Jiri Obi Gị Dum Na-ejere Jehova Ozi
Jiri Obi Gị Dum Na-ejere Jehova Ozi
“Nwa m, mara Chineke nke nna gị, jirikwa obi gị dum . . . jeere ya ozi.” —1 IHE 28:9.
CHỌTA AZỊZA NKE AJỤJỤ NDỊ A:
Gịnị bụ obi ihe atụ?
Olee otú anyị nwere ike isi nyochaa obi anyị?
Olee otú anyị nwere ike isi jiri obi anyị dum na-ejere Jehova ozi mgbe niile?
1, 2. (a) Olee ihe dị n’ahụ́ mmadụ Baịbụl ji mee ihe atụ karịa ihe ndị ọzọ? (b) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị ghọta ihe obi ihe atụ pụtara?
BAỊBỤL na-ejikarị ihe ndị dị n’ahụ́ mmadụ eme ihe atụ. Dị ka ihe atụ, nna ochie bụ́ Job kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe ọjọọ dị n’ọbụ aka m.” Eze Sọlọmọn sịrị: “Akụkọ dị mma na-eme ka ọkpụkpụ maa abụba.” Jehova mesiri Ezikiel obi ike, sị: ‘M mewo ka egedege ihu gị sie ike karịa ọmụ́.’ A gwakwara Pọl onyeozi, sị: “Ị na-akụzi ihe ndị anyị na-anụtụbeghị ná ntị.”—Job 16:17; Ilu 15:30; Ezik. 3:9; Ọrụ 17:20.
2 Ma, e nwere ihe dị n’ahụ́ mmadụ Baịbụl ji mee ihe atụ karịa ihe ndị ọzọ. Ọ bụ ihe ahụ Hana, bụ́ onye kwesịrị ntụkwasị obi, kpọrọ aha n’ekpere ya, mgbe ọ sịrị: “Obi m na-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova.” (1 Sam. 2:1) N’eziokwu, ndị dere Baịbụl kpọrọ obi aha ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu puku ugboro, ọ fọkwara obere ka ọ bụrụ na ha jicha ya mee ihe atụ n’ebe ndị ahụ. Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị ghọta ihe obi pụtara n’ihi na Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ichebe ya.—Gụọ Ilu 4:23.
GỊNỊ BỤ OBI IHE ATỤ?
3. Olee otú anyị ga-esi ghọta ihe “obi” pụtara na Baịbụl? Nye ihe atụ.
3 Ọ bụ eziokwu na Baịbụl akọwaghị “obi” otú akwụkwọ ọkọwa okwu si akọwa ihe, ọ gwara anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ọ pụtara. Olee otú o si mee ya? Dị ka ihe atụ, chee banyere osisi nwere ọtụtụ akwụkwọ. Ị kwụrụ n’okpuru ya, ị ga-ahụ naanị akwụkwọ ole na ole, ma ị gaghị ahụ otú osisi ahụ dị. Ma, ị nọrọ ebe dị anya lee osisi ahụ anya, ị ga-ahụ otú osisi ahụ dị. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị atụlee ebe dị iche iche Baịbụl
kwuru banyere “obi,” anyị ga-enwe ike ịghọta ihe ọ pụtara. Ya mere, gịnị ka obi ihe atụ pụtara?4. (a) Gịnị ka “obi” na-anọchi anya ya? (b) Gịnị ka ihe Jizọs kwuru na Matiu 22:37 pụtara?
4 Ndị so dee Baịbụl ji okwu bụ́ “obi” kọwaa ụdị onye mmadụ bụ, ma ọchịchọ ya, echiche ya, àgwà ya, otú obi na-adị ya, otú o si ele ihe anya, ihe ndị o nwere ike ime, ihe mere o ji eme ihe ndị ọ na-eme, na ihe ndị o kpebiri ime. (Gụọ Diuterọnọmi 15:7; Ilu 16:9; Ọrụ Ndịozi 2:26.) Otu akwụkwọ kwuru na ọ bụ “ụdị onye mmadụ bụ.” Ma, ọ bụghị mgbe niile ka “obi” na-apụta ihe ndị a niile a kọwara. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru, sị: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Mat. 22:37) N’ebe a, “obi” pụtara otú obi dị mmadụ na ihe ndị ọ chọrọ ime. Ebe ọ bụ na Jizọs kpọrọ obi, mkpụrụ obi, na uche aha iche iche, ihe ọ na-ekwu bụ na otú obi na-adị anyị na otú anyị si ebi ndụ na otú anyị si eche echiche kwesịrị igosi na anyị hụrụ Chineke n’anya. (Jọn 17:3; Efe. 6:6) Ma, mgbe a kpọrọ naanị “obi” aha, ọ na-apụta ụdị onye mmadụ bụ.
GỊNỊ MERE ANYỊ GA-EJI CHEBE OBI ANYỊ?
5. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji mee ihe niile anyị nwere ike ime iji jiri obi anyị dum na-ejere Jehova ozi?
5 Eze Devid chetaara Sọlọmọn, sị: “Nwa m, mara Chineke nke nna gị, jirikwa obi gị dum na mkpụrụ obi jupụtara n’aṅụrị jeere ya ozi; n’ihi na Jehova na-enyocha obi niile, ọ na-amatakwa ihe niile mmadụ na-eche n’echiche.” (1 Ihe 28:9) N’eziokwu, Jehova bụ Onye na-enyocha obi niile, ma obi nke anyị. (Ilu 17:3; 21:2) Ihe ọ hụrụ n’obi anyị ga-eme ka anyị na ya dị ná mma ma ọ bụ ghara ịdị ná mma, kpebiekwa ma ànyị ga-adị ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ime ihe ahụ Devid gwara nwa ya ma mee ihe niile anyị nwere ike ime iji jiri obi anyị dum na-ejere Jehova ozi.
6. Gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta banyere mkpebi anyị mere ijere Jehova ozi?
6 Otú anyị si na-eji ịnụ ọkụ n’obi arụ ọrụ Jehova nyere anyị na-egosi n’ezie na anyị chọrọ iji obi anyị dum na-ejere Jehova ozi. Ma, anyị ghọtara na ajọ ụwa Setan na mmehie anyị bu pụta ụwa nwere ike ime ka anyị kwụsị iji obi anyị dum na-ejere Chineke ozi. (Jere. 17:9; Efe. 2:2) N’ihi ya, iji chọpụta ma ànyị ka kpebisiri ike ijere Chineke ozi, anyị kwesịrị ịna-enyocha obi anyị mgbe niile. Olee otú anyị nwere ike isi mee ya?
7. Gịnị na-egosi otú obi anyị dị?
7 O doro anya na otú ahụ mmadụ na-anaghị ahụ ihe dị n’ime osisi anya, a naghị ahụ ụdị ndị anyị bụ anya. Ma, dị ka Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya, otú ahụ e si eji ụdị mkpụrụ osisi mịrị amata ma osisi ahụ ọ̀ dị mma, otú ahụkwa ka e si eji ihe anyị na-eme amata otú obi anyị dị. (Mat. 7:17-20) Ka anyị tụlee otu ihe anyị na-eme nke nwere ike igosi otú obi anyị dị.
OTU ỤZỌ ANYỊ NWERE IKE ISI NYOCHAA OBI ANYỊ
8. Olee otú ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:33 si gbasa ihe dị anyị n’obi?
8 Tupu Jizọs ekwuo ihe ahụ dị na Matiu 7:17-20, n’Ozizi Elu Ugwu ahụ, ọ gwara ndị na-ege ya ntị otu ihe ha ga-eme nke ga-egosi na ha chọrọ iji obi ha dum jeere Jehova ozi. O kwuru, sị: “Ya mere, burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.” (Mat. 6:33) Ihe ndị anyị na-ebute ụzọ ná ndụ anyị na-egosi n’ezie ihe anyị chọrọ, ihe anyị na-eche, na ihe anyị na-eme atụmatụ ya n’ime ime obi anyị. N’ihi ya, otu ụzọ anyị nwere ike isi mata ma ànyị ka ji obi anyị dum na-ejere Chineke ozi bụ ịtụle ihe ndị anyị na-ebute ụzọ ná ndụ.
9. Olee òkù Jizọs kpọrọ ndị ikom ụfọdụ, gịnịkwa ka ihe ha mere gosiri?
9 Obere oge Jizọs gwachara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ,’ e nwere ihe merenụ nke gosiri otú ihe mmadụ butere ụzọ ná ndụ si egosi ihe dị ya n’obi. Luk bu ụzọ kwuo na Jizọs “kpebisiri ike ịga Jeruselem” n’agbanyeghị na ọ maara ihe ga-eme ya n’ebe ahụ. Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya “na-aga n’ụzọ,” o zutere ụfọdụ ụmụ nwoke, bụ́ ndị ọ gwara, sị: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.” Ndị ahụ kwetara na ha ga-abụ ndị na-eso ụzọ ya, ma e nwere ihe ndị ha chọrọ ibugodị ụzọ mee. Otu nwoke zara ya, sị: “Hapụ m ka m buru ụzọ gaa lie nna m.” Onye ọzọ gwara ya, sị: “M ga-eso gị, Onyenwe anyị; ma hapụgodị m ka m sị ndị ezinụlọ m ka e mesịa.” (Luk 9:51, 57-61) Otú Jizọs si kpebisie ike ije ozi ya dị nnọọ iche n’àgwà ndị ikom a na-achọ ihe ha ga-akụdo aka ghara iso Jizọs! Ebe ọ bụ na ha butere ihe ndị ha chọrọ ụzọ kama ibute Alaeze Chineke ụzọ, ha gosiri na ha ejighị obi ha dum na-ejere Chineke ozi.
10. (a) Olee otú ndị na-eso ụzọ Kraịst sirila zaa òkù ahụ Jizọs kpọrọ? (b) Olee ihe atụ Jizọs mere?
10 Anyị adịghị ka ndị ahụ Jizọs kpọrọ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’ihi na anyị zara òkù Jizọs kpọrọ anyị ịbụ ndị na-eso ụzọ ya, anyị na-efekwa Jehova kwa ụbọchị. Anyị si otú a egosi otú anyị si were Jehova n’obi anyị. Ma, n’agbanyeghị na anyị na-eme nke ọma n’ọgbakọ, ọ ka dị mkpa ka anyị mara na e nwere ihe nwere ike ime ka anyị ghara iji obi anyị dum na-efe Jehova. Gịnị ka ọ bụ? Jizọs kwuru ihe ọ bụ mgbe ahụ ọ kpọrọ ndị ikom ahụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. O kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke jidere aka n’ọ́gụ̀ ma na-ele anya n’ihe ndị dị n’azụ nke kwesịrị nnọọ ekwesị maka alaeze Chineke.” (Luk 9:62) Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ ahụ?
ÀNYỊ ‘NA-EJIDESI EZI IHE IKE’?
11. Gịnị ka onye ọrụ ahụ e goro ego Jizọs ji mee ihe atụ mere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
11 Iji ghọta nke ọma ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe atụ ahụ dị mkpirikpi Jizọs mere, ka anyị kọwakwuo ya. Onye e goro ọrụ n’ubi nọ na-akọ ubi. Ma, ka ọ na-akọ ubi ahụ, ọ nọ na-echeta ihe ndị dị n’ụlọ ya, dị ka ndị ezinụlọ ya, ndị enyi ya, nri, egwú, ọchị a na-achị n’ụlọ ya, na ndò dị ebe ahụ. Ihe ndị a na-agụ ya agụụ. Mgbe ọ kọruru ebe dị anya, ihe ndị ahụ gụsiri ya agụụ ike nke na ọ tụgharịrị iji lee anya “n’ihe ndị dị n’azụ.” Ọ bụ ezie na ebe ọ kọfọrọ ka buru ibu, obi ya pụrụ n’ọrụ ya, nke mere ka ọ ghara ịrụ ọrụ ya nke ọma. O doro anya na o wutere onye nwe ubi ahụ na onye ọrụ ahụ anọgideghị n’ọrụ ya.
12. Olee otú ụfọdụ Ndị Kraịst taa si yie onye ọrụ ubi ahụ Jizọs ji mee ihe atụ?
12 Ka anyị tụlezie otú ụdị ihe ahụ nwere ike isi mee n’oge anyị. Onye ọrụ ubi ahụ nwere ike ịnọchi anya Onye Kraịst ọ bụla nke yiri ka ọ̀ na-eme nke ọma ma ya abụrụ na mmekọrịta ya na Chineke esighị ike. Ka anyị were ya na nwanna na-ejechi ozi ọma anya. Ma, n’agbanyeghị na ọ na-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma, uche ya na-adị mgbe Fil. 2:16) Ọ na-ewute Jehova, bụ́ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, ma ọ bụrụ na anyị anọgideghị n’ọrụ anyị.—Luk 10:2.
niile n’ihe ụfọdụ ndị ụwa na-eme. Ihe ndị ahụ na-agụkwa ya agụụ n’ime ime obi ya. Mgbe o jere ozi ruo afọ ole na ole, ihe ụfọdụ ndị ụwa na-eme gụsiwere ya ike nke na ọ tụgharịrị iji lee anya “n’ihe ndị dị n’azụ.” Ọ bụ ezie na ọ ka nwere ọtụtụ ihe ọ ga-arụ n’ozi ya, o ‘jidesighị okwu nke ndụ ike,’ nke mere ka ọ ghara ije ozi ya nke ọma. (13. Olee ihe iji obi anyị dum ejere Jehova ozi pụtara?
13 Ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe atụ a doro anya. Ọ dị mma ka anyị na-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya, bụ́ ọrụ ọma ndị na-eme anyị obi ụtọ. Ma ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iji obi anyị dum na-ejere Jehova ozi. (2 Ihe 25:1, 2, 27) Ọ bụrụ na Onye Kraịst hụrụ ‘ihe ndị dị n’azụ’ n’anya n’ime ime obi ya, ya bụ, ihe ụfọdụ ndị ụwa na-eme, o nwere ike ime ka ya na Chineke ghara ịdịzi ná mma. (Luk 17:32) Naanị ihe ga-eme ka anyị bụrụ ndị “kwesịrị nnọọ ekwesị maka alaeze Chineke” bụ ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị ma jidesie ezi ihe ike.’ (Rom 12:9; Luk 9:62) N’ihi ya, n’agbanyeghị otú ihe ndị dị n’ụwa Setan si yie ihe bara uru ma ọ bụ ihe dị mma, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka ihe ọ bụla ghara igbochi anyị iji obi anyị dum na-arụ ọrụ ndị metụtara Alaeze Chineke.—2 Kọr. 11:14; gụọ Ndị Filipaị 3:13, 14.
MỤRỤ ANYA!
14, 15. (a) Olee otú Setan si na-agba mbọ inweta obi anyị? (b) Kọwaa ihe mere otú a Setan si achọ inweta ndị Chineke ji dị ezigbo njọ.
14 Ihe mere anyị ji rara onwe anyị nye Jehova bụ na anyị hụrụ ya n’anya. Kemgbe ahụ, ọtụtụ n’ime anyị egosila na anyị kpebisiri ike iji obi anyị dum na-ejere Jehova ozi, jeekwa ya ruo ọtụtụ afọ. Ma, Setan ahapụbeghị anyị aka. Ọ ka chọrọ imetọ obi anyị. (Efe. 6:12) N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na ọ maara na anyị agaghị ahapụ Jehova n’otu ntabi anya. N’ihi ya, ọ na-eji aghụghọ agbalị iji “usoro ihe a” eme ka anyị jiri nwayọọ nwayọọ kwụsị ịnụ ọkụ n’obi n’ozi anyị na-ejere Chineke. (Gụọ Mak .) Gịnị mere Setan ji esi otú a enweta ọtụtụ ndị? 4:18, 19
15 Iji zaa ajụjụ ahụ, ka e were ya na i nwere iko garị iri n’ụlọ. Mgbe ị na-anọghị ya, nwa gị agaa kporo garị juru ọbụ aka ya taa. Ị̀ ga-ama na e nwere ihe pụrụ na garị ahụ? Ị gaghị ama. N’ụtụtụ echi ya, ya ekporokwa nke juru ọbụ aka ya ugboro abụọ. Ị̀ ga-ama na e kpopụrụ ihe na garị ahụ? Mbanụ! Maka gịnị? Maka na garị ahụ ji nwayọọ nwayọọ na-agbada nke na ị chọpụtaghị. N’otu aka ahụ, ụwa Setan nwere ike ime ka ịnụ ọkụ n’obi anyị jiri nwayọọ nwayọọ na-ajụ oyi. Ọ bụrụ na nke ahụ emee, ọ ga-adị ka à ga-asị na e ji nwayọọ nwayọọ na-ewepụ ihe n’ịnụ ọkụ n’obi anyị ji na-ejere Jehova ozi. Ọ bụrụ na Onye Kraịst amụghị anya, o nwere ike ọ gadịghị achọpụta na ịnụ ọkụ n’obi ya ji nwayọọ nwayọọ na-ajụ oyi.—Mat. 24:42; 1 Pita 5:8.
EKPERE DỊ EZIGBO MKPA
16. Olee otú anyị ga-esi chebe onwe anyị ka Setan ghara iji atụmatụ aghụghọ ya nweta anyị?
16 Olee otú anyị ga-esi chebe onwe anyị ka Setan ghara iji atụmatụ aghụghọ ya nweta anyị, anyị ejirikwa obi anyị dum na-ejere Jehova ozi? (2 Kọr. 2:11) Ekpere dị anyị ezigbo mkpa. Pọl gbara Ndị Kraịst ibe ya ume ka ha ‘guzosie ike megide atụmatụ aghụghọ Ekwensu.’ Ọ dụziri ha ọdụ, sị: “[Jirinụ] ụdị ikpe ekpere ọ bụla na ụdị ịrịọsi arịrịọ ike ọ bụla na-anọgide n’ekpere n’oge niile.”—Efe. 6:11, 18; 1 Pita 4:7.
17. Olee ihe anyị mụtara n’ekpere Jizọs?
17 Ọ bụrụ na anyị chọrọ iguzogide Setan, anyị kwesịrị iṅomi Jizọs ma jiri obi anyị dum na-ejere Jehova ozi. Dị ka ihe atụ, ka anyị tụlee ihe Luk kwuru banyere otú Jizọs si kpee ekpere n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ. O kwuru, sị: “Mgbe obi na-erukwaghi ya ala, ọ nọ na-ekpesi ekpere ike karị, ọsụsọ ya dịkwa ka ọbara nke na-atapụsị n’ala.” (Luk 22:44) E nweela mgbe Jizọs kpesiri ekpere ike, ma ugbu a mgbe ụdị nsogbu ọ na-ahụtụbeghị bịaara ya, o kpesiri ekpere ike “karị,” Chineke zakwara ekpere ya. Ihe ahụ Jizọs mere gosiri na e nwere ekpere ndị na-aka ibe ha esi ike. N’ihi ya, ka nsogbu anyị na ọnwụnwa Setan na-esikwu ike, ka anyị kwesịrị ikpesikwu ekpere ike ka Jehova chebe anyị.
18. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị banyere ekpere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee ihe ndị na-eme ka obi anyị na-arụ ọrụ nke ọma, oleekwa otú ha nwere ike isi mee ya? (Gụọ igbe dị na peeji nke 16.)
18 Olee ihe ụdị ekpere ndị ahụ nwere ike imere anyị? Pọl kwuru, sị: “N’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu . . . nche.” (Fil. 4:6, 7) N’eziokwu, anyị kwesịrị ịna-ekpesi ekpere ike, na-ekpekwa ya mgbe niile ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iji obi anyị dum na-ejere Jehova ozi. (Luk 6:12) N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị, ‘Àna m ekpesi ekpere ike, na-ekpekwa ya mgbe niile?’ (Mat. 7:7; Rom 12:12) Ihe ị zara ga-eme ka ị mara ma ị̀ chọrọ iji obi gị niile na-efe Chineke.
19. Olee ihe ị ga-eme iji jiri obi gị dum na-ejere Jehova ozi mgbe niile?
19 Dị ka anyị tụlerela, ihe ndị anyị na-ebute ụzọ ná ndụ na-egosi n’ezie otú obi anyị dị. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka ihe ndị anyị hapụrụ na aghụghọ Setan ghara ime ka anyị kwụsị iji obi anyị dum na-efe Jehova. (Gụọ Luk 21:19, 34-36.) N’ihi ya, dị ka Devid, anyị ga-anọgide na-arịọ Jehova, sị: “Mee ka obi m dị n’otu.”—Ọma 86:11.
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Igbe dị na peeji nke 16]
IHE ATỌ NA-EME KA OBI ANYỊ NA-ARỤ ỌRỤ NKE ỌMA
Otú ahụ anyị na-eme ihe ụfọdụ iji mee ka obi anyị na-arụ ọrụ nke ọma, e nwekwara ihe ndị anyị nwere ike ime iji hụ na obi ihe atụ anyị na-arụ ọrụ nke ọma. Ka anyị tụlee ihe atọ dị mkpa na-eme ka obi anyị na-arụ ọrụ nke ọma:
1 Nri: Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka obi anyị na-arụ ọrụ nke ọma, anyị ga na-eri ezigbo nri mgbe niile. Otú ahụ ka anyị kwesịrị ịna-eri ezigbo nri ime mmụọ mgbe niile. Otú anyị ga-esi eme ya bụ inwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya, ịtụgharị uche n’ihe anyị na-amụ, na ịgachi ọmụmụ ihe anya.—Ọma 1:1, 2; Ilu 15:28; Hib. 10:24, 25.
2 Imega ahụ́: Ka obi anyị nwee ike ịna-arụ ọrụ nke ọma, anyị kwesịrị ịna-emega ahụ́ mgbe ụfọdụ. Otú ahụ ka anyị kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ọma ka obi ihe atụ anyị nwee ike ịna-arụ ọrụ nke ọma. Otu ụzọ anyị nwere ike isi mee ya bụ iwepụtakwu oge na-eje ozi ọma.—Luk 13:24; Fil. 3:12.
3 Ebe anyị bi na ebe anyị na-arụ ọrụ: Ihe ndị mmadụ na-eme n’ebe anyị na-arụ ọrụ na n’ebe anyị bi nwere ike ịna-enye anyị nsogbu n’obi. Ma, obi ga na-adị anyị mma ma ọ bụrụ na anyị na ụmụnna anyị na-anọ mgbe mgbe n’ihi na ha hụrụ anyị n’anya ma jiri obi ha niile na-ejere Chineke ozi.—Ọma 119:63; Ilu 13:20.