Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-ekpughe “Ihe Ndị Na-aghaghị Ime N’oge Na-adịghị Anya”

Jehova Na-ekpughe “Ihe Ndị Na-aghaghị Ime N’oge Na-adịghị Anya”

Jehova Na-ekpughe “Ihe Ndị Na-aghaghị Ime N’oge Na-adịghị Anya”

“Mkpughe nke si n’aka Jizọs Kraịst, nke Chineke kpugheere ya ka o gosi ndị ohu ya ihe ndị na-aghaghị ime n’oge na-adịghị anya.”—MKPU. 1:1.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

Ná nnukwu ihe oyiyi ahụ, olee ihe nọchiri anya Briten na Amerịka?

Gịnị ka Jọn kwuru n’ọhụụ ya nke gosiri na Briten na Amerịka na-enye Òtù Mba Ụwa ike?

Olee otú ọhụụ Daniel na Jọn si gosi na a ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ?

1, 2. (a) Gịnị ka amụma Daniel na Jọn na-enyere anyị aka ịghọta? (b) Olee mba ndị isi isii mbụ nke anụ ahụ nọchiri anya ha?

Ọ BỤRỤ na anyị atụlee amụma Daniel na nke Jọn, anyị ga-aghọta ihe ọtụtụ ihe ndị na-eme ugbu a na ndị ka ga-eme n’ọdịnihu pụtara. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa nke Jọn hụrụ n’ọhụụ, n’anụ ọhịa nwere mpi iri nke Daniel hụrụ nakwa n’ihe Daniel kwuru banyere nnukwu ihe oyiyi ahụ Nebukadneza hụrụ ná nrọ? Oleekwa ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị aghọta amụma ndị ahụ nke ọma?

2 Ka anyị tụlee anụ ọhịa ahụ Jọn hụrụ n’ọhụụ. (Mkpu., isi 13) N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị hụrụ na isi isii mbụ nke anụ ọhịa ahụ nọchiri anya Ijipt, Asiria, Babịlọn, Midia na Peshia, Gris, na Rom. Ha niile gosiri na ha kpọrọ mkpụrụ nwaanyị ahụ asị. (Jen. 3:15) Ọ bụ Rom, bụ́ isi nke isii nke anụ ọhịa ahụ, na-achị ụwa mgbe Jọn dere ọhụụ ahụ, ọ chịkwara ọtụtụ narị afọ mgbe e dechara ọhụụ ahụ. Isi nke asaa ga-emecha nara Rom ọchịchị ụwa. Olee mba ọ ga-emecha bụrụ, oleekwa otú ọ ga-esi mesoo mkpụrụ nwaanyị ahụ?

MGBE BRITEN NA AMERỊKA MALITERE ỊCHỊ ỤWA

3. Gịnị ka anụ ọhịa ahụ dị egwu nwere mpi iri nọchiri anya ya, gịnịkwa ka mpi iri ahụ nọchiri anya ha?

3 Anyị ga-amata mba isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi 13 nọchiri anya ya ma ọ bụrụ na anyị atụlee ọhụụ Jọn na anụ ọhịa ahụ dị egwu nke nwere mpi iri Daniel hụrụ n’ọhụụ. * (Gụọ Daniel 7:7, 8, 23, 24.) Anụ ọhịa ahụ Daniel hụrụ nọchiri anya Rom, bụ́ mba chịrị ụwa. (Gaa na chaatị dị na peeji nke 12-13.) Ihe dị ka narị afọ anọ Kraịst nwụchara, Alaeze Ukwu Rom malitere itisa. Mpi iri ndị pulitere n’isi anụ ọhịa ahụ dị egwu nọchiri anya alaeze ndị si n’Alaeze Ukwu Rom pụta.

4, 5. (a) Gịnị ka mpi ahụ nke dị ntakịrị mere? (b) Gịnị bụ isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ?

4 Baịbụl kwuru ihe mere anọ n’ime mpi ndị ahụ ma ọ bụ alaeze ndị ahụ pulitere n’isi anụ ọhịa ahụ dị egwu. Mpi ọzọ “nke dị ntakịrị” fopụrụ atọ n’ime mpi ndị ahụ. Nke a mezuru mgbe Briten, bụ́ mba nọbu n’okpuru Alaeze Ukwu Rom, ghọrọ ọchịchị a ma ama. Ruo na narị afọ nke iri na asaa, Briten bụ ọchịchị a na-amaghị ama. E nwere mba atọ ndị ọzọ ha na ya nọ n’okpuru Rom, bụ́ ndị a ma ama karịa ya. Mba ndị ahụ bụ Spen, Nedalandz, na Frans. Briten fopụrụ ha atọ otu otu, ghọzie mba a ma ama karịa ha. N’ihe dị ka narị afọ atọ gara aga, Briten achọwala ịghọ ọchịchị kasị ike n’ụwa. Ma, ọ ghọbeghị isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ.

5 N’agbanyeghị na Briten ghọrọ alaeze kacha ike, ụfọdụ mba ha na-achị nupụụrụ ha isi ma ghọọ mba Amerịka. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị Briten kwere ka Amerịka ghọọ mba dị ike, ha jikwa ndị agha mmiri ha na-echebe ya. Mgbe ụbọchị Onyenwe anyị malitere n’afọ 1914, Briten aghọọla alaeze kacha ukwuu e nwetụrụla, Amerịka aghọọkwala mba kacha nwee ụlọ ọrụ na-emepụta ihe n’ụwa. * Mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ, Amerịka na Briten gbakọrọ aka lụọ agha. Ọ bụ mgbe ahụ ka isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ pụtara, ya bụ, Briten na Amerịka Bụ́ Mba Abụọ Jikọrọ Aka Na-achị Ụwa. Olee otú isi nke asaa ahụ si mesoo mkpụrụ nwaanyị ahụ?

6. Olee otú isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ sirila mesoo ndị Chineke?

6 Obere oge ụbọchị Onyenwe anyị malitechara, isi nke asaa ahụ malitere imegide ndị Chineke, bụ́ ụmụnna Kraịst ndị fọrọ n’ụwa. (Mat. 25:40) Jizọs mere ka anyị mata na n’oge ọnụnọ ya, ndị fọrọ ná mkpụrụ nwaanyị ahụ ka ga-anọ n’ụwa ma na-arụ ọrụ o nyere ha. (Mat. 24:45-47; Gal. 3:26-29) Briten na Amerịka busoro ndị nsọ ahụ agha. (Mkpu. 13:3, 7) Mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ, ọ kpagburu ndị Chineke, machibido ụfọdụ akwụkwọ ha iwu, tụọkwa ndị nnọchianya nke ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi mkpọrọ. Ọ fọrọ obere ka isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ kwụsị ozi ọma ndị Chineke na-ekwusa. Jehova gwara Jọn n’ọhụụ na ihe a ga-eme. Chineke gwakwara Jọn na ndị so ná mkpụrụ nwaanyị ahụ ga-amaliteghachi ikwusa ozi ọma. (Mkpu. 11:3, 7-11) Akụkọ ndị ohu Jehova n’oge a gosiri na ihe ndị ahụ mere.

BRITEN NA AMERỊKA NA ALA ALA ỤKWỤ AHỤ E JI ÍGWÈ NA ỤRỌ KPỤỌ

7. Gịnị jikọrọ isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ na nnukwu ihe oyiyi ahụ?

7 Olee ihe jikọrọ isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ na nnukwu ihe oyiyi ahụ? Briten si n’Alaeze Ukwu Rom pụta. Ebe ọ bụ na Amerịka si na Briten pụta, anyị nwere ike ikwu na o sikwa na Rom pụta. Ma, gịnị ka ala ala ụkwụ nke ihe oyiyi ahụ pụtara? Baịbụl kwuru na e ji ígwè na ụrọ kpụọ ya. (Gụọ Daniel 2:41-43.) Ihe a e kwuru banyere ala ala ụkwụ ihe oyiyi ahụ bụ ihe mere mgbe isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ pụtara, ya bụ, mgbe Briten na Amerịka gbakọrọ aka chịwa ụwa. Otú ahụ ígwè a gwakọtara ya na ụrọ na-agaghị esiru ike ka ígwè nkịtị, Briten na Amerịka esirughị ike ka Alaeze Ukwu Rom bụ́ ebe o si pụta. Gịnị mere ka ha ghara isi ike ka Rom?

8, 9. (a) Olee otú ọchịchị nke asaa ahụ chịrị ụwa si gosi na o siri ike ka ígwè? (b) Gịnị ka ala ala ụkwụ nke ihe oyiyi ahụ nọchiri anya ya?

8 Mgbe ụfọdụ, isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ gosiri na ya siri ike ka ígwè. Dị ka ihe atụ, o gosiri ike ya mgbe o meriri n’Agha Ụwa Mbụ. Mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, o gosikwara ike ya. * Mgbe a lụchara agha ahụ, ọ ka nọkwa na-akpa ike iji gosi na ya siri ike ka ígwè. Ma, a gwakọtara ígwè ahụ na ụrọ kemgbe Briten na Amerịka malitere ịchị ụwa.

9 Ọ dịla anya ndị Jehova chọwara ịghọta ihe ala ala ụkwụ ihe oyiyi ahụ nọchiri anya ya. Daniel 2:41 kpọrọ ígwè ahụ na ụrọ ahụ gwakọtara agwakọta otu “alaeze,” ọ bụghị ọtụtụ alaeze. N’ihi ya, ụrọ ahụ nọchiri anya ihe ndị dị ka òtù na ndị dị iche iche nọ n’ebe Briten na Amerịka na-achị, bụ́ ndị na-eme ka ha ghara isi ike ka Alaeze Ukwu Rom, nke ígwè nọchiri anya ya. Amụma Daniel kpọrọ ụrọ ahụ “ụmụ mmadụ,” ma ọ bụ, ndị nkịtị. (Dan. 2:43) N’ọchịchị Briten na Amerịka, e nweela ọtụtụ ndị na-esi ọnwụ inweta ihe ndị ruuru ha, inwetakwu ihe ha chọrọ n’ụlọ ọrụ ha, nakwa mba ndị na-alụ ọgụ ka ha nwere onwe ha. Ihe a niile ha na-eme anaghị ekwe ka Briten na Amerịka kpaa ike ka ígwè. Ndị mmadụ nwere echiche dị iche iche banyere ọchịchị. Ọ na-esikwara ọtụtụ ndị ọchịchị a ma ama ike ime ihe ha chọrọ ime n’ihi na ọ bụ naanị obere ihe ka ha ji merie ná ntụliaka, ọtụtụ ndị anaghịkwa akwado ọchịchị ha. Daniel buru amụma, sị: “Alaeze ahụ ga-esi ike n’otu aka, ma n’aka nke ọzọ, ọ gaghị esi ike.”—Dan. 2:42; 2 Tim. 3:1-3.

10, 11. (a) Gịnị ga-eme “ala ala ụkwụ ahụ”? (b) Olee ihe anyị ghọtara banyere ole mkpịsị ụkwụ ihe oyiyi ahụ dị?

10 N’oge anyị a, Briten na Amerịka ka na-agbakọ aka, nke ka nke, n’ihe ndị dị mkpa. Amụma ndị ahụ e buru banyere nnukwu ihe oyiyi ahụ na anụ ọhịa ahụ mere ka o doo anyị anya na Briten na Amerịka bụ ọchịchị ikpeazụ ga-achị ụwa. Ọ bụ ezie na ha esirughị ike ka ọchịchị Rom, bụ́ ogwe ụkwụ ígwè nke ihe oyiyi ahụ, ha agaghị eji aka ha tisaa.

11 Ole mkpịsị ụkwụ ihe oyiyi ahụ dị ò nwere ihe pụrụ iche ọ pụtara? Chegodị echiche: N’ọhụụ ndị ọzọ Daniel hụrụ, o kwuru kpọmkwem ole ihe ụfọdụ dị. Dị ka ihe atụ, o kwuru mpi ole dị n’isi anụ ọhịa dị iche iche. Ole ihe ndị ahụ dị nwere ihe ha pụtara. Ma, mgbe Daniel na-akọwa ihe oyiyi ahụ, o kwughị ole mkpịsị ụkwụ ya dị. N’ihi ya, o yiri ka ole mkpịsị ụkwụ ihe oyiyi ahụ dị adịghị mkpa, otú ahụ ọ na-adịghị mkpa ikwuwe na o nwere aka abụọ, mkpịsị aka iri, na ụkwụ abụọ. Ma, Daniel kwuru hoo haa na e ji ígwè na ụrọ kpụọ mkpịsị ụkwụ ihe oyiyi ahụ. Ihe ọ kọwara mere ka anyị ghọta na Briten na Amerịka bụ ọchịchị ga na-achị ụwa mgbe “nkume” ahụ nke nọchiri anya Alaeze Chineke ga-akụrisị ala ala ụkwụ ihe oyiyi ahụ.—Dan. 2:45.

BRITEN NA AMERỊKA NA ANỤ ỌHỊA AHỤ NWERE MPI ABỤỌ

12, 13. Gịnị ka anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ nọchiri anya ya, gịnịkwa ka o mere?

12 Ọ bụ eziokwu na ọchịchị Briten na Amerịka bụ ígwè na ụrọ a gwakọtara agwakọta, ọhụụ Jizọs gosiri Jọn mere ka a mata na ọchịchị a ga-arụ ọrụ dị mkpa n’oge ikpeazụ. Olee otú ọ ga-esi rụọ ya? Jọn hụrụ otu anụ ọhịa nwere mpi abụọ nke na-ekwu okwu ka dragọn. Gịnị ka anụ ọhịa a pụrụ iche nọchiri anya ya? O nwere mpi abụọ, n’ihi ya, ọ nọchiri anya mba abụọ gbakọrọ aka na-achị. Anụ ọhịa a Jọn hụrụ bụkwa Briten na Amerịka Bụ́ Mba Abụọ Jikọrọ Aka Na-achị Ụwa, ma ugbu a, ha rụrụ ọrụ pụrụ iche.—Gụọ Mkpughe 13:11-15.

13 Anụ ọhịa a kwuru ka e mee onyinyo nke anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa. Jọn kwuru na onyinyo nke anụ ọhịa ahụ ga-adị, kwụsị ịdị, ma pụta ọzọ. Nke ahụ bụkwa ihe mere otu òtù Briten na Amerịka mere ka e hiwe, bụ́ òtù e hiwere ka o jikọta mba dị iche iche ma bụrụ ọnụ na-ekwuru ha. * Òtù a pụtara mgbe Agha Ụwa Mbụ gachara, a kpọkwara ya Njikọ Mba Niile. O tisara mgbe Agha Ụwa nke Abụọ malitere. Mgbe a na-alụ agha ahụ, ndị Chineke kwuru na n’ihi amụma e buru ná Mkpughe, anụ ọhịa ahụ ga-apụta ọzọ. Ọ pụtakwara ọzọ, bụrụzie Òtù Mba Ụwa.—Mkpu. 17:8.

14. Olee otú onyinyo nke anụ ọhịa ahụ si bụrụ “eze nke asatọ”?

14 Jọn kpọrọ onyinyo nke anụ ọhịa ahụ “eze nke asatọ.” N’ihi gịnị? E kwughị na ọ bụ isi nke asatọ anụ ọhịa mbụ ahụ nwere. Ihe ọ bụ bụ naanị onyinyo nke anụ ọhịa ahụ. Ike ọ bụla o nwere bụ nke mba ndị so na ya nyere ya, karịsịa, ndị nke kacha akwado ya, bụ́ Briten na Amerịka. (Mkpu. 17:10, 11) Ma, e nyere ya ike ịchị ka eze ka o nwee ike ịrụ otu ọrụ dị mkpa ga-emetụta ụwa niile.

ONYINYO NKE ANỤ ỌHỊA AHỤ GA-ALA NWAANYỊ AKWỤNA AHỤ N’IYI

15, 16. Gịnị ka nwaanyị akwụna ahụ nọchiri anya ya, oleekwa ihe ndị na-akwadobu ya na-eme ugbu a?

15 Jọn kwuru na otu nwaanyị akwụna nọ n’elu otu anụ ọhịa nke na-acha uhie uhie, na-eduzikwa ya. Anụ ọhịa a na onyinyo nke anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa bụ otu ihe. A kpọrọ nwaanyị ahụ “Babịlọn Ukwu ahụ.” (Mkpu. 17:1-6) Nwaanyị akwụna a nọchiri anya okpukpe ụgha niile, karịsịa chọọchị Krisendọm. Okpukpe ụgha dị iche iche na-agọzi onyinyo nke anụ ọhịa ahụ ma na-agbalị ịgwa ya ihe ọ ga-eme.

16 Ma, n’ụbọchị Onyenwe anyị, ọtụtụ mmiri nke Babịlọn Ukwu ahụ nọ n’elu ya, ya bụ, ndị na-akwado ya, atawala n’ike n’ike. (Mkpu. 16:12; 17:15) Dị ka ihe atụ, mgbe mbụ onyinyo nke anụ ọhịa ahụ pụtara, chọọchị dị iche iche nke Krisendọm, bụ́ ndị a kacha mara amara na Babịlọn Ukwu ahụ, na-akpa ezigbo ike n’Ala Bekee. Taa, ọtụtụ ndị anaghịzi akwanyere chọọchị na ndị pastọ ha ùgwù. N’ezie, ha chere na okpukpe so na-akpata nsogbu n’ụwa. Kwa ụbọchị, ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu n’Ala Bekee na-ekwu ka e bibie okpukpe niile.

17. Gịnị ga-eme okpukpe ụgha n’oge na-adịghị anya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

17 Ma, okpukpe ụgha agaghị eji nwayọọ nwayọọ nwụọ. Nwaanyị akwụna ahụ ka ga na-akpa ike, na-agbalị ka ndị eze ụwa na-eme ihe ọ chọrọ ruo mgbe Chineke ga-etinye otu ihe n’obi ndị ọchịchị ahụ. (Gụọ Mkpughe 17:16, 17.) Òtù Mba Ụwa nọchiri anya ndị na-achị ụwa Setan a. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eme ka ha lụso okpukpe ụgha ọgụ. Nwaanyị akwụna ahụ agaghịzi enwe ike ịgwa ndị ọchịchị ihe ha ga na-eme, ha ga-ebibikwa akụ̀ ya niile. Ihe dị ka iri afọ atọ gara aga, ụdị ihe ahụ yiri ihe na-agaghị eme eme. Taa, nwaanyị akwụna ahụ anọsizighị ike n’elu anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie. Ma, ọ gaghị eji nwayọọ nwayọọ dapụ. Ọ ga-ada na mberede, e bibiekwa ya.—Mkpu. 18:7, 8, 15-19.

A GA-EBIBI ANỤ ỌHỊA NDỊ AHỤ

18. (a) Gịnị ka anụ ọhịa ahụ ga-eme, gịnịkwa ga-esi na ya pụta? (b) Olee alaeze ndị Daniel 2:44 gosiri na Alaeze Chineke ga-ebibi? (Gụọ ihe e kwuru n’igbe dị na peeji nke 17.)

18 E bibichaa okpukpe ụgha, a ga-eme ka anụ ọhịa ahụ, bụ́ ọchịchị ụwa nke dị n’aka Setan, lụso Alaeze Chineke ọgụ. Ebe ọ bụ na ndị eze ụwa agaghị agali n’eluigwe, ha ga-alụso ndị na-akwado Alaeze Chineke n’ụwa ọgụ. A naghị ajụ ajụ ihe ga-eme ha. (Mkpu. 16:13-16; 17:12-14) Daniel kọwara otu ihe ga-eme n’agha ahụ. (Gụọ Daniel 2:44.) A ga-ebibi ma anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe 13:1, ma onyinyo ya ma anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ.

19. Gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-eme, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ime ugbu a?

19 Anyị bi mgbe isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ na-achị. O nweghị isi ọzọ ga-epulite n’isi anụ ọhịa ahụ tupu e bibie ya. Ọ bụ Briten na Amerịka ga na-achị ụwa mgbe a ga-ebibi okpukpe ụgha. Ihe ndị ahụ Daniel na Jọn buru n’amụma emezuola otú ha si dee ha. Obi kwesịrị isi anyị ike na a ga-ebibi okpukpe ụgha nakwa na agha Amagedọn ga-amalite n’oge na-adịghị anya. Chineke emeela ka anyị mara ihe ndị ga-emenụ. Ànyị ga-aṅa ntị n’amụma ndị a e ji adọ anyị aka ná ntị? (2 Pita 1:19) Anyị kwesịrị ịkwado Jehova na Alaeze ya ugbu a.—Mkpu. 14:6, 7.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Na Baịbụl, iri na-anọchikarị anya ihe zuru ezu. N’ebe a, ọ pụtara alaeze niile si n’Alaeze Ukwu Rom pụta.

^ par. 5 Alaeze Ukwu Briten na Amerịka dị adị kemgbe narị afọ nke iri na asatọ. Ma, ọhụụ Jọn gosiri na ha abụọ ga-agbakọ aka na-achị ụwa mgbe ụbọchị Onyenwe anyị ga-amalite. N’eziokwu, ọ bụ “n’ụbọchị Onyenwe anyị” ka ọhụụ ndị e dere ná Mkpughe ga-emezu. (Mkpu. 1:10) Ọ bụ mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ ka isi nke asaa ahụ ghọrọ ọchịchị na-achị ụwa.

^ par. 8 Daniel hụrụ na eze a ga-ebibi nnukwu ihe n’agha ahụ. O dere, sị: ‘Ọ ga-eweta mbibi n’ụzọ dị ịtụnanya.’ (Dan. 8:24) Dị ka ihe atụ, Amerịka bibiri nnukwu ihe mgbe ọ tụrụ ndị iro ha bọmbụ abụọ.

^ par. 13 Gụọ akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! peeji nke 240, 241, 253.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Igbe dị na peeji nke 17]

OLEE NDỊ BỤ́ “ALAEZE NDỊ A NIILE”?

Daniel 2:44 buru amụma na Alaeze Chineke “ga-egwepịa alaeze ndị a niile.” Amụma ahụ kwuru banyere naanị alaeze ndị so n’ihe oyiyi ahụ.

Gịnị ga-eme alaeze ndị ọzọ niile? Amụma e buru ná Mkpughe, nke kwuru banyere otu ihe ahụ, mere ka anyị ghọtakwuo ihe ga-eme alaeze ndị ahụ. O gosiri na a ga-akpọkọta “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi” ka ha lụso Jehova ọgụ ‘n’oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.’ (Mkpu. 16:14; 19:19-21) N’ihi ya, ọ bụghị naanị alaeze ndị so n’ihe oyiyi ahụ ka a ga-ebibi n’Amagedọn, kama a ga-ebibikwa alaeze ụmụ mmadụ niile.