Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Guzosie Ike Ma Zere Ọnyà Setan!

Guzosie Ike Ma Zere Ọnyà Setan!

Guzosie Ike Ma Zere Ọnyà Setan!

‘Guzosie ike megide atụmatụ aghụghọ nke Ekwensu.’—EFE. 6:11.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

Olee otú onye na-efe Jehova nwere ike isi zere ịhụ akụ̀ n’anya?

Gịnị nwere ike inyere Onye Kraịst lụrụ di ma ọ bụ nwunye aka izere ịkwa iko?

Gịnị mere i ji kweta na ọ bara uru ka mmadụ guzosie ike ma zere ịkwa iko na ịhụ akụ̀ n’anya?

1, 2. (a) Gịnị mere Setan anaghị emere ndị e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” ebere? (b) Olee ọnyà ndị Setan na-esi, bụ́ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

SETAN BỤ́ EKWENSU anaghị emere ndị mmadụ ebere, karịsịa ndị na-efe Jehova. N’eziokwu, Setan na-alụso ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ agha. (Mkpu. 12:17) Ndị Kraịst ndị ahụ obi siri ike na-ebute ụzọ n’ozi ọma a na-ekwusa ugbu a banyere Alaeze Chineke, ha na-agwakwa ndị ọzọ na ọ bụ Setan na-achị ụwa a. Ekwensu kpọkwara “atụrụ ọzọ” ahụ asị, bụ́ ndị na-akwado ndị e tere mmanụ ma nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (Jọn 10:16) Setan enweghị olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, iwe juru ya obi. Ma ànyị nwere olileanya ibi n’eluigwe ma ọ bụ ibi n’ụwa, Setan achọghị ka ihe dịrị anyị mma. Ọ chọrọ ka anyị ghọọrọ ya anụ oriri.—1 Pita 5:8.

2 Setan na-esi ụdị ọnyà dị iche iche iji jide anyị. Ebe ọ bụ na ‘o meela ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì,’ ha anaghị anabata ozi ọma Alaeze Chineke, ha anaghịkwa ahụ ọnyà ndị o siri. Ma, Ekwensu na-ejidekwa ụfọdụ ndị nabatara ozi ọma ahụ. (2 Kọr. 4:3, 4) Isiokwu bu nke a ụzọ gosiri otú anyị ga-esi zere ọnyà atọ Setan na-esi, ya bụ, (1) ikwu okwu n’echeghị echiche, (2) egwu na ịsọ mmadụ anya, na (3) inwebiga mwute ókè. Ka anyị tụlezie otú anyị nwere ike isi zere ọnyà abụọ ọzọ Setan na-esiri anyị, ya bụ, ịhụ akụ̀ n’anya na ịkwa iko.

ỊHỤ AKỤ̀ N’ANYA BỤ ỌNYÀ NKE NA-ATỌCHI AKPỊRỊ

3, 4. Olee otú nchegbu nke usoro ihe a nwere ike isi mee ka mmadụ hụ akụ̀ n’anya?

3 N’otu ihe atụ Jizọs mere, o kwuru banyere mkpụrụ nke a ghara n’etiti ogwu. O kwuru na mmadụ nwere ike ịnụ okwu Chineke, ‘ma nchegbu nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụnụba akpagbuo okwu ahụ, o wee ghọọ onye na-adịghị amị mkpụrụ.’ (Mat. 13:22) N’eziokwu, ịhụ akụ̀ n’anya bụ otu ọnyà onye iro anyị, bụ́ Setan, na-esi.

4 E nwere ihe abụọ nwere ike ịkpagbu okwu ahụ. Otu bụ “nchegbu nke usoro ihe a.” E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ime ka ị na-echegbu onwe gị ‘n’oge a dị oké egwu, nke tara akpụ.’ (2 Tim. 3:1) O nwere ike ịna-esiri gị ike ịna-akpata ihe ị ga-eri n’ihi na ihe dị oké ọnụ ma ọ bụ n’ihi na i nweghị ọrụ. I nwekwara ike ịna-echegbu onwe gị banyere ọdịnihu ma na-eche, sị: ‘M̀ ga-enwe ego m ga-eji na-egbo mkpa m ma m kaa nká?’ Ụdị nchegbu ahụ emeela ka ụfọdụ ndị na-achụ akụnụba n’ihi na ha chere na ego ga-eme ka ha na-enweta ihe ha chọrọ.

5. Olee otú ‘ike nke akụnụba’ nwere ike isi ghọgbuo anyị?

5 Ihe ọzọ Jizọs kwuru bụ “ike dị aghụghọ nke akụnụba.” Ike a na nchegbu nwere ike ịkpagbu okwu ahụ. Baịbụl kwuru na “ego bụ ihe nchebe.” (Ekli. 7:12) Ma, ịgbalịsi ike ịba ọgaranya abaghị uru. Ọtụtụ achọpụtala na ịgbalịsi ike ịba ọgaranya na-eme ka ha na-ahụkwu akụ̀ n’anya. Ụfọdụ aghọọdịla ohu nke akụnụba.—Mat. 6:24.

6, 7. (a) Olee otú ịhụ akụ̀ n’anya nwere ike isi ghọọrọ mmadụ ọnwụnwa n’ebe ọ na-arụ ọrụ? (b) Gịnị ka Onye Kraịst kwesịrị ichebara echiche ma a gwa ya ka ọ na-arụ ọrụ mgbe a gbasara ọrụ?

6 Mmadụ nwere ike chọwa ịba ọgaranya n’amaghị ama. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na onye ị na-arụrụ ọrụ bịakwutere gị, sị gị: “Ihe ọma emeela! Ụlọ ọrụ anyị enwetala nnukwu ihe a ga-arụ. Ihe ọ pụtara bụ na n’ọnwa ole na ole na-abịanụ, i nwere ike ịna-arụ ọrụ ma a gbasaa ọrụ. Ma, m na-ekwe gị nkwa na a ga-akwụ gị ezigbo ego.” Gịnị ka ị ga-eme ma a gwa gị ụdị ihe a? N’eziokwu, inweta ego ị ga-eji na-egbo mkpa ezinụlọ gị dị ezigbo mkpa, ma ọ bụghị naanị ya bụ ọrụ i nwere. (1 Tim. 5:8) E nwere ihe ndị ọzọ i kwesịrị ichebara echiche. Awa ole ka ị ga-eji na-arụ ọrụ ma a gbasaa ọrụ? Ọrụ ị na-arụ ọ̀ ga-eme ka ị ghara ịna-agachi ọmụmụ ihe anya, meekwa ka unu ghara ịna-enwe Ofufe Ezinụlọ na ime ihe ndị ọzọ gbasara ofufe Chineke?

7 Ka ị na-eche ihe ị ga-eme, gịnị ka i chere kacha mkpa? Ọ̀ bụ ego ole ị ga-enweta n’ọrụ ahụ ka ọ̀ bụ adịm ná mma gị na Chineke? Ịchụ ego ọ̀ ga-eme ka ị kwụsị ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke? Ì nwere ike ịhụ nsogbu ịhụ akụ̀ n’anya ga-akpatara gị ma ọ bụrụ na i meghị ka gị na Jehova dị ná mma nakwa ka ya na ndị ezinụlọ gị dị ná mma? Ọ bụrụ na i nwere ụdị nsogbu ahụ ugbu a, olee otú i nwere ike isi guzosie ike ma ghara ikwe ka ịhụ akụ̀ n’anya mata gị n’ọnyà?—Gụọ 1 Timoti 6:9, 10.

8. Olee ihe atụ ndị dị na Baịbụl nwere ike inyere anyị aka ichebara otú anyị si ebi ndụ echiche?

8 Ọ bụrụ na ị chọghị ka ịhụ akụ̀ n’anya tọchie gị akpịrị ka ọnyà, i kwesịrị ịna-echebara otú i si ebi ndụ echiche. I kwesịghị ime ka Isọ, bụ́ onye na-ejighị ihe dị nsọ kpọrọ ihe! (Jen. 25:34; Hib. 12:16) I kwesịghịkwa ime ka ọgaranya ahụ Jizọs gwara ka o ree ihe niile o nwere nye ndị ogbenye ma soro ya. Kama ime otú ahụ, nwoke ahụ “lawara ná mwute, n’ihi na o nwere ọtụtụ ihe.” (Mat. 19:21, 22) Akụ̀ nwoke ahụ nwere ghọọrọ ya ọnyà, mee ka ọ jụ ihe ùgwù pụrụ iche, nke bụ́ iso ụzọ Jizọs, bụ́ nwoke kacha ukwuu bitụrụla n’ụwa a! Kpachara anya ka ị ghara ịjụ ihe ùgwù ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.

9, 10. N’ihi ihe Baịbụl kwuru, olee otú i chere anyị kwesịrị isi na-ele akụnụba anya?

9 Ọ bụrụ na ị chọghị ka nchegbu banyere akụnụba ghọọrọ gị ọnyà, gee ntị na ndụmọdụ Jizọs, nke bụ́: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla, sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyi?’ N’ihi na ihe a niile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsi ike. N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe a niile dị unu mkpa.”—Mat. 6:31, 32; Luk 21:34, 35.

10 Kama ikwe ka ike dị aghụghọ nke akụnụba mata gị n’ọnyà, gbalịa ịna-eche echiche ka Egọ, bụ́ onye so dee Baịbụl. O kwuru, sị: “Emela ka m daa ogbenye, enyekwala m akụnụba. Ka m rie nri e kenyere m.” (Ilu 30:8) O doro anya na Egọ ghọtara uru ego bara, ghọtakwa ike dị aghụghọ nke akụnụba. Cheta na nchegbu nke usoro ihe dị ugbu a na ike dị aghụghọ nke akụnụba nwere ike ime ka anyị na Jehova gharazie ịdị ná mma. Ọ bụrụ na ị na-echegbubiga onwe gị ókè banyere akụnụba, o nwere ike ime ka ị ghara inwe oge, ume, ma ọ bụ mmasị ibu ụzọ na-eme ihe gbasara Alaeze Chineke. N’ihi ya, kpebisie ike na ọnyà Setan nke bụ́ ịhụ akụ̀ n’anya agaghị amata gị!—Gụọ Ndị Hibru 13:5.

ỊKWA IKO YIRI OLULU ZORO EZO

11, 12. Olee otú Onye Kraịst nwere ike isi kwaa iko n’ebe ọ na-arụ ọrụ?

11 Ndị dinta chọọ ijide anụ siri ike, ha nwere ike igwu olulu n’ebe anụ ahụ na-esikarị agafe. Ha na-ejikarị osisi na-esighị ike na ahịhịa mechie ya ka anụ ahụ ghara ịhụ ya. Otu n’ime ọnwụnwa Setan na-ejikarị arata ndị mmadụ yiri ọnyà ahụ. Ọ bụ ịkwa iko. (Ilu 22:14; 23:27) Ọnyà ahụ amatala ọtụtụ Ndị Kraịst n’ihi na ha ji nwayọọ nwayọọ mewe ihe mere ka ọ dịrị ha mfe ịkwa iko. Ụfọdụ Ndị Kraịst lụrụ di ma ọ bụ nwunye akwaala iko n’ihi na ha na onye ọzọ kpachiwere anya.

12 Nwoke na nwaanyị ndị na-arụkọ ọrụ nwere ike ịkpachiwe anya otú na-ekwesịghị ekwesị. E mere otu nchọpụta banyere ma ụmụ nwaanyị nọ na di ma ụmụ nwoke ndị lụrụ nwaanyị, bụ́ ndị na-akwa iko. N’ime ụmụ nwaanyị ndị ahụ, ndị ha na ihe karịrị ọkara kwara iko bụ ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ. E kee ụmụ nwoke ndị ahụ ụzọ anọ, ndị ha na ihe karịrị ụzọ atọ kwara iko bụkwa ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ. Ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ hà bụ ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị? Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú gị na ha na-akparu? Ì kpebiela ihe ndị ị na-agaghị eme iji mee ka ọ bụrụ naanị ọrụ ka gị na ha na-arụ, nakwa ka gị na ha ghara ịna-akpachi anya? Dị ka ihe atụ, nwanna nwaanyị na nwoke ya na ya na-arụkọ ọrụ nwere ike ikwurịta ihe na-agbasaghị ọrụ ugboro ugboro, nwanna nwaanyị ahụ ana-akọrọ ya ihe ọ na-agaghị akọrọ onye ọzọ, ma nsogbu ndị ya na di ya na-enwe. Nwanna nwoke nwekwara ike imeta nwaanyị ya na ya na-arụkọ ọrụ enyi ma malite iche, sị: “Nwaanyị a anaghị eji ihe m chere egwuri egwu. Ọ na-ege m ntị, na-akwanyekwara m ùgwù. Ọ gaara adị mma ma a sị na nwunye m na-eme m otú a!” Ị̀ hụlanụ otú o nwere ike isi dịrị ụmụnna ndị a mfe ịkwa iko?

13. Olee otú nwoke na nwaanyị nwere ike isi kpachiwe anya otú na-ekwesịghị ekwesị n’ọgbakọ?

13 Nwoke na nwaanyị nwekwara ike ịkpachiwe anya otú na-ekwesịghị ekwesị n’ọgbakọ. Chegodị banyere akụkọ a mere eme. O mere mgbe Daniel na nwunye ya, bụ́ Sera, * bụ ndị ọsụ ụzọ. Daniel kwuru na ya anaghị ajụ ọrụ ọ bụla e nyere ya n’ọgbakọ. N’oge ahụ, Daniel na-amụrụ ụmụ okorobịa ise ihe. E mechara mee mmadụ atọ n’ime ha baptizim. E kwesịrị ịna-enyere ụmụnna ndị ahụ a ka mere baptizim ọhụrụ aka ka okwukwe ha sie ike. Ka Daniel na-arụ ọrụ ndị ọ na-arụ n’ọgbakọ, nwunye ya na-enyere ụmụnna ndị ahụ aka. N’oge na-adịghị anya, ihe na-emezinụ bụ: ndị ahụ Daniel mụụrụ Baịbụl chọọ onye ga-agba ha ume, ha agakwuru Sera. Sera chọọkwa onye ga-agba ya ume, ya agakwuru ha. Ekwensu esierela ha ọnyà. Daniel kwuru, sị: “Ka nwunye m ji ike ya niile na-enyere ndị ọzọ aka ruo ọtụtụ ọnwa, e kwesịrị ịna-agba ya ume ka okwukwe ya na-esikwu ike. Ma n’oge ahụ, m na-eleghara ya anya. Ihe ahụ niile kpatara nsogbu. Nwunye m na otu n’ime ụmụ okorobịa ndị ahụ m mụụrụ Baịbụl kwara iko. Ihe niile m na-arụ n’ọgbakọ ekweghị m mata na okwukwe ya esighịzi ike.” Olee otú i nwere ike isi zere ụdị ọdachi ahụ?

14, 15. Gịnị nwere ike inyere Ndị Kraịst lụrụ di na nwunye aka izere ịkwa iko?

14 Ọ bụrụ na ị chọghị ịkwa iko, na-atụgharị uche n’ihe nkwa i kwere di gị ma ọ bụ nwunye gị pụtara. Jizọs kwuru, sị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Mat. 19:6) I kwesịghị iche na ihe ùgwù ndị i nwere n’ọgbakọ dị mkpa karịa di gị ma ọ bụ nwunye gị. Marakwa na ọ bụrụ na ị na-ahapụkarị di gị ma ọ bụ nwunye gị n’ihi na ị na-eme ihe ndị na-adịghị mkpa, o nwere ike igosi na gị na ya adịchaghị ná mma. O nwekwara ike ime ka ị kwaa iko.

15 Ọ bụrụ na ị bụ okenye, ị̀ ga-ahapụnụ ìgwè atụrụ Jehova? Pita onyeozi dere, sị: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke nke unu na-elekọta, ọ bụghị ná mmanye, kama jirinụ obi unu na-azụ ha; ọ bụghị n’ihi na unu hụrụ uru aghụghọ n’anya, kama n’ịnụ ọkụ n’obi.” (1 Pita 5:2) I kwesịghị ileghara ndị nọ n’ọgbakọ unu anya. Ma, ilekọta ndị nọ n’ọgbakọ ekwesịghị ime ka i leghara nwunye gị na ụmụ gị anya. O nweghị uru ọ ga-aba ma ọ bụrụ na ị na-enyere ụmụnna nọ n’ọgbakọ aka ma na-eleghara nwunye gị nọ n’ụlọ anya. Ime otú ahụ ga-akpatara unu nsogbu. Daniel kwuru, sị, “I kwesịghị ikwe ka ọrụ ị na-arụ n’ọgbakọ mee ka i leghara ezinụlọ gị anya.”

16, 17. (a) Gịnị ka Ndị Kraịst lụrụ di na nwunye nwere ike ime n’ebe ha na-arụ ọrụ iji mee ka o doo ndị ọzọ anya na ha achọghị ịkwa iko? (b) Kwuo ihe e bipụtarala n’akwụkwọ anyị nke nwere ike inyere Ndị Kraịst aka izere ịkwa iko.

16 E nwere ọtụtụ ezigbo ndụmọdụ n’Ụlọ Nche na Teta! bụ́ ndị ga-enyere Ndị Kraịst lụrụ di na nwunye aka izere ịkwa iko. Dị ka ihe atụ, Ụlọ Nche September 15, 2006, dọrọ aka ná ntị na, ma n’ụlọ ọrụ ma n’ebe ndị ọzọ, mmadụ ekwesịghị ime ihe ọ bụla nwere ike ime ka ya na onye na-abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya kpachiwe anya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-arụkọ ọrụ mgbe a gbasara ọrụ, gị na onye ahụ nwere ike ịkpachiwe anya otú na-ekwesịghị ekwesị. Ọ bụrụ na ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, okwu gị na omume gị kwesịrị ime ka o doo onye ọ bụla anya na ị chọghị ịkwa iko. Achụla nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Eyila uwe ma ọ bụ jie ejiji ga-eme ka ndị mmadụ nwewe mmasị na-ekwesịghị ekwesị n’ebe ị nọ. Dewe foto di gị ma ọ bụ nke nwunye gị na nke ụmụ gị n’ebe ị na-arụ ọrụ. Ọ ga na-echetara gị na ndị ọzọ na ezinụlọ gị dị gị ezigbo mkpa. Kpebisie ike na ị gaghị eme ka mmadụ nwewe mmasị na-ekwesịghị ekwesị n’ebe ị nọ. Ekwela ka onye ọ bụla gwusa gị egwuregwu iberiibe.

17 Isiokwu bụ́ “Gịnị n’Ezie Ka Di Ma Ọ Bụ Nwunye Ịghara Ịgba n’Èzí Pụtara?” nke dị na Teta! April 2009 dọrọ di na nwunye aka ná ntị ka ha ghara ịna-eche obi ụtọ ha ga-enwe ma ha na onye na-abụghị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwee mmekọahụ. Isiokwu ahụ kwuru na ọ bụrụ na mmadụ na-eme otú ahụ, o nwere ike ime ka ọ kwaa iko. (Jems 1:14, 15) Ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ nwunye, ọ ga-adị mma ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-atụle ụdị isiokwu ahụ mgbe ụfọdụ. Ọ bụ Jehova malitere alụmdi na nwunye, ọ bụkwa ihe dị nsọ. Otu ụzọ magburu onwe ya ị ga-esi gosi na i ji ihe dị nsọ kpọrọ ihe bụ iwepụta oge ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwurịta banyere alụmdi na nwunye unu.—Jen. 2:21-24.

18, 19. (a) Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye akwaa iko, olee nsogbu ndị ọ ga-akpata? (b) Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye ezere ịkwa iko, olee uru ndị ọ ga-erite?

18 Ọ bụrụ na i nwewe mmasị na-ekwesịghị ekwesị n’ebe onye na-abụghị di gị ma ọ bụ nwunye gị nọ, tụgharịa uche ná nsogbu ịkwa iko ga-akpatara gị. (Ilu 7:22, 23; Gal. 6:7) Ndị na-akwa iko na-akpasu Jehova iwe, na-akpatara onwe ha nsogbu, na-emekwa ka obi gbawaa di ha ma ọ bụ nwunye ha. (Gụọ Malakaị 2:13, 14.) Kama ịkpatara onwe gị ụdị nsogbu ahụ, tụgharịa uche n’uru ndị na-ezere ịkwa iko na-erite. Ọ bụghị naanị na ha nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi, ha na-ebi ezigbo ndụ ugbu a, nweekwa akọnuche dị ọcha.—Gụọ Ilu 3:1, 2.

19 Ọbụ abụ bụrụ abụ, sị: “Ndị hụrụ iwu gị n’anya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghịkwa ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.” (Ọma 119:165) N’ihi ya, hụ eziokwu n’anya ma ‘na-echesi nche ike ka otú i si na-eje ije ghara ịdị ka onye na-amaghị ihe kama dị ka onye maara ihe’ n’usoro ihe ochie a. (Efe. 5:15, 16) Setan na-esi ọtụtụ ọnyà iji nwụde ndị na-efe Chineke. Ma a kwadebela anyị nke ọma ka ọ ghara inweta anyị. Jehova enyela anyị ihe niile ga-eme ka anyị ‘guzosie ike’ ma ‘menyụọ akụ́ ụta niile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ’!—Efe. 6:11, 16.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Aha a kpọrọ ha abụghị ezigbo aha ha.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

Ịhụ akụ̀ n’anya nwere ike ịmata mmadụ n’ọnyà. Ekwela ka ụdị ihe ahụ mee gị

[Foto dị na peeji nke 29]

Ịchụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ma ọ bụ ikwe ka a na-egwusa gị egwuregwu iberiibe, nwere ike ime ka ị kwaa iko