Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tụkwasị Jehova Bụ́ Chineke Nke Na-edebe “Oge Na Mgbe A kara Aka” obi

Tụkwasị Jehova Bụ́ Chineke Nke Na-edebe “Oge Na Mgbe A kara Aka” obi

Tụkwasị Jehova Bụ́ Chineke Nke Na-edebe “Oge Na Mgbe A kara Aka” obi

‘Ọ na-agbanwe oge na mgbe a kara aka, na-ewepụ ndị eze, na-emekwa ka ndị eze malite ịchị.’—DAN. 2:21.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

Olee otú ihe Chineke kere nakwa amụma ndị mezuru emezu si gosi na Jehova bụ Onye Ukwu Na-edebe Oge?

Ebe anyị ma na Jehova bụ Chineke nke na-edebe “oge na mgbe a kara aka,” gịnị ka anyị kwesịrị ime?

Gịnị mere na ihe ndị na-eme n’ụwa na ihe ụmụ mmadụ chọrọ ime anaghị eme ka Jehova gbanwee oge ọ chọrọ ime ihe?

1, 2. Gịnị na-egosi na Jehova ghọtara ihe niile banyere oge?

OGOLOGO oge tupu Jehova Chineke ekee mmadụ, o kere ihe ndị e ji agụ oge. Mgbe Chineke na-eke ihe, o kwuru n’ụbọchị nke anọ, sị: “Ka e nwee ihe ndị na-enye ìhè na mbara eluigwe iji kpaa ókè n’agbata ehihie na abalị; ha ga-abụ ihe ịrịba ama na ihe e ji agụ oge na ụbọchị na afọ.” (Jen. 1:14, 19, 26) Ihe ahụ Jehova kwuru mezuru.

2 Ma, ruokwa taa, ndị ọkà mmụta sayensị aghọtabeghị ihe niile banyere oge. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Oge so n’ihe kacha bụrụ ihe omimi n’ụwa. Mmadụ enweghị ike ịkọwa ihe ọ bụ.” Ma, Jehova ghọtara ihe ọ bụ. A sị ka e kwuwe, ọ bụ ya bụ “Onye kere eluigwe, . . . Onye kpụrụ ụwa na Onye kere ya.” Jehova “na-anọ ná mmalite kwuo ihe ga-eme n’ikpeazụ, . . . na-anọkwa n’oge dị anya gara aga kwuo ihe a na-emebeghị eme.” (Aịza. 45:18; 46:10) Iji mee ka okwukwe anyị sikwuo ike n’ebe Jehova nọ nakwa n’Okwu ya bụ́ Baịbụl, ka anyị tụlee otú ihe Chineke kere eke na amụma ndị mezuru emezu si egosi na Jehova bụ Onye Ukwu Na-edebe Oge.

IHE JEHOVA KERE NA-EME KA OKWUKWE ANYỊ SIE IKE

3. Olee ihe ndị gosiri na ihe ndị e kere eke na-edebe oge?

3 Ọtụtụ ihe Jehova kere, ma ndị ukwu ma ndị nta, na-edebecha oge. Dị ka ihe atụ, kpakpando na ihe ndị ọzọ dị na mbara igwe na-agagharị n’oge ha. Otú ha si agagharị na-enyere ndị mmadụ aka ịmata oge, na-enyekwara ndị na-akwọ ụgbọ mmiri aka ịmata ụzọ. Ebe ọ bụ Jehova kere kpakpando na ihe ndị ọzọ na-edebe oge, “ike ya dị ukwuu” n’ezie, anyị kwesịkwara ito ya.—Gụọ Aịzaya 40:26.

4. Olee otú oge ihe ndị e kere eke na-edebe si egosi na Chineke maara ihe?

4 Ihe ndị dị ndụ na-eme ihe n’oge ha. Anụmanụ na ihe ndị a kụrụ akụ na-eme ka à ga-asị na e tinyere elekere n’ime ha. Ọ bụ ya mere ọtụtụ nnụnụ ji mara mgbe ha kwesịrị ifega obodo ọzọ. (Jere. 8:7) Ndị mmadụ na-emekwa ka è tinyere elekere n’ahụ́ ha. Dị ka ihe atụ, ahụ́ anyị na-agwa anyị na chi abọọla nakwa na chi ejiela. Ọ bụrụ na anyị ejiri ụgbọelu gaa mba ọzọ, bụ́ ebe oge ha dị iche na nke anyị, ụbọchị ole na ole ga-agafe tupu oge ha amara anyị ahụ́. N’eziokwu, ọtụtụ ihe Jehova kere na-egosi na ọ bụ Chineke nke na-edebe “oge na mgbe a kara aka,” nakwa na ọ dị ike, marakwa ihe. (Gụọ Abụ Ọma 104:24.) N’eziokwu, Onye Ukwu Na-edebe Oge maara ihe niile, bụrụkwa onye kacha ike. Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-emezu ihe niile bụ́ uche ya!

AMỤMA NDỊ MEZURU N’OGE HA NA-EME KA OKWUKWE ANYỊ SIE IKE

5. (a) Olee otú anyị ga-esi mata ihe ga-eme n’ọdịnihu? (b) Gịnị mere o ji bụrụ na Jehova nwere ike ịgwa anyị ihe ga-eme n’ọdịnihu nakwa mgbe ọ ga-eme?

5 Ihe ndị Jehova kere eke na-akụziri anyị ọtụtụ ihe banyere “àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya,” ma ha anaghị aza ajụjụ ndị dị mkpa dị ka, Gịnị ga-abụ ọdịnihu ndị mmadụ? (Rom 1:20) Naanị otú anyị ga-esi mata azịza ya bụ ịmụ Okwu Chineke bụ́ Baịbụl. Anyị mụọ Baịbụl, anyị ga-ahụ amụma ndị mezuru mgbe oge ha ruru! Jehova nwere ike ime ka a mata ihe ndị na-emebeghị eme n’ihi na o nwere ike ịmata ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ihe ọzọ bụ na amụma ọ bụla e buru n’Akwụkwọ Nsọ na-emezu mgbe oge ya ruru n’ihi na Jehova Chineke nwere ike ime ka nzube ya mezuo mgbe ọ bụla ọ chọrọ.

6. Olee ihe gosiri na Jehova chọrọ ka anyị ghọta amụma ndị dị na Baịbụl?

6 Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya ghọta amụma ndị o buru n’Akwụkwọ Nsọ ma rite uru na ha. N’agbanyeghị na Chineke anaghị ele oge anya otú anyị si ele ya anya, o kwuo na ihe ga-eme n’oge ọ kara aka, ọ ga-ekwu ya otú anyị ga-aghọta ya. (Gụọ Abụ Ọma 90:4.) Dị ka ihe atụ, akwụkwọ Mkpughe kwuru banyere ndị “mmụọ ozi anọ . . . a kwadebere maka oge awa na ụbọchị na ọnwa na afọ.” Anyị ghọtara ihe bụ́ awa, ụbọchị, ọnwa, na afọ. (Mkpu. 9:14, 15) Ịghọta otú amụma ndị e buru si mezuo n’oge ha kwesịrị ime ka okwukwe anyị sie ike n’Okwu Chineke nakwa na ọ bụ onye na-edebe “oge na mgbe a kara aka.” Ka anyị tụlee ụfọdụ amụma e buru na Baịbụl.

7. Olee otú mmezu amụma Jeremaya buru banyere Jeruselem na Juda si gosi na Jehova bụ Onye Ukwu Na-edebe Oge?

7 Nke mbụ anyị ga-atụle bụ ihe mere n’ihe karịrị narị afọ isii tupu a mụọ Kraịst. “N’afọ nke anọ nke ọchịchị Jehoyakim nwa Josaya, bụ́ eze Juda,” okwu Onye Ukwu Na-edebe Oge “ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juda niile.” (Jere. 25:1) Jehova kwuru na a ga-ebibi Jeruselem, dọrọkwa ndị Juu bi na Juda n’agha laa Babịlọn. Ndị Juu ahụ “ga-ejere eze Babịlọn ozi ruo afọ iri asaa.” N’afọ 607 T.O.A., ndị agha Babịlọn bibiri Jeruselem, dọrọkwa ndị Juu bi na Juda n’agha laa Babịlọn. Gịnịkwanụ ga-eme ma iri afọ asaa gachaa? Jeremaya buru amụma, sị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘M ga-elebara unu anya mgbe afọ iri asaa zuru na Babịlọn, m ga-eme ka okwu dị mma m kwuru mezuo n’isi unu site n’ịkpọlata unu ebe a.’” (Jere. 25:11, 12; 29:10) Amụma a mezuru mgbe oge ya ruru, ya bụ, n’afọ 537 T.O.A. mgbe ndị Midia na ndị Peshia tọhapụrụ ndị Juu ahụ nọ na Babịlọn.

8, 9. Olee otú amụma Daniel buru banyere ọbịbịa Mesaya na mgbe Alaeze eluigwe ga-amalite ịchị si gosi na Jehova bụ Chineke nke na-edebe “oge na mgbe a kara aka”?

8 Amụma ọzọ anyị ga-atụle bụ nke e buru banyere ndị Chineke n’oge ochie. Ihe dị ka afọ abụọ tupu ndị Juu esi na Babịlọn pụọ, Chineke si n’ọnụ Daniel onye amụma kwuo na Mesaya ga-abịa mgbe narị afọ anọ na iri asatọ na atọ gachara malite mgbe e nyere iwu ka e wughachi Jeruselem. Eze ndị Midia na Peshia nyere iwu ahụ n’afọ 455 T.O.A. Ozugbo narị afọ anọ na iri afọ asatọ na atọ gachara, ya bụ, n’afọ 29 O.A., e ji mmụọ nsọ tee Jizọs onye Nazaret mmanụ mgbe e mere ya baptizim, o wee bụrụ Mesaya. *Nehe. 2:1, 5-8; Dan. 9:24, 25; Luk 3:1, 2, 21, 22.

9 Chegodị ihe Akwụkwọ Nsọ buru n’amụma banyere Alaeze Chineke. Baịbụl buru amụma na Alaeze Mesaya ga-amalite ịchị n’eluigwe n’afọ 1914. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru ihe ga-abụ “ihe ịrịba ama” nke ọnụnọ Jizọs, kwuokwa na a ga-enwe ọtụtụ nsogbu n’ụwa n’oge ahụ, n’ihi na a ga-esi n’eluigwe chụda Setan. (Mat. 24:3-14; Mkpu. 12:9, 12) Amụma ndị ọzọ e buru na Baịbụl nyeere anyị aka ịmata kpọmkwem mgbe “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” zuru na mgbe Kraịst ghọrọ Eze n’eluigwe. Ọ bụ n’afọ 1914 ka o mezuru.—Luk 21:24; Dan. 4:10-17. *

10. Olee ihe ndị ga-emerịrị mgbe oge ha ruru?

10 N’oge na-adịghị anya, “oké mkpagbu” ahụ Jizọs buru n’amụma ga-amalite. Ihe ga-esochi ya bụ Ọchịchị Puku Afọ Kraịst. O doro anya na ihe ndị a ga-eme kpọmkwem n’oge ha. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, Jehova ebula ụzọ kpebie ‘ụbọchị na oge awa’ ihe ndị a ga-eme.—Mat. 24:21, 36; Mkpu. 20:6.

‘ZỤTARA ONWE GỊ OGE KWESỊRỊ EKWESỊ’

11. Ebe anyị ma na anyị bi n’oge ikpeazụ, gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme?

11 Ebe anyị ghọtara na Alaeze Chineke amalitela ịchị n’eluigwe nakwa na anyị bi “n’oge ikpeazụ,” gịnị ka anyị kwesịrị ime? (Dan. 12:4) Ọtụtụ ndị na-ahụ na nsogbu ụwa na-aka njọ, ma ha aghọtaghị na ihe ndị na-emenụ na-emezu amụma Baịbụl buru banyere oge ikpeazụ. Ha nwere ike ịna-atụ anya na nsogbu ndị a nwere ike ibibi ụwa otu ụbọchị ma ọ bụkwanụ kweta na ọ bụ ndị mmadụ ga-eme ka e nwee “udo na obi iru ala” n’ụwa. (1 Tesa. 5:3) Gịnị ka anyịnwa chere? Ọ bụrụ na anyị ghọtara na anyị bi n’oge ikpeazụ nke ụwa Setan, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịgbalịsi ike jiri oge fọrọnụ fee Chineke nke na-edebe “oge na mgbe a kara aka” ma nyere ndị ọzọ aka ịmata ya? (2 Tim. 3:1) Anyị kwesịrị ikpebi iji oge anyị na-eme ihe bara uru.—Gụọ Ndị Efesọs 5:15-17.

12. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe Jizọs kwuru banyere oge Noa?

12 ‘Ịzụtara onwe anyị oge kwesịrị ekwesị’ adịghị mfe n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe dị n’ụwa nwere ike imegharị anyị anya. Jizọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Dị nnọọ ka ụbọchị Noa dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.” Olee otú ụbọchị Noa dị? E buru amụma na a ga-ebibi ụwa n’oge ahụ. A ga-eji iju mmiri zuru ụwa ọnụ kpochapụ ndị ajọ mmadụ. Ebe Noa bụ “onye na-ekwusa ezi omume,” o ji obi ya niile zie ndị bi n’oge ya ozi Chineke. (Mat. 24:37; 2 Pita 2:5) Ma ha nọ “na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-ekekwa ndị inyom di, . . . ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile.” Ọ bụ ya mere Jizọs ji dọọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Dịrịnụ njikere, n’ihi na ọ bụ n’oge awa unu na-echeghị na ọ ga-abụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” (Mat. 24:38, 39, 44) Anyị kwesịrị ime ka Noa, ọ bụghị ka ndị biri n’oge ya. Gịnị ga-enyere anyị aka ịdị njikere?

13, 14. Ka anyị na-eche ka Nwa nke mmadụ bịa, gịnị ka anyị kwesịrị icheta banyere Jehova nke ga-enyere anyị aka iji obi anyị niile na-efe ya?

13 N’agbanyeghị na Nwa nke mmadụ ga-abịa n’oge anyị na-atụghị anya ya, anyị kwesịrị icheta na Jehova bụ Onye Ukwu Na-edebe Oge. Ihe ndị na-eme n’ụwa na ihe ụmụ mmadụ chọrọ ime anaghị eme ka Jehova gbanwee oge ọ chọrọ ime ihe. Jehova na-ahazi mgbe ọ ga-eme ihe na ihe ga-esi na ya pụta iji mezuo uche ya. (Gụọ Daniel 2:21.) N’eziokwu, Ilu 21:1 gwara anyị, sị: “Obi onye eze dị ka iyi n’aka Jehova. Ebe ọ bụla ọ chọrọ, ya echee ya ihu.”

14 Jehova nwere ike ime ka ihe ụfọdụ mee iji mezuo nzube ya n’oge ya. Ọtụtụ nnukwu mgbanwe ndị e nwere n’ụwa na-emezu amụma Baịbụl, karịchaa, amụma gbasara ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe mere ná mba ụfọdụ bụ́ ebe e nweburu ọchịchị aka ike na ọchịchị Kọmunist. Ọtụtụ ndị atụghị anya na a ga-enwe ụdị nnukwu mgbanwe ahụ n’ọchịchị n’egbughị oge. Ma, n’ihi mgbanwe ahụ, a na-ekwusa ozi ọma n’ọtụtụ mba bụ́ ebe a machibidoro ọrụ anyị iwu n’oge gara aga. N’ihi ya, ka anyị jisie ike zụta oge kwesịrị ekwesị ka anyị nwee ike iji obi anyị niile na-efe Chineke nke na-edebe “oge na mgbe a kara aka.”

NWEE OKWUKWE NA JEHOVA GA-EMEZU NZUBE YA N’OGE Ọ KARA AKA

15. E nwee mgbanwe ná nzukọ Jehova, olee otú anyị ga-esi gosi na anyị nwere okwukwe?

15 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-ekwusa ozi ọma n’oge ikpeazụ a, anyị kwesịrị inwe okwukwe na Jehova ga-emezu nzube ya n’oge ọ kara aka. Mgbanwe a na-enwe n’ụwa nwere ike ime ka ọ dị mkpa na anyị ga-agbanwe otú anyị si ekwusa ozi ọma. Nzukọ Jehova nwere ike ịgbanwe ihe ụfọdụ iji nyere anyị aka ikwusa ozi ọma nke ọma. Otú anyị ga-esi gosi na anyị nwere okwukwe na Chineke bụ onye na-edebe “oge na mgbe a kara aka” bụ ime ihe nzukọ ya gwara anyị, jirikwa obi anyị niile na-erubere Ọkpara ya bụ́ “isi nke ọgbakọ ahụ” isi.—Efe. 5:23.

16. Gịnị mere anyị ga-eji nwee okwukwe na Jehova ga-enyere anyị aka n’oge kwesịrị ekwesị?

16 Jehova chọrọ ka anyị na-ekpe ekpere n’oge ọ bụla nakwa ka anyị nwee okwukwe na ọ ga-enyere anyị aka “n’oge kwesịrị ekwesị.” (Hib. 4:16) Ọ̀ bụ na nke ahụ anaghị egosi na ọ hụrụ onye ọ bụla n’ime anyị n’anya, na-echekwara anyị echiche ọma? (Mat. 6:8; 10:29-31) Otú anyị ga-esi gosi na anyị nwere okwukwe na Jehova Chineke bụ ikpe ekpere mgbe niile ka o nyere anyị aka, ma na-eme ihe gosiri na ekpere ahụ si anyị n’obi, na-emekwa ihe o kwuru. Anyị ga na-echetakwa ụmụnna anyị n’ekpere.

17, 18. (a) Gịnị ka Jehova ga-eme ndị iro ya n’oge na-adịghị anya? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị izere?

17 Anyị ekwesịghị ‘inwe obi abụọ’ ugbu a, kama, okwukwe anyị kwesịrị isi ezigbo ike. (Rom 4:20) Setan na ndị ọ na-achị bụ ndị iro Chineke. Ha na-agbalị ịkwụsị ozi ọma anyị na-ekwusa, nke bụ́ ọrụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 28:19, 20) N’agbanyeghị ọgụ Ekwensu na-alụso anyị, anyị ma na Jehova bụ ‘Chineke dị ndụ, onye bụ́ Onye Nzọpụta nke ụdị mmadụ niile, karịsịa nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi.’ Jehova “maara otú o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa.”—1 Tim. 4:10; 2 Pita 2:9.

18 N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ebibi ụwa ochie a. N’agbanyeghị na ọ gwaghị anyị kpọmkwem mgbe ọ ga-eme ya na otú ihe niile ga-esi mee, anyị ma na Kraịst ga-ebibi ndị iro Chineke n’oge a kara aka, meekwa ka mmadụ niile mata na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ihe “oge na mgbe a kara aka” anyị bi na ya ugbu a pụtara, o nwere ike ịkpatara anyị ọnwụ! Ka anyị kpachara anya ka anyị ghara iche na “ihe niile ka dị kpọmkwem otú ha dị site ná mmalite okike.”—1 Tesa. 5:1; 2 Pita 3:3, 4.

‘CHERE CHINEKE’

19, 20. Gịnị mere anyị ga-eji chere Jehova?

19 Mgbe Jehova Chineke kere mmadụ, ọ chọrọ ka ha dị ndụ ebighị ebi, nke ga-eme ka ha na-amụ banyere ya nakwa ihe ndị mara mma o kere. Ekliziastis 3:11 kwuru banyere Jehova, sị: “O mewo ka ihe ọ bụla maa mma n’oge ya. O tinyewo ọbụna mgbe ebighị ebi n’obi ha, ka ụmụ mmadụ wee ghara ịchọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ site ná mmalite ruo ná ngwụsị.”

20 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova agbanwebeghị ihe o bu n’obi maka ndị mmadụ! (Mal. 3:6) ‘Chineke adịghị agbanwe agbanwe, ọ dịghị ka onyinyo nke na-atụgharị atụgharị.’ (Jems 1:17) Onyinyo na-agbanwe agbanwe n’ihi na ụwa na-agba gburugburu, ma Jehova anaghị agbanwe ka oge na-aga. Ọ bụ “Eze mgbe ebighị ebi.” (1 Tim. 1:17) N’ihi ya, ka anyị ‘chere Chineke nke nzọpụta anyị.’ (Maị. 7:7) Baịbụl kwuru, sị: “Nweenụ obi ike, ka obi siekwa unu ike, unu niile ndị na-echere Jehova.”—Ọma 31:24.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Gụọ akwụkwọ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! peeji nke 186-195.

^ par. 9 Gụọ akwụkwọ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! peeji nke 94-97.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 19]

Daniel nwere okwukwe na amụma Chineke buru ga-emezu

[Foto dị na peeji nke 21]

Ị̀ na-eji oge gị eme ihe bara uru iji mee uche Jehova?