Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:

Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe Sọlọmọn mere?

Chineke gọziri Eze Sọlọmọn, meekwa ka ọ rụọrọ ya ọtụtụ ihe. Ma, mgbe Sọlọmọn na-achị, ọ kwụsịrị ime ihe Chineke kwuru. Ọ lụrụ ada Fero, bụ́ onye na-ekpere arụsị, lụọkwa ọtụtụ ụmụ nwaanyị. O kwekwara ka ụmụ nwaanyị ndị ahụ mee ka ọ malite ikpere arụsị. Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara iji nwayọọ nwayọọ mụta ịkpa àgwà ọjọọ ma ọ bụ iche echiche ọjọọ. (Diut. 7:1-4; 17:17; 1 Eze 11:4-8)—12/15, peeji nke 10-12.

Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na Sera bụ nwaanyị na-atụ egwu Chineke, bụrụkwa ezigbo nwunye?

Mgbe Chineke gwara Ebreham ka ọ hapụ obodo Ọọ, ọ pụtara na ọ ga-ahapụ ndị ezinụlọ ya, ndị enyi ya, na ebe maara ya ahụ́ ma gawa ebe ọ na-amaghị. Ma Sera so di ya kwapụ, nwee okwukwe na Chineke ga-agọzi ya. Ọ kwanyeere Ebreham ùgwù, kpaakwa àgwà ọma dị iche iche.—1/1, peeji nke 8.

Gịnị mere Jehova ji gwa Ebreham ka o jiri nwa ya nwoke ọ hụrụ n’anya chụọrọ ya àjà?

Anyị kwesịrị icheta na Chineke ekweghị ka Ebreham jiri Aịzik chụọ àjà. Chineke ji ihe ahụ ọ gwara Ebreham gosi otú ọ ga-adị ya mgbe ọ ga-eji Ọkpara ya bụ́ Jizọs chụọ àjà.—1/1, peeji nke 23.

Gịnị gosiri na kemgbe narị afọ mbụ, na ọ dịbeghị mgbe a na-enweghị ezigbo Ndị Kraịst e tere mmanụ n’ụwa?

N’ilu Jizọs tụrụ banyere “ọka wit ahụ” na “ata ahụ,” “ezi mkpụrụ ahụ” bụ “ụmụ nke alaeze.” (Mat. 13:24-30, 38) Ata ahụ na ọka wit ahụ ga-etokọ ruo oge owuwe ihe ubi. N’ihi ya, n’agbanyeghị na anyị enweghị ike ikwu kpọmkwem ndị bụ́ ọka wit ahụ n’oge ahụ niile, ọ ga-abụrịrị na e nweghị mgbe a na-enweghị ndị e tere mmanụ ruokwa n’oge anyị a.—1/15, peeji nke 7.

Olee ihe ndị ga-eme tupu agha Amagedọn?

Mba niile ga-ekwu n’ebe niile na e nweela “Udo na obi iru ala!” (1 Tesa. 5:3) Ndị ọchịchị ga-alụso okpukpe ụgha ọgụ. (Mkpu. 17:15-18) A ga-alụso ndị na-efe Chineke ọgụ. Mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ga-abịa.—2/1, peeji nke 9.

Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ka anyị ghara ịna-enwe anyaụfụ?

Ihe ndị nwere ike inyere anyị aka bụ: Ịhụ ụmụnna anyị n’anya, anyị na ndị Chineke ịna-akpakọrịta, ịna-eme ihe dị mma, na ‘iso ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ.’ (Rom 12:15)—2/15, peeji nke 16-17.

Ole ndị na-asụ asụsụ Nawatụl, gịnị ka a na-emere ha ugbu a?

Ọ bụ asụsụ ndị Aztek mgbe ochie, a ka nwekwara otu nde mmadụ na narị puku mmadụ ise na-asụ ya na Meksiko. Ndịàmà Jehova na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’asụsụ Nawatụl, e nwekwara akwụkwọ anyị n’asụsụ ahụ.—3/1, peeji nke 13-14.

Olee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị na-enye mmadụ ndụmọdụ?

Ghọta nsogbu onye ahụ. Enyela ndụmọdụ ngwa ngwa. Jiri obi umeala mee ihe Baịbụl kwuru. O kwe omume, jiri ọ́bá akwụkwọ e ji amụ Baịbụl na-eme nchọnchọ. Ekpebirila ndị ọzọ ihe ha ga-eme.—3/15, peeji nke 7-9.

Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị ka ha gaa maịl abụọ. (Mat. 5:41) Gịnị ka ihe ahụ o kwuru pụtara?

N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ndị Rom na-achị ndị Izrel nwere ike ịmanye mmadụ ịrụ ọrụ. Mgbe Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị ka ha gaa maịl abụọ, ihe ọ na-agwa ha bụ ka ha jiri obi ha niile rụọ ọrụ ọ bụla ndị ọchịchị manyere ha ịrụ, ma ọ bụrụhaala na ọrụ ahụ emegideghị iwu Chineke.—4/1, peeji nke 9.