Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ònye Ka M Ga-atụ Ụjọ?”

“Ònye Ka M Ga-atụ Ụjọ?”

“Ònye Ka M Ga-atụ Ụjọ?”

“Ọ bụrụgodị na e buso m agha, m ka ga na-atụkwasị ya obi.”—ỌMA 27:3.

OLEE OTÚ AMAOKWU NDỊ A GA-ESI ENYERE GỊ AKA INWE OBI IKE?

Abụ Ọma 27:1

Abụ Ọma 27:4

Abụ Ọma 27:11

1. Gịnị ka Abụ Ọma nke 27 ga-enyere anyị aka ịghọta?

GỊNỊ mere ozi ọma anyị na-ekwusa ji na-aga n’ihu n’agbanyeghị na nsogbu ụwa na-aka njọ? Gịnị mere anyị ji eji oge anyị na ike anyị ekwusa ya n’agbanyeghị na ihe na-esiri ọtụtụ ndị ike? Olee otú anyị ga-esi na-enwe obi ike n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị na-atụ ụjọ ihe ga-eme n’ọdịnihu? Abụ Eze Devid si n’ike mmụọ nsọ dee n’Abụ Ọma nke 27 zara ajụjụ ndị a.

2. Gịnị ka ụjọ na-eme mmadụ, ma olee ihe na-eme ka obi sie anyị ike?

2 Ihe mbụ Devid kwuru n’ebe ahụ bụ: “Jehova bụ ìhè m na nzọpụta m. Ònye ka m ga-atụ egwu? Jehova bụ idé ji ndụ m. Ònye ka m ga-atụ ụjọ?” (Ọma 27:1) Ụjọ na-eme ka mmadụ ghara inwe ike ime ihe ọ bụla. Ma ụjọ ekwesịghị ime ka ike gwụ onye na-atụ egwu Jehova. (1 Pita 3:14) Ọ bụrụ na anyị emee ka Jehova bụrụ idé ji ndụ anyị, anyị ‘ga-ebi n’obi iru ala, ụjọ ọdachi agaghịkwa enye anyị nsogbu.’ (Ilu 1:33; 3:25) N’ihi gịnị?

“JEHOVA BỤ ÌHÈ M NA NZỌPỤTA M”

3. Olee otú Jehova si bụrụ ìhè anyị, ma gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme?

3 Mgbe Baịbụl kwuru na “Jehova bụ ìhè” anyị, ọ pụtara na Jehova na-eme ka anyị si n’ọchịchịrị pụta, na-akụzikwara anyị eziokwu ya. (Ọma 27:1) Ìhè nkịtị nwere ike ime ka anyị hụ ihe ga-emerụ anyị ahụ́ ma ọ bụ ihe dịchiri ụzọ, ma ọ naghị ewepụ ya. Anyị kwesịrị izere ihe ahụ ga-emerụ anyị ahụ́. N’otu aka ahụ, Jehova na-eme ka anyị ghọta ihe ihe ndị na-eme n’ụwa pụtara. Ọ na-adọ anyị aka ná ntị banyere ihe ndị nwere ike ịkpatara anyị nsogbu n’ụwa ochie a. Ọ na-eji Baịbụl enye anyị ndụmọdụ ndị na-aba uru mgbe niile, ma anyị kwesịrị ịna-eme ihe anyị na-amụta. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, anyị ga-ama ihe karịa ndị iro anyị ma ọ bụ ndị nkụzi anyị.—Ọma 119:98, 99, 130.

4. (a) Gịnị mere obi ji sie Devid ike ikwu, sị: “Jehova bụ . . . nzọpụta m”? (b) Olee mgbe Jehova ga-akacha bụụrụ anyị nzọpụta?

4 Ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma 27:1 gosiri na ọ ga-abụrịrị na o chetara otú Jehova si napụta ya, ma ọ bụ zọpụta ya, n’oge gara aga. Dị ka ihe atụ, Jehova napụtara ya “n’aka ọdụm nakwa n’aka anụ ọhịa bea.” Jehova mekwara ka o merie ajọ dike bụ́ Golayat. Eze Sọl mechara jiri ube chọọ ịtụgide Devid n’ahụ́ ájá ugboro abụọ, ma Jehova napụtachara ya. (1 Sam. 17:37, 49, 50; 18:11, 12; 19:10) Ka a sịkwa ihe mere obi ji sie Devid ike ikwu, sị: “Jehova bụ . . . nzọpụta m”! Jehova ga-abụkwara ndị ohu ya nzọpụta otú ahụ ọ bụụrụ Devid. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ọ ga-anapụta ndị ohu ya “n’oké mkpagbu” na-abịanụ.—Mkpu. 7:14; 2 Pita 2:9.

NA-ECHETA MGBE Ọ BỤLA JEHOVA NYEERE GỊ AKA

5, 6. (a) Olee otú ihe anyị na-echeta ga-esi nyere anyị aka inwe obi ike? (b) Olee otú icheta ihe Jehova meere ndị ohu ya n’oge gara aga ga-esi mee ka anyị nwee obi ike?

5 Abụ Ọma 27:2, 3 kwuru otu ihe dị mkpa anyị ga-eme nke ga-enyere anyị aka inwekwu obi ike. (Gụọ ya.) Devid chetara oge dị iche iche Jehova napụtara ya. (1 Sam. 17:34-37) Ihe ndị ahụ o chetara mere ka obi sie ya ike idi ụdị nsogbu ọ bụla. Obi ọ̀ na-adị gị otú ahụ ma i cheta otú Jehova si napụta gị? Dị ka ihe atụ, è nweela mgbe i kpesiri ekpere ike ka Chineke nyere gị aka ná nsogbu bịaara gị, gị emechaa hụ otú Jehova si nye gị amamihe ma ọ bụ ike idi ọnwụnwa ahụ? Ì nwere ike icheta otú Chineke si wepụrụ gị ihe gbochiri gị iji ọṅụ na-ejere ya ozi ma ọ bụ otú o si megheere gị ọnụ ụzọ buru ibu ka i nwee ike ijekwuru ya ozi? (1 Kọr. 16:9) Olee otú obi na-adị gị ugbu a ma i cheta ihe ndị ahụ o meere gị? Ọ̀ bụ na ihe ndị ahụ anaghị eme ka obi sie gị ike na Jehova nwere ike inyere gị aka imeri nsogbu ndị siri ezigbo ike ma ọ bụ mee ka i die ha?—Rom 5:3-5.

6 Ọ́ bụrụkwanụ na ndị ọchịchị achọọ ikpochapụ nzukọ Jehova? N’oge anyị a, ọtụtụ ndị agbalịala ime otú ahụ, ma mbọ ha niile kụrụ afọ n’ala. Ọ bụrụ na anyị echeta otú Jehova si nyere ndị ya aka n’oge gara aga, ọ ga-eme ka obi sie anyị ike idi ihe ọ bụla nwere ike ime n’ọdịnihu.—Dan. 3:28.

JIRI EZI OFUFE KPỌRỌ IHE

7, 8. (a) Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 27:4, gịnị ka Devid rịọrọ Jehova? (b) Gịnị bụ nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ nke Jehova, oleekwa otú anyị si efe Chineke na ya?

7 Ihe ọzọ dị mkpa nke ga-eme ka anyị nwekwuo obi ike bụ iji ezi ofufe kpọrọ ihe. (Gụọ Abụ Ọma 27:4.) N’oge Devid, “ụlọ Jehova” bụ ụlọikwuu. Ọ bụ Devid mere ndokwa maka nnukwu ụlọ nsọ ahụ nwa ya Sọlọmọn ga-arụ. Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, Jizọs kọwara na oge na-abịa, mgbe ọ na-agaghịzi adị mkpa ka ndị mmadụ gaa n’ụlọ nsọ tupu Chineke anabata ofufe ha. (Jọn 4:21-23) Ná Ndị Hibru isi 8 ruo n’isi 10, Pọl onyeozi kwuru na nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ ahụ malitere mgbe e mere Jizọs baptizim n’afọ 29 O.A., mgbe o wepụtara onwe ya ime uche Jehova. (Hib. 10:10) Nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ ahụ bụ ndokwa Jehova mere ka anyị si n’okwukwe anyị nwere n’àjà mgbapụta Jizọs chụrụ nwee ike ife Chineke nke ọma. Olee otú anyị si efe Chineke n’ụlọ nsọ ahụ? Ọ bụ iji “ezi obi . . . , obi ike zuru ezu na okwukwe” na-ekpe ekpere, ịna-ekwupụta olileanya anyị n’ihu ọha n’amaghị jijiji, ịna-echebara ụmụnna anyị echiche, na-akpali ha, na-agbakwa ha ume mgbe anyị gara ọmụmụ ihe nakwa mgbe anyị na-enwe ofufe ezinụlọ. (Hib. 10:22-25) Iji ofufe Jehova kpọrọ ihe ga-enyere anyị aka inwe obi ike n’oge ikpeazụ a dị oké egwu.

8 N’ụwa niile, ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi na-ewepụtakwu oge ikwusa ozi ọma ma na-amụtakwu asụsụ ọhụrụ, na-akwagakwa n’ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ihe ha na-eme gosiri na, dị ka Devid, e nwere naanị otu ihe ha na-arịọ Jehova. Ihe ha na-arịọ ya bụ ka ha na-ahụ ịdị mma ya ma soro na-ejere ya ozi dị nsọ, ihe ọ sọkwara ya mee.—Gụọ Abụ Ọma 27:6.

KA OBI SIE GỊ IKE NA CHINEKE GA-ENYERE GỊ AKA

9, 10. Olee ihe nkwa ahụ dị n’Abụ Ọma 27:10 pụtara?

9 Devid kwuru ihe gosiri na obi siri ya ike na Jehova ga-enyere ya aka. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na nna m na nne m ahapụ m, Jehova ga-akpọrọ m.” (Ọma 27:10) Ihe e kwuru na Samuel nke Mbụ isi iri abụọ na abụọ mere ka anyị mata na nne na nna Devid ahapụghị ya. Ma, e nwere ọtụtụ ndị taa ndị ezinụlọ ha jụrụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọgbakọ Ndị Kraịst enyerela ọtụtụ ndị dị otú ahụ aka ma chebe ha.

10 Ebe ọ bụ na Jehova dị njikere ilekọta ndị ohu ya ma ọ bụrụ na ndị ọzọ ahapụ ha, ọ̀ bụ na ọ gaghị akwado ha mgbe ụdị mkpagbu ọ bụla bịaara ha? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na-echegbu onwe anyị banyere otú anyị ga-esi na-egboro ezinụlọ anyị mkpa ha, ọ̀ bụ na obi ekwesịghị isi anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka? (Hib. 13:5, 6) Ọ maara ọnọdụ ndị niile ji obi ha niile na-efe ya, marakwa ihe na-akpa ha.

11. Gịnị ka ndị mmadụ nwere ike iche banyere Ndịàmà Jehova ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi? Nye ihe atụ.

11 Chegodị banyere Victoria, bụ́ onye a na-amụrụ Baịbụl na Laịberịa. Mgbe ọ chọwara ka e mee ya baptizim, nwoke ya na ya bi hapụrụ ya na ụmụ ha atọ. N’agbanyeghị na o nweghị ụlọ, o nweghịkwa ọrụ, ọ kwụsịghị ịmụ Baịbụl. E mechara mee ya baptizim. Mgbe e mechara ya baptizim, nwa ya nwaanyị dị afọ iri na atọ hụrụ obere akpa ego juru. Ha kpebiri na ha agaghịdị agụ ego ahụ n’ihi na ha achọghị ka ọ dọwa ha akpịrị. Kama, ha kpọrọ onye soja nwe akpa ahụ ozugbo. Ọ gwara ha na a sị na mmadụ niile na-akwụwa aka ọtọ ka Ndịàmà Jehova, ihe gaara adị mma, udo adịkwa n’ụwa niile. Victoria ji Baịbụl gosi ya na Jehova kwere nkwa iweta ụwa ọhụrụ. Otú nwanna nwaanyị ahụ si kwụwa aka ọtọ mere ka onye soja ahụ si n’ego ahụ nye ya ego buru ibu. N’eziokwu, obi siri Ndịàmà Jehova ike na Jehova ga na-egboro ha mkpa ha. Ọ bụ ya mere e ji mara ha amara n’ụwa niile na ha na-akwụwa aka ọtọ.

12. Gịnị ka anyị ga-egosi ma ọ bụrụ na anyị ana-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị na anyị enwetaghị ihe anyị kwesịrị inweta? Nye ihe atụ.

12 Chegodị banyere otú obi dị Thomas, bụ́ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, nke bi na Siera Lion. Ọ malitere ịkụzi ihe n’otu ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ma a kwụghị ya ụgwọ ọnwa ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ n’ihi na a bịanyechabeghị aka n’akwụkwọ ya. Gịnị bụ ihe ikpeazụ a gwara ya ka o mee tupu a kwụwa ya ụgwọ ọnwa, kwụọkwa ya ụgwọ ndị e ji ya? Ọ bụ ịga ka otu ụkọchukwu, bụ́ onyeisi n’ụlọ akwụkwọ ahụ, gbaa ya ajụjụ ọnụ. Ụkọchukwu ahụ kwuru na ihe Ndịàmà Jehova kweere na ihe a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ ahụ abụghị otu ihe. Ọ gwara Thomas ka ọ họrọ ma ọ̀ ga na-arụ ọrụ ahụ ka ọ̀ ga-abụ Onyeàmà Jehova. Thomas gbara arụkwaghịm, hapụkwara ha ụgwọ niile ahụ ha ji ya. O nwetara ọrụ ọzọ, nke bụ́ ịrụzi redio na ekwentị. Akụkọ a na ọtụtụ akụkọ ndị ọzọ yiri ya gosiri na ndị mmadụ nwere ike ịna-atụ ụjọ na ha ga-anọ n’ụkọ. Ma, ụdị ụjọ ahụ anaghị atụ anyị n’ihi na anyị tụkwasịrị Onye kere ihe niile obi, marakwa na ọ na-echebe ndị ya.

13. Olee otú ozi ọma si aga n’ihu ná mba ebe ihe na-esiri ndị mmadụ ike?

13 Ụmụnna anyị na-ekwusasi ozi ọma ike n’ọtụtụ mba ebe ihe siri ezigbo ike. N’ihi gịnị? Otu alaka ụlọ ọrụ dere, sị: “Ọtụtụ ndị na-ekwe ka a mụọrọ ha Baịbụl bụ ndị na-enweghị ọrụ. N’ihi ya, ha na-enwekarị ohere ịmụ ihe n’ehihie. Ụmụnna na-enwekwa ohere ịga ozi ọma. N’ebe ihe siri ezigbo ike, a naghị agwa ndị mmadụ agwa na anyị bi n’oge ikpeazụ; ha na-ahụ ihe na-eme n’ebe niile.” N’otu mba, onye nkwusa ọ bụla na-amụrụ ihe karịrị mmadụ atọ Baịbụl. Otu onye ozi ala ọzọ nke jerela ozi ihe karịrị afọ iri na abụọ n’ebe ahụ dere, sị: “Ọtụtụ ndị nkwusa na-enwekarị ohere ikwusa ozi ọma na ịmụrụ ndị mmadụ ihe n’ihi na ha enweghị ọtụtụ ihe na-eri ha oge.”

14. Olee otú Chineke ga-esi echebe oké ìgwè mmadụ ahụ?

14 Jehova kwere nkwa na ya ga na-enyere nzukọ ya aka, na-echebe ya ma napụta ya. Obi siri anyị ike na ọ ga-eme otú ahụ. (Ọma 37:28; 91:1-3) Ndị ga-esi “n’oké mkpagbu ahụ” pụta ga-abụ oké ìgwè mmadụ n’eziokwu. (Mkpu. 7:9, 14) N’ihi ya, Chineke ga-echebe oké ìgwè mmadụ ahụ. Otu ụzọ ọ ga-esi mee ya bụ na ọ gaghị ekwe ka e kpochapụ ndị ya n’oge ikpeazụ a. Ụzọ ọzọ bụ na ọ ga-enye ha ihe niile ga-enyere ha aka idi ọnwụnwa, meekwa ka ha na ya dị ná mma. Jehova ga-echebekwa ndị ya n’agha Amagedọn.

“JEHOVA, BIKO, ZI M ỤZỌ GỊ”

15, 16. Ọ bụrụ na anyị emee ihe Chineke kwuru, olee uru anyị ga-erite? Nye ihe atụ.

15 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-enwe obi ike, ọ dị mkpa ka Chineke na-ezi anyị ihe. Ihe Devid rịọrọ Jehova gosiri na ọ bụ eziokwu. Ọ rịọrọ, sị: “Jehova, biko, zi m ụzọ gị, duokwa m n’ụzọ ezi omume n’ihi ndị iro m.” (Ọma 27:11) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe ahụ Devid rịọrọ Jehova, anyị ga na-ege ntị nke ọma ná ntụziaka ọ bụla nzukọ Jehova si na Baịbụl nye anyị ma mee ya ozugbo. Dị ka ihe atụ, nzukọ Jehova enyela anyị ndụmọdụ ugboro ugboro ka anyị selata aka n’ịchụ ego. Ọtụtụ ndị mere otú ahụ eritela ezigbo uru. Ha akwụọla ụgwọ ndị ha ji, reekwa ihe ndị na-adịchaghị ha mkpa. N’ihi ya, mgbe ihe siri ike n’ụwa dum n’oge na-adịbeghị anya, ha enweghị ọtụtụ ihe ga-echegbu ha. Kama ịna-arụgbu onwe ha n’ọrụ iji na-akwụ ụgwọ ihe ndị na-adịchaghị ha mkpa, ha na-ewepụtakwu oge na-aga ozi ọma. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M gụọ ihe na Baịbụl ma ọ bụ n’akwụkwọ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche na-ebipụta, m̀ na-eme ya ozugbo, ọ bụrụgodị na ọ ga-esiri m ezigbo ike?’—Mat. 24:45.

16 Ọ bụrụ na anyị ekwe ka Jehova na-ezi anyị ihe ma na-edu anyị n’ụzọ ezi omume, anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ. Mgbe otu ọsụ ụzọ oge niile nke bi n’Amerịka chọrọ ka e nye ya ọrụ ga-eme ka ya na ndị ezinụlọ ya nọgide n’ozi oge niile, onyeisi ya gwara ya na a gaghị enye ya ọrụ ahụ n’ihi na o jighị asambodo mahadum. Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emee gị, ị̀ ga-akwawa mmakwaara na ị na-eje ozi oge niile kama ịga mahadum? Mgbe izu abụọ gachara, a chụrụ onyeisi ahụ n’ọrụ. Onye ọzọ e mere onyeisi jụrụ nwanna ahụ ihe ọ chọrọ iji ndụ ya mee. Nwanna ahụ gwara ya ozugbo na ya na nwunye ya bụ Ndịàmà Jehova na-eje ozi oge niile nakwa na ha achọghị ịkwụsị. Tupu nwanna ahụ ekwuo ihe ọzọ, onyeisi ahụ gwara ya, sị: “Ama m na ị dị iche! Mgbe papa m nọ n’ọnụ ọnwụ, ụmụ nwaanyị abụọ bụ́ Ndịàmà Jehova na-abịa agụrụ ya Baịbụl kwa ụbọchị. Ekpebiri m na mgbe ọ bụla m nwere ike inyere Onyeàmà Jehova aka, m ga-eme otú ahụ.” N’ụtụtụ echi ya, e nyere nwanna ahụ ọrụ ahụ onyeisi ya nke mbụ na-ekweghị enye ya. N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, Jehova ga-emezu nkwa ahụ o kwere, nke bụ́ na ya ga na-egboro anyị mkpa anyị.—Mat. 6:33.

OKWUKWE NA OLILEANYA DỊ MKPA

17. Gịnị ga-enyere anyị aka iji obi ike na-echere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu?

17 Devid kwuru ihe ọzọ gosiri na okwukwe na olileanya dị mkpa. O kwuru, sị: “Gịnị ka m gaara eme ma a sị nnọọ na enweghị m okwukwe n’ịhụ ịdị mma Jehova n’ala ndị dị ndụ?” (Ọma 27:13) N’eziokwu, gịnị ka anyị gaara eme ma a sị na Chineke enyeghị anyị olileanya ma mee ka anyị ghọta ihe ndị ahụ e kwuru n’Abụ Ọma nke 27? N’ihi ya, n’oge ikpeazụ a, ka anyị jiri obi ike na-ekpe ekpere ka Jehova nye anyị ike ma napụta anyị ka anyị na-echere ihe ndị ga-eme n’Amagedọn.—Gụọ Abụ Ọma 27:14.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Obi siri Devid ike mgbe o chetara otú Jehova si napụta ya n’oge gara aga

[Foto dị na peeji nke 25]

Mgbe ihe siri ike, ànyị na-ewepụtakwu oge ikwusa ozi ọma?