Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Fee Chineke Nke Na-eme Ka Mmadụ Nwere Onwe Ya

Fee Chineke Nke Na-eme Ka Mmadụ Nwere Onwe Ya

Fee Chineke Nke Na-eme Ka Mmadụ Nwere Onwe Ya

“Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.”—1 JỌN 5:3.

Ị̀ GA-AZALI AJỤJỤ NDỊ A?

Olee otú Setan si agbalị ime ka iwu Chineke yie ibu arọ?

Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya nke ọma maka ndị anyị na ha na-akpa?

Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-erubere Chineke isi, bụ́ onye na-eme ka mmadụ nwere onwe ya?

1. Olee otú Jehova si emeso ndị ọzọ, oleekwa otú o si mee ka Adam na Iv nwere onwe ha?

Ọ BỤ naanị Jehova bụ Onye nweere onwe ya kpamkpam. Ma, ọ naghị eme ihe na-ezighị ezi; ọ naghịkwa ekpebiri ndị ohu ya ihe ọ bụla ha na-eme. Kama, ọ na-ekwe ka ha were aka ha kpebie ihe ha ga-eme, meekwa ihe ndị dị mma na-agụ ha agụụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ naanị otu ihe ka Chineke gwara Adam na Iv ka ha ghara ime, ya bụ, ka ha ghara iri “mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Jen. 2:17) Ha nwere ike ime uche Onye kere ha ma ka nwere onwe ha.

2. Gịnị mere nne na nna mbụ anyị ji ghọọ ndị ohu mmehie?

2 Gịnị mere Chineke ji mee ka Adam na Iv nwere onwe ha otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na o kere ha n’onyinyo ya, nyekwa ha akọnuche. Ọ tụrụ anya na ha ga na-eme ihe ziri ezi n’ihi na ha hụrụ Onye kere ha n’anya. (Jen. 1:27; Rom 2:15) Ọ dị mwute na Adam na Iv egosighị na obi dị ha ụtọ maka otú Onye nyere ha ndụ si mee ka ha nwere onwe ha. Kama ime otú ahụ, ha kpebiri iso Setan ma na-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ma, ihe ahụ nne na nna mbụ anyị mere emeghị ka ha nwerekwuo onwe ha. Kama, o mere ka ha na ụmụ ha ga-amụta ghọọ ndị ohu mmehie, kpatakwara ha ọnwụ.—Rom 5:12.

3, 4. Gịnị ka Setan chọrọ ime ka anyị na-eche banyere iwu Jehova?

3 Ebe Setan mere ka mmadụ abụọ ndị zuru okè na ndị mmụọ ozi nupụrụ Chineke isi, o nwekwara ike iduhie anyị. Ọ gbanwebeghị otú o si aghọ aghụghọ. Ọ chọrọ ime ka anyị chee na iwu Chineke bụ ibu arọ, na ọ na-eme ka anyị ghara ịna-ekpori ndụ ma ọ bụ na-enwe obi ụtọ. (1 Jọn 5:3) Ọ bụ otú ahụ ka ndị ụwa si eche echiche. Ọ bụrụ na anyị na ha na-anọ mgbe niile, anyị nwere ike ichewe echiche ka ha. Otu nwanna nwaanyị dị iri afọ abụọ na anọ kwara iko n’oge gara aga. O kwuru, sị: “Mkpakọrịta ọjọọ kpataara m nsogbu, nke ka nke, n’ihi na achọghị m ịgbapụ iche ma mụ na ụmụaka ibe m nọrọ.” O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ndị enyi mmadụ nwere ike ime ka o mee ihe na-adịghị mma.

4 Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst nwekwara ike ịbụ ndị enyi ọjọọ. Otu nwanna na-eto eto kwuru, sị: “Ahụla m ụfọdụ ndị na-eto eto ha na onye ụwa na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-akpachi anya. Ma, aghọtara m na ka mụ na ụmụnna ndị ahụ na-akpakwu ka m na-amụtakwu àgwà ọjọọ ha. O mere ka mụ na Jehova ghara ịdịzi ná mma. Ọmụmụ ihe anaghịzi atọ m ụtọ, ọ fọkwara obere ka m kwụsị ịga ozi ọma. Ọ bụ mgbe ahụ ka m ghọtara na mụ na ndị ahụ ekwesịghịzi ịna-akpa. M hapụrụ ha!” Ị̀ ma na i nwere ike ịmụta àgwà ndị enyi gị na-akpa? Ka anyị tụlee otu akụkọ a kọrọ na Baịbụl.—Rom 15:4.

O ZUURU OBI HA

5, 6. Olee otú Absalọm si duhie ndị ọzọ, ò mechara nweta ihe ọ chọrọ?

5 Baịbụl kọrọ akụkọ banyere ọtụtụ ndị mere ka ndị ọzọ mụta àgwà ọjọọ. Otu n’ime ha bụ Absalọm, bụ́ nwa Eze Devid. Absalọm mara mma okorobịa. Ma, ka oge na-aga, o kwere ka oké ọchịchọ ju ya obi otú ahụ Setan mere. Absalọm chọrọ ịchụpụ nna ya n’ocheeze ma nọchie, n’agbanyeghị na ọ bụghị yanwa kwesịrị ịbụ eze. * Iji nweta ihe ọ chọrọ, o ji aghụghọ mee ka ndị Izrel ibe ya chee na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi nakwa na o nweghị ihe eze ji ha kpọrọ. Otú ahụ Ekwensu mere n’ogige Iden, Absalọm mere ka ndị Izrel chee na ọ chọrọ inyere ha aka, ma ọ ghagidere nna ya ụgha jọgburu onwe ya.—2 Sam. 15:1-5.

6 Absalọm ò mechara nweta ihe ọ chọrọ? O nwetara obere, n’ihi na Baịbụl kwuru, sị: “Absalọm wee na-ezuru obi ndị Izrel.” (2 Sam. 15:6) Ma n’ikpeazụ, mpako Absalọm mere ka e merie ya. Ọ dị mwute na o mere ka e gbuo ya na ọtụtụ puku ndị ọ ghọgburu.—2 Sam. 18:7, 14-17.

7. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Baịbụl kọrọ banyere Absalọm? (Lee ihe e sere na peeji nke 14.)

7 Gịnị mere o ji dịrị Absalọm mfe iduhie ndị Izrel ahụ? Ọ dị ka obi ha ọ̀ dị n’ihe Absalọm kwere ha ná nkwa. O nwekwara ike ịbụ na mma ọ mara megharịrị ha anya. Ihe ọ sọkwara ya bụrụ, otu ihe doro anya bụ na ha erubereghị Jehova na onye o mere eze isi. Taa, Setan ka na-eji ndị na-akpa àgwà ka Absalọm agbalị izuru obi ndị ohu Jehova. Ha nwere ike iche, sị, ‘Iwu Jehova na-eke mmadụ agbụ. Legodị ndị niile na-anaghị efe Jehova. Ha na-ekpori ndụ!’ Ì nwere ike ịghọta na ihe ahụ niile bụ ụgha chara acha? Ị̀ ka ga na-erubere Chineke isi? Ị̀ ga-aghọta na ọ bụ naanị ‘iwu zuru okè’ nke Jehova, ya bụ, iwu nke Kraịst, ga-eme ka i nwere onwe gị n’ezie? (Jems 1:25) Ọ bụrụ otú ahụ, jiri iwu ahụ kpọrọ ihe, ekwela ka a rata gị iji nnwere onwe gị na-eme ihe ọjọọ.—Gụọ 1 Pita 2:16.

8. Olee ihe ndị mere eme gosiri na ileghara iwu Jehova anya anaghị eme ka obi dị mmadụ ụtọ?

8 Ndị Setan na-achọkarị iduhie bụ ndị na-eto eto. Otu nwanna nwoke nke dị iri afọ atọ ugbu a kwuru banyere mgbe ọ ka na-eto eto, sị: “N’oge ahụ, echere m na iwu Jehova na-eke mmadụ agbụ, ọ bụghị ichebe mmadụ.” N’ihi ya, ọ kwara iko. Ma o meghị ka obi dị ya ụtọ. O kwuru, sị: “Ruo ọtụtụ afọ, obi mara m ikpe, m na-akwakwa mmakwaara.” Otu nwanna nwaanyị chetara ihe o mere mgbe ọ na-eto eto ma kwuo, sị: “Mmadụ kwaa iko, obi agaghị adị ya mma, ọ ga-adịkwa ya ka ọ baghịzi uru. Afọ iri na itoolu agaala kemgbe m kwara iko, ma obi ka na-ajọ m njọ ma m cheta ya.” Nwanna nwaanyị ọzọ kwuru, sị: “Icheta na omume m wutere ndị m hụrụ n’anya mere ka obi ghara izu m ike, isi ana-agba m gharaghara, ọ kpakwara okwukwe m aka ọjọọ. Mmadụ ịbụ onyeiro Jehova bụ ihe jọgburu onwe ya.” Setan achọghị ka i chee banyere nsogbu ndị ahụ mmehie ga-akpatara gị.

9. (a) Olee ajụjụ ndị nwere ike inyere anyị aka ịtụle otú anyị si ele Jehova na iwu ya anya? (b) Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị mata Chineke nke ọma?

9 Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị na-eto eto na ụfọdụ ndị torola eto bụ́ ndị nọ n’ọgbakọ ataala ahụhụ tupu ha amata na mmehie na-akpatara mmadụ nsogbu! (Gal. 6:7, 8) N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Àghọtara m aghụghọ dị iche iche Setan chọrọ iji ghọgbuo m? Àghọtara m na Jehova bụ ezigbo Enyi m, na ọ na-agwa m eziokwu mgbe niile nakwa na ọ chọrọ ka ihe dịrị m mma? M̀ kwetasiri ike na o nweghị mgbe ọ ga-anapụ m ihe ga-abara m ezigbo uru na ihe ga-eme ka obi dị m ezigbo ụtọ?’ (Gụọ Aịzaya 48:17, 18.) Naanị ihe ga-eme ka ị zaa ee n’ajụjụ ndị ahụ bụ ịmata Jehova nke ọma. I kwesịrị ịmata ya nke ọma, ghọtakwa na iwu ya na ụkpụrụ ya ndị dị na Baịbụl gosiri na ọ hụrụ gị n’anya, ọ bụghị na ọ chọrọ ike gị agbụ.—Ọma 25:14.

RỊỌ CHINEKE KA O NYE GỊ OBI NWERE AMAMIHE, NKE NA-ERUBEKWA ISI

10. Gịnị mere anyị ji kwesị ime ihe Eze Sọlọmọn mere mgbe ọ bụ nwa okorobịa?

10 Mgbe Sọlọmọn ka bụ nwa okorobịa, o ji obi umeala kpee ekpere, sị: ‘M ka bụ nwata. Amaghị m otú e si apụ apụ, amaghịkwa m otú e si abata abata.’ N’ihi ya, ọ rịọrọ Chineke ka o nye ya obi nwere amamihe, nke na-erubekwa isi. (1 Eze 3:7-9, 12) Jehova zara ekpere ahụ o ji obi ya niile kpee. Ọ ga-azakwa nke gị, ma ị̀ bụ onye na-eto eto ma ị̀ bụ agadi. N’eziokwu, Jehova agaghị arụ ọrụ ebube nye gị amamihe na nghọta. Ma ọ ga-eme ka ị mara ihe ma ọ bụrụ na ị na-amụsi Okwu ya ike, na-arịọ ka o nye gị mmụọ nsọ, na-emekwa ihe a na-akụziri gị n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Jems 1:5) N’eziokwu, Jehova na-esi otú ahụ eme ka ọbụna ndị ohu ya ka na-eto eto mara ihe karịa ndị niile na-eleghara ndụmọdụ ya anya, ma ndị a sịrị na ha bụ “ndị maara ihe na ndị nwere ọgụgụ isi” n’ụwa a.—Luk 10:21; gụọ Abụ Ọma 119:98-100.

11-13. (a) Olee ihe ndị bara uru anyị nwere ike ịmụta n’Abụ Ọma 26:4, n’Ilu 13:20, nakwa ná 1 Ndị Kọrịnt 15:33? (b) Olee otú i nwere ike isi mee ihe e kwuru n’amaokwu ndị a?

11 Ka anyị tụlee amaokwu Baịbụl ndị ga-akụziri anyị ihe ụfọdụ dị mkpa banyere ụdị ndị anyị ga-emeta enyi. Ịtụle amaokwu ndị ahụ ga-enyere anyị aka ịghọta na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-amụ Baịbụl ma na-atụgharị uche na ya ka anyị nwee ike ịmata Jehova nke ọma. Abụ Ọma 26:4 kwuru, sị: “Mụ na ndị ụgha adịghị anọkọ; mụ na ndị na-ezochi ihe ha bụ adịghị akpakọrịta.” Ilu 13:20 kwuru, sị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.” Ndị Kọrịnt nke Mbụ 15:33 kwuru, sị: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.”

12 Olee ihe ndị bara uru anyị nwere ike ịmụta n’amaokwu ndị ahụ? (1) Jehova chọrọ ka anyị na-ahọ ndị anyị ga-emeta enyi ahọ. Ọ chọrọ ichebe anyị ka anyị ghara ime ihe ga-akpatara anyị nsogbu ma mee ka anyị na ya ghara ịdị ná mma. (2) Ndị anyị na ha na-akpa nwere ike ime ka anyị mụta ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. A gaghị agbanahụ ya agbanahụ. Otú e si kwuo ihe e kwuru n’amaokwu ndị ahụ gosiri na Jehova na-agbalị ikwu ihe ga-eru anyị n’obi. Olee otú o si eme ya? Cheta na ihe e kwuru n’amaokwu ndị ahụ abụghị “mee nke a” ma ọ bụ “emela nke a.” Kama, ihe e dere na ha bụ eziokwu doro anya. Ọ dị ka à ga-asị na Jehova na-agwa anyị, sị: ‘Lee nke bụ́ eziokwu. Gịnị ka ị ga-eme? Gịnị ka i bu n’obi?’

13 N’ikpeazụ, ebe ọ bụ na ihe e kwuru n’amaokwu atọ ahụ bụ eziokwu doro anya, ha ka bara uru taa otú ha bara mgbe e dere ha, ha na-abakwara ọtụtụ ndị uru n’agbanyeghị ọnọdụ ha. Dị ka ihe atụ, jụọ onwe gị ajụjụ ndị dị ka: Gịnị ka m ga-eme ka mụ na “ndị na-ezochi ihe ha bụ” ghara ịna-akpa? Olee ebe m nwere ike ịhụ ụdị ndị ahụ? (Ilu 3:32; 6:12) Ole ndị bụ “ndị maara ihe” Jehova chọrọ ka mụ na ha na-akpa? Ole ndị bụ “ndị nzuzu” ọ chọrọ ka mụ na ha ghara ịna-akpa? (Ọma 111:10; 112:1; Ilu 1:7) Olee “àgwà ọma” ndị m ga-emebi ma ọ bụrụ na mụ emeta ndị ọjọọ enyi? Ọ̀ bụ naanị ndị ụwa bụ ndị enyi ọjọọ? (2 Pita 2:1-3) Olee otú ị ga-esi zaa ajụjụ ndị a?

14. Olee otú unu nwere ike isi mee ka mgbede Ofufe Ezinụlọ unu ka mma?

14 Mgbe ị tụgharịchara uche n’amaokwu ndị ahụ, ọ́ gaghị adị mma ka ị tụlee amaokwu ndị ọzọ ga-enyere gị aka ịghọta ihe bụ́ uche Chineke n’ihe ndị na-echu gị na ezinụlọ gị ụra? * Ndị nne na nna, ọ ga-adị mma ka unu tụlee ihe ndị ahụ ná mgbede Ofufe Ezinụlọ unu. Ka unu na-eme otú ahụ, chetanụ na ihe unu kwesịrị ibu n’obi na-eme ya bụ inyere onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ unu aka ịghọtakwu na iwu Chineke na ụkpụrụ ya na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. (Ọma 119:72) N’eziokwu, ọ bụrụ na unu na-amụ ihe otú ahụ, o kwesịrị ime ka ezinụlọ unu dị n’otu, unu na Jehova adịkwuo ná mma.

15. Olee otú ị ga-esi mara ma ì nwewela obi maara ihe, nke na-erubekwa isi?

15 Olee otú ị ga-esi mara ma ì nwewela obi maara ihe, nke na-erubekwa isi? Otu ụzọ bụ ịmata ma ị̀ na-eche echiche ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie, dị ka Eze Devid, bụ́ onye dere, sị: “Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ, iwu gị dịkwa n’ime obi m.” (Ọma 40:8) Onye dere Abụ Ọma nke 119 dekwara, sị: “Lee ka m si hụ iwu gị n’anya! Ọ bụ ihe m na-atụgharị n’uche ogologo ụbọchị dum.” (Ọma 119:97) Ị chọọ inwe ụdị ịhụnanya a, i kwesịrị ịgbasi mbọ ike. Ị ga-enwe ịhụnanya ahụ ma ọ bụrụ na ị na-amụsi Baịbụl ike, na-ekpe ekpere ma na-atụgharị uche. Ị ga-enwekwa ya ma ị hụ otú Chineke si na-agọzi gị n’ihi na ị na-erubere iwu ya isi.—Ọma 34:8.

NA-ALỤ ỌGỤ MAKA NNWERE ONWE GỊ N’IME KRAỊST!

16. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri n’ọgụ anyị na-alụ ka anyị nwee ike inwere onwe anyị n’ezie?

16 Kemgbe ụwa, mba dị iche iche na-alụsi agha ike n’ihi na ha chọrọ inwere onwe ha. N’ihi ya, i kwesịrị ịna-alụsi ọgụ ike ka ihe ọ bụla ghara ime ka ị bụrụ ohu! Cheta na ndị iro gị abụghị naanị Setan, ụwa ya, na mmụọ nke ụwa. I kwesịkwara ịlụso ezughị okè gị ọgụ, nakwa obi gị nke nwere ike iduhie gị. (Jere. 17:9; Efe. 2:3) Ma, i nwere ike imeri n’ọgụ ahụ ma Jehova nyere gị aka. Mgbe ọ bụla i mere ihe ziri ezi, e nwere uru abụọ ọ ga-abara gị. Nke mbụ bụ na ị ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11) Nke abụọ abụrụ na mgbe ọ bụla ị chọpụtara na “iwu ahụ zuru okè nke na-eweta nnwere onwe” na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, ị ga-ekpebisikwu ike ịnọsi ike ‘n’okporo ụzọ ahụ dị warara’ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi. Ị ga-enwerekwu onwe gị n’ọdịnihu mgbe Jehova ga-emezu nkwa o kwere ndị niile na-erubere ya isi.—Jems 1:25; Mat. 7:13, 14.

17. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịda mbà n’ihi ezughị okè anyị, oleekwa otú Jehova si enyere anyị aka?

17 N’eziokwu, anyị niile na-emehie mgbe ụfọdụ. (Ekli. 7:20) Mgbe i mehiere, adala mbà ma ọ bụ chee na ị baghịzi uru. Ọ bụrụ na ị daa, bilie gawakwa, ọ bụrụgodị na ị ga-agwa ndị okenye ka ha nyere gị aka. Jems kwuru na ‘ekpere ha ga-eji okwukwe kpee ga-eme ka ahụ́ dị onye ahụ́ na-adịghị ike mma, Jehova ga-emekwa ka o bilie. Ọ bụrụkwa na o mewo mmehie, a ga-agbaghara ya.’ (Jems 5:15) Echefula na Chineke dị ebere n’eziokwu, nakwa na o mere ka ị bata n’ọgbakọ n’ihi na ọ hụrụ ihe dị mma n’ime gị. (Gụọ Abụ Ọma 103:8, 9.) N’ihi ya, ọ bụrụhaala na i ji obi gị dum na-ejere Jehova ozi, ọ gaghị ahapụ gị.—1 Ihe 28:9.

18. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị kwetara ihe Jizọs kwuru n’ekpere ya e dere na Jọn 17:15?

18 N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, o kpere ekpere maka ndịozi ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi, rịọkwa Nna ya ka o chebe ha. O kwuru ihe a na-agaghị echefu echefu, sị: “Chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ.” (Jọn 17:15) Ọ bụghị naanị ndịozi ya ndị ahụ ka Jizọs bu n’obi, kama o kwukwara banyere ndị niile na-eso ụzọ ya. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-aza ekpere ahụ Jizọs kpere ma chebe anyị n’oge a dị oké egwu. ‘Jehova bụ ọta nke ndị na-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe. Ọ ga-eche ụzọ nke ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ nche.’ (Ilu 2:7, 8) Irubere iwu Jehova isi anaghị adị mfe mgbe niile, ma ọ bụ naanị ndị na-erubere Jehova isi ga-enweta ndụ ebighị ebi ma nwere onwe ha n’ezie. (Rom 8:21) Ekwela ka onye ọ bụla duhie gị!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 A mụọla Absalọm tupu Chineke ekwe Devid nkwa na ọ ga-amụta nwa ma ọ bụ “mkpụrụ” nke ga-abụ eze ma Devid nwụọ. N’ihi ya, Absalọm kwesịrị ịma na ọ bụghị ya ka Jehova họọrọ ịbụ eze ga-anọchi Devid.—2 Sam. 3:3; 7:12.

^ par. 14 Amaokwu Baịbụl ndị unu nwere ike ịtụle bụ 1 Ndị Kọrịnt 13:4-8, bụ́ ebe Pọl kọwara ịhụnanya, na Abụ Ọma 19:7-11, bụ́ ebe kwuru ọtụtụ ngọzi anyị ga-enweta ma ọ bụrụ na anyị na-erubere iwu Jehova isi.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 14]

Olee otú anyị nwere ike isi mata ndị na-eme ka Absalọm taa ma zere ha?