Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọrụ Kọpọtụa Na-atọkwu M Ụtọ Kwa Ụbọchị”

“Ọrụ Kọpọtụa Na-atọkwu M Ụtọ Kwa Ụbọchị”

Ihe Si n’Ebe Anyị Na-edebe Ihe Ochie

“Ọrụ Kọpọtụa Na-atọkwu M Ụtọ Kwa Ụbọchị”

N’AFỌ 1886, e si n’Ụlọ Baịbụl dị n’Alegeni, n’Amerịka, buru otu narị akwụkwọ Millennial Dawn, Nke 1, gawa Chikago dị n’Ilinọị. Charles Taze Russell bu n’obi ibuga akwụkwọ ọhụrụ ndị ahụ n’ebe ndị a na-ere akwụkwọ. Otu nnukwu ụlọ ahịa na-ere akwụkwọ okpukpe n’Amerịka kwetara ka e butere ha akwụkwọ Millennial Dawn. Ma, ka izu abụọ gachara, e bughachiri akwụkwọ ahụ niile n’Ụlọ Baịbụl.

E kwuru na mgbe otu onye a ma ama nke na-ekwu okwuchukwu hụrụ akwụkwọ Millennial Dawn n’ebe a kpọsara akwụkwọ ndị nke ya, ezigbo iwe were ya. O kwuru na ọ bụrụ na a hapụ akwụkwọ Millennial Dawn n’ụlọ ahịa ahụ, ya na ndị enyi ya, bụ́ ndị a ma ama na-ekwukwa okwuchukwu, ga-ebuga akwụkwọ ha n’ebe ọzọ, ha na ndị ụlọ ahịa ahụ agaghịzi na-azụkọ ahịa. N’ihi ya, onye ahụ na-ere akwụkwọ bughachiri akwụkwọ Millennial Dawn ndị ahụ. Ka ọ dị mgbe ahụ, a kwụọla ụgwọ ka a kpọsaa akwụkwọ ahụ n’akwụkwọ akụkọ. Ma, ndị iro mere ka a ghara ịkpọsa ya n’akwụkwọ akụkọ. Oleekwanụ otú ndị chọrọ ịnụ eziokwu Baịbụl ga-esi nweta akwụkwọ ọhụrụ a?

Ndị a na-akpọbu ndị kọpọtụa mere ka ndị mmadụ nweta ya. * N’afọ 1881, Zion’s Watch Tower kwuru na a chọrọ otu puku ndị nkwusa ga-eji oge ha niile kesaa akwụkwọ e ji amụ Baịbụl. N’agbanyeghị na ndị kọpọtụa dị ihe dị ka narị atọ, ha kesara akwụkwọ ndị e ji akụzi eziokwu Baịbụl n’ebe niile. Ka afọ 1897 na-agwụcha, e kesaala ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu nde akwụkwọ Millennial Dawn. Ọ bụ ndị kọpọtụa kesara ọtụtụ n’ime ha. Ihe ọtụtụ n’ime ha ji eri ihe bụ obere ego mmachi akpa a na-enye ha maka ọda Ụlọ Nche ọ bụla mmadụ si n’aka ha tụọ ma ọ bụ akwụkwọ ha nyere mmadụ.

Ole ndị bụ ndị kọpọtụa a ụjọ na-anaghị atụ? Ụfọdụ malitere ọrụ ahụ mgbe ha dị afọ iri na ụma, ndị ọzọ malitere ya mgbe ha torola. Ọtụtụ n’ime ha alụghị di ma ọ bụ nwunye. Ọtụtụ bụ ndị di na nwunye na-amụghị ụmụ. Ma e nwere ọtụtụ ezinụlọ so rụọ ọrụ ahụ. Ndị kọpọtụa oge niile na-aga ozi ọma si n’ụtụtụ ruo n’anyasị, ndị kọpọtụa inyeaka na-ekwusa ozi ọma otu awa ma ọ bụ awa abụọ kwa ụbọchị. E nwere ndị ọzọ ọrịa ma ọ bụ ihe ọzọ na-ekweghị ka ha bụrụ ndị kọpọtụa. Ma, n’otu mgbakọ e nwere n’afọ 1906, a gwara ndị ga-emeli ya na ọ bụghị iwu na ha ga-abụ “ndị gụrụ oké akwụkwọ ma ọ bụ ndị ụbụrụ ha na-aghọ nkọ ma ọ bụ ndị nwere ire ndị mmụọ ozi.”

Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na n’ebe niile n’ụwa, ndị na-agụghị oké akwụkwọ rụrụ ihe juru ndị mmadụ anya. Otu nwanna kwuru na ya nyere ndị mmadụ puku akwụkwọ iri na ise n’ime afọ asaa. Ma, o kwuru, sị, “Ihe mere m ji bụrụ kọpọtụa abụghị na m chọrọ ịbụ onye na-ere akwụkwọ, kama ọ bụ n’ihi na m chọrọ ịgbara Jehova na eziokwu ya àmà.” N’ebe ọ bụla ndị kọpọtụa gara, eziokwu Baịbụl gbanyere mgbọrọgwụ, e nweekwa ọtụtụ Ndị Mmụta Baịbụl.

Ndị ụkọchukwu kparịrị ndị kọpọtụa. Ha kpọrọ ha ndị ore akwụkwọ. Ụlọ Nche (Bekee) 1892 kwuru, sị: “Naanị mmadụ ole na ole maara na [ha] bụ ndị na-anọchi anya Onyenwe anyị n’eziokwu, ma ọ bụ ghọta na Onyenwe anyị anaghị eji ha egwuri egwu n’ihi ịdị umeala n’obi ha na otú ha si ewepụta onwe ha ije ozi.” N’eziokwu, otu n’ime ha kwuru na ịbụ onye kọpọtụa adịghị mfe. Naanị ihe ha na-eji aga ebe ha na-aga bụ akpụkpọ ụkwụ na ígwè siri ike. Mgbe ego kọrọ ha, ha na-eji akwụkwọ gbanwere nri. Ha gachaa ozi ọma n’ụbọchị, ike na-agwụ ha, ma obi na-adị ha ụtọ mgbe ha na-alaghachi n’ụlọikwuu ha ma ọ bụ n’ụlọ ebe ha na-akwụ ụgwọ ya. Ka oge na-aga, e wepụtara Ụgbọ Ndị Kọpọtụa, nke bụ́ ụlọ ịnyịnya na-adọkpụ. Ịrụ ya anaghị efu oké ego. Ọ naghịkwa ewe oge. *

Malite ná Mgbakọ Distrikti e nwere na Chikago n’afọ 1893, e nwere oge pụrụ iche e wepụtara maka ndị kọpọtụa. A na-eji ya akọ ahụmahụ ndị tọrọ ụtọ, tụọkwa aro otú e nwere ike isi kwusaa ozi ọma, nyekwa ha ndụmọdụ ndị ga-abara ha uru. O nwere mgbe Nwanna Russell gbara ndị nkwusa na-arụsi ọrụ ike ume ka ha na-eri ezigbo nri n’ụtụtụ, ṅụọ mmiri ara ehi ma ha gatụ ozi ọma n’ụtụtụ ahụ, raakwa aịs krim n’ụbọchị okpomọkụ dị.

Ndị kọpọtụa bụ́ ndị chọrọ onye ha na ha ga-eso na-aga ozi ọma na-etinye ákwà na-acha odo odo n’uwe ha. Ndị kọpọtụa ọhụrụ na ndị bụrụla ndị kọpọtụa ọtụtụ afọ na-arụ n’ozi ọma. O doro anya na ọzụzụ dị otú ahụ bara uru, n’ihi na otu onye kọpọtụa ọhụrụ ụjọ na-atụ gwara onye ọ na-achọ inye akwụkwọ, sị, “Echeghị m na ị chọrọ akwụkwọ a, ka ị̀ chọrọ ya?” Ọ dị mma na onye ahụ o ziri ozi ọma naara akwụkwọ ahụ ma mechaa ghọọ nwanna nwaanyị.

Otu nwanna nwoke jụrụ, sị, ‘Ọ̀ bụ m nọgide n’ọrụ m na-arụ nke na-enye m ezigbo ego ma na-enye onyinye otu puku dọla kwa afọ, ka ọ̀ bụ m ghọọ onye kọpọtụa?’ A gwara ya na Onyenwe anyị ga-anabata nke ọ bụla n’ime ihe abụọ ahụ, ma iwepụta oge ya jee ozi Onyenwe anyị ga-aka ewetara ya ngọzi. Mary Hinds kwuru na ịrụ kọpọtụa bụ “ụzọ kacha mma mmadụ ga-esi nyere ọtụtụ ndị aka.” Alberta Crosby, bụ́ onye na-eme ihere, kwuru, sị, “Ọrụ kọpọtụa na-atọkwu m ụtọ kwa ụbọchị.”

Taa, ọtụtụ ụmụ ndị kọpọtụa ahụ nụrụ ọkụ n’obi na ndị ha mụụrụ ihe ka na-eje ozi oge niile. Ọ bụrụ na e nwebeghị onye kọpọtụa ma ọ bụ onye ọsụ ụzọ n’ezinụlọ unu, ọ́ gaghị adị mma ka ị malite ya? Ikwusa ozi ọma oge niile ga na-atọkwu gị ụtọ kwa ụbọchị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Mgbe afọ 1931 gachara, a malitere ịkpọ “ndị kọpọtụa” “ndị ọsụ ụzọ.”

^ par. 8 A ga-akọwakwu ụgbọ ahụ n’Ụlọ Nche a ga-ebipụta n’ọdịnihu.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 32]

Ọ bụghị iwu na ha ga-abụ “ndị gụrụ oké akwụkwọ ma ọ bụ ndị ụbụrụ ha na-aghọ nkọ ma ọ bụ ndị nwere ire ndị mmụọ ozi”

[Foto dị na peeji nke 31]

Onye kọpọtụa bụ́ Alfred Winfred Osei na Gana, ihe dị ka n’afọ 1930

[Foto ndị dị na peeji nke 32]

N’elu: Ndị kọpọtụa bụ́ Edith Keen na Gertrude Morris n’Ingland, ihe dị ka n’afọ 1918; n’okpuru: Stanley Cossaboom na Henry Nonkes n’Amerịka, na okpokoro katọn ndị ha nyefecharala akwụkwọ ndị dị na ha