Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:

Ọ̀ bụ ntutu Samsịn mere ka ọ dị ike?

Ọ bụghị ntutu nkịtị mere ka Samsịn dị ike. Ntutu ya nọchiri anya mmekọrịta pụrụ iche ya na Chineke nwere n’ihi na ọ bụ onye Naziraịt. Mgbe Delaịla mere ka a kpụọ ya isi, mmekọrịta ahụ esighịzi ike.—4/15, peeji nke 9.

Olee ihe atọ na-eme ka obi nkịtị na-arụ ọrụ nke ọma, bụ́ ndị nwekwara ike ime ka obi ihe atụ anyị na-arụ ọrụ nke ọma?

(1) Nri. Iri ezigbo nri na-eme ka obi anyị na-arụ ọrụ nke ọma, otú ahụkwa ka iri ezigbo nri ime mmụọ ga-eme ka obi ihe atụ anyị na-arụ ọrụ nke ọma. (2) Imega ahụ́. Iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma nwere ike ime ka obi ihe atụ anyị na-arụ ọrụ nke ọma. (3) Ebe anyị bi na ebe anyị na-arụ ọrụ. Obi nwere ike iru anyị ala ma anyị na ụmụnna anyị ndị hụrụ anyị n’anya na-anọ.—4/15, peeji nke 16.

Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye akwaa iko, olee otú ha nwere ike isi maliteghachi ịtụkwasị ibe ha obi?

Ha kwesịrị (1) ịna-agwa ibe ha eziokwu; (2) iji otu obi na-arụkọ ọrụ; (3) ịhapụ àgwà ọjọọ ma na-akpa àgwà ọma; nakwa (4) ịma mgbe ha kwesịrị ịkwụsị iburu ibe ha iwe n’obi iji mee ka ha dịghachi ná mma.—5/1, peeji nke 12-15.

Gịnị mere na onye na-ekwu okwu olili ozu ekwesịghị ikwu na ihe e dere n’Abụ Ọma 116:15 na-ekwu banyere onye ahụ nwụrụ anwụ?

Abụ Ọma 116:15 kwuru, sị: “Ọnwụ ndị na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ dị oké ọnụ ahịa n’anya ya.” Ọ pụtara na Chineke agaghị ekwe ka e gbuo ndị niile na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ n’ihi na o ji ndụ ha kpọrọ ihe. Ọ gaghị ekwe ka e kpochapụ ndị niile na-efe ya n’ụwa.—5/15, peeji nke 22.

Ole ndị bụ ndị kọpọtụa?

Tupu afọ 1931, ihe a na-akpọ ndị ọsụ oge niile bụ “ndị kọpọtụa.”—5/15, peeji nke 31.

Olee ihe ụfọdụ mere Baịbụl ji dị iche n’akwụkwọ ndị ọzọ ndị mmadụ dere?

Baịbụl buru ọtụtụ amụma ndị mechara mezuo. Ihe ndị a kọrọ na ya mere eme, ha abụghị akụkọ ifo. Ihe o kwuru dabara n’ihe ndị dọkịta chọpụtara. Ihe niile e dere na ya bụ otu. Ihe ndị e kwuru na ya bara uru taa.—6/1, peeji nke 4-8.

Olee ndị bụ́ “alaeze ndị a niile” e kwuru okwu ha na Daniel 2:44?

Alaeze ma ọ bụ ọchịchị ndị e kwuru okwu ha bụ ndị so n’ihe oyiyi ahụ e ji ọla na ígwè kpụọ, nke Daniel kọwara.—6/15, peeji nke 17.

Olee mgbe Briten na Amerịka ghọrọ ọchịchị nke asaa Baịbụl kwuru ga-achị ụwa?

Mgbe mba abụọ ahụ jikọrọ aka malite ịchị ụwa bụ mgbe ha gbakọrọ aka mee ihe pụrụ iche n’oge a na-alụ Agha Ụwa Mbụ.—6/15, peeji nke 19.

Olee otú Chineke si agbaghara ndị chegharịrị echegharị mmehie ha ma chefuo ihe ha mere?

Jehova kwuru banyere ndị ọ hụrụ n’anya, sị: “M ga-agbaghara ha njehie ha, agakwaghị m echeta mmehie ha.” (Jere. 31:34) O nwere ike ịgbaghara mmehie n’ihi ihe mgbapụta ahụ. Ọ bụrụ na Chineke agbaghara mmadụ mmehie ya, ọ na-echefu ya, nke pụtara na ọ gaghị echeta mmehie ahụ iji taa onye ahụ ahụhụ.—7/1, peeji nke 18.

Gịnị mere anyị ga-eji kwere na ọrụ ebube ndị a kọrọ na Baịbụl mere eme?

Ọtụtụ mgbe, a rụrụ ọrụ ebube ndị ahụ n’ihu ndị mmadụ, ọ bụghị na nzuzo. A rụghị ọrụ ebube ndị ahụ otú ga-agbagwoju ndị mmadụ anya, e bughịkwa ụzọ mee nkwadebe pụrụ iche tupu a rụọ ha. A rụrụ ọrụ ebube ndị ahụ iji nye Chineke otuto, ọ bụghị iji too ndị mmadụ. Ọrụ ebube ndị ahụ dị n’ụdị dị iche iche, ndị iro Jizọs ekwughịkwa na ihe ndị ahụ emeghị eme. Ihe a niile kwesịrị ime ka obi sie anyị ike na ọrụ ebube ndị a kọrọ na Baịbụl mere eme.—8/1, peeji nke 7-8.