Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Lezienụ Anya Maka Ihe Iko Achịcha Ndị Farisii”

“Lezienụ Anya Maka Ihe Iko Achịcha Ndị Farisii”

“Lezienụ Anya Maka Ihe Iko Achịcha Ndị Farisii”

Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya maka ihe iko achịcha ndị Farisii, ya bụ, ihu abụọ.” (Luk 12:1) Ebe ọzọ e dere okwu ahụ Jizọs kwuru mere ka o doo anya na ọ bụ “ozizi” ndị Farisii ka Jizọs kwuru na ọ dịghị mma.—Mat. 16:12.

N’ebe ụfọdụ na Baịbụl, “ihe iko achịcha” na-anọchi anya ihe na-emerụ mmadụ. O doro anya na ozizi ndị Farisii na otú ha si eche echiche mere ka ndị na-ege ha ntị na-eme ihe ọjọọ. Gịnị mere na ozizi ndị Farisii adịghị mma?

1 Ndị Farisii dị mpako, cheekwa na ha ka mmadụ niile mma, nakwa na ha bụ ndị ezi omume karịa ndị ọzọ.

N’otu ilu Jizọs, o kwuru banyere àgwà ọjọọ ha. O kwuru, sị: “Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ wee malite ikpe ekpere n’obi ya, sị, ‘Chineke, ana m ekele gị na adịghị m ka ụmụ mmadụ ndị ọzọ, bụ́ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị ajọ omume, ndị na-akwa iko ma ọ bụ ọbụna dị ka onye ọnaụtụ a. Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ n’izu, ana m enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile m nwetara.’ Ma onye ọnaụtụ ahụ guzo n’ebe dị anya, ọ chọghị ọbụna ileli anya ya lee eluigwe, kama ọ nọ na-eti aka n’obi, na-asị, ‘Chineke, meere mụ onwe m bụ́ onye mmehie amara.’”—Luk 18:11-13.

Jizọs jara onye ọnaụtụ ahụ mma n’ihi na ọ dị umeala n’obi. Jizọs kwuru, sị: “Ana m asị unu, Nwoke a laruru n’ụlọ ya wee bụrụ onye ezi omume karịa nwoke ahụ [bụ́ onye Farisii]; n’ihi na onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, ma onye na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.” (Luk 18:14) N’agbanyeghị na ndị ọnaụtụ anaghị akwụwa aka ọtọ, Jizọs chọrọ inyere ndị ọnaụtụ gere ya ntị aka. Baịbụl kwuru na ndị ọnaụtụ abụọ, bụ́ Matiu na Zakịọs, ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chere na anyị ka ndị ọzọ mma n’ihi amamihe Chineke nyere anyị ma ọ bụ ihe ùgwù anyị nwere ma ọ bụ n’ihi ihe ndị ọzọ na-anaghị emeta? Anyị kwesịrị iwepụ ụdị echiche ahụ n’obi anyị ozugbo n’ihi na Baịbụl kwuru, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo, ọ dịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu, ọ dịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya, ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe. Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ. Ọ dịghị aṅụrị ọṅụ n’ihi ajọ omume, kama ọ na-eso eziokwu aṅụrị ọṅụ.”—1 Kọr. 13:4-6.

Anyị kwesịrị iche echiche ka Pọl onyeozi. Mgbe o kwuchara na “Kraịst Jizọs bịara n’ụwa ịzọpụta ndị mmehie,” o kwukwara, sị: “N’ime ndị a, abụ m onye mbụ.”—1 Tim. 1:15.

Ajụjụ ndị i kwesịrị ichebara echiche:

M̀ ghọtara na m bụ onye mmehie nakwa na ọ bụ naanị n’ihi obiọma Jehova nke na-erughịrị mmadụ ka a ga-eji zọpụta m? Ka m̀ chere na m ka ndị ọzọ n’ihi na efeela m Jehova ruo ọtụtụ afọ, ma ọ bụ n’ihi ihe ùgwù ndị m nwere ná nzukọ Chineke, ma ọ bụkwanụ n’ihi ihe ndị m na-emeta?

2 Ndị Farisii na-eme ihe ọma ka ndị ọzọ hụ ha ma chee na ha bụ ndị ezi omume. Ha chọrọ ịbụ ndị a ma ama, chọọkwa ka a na-etu ha aha.

Ma, Jizọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Ha na-arụ ọrụ niile ha na-arụ ka ndị mmadụ hụ ha; n’ihi na ha na-eme ka mkpọ̀ a na-etinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ ndị ha na-eyi dị ka ihe nchebe bukwuo ibu, na-emekwa ka ọnụ ọnụ uwe ha sakwuo mbara. Ọ na-atọ ha ụtọ ịnọ n’ebe kasị ùgwù ná nri anyasị nakwa n’oche ihu n’ụlọ nzukọ, nakwa ka a na-ekele ha n’ọma ahịa, ka ndị mmadụ na-akpọkwa ha Rabaị.” (Mat. 23:5-7) Otú ha si eche echiche dị iche n’otú Jizọs si eche. N’agbanyeghị na o zuru okè, bụrụkwa Ọkpara Chineke, ọ dị umeala n’obi. Mgbe otu nwoke kpọrọ ya “ezi onye,” ọ sịrị: “Gịnị mere i ji akpọ m ezi onye? Ọ dịghị onye bụ́ ezi onye, ma e wezụga otu onye, ya bụ, Chineke.” (Mak 10:18) E nwekwara mgbe Jizọs sara ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya iji kụziere ha na ha kwesịrị ịna-adị umeala n’obi.—Jọn 13:1-15

Ezi Onye Kraịst kwesịrị ịna-ejere ụmụnna ya ozi. (Gal. 5:13) Ndị chọrọ ịbụ ndị nlekọta n’ọgbakọ kwesịrị ịna-eme otú ahụ. Mmadụ kwesịrị ‘ịna-agbalị ka o ruo eru ịbụ onye nlekọta,’ ma o kwesịrị ịbụ n’ihi na ọ chọrọ inyere ndị ọzọ aka. Ịbụ onye nlekọta apụtaghị na e nyela ya ọkwá ma ọ bụ na ọ bụ ya na-achị ndị ọzọ. Ndị nlekọta kwesịrị iṅomi Jizọs ma ‘dị umeala n’obi.’—1 Tim. 3:1, 6; Mat. 11:29.

Ajụjụ ndị i kwesịrị ichebara echiche:

M̀ na-emenyere ndị nlekọta n’ọgbakọ n’ihi na m chọrọ ịbụ onye a ma ama ma ọ bụ ka ha nyekwuo m ihe ùgwù? Ihe m na-achọkarị ịrụ n’ozi Chineke ọ̀ bụ ihe ga-eme ka ndị mmadụ mara m ma too m? M̀ na-agbalị ịka ndị ọzọ mma?

3 Iwu ndị Farisii na omenala ha mere ka o siere ndị mmadụ ike idebe Iwu Jehova.

Jehova nyere ndị Izrel Iwu ya iji gwa ha otú ha ga-esi na-efe ya. Ma, ọ gwaghị ha irighiri ihe niile ha ga na-eme. Dị ka ihe atụ, Iwu ahụ kwuru na ndị Izrel agaghị arụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike, ma o kwughị ihe ha ga-eme ya abụrụ na ha arụọla ọrụ. (Ọpụ. 20:10) Ndị Farisii ji aka ha mee iwu na omenala ụfọdụ n’ihi na ha chere na Iwu Jehova ezughị ezu. Jizọs rubeere Iwu Jehova isi ma leghara iwu aka ike ndị ahụ ndị Farisii mere anya. (Mat. 5:17, 18; 23:23) Jizọs echeghị naanị banyere ihe e kwuru n’Iwu ahụ. Ọ ghọtara ihe mere Jehova ji nye ndị Izrel Iwu ahụ, marakwa na ebere na ọmịiko dị mkpa. Jizọs nwere obiọma, ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya mejọrọ ya. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị na Jizọs gwara Pita, Jems, na Jọn ka ha mụrụ anya ma na-eche nche n’abalị ahụ e mechara jide ya, ụra buuru ha ugboro ugboro. Ma, kama ịbara ha mba, Jizọs ji obiọma kwuo, sị: “N’ezie, mmụọ dị njikere, ma anụ ahụ́ adịghị ike.”—Mak 14:34-42.

Ajụjụ ndị i kwesịrị ichebara echiche:

M̀ na-emere ndị ọzọ iwu ndị siri ike ma ọ bụ na-esi ọnwụ ka ndị ọzọ mee ihe m kwuru? M̀ na-atụ anya ka ndị ọzọ mee ihe ha na-agaghị emeli?

Chegodị banyere otú ozizi Jizọs si dị iche na nke ndị Farisii. Ị̀ chọpụtara ebe i kwesịrị imekwu nke ọma? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ́ gaghị adị mma ka ị gbalịsie ike mee ya?

[Foto dị na peeji nke 28]

Ndị Farisii na-eyi mkpọ̀ a na-etinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ.—Mat. 23:2, 5

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Ndị okenye dị umeala n’obi na-ejere ndị ọzọ ozi, ha anaghị adị mpako ka ndị Farisii

[Foto dị na peeji nke 30]

Ị̀ dị obiọma ka Jizọs, ka ị̀ na-atụ anya ka ndị ọzọ mee ihe ha na-agaghị emeli?