Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha n’Ekwedọọ

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha n’Ekwedọọ

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha n’Ekwedọọ

N’ỊTALI, otu nwanna nwoke na-eto eto aha ya bụ Bruno chọrọ ikpebi ihe ọ ga-eme. Ọ dịbeghị anya ọ gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ọ gbara onye mbụ na klas ha. Ndị ikwu ya na ndị nkụzi gwara ya na o kwesịrị ịga mahadum. Ma afọ ole na ole tupu mgbe ahụ, Bruno raara onwe ya nye Jehova ma kwe ya nkwa na ọ bụ ime uche Chineke ga-abụ ihe kacha mkpa ná ndụ ya. Gịnịzi ka o kpebiri ime? O kwuru, sị: “Ekpere m ekpere gwa Jehova na m ga-emezu nkwa m kwere ya ma were ozi ya ka ihe kacha mkpa. Ma, eji m obi m dum gwakwa ya n’ekpere na m chọrọ ka ozi m ga-ejere ya tọọ m ụtọ, meekwa ka m rụọ ọtụtụ ihe n’ozi ya.”

Mgbe afọ ole na ole gachara, Bruno gara biri n’Ekwedọọ, n’Ebe Ndịda Amerịka. O kwuru, sị: “Jehova zara ekpere m otú m na-atụghị anya ya.” O juru ya anya na mgbe o ruru n’Ekwedọọ, ọ hụrụ ọtụtụ ndị ọzọ na-eto eto, bụ́ ndị bịakwara ebe ahụ ka ha nwee ike jekwuoro Jehova ozi.

NDỊ NA-ETO ETO BỤ́ NDỊ ‘NWALERE JEHOVA’

Bruno na ọtụtụ ndị ọzọ na-eto eto n’ụwa niile mere ihe ahụ Jehova kwuru, nke bụ́: “Biko, nwaleenụ m n’ihe a . . . ma ḿ gaghị emeghe ọnụ ụzọ mmiri nke eluigwe wee wụsa unu ngọzi.” (Mal. 3:10) Ebe ọ bụ na ha hụrụ Chineke n’anya, ha kpebiri ‘ịnwale Jehova.’ Ha wepụtara oge ha, ike ha, na ego ha na-akwado ozi ya n’obodo ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke.

Oge na-adịghị anya ka ndị ahụ na-eto eto ruru ná mba ha gara, ha na-achọpụta na “ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole.” (Mat. 9:37) Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ si Jamanị aha ya bụ Jaqueline ji obi ụtọ degara alaka ụlọ ọrụ dị n’Ekwedọọ akwụkwọ ozi, sị: “Ejeela m ozi n’Ekwedọọ naanị ihe dị ka afọ abụọ, ma amalitela m ịmụrụ mmadụ iri na atọ ihe. Mmadụ anọ n’ime ha na-abịachi ọmụmụ ihe anya. Ọ̀ bụ na obi ekwesịghị ịdị m ụtọ?” Nwa agbọghọ ọzọ si Kanada aha ya bụ Chantal kwuru, sị: “N’afọ 2008, akwagara m n’otu obodo dị n’akụkụ oké osimiri n’Ekwedọọ. N’oge ahụ, naanị otu ọgbakọ ka e nwere n’ebe ahụ. E nweela ọgbakọ atọ na ihe karịrị ndị ọsụ ụzọ iri atọ n’ebe ahụ ugbu a. O nweghị ihe na-eme m obi ụtọ ka ịhụ ka ọtụtụ ndị ọhụrụ na-eme nke ọma n’ọgbakọ!” O kwukwara, sị: “Ebi m n’otu obodo dị n’elu Ugwu Andiz. Ndị bi n’obodo a karịrị iri puku asaa na ise. Ma ọ bụ naanị otu ọgbakọ ka e nwere. Ọtụtụ ndị na-ege ntị n’ozi ọma! Ozi m na-eje n’ebe a na-eme m obi ụtọ.”

NSOGBU NDỊ A NA-ENWE

O doro anya na ije ozi ná mba ọzọ anaghị adị mfe mgbe niile. N’eziokwu, ụfọdụ ndị na-eto eto chọpụtara na ọ dịghị mfe tupu ha agawa. Otu nwa agbọghọ si Amerịka aha ya bụ Kayla kwuru, sị: “Ihe ụfọdụ ụmụnna nọ n’ọgbakọ anyị kwuru banyere ikwusa ozi ọma n’ala ọzọ anaghị agba ume. Ha aghọtaghị ihe mere anyị ji chọọ ịkwaga mba ọzọ gaa sụwa ụzọ. Mgbe ụfọdụ, o mere ka m chewe, sị, ‘Ihe a m kpebiri ime ò kwesịrị ekwesị?’” N’agbanyeghị nke ahụ, Kayla kpebiri ịkwaga ebe ahụ. O kwuru, sị: “Ekpere m kpere ọtụtụ ugboro na ụka mụ na ụmụnna tozuru okè kparịtara nyeere m aka ịghọta na Jehova na-agọzi ndị na-ewepụta onwe ha ijere ya ozi.”

Ịmụ asụsụ ọzọ siiri ọtụtụ ndị ike. Otu nwa agbọghọ si Ayaland aha ya bụ Siobhan kwuru, sị: “O wutere m na agaghị m ekwuli ihe m chọrọ ikwu. Amụtara m inwe ndidi, na-amụsi asụsụ ahụ ike ma na-achị onwe m ọchị mgbe m na-asụtaghị ya.” Nwa agbọghọ ọzọ si Estonia aha ya bụ Anna kwukwara, sị: “Ebe a na-ekpo ọkụ. Uzuzu juru ebe niile. Mmiri ọkụ anaghịkwa agbapụta n’ebe a na-asa ahụ́. Ma ihe kacha siere m ike bụ ịmụ asụsụ Spanish. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka m kwụsị ịmụ ya. Achọpụtara m na m kwesịrị ilekwasị anya n’ihe m na-emeta, ọ bụghị n’ihe m na-emejọ.”

Nsogbu ọzọ ụfọdụ ndị na-enwekarị bụ na ọ na-agụsi ha agụụ ike ịhụ ndị ezinụlọ ha ha hapụrụ. Otu nwa okorobịa si Amerịka aha ya bụ Jonathan kwuru, sị: “Oge na-adịghị anya ka m rutechara ebe a, obi adịchaghị m mma n’ihi na mụ na ndị ikwu na ibe m ebighịzi. Ma obi mechara dịwa m mma mgbe m malitere ịmụsi Baịbụl ike, na-agasikwa ozi ọma ike. N’oge na-adịghị anya, ihe ndị na-atọ m ụtọ n’ozi ọma na ndị enyi ọhụrụ m nwetara n’ọgbakọ mere ka obi dịwakwa m ụtọ.”

Ihe ọzọ na-esiri ụfọdụ ndị ike bụ otú ihe dị n’ebe ha kwagara. Ihe ụfọdụ nwere ike ịdị iche n’ebe ị kwagara. Otu nwa okorobịa si Kanada aha ya bụ Beau kwuru, sị: “Mgbe i bi n’obodo unu, o nwere ike o nweghị ihe i ji ihe ndị dị ka ọkụ eletrik na mmiri pọmpụ kpọrọ. Ma n’ebe a, ọkụ na-eme pịnyụ pịnyụ, pọmpụ anaghịkwa agba mgbe niile.” N’ọtụtụ mba, ọtụtụ ndị dara ogbenye, a naghịkwa enwe ezigbo ụgbọala na-ebu ndị mmadụ, ọtụtụ ndị amaghịkwa akwụkwọ. E nwere otu nwa agbọghọ si Ọstria aha ya bụ Ines. Ihe na-enyere ya aka idi nsogbu ndị ahụ bụ iche banyere àgwà ọma ndị obodo ahụ nwere. O kwuru, sị: “Ha na-anabata ndị ọbịa, ha dị nwayọọ, na-enyere mmadụ aka ma dị umeala n’obi. Nke kachanụ bụ na ha nwere ezigbo mmasị ịmụkwu banyere Chineke.”

“NGỌZI RUO MGBE Ọ NA-ADỊGHỊ IHE GA-AKỌ UNU”

N’agbanyeghị na ndị ahụ niile na-eto eto, bụ́ ndị na-eje ozi n’Ekwedọọ, hapụrụ ọtụtụ ihe, ha achọpụtala na Jehova mere ka ha nwee “ihe nke ukwuu karịa ihe niile” ha tụrụ anya ya. (Efe. 3:20) N’eziokwu, ha achọpụtala na Jehova ‘agọziela ha ruo mgbe ọ na-adịghị ihe kọrọ ha.’ (Mal. 3:10) Lee ihe ha kwuru banyere otú obi dị ha n’ihi ozi ha na-eje:

Bruno kwuru, sị: “Amalitere m ozi m n’Ekwedọọ ebe a, nke bụ́ ọmarịcha obodo dị n’Amazọn. Mgbe e mechara, eso m rụọ ọrụ mgbe a na-ewusa alaka ụlọ ọrụ dị n’Ekwedọọ. M na-eje ozi ugbu a na Betel. Mgbe m ka nọ n’Ịtali, ekpebiri m ime ka ozi Jehova bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ m. Jehova emeekwala ka m nweta ihe na-agụ m agụụ, nke bụ́ ịrụ ọtụtụ ihe ga-atọ m ụtọ n’ozi ya.”

Beau kwuru, sị: “Mụ na Jehova adịkwuola ná mma n’ihi na n’Ekwedọọ, ana m eji oge m niile arụ ọrụ ya. Ana m agakwa ebe dị iche iche mara mma, bụ́ ihe na-agụ m agụụ kemgbe.”

Anna kwuru, sị: “Echebughị m na m ga-enwe ike ibi ndụ ka ndị ozi ala ọzọ ebe ọ bụ na alụbeghị m di. Ma amatala m na m ga-emeli ya. Ngọzi Jehova emeela ka m na-enyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, mee ka m soro na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-emetakwa ndị enyi. Obi dị m ezigbo ụtọ.”

Elke kwuru, sị: “N’obodo anyị bụ́ Ọstria, m rịọrọ Jehova ugboro ugboro ka m nweta otu onye m ga na-amụrụ Baịbụl. Ma n’ebe a, m na-amụrụ mmadụ iri na ise Baịbụl! Obi na-adị m ezigbo ụtọ ịhụ na ihe ha na-amụta banyere Jehova na-eme ha obi ụtọ.”

Joel kwuru, sị: “Ị gaa ná mba ọzọ na-ejere Jehova ozi, ọ ga-atọ gị ezigbo ụtọ. Ị ga-amụta ịtụkwasịkwu Chineke obi. Obi ga-adịkwa gị ụtọ ịhụ otú o si na-agọzi mgbalị gị! Mgbe m si Amerịka bịa ebe a, e nwere naanị ndị nkwusa isii. Tupu otu afọ agachaa, anyị dịzi ndị nkwusa iri abụọ na otu. Ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs dị otu narị na iri.”

GỊNWA KWANỤ?

Ndị na-eto eto, ùnu nwere ike ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke? N’eziokwu, ị chọọ ikpebi ime ụdị ihe ahụ, i kwesịrị ime ezigbo atụmatụ. Ihe kacha mkpa bụ na i kwesịrị iji obi gị niile hụ Jehova na ndị agbata obi gị n’anya. Ọ bụrụ na ị hụrụ ha n’anya otú ahụ, nweekwa ike ịkwaga ná mba ọzọ, kpesie ekpere ike, gwa Jehova na ị chọrọ ịkwaga ná mba ọzọ jeere ya ozi. Gwakwa ndị mụrụ gị bụ́ Ndị Kraịst nakwa ndị okenye ọgbakọ ihe ị chọrọ ime. I nwere ike ikpebi na gịnwa nwere ike isi otú ahụ jeere Jehova ozi dị nsọ nke na-atọ ezigbo ụtọ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

“Ekpere m kpere ọtụtụ ugboro na ụka mụ na ụmụnna tozuru okè kparịtara nyeere m aka ịghọta na Jehova na-agọzi ndị na-ewepụta onwe ha ijere ya ozi.”​—Kayla, onye si Amerịka

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Otú ị ga-esi jikere maka ije ozi ná mba ọzọ

• Na-amụ ihe mgbe niile

• Gụọ Ozi Alaeze Anyị nke Nọvemba 2011, peeji nke 5-7

• Gị na ndị ọzọ jerela ozi ná mba ọzọ kwurịta banyere ya

• Mee nchọnchọ banyere omenala mba ahụ na ihe ndị mere na ya

• Mụta ihe ụfọdụ n’asụsụ mba ahụ

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Otú ụfọdụ ndị na-eje ozi ná mba ọzọ si enweta ego ha ji egbo mkpa ha bụ . . .

• ịrụ ọrụ ọnwa ole na ole kwa afọ ná mba ha

• ịhapụrụ onye ọzọ ụlọ ha ma ọ bụ ahịa ha, onye ahụ ana-akwụ ha ụgwọ

• ịrụ ọrụ n’Ịntanet

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

1 Jaqueline si Jamanị

2 Bruno si Ịtali

3 Beau si Kanada

4 Siobhan si Ayaland

5 Joel si Amerịka

6 Jonathan si Amerịka

7 Anna si Estonia

8 Elke si Ọstria

9 Chantal si Kanada

10 Ines si Ọstria