Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

M Jidela Uwe Mwụda nke Onye Juu Ruo Afọ Iri Asaa

M Jidela Uwe Mwụda nke Onye Juu Ruo Afọ Iri Asaa

Akụkọ Ndụ

M Jidela Uwe Mwụda nke Onye Juu Ruo Afọ Iri Asaa

Akụkọ Leonard Smith kọrọ

Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na anọ, e nwere ihe abụọ Baịbụl kwuru masịrị m nke ukwuu. Taa, ka afọ iri asaa gaferela, m ka na-echeta mgbe m ghọtara ihe Zekaraya 8:23 kwuru banyere “ndị ikom iri” ijide “uwe mwụda nke nwoke bụ́ onye Juu.” Ha na-asị onye Juu ahụ: “Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.”

NWOKE ahụ bụ́ onye Juu nọchiri anya Ndị Kraịst e tere mmanụ, “ndị ikom iri” ahụ nọchikwara anya “atụrụ ọzọ,” ma ọ bụ “ndị Jonadab,” bụ́ ihe a na-akpọbu ha. * (Jọn 10:16) Mgbe m ghọtara eziokwu ahụ, m chọpụtara na ọ bụrụ na m chọrọ ibi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi, m kwesịrị iji obi m niile na-akwado ndị e tere mmanụ.

Ihe atụ Jizọs mere banyere “atụrụ” na “ewu” na Matiu 25:31-46 masịkwara m. “Atụrụ” ahụ nọchiri anya ndị Jizọs na-agaghị ama ikpe n’oge ikpeazụ n’ihi na ha meere ụmụnna ya e tere mmanụ bụ́ ndị ka nọ n’ụwa ihe ọma. Ebe m bụ nwa okorobịa so n’òtù Jọnadab, agwara m onwe m, sị: ‘Len, ọ bụrụ na ị chọrọ ka Kraịst kpọọ gị atụrụ ya, i kwesịrị ịkwado ụmụnna ya e tere mmanụ, ma kwe ka ha na-edu gị n’ihi na Chineke nọnyeere ha.’ Ihe a m ghọtara enyerela m aka ruo ihe karịrị afọ iri asaa.

‘GỊNỊ KA M KWESỊRỊ ỊRỤ?’

E mere mama m baptizim n’afọ 1925 n’ụlọ nzukọ dị na Betel nke a na-akpọ Lọndọn Tabanakụl. Ọ bụ ebe ụmụnna ndị bi gburugburu ebe ahụ na-aga ọmụmụ ihe. A mụrụ m n’Ọktoba 15, 1926. N’ọnwa Mach 1940, e mere m baptizim ná mgbakọ e mere na Dova, n’ụsọ oké osimiri Ingland. M hụkwuru eziokwu Baịbụl n’anya. Ebe mama m bụ Onye Kraịst e tere mmanụ, e  nwere ike ikwu na ọ bụ ya bụ “onye Juu” mbụ m jidere “uwe mwụda” ya. N’oge ahụ, papa m na nwanne m nwaanyị nke tọrọ m adịghị efe Jehova. Anyị nọ n’Ọgbakọ Gillingham nke dị na ndịda ebe ọwụwa anyanwụ Ingland. Ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ. Mama m ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.

Ná mgbakọ e mere n’obodo Lesta na Septemba 1941, otu okwu isiokwu ya bụ “Ikwesị Ntụkwasị Obi” kwuru banyere onye kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa. Okwu ahụ nyeere m aka ịghọta na okwu Jehova na Setan na-ese gbasara anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkwado Jehova ma na-erubere ya isi ebe ọ bụ Ọkaakaa Eluigwe na Ala.

Ná mgbakọ ahụ, e kwusiri okwu ịsụ ụzọ oge niile ike, a gbakwara ndị na-eto eto ume ka ha kpebie ịsụ ụzọ oge niile. Okwu isiokwu ya bụ “Ihe Ndị Ọsụ Ụzọ Oge Niile Na-arụ ná Nzukọ Jehova” mere ka m jụọ onwe m, sị: ‘Gịnị ka m kwesịrị ịrụ ná nzukọ Jehova?’ Mgbakọ ahụ mere ka m ghọta nke ọma na ebe m so n’òtù Jọnadab, ọrụ m bụ iji ike m niile na-enyere ndị e tere mmanụ aka n’ikwusa ozi ọma. Edejupụtara m akwụkwọ n’ebe ahụ ozugbo iji malite ịsụ ụzọ.

ỊSỤ ỤZỌ MGBE A NA-ALỤ AGHA

Na Disemba 1, 1941, mgbe m dị afọ iri na ise, aghọrọ m ọsụ ụzọ pụrụ iche. Mama m bụ ọsụ ụzọ mbụ mụ na ya rụkọrọ ọrụ. Ma, mgbe ihe dị ka otu afọ gachara, ọ kwụsịrị ịsụ ụzọ n’ihi na ahụ́ esichazighị ya ike. Alaka ụlọ ọrụ dị na Lọndọn kenyeziri m Nwanna Ron Parkin, bụ́ onye sozi na Kọmitii Alaka dị na Puweto Riko.

E zigara anyị n’obodo Brọdstes na Ramsget, bụ́ obodo ndị dịcha n’ebe a na-akpọ Kent. Anyị chọtara otu ọnụ ụlọ anyị na-akwụ ụgwọ ya. Ego mmachi akpa a na-enye ndị ọsụ ụsọ pụrụ iche kwa ọnwa bụ shịnị iri anọ (ihe dị ka otu puku naịra na narị naịra abụọ). N’ihi ya, anyị kwụọ ụgwọ ụlọ, ego na-afọ anyị n’aka na-epe mpe. Mgbe ụfọdụ, anyị anaghịkwa ama ebe anyị ga-esi enweta nri ọzọ anyị ga-eri. Ma, Jehova gboro mkpa anyị mgbe niile.

Anyị na-agbakarị ígwè, ikuku si n’Oké Osimiri Ebe Ugwu na-emekwa ka o siere anyị ike ịgba ígwè anyị anyị kejuru ngwongwo. Nsogbu ọzọ anyị nwere bụ na bọmbụ ndị Jamanị na-atụ na Lọndọn n’oge ahụ na-ebu ụzọ agafe obodo Kent, bú ebe anyị bi. O nwere ụbọchị m si n’ígwè m wụpụ, wụba n’olulu iji zere bọmbụ si n’elu isi m fefere. Bọmbụ ahụ dara n’ubi dị nso ebe ahụ. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, afọ ndị ahụ anyị ji kwusaa ozi ọma na Kent tọrọ anyị ezigbo ụtọ.

AGHỌRỌ M ONYE BETEL

Mama m na-ekwu okwu ọma mgbe niile banyere Betel. Ọ na-agwa m, sị: “O nweghị ihe ga-eme m obi ụtọ karịa ka ị ghọọ onye Betel.” Ị ga-amazi ụdị ọṅụ m nwere na otú o si ju m anya na Jenụwarị 1946 mgbe m natara akwụkwọ e ji kpọọ m òkù ka m bịa nye aka n’ọrụ a na-arụ na Betel dị na Lọndọn ruo izu atọ. Mgbe izu atọ ahụ gwụrụ, Nwanna Pryce Hughes, bụ́ onye na-elekọta alaka ụlọ ọrụ ahụ n’oge ahụ, gwara m ka m nọrọzie na Betel. Ọzụzụ m nwetara n’ebe ahụ abaarala m uru kemgbe ahụ.

E nwere ihe dị ka mmadụ iri atọ na-arụ na Betel dị na Lọndọn n’oge ahụ. Ọtụtụ n’ime anyị bụ ụmụnna nwoke ndị na-eto eto, ma e nwekwara ọtụtụ ụmụnna bụ́ ndị e tere mmanụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ Pryce Hughes, Edgar Clay, na John Barr, bụ́ onye mechara soro n’Òtù Na-achị Isi. Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù ịkwado ụmụnna Kraịst, ndị bụ́ “ogidi.” (Gal. 2:9) Mụ na ha rụkọrọ ọrụ mgbe m na-eto eto, ha ana-elekọta m!

Otu ụbọchị na Betel, otu nwanna nwoke gwara m na e nwere nwanna nwaanyị kwụ n’ọnụ ụzọ, na ọ chọrọ ịhụ m. O juru m anya na ọ bụ mama m. O nwere ngwugwu o ji. O kwuru na ya agaghị abata ka ya ghara ịkwụsị m ọrụ. Ma, o nyere m ngwugwu ahụ, lawa. Ihe dị na ya bụ uwe oyi. Ihe ọma a o meere m mere ka m cheta otú Hana si achịtara nwa ya bụ́ Samuel uwe elu mgbe ọ na-eje ozi n’ụlọikwuu.—1 Sam. 2:18, 19.

AGAGHỊ M ECHEZỌ GILIED ECHEZỌ

Na 1947, a kpọrọ anyị mmadụ ise na-eje ozi na Betel ka anyị gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied n’Amerịka. N’afọ 1948, anyị gara klas nke iri na otu. Mgbe anyị ruru Amerịka, ezigbo oyi na-atụ n’ebe ụlọ akwụkwọ ahụ dị, bụ́ n’ebe ugwu Niu Yọk. Obi dị m ezigbo ụtọ maka uwe oyi ahụ mama m chịnyere m!

Agaghị m echezọ ọnwa isii ahụ m nọrọ na Gilied. Otú mụ na ụmụ akwụkwọ ibe m, bụ́ ndị si mba iri na isii, si kpakọrịta mere ka m mụta ọtụtụ ihe. Amụtara m ọtụtụ ihe mere ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma, mụtakwa ihe n’aka Ndị Kraịst tozuru okè, bụ́ ndị mụ na ha kpakọrịtara. Ụfọdụ n’ime ha bụ Lloyd Barry, bụ́ nwa akwụkwọ ibe m, Albert Schroeder, bụ́ onye so ná ndị nkụzi anyị, na John Booth, bụ́ onye na-elekọta Ugbo Alaeze (bụ́ ebe Ụlọ Akwụkwọ Gilied dị). Ha atọ mechara soro n’Òtù Na-achị Isi. Agaghị m echezọ ndụmọdụ ụmụnna ndị a ji ịhụnanya nye m na otú ha si jiri obi ha niile kwado Jehova na nzukọ ya.

ỌRỤ SEKIT NA ỊLAGHACHI BETEL

Mgbe m gụchara akwụkwọ na Gilied, e zigara m ọrụ sekit n’obodo Ohayo, n’Amerịka. Adị m naanị afọ iri abụọ na otu mgbe ahụ, ma ụmụnna ndị ahụ nabatara m nke ọma. Amụtara m ọtụtụ ihe n’aka ụmụnna ndị tọrọ m nọ na sekit ahụ, bụ́ ndị nọrọla ọtụtụ afọ n’ọgbakọ.

Mgbe ọnwa ole na ole gachara, a kpọrọ m ka m lọghachi na Betel dị na Bruklin ka a zụkwuo m. N’oge ahụ, amatara m ndị ọzọ bụ́ ogidi ná nzukọ Jehova dị ka Milton Henschel, Karl Klein, Nathan Knorr, T. J. (Bud) Sullivan, na Lyman Swingle, bụ́ ndị nwere mgbe ha so n’Òtù Na-achị Isi. Otú ha si rụọ ọrụ na otú ha si bie ndụ kụziiri m ọtụtụ ihe. Atụkwasịkwuru m nzukọ Jehova obi. Mgbe e mechara, e zighachiri m Yurop ka m jewekwa ozi n’ebe ahụ.

Mama m nwụrụ na Febụwarị 1950. Mgbe e lichara ya, mụ na papa m na nwanne m nwaanyị, bụ́ Dora, kparịtara ezigbo ụka. Ajụrụ m ha ihe ha chọrọ ime banyere ofufe Jehova ugbu a Mama nwụrụ, mụnwa anọghịzikwa n’ụlọ. E nwere nwanna nwoke e tere mmanụ ha na-akwanyere ùgwù nke aha ya bụ Harry Browning. Ha kwetara na ha na ya ga-ekwurịta banyere ihe Baịbụl na-akụzi. N’ime otu afọ, e mere papa m na Dora baptizim. E mechara họpụta papa m ịbụ ohu na-eje ozi n’Ọgbakọ Gillingham. Mgbe Papa nwụrụ, Dora lụrụ Roy Moreton, bụ́ okenye kwesịrị ntụkwasị obi. Dora ji obi ya niile jeere Jehova ozi ruo mgbe ọ nwụrụ na 2010.

INYE AKA NA FRANS

A kụziiri m asụsụ French, Jaman, na Latịn n’ụlọ akwụkwọ gọọmenti. Ma n’ime asụsụ atọ ahụ, ọ bụ French kacha siere m ike. N’ihi ya, obi eruchaghị m ala mgbe a gwara m ka m gaa Frans rụwa ọrụ na Betel dị na Paris. N’ebe ahụ, obi dị m ụtọ na mụ na Henri Geiger, bụ́ onye na-elekọta alaka ụlọ ọrụ ahụ, rụkọrọ ọrụ. Ọ bụ okenye merela agadi, bụrụkwa onye e tere mmanụ. Ọrụ Betel adịchaghị mfe, amakwa m na e nwere ọtụtụ ihe m na-emetaghị, ma amụtara m ọtụtụ ihe banyere otú mmadụ na ibe ya ga-esi na-emekọ ihe n’udo.

E mere ndokwa ka e nwee mgbakọ mba niile na Paris n’afọ 1951, bụ́ nke mbụ a ga-enwe kemgbe agha biri. Esokwa m ná ndị haziri ya. Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-akatabeghị ahụ́ bịara Betel inyere m aka. Aha ya bụ Léopold Jontès. E mechara họpụta ya ka ọ bụrụ onye na-elekọta alaka. E mere mgbakọ ahụ na Palais des sports, nke dị nso n’Ụlọ Elu Ifel. Ndị bịara mgbakọ ahụ si mba iri abụọ na asatọ. N’ụbọchị ikpeazụ, obi tọrọ puku ụmụnna isii na-asụ French ụtọ ịhụ iri puku mmadụ, narị anọ na iri ise na isii bịara mgbakọ ahụ.

Mgbe mbụ m bịara Frans, amachaghị m asụ French, nke kakwanụ njọ bụ na m na-asụ French naanị mgbe o doro m anya na m gaghị akpọhie okwu. Ma, ọ bụrụ na mmadụ akpọhieghị okwu, a gaghị agbazi ya olu, ọ gaghịkwa amụta asụsụ.

Iji nyere m aka ịmụtakwu asụsụ ahụ, amalitere m ịga ụlọ akwụkwọ ebe a na-akụziri ndị ala ọzọ French. M na-aga ụlọ akwụkwọ ahụ ná mgbede anyị na-enweghị ọmụmụ ihe. Asụsụ French malitere ịtọ m ụtọ, ọ ka na-atọ m ezigbo ụtọ. Asụsụ a abaarala m uru n’ihi na enyerela m alaka ụlọ ọrụ Frans aka n’ọrụ nsụgharị. M mechara ghọọ onye nsụgharị, na-asụgharị ihe e dere na Bekee ka ọ bụrụ French. Ọ bụ ihe ùgwù inyere ụmụnna ndị na-asụ French n’ụwa niile aka inweta nri ime mmụọ ohu ahụ na-enye anyị.—Mat. 24:45-47.

ỊLỤ NWAANYỊ NA IHE ÙGWÙ NDỊ ỌZỌ

N’afọ 1956, alụrụ m Esther, bụ́ ọsụ ụzọ onye Swizaland m matara afọ ole na ole tupu mgbe ahụ. Anyị gbara akwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’akụkụ Betel dị na Lọndọn (bụ́ ebe bụbu Lọndọn Tabanakụl, bụ́kwa ebe e mere mama m baptizim). Ọ bụ Nwanna Hughes kwuru okwu agbamakwụkwọ anyị. Mama Esther bịara, o sokwa ná ndị nwere olileanya ịga eluigwe. Ịlụ Esther mere ka m nwee nwunye hụrụ m n’anya mụ na ya na-akpakọrịta, meekwa ka m nweta ọgọ nwaanyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, bụ́ onye mụ na ya kpakọrịtara ọtụtụ mgbe ruo mgbe o jechara ozi ya n’ụwa n’afọ 2000.

Mgbe mụ na Esther gbachara akwụkwọ, anyị ebighị n’ime Betel. Ọ bụ ezie na m ka nọ na-arụ ọrụ nsụgharị na Betel, Esther bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche mgbe ahụ n’ebe mpụga Paris. O nyeere ọtụtụ ndị aka ịmalite ife Jehova. N’afọ 1964, a kpọrọ anyị ka anyị bịa biri na Betel. Na 1976, mgbe a malitere inwe Kọmitii Alaka, a họpụtara m iso na ya. Esther na-akwado m kemgbe ọtụtụ afọ.

“MỤ NA UNU ANỌGHỊ MGBE NIILE”

Agaala m isi ụlọ ọrụ anyị dị na Niu Yọk ugboro ugboro. N’oge ndị ahụ, ndị so n’Òtù Na-achị Isi nyere m ezigbo ndụmọdụ. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe e nyere m ọrụ, gwa m mgbe m ga-arụcha ya. Ma mgbe m gwara Nwanna Knorr na m na-eche otú m ga-esi rụchaa ọrụ ahụ n’oge, ọ mụmụrụ ọnụ ọchị ma gwa m, sị: “Echegbula onwe gị. Rụwa ọrụ!” Kemgbe ahụ, mgbe ọ bụla m nwere ọrụ karịrị akarị, kama ichegbuwe onwe m, m na-arụwa ha otu otu, ọtụtụ mgbe, m na-arụchakwa ha n’oge.

Tupu Jizọs anwụọ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mụ na unu anọghị mgbe niile.” (Mat. 26:11) Anyị bụ́ atụrụ ọzọ makwa na ụmụnna Kraịst e tere mmanụ agaghị eso anyị nọrọ n’ụwa mgbe niile. N’ihi ya, ọ bụụrụ m ihe ùgwù na-enweghị atụ na mụ na ọtụtụ ndị e tere mmanụ ejekọọla ozi ihe karịrị afọ iri asaa. Obi dị m ụtọ na m jidere uwe mwụda nke onye Juu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ị chọọ ịgụkwu banyere “Jọnadab,” gụọ akwụkwọ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peeji nke 83, 165, na nke 166; Ụlọ Nche Febụwarị 15, 2010, peeji nke 16-17, paragraf nke 8 na nke 10.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]

Nwanna Knorr mụmụrụ ọnụ ọchị ma gwa m, sị: “Echegbula onwe gị. Rụwa ọrụ!”

[Foto ndị dị na peeji nke 19]

(N’aka ekpe) Mama m na papa m

(N’aka nri) N’ụlọ akwụkwọ Gilied n’afọ 1948, eyi m uwe oyi ahụ Mama nyere m

[Foto dị na peeji nke 20]

Ebe m na-asụgharị okwu Nwanna Lloyd Barry mgbe a raara alaka ụlọ ọrụ Frans nye, n’afọ 1997

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

(N’aka ekpe) Mụ na Esther n’ụbọchị anyị gbara akwụkwọ

(N’aka nri) Ebe anyị abụọ nọ n’ozi ọma