Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mụ na Ndị Agadi Maara Ihe Bụ Enyi

Mụ na Ndị Agadi Maara Ihe Bụ Enyi

Akụkọ Ndụ

Mụ na Ndị Agadi Maara Ihe Bụ Enyi

AKỤKỌ ELVA GJERDE KỌRỌ

Ihe dị ka afọ iri asaa gara aga, otu onye nke bịara n’ụlọ anyị gwara papa m ihe mechara gbanwee ndụ m. Anaghị m echefu ụbọchị ahụ echefu. Kemgbe ahụ, e nweela ndị ọzọ àgwà ha metụtara ndụ m. Mkpakọrịta mụ na ha emeela ka m nweta enyi kacha ndị ọzọ niile m nwerela. Ka m kọwaa.

A MỤRỤ m na Sidni dị n’Ọstrelia n’afọ 1932. Ndị mụrụ m kweere na Chineke, ma ha anaghị aga chọọchị. Nne m kụziiri m na Chineke na-ahụ ihe niile m na-eme, na ọ ga-atakwa m ahụhụ ma m mee ihe na-adịghị mma. Nke a mere ka m na-atụ Chineke ụjọ. Ma, ihe dị na Baịbụl na-atọ m ụtọ. N’oge ahụ, nwanne mama m na-eleta anyị ná ngwụsị izu, ọ na-akọkwara m ọtụtụ akụkọ dị ụtọ si na Baịbụl. Obi na-adị m ụtọ mgbe ọ bụla ọ bịara ileta anyị.

Mgbe m dị afọ iri na ụma, papa m gụrụ akwụkwọ ndị mama m natara otu agadi nwaanyị bụ́ Onyeàmà Jehova. Ihe ọ gụtara n’akwụkwọ Ndị Kraịst ahụ tọrọ ya ụtọ nke na o kwetara ka Ndịàmà Jehova mụwara ya Baịbụl. Otu mgbede a nọ na-amụrụ papa m Baịbụl, ọ hụrụ m ebe m zoro na-ege ihe ha na-ekwu. Ọ chọwala ịsị m gaa hie ụra mgbe onye ahụ na-amụrụ ya Baịbụl gwara ya, sị: “Hapụnụ Elva ka ọ bịa gere ihe anyị na-ekwu.” Ihe ahụ ọ gwara ya gbanwere ndụ m ma mee ka m malite ịghọ enyi ezi Chineke, bụ́ Jehova.

Obere oge ka ihe a mechara, mụ na papa m malitere ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Ihe ndị ọ mụtara mere ka ọ gbanwee otú o si ebi ndụ. Ọ kwụsịdịrị iwe iwe ọkụ. N’ihi ya, mama m na nwanne m nwoke nke tọrọ m, bụ́ Frank, malitere ịga ọmụmụ ihe. * Anyị anọ gbanwere otú anyị si ebi ndụ, nke mere ka anyị ghọọ Ndịàmà Jehova e mere baptizim. Kemgbe ahụ, mụ na ọtụtụ ndị agadi abụrụla enyi, ha enyekwarala m aka n’oge dị iche iche.

MGBE M KPEBIRI IHE M GA-ARỤ

Mgbe m dị afọ iri na ụma, mụ na ndị agadi nọ n’ọgbakọ anyị na-akpachi anya. Otu n’ime ha bụ nwanna nwaanyị mere agadi aha ya bụ Alice Place. Ọ bụ ya bụ onye mbụ ziri ezinụlọ anyị ozi ọma. Eweere m ya ka nne nne m. Alice kụziiri m otú e si ezi ozi ọma, gbaakwa m ume ka m mee baptizim. N’ihi ya, m mere baptizim mgbe m dị afọ iri na ise.

E nwekwara di na nwunye mere agadi mụ na ha ghọrọ enyi. Aha ha bụ Percy na Madge [ma ọ bụ Margaret] Dunham. Mkpakọrịta mụ na ha baara m ọtụtụ uru mgbe m toro. Mgbakọ na mwepụ na-atọ m ụtọ, achọkwara m ịna-akụziri ya ndị ọzọ. Percy na Madge bụbu ndị ozi ala ọzọ na Latvia tupu Agha Ụwa nke Abụọ. Mgbe agha ahụ malitere na Yurop, a kpọrọ ha ka ha gawa ozi na Betel dị na Sidni, n’Ọstrelia. Percy na Madge hụrụ m n’anya. Ha kọrọ ọtụtụ ihe tọrọ ha ụtọ mgbe ha na-eje ozi ala ọzọ. Achọpụtara m na ịkụziri ndị ọzọ Baịbụl ga-atọ m ụtọ karịa ịkụzi mgbakọ na mwepụ. N’ihi ya, ekpebiri m ịbụ onye ozi ala ọzọ.

Nwanna Dunham na nwunye ya gbara m ume ka m malite ịsụ ụzọ iji kwado maka ozi ala ọzọ. N’ihi ya, n’afọ 1948 mgbe m dị afọ iri na isii, amalitere m ịsụ ụzọ ma soro ndị ọsụ ụzọ iri ndị ọzọ bụ́ ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ anyị jiri obi ụtọ na-ekwusa ozi ọma na Họstvil dị na Sidni.

N’afọ anọ ndị na-esonụ, asụrụ m ụzọ n’obodo anọ ndị ọzọ dị na Niu Saụt Wels nakwa Kwinsland. Otu n’ime ndị mbụ m mụụrụ Baịbụl bụ Betty Law (ọ na-azazi Betty Remnant). Betty ji afọ abụọ tọọ m, ọ bụkwa ezigbo mmadụ. Mgbe e mechara, mụ na ya sụkọrọ ụzọ n’obodo Kaụra, bụ́ obodo dị ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri atọ site n’ebe ọdịda anyanwụ Sidni. N’agbanyeghị na ọ bụ obere oge ka mụ na Betty sụkọrọ ụzọ, anyị ka bụ enyi ruo taa.

Mgbe e mere m ọsụ ụzọ pụrụ iche, akwagara m Narandera, bụ́ obodo dị narị kilomita abụọ na iri abụọ site n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ Kaụra. Ọsụ ụzọ ọzọ mụ na ya jekọrọ ozi bụ Joy Lennox (ọ na-azazi Joy Hunter), ọ na-anụ ọkụ n’obi, o jikwa afọ abụọ tọọ m. Ọ bụ naanị anyị abụọ bụ Ndịàmà Jehova n’obodo ahụ. E nwere otu di na nwunye dị obiọma aha ha bụ Ray na Esther Irons. Ọ bụ n’ụlọ ha ka mụ na Joy bi n’oge ahụ. Ha mụrụ otu nwoke na ụmụ nwaanyị atọ. Ha niile nwere mmasị n’eziokwu Baịbụl. Ray na nwa ya nwoke na-arụ ọrụ n’ugbo ebe a na-azụ atụrụ, na-akọkwa ọka wit. Esther na ụmụ ya ndị nwaanyị na-elekọta ụlọ ebe ndị ọbịa na-arahụ, na-erekwa nri n’ebe ahụ. Ụbọchị Sọnde ọ bụla, mụ na Joy na-esi nri maka ndị ezinụlọ Irons na ihe dị ka ụmụ nwoke iri na abụọ ndị na-arahụ n’ụlọ ndị ọbịa ahụ. Ụmụ nwoke ndị ahụ na-arụ ọrụ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè. Ezigbo agụụ na-agụ ha. Nri ahụ anyị na-esiri ndị ezinụlọ Irons so n’ụgwọ ụlọ anyị na-akwụ ha. Anyị sachaa ihe ha ji rie nri, anyị na Ray na ndị ezinụlọ ya na-amụ Ụlọ Nche a ga-amụ n’izu ahụ, nke bụ́ nri ime mmụọ na-atọ ụtọ. Ray, nwunye ya, na ụmụ ha anọ natara eziokwu. Ọ bụ ha malitere Ọgbakọ Narrandera.

N’afọ 1951, agara m mgbakọ distrikti na Sidni ma gaa nzukọ pụrụ iche maka ndị ọsụ ụzọ chọrọ ịga ozi ala ọzọ. E nwere nzukọ ahụ n’otu nnukwu ụlọikwuu. Ndị bịara ya karịrị narị mmadụ atọ. Nathan Knorr, bụ́ onye si Betel dị na Bruklin bịa, gwara ndị bịara nzukọ ahụ na e kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma n’ebe niile n’ụwa. Anyị gere ntị nke ọma n’ihe niile o kwuru. Ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ bịaranụ mechara bụrụ ndị malitere ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’Ebe Ndịda Pasifik na n’ebe ndị ọzọ. Obi dị m ezigbo ụtọ na m so n’ụmụnna iri na asaa bụ́ ndị Ọstrelia a kpọrọ ịga klas nke iri na itoolu n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied n’afọ 1952. Adị m naanị afọ iri abụọ mgbe ahụ, aghọwala m onye ozi ala ọzọ, nke bụ́ ihe na-agụ m kemgbe!

MGBANWE NDỊ ỌZỌ M MERE

Ọzụzụ e nyere m na ndị mụ na ha kpakọrịtara na Gilied nyeere m aka ịmatakwu Baịbụl, meekwa ka okwukwe m sikwuo ike. M mụtakwuru otú m ga-esi na-akpa àgwà ọma. N’oge ahụ, abụ m nwa agbọghọbịa ụbụrụ na-aghọ nkọ, na-atụkwa anya na onye ọ bụla kwesịrị ịna-emetacha ihe niile. Mgbe ụfọdụ, m na-adị aka ike. Dị ka ihe atụ, akụjara m mgbe m hụrụ Nwanna Knorr ka ya na ụmụ okorobịa ndị nọ na Betel na-akụ bọl.

Ndị niile kụziiri anyị ihe na Gilied bụ ụmụnna nwoke ndị maara ihe, ha ejeekwarala Jehova ozi ọtụtụ afọ. Ọ ga-abụrịrị na ha ghọtara na e nwere ihe mụ na ya na-alụ. Ha gosiri mmasị n’ebe m nọ, nyekwara m aka ịgbanwe otú m si ele ihe anya. Eji m nwayọọ nwayọọ malite ịghọta na Jehova bụ Chineke hụrụ anyị n’anya nakwa na ozi anyị na-ejere ya na-atọ ya ụtọ. Ọ bụghị onye aka ike. Ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ibe m nyekwaara m aka. M ka na-echeta mgbe otu n’ime ha gwara m, sị: “Elva, Jehova ejighị ụtarị nọrọ n’eluigwe na-achị anyị. Atazila onwe gị ahụhụ!” Ihe ahụ ọ gwara m n’ezoghị ọnụ ruru m n’obi.

Mgbe anyị gụchara akwụkwọ na Gilied, e zigara mụ na mmadụ anọ ndị ọzọ Namibia, n’Afrịka. N’oge na-adịghị anya, anyị nwetara mmadụ iri asatọ anyị na-amụrụ Baịbụl. Ịnọ na Namibia na ozi ala ọzọ m na-eje tọrọ m ụtọ. Ma, e nwere nwa akwụkwọ ibe m na Gilied nke m hụrụ n’anya, bụ́ onye e zigara Swizaland. Ka m nọchara otu afọ na Namibia, m kwagara Swizaland. Mgbe anyị gbachara akwụkwọ, m so di m na-aga eleta ọgbakọ dị iche iche. Di m bụ onye nlekọta sekit.

NNUKWU NSOGBU BỊAARA M

Anyị ji obi ụtọ jee ozi sekit ruo afọ ise. Mgbe e mechara, a kpọrọ anyị ka anyị bịa jewe ozi na Betel dị na Swizaland. Obi dị m ezigbo ụtọ iso n’ezinụlọ Betel, bụ́ ebe mụ na ọtụtụ ụmụnna ndị tozuru okè tọrọ m jekọrọ ozi.

Ka obere oge gachara, otu ihe gbawara m obi mere. Achọpụtara m na di m kwara iko, mebiekwa mmekọrịta ya na Jehova. O mechara hapụ m. Obi gbawara m! E wepụ ịhụnanya na enyemaka nke ndị enyi m tọrọ m, bụ́ ndị mụ na ha nọ na Betel, amaghị m otú m gaara esi die nsogbu ahụ. Ha gere m ntị mgbe ọ bụla m chọrọ onye m ga-agwa okwu, nyekwa m ohere ka m zuo ike mgbe m chọrọ izu ike. Okwu nkasi obi ha na mmeso ọma ha n’oge ahụ nyeere m aka idi nsogbu m ma meedị ka m bịarukwuo Jehova nso.

Echetakwara m okwu ndị agadi maara ihe gwara m ọtụtụ afọ gara aga. Ha mụtara ihe ná nsogbu ndị bịaara ha. Ihe Madge Dunham gwara m so n’ihe ndị ahụ m chetara. E nwere mgbe ọ gwara m, sị: “Elva, ọnwụnwa dị iche iche ga-abịara gị mgbe ị na-ejere Jehova ozi, ma ọnwụnwa ga-akacha esiri gị ike nwere ike isi n’aka ndị gị na ha dị ná mma. Nsogbu ndị ahụ bịara gị, mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma. Cheta na ọ bụ Jehova ka ị na-efe, ọ bụghị ụmụ mmadụ na-ezughị okè!” Ndụmọdụ ahụ Madge nyere m nyeere m aka idi ọtụtụ ọnwụnwa ndị bịaara m. Ekpebiri m na agaghị m ekwe ka ihe di m mere mee ka m hapụ Jehova.

Ka oge na-aga, ekpebiri m ịlaghachi Ọstrelia iji malite ịsụ ụzọ n’ebe m ga-anọ ndị ezinụlọ anyị nso. Mgbe m nọ n’ụgbọ mmiri na-ala, obi tọrọ m ụtọ ịgwa ndị ọzọ nọ n’ụgbọ ahụ ihe ndị dị na Baịbụl. Otu n’ime ha bụ nwoke dị nwayọọ si Nọọwee nke aha ya bụ Arne Gjerde. Ihe ọ nụrụ tọrọ ya ụtọ. Arne mechara bịa leta mụ na ndị ezinụlọ anyị na Sidni. O nwere ezigbo ọganihu, batakwa n’ọgbakọ. N’afọ 1963, mụ na Arne lụrụ, mgbe afọ abụọ gachakwara, amụrụ m nwa anyị nwoke bụ́ Gary.

IDI NSOGBU ỌZỌ

Mụ na Gary na Arne na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ anyị. N’oge na-adịghị anya, Arne rụnyekwuru ọnụ ụlọ ole na ole n’ụlọ anyị ka nne m na nna m, bụ́ ndị merela agadi, kwafeta n’ụlọ anyị. Mgbe anyị lụrụla afọ isii, ụdị nsogbu ọzọ bịaara anyị. A chọpụtara na Arne na-arịa kansa ụbụrụ. Ọ nọtere aka n’ụlọ ọgwụ ebe a na-agwọ ya. M na-aga eleta ya n’ụlọ ọgwụ kwa ụbọchị. O yiri ka ọ̀ na-adị mma, ma a nọteghị aka, ahụ́ ya aka njọ, ya enwee strok. A gwara m na Arne ga-anwụ n’izu ole na ole. Ma, ọ nwụghị. O mechara lọta, mụ ana-elekọta ya ruo mgbe ọ gbakechara. Ka oge na-aga, ọ malitere ịga ije, malitekwa ọrụ okenye ọ na-arụbu n’ọgbakọ. Obi na-adị ya ụtọ mgbe niile, ihu na-atọkwa ya ọchị. O so n’ihe mere o ji gbakee ngwa ngwa, ya adịkwara m mfe ịna-elekọta ya.

N’afọ 1986, ka ọtụtụ afọ gaferela, Arne malitekwara ịrịa ọrịa. Mgbe ahụ, papa m na mama m anwụọla. N’ihi ya, anyị si na Sidni kwaga Blue Mountains, nke mere ka anyị nọrọkwuo ndị enyi anyị nso. Mgbe e mechara, Gary lụrụ otu ọmarịcha nwanna nwaanyị aha ya bụ Karin. Ha tụrụ aro ka anyị na ha biri n’otu ụlọ. Mgbe ọnwa ole na ole gachara, anyị niile kwabara n’otu ụlọ dị nso n’ebe mụ na Arne bibu.

Otu afọ na ọnwa isii tupu Arne anwụọ, m na-elekọta ya ehihie na abalị n’ihi na ọ naghị ebili ọtọ. Ebe ọ bụ na m na-anọkarị n’ụlọ, ana m eji awa abụọ kwa ụbọchị amụ Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. N’oge ndị ahụ m na-amụ ihe, amụtara m ọtụtụ ihe nyeere m aka idi nsogbu ndị bịaara m. Ọtụtụ ndị agadi nọ n’ọgbakọ anyị bịakwara leta m. Ụfọdụ n’ime ha ediela ụdị ọnwụnwa ahụ. Nleta ha letara m gbara m ume! Arne nwụrụ n’Eprel 2003, o nwekwara olileanya ibilite n’ọnwụ.

ONYE KACHA ENYERE M AKA

Mgbe m bụ nwa agbọghọbịa, m na-atụkarị anya imetacha ihe niile. Ma, m mechara chọpụta na ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ na-enweta ihe ọ tụrụ anya ya. Chineke emeerela m ọtụtụ ihe ọma. Ihe ọjọọ abụọ na-agbawa obi emeekwala m. Otu bụ na di mbụ m kwara iko ma hapụ m. Nke abụọ abụrụ na di m nke abụọ rịara ọrịa ma nwụọ. N’ọnwụnwa ahụ niile, ọtụtụ ndị enyerela m aka, kasiekwa m obi. Onye kacha enyere m aka ka bụkwa Jehova Chineke, bụ́ “Onye Ochie ahụ.” (Dan. 7:9) Ndụmọdụ ya emeela ka àgwà m ka mma. N’ihi ya, ọtụtụ ihe ọma emeerela m n’ozi ala ọzọ. Mgbe nsogbu bịaara m, ‘obiọma Jehova kwadoro m, nkasi obi ya mekwara ka ahụ́ ruo mkpụrụ obi m ala.’ (Ọma 94:18, 19) Ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi m egosila na ha hụrụ m n’anya, ha kwadokwara m. Ha nyeere m ezigbo aka mgbe nsogbu ndị ahụ bịaara m. (Ilu 17:17) Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị agadi maara ihe.

Nna ochie bụ́ Job jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ na amamihe adịghị n’etiti ndị agadi, ọ̀ bụ na nghọta adịghịkwa n’ogologo ndụ?” (Job 12:12) M cheta ihe ndị mere m, m nwere ike ịza ee. Ndụmọdụ ndị agadi maara ihe nyere m nyeere m aka, nkasi obi ha kwadoro m, enyi mụ na ha bụ mere ka ndụ m ka mma. Obi dị m ụtọ na mụ na ha bụ enyi.

Ebe m dị afọ iri asatọ, mụnwa bụkwa agadi. Ihe ndị mere m emeela ka m na-elebara mkpa ndị agadi ndị ọzọ anya. Ọ ka na-atọ m ụtọ ileta ha ma nyere ha aka. Obi na-atọkwa m ụtọ ma mụ na ndị na-eto eto nọrọ. Ume ha nwere na-amasị m, ịnụ ọkụ n’obi ha na-agbakwa m ume. Ọ bụrụ na ndị na-eto eto achọọ ka m dụọ ha ọdụ ma ọ bụ kwado ha, obi na-adị m ụtọ inyere ha aka.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Nwanne Elva, bụ́ Frank Lambert, ghọrọ ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi n’otu ime ime obodo dị n’Ọstrelia. E dere ihe banyere otú o si gaa kwusaa ozi ọma n’ebe ahụ na Yearbook nke afọ 1983, peeji nke 110-112.

[Foto dị na peeji nke 14]

Mgbe mụ na Joy Lennox na-asụ ụzọ na Narandera

[Foto dị na peeji nke 15]

Elva na ụfọdụ ndị ezinụlọ Betel dị na Swizaland n’afọ 1960

[Foto dị na peeji nke 16]

Mgbe m na-elekọta Arne mgbe ọ na-arịa ọrịa