Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-egbukepụ Ebube Jehova?

Ị̀ Na-egbukepụ Ebube Jehova?

Ị̀ Na-egbukepụ Ebube Jehova?

“Anyị na-egbukepụ ebube Jehova dị ka enyo.”—2 KỌR. 3:18.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

Olee otú anyị nwere ike isi na-eto Jehova n’agbanyeghị na anyị ezughị okè?

Olee otú ikpe ekpere na ịga ọmụmụ ihe si enyere anyị aka igbukepụ ebube Chineke?

Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eto Jehova?

1, 2. Gịnị mere o ji bụrụ na anyị nwere ike iṅomi àgwà Jehova?

E NWERE otú anyị niile si yie ndị mụrụ anyị. N’ihi ya, anyị nwere ike ịnụ ka a gwara nwa okorobịa, sị, ‘I yiri nna gị.’ E nwere ike ịgwa nwa agbọghọ, sị, ‘Ọ na-abụ m hụ gị, mụ echeta mama gị.’ Ụmụaka na-emekarị ihe ha hụrụ ndị mụrụ ha na-eme. Anyịnwa kwanụ? Ànyị nwere ike iṅomi Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova? N’agbanyeghị na anyị ahụbeghị ya, anyị nwere ike ịghọta àgwà ya ma anyị gụọ Okwu ya, bụ́ Baịbụl, hụ ihe ndị o kere, tụgharịakwa uche n’Akwụkwọ Nsọ, karịchaa n’ihe ndị Ọkpara Chineke bụ́ Jizọs Kraịst kwuru na ihe ndị o mere. (Jọn 1:18; Rom 1:20) Anyị nwere ike igbukepụ ebube Jehova.

2 Tupu Chineke ekee Adam na Iv, obi siri ya ike na ndị mmadụ ga-emezu ihe o bu n’obi kee ha, ṅomie àgwà ya ma wetara ya otuto. (Gụọ Jenesis 1:26, 27.) Ka anyị na-efe Onye kere anyị, anyị kwesịrị iṅomi àgwà ya. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, anyị nwere ihe ùgwù igbukepụ ebube Chineke n’agbanyeghị obodo ebe anyị si, ebe anyị gụruru akwụkwọ, ma ọ bụ agbụrụ anyị. N’ihi gịnị? N’ihi na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.

3. Olee otú obi na-adị Ndị Kraịst mgbe ha na-ejere Jehova ozi?

3 Ndị Kraịst e tere mmanụ na-egbukepụ ebube Jehova. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi, bụ́ onye e ji mmụọ nsọ mụọ ọzọ, ji dee, sị: “Ọ bụ ezie na anyị na-egbukepụ ebube Jehova dị ka enyo n’ihu a na-ekpuchighị ákwà, a na-agbanwe anyị niile inwe otu onyinyo ahụ site n’ebube ruo n’ebube.” (2 Kọr. 3:18) Mgbe Mozis onye amụma bu mbadamba nkume abụọ e dere Iwu Iri ahụ si n’Ugwu Saịnaị gbadata, ihu ya na-enwupụta ìhè n’ihi na ya na Jehova kwurịtara okwu. (Ọpụ. 34:29, 30) Ụdị ihe ahụ emetụbeghị Ndị Kraịst, ihu ha anaghịkwa enwupụta ìhè. Ma, mgbe ha na-agwa ndị mmadụ banyere Jehova, àgwà ya, na nzube ya magburu onwe ya maka ndị mmadụ, ihu ha na-egosi na obi dị ha ụtọ. N’ihi ya, dị ka enyo oge ochie bụ́ ígwè na-akwọ mụrụmụrụ, ndị e tere mmanụ na ndị so n’atụrụ ọzọ na-egbukepụ ebube Jehova n’otú ha si ebi ndụ nakwa n’ozi ọma ha na-ekwusa. (2 Kọr. 4:1) Ị̀ na-eme omume ọma, na-ekwusakwa ozi ọma mgbe niile, nke ga-eme ka ị na-egbukepụ ebube Jehova?

ANYỊ CHỌRỌ ỊNA-EGBUKEPỤ EBUBE JEHOVA

4, 5. (a) Dị ka Pọl, olee ọgụ anyị na-alụ n’obi anyị? (b) Gịnị ka mmehie na-eme ụmụ mmadụ?

4 Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, anyị chọrọ ịna-asọpụrụ Onye kere anyị, na-etokwa ya n’ihe niile anyị na-eme. Ma, ọtụtụ mgbe, ihe anyị chọrọ ime abụghị ihe anyị na-eme. Ụdị ihe ahụ mekwara Pọl. (Gụọ Ndị Rom 7:21-25.) O kwuru ihe mere anyị ji nwee nsogbu ahụ. O dere, sị: “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke.” (Rom 3:23) Mmehie Adam mere ka mmadụ niile bụrụ ndị ohu mmehie, mmehie ana-achịkwa ha ka eze obi tara mmiri.—Rom 5:12; 6:12.

5 Gịnị bụ mmehie? Mmehie bụ ihe ọ bụla megidere àgwà Jehova, ụzọ ya, ụkpụrụ ya, na uche ya. Mmehie na-eme ka mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma. Ọ na-eme ka anyị ghara igbukepụ ebube Jehova, otú ahụ otu ihe nwere ike ime ka onye gbara ụta gbajọọ ya. Anyị nwere ike ịkpachara anya mehie ma ọ bụkwanụ mehie n’amaghị ama. (Ọnụ Ọgụ. 15:27-31) Mmehie dị ndị mmadụ n’ọbara, na-ekewakwa ha na Onye kere ha. (Ọma 51:5; Aịza. 59:2; Kọl. 1:21) Ọ bụ ya mere na ọtụtụ ndị anaghị eme uche Jehova, ha anaghịkwa egbukepụ ebube Chineke, nke bụ́ ihe ùgwù na-enweghị atụ. O doro anya na mmehie bụ nsogbu kacha akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ.

6. N’agbanyeghị na anyị bụ ndị mmehie, olee otú anyị nwere ike isi nye Chineke otuto?

6 N’agbanyeghị na anyị bụ ndị mmehie, Jehova egosila na ya bụ “Chineke onye na-enye olileanya.” (Rom 15:13) O mere ka e nwee ihe ga-ewepụ mmehie, ya bụ, àjà mgbapụta ahụ Jizọs Kraịst chụrụ. N’ihi okwukwe anyị nwere n’àjà ahụ, anyị abụghịzi “ndị ohu nke mmehie,” kama anyị nwere ike igbukepụ ebube Jehova. (Rom 5:19; 6:6; Jọn 3:16) Ọ bụrụ na anyị abụrụ enyi Jehova mgbe niile, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-agọzi anyị ugbu a. N’ọdịnihu, ọ ga-eme ka anyị zuo okè, nwetakwa ndụ ebighị ebi. Ọ bụụrụ anyị ezigbo ihe ùgwù na Chineke ma na anyị nwere ike ịna-egbukepụ ebube ya n’agbanyeghị na anyị ka bụ ndị mmehie!

IGBUKEPỤ EBUBE CHINEKE

7. Gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta banyere onwe anyị iji na-egbukepụ ebube Chineke?

7 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-egbukepụ ebube Chineke, anyị kwesịrị ịghọta na anyị niile na-eme mmehie. (2 Ihe 6:36) Anyị kwesịrị ikweta na anyị adịghị ike n’ebe ndị ahụ ma gbalịsie ike imeri ha ka anyị nwee ike ịna-eto Chineke. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị amalite ile ndị gba ọtọ, nke bụ́ mmehie jọgburu onwe ya, ka anyị ghọta na ndị okenye kwesịrị inyere anyị aka, anyị agakwurukwa ha ka ha nyere anyị aka. (Jems 5:14, 15) Ọ bụ ihe mbụ anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inye Chineke otuto n’eziokwu. Ebe anyị na-efe Jehova, anyị kwesịrị ịna-enyocha onwe anyị mgbe niile iji mata ma ànyị na-eme ihe Jehova chọrọ. (Ilu 28:18; 1 Kọr. 10:12) N’agbanyeghị ihe bụ́ adịghị ike anyị, anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike imeri ha ka anyị nwee ike ịna-egbukepụ ebube Chineke.

8. Gịnị ka anyị kwesịrị ime n’agbanyeghị na anyị bụ ndị na-ezughị okè?

8 Ọ bụ naanị Jizọs bụ mmadụ dịchara ndụ nwụọ n’emejọghị Chineke, n’akwụsịghịkwa igbukepụ ebube Chineke. Jizọs zuru okè, anyịnwa ezughị okè. Ma, anyị nwere ike iṅomi ya, kwesịkwa ịna-eṅomi ya. (1 Pita 2:21) Jehova na-ahụ ọganihu anyị na-enwe nakwa otú anyị si agbalịsi ike inye ya otuto, ọ na-agọzikwa mgbalị anyị.

9. Olee otú Baịbụl si enyere Ndị Kraịst chọrọ ime uche Chineke aka?

9 Okwu Jehova nwere ike inyere anyị aka ịmata ụzọ ka mma anyị ga-esi na-egbukepụ ebube Chineke. Anyị kwesịrị ịmụ Baịbụl nke ọma, na-agụ ya ma na-atụgharị uche na ya. (Ọma 1:1-3) Ịgụ Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị ga-enyere anyị aka imekwu nke ọma. (Gụọ Jems 1:22-25.) Ihe anyị mụtara na Baịbụl na-eme ka okwukwe anyị sie ike, na-emekwa ka anyị kpebisie ike ime uche Jehova na izere mmehie.—Ọma 119:11, 47, 48.

10. Olee otú ekpere nwere ike isi nyere anyị aka imekwu nke ọma n’ozi Jehova?

10 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-egbukepụ ebube Chineke, anyị kwesịkwara ‘ịnọgidesi ike n’ekpere.’ (Rom 12:12) Anyị kwesịrị ikpe ekpere ka Jehova nyere anyị aka ijere ya ozi otú ọ chọrọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịrịọ ya ka o nye anyị mmụọ nsọ ya, nyekwuo anyị okwukwe, nyekwa anyị ike imeri ọnwụnwa na ‘ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.’ (2 Tim. 2:15; Mat. 6:13; Luk 11:13; 17:5) Otú ahụ nwatakịrị na-atụkwasị nna ya obi, anyị kwesịrị ịtụkwasị Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, obi. Ọ bụrụ na anyị arịọ ya ka o nyere anyị aka imekwu nke ọma n’ozi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-eme ya. Ka anyị ghara iche mgbe ọ bụla na anyị na-enye ya nsogbu! Kama nke ahụ, ka anyị jiri ekpere na-eto ya, na-ekele ya, na-arịọ ka o duzie anyị karịchaa mgbe a na-anwa anyị ọnwụnwa, na-arịọkwa ya ka o nyere anyị aka ife ya otú ga-ewetara aha nsọ ya otuto.—Ọma 86:12; Jems 1:5-7.

11. Olee otú ọmụmụ ihe ọgbakọ si enyere anyị aka igbukepụ ebube Chineke?

11 Chineke nyere “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” ọrụ ilekọta atụrụ ya dị oké ọnụ ahịa. (Mat. 24:45-47; Ọma 100:3) Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi chọrọ inyere anyị niile aka ịna-egbukepụ ebube Jehova. Otu ụzọ ohu ahụ si enyere anyị aka ime otú ahụ bụ ọmụmụ ihe ọgbakọ. Ọmụmụ ihe na-enyere anyị aka ime ka àgwà anyị ka mma otú onye na-akwa ákwà na-akwara anyị ákwà otú ọ ga-adị anyị mma n’ahụ́. (Hib. 10:24, 25) N’ihi ya, ka anyị na-abịa ọmụmụ ihe n’oge, n’ihi na ọ bụrụ na anyị na-abịakarị n’azụ oge, anyị agaghị erite uru niile anyị kwesịrị irite n’ọmụmụ ihe.

KA ANYỊ NA-EṄOMI CHINEKE

12. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Chineke?

12 Naanị ihe ga-eme ka anyị na-egbukepụ ebube Jehova bụ ‘ịghọ ndị na-eṅomi Chineke.’ (Efe. 5:1) Otu ụzọ anyị ga-esi ṅomie Jehova bụ ịmụta ile ihe anya otú o si ele ya. Ọ bụrụ na anyị ahapụ uche Chineke na-eme ihe dị anyị mma, anyị ga-ewetara Chineke nkọcha ma kpatara onwe anyị nsogbu. Ebe anyị bi n’ụwa dị n’aka ajọ onye ahụ bụ́ Ekwensu, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị kpọọ ihe Jehova kpọrọ asị asị, hụkwa ihe ọ hụrụ n’anya n’anya. (Ọma 97:10; 1 Jọn 5:19) Obi kwesịrị isi anyị ike na naanị otú anyị ga-esi jeere Chineke ozi nke ọma bụ ime ihe niile iji nye ya otuto.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:31.

13. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpọ mmehie asị, gịnịkwa ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị kpọrọ mmehie asị?

13 Jehova kpọrọ mmehie asị, anyị kwesịkwara ịkpọ ya asị. N’eziokwu, anyị kwesịrị ịgbara mmehie ọsọ, kama ime ihe ga-eme ka ọ fọ obere ka anyị mee mmehie. Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị izere ihe ga-eme ka anyị dapụ n’ezi ofufe, bụ́ ihe ga-eme ka anyị ghara inwe ike ito Chineke. (Diut. 13:6-9) N’ihi ya, ka anyị zere onye ọ bụla dapụrụ n’ezi ofufe ma ọ bụ onye sịrị na ya bụ nwanna ma ọ naghị asọpụrụ Chineke. Anyị kwesịrị izere onye dị otú ahụ ma ọ bụrụgodị na ọ bụ onye ezinụlọ anyị. (1 Kọr. 5:11) Ịgbalịwa igosi ndị si n’ezi ofufe dapụ ma ọ bụ ndị na-akatọ nzukọ Jehova na ihe ha na-akụzi abụghị eziokwu agaghị abara anyị uru. N’eziokwu, anyị ekwesịghị ịchọ ịmata ihe ha na-ekwu, ma hà dere ya n’akwụkwọ ma hà tinyere ya n’Ịntanet, n’ihi na o nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma.—Gụọ Aịzaya 5:20; Matiu 7:6.

14. Ka anyị na-agbalị igbukepụ ebube Chineke, olee àgwà e kwesịrị iji mara anyị, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

14 Otu ụzọ dị mkpa anyị ga-esi ṅomie Nna anyị nke eluigwe bụ ịhụ ndị ọzọ n’anya. N’eziokwu, anyị kwesịrị ịhụ ndị ọzọ n’anya otú ahụ ọ hụrụ ha. (1 Jọn 4:16-19) Otú anyị si hụ ibe anyị n’anya na-egosi na anyị na-eso ụzọ Jizọs, bụrụkwa ndị ohu Jehova. (Jọn 13:34, 35) Ebe anyị bụ ndị mmehie, o nwere ike isiri anyị ike mgbe ụfọdụ ịhụ ndị ọzọ n’anya. Ma, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike hụ ha n’anya mgbe niile. Ọ bụrụ na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya ma na-akpa àgwà Ndị Kraịst, ọ ga-enyere anyị aka izere mmehie na imeso ndị ọzọ omume ọjọọ.—2 Pita 1:5-7.

15. Ọ bụrụ na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya, olee otú anyị ga-esi na-emeso ha?

15 Ọ bụrụ na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya, anyị ga na-agbalị imere ha ihe ọma. (Rom 13:8-10) Dị ka ihe atụ, ịhụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị n’anya ga-eme ka anyị ghara ịkwa iko. Ọ bụrụ na anyị hụrụ ndị okenye n’anya ma jiri ọrụ ha na-arụ kpọrọ ihe, anyị ga na-erubere ha isi ma na-anọ n’okpuru ha. Ụmụaka ndị hụrụ nne ha na nna ha n’anya na-erubere ha isi, na-asọpụrụ ha, ha anaghịkwa ekwu okwu ọjọọ banyere ha. Ọ bụrụ na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya, anyị agaghị na-eleda ha anya ma ọ bụ na-akparị ha. (Jems 3:9) Ndị okenye hụrụ atụrụ Chineke n’anya na-emekwara ha ebere.—Ọrụ 20:28, 29.

16. Olee otú ịhụnanya ga-esi enyere anyị aka n’ozi anyị?

16 Ozi ọma anyị na-ekwusa kwesịrị igosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya. Ebe anyị ji obi anyị niile hụ Jehova n’anya, anyị agaghị ada mbà n’ihi na ndị mmadụ enweghị mmasị n’ozi anyị. Kama, anyị ga na-ekwusasi ozi ọma ike. Ịhụnanya ga-eme ka anyị na-akwado nke ọma ma na-agbalị ịkụzi Okwu Chineke nke ọma. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya n’eziokwu, ozi ọma anyị na-ekwusa agaghị abụ iji mezuo iwu. Kama, anyị ga-aghọta na ọ bụ nnukwu ihe ùgwù, jirikwa ọṅụ na-ekwusa ya.—Mat. 10:7.

NỌGIDE NA-ETO JEHOVA

17. Gịnị mere ịghọta na anyị adịghịkwa eru ebube Chineke ga-eji baara anyị uru?

17 O nweghịzi ihe ọtụtụ ndị ji mmehie kpọrọ, ma anyị ma na ọ bụ ihe ọjọọ. N’ihi ya, anyị na-agba mbọ ka anụ ahụ́ anyị ghara ime ka anyị mee mmehie. Anyị ghọta na anyị bụ ndị mmehie, ọ ga-enyere anyị aka ịzụ akọnuche anyị ka anyị nwee ike ime ihe anyị kwesịrị ime mgbe ọ bụla ihe ọjọọ batawara anyị n’obi. (Rom 7:22, 23) N’agbanyeghị na anyị adịghị ike, Chineke nwere ike inye anyị ike ime ihe ziri ezi n’agbanyeghị ihe merenụ.—2 Kọr. 12:10.

18, 19. (a) Olee ihe na-enyere anyị aka imeri Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebi ime?

18 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ito Jehova, anyị ga na-alụso Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ọgụ. Ngwá agha ime mmụọ Chineke nyere anyị ga-enyere anyị aka imeri n’ọgụ ahụ. (Efe. 6:11-13) Setan na-eme ihe niile o nwere ike ime ka a ghara inye Jehova otuto e kwesịrị inye naanị ya. Ekwensu na-agbalịkwa ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. Ma mgbe anyị na ọtụtụ nde ndị ọzọ na-ezughị okè, ma ndị ikom ma ndị inyom ma ụmụaka, na-ekwesị ntụkwasị obi ma na-eto Chineke, ọ na-abụrụ Setan ezigbo ihe ihere! N’ihi ya, ka anyị nọgide na-eto Jehova otú ahụ ndị nọ n’eluigwe si na-eto ya, na-asị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile, ọ bụkwa n’ihi uche gị ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.”—Mkpu. 4:11.

19 Ka anyị kpebisie ike na ihe ọ sọkwara ya mee, anyị ga na-eto Jehova. O doro anya na obi na-adị ya ụtọ ịhụ ka ọtụtụ ndị ohu ya na-eme ihe niile ha nwere ike ime iji na-eṅomi ya ma na-egbukepụ ebube ya. (Ilu 27:11) Ka anyị kwuo ka Devid, bụ́ onye bụrụ abụ, sị: “M ji obi m dum na-eto gị, Jehova Chineke m, m ga-enyekwa aha gị otuto ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọma 86:12) Anyị na-atụ anya mgbe anyị ga-enwe ike igbukepụ ebube Jehova n’ụzọ zuru okè ma too ya ruo mgbe ebighị ebi! Ụmụ mmadụ ndị na-erubere Chineke isi ga-eme otú ahụ. Ị̀ na-egbukepụ ebube Jehova Chineke ugbu a, na-atụ anya ime otú ahụ ruo mgbe ebighị ebi?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Ị̀ na-egbukepụ ebube Jehova n’ihe ndị a?