (Ilu 6:10, 11) O nwere ike ịnọ na-eche, sị, ‘Ọ bụrụ na o nweghị onye ga-ege ntị, gịnị mere m ga-eji na-agbalịsi ike inyere ndị mmadụ aka?’ Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị nwere ike ịna-arahụ ụra ime mmụọ ugbu a, ma ọnọdụ ha na àgwà ha nwere ike ịgbanwe. Ụfọdụ na-emecha teta ma nabata ozi ọma anyị. Anyị nwekwara ike inyere ha aka ma ọ bụrụ na anyị mụ anya. Otú anyị nwere ike isi nyere ha aka bụ ịmụta ụzọ ndị ọzọ anyị ga-esi zie ha ozi ọma, ya eruo ha n’obi. Otu ihe ga-egosi na anyị mụ anya bụ icheta ihe mere ozi anyị ji dị ezigbo mkpa.

GỊNỊ MERE OZI ANYỊ JI DỊ EZIGBO MKPA?

8. Gịnị mere ozi ọma anyị na-ekwusa ji dị ezigbo mkpa?

8 Cheta na n’agbanyeghị otú ndị mmadụ si ele ozi anyị anya ugbu a, ozi ọma anyị na-ekwusa na-ewetara Jehova otuto, o sokwa na-emezu nzube ya. N’oge na-adịghị anya, ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma ga-anata ntaramahụhụ ikpe ọmụma. Ihe a ga-eji kpee ndị mmadụ ikpe bụ ma hà nabatara ozi ọma anyị na-ezi ha ma ọ bụ na ha anabataghị ya. (2 Tesa. 1:8, 9) Onye Kraịst ekwesịghịkwa iche na ikwusasi ozi ọma ike abaghị uru ebe ọ bụ na “a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Okwu Chineke mere ka anyị ghọta na ndị Jizọs kpọrọ “ewu” “ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi.” Ozi ọma anyị na-ekwusa na-egosi na Chineke nwere obi ebere. Ọ na-eme ka ndị mmadụ gbanwee ma nweta “ndụ ebighị ebi.” (Mat. 25:32, 41, 46; Rom 10:13-15) Ọ bụrụ na anyị ekwusaghị ozi ọma, olee otú ndị mmadụ ga-esi nụ ozi ahụ nke nwere ike ime ka ha nweta ndụ?

9. Olee otú ikwusa ozi ọma sirila baara gị na ndị ọzọ uru?

9 Izisa ozi ọma na-abakwara anyịnwa uru. (Gụọ 1 Timoti 4:16.) Ị́ chọpụtabeghị na ịgwa ndị ọzọ banyere Jehova na Alaeze ya na-eme ka okwukwe gị sikwuo ike, meekwa ka ị hụkwuo Chineke n’anya? Ọ̀ bụ na o nyebereghị gị aka ịmụta àgwà Ndị Kraịst? Obi ọ́ naghị adị gị ụtọ n’ihi na ị na-aga ozi ọma iji gosi na ị hụrụ Chineke n’anya? Obi dị ọtụtụ ndị ụtọ n’ihi na mmụọ nsọ Chineke nyeere ndị ha kụziiri eziokwu Baịbụl aka ịgbanwe otú ha si ebi ndụ.

KA ANYA NA-ERU GỊ ALA

10, 11. (a) Olee otú Jizọs na Pọl si gosi na anya ruru ha ala? (b) Kọwaa otú ozi anyị nwere ike isi ka mma ma ọ bụrụ na anya na-eru anyị ala.

10 E nwere ụzọ dị iche iche e nwere ike isi mee ka ndị mmadụ malite inwe mmasị n’ozi ọma. N’ihi ya, anya kwesịrị ịna-eru Ndị Kraịst ala mgbe ha na-ekwusa ozi ọma. Anya ruru Jizọs ala. Ebe ọ bụ onye zuru okè, ọ ma mgbe iwe dị otu onye Farisii n’obi, mara mgbe otu nwaanyị bụ́ onye mmehie ji obi ya niile chegharịa, marakwa na otu nwaanyị di ya nwụrụ ji ihe niile o nwere nye onyinye. (Luk 7:37-50; 21:1-4) Jizọs nyeere onye ọ bụla n’ime ha aka n’ihi na ọ maara ihe dị ha mkpa. Anya nwekwara ike iru anyị ala n’agbanyeghị na anyị ezughị okè. Anya ruru Pọl onyeozi ala. Ọ gbanwere otú o si ezi ozi ọma iji ruo n’obi ụdị ndị dị iche iche.—Ọrụ 17:22, 23, 34; 1 Kọr. 9:19-23.

11 Ọ bụrụ na anyị na-agba mbọ ileru anya ala dị ka Jizọs na Pọl, anyị ga-ama otú anyị ga-esi mee ka ndị mmadụ nwekwuo mmasị n’ozi ọma anyị na-ezi ha. Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-eru mmadụ nso, legharịa anya ma è nwere ihe ndị ga-enyere gị aka ịmata omenala ya, ihe ndị na-amasị ya, ma ọ̀ lụọla di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na ọ lụbeghị, ma ọ bụkwanụ ma ò nwere ụmụ. I nwere ike ịhụ ihe ọ na-eme mgbe ahụ ma kwuo ihe ọma banyere ya mgbe ị na-amalite ịgwa ya okwu.

12. Mgbe anyị nọ n’ozi ọma, gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya n’ihe anyị na-akparịta?

12 Onye anya ruru ala anaghị ekwe ka ihe ọ bụla megharịa ya anya. Mgbe anyị nọ n’ozi ọma, mkparịta ụka anyị na onye anyị na ya na-arụ nwere ike ịgba anyị ume. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị ekwesịghị ichefu na ihe mere anyị ji aga ozi ọma bụ ka anyị zie ndị ọzọ ozi ọma. (Ekli. 3:1, 7) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ihe anyị na-akparịta mgbe anyị na-aga ozi ọma ghara igbochi anyị izi ndị ọzọ ozi ọma. Otu ihe ga-enyere anyị aka ilekwasị anya n’ozi anyị bụ ikwurịta ihe ndị anyị ga-agwa ndị nwere mmasị. Ọ bụ eziokwu na ekwe ntị nwere ike inyere anyị aka n’ozi ọma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ọ ghara ime ka anyị kwụsịtụ mkparịta ụka anyị na onye nwe ụlọ.

CHEBARA NDỊ Ị NA-EZI OZI ỌMA ECHICHE

13, 14. (a) Olee otú anyị nwere ike isi chọpụta ihe na-amasị mmadụ? (b) Gịnị nwere ike ime ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ihe gbasara Chineke?

13 Ọ bụrụ na anyị mụ anya, anya ana-erukwa anyị ala, anyị ga na-ege ndị anyị na-ezi ozi ọma ntị. Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ mmadụ n’ókèala anyị iji mee ka o kwuo otú obi dị ya? Ihe na-echu ya ụra ọ̀ bụ ọtụtụ okpukpe e nwere, ihe ike a na-eme n’ebe o bi, ka ọ̀ bụ otú ndị ọchịchị si kụọ afọ n’ala? Ì nwere ike ịgwa ya banyere ihe ndị dị ebube Chineke kere ma ọ bụ otú ndụmọdụ Baịbụl si baa uru, nke ga-eme ka ọ malite inwe mmasị n’ihe gbasara Chineke? Ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na ekpere na-amasị ndị si n’obodo ọ bụla, ọ na-amasịkwa ụfọdụ ndị na-ekweghị na Chineke dị. Ọtụtụ ndị na-eche ma è nwere onye na-anụ ekpere. Ndị ọzọ nwere ike ịna-ajụ onwe ha, sị: ‘Chineke ọ̀ na-anụ ekpere niile? Ọ bụrụ na ọ naghị anụ ekpere niile, gịnị ka anyị kwesịrị ime ka ọ nụ nke anyị?’

14 Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe banyere otú e si amalite mkparịta ụka ma ọ bụrụ na anyị eleruo anya n’otú ndị nkwusa bụ́ aka ochie si eme ya. Chọpụta otú ha si eme ka ọ ghara ịdị mmadụ ka hà na-ajụkasị ya ajụjụ ahụ́. Olee otú ụda olu ha na ihu ha si egosi na ha chọrọ ịghọta ihe onye nwe ụlọ bu n’obi?—Ilu 15:13.

JIRI OBIỌMA NA NKÀ NA-EZI OZI ỌMA

15. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe obiọma mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma?

15 Obi ọ̀ na-adị gị mma ma a kpọtee gị mgbe i himirila ụra? Ụfọdụ na-ewe iwe ma a kpọtee ha n’ike. Ọ na-akara ndị mmadụ mma ma e jiri nwayọọ kpọtee ha. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ịkpọte ndị na-ehi ụra ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ ewee iwe mgbe ị gara izi ya ozi ọma, gịnị ka ọ ga-akacha mma ka i mee? Wetuo obi gwa ya na ị ghọtara otú obi dị ya, kelee ya maka ịgwa gị eziokwu, jirikwa nwayọọ lawa. (Ilu 15:1; 17:14; 2 Tim. 2:24) Obiọma i gosiri onye ahụ nwere ike ime ka o gee ntị mgbe Onyeàmà Jehova ọzọ bịara na nke ya.

16, 17. Olee otú anyị ga-esi jiri nghọta na-ezi ozi ọma?

16 N’oge ndị ọzọ, i nwere ike ikwu ihe ụfọdụ iji mee ka onye na-achọghị ige ntị gbanwee obi ya. Mmadụ nwere ike ịsị gị, “Biko gaanụ ziwe ndị ọzọ. Enwere m okpukpe nke m na-ekpe” ma ọ bụ, “Achọghị m ozi ọma unu” naanị n’ihi na o chere na o kwuhaala otú ahụ, unu alawa. Ma i nwere ike iji nkà na obiọma jụọ ya ajụjụ ga-eme ka ọ chọọ ige ntị n’ozi ọma.—Gụọ Ndị Kọlọsi 4:6.

17 Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ ekwuo na ya enweghị efe, mgbe ụfọdụ, ọ ka mma ikweta ma hapụ ya. Ma, o nwere mgbe ị ga-enwe ike ikwu ihe ole na ole ga-abara onye ahụ uru. Ụmụnna ụfọdụ na-eji ihe na-erughị otu nkeji mepee Baịbụl ha, gụọ amaokwu ga-eme ka onye nwe ụlọ chee echiche, ma jụzie ya ajụjụ. Ime otú ahụ emeela ka ụfọdụ ndị nwe ụlọ kpebie na ha ga-egetụ ntị n’agbanyeghị ihe ha na-eme. Ọ́ gaghị adị mma ka ị gbalịa mee otú ahụ mgbe o kwere omume?

18. Olee ihe anyị nwere ike ime ka anyị nwee ike izikwu ozi ọma nke ọma mgbe anyị na-anọghị n’ozi?

18 Ọ bụrụ na anyị ejikere ikwusa ozi ọma mgbe ọ bụla, anyị ga-enwe ike ịgwa ndị anyị hụrụ mgbe anyị na-anọghị n’ozi ihe nwere ike ime ka ha nwee mmasị n’ozi ọma. Ọtụtụ ụmụnna na-etinye akwụkwọ anyị n’akpa ha ma ọ bụ n’akpa uwe ha. Ha nwekwara ike iburu n’uche otu amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ndị ọzọ ma ohere dapụta. I nwere ike ịgwa onye nlekọta ije ozi ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ nọ n’ọgbakọ unu ka ha nyere gị aka ịmụta otú e si eme ya.

JIRI NWAYỌỌ NA-AKPỌTE NDỊ IKWU GỊ

19. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịkwụsị ịgbalị inyere ndị ikwu anyị aka?

19 O doro anya na anyị chọrọ inyere ndị ikwu anyị aka ịnabata ozi ọma. (Jọsh. 2:13; Ọrụ 10:24, 48; 16:31, 32) Ọ bụrụ na ha egeghị anyị ntị mgbe mbụ anyị gbalịrị izi ha ozi ọma, o nwere ike ime ka anyị ghara ịchọ izi ha ozi ọma n’oge ọzọ. Anyị nwere ike iche na e nweghị ihe anyị nwere ike ime ma ọ bụ kwuo nke ga-eme ka ha gbanwee. Ma, ihe ụfọdụ nwere ike ime nke ga-agbanwe ndụ ndị ikwu gị ma ọ bụ otú ha si eche echiche. O nwekwara ike ịbụ na ị mụtakwuola otú e si akọwa Baịbụl. N’ihi ya, ha nwere ike ige gị ntị ugbu a.

20. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị jiri akọ na-agwa ndị ikwu anyị okwu?

20 Anyị ekwesịghị ileghara ihe ndị ikwu anyị chere anya. (Rom 2:4) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iwetu obi mgbe anyị na-agwa ha okwu otú ahụ anyị si eme mgbe anyị gara ozi ọma? Jiri obiọma na-agwa ha okwu, na-akwanyekwara ha ùgwù. Kama izi ha ozi ọma mgbe niile, ka omume gị gosi ha otú eziokwu ị mụtara sirila mee ka ndụ gị ka mma. (Efe. 4:23, 24) Mee ka ha hụ otú ndụ gị sirila gbanwee n’ihi na Jehova ‘kụziiri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru.’ (Aịza. 48:17) Ka àgwà gị gosi ndị ikwu gị na ị bụ ezigbo Onye Kraịst.

21, 22. Olee ihe otu nwanna nwaanyị kọrọ nke gosiri na ọ bara uru ka anyị nọgide na-agbalị inyere ndị ikwu anyị aka ịmụta banyere Jehova?

21 Otu nwanna nwaanyị dere n’oge na-adịbeghị anya, sị: “O teela m gbalịwara izi ụmụnne m dị iri na atọ ozi ọma, ma n’àgwà m ma n’okwu ọnụ m. M na-edere ha niile akwụkwọ ozi kwa afọ. Ma, ọ bụ naanị m bụ Onyeàmà Jehova n’ezinụlọ anyị ruo iri afọ atọ.”

22 O kwukwara, sị: “Otu ụbọchị, m kpọrọ otu nwanne m nwaanyị bi n’ebe dị ezigbo anya n’ekwe ntị. Ọ gwara m na ya gwara onyeisi chọọchị ha ka ọ mụọrọ ya Baịbụl, ma o nweghị isi. Mgbe m sịrị ya na m ga-amụrụ ya Baịbụl, ya asị m: ‘Ọ dị mma, ma ihe m na-agwa gị bụ: O nweghị ihe ga-eme ka m bụrụ Onyeàmà Jehova.’ M zigaara ya akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, na-akpọkwa ya n’ekwe ntị kwa ụbọchị ole na ole. Ma, o mepebeghị akwụkwọ ahụ. M mechaziri gwa ya ka o weta akwụkwọ ya, anyị jikwa ihe dị ka nkeji iri na ise gụọ amaokwu ole na ole e depụtara na ya, kwurịtakwa banyere ha n’ekwe ntị. Mgbe anyị mere otú ahụ ugboro ole na ole, ọ chọrọ ka anyị na-ejizi ihe karịrị nkeji iri na ise na-amụ ihe. Ọ maliteziri iji aka ya akpọ m ka anyị mụọ ihe. Mgbe ụfọdụ, ọ na-akpọdị m mgbe m na-etetabeghị n’ụtụtụ ma ọ bụ ugboro abụọ n’ụbọchị. E mere ya baptizim n’afọ na-esonụ, mgbe otu afọ gakwara, ọ malitere ịsụ ụzọ.”

23. Gịnị mere na ike ekwesịghị ịgwụ anyị ka anyị na-agbalị inyere ndị mmadụ aka iteta n’ụra ime mmụọ?

23 Iji nyere ndị mmadụ aka iteta n’ụra ime mmụọ, anyị kwesịrị iji nkà na-ezi ha ozi ọma. Anyị kwesịkwara ịna-agbasi mbọ ike. Ọtụtụ ka na-abata n’ọgbakọ n’ihi ozi ọma anyị na-ezi. A na-eme ihe dị ka iri puku mmadụ abụọ baptizim kwa ọnwa. N’ihi ya, ka anyị cheta ndụmọdụ Pọl nyere Akịpọs, nke bụ́: “Na-eche ozi ahụ ị nabatara n’ime Onyenwe anyị nche, ka i wee jezuo ya.” (Kọl. 4:17) Isiokwu na-esonụ ga-eme ka anyị mata ihe iji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma pụtara.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Igbe dị na peeji nke 13]

IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA ỊMỤRỤ ANYA

▪ Na-eme uche Chineke mgbe niile

▪ Zere ọrụ ndị dịịrị ọchịchịrị

▪ Mata na ụra ime mmụọ nwere ike ịkpata ọnwụ

▪ Echela na ndị nọ n’ókèala unu enweghị ike ichegharị

▪ Mụta ụzọ ndị ọhụrụ ị ga-esi na-ezi ndị ọzọ ozi ọma

▪ Cheta na ozi gị dị mkpa