Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obiọma Ha Mere Ka Obi Ọjọọ Laa

Obiọma Ha Mere Ka Obi Ọjọọ Laa

Obiọma Ha Mere Ka Obi Ọjọọ Laa

NA Nedalandz, otu nwanna nwoke aha ya bụ George na nwunye ya bụ Manon gara izi otu agadi nwaanyị aha ya bụ Rie ozi ọma. Ma, nwaanyị ahụ enyeghị ha ihu. Ha chọpụtara na nwaanyị ahụ lụrụ di ugboro abụọ, ha abụọ emechaa nwụọ, nwa ya nwoke anwụọkwa. Nwaanyị ahụ na-arịakwa ogbu na nkwonkwo. N’agbanyeghị na o getụrụ ha ntị mgbe ha na ya na-akparịta ụka, o jighị obi ya niile nabata ha.

Ma George gwara Manon ka ha gaara nwaanyị ahụ nletaghachi ma nye ya okooko osisi ebe ọ bụ na ọ dị ka ọ̀ nọ naanị ya, obi adịghịkwa ya mma. Mgbe ha gara, o juru nwaanyị ahụ ezigbo anya, ma, o nweghị efe mgbe ahụ. N’ihi ya, ha na ya yiri agba mgbe ọzọ ha ga-abịa. George na Manon mechara gaghachi n’oge ahụ, ma o nweghị onye nọ n’ụlọ. Ha gakwara ugboro ugboro, ma ha ahụghị nwaanyị ahụ, nke mere ka ha chewe na ọ na-agbara ha ọsọ.

Otu ụbọchị, George mechara nweta nwaanyị ahụ n’ụlọ. O kwuru na o wutere ya na ya anọghị n’ụlọ mgbe ahụ ha bịara, kwuokwa na ya gara ụlọ ọgwụ kemgbe ahụ. Rie gwara ya, sị: “Ị maghịdị ihe m mere mgbe unu lara. Amalitere m ịgụ Baịbụl!” E ziri ya ozi ọma, malitere ya ọmụmụ Baịbụl.

Tupu Rie amụwa Baịbụl, ọ na-ewekarị iwe. Ma, mgbe ọ malitere ịmụ Baịbụl, ọ ghọrọ nwaanyị obiọma nke na-enwe obi ụtọ. N’agbanyeghị na ọrịa anaghị ekwe ya pụọ apụọ, ọ malitere ịgwa onye ọ bụla bịara ileta ya ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl. Ọrịa anaghị ekwe ya gachie ọmụmụ ihe anya, ma nleta ụmụnna na-abịa eleta ya na-atọ ya ụtọ. N’ụbọchị ọ gbara iri afọ asatọ na abụọ, ọ gara mgbakọ sekit, e meekwa ya baptizim iji gosi na ọ rarala onwe ya nye Chineke.

Ọnwa ole na ole ka e mechara ya baptizim, ọ nwụrụ. E mechara hụ abụ o dere. N’abụ ahụ, o kwuru na obi na-agbawa ndị agadi naanị ha nọ, kwuokwa na e kwesịrị ịna-emere ha obiọma. Manon kwuru, sị: “Mgbe m gụrụ abụ ahụ o dere, o metụrụ m n’ahụ́. Obi dịkwa m ụtọ na Jehova nyeere anyị aka imere ya obiọma.”

N’eziokwu, àgwà ọma Jehova na-eme ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya otú ahụ ma na-emere ha obiọma. (Efe. 5:1, 2) Anyị ga-arụpụta ihe n’ozi anyị ma ọ bụrụ na anyị “na-eme ka a mata anyị dị ka ndị ozi Chineke . . . site n’obiọma.”—2 Kọr. 6:4, 6.