Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-achịkọta Ezinụlọ Ya

Jehova Na-achịkọta Ezinụlọ Ya

Jehova Na-achịkọta Ezinụlọ Ya

‘M na-arịọsi unu ike ka unu nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ.’—EFE. 4:1, 3.

OLEE OTÚ Ị GA-ESI ZAA AJỤJỤ NDỊ A?

Gịnị ka Chineke mere iji mezuo nzube ya?

Olee otú anyị si ‘anọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ’?

Olee ihe ga-enyere anyị aka ‘inwe obiọma n’ebe ibe anyị nọ’?

1, 2. Gịnị ka Jehova zubere maka ụwa na ndị mmadụ?

MGBE ị nụrụ ezinụlọ, gịnị na-abata gị n’obi? Ị̀ na-echeta ịhụnanya na obi ụtọ a na-enwe n’ezinụlọ? Ị̀ na-echeta otú ndị nọ n’otu ezinụlọ si eji otu obi arụ ọrụ? Ka ị̀ na-echeta ebe obi ruru mmadụ ala, bụ́ ebe ọ ga-anọ too, na-amụta ihe, na-ekwu ihe o chere? Ihe ndị ahụ nwere ike ịbata gị n’obi ma ọ bụrụ na e nwere ịhụnanya n’ezinụlọ unu. Ọ bụ Jehova malitere ezinụlọ. (Efe. 3:14, 15) O bu n’obi ka ndị niile o kere n’eluigwe na n’ụwa dịrị n’otu, tụkwasị ibe ha obi, obi eruokwa ha ala.

2 Mgbe Adam na Iv mehiechara, ụmụ mmadụ esoghịzi n’ezinụlọ Chineke, ma nzube Jehova agbanweghị. Ọ ga-eme ka ụmụ Adam na Iv jupụta ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs. (Jen. 1:28; Aịza. 45:18) O meela ihe niile o kwesịrị ime iji mezuo nzube ya. Akwụkwọ Ndị Efesọs kwuru ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ Jehova na-eme. O kwukwara ọtụtụ ihe banyere ịdị n’otu. Ka anyị tụlee ụfọdụ amaokwu ná Ndị Efesọs ma hụ otú anyị nwere ike isi na-akwado nzube Jehova, nke bụ́ ime ka ndị niile o kere eke dịrị n’otu.

OTÚ CHINEKE SI ELEKỌTA IHE NA IHE Ọ NA-ELEKỌTA

3. Gịnị bụ “ilekọta ihe” e kwuru okwu ya ná Ndị Efesọs 1:10, oleekwa mgbe Chineke malitere ya?

3 Mozis gwara ndị Izrel, sị: “Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova.” (Diut. 6:4) Ihe niile Jehova na-eme na-akwado nzube ya. N’ihi ya, ‘mgbe oge a kara aka zuru,’ Chineke malitere ihe Baịbụl kpọrọ “ilekọta ihe,” ya bụ, ịhazi otú ndị niile o kere eke ga-esi dịrị n’otu. (Gụọ Ndị Efesọs 1:8-10.) E nwere ụzọ abụọ ọ ga-esi mee ya. Nke mbụ bụ ịkwadebe ndị e tere mmanụ ka ha nwee ike ibi n’eluigwe, bụ́ ebe Jizọs Kraịst ga-abụ Onyeisi ha. Jehova malitere ime otú ahụ n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33, mgbe ọ malitere ịchịkọta ndị ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe. (Ọrụ 2:1-4) N’ihi àjà ahụ Kraịst chụrụ, Chineke kpọrọ ndị e tere mmanụ ndị ezi omume ka ha wee nweta ndụ. Ha ghọtara na Chineke emeela ka ha bụrụ ‘ụmụ ya.’—Rom 3:23, 24; 5:1; 8:15-17.

4, 5. Olee ụzọ nke abụọ Chineke si elekọta ihe ya?

4 Ihe nke abụọ bụ ịkwadebe ndị ga-ebi na Paradaịs n’ụwa mgbe Kraịst na ndị e tere mmanụ ga na-achị. Ọ bụ “oké ìgwè mmadụ” bụ ndị mbụ ga-ebi na Paradaịs. (Mkpu. 7:9, 13-17; 21:1-5) N’Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, ọtụtụ nde ndị si n’ọnwụ bilite ga-esonyere ha. (Mkpu. 20:12, 13) Chegodị otú mbilite n’ọnwụ ahụ ga-esi gosi na anyị dị n’otu! Mgbe otu puku afọ ahụ ga-agwụcha, a ga-ele “ihe ndị dị n’ụwa” ule ikpeazụ. Chineke ga-eme ka ndị niile kwesịrị ntụkwasị obi bụrụ ‘ụmụ ya’ nọ n’ụwa.—Rom 8:21; Mkpu. 20:7, 8.

5 N’oge anyị a, Chineke na-akwadebe ndị e tere mmanụ ibi n’eluigwe, na-akwadebekwa atụrụ ọzọ ibi na Paradaịs n’ụwa. Ma, olee otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi na-akwado ihe a Chineke na-eme?

“NỌGIDE N’ỊDỊ N’OTU NKE MMỤỌ NSỌ”

6. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si gosi na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-ezukọta ọnụ?

6 Akwụkwọ Nsọ kwuru na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-ezukọta ọnụ. (1 Kọr. 14:23; Hib. 10:24, 25) Ọ pụtaghị naanị ịbịakọta ọnụ n’otu ebe dị ka ndị gara n’ahịa ma ọ bụ n’ámá egwuregwu. Ọ bụghị ya bụ ezigbo ịdị n’otu. Ihe ga-eme ka anyị dị n’otu n’ezie bụ ịna-eme ihe Jehova kụziiri anyị, kwekwa ka mmụọ nsọ ya na-akpụzi anyị.

7. Gịnị ka ‘ịnọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ’ pụtara?

7 N’ihi àjà mgbapụta Kraịst chụrụ, Jehova kpọrọ ndị e tere mmanụ ndị ezi omume ka ha bụrụ ụmụ ya, kpọọkwa atụrụ ọzọ ndị ezi omume ka ha bụrụ ndị enyi ya. Ma, ebe anyị ka bi n’ụwa ochie a, anyị na ụmụnna anyị ga na-enwe nghọtahie mgbe ụfọdụ. (Rom 5:9; Jems 2:23) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji nye anyị ndụmọdụ ka anyị ‘na-ediri ibe anyị ihe.’ Olee otú anyị ga-esi mee ka anyị na ụmụnna anyị dị n’otu? Anyị kwesịrị ịmụta ‘ịdị umeala n’obi na ịdị nwayọọ zuru ezu.’ Pọl gbakwara anyị ume ịgbasi mbọ ike ‘ka anyị nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.’ (Gụọ Ndị Efesọs 4:1-3.) Ime ihe ahụ o kwuru pụtara ikwe ka mmụọ Chineke na-eduzi anyị, kwekwa ka o nyere anyị aka ịmịpụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Mkpụrụ nke mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka idozi esemokwu anyị na ndị ọzọ ma mee ka anyị dị n’otu. Ọ dịghị ka ọrụ nke anụ ahụ́, bụ́ ihe ndị na-akpata nkewa.

8. Olee otú ọrụ nke anụ ahụ́ si eme ka ndị mmadụ ghara ịdị n’otu?

8 Buru n’obi otú “ọrụ nke anụ ahụ́” si eme ka ndị mmadụ ghara ịdị n’otu. (Gụọ Ndị Galeshia 5:19-21.) Mmadụ kwaa iko, ya na Jehova na ọgbakọ ya agaghịzi adị ná mma. O nwekwara ike ikewa onye ahụ na di ya ma ọ bụ nwunye ya nakwa ụmụ ya. Adịghị ọcha na-eme ka mmadụ na Chineke ghara ịdị n’otu, meekwa ka onye ahụ na ndị hụrụ ya n’anya ghara ịdị n’otu. Ị manụ na ihe abụọ agaghị anyakọta ọnụ ma ọ bụrụ na ájá dị n’otu n’ime ha. Ime ihe ọjọọ n’asọghị anya na-egosi na mmadụ na-eleghara iwu Chineke anya. Ihe ndị ọzọ so n’ọrụ nke anụ ahụ́ na-ekewa mmadụ na ibe ya, na-ekewakwa mmadụ na Chineke. Ụdị omume ndị ahụ na-emegide àgwà Jehova.

9. Olee otú anyị nwere ike isi nyochaa onwe anyị iji mata ma ànyị ‘na-agbasi mbọ ike ịnọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ’?

9 N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: “Olee otú m si agbasi mbọ ike ‘ịnọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo’? Gịnị ka m na-eme ma mụ na mmadụ nwee nghọtahie? Àna m akọrọ onye ọ bụla ihe ọjọọ e mere m, buru n’obi na ọtụtụ ndị enyi m ga-akwado m? M̀ na-atụ anya ka ndị okenye dozie ihe na-esere mụ na onye ọzọ kama ịgbalịsi ike ka mụ na ya kpezie? Àna m eze ndị ọzọ eze n’ihi na achọghị m ka ha cheta ihe m mere nke na-adịghị ha mma?” Ime otú ahụ ọ̀ ga-egosi na anyị na-akwado nzube Jehova, nke bụ́ ịchịkọtaghachi ihe niile n’ime Kraịst?

10, 11. (a) Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị na ụmụnna anyị na-adị n’udo? (b) Olee ụdị àgwà ga-eme ka udo dị, Jehova agọziekwa anyị?

10 Jizọs kwuru, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na i ji onyinye gị gaa n’ebe ịchụàjà, i wee nọrọ n’ebe ahụ cheta na obi adịghị nwanne gị mma n’ebe ị nọ, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà gawa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ị bịaghachikwara, nye onyinye gị . . . Dozie okwu ọsọ ọsọ.” (Mat. 5:23-25) Jems dere, sị: ‘A na-agha mkpụrụ nke ezi omume n’ebe udo dị maka ndị na-eme udo.’ (Jems 3:17, 18) N’ihi ya, anyị enweghị ike ịbụ ndị ezi omume ma ọ bụrụ na anyị na ndị ọzọ adịghị n’udo.

11 Dị ka ihe atụ, ná mba ụfọdụ ebe a lụrụ agha, e kee ala ha ụzọ atọ, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ndị mmadụ enweghị ike ịkọ ihe n’otu ụzọ n’ihi ogbunigwe ndị e liri n’ala. Ọ bụrụ na ogbunigwe agbawaa, ndị ọrụ ubi na-ahapụ ubi ha, ndị mmadụ agaghịzi enwe ihe ha ga-arụ n’ime obodo, ndị bi n’obodo mepere emepe agaghịkwa enwe ihe oriri. N’otu aka ahụ, anyị agaghị amụta ịna-akpakwu àgwà Ndị Kraịst ma ọ bụrụ na omume anyị na-eme ka anyị na ụmụnna anyị ghara ịdị n’udo. Ma ọ bụrụ na anyị na-agbaghara ndị ọzọ n’egbughị oge ma na-emere ha ihe ọma, anyị ga-eme ka udo dị, Jehova agọziekwa anyị.

12. Olee otú ndị okenye nwere ike isi nyere anyị aka ịdị n’otu?

12 Ndị okenye, bụ́ ndị Baịbụl kpọrọ “onyinye n’ụdị mmadụ,” nwekwara ike inyere anyị aka ịdị n’otu. Chineke nyere anyị ha ka ha nyere anyị aka ‘ịdị n’otu n’okwukwe.’ (Efe. 4:8, 13) Mgbe anyị na ndị okenye na-ejekọ ozi dị nsọ, ha ejiri Okwu Chineke na-enye anyị ezigbo ndụmọdụ, ha na-enyere anyị aka ịmụtakwu otú e si eyiri mmadụ ọhụrụ. (Efe. 4:22-24) Ị̀ ghọtara na ndụmọdụ ha na-enye bụ otú Jehova si akwadebe gị ibi n’ụwa ọhụrụ mgbe Ọkpara ya ga na-achị? Ndị okenye, ọ̀ bụ ihe ahụ ka unu bu n’obi mgbe unu na-agbalị ịgbazi ndị ọzọ?—Gal. 6:1.

“NWEENỤ OBIỌMA N’EBE IBE UNU NỌ”

13. Olee nsogbu a ga-enwe ma ọ bụrụ na anyị eleghara ndụmọdụ ahụ e nyere ná Ndị Efesọs 4:25-32 anya?

13 Ndị Efesọs 4:25-29 mere ka anyị mata ụdị omume anyị kwesịrị izere. Ụfọdụ n’ime ha bụ ịgha ụgha, iwe oké iwe ma ọ bụ ịdị umengwụ, na ikwu okwu rere ure kama ikwu okwu dị mma nke na-ewuli elu. Ọ bụrụ na mmadụ eleghara ndụmọdụ ahụ anya, ọ ga-eme ka mmụọ nsọ Chineke nwee mwute, n’ihi na ọ bụ mmụọ nsọ na-eme ka anyị dị n’otu. (Efe. 4:30) Ime ihe ọzọ Pọl dere ga-eme ka anyị nwee udo ma dị n’otu. O dere, sị: “Wepụnụ obi ilu niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị, tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu. Ma nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko, na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam dị nnọọ ka Chineke sikwa n’aka Kraịst gbaghara unu kpamkpam.”—Efe. 4:31, 32.

14. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ “nweenụ obiọma” nwere ike igosi? (b) Olee ihe ga-enyere anyị aka inwe obiọma?

14 Okwu ahụ bụ́ “nweenụ obiọma” gosiri na o nwere ike ịbụ na anyị anaghị enwecha obiọma nakwa na anyị kwesịrị inwekwu obiọma. Anyị kwesịrị ịmụta na otú obi dị ndị ọzọ dị mkpa karịa otú obi dị anyị! (Fil. 2:4) Ihe anyị chọrọ ikwu nwere ike ime ka a chịa ọchị ma ọ bụ mee ka ndị ọzọ chee na anyị ma ihe, ma ọ̀ ga-egosi na anyị nwere obiọma? Ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ chebara ihe anyị chọrọ ikwu echiche, ọ ga-enyere anyị aka ‘inwe obiọma.’

ỊMỤTA ỊHỤNANYA NA NKWANYE ÙGWÙ N’EZINỤLỌ

15. Olee ihe Kraịst meere ọgbakọ ya, nke Pọl kwuru banyere ya ná Ndị Efesọs 5:28?

15 Baịbụl ji adịm ná mma Kraịst na ọgbakọ ya tụnyere adịm ná mma di na nwunye. Ihe a kwesịrị ime ka di ghọta ozugbo na o kwesịrị ịna-eduzi nwunye ya, hụ ya n’anya ma na-elekọta ya. O kwesịkwara ime ka nwunye na-edo onwe ya n’okpuru di ya. (Efe. 5:22-33) Mgbe Pọl dere, sị: “N’ụzọ dị otú a, ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha,” olee “ụzọ” ọ na-ekwu banyere ya? (Efe. 5:28) N’ihe Pọl bu ụzọ kwuo, o kwuru otú ‘Kraịst si hụ ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya, jirikwa mmiri saa ya wee mee ka ọ dị ọcha site n’okwu Chineke.’ N’eziokwu, ọ bụrụ na di chọrọ ịkwado nzube Jehova nke bụ́ ịchịkọtaghachi ihe niile n’ime Kraịst, o kwesịrị ịna-enyere ndị ezinụlọ ya aka ka ha na Jehova dị ná mma.

16. Olee uru ọ ga-aba ma ọ bụrụ na ndị nne na nna na-arụ ọrụ Chineke nyere ha n’ezinụlọ?

16 Ndị nne na nna kwesịrị icheta na ọ bụ Jehova nyere ha ọrụ ịzụ ụmụ ha. Ma, ọ dị mwute na n’ụwa taa, ọtụtụ ndị ‘enweghị obi mmadụ.’ (2 Tim. 3:1, 3) Ọtụtụ ndị bụ́ nna na-ahapụ ọrụ ha kwesịrị ịrụ. Ọ na-ewute ụmụ ha ma na-akpatara ha nsogbu. Ma, Pọl dụrụ Ndị Kraịst bụ́ nna ọdụ, sị: “Unu ndị bụ́ nna, unu emela ụmụ unu ihe iwe, kama na-azụlitenụ ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Efe. 6:4) Ọ́ bụghị ezinụlọ bụ ebe mbụ ụmụaka na-anọ amụta ịhụ mmadụ n’anya na irubere mmadụ isi? Ọ bụrụ na ndị nne na nna akụziere ụmụ ha ihe ndị a, ọ pụtara na ha na-akwado otú Jehova si elekọta ihe ya. Ọ bụrụ na anyị emee ka ịhụnanya dịrị n’ezinụlọ anyị, wepụkwa iwe na ọnụma na okwu mkparị, anyị na-akụziri ụmụ anyị ihe ndị dị mkpa, ya bụ, otú e si ahụ mmadụ n’anya na otú e si akwanyere mmadụ ùgwù. Àgwà ndị a ga-eme ka ha jikere ibi n’ụwa ọhụrụ Chineke.

17. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iguzogide Ekwensu?

17 Ọ bụ Ekwensu bụ onye mbụ mere ka udo ghara ịdị n’eluigwe na n’ụwa. Anyị kwesịrị ịghọta na ọ ga na-eme ihe niile o nwere ike ime ka anyị ghara ime uche Chineke. O doro anya na obi na-adị Setan ụtọ mgbe ọtụtụ ndị na-agba alụkwaghịm, ndị mmadụ ana-ebikọta ọnụ n’alụghị di na nwunye, ụmụ nwoke ana-alụ ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị ana-alụkwa ụmụ nwaanyị. Anyị anaghị amụta ịkpa àgwà ma ọ bụ iche echiche ka ndị ụwa. Anyị na-eṅomi Kraịst. (Efe. 4:17-21) N’ihi ya, a dụrụ anyị ọdụ ka anyị ‘yiri ekike agha zuru ezu nke si n’aka Chineke’ ka anyị nwee ike iguzogide Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya.—Gụọ Ndị Efesọs 6:10-13.

‘NA-EJE IJE N’ỊHỤNANYA’

18. Gịnị mere anyị bụ́ Ndị Kraịst ji dị n’otu?

18 Ọ bụ ịhụnanya mere ka anyị bụ́ Ndị Kraịst dị n’otu. Anyị ji obi anyị niile hụ “otu Onyenwe anyị” n’anya, hụ “otu Chineke” anyị n’anya, hụkwa ụmụnna anyị n’anya. N’ihi ya, anyị kpebisiri ike na anyị ‘ga-anọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.’ (Efe. 4:3-6) Jizọs kpere ekpere banyere ụdị ịhụnanya ahụ, sị: “M na-arịọ arịrịọ, ọ bụghị naanị banyere ndị a, kamakwa banyere ndị nwere okwukwe n’ebe m nọ site n’okwu ha; ka ha niile wee bụrụ otu, dị ka gị onwe gị, Nna, na mụ onwe m dị n’otu, mụ onwe m na gị adịrịkwa n’otu, ka anyị na ha wee dị n’otu . . . Emewokwa m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya, ka ịhụnanya i nwere n’ebe m nọ wee dịrị n’ime ha, mụ na ha adịkwa n’otu.”—Jọn 17:20, 21, 26.

19. Gịnị ka i kpebisiri ike ịna-eme?

19 Ọ bụrụ na anyị nwere àgwà ọjọọ nke siiri anyị ike ịgbanwe, ka ịhụnanya anyị nwere mee ka anyị kpee ụdị ekpere ahụ ọbụ abụ kpere, nke bụ́: “Mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị.” (Ọma 86:11) Ka anyị kpebisie ike iguzogide ihe ọ bụla Ekwensu na-eme iji kewaa anyị na Nna anyị hụrụ anyị n’anya nakwa ụmụnna anyị. Ka anyị na-agbasi mbọ ike ‘ịna-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya, na-ejekwa ije n’ịhụnanya,’ ma n’ezinụlọ anyị ma n’ozi ọma ma n’ọgbakọ.—Efe. 5:1, 2.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 29]

Ọ hapụrụ onyinye ya n’ebe ịchụàjà, gawa ime ka ya na nwanne ya dị n’udo

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndị nne na nna, na-akụzirinụ ụmụ unu ka ha na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù