Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ọkpara ahụ Chọrọ Ikpughe Nna Ya’

‘Ọkpara ahụ Chọrọ Ikpughe Nna Ya’

‘Ọkpara ahụ Chọrọ Ikpughe Nna Ya’

“Ọ dịghịkwa onye maara onye Nna ahụ bụ ma e wezụga Ọkpara ya nakwa onye Ọkpara ya chọrọ ikpughere ya.”—LUK 10:22.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

Gịnị mere o ji bụrụ Jizọs kacha ruo eruo ikpughe Nna ya?

Olee otú Jizọs si kpugheere ndị ọzọ Nna ya?

Olee otú i nwere ike isi ṅomie Jizọs ma kpugheere ndị ọzọ Nna anyị nke eluigwe?

1, 2. Olee ajụjụ na-agbagwoju ọtụtụ ndị anya, gịnịkwa mere o ji agbagwoju ha anya?

‘ÒNYE bụ Chineke?’ Ajụjụ a na-agbagwoju ọtụtụ ndị anya. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị na-akpọ onwe ha Ndị Kraịst kweere na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu, ha na-ekwu na mmadụ enweghị ike ịghọta ozizi a. Otu onye ụkọchukwu na-ede akwụkwọ kwuru, sị: “Ozizi a abụghị ihe mmadụ nkịtị ga-aghọtali. Ụbụrụ mmadụ agaghị ebuli ya.” N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị kweere n’ozizi evolushọn na-ekwu na Chineke adịghị. Ha na-ekwu na ihe niile mara mma anyị na-ahụ n’ụwa a pụtara n’onwe ha. Ma, Charles Darwin, bụ́ onye chepụtara ozizi evolushọn, ekwughị na Chineke adịghị. O kwuru, sị: “Ihe m chere n’okwu a bụ na ọ bụghị ihe niile banyere Chineke ka mmadụ nkịtị ga-aghọtali.”

2 Ọtụtụ ndị ajụọla ajụjụ dị iche iche banyere Chineke, n’agbanyeghị ihe ha kweere. Ma, ọtụtụ ndị na-akwụsị ịchọ Chineke n’ihi na ha enwetaghị azịza juru ha afọ. N’eziokwu, Setan ‘emeela ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì.’ (2 Kọr. 4:4) Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị ji nọrọ ná mgbagwoju anya, gharakwa ịma ihe bụ́ eziokwu banyere Nna ahụ, bụ́ Onye kere eluigwe na ụwa!—Aịza. 45:18.

3. (a) Ònye kpugheere anyị Onye kere anyị? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

3 Ma, ọ dị ezigbo mkpa ka ndị mmadụ mata ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ naanị ndị “na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.” (Rom 10:13) Mmadụ ịkpọku aha Chineke pụtara na onye ahụ ga-amata ụdị onye Jehova bụ. Jizọs Kraịst kọwaara ndị na-eso ụzọ ya ihe a dị mkpa. O kpugheere ha Nna ya. (Gụọ Luk 10:22.) Gịnị mere Jizọs ji nwee ike ikpughe Nna ya karịa otú onye ọzọ gaara esi ekpughe ya? Olee otú Jizọs si kpughee Nna ya? Oleekwa otú anyị nwere ike isi ṅomie Jizọs n’ikpughere ndị ọzọ Nna anyị nke eluigwe? Ka anyị tụlee ajụjụ ndị a.

JIZỌS KRAỊST RURU ERU IKPUGHE NNA YA KARỊA ONYE Ọ BỤLA

4, 5. Gịnị mere Jizọs ji kacha ruo eruo ikpughe Nna ya?

4 Jizọs ruru eru ikpughe Nna ya karịa onye ọ bụla. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na tupu e kee ihe ọ bụla ọzọ, mmụọ ozi ahụ nke mechara ghọọ Jizọs nọ anọ n’eluigwe. Ọ bụ “Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.” (Jọn 1:14; 3:18) Ọ nọ n’ọkwá pụrụ iche! Mgbe a na-ekebeghị ihe ọ bụla ọzọ, Ọkpara ahụ na Nna ya nọ. Ọ mụtara ọtụtụ ihe banyere Nna ya, mụtakwa àgwà ya. Ka ha na-akpachikwu anya ka ha na-ahụkwu ibe ha n’anya. (Jọn 5:20; 14:31) Cheedị ọtụtụ ihe Jizọs mụtara banyere àgwà Nna ya!—Gụọ Ndị Kọlọsi 1:15-17.

5 Nna ahụ họpụtara Ọkpara ya ịbụ ọnụ na-ekwuru ya, ya bụ, “Okwu Chineke.” (Mkpu. 19:13) N’ihi ya, ọ bụ Jizọs kacha ruo eruo ikpughere ndị ọzọ Nna ya. Ọ bụ ya mere Jọn onyeozi ji kwuo na Jizọs, bụ́ “Okwu ahụ,” nọ “n’obi Nna ya.” (Jọn 1:1, 18) Ihe ahụ Jọn kwuru bụ ihe a na-eme n’oge ochie ma e riwe nri. Mmadụ abụọ na-anọ ibe ha nso n’ebe ha na-eri nri ka ha nwee ike ịkparịta ụka. Otú ahụ ka Ọkpara ahụ na Nna ya kparịtara ụka nke ọma n’ihi na ọ nọ “n’obi Nna ya.”

6, 7. Olee otú Nna ahụ na Ọkpara ya si na-akpachikwu anya?

6 Nna ahụ na Ọkpara ya nọ na-akpachikwu anya. Ọkpara ahụ “wee bụrụ onye ihe ya masịrị [Chineke] karịsịa kwa ụbọchị.” (Gụọ Ilu 8:22, 23, 30, 31.) O kwesịghị iju anyị anya na Ọkpara ahụ na Nna ya hụkwuru ibe ha n’anya ka ha na-arụkọ ọrụ. Ọkpara ahụ mụtakwara àgwà Nna ya. Mgbe Chineke kere ndị ọzọ nwere ọgụgụ isi, Ọkpara ahụ hụrụ otú Nna ya si mesoo nke ọ bụla n’ime ha ihe, nke mekwara ka ọ ghọtakwuo àgwà Nna ya.

7 Ihe Jehova mere mgbe Setan nupụụrụ ọchịchị ya isi mere ka Ọkpara ya mụta ịhụnanya Chineke, ike ya, amamihe ya, na otú o si ekpe ikpe ziri ezi ma ihe sie ike. O doro anya na nke ahụ nyeere Jizọs aka ịma otú ọ ga-esi merie nsogbu ndị o mechara nwee mgbe ọ na-eje ozi n’ụwa.—Jọn 5:19.

8. Olee otú ihe ndị a kọrọ na Matiu, Mak, Luk, na Jọn si enyere anyị aka ịmụta ọtụtụ ihe banyere àgwà Jehova?

8 N’ihi otú Ọkpara ahụ na Jehova si kpachie anya, Ọkpara ahụ kọwara Nna ya nke ọma karịa ka onye ọ bụla ọzọ gaara esi kọwaa ya. È nwere ụzọ ka mma anyị ga-esi aghọta Nna ahụ karịa ịtụle ihe Ọkpara ọ mụrụ naanị ya kụziri ma mee? Dị ka ihe atụ, cheedị otú ọ ga-esi siere anyị ike ịghọta ihe niile okwu ahụ bụ́ “ịhụnanya” pụtara ma ọ bụrụ na ọ bụ naanị n’akwụkwọ ọkọwa okwu ka anyị gụrụ ihe ọ pụtara. Ma, ọ bụrụ na anyị atụgharịa uche n’ihe ndị doro anya a kọrọ na Baịbụl na Matiu, Mak, Luk, na Jọn banyere ozi Jizọs na otú o si gosi ndị ọzọ ịhụnanya, anyị ga-aghọtakwu ihe okwu ahụ bụ́ “Chineke bụ ịhụnanya” pụtara. (1 Jọn 4:8, 16) Ịtụgharị uche n’akwụkwọ Baịbụl ndị ahụ ga-enyekwara anyị aka ịghọtakwu àgwà ndị ọzọ Chineke nwere, bụ́ ndị Jizọs kpugheere ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ nọ n’ụwa.

OTÚ JIZỌS SI KPUGHEE NNA YA

9. (a) Olee ụzọ abụọ Jizọs si kpughee Nna ya? (b) Nye ihe atụ nke gosiri otú Jizọs si jiri ihe ndị ọ kụziri kpughee Nna ya.

9 Olee otú Jizọs si kpugheere ndị na-eso ụzọ ya Nna ya, ma ndị nke oge gara aga ma ndị nke oge a? E nwere ụzọ abụọ o si mee ya. Nke mbụ bụ ihe ndị ọ kụziri. Nke abụọ abụrụ àgwà ya. Ka anyị buru ụzọ kwuo banyere ihe ndị Jizọs kụziri. Ihe ndị Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya gosiri na ọ ghọtara otú Nna ya si eme ihe, otú o si eche echiche, na otú obi na-adị ya n’ihe ndị ọzọ mere. Dị ka ihe atụ, Jizọs ji Nna ya tụnyere onye nwere ìgwè atụrụ nke gara ịchọ otu atụrụ ya furu efu. Jizọs kwuru na mgbe nwoke ahụ hụrụ atụrụ ya ahụ furu efu, ‘ọ ṅụrịrị ọṅụ n’ihi ya karịa otú ọ na-aṅụrị n’ihi iri itoolu na itoolu ahụ na-akpafughị akpafu.’ Olee ihe ihe atụ ahụ pụtara? Jizọs kọwara, sị: “N’otu aka ahụ, ọ dịghị Nna m nke bi n’eluigwe mma ka otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.” (Mat. 18:12-14) Olee ihe i nwere ike ịmụta banyere Jehova n’ihe atụ a? Ọ bụrụgodị na ọ na-adị gị mgbe ụfọdụ ka ị baghị uru nakwa na e chefuola gị, Nna gị nke eluigwe nwere mmasị n’ebe ị nọ, ihe banyere gị na-emetụkwa ya n’obi. N’anya ya, ị bụ otu n’ime “ndị a dị nta.”

10. Olee otú Jizọs si jiri àgwà ya kpughee Nna ya?

10 Ụzọ nke abụọ Jizọs si mee ka ndị na-eso ụzọ ya mata Nna ya bụ otú o si kpaa àgwà. N’ihi ya, mgbe Filip onyeozi gwara Jizọs, sị: “Gosi anyị Nna ahụ,” Jizọs sịrị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:8, 9) Ka anyị tụlee ụzọ ụfọdụ Jizọs si ṅomie àgwà Nna ya. Mgbe otu onye ekpenta rịọrọ Jizọs ka ọ gwọọ ya, Jizọs bitụrụ nwoke ahụ “ekpenta zuru ahụ́” aka, ma sị ya: “Achọrọ m. Dị ọcha.” Mgbe a gwọrọ onye ekpenta ahụ, o doro anya na ọ ghọtara na ọ bụ Jehova si n’aka Jizọs gwọọ ya. (Luk 5:12, 13) Mgbe Lazarọs nwụrụ, Jizọs “sụrụ ude n’ime mmụọ ya, o nyekwara ya nsogbu,” ‘anya mmiri agbaakwa ya.’ Ọ ga-abụrịrị na ihe ahụ o mere mere ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta ụdị ọmịiko Jehova nwere. N’agbanyeghị na Jizọs maara na ọ na-aga ịkpọlite Lazarọs n’ọnwụ, ọnwụ Lazarọs wutere ya otú ahụ o si na-ewute ụmụnne Lazarọs na ndị enyi ya. (Jọn 11:32-35, 40-43) O doro anya na e nwere ihe Baịbụl kọrọ banyere Jizọs nke na-akacha enyere gị aka ịghọta na Jehova nwere obi ebere.

11. (a) Mgbe Jizọs chụpụrụ ndị na-ere ahịa n’ụlọ nsọ, olee ihe o kpughere banyere Nna ya? (b) Gịnị mere akụkọ ahụ ji akasi anyị obi?

11 Gịnị ka ị chọpụtara n’ihe ahụ Baịbụl kọrọ banyere otú Jizọs si chụpụ ndị na-ere ahịa n’ụlọ nsọ? Weregodị ya na ị nọ mgbe ihe ahụ na-eme: Jizọs ji ụdọ mere ụtarị wee chụpụ ndị na-ere atụrụ na ehi. Ọ wụfusịrị mkpụrụ ego nke ndị na-agbanwe ego ma kpuo tebụl ha ihu. (Jọn 2:13-17) Ihe ahụ o ji ịnụ ọkụ n’obi mee mere ka ndị na-eso ụzọ ya cheta amụma Eze Devid buru, nke bụ́: “Ekworo maka ụlọ gị eripịawo m.” (Ọma 69:9) Otú ahụ Jizọs si chụpụ ndị na-eme ihe ọjọọ n’ụlọ Nna ya gosiri na ọ chọghị ka e merụọ ofufe dị ọcha. Ò nwere ihe ihe a na-akụziri gị banyere àgwà Nna anyị nke eluigwe? Ọ na-echetara anyị na ọ bụghị naanị na Chineke nwere ike iwepụ ihe ọjọọ niile n’ụwa, kamakwa, na ọ chọsiri ike ime ya. Iwe ahụ Jizọs were mgbe ọ hụrụ ihe ọjọọ a na-eme n’ụlọ Nna ya na-eme ka anyị ghọta otú obi na-adị Nna ya mgbe ọ na-ahụ ihe ọjọọ juru n’ụwa taa. Nke ahụ ó kwesịghị ịkasi anyị obi mgbe a na-emegbu anyị?

12, 13. Olee ihe i nwere ike ịmụta banyere Jehova n’otú Jizọs si mesoo ndị na-eso ụzọ ya?

12 Ka anyị tụlee ihe atụ ọzọ, ya bụ, otú Jizọs si mesoo ndị na-eso ụzọ ya. Ha rụrụ ụka ugboro ugboro banyere onye ka ukwuu n’etiti ha. (Mak 9:33-35; 10:43; Luk 9:46) Ebe ọ bụ na Jizọs na Nna ya nọrọ ọtụtụ afọ, ọ maara otú obi na-adị Jehova mgbe ndị mmadụ na-ebuli onwe ha elu. (2 Sam. 22:28; Ọma 138:6) Ihe ọzọ bụ na Jizọs ahụla ebe Setan bụ́ Ekwensu kpara ụdị àgwà ahụ. Ihe bụ́ mkpa Ekwensu bụ ịnọ n’ọkwá dị elu na ịbụ onye a ma ama. Ọ ga-abụrịrị na o wutere Jizọs mgbe ọ hụrụ na ndị na-eso ụzọ ya ọ zụrụ azụ amalitela ịdị mpako! Ndị nke ọ họọrọ ịbụ ndịozi ya sodị na-akpa ụdị àgwà ahụ! Ha kpagidere àgwà ọjọọ ahụ ruo ụbọchị Jizọs nwụrụ. (Luk 22:24-27) N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs ji obiọma na-agbazi ha, na-enwe olileanya na ha ga-emecha mụta ịdị umeala n’obi ka ya.—Fil. 2:5-8.

13 È nwere ihe ị mụtara banyere àgwà Nna anyị nke eluigwe n’otú Jizọs si jiri ndidi na-agbazi ndị na-eso ụzọ ya? Àgwà Jizọs na okwu ọnụ ya ò mere ka ị ghọta àgwà Nna ya, bụ́ onye na-anaghị ahapụ ndị ya n’agbanyeghị ugboro ole ha mejọrọ ya? N’ihi ihe ndị ahụ anyị mụtara banyere àgwà Chineke, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ichegharị ma rịọ ya mgbaghara mgbe anyị mejọrọ ya?

ỌKPARA AHỤ CHỌRỌ IKPUGHE NNA YA

14. Olee otú Jizọs si gosi na ọ chọrọ ikpughe Nna ya?

14 Otú ọtụtụ ndị ọchịchị aka ike si eme ka ndị ha na-achị nọgide n’okpuru ha bụ izochiri ha ihe ndị ha kwesịrị ịma. Ma, Jizọs na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị ọ maara banyere Nna ya, na-ekpughere ha Nna ya nke ọma. (Gụọ Matiu 11:27.) Jizọs nyekwara ndị na-eso ụzọ ya “ikike inwe nghọta ka [ha] wee mara” Jehova Chineke. (1 Jọn 5:20) Gịnị ka nke ahụ pụtara? Ọ pụtara na Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya nwee ike ịghọta ihe ndị ọ kụziiri ha banyere Nna ya. Ọ kụzighịrị ha ihe na-agaghị ekwe ha nghọta, dị ka ozizi Atọ n’Ime Otu.

15. Gịnị mere Jizọs ekpugheghị ihe ụfọdụ banyere Nna ya?

15 Jizọs ò kpughere ihe niile ọ maara banyere Nna ya? Mba, n’ihi amamihe ya, ọ gwaghị ndị na-eso ụzọ ya ihe niile ọ maara. (Gụọ Jọn 16:12.) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị na-eso ụzọ ya “apụghị ịghọta” ihe ndị ahụ mgbe ahụ. Ma, dị ka Jizọs kwuru, a ga-ekpughere ha ọtụtụ ihe mgbe “ihe inyeaka,” bụ́ mmụọ nsọ, ga-abịa, bụ́ nke ga-eduzi ha ma nyere ha aka ịghọta “eziokwu niile.” (Jọn 16:7, 13) E nwere ihe ụfọdụ ndị nne na nna maara ihe na-anaghị agwa ụmụ ha ruo mgbe ha toruru ịghọta ha. Otú ahụ ka Jizọs cheere ruo mgbe ndị na-eso ụzọ ya tozuru okè ma nwee ike ịghọta ihe ụfọdụ banyere Nna ya. N’ihi obiọma Jizọs, ọ gwaghị ha ihe ndị ha na-agaghị aghọtali.

ṄOMIE JIZỌS MA NYERE NDỊ ỌZỌ AKA ỊMATA JEHOVA

16, 17. Gịnị mere i ji kwesị ikpughere ndị ọzọ Nna anyị nke eluigwe?

16 Mgbe ị matara mmadụ nke ọma ma hụ na ọ bụ ezigbo mmadụ, ị́ naghị achọ ịgwa ndị ọzọ banyere ya? Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ gwara ndị ọzọ banyere Nna ya. (Jọn 17:25, 26) Ànyị nwere ike iṅomi ya ma nyere ndị ọzọ aka ịmata Jehova?

17 Dị ka anyị kwurula, Jizọs maara Nna ya karịa onye ọ bụla ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ chọrọ ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị ọ maara. O medịrị ka ndị na-eso ụzọ ya nwee ike ịghọta àgwà Chineke. Jizọs ó mebeghị ka anyị ghọta Nna anyị nke eluigwe karịa ọtụtụ ndị ọzọ taa? Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jizọs ji àgwà ya na ihe ndị ọ kụziri kpugheere anyị Nna ya! N’eziokwu, anyị nwere ike ịnya isi na anyị maara Nna anyị nke eluigwe. (Jere. 9:24; 1 Kọr. 1:31) Ebe ọ bụ na anyị agbaala mbọ ịbịaru Jehova nso, ọ bịaruokwala anyị nso. (Jems 4:8) N’ihi ya, anyị nweziri ike ịgwa ndị ọzọ ihe anyị maara banyere ya. Olee otú anyị nwere ike isi mee ya?

18, 19. Olee otú i nwere ike isi kpugheere ndị ọzọ Nna anyị nke eluigwe? Kọwaa.

18 Anyị kwesịrị iṅomi Jizọs ma jiri okwu ọnụ anyị na àgwà anyị na-ekpughere ndị ọzọ Nna anyị nke eluigwe. Cheta na ọtụtụ ndị anyị na-ezi ozi ọma amaghị onye Chineke bụ. O nwere ike ịbụ na ha aghọtaghị onye Chineke bụ n’ihi na e ziri ha ozizi ụgha. Anyị nwere ike ịgwa ha ihe anyị maara banyere aha Chineke, nzube ya maka ụmụ mmadụ, na àgwà ya ndị Baịbụl kọwaara anyị. Anyị nwekwara ike ịgwa ụmụnna anyị ihe ụfọdụ anyị gụrụ na Baịbụl nke mere ka anyị ghọtakwuo àgwà Chineke. Ime otú ahụ nwekwara ike ịgba ha ume.

19 Anyị kwesịrị iṅomi Jizọs ma jiri àgwà anyị kpugheere ndị ọzọ Nna anyị nke eluigwe. Ọ bụrụ na àgwà anyị emee ka ndị mmadụ ghọta na anyị hụrụ Kraịst n’anya, ọ ga-eme ka ha bịarukwuo Jizọs na Nna anyị nke eluigwe nso. (Efe. 5:1, 2) Pọl onyeozi gbara anyị ume ka anyị ‘bụrụ ndị na-eṅomi ya, ọbụna dị ka o ṅomiri Kraịst.’ (1 Kọr. 11:1) Anyị nwere nnukwu ihe ùgwù iji àgwà anyị mee ka ndị mmadụ ghọtakwuo Jehova! Ka anyị niile nọgide na-eṅomi Jizọs ma na-ekpughere ndị ọzọ Nna anyị nke eluigwe.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]