Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iso Ndị Pilgrim Aga Ebe Dị Iche Iche

Iso Ndị Pilgrim Aga Ebe Dị Iche Iche

Ihe Si n’Ebe Anyị Na-edebe Ihe Ochie

Iso Ndị Pilgrim Aga Ebe Dị Iche Iche

“AGAGHỊ m agali n’ụlọ n’ụlọ!” Ọtụtụ ndị ka malitere ịmụ Baịbụl amalite ekwuola ụdị ihe ahụ mgbe a gwara ha ka ha gaa zie ndị ha na-ahụtụbeghị ozi ọma! Ma onye kwuru ihe ahụ bụ aka ochie n’ikwu okwu ihu ọha na n’ịkụzi Baịbụl, bụ́ onye a na-akpọ onye pilgrim.

Ọtụtụ ndị na-agụ Zion’s Watch Tower kwụsịrị ịga chọọchị. Ọ gụsiri ha agụụ ike ka ha na ndị na-achọ eziokwu Baịbụl otú ha na-achọ na-ezukọ. Magazin ahụ gbara ndị na-agụ ya ume ịchọta ndị ọzọ kweere n’ihe ha kweere ka ha na ha na-ezukọ mgbe mgbe ịmụ Baịbụl. N’ihe dị ka afọ 1894, Watch Tower Society malitere izipụ ndị nnọchianya ka ha na-aga eleta obere ìgwè ndị rịọrọ ka a bịa leta ha. Ndị nnọchianya ndị ahụ bụ ndị ikom maara ihe, ndị na-arụsikwa ọrụ ike. E mechara kpọwa ha ndị pilgrim. A họpụtara ha n’ihi na ha dị umeala n’obi, mara Baịbụl, na-ekwu okwu nke ọma, na-akụzi ihe nke ọma, na-egosikwa na ha kwenyesiri ike n’ihe mgbapụta ahụ. Ha na-eleta ndị ahụ naanị otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ, rụsiekwa ọrụ ike n’oge ahụ. Mgbe mbụ ọtụtụ Ndị Mmụta Baịbụl gara ozi ọma bụ mgbe ha na-ekesa akwụkwọ e ji akpọ ndị mmadụ ka ha bịa gere okwu ihu ọha onye pilgrim ga-ekwu. Mgbe Nwanna Hugo Riemer, bụ́ onye mechara soro n’Òtù Na-achị Isi, kwuchara okwu ná mgbede n’otu ụlọ akwụkwọ, ọ zagidere ajụjụ ndị si na Baịbụl ruo mgbe ọ gafere etiti abalị. Ike gwụchara ya, ma obi dị ya ụtọ. O kwukwara na nzukọ ahụ gara nke ọma.

Ụlọ Nche kwuru na ihe mere ndị pilgrim ji aga eleta ndị ọzọ bụ ka ha gbaa “ezinụlọ nke okwukwe” ume ná nzukọ ha na-enwe n’ụlọ ndị kwere ekwe. Ndị Mmụta Baịbụl ndị bi gburugburu ebe a na-enwe nzukọ ahụ na-abịa egere okwu ndị ahụ, nọrọkwa mgbe a na-ajụ ajụjụ ma na-aza ha. Ha mechaa, a na-ele ha ọbịa. Mgbe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Maude Abbott ka dị obere, ọ gara gere okwu e kwuru n’otu ụtụtụ. Mgbe a gbasara, mmadụ niile gara zukọọ n’ebe a haziri maka oriri. O kwuru, sị: “E siri ụdị ihe dị iche iche, ma anụ ézì, ma anụ ọkụkọ, ma ụdị bred dị iche iche, ma keki! Onye ọ bụla riri otú o nwere ike. N’ihe dị ka elekere abụọ, anyị zukọrọ igere okwu ọzọ.” Ma o kwuru, sị: “N’oge ahụ, ụra atụwala onye ọ bụla.” Benjamin Barton, bụ́ onye bụrụ onye pilgrim ruo ọtụtụ afọ, kwuru otu mgbe, sị: ‘A sị na m richara ihe niile e buteere m, o teela m gaara anwụ.’ E mechara si n’isi ụlọ ọrụ dị na Bruklin deta akwụkwọ ozi ma gwa ụmụnna nwaanyị na ọ ga-aka mma ka ndị niile na-enye ndị pilgrim nri na-esiri ha “nri nkịtị a na-esi kwa ụbọchị,” meekwa ka ha “na-ehi ụra nke ọma.”

Ndị pilgrim ndị ahụ na-ezi ihe nke ọma. Ha na-eji chaatị ma ọ bụ ihe ọzọ a na-ahụ anya akọwa ihe ha na-akụzi. Okwu Nwanna Richard Harvey Barber na-agba ume mgbe niile, na-atọkwa ụtọ. Nwanna Walter J. Thorn, bụ́ onye na-eme ka Nna, na-ekwu okwu “ka ndị nna ochie a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl.” Otu ụbọchị, mgbe Nwanna Shield Toutjian nọ n’ụgbọala, o tiri mkpu, sị: “Kwụsị!” O si n’ụgbọala ahụ wụtuo, kụbiri okooko dị n’ọhịa, jiri ya kụziere ndị ya na ha so banyere ihe Jehova kere eke.

Ọrụ ndị pilgrim siri ezigbo ike. Ndị ọ kacha siere ike bụ ndị katatụrụla ahụ́. Ma, ihe kacha siere ụfọdụ ndị ike bụ mgbe a gbanwere ihe ha na-arụ. A gwara ha ka ha na-ebute ụzọ n’ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ụlọ Nche March 15, 1924, kwuru na “otu n’ime ọrụ kacha mkpa” ezi Ndị Kraịst na-arụ bụ “ịgbara alaeze Chineke àmà. Ọ bụ ihe mere e ji ezipụ ndị pilgrim.”

Mgbanwe ahụ e mere were ụfọdụ ndị pilgrim iwe, ha ahapụ ọrụ njegharị ahụ. Ụfọdụ ndị ọ ka njọ n’ahụ́ malitedịrị chọọchị nke ha. Nwanna Robie D. Adkins kwuru na otu onye pilgrim nke na-ekwu okwu nke ọma kwara arịrị, sị: “Naanị ihe m ma bụ otú e si anọ n’elu ikpo okwu ekwu okwu. Agaghị m agali n’ụlọ n’ụlọ!” Nwanna Adkins kwuru, sị: “Mgbe ọzọ m hụrụ ya bụ ná mgbakọ e nwere na Kolọmbọs dị n’Ohayo n’afọ 1924. Ahụtụbeghị m onye ike ụwa gwụrụ ka ya. Ọ gara guzoro naanị ya n’okpuru otu obere osisi. Ọ nọ naanị ya n’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ puku ụmụnna obi dị ụtọ. Ahụghị m ya anya ọzọ. O mechara hapụ nzukọ Jehova n’oge na-adịghị anya.” Ma, “ọtụtụ ụmụnna ji obi ụtọ na-ebuba akwụkwọ n’ụgbọala ha,” nke gosiri na ọ na-anụ ha ọkụ n’obi ikwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ.—Ọrụ 20:20, 21.

Ma, e nwere ọtụtụ ndị pilgrim ji obi ha niile na-arụ ọrụ ahụ n’agbanyeghị na ụjọ na-atụ ha otú ọ na-atụkwa ndị a gwara ha ka ha zụọ. Nwanna Maxwell G. Friend, bụ́ onye na-asụ Jaman, dere banyere ikwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, sị: “Ihe a ndị pilgrim na-arụ na-emekwu ka nleta ha bụrụ ngọzi.” Onye pilgrim aha ya bụ John Adams Bohnet kwuru na ọtụtụ ụmụnna ji obi ha niile nabata otú e si ekwusi okwu ike banyere ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. O kwukwara na ‘ọ nụrụ ọtụtụ ndị ọkụ n’obi ibute ụzọ n’ọrụ ahụ.’

Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, na-agba ụmụnna ume. Norman Larson, bụ́ onye nọrọla n’ọgbakọ ruo ọtụtụ afọ, kwuru, sị: “Ọbụna mgbe m dị obere, m chọpụtara na ndị pilgrim dị ezigbo mkpa, baakwa uru. Ha nyeere m aka ịmụta ọtụtụ ihe ọma.” Ruokwa taa, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, bụ́ ndị ji obi ha niile ewepụta onwe ha ije ozi, na-enyere ụmụnna ha aka ikwu, sị: “Anyị ga-agali n’ụlọ n’ụlọ!”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 32]

Obi na-adị onye ọ bụla ụtọ mgbe onye pilgrim bịara!

[Foto dị na peeji nke 31]

Na 1905, Benjamin Barton dere ebe ruru ihe dị ka otu narị na iri asaa ọ ga-eleta

[Foto dị na peeji nke 32]

Walter J. Thorn bụ onye pilgrim. A na-akpọ ya Pappy n’ihi otú o si eme ka nna, na-akpakwa àgwà Kraịst

[Foto dị na peeji nke 32]

J. A. Browne bụ onye pilgrim e zigara Jameika n’ihe dị ka afọ 1902 ka ọ gbaa ụmụnna e nwere n’obere ìgwè iri na anọ ume

[Foto dị na peeji nke 32]

Ọrụ ndị pilgrim mere ka okwukwe ụmụnna sie ike, mee ka ha dịkwuo n’otu, meekwa ka ụmụnna mara ihe a na-eme ná nzukọ Jehova