Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-akpanụ Àgwà Ka Ụmụ Amaala Alaeze Chineke!

Na-akpanụ Àgwà Ka Ụmụ Amaala Alaeze Chineke!

Na-akpanụ Àgwà Ka Ụmụ Amaala Alaeze Chineke!

“Na-akpanụ àgwà n’ụzọ kwesịrị ozi ọma.” —FIL. 1:27.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

Ole ndị nwere ike ịbụ ụmụ amaala Alaeze Chineke?

Gịnị ka anyị kwesịrị ime banyere asụsụ Alaeze Chineke, akụkọ banyere ya, na iwu ya?

Olee otú ụmụ amaala Alaeze Chineke si egosi na ha hụrụ iwu Chineke n’anya?

1, 2. Gịnị mere ihe Pọl gwara ndị nọ n’ọgbakọ Filipaị ji nwee ihe pụrụ iche ọ pụtaara ha?

PỌL ONYEOZI gbara ọgbakọ dị na Filipaị ume, sị: “Na-akpanụ àgwà n’ụzọ kwesịrị ozi ọma.” (Gụọ Ndị Filipaị 1:27.) Otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa okwu Grik ahụ Pọl kwuru bụ́ “na-akpanụ àgwà” bụ “na-akpanụ àgwà ka ụmụ amaala.” Okwu ahụ nwere ihe pụrụ iche ọ pụtaara ndị nọ n’ọgbakọ Filipaị. N’ihi gịnị? N’ihi na o yiri ka Filipaị ò so n’obodo ole na ole e nwere ike inye ndị bi na ha ikike ịbụ ụmụ amaala Rom. Ụmụ amaala Rom ndị bi na Filipaị nakwa n’ebe ndị ọzọ Alaeze Ukwu Rom na-achị na-anya isi na ha bụ ụmụ amaala Rom. Ọ na-emekwa ka ha rite uru ọtụtụ ndị na-anaghị erite n’oge ahụ.

2 Ndị nọ n’ọgbakọ Filipaị nwere ihe ka mma ha kwesịrị iji na-anya isi. Pọl chetaara ha na ebe ha bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ, ha nwere ikike ịbụ ụmụ amaala “n’eluigwe.” (Fil. 3:20) Ha abụghị ụmụ amaala alaeze mmadụ, kama ha bụ ụmụ amaala Alaeze Chineke. N’ihi ya, Chineke na-echebe ha, na-emekwa ka ha rite uru, karịa ihe mba ọ bụla nwere ike imere ụmụ amaala ya.—Efe. 2:19-22.

3. (a) Olee ndị nwere ihe ùgwù ịbụ ụmụ amaala Alaeze Chineke? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Ọ bụ ndị ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe ka Pọl nyere ndụmọdụ ahụ bụ́ “na-akpanụ àgwà ka ụmụ amaala.” (Fil. 3:20) Ma, ọ gbasakwara ndị Alaeze Chineke ga-achị n’ụwa. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Ndị Kraịst niile raara onwe ha nye Chineke na-ejere otu Eze, bụ́ Jehova, ozi, ha kwesịkwara irubere iwu ya isi. (Efe. 4:4-6) Taa, ndị mmadụ na-agbasi mbọ ike ịbụ ụmụ amaala mba a ma ama. Ọ̀ bụ na ihe ùgwù anyị nwere ịbụ ụmụ amaala Alaeze Chineke ekwesịghị ịdị anyị mkpa karịa otú ahụ? Iji nyere anyị aka ghọtakwuo ihe ùgwù ahụ, ka anyị tụlee ihe mmadụ kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịbụ nwa amaala mba ọzọ ma jiri ya tụnyere ihe onye chọrọ ịbụ nwa amaala Alaeze Chineke kwesịrị ime. Ihe ndị ọzọ anyị ga-atụle bụ ihe atọ anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị achọghị ịkwụsị ịbụ ụmụ amaala Alaeze Chineke.

IHE ONYE CHỌRỌ ỊBỤ NWA AMAALA KWESỊRỊ IME

4. Gịnị bụ asụsụ ahụ dị ọcha, oleekwa otú anyị si “asụ” ya?

4 Ịmụ asụsụ mba ahụ. N’obodo ụfọdụ, ndị ọchịchị na-enye iwu na onye chọrọ ịbụ nwa amaala ga-amụta asụsụ a kacha asụ n’obodo ahụ. E nyechagodị mmadụ ikike ịbụ nwa amaala, ọ ka nwere ike iwe ya ọtụtụ afọ tupu ya amụtachaa asụsụ obodo ahụ. Onye ahụ nwere ike ịmụta otú e si asụ asụsụ ahụ, ma ọ ga-ewetụ oge tupu ya amụtachaa ịkpọ okwu ọ bụla nke ọma. N’otu aka ahụ, ndị chọrọ ịbụ ụmụ amaala Alaeze Chineke ga-amụtarịrị ihe Baịbụl kpọrọ “asụsụ dị ọcha.” (Gụọ Zefanaya 3:9.) Gịnị ka asụsụ ahụ bụ? Ọ bụ eziokwu banyere Chineke na nzube ya, bụ́ ndị dị na Baịbụl. Otú anyị si “asụ” asụsụ ahụ dị ọcha bụ irube isi n’iwu Chineke na ụkpụrụ ya. O nwere ike ịdịrị ụmụ amaala Alaeze Chineke mfe ịmụta ozizi Baịbụl ndị bụ́ isi, e meekwa ha baptizim. Ma, ọ bụrụgodị na e meela ha baptizim, ha ka kwesịrị ịgbasi mbọ ike ịmụtakwu “ịsụ” asụsụ ahụ dị ọcha nke ọma. Olee otú ha ga-esi mee ya? Anyị niile kwesịrị ịgbalịsi ike ịna-eme ihe anyị na-amụta na Baịbụl.

5. Gịnị mere anyị ji kwesị ịmụta ihe niile anyị nwere ike ịmụta banyere nzukọ Jehova?

5 Ịmụ akụkọ mba ahụ. O nwere ike ịdị mkpa ka onye chọrọ ịbụ nwa amaala mba ọzọ mụọ akụkọ banyere ọchịchị obodo ahụ. N’otu aka ahụ, ndị chọrọ ịbụ ụmụ amaala Alaeze Chineke kwesịrị ịmụta ihe niile ha nwere ike ịmụta banyere Alaeze ahụ. Ka anyị tụlee ihe ụmụ Kora mere, bụ́ ndị jere ozi n’Izrel oge ochie. Ihe banyere Jeruselem na ebe a na-anọ efe Chineke na ya tọrọ ha ezigbo ụtọ, ọ na-amasịkwa ha ịkọ akụkọ banyere obodo ahụ. Ihe kacha masị ha abụghị nkume na ihe ndị ọzọ e ji wuo obodo ahụ, kama ọ bụ ihe obodo ahụ na ebe ahụ ha na-anọ efe Chineke nọchiri anya ya. Jeruselem bụ “obodo nke Eze Ukwu,” bụ́ Jehova, n’ihi na ọ bụ ebe a na-anọ efe ya. Ọ bụ ebe ahụ ka a na-anọ akụziri ndị mmadụ Iwu Jehova. Ọ bụ ndị Eze Jeruselem na-achị ka Jehova gosiri obiọma. (Gụọ Abụ Ọma 48:1, 2, 9, 12, 13.) Ịmụ banyere ndị Jehova na ịkọ banyere ha ọ̀ na-atọ gị ụtọ otú ahụ o si tọọ ụmụ Kora? Ka ị na-amụtakwu banyere nzukọ Chineke na otú Jehova si akwado ndị ya, obi ga-esikwu gị ike na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị. Ọ ga-eme ka i nwekwuo mmasị ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.—Jere. 9:24; Luk 4:43.

6. Gịnị mere na o kwesịghị iju anyị anya na Jehova chọrọ ka anyị mụta iwu na ụkpụrụ na-achị ụmụ amaala Alaeze ya ma na-erubere ha isi?

6 Ịmụta iwu obodo ahụ. Ndị ọchịchị na-achọ ka ndị ha na-achị mụta iwu obodo ha ma na-erubere ya isi. N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya na Jehova chọrọ ka anyị mụta iwu na ụkpụrụ na-achị ụmụ amaala Alaeze ya, chọọkwa ka anyị na-erubere ha isi. (Aịza. 2:3; Jọn 15:10; 1 Jọn 5:3) Iwu ụmụ mmadụ ezughị okè, e nwere ike iji ya emegbu ụfọdụ ndị. Ma, “iwu Jehova zuru okè.” (Ọma 19:7) Iwu Chineke ọ̀ na-atọ anyị ụtọ? Ànyị na-agụ Okwu ya kwa ụbọchị? (Ọma 1:1, 2) Naanị otú anyị nwere ike isi mụta iwu Chineke bụ ịmụ ya n’onwe anyị. Onye ọzọ agaghị amụrụ anyị ya.

ỤMỤ AMAALA ALAEZE CHINEKE HỤRỤ ỤKPỤRỤ CHINEKE N’ANYA

7. Gịnị mere ụmụ amaala Alaeze Chineke ji erubere iwu Chineke isi?

7 Ọ bụrụ na anyị achọghị ịkwụsị ịbụ ụmụ amaala Alaeze Chineke, anyị kwesịrị ịma ụkpụrụ Chineke, hụkwa ha n’anya. Ọtụtụ ụmụ amaala mba dị iche iche na-ekwu na ha nabatara iwu na ụkpụrụ mba ha bi na ya. Ma, e nwee iwu mba ahụ nke na-adịghị ha mma, ma ọ bụ ha chee na ọ dịghị onye na-ahụ ha, ha na-emebi iwu ahụ. Ha na-abụkarị “ndị na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ.” (Kọl. 3:22) Ụmụ amaala Alaeze Chineke nwere ihe dị iche mere ha ji erubere iwu Chineke isi. Anyị na-eji obi ụtọ erubere iwu Chineke isi, ma mgbe mmadụ na-anaghị ahụ anyị. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị hụrụ Onye nyere iwu ahụ n’anya.—Aịza. 33:22; gụọ Luk 10:27.

8, 9. Olee otú ị ga-esi mara ma ị̀ hụrụ iwu Chineke n’anya n’eziokwu?

8 Olee otú ị ga-esi mara ma ị̀ hụrụ iwu Chineke n’anya n’eziokwu? Chegodị ihe ị na-eme ma e nye gị ndụmọdụ n’ihe i chere na-agbasaghị onye ọzọ, dị ka mgbe e nyere gị ndụmọdụ banyere uwe gị na ejiji gị. Mgbe ị na-abụbeghị nwa amaala Alaeze Chineke, o nwere ike ịbụ na ị na-eyi uwe ndị na-adịghị mma n’anya ma ọ bụ ndị na-eme ka mmadụ na-eche banyere omume rụrụ arụ. Ka ị na-ahụkwu Chineke n’anya, ị mụtara iyi uwe na-ewetara Chineke otuto. (1 Tim. 2:9, 10; 1 Pita 3:3, 4) Ugbu a, i nwere ike iche na ị na-eyi uwe dị mma. Ọ́ bụrụkwanụ na okenye ọgbakọ agwa gị na uwe ị na-eyi adịghị ọtụtụ ndị nkwusa n’ọgbakọ unu mma? Gịnị ka ị ga-eme? Ị̀ ga-ekwuwe ihe mere i ji chee na ọ dị mma, wewe iwe, ma ọ bụ kpọọ ekwo nkụ? Onye chọrọ ịbụ nwa amaala Alaeze Chineke ga-amụtarịrị iṅomi Kraịst. (1 Pita 2:21) Mgbe Pọl na-ede banyere ihe nlereanya Jizọs, o kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime anyị na-eme ihe na-amasị onye agbata obi ya n’ihe dị mma maka iwuli ya elu. N’ihi na ọbụna Kraịst emeghị ihe masịrị onwe ya.” (Rom 15:2, 3) Iji mee ka udo dị n’ọgbakọ, Onye Kraịst tozuru okè anaghị eme ihe ọ bụla ga-enye akọnuche ndị ọzọ nsogbu.—Rom 14:19-21.

9 Ka anyị tụlee ihe abụọ ọzọ dị ezigbo mkpa: otú anyị si ele mmekọahụ na alụmdi na nwunye anya. Ndị na-abụbeghị ụmụ amaala Alaeze Chineke nwere ike iche na nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị abụghị ihe ọjọọ, na ikiri ndị gba ọtọ bụ ihe egwuregwu, nakwa na mmadụ kwaa iko ma ọ bụ gbaa alụkwaghịm, ọ gbasaghị onye ọzọ. Ụmụ amaala Alaeze Chineke anaghị eche otú ahụ n’ihi na ha ma ihe nwere ike isi n’omume ha pụta, marakwa na omume ha gbasara ndị ọzọ. Ọtụtụ ndị na-ebibu ndụ rụrụ arụ tupu ha aghọọ Ndị Kraịst. Ma ugbu a, ha amụtala na mmekọahụ na alụmdi na nwunye bụ onyinye Chineke nyere ụmụ mmadụ. Ha anaghị eji iwu Jehova egwuri egwu. Ha jikwa obi ha niile kweta na ndị na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ erughị eru ịbụ ụmụ amaala Alaeze Chineke. (1 Kọr. 6:9-11) Ma, ha makwa na obi dị aghụghọ. (Jere. 17:9) N’ihi ya, obi na-adị ha ụtọ ma a dọọ ha aka ná ntị iji nyere ha aka ịna-erubere iwu Chineke isi.

ỤMỤ AMAALA ALAEZE CHINEKE ANAGHỊ EJI ỊDỌ AKA NÁ NTỊ EGWURI EGWU

10, 11. Olee ndụmọdụ Alaeze Chineke na-enye anyị ugbu a, oleekwa otú i si ele ndụmọdụ ahụ anya?

10 Ndị ọchịchị nwere ike ịdọ ndị obodo ha aka ná ntị ka ha zere ihe oriri ma ọ bụ ọgwụ na-adịghị mma. O doro anya na ọ bụghị ihe oriri niile ma ọ bụ ọgwụ niile dị njọ. Ma, e nwee ihe nwere ike ịkpatara ndị mmadụ ọrịa, ndị ọchịchị nwere ike ịdọ ndị obodo ha aka ná ntị ka ha zere ya. Ọ bụrụ na ndị ọchịchị emeghị otú ahụ, ọ pụtara na ha anaghị arụ ọrụ ha nke ọma. N’ihi ya, Alaeze Chineke na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị zere ihe ndị nwere ike ime ka anyị mebie iwu Chineke ma ọ bụ ihe nwere ike ime ka anyị na ya ghara ịdị ná mma. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-eji Ịntanet ezirịta ozi, amụta ihe, na-ejikwa ya atụrụ ndụ. Nzukọ Chineke na-eji Ịntanet arụ ọtụtụ ihe bara uru. Ma, n’Ịntanet, e nwere ọtụtụ ebe mmadụ nwere ike ịmụta ihe ọjọọ. Ebe ndị a na-egosi ndị gba ọtọ n’Ịntanet ga-eme ka ụmụ amaala Alaeze Chineke ghọọ ndị iro Chineke. Kemgbe ọtụtụ afọ, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi adọọla anyị aka ná ntị ka anyị zere ụdị ebe ahụ. Obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ na a na-adọ anyị aka ná ntị!

11 N’oge na-adịbeghị anya, e mepeela ebe ọzọ na-ewu ewu, bụ́ ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet. O nwere ike ịbara mmadụ uru. Ma, o nwere ike ịkpatara mmadụ nsogbu ma ọ bụrụ na onye ahụ akpacharaghị anya. Mmadụ na ndị ọjọọ nwere ike ịna-akparịta ụka n’ebe ahụ. (1 Kọr. 15:33) Ka a sịkwa ihe mere nzukọ Chineke ji adọ anyị aka ná ntị banyere ụdị ebe ahụ. Ị̀ gụọla ihe niile ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bipụtara n’oge na-adịbeghị anya banyere ebe ndị a na-akparịta ụka n’Ịntanet? Ọ gaghị adị mma ka anyị jiri ụdị ebe ahụ na-ezirịta ozi n’ebughị ụzọ gụọ ihe ndị ahụ e bipụtara! * Ọ ga-adị ka ịṅụ ọgwụ na-akpa ike n’ebughị ụzọ gụọ ihe e dere ná mkpọ̀ ya.

12. Gịnị mere na ileghara ndụmọdụ anya agaghị abara anyị uru?

12 Ndị na-eleghara ndụmọdụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-enye anya ga-akpatara onwe ha na ndị ha hụrụ n’anya nsogbu. E nwere ndị ile ndị gba ọtọ ririla isi, nweekwa ndị na-akwa iko ma chee na Jehova anaghị ahụ ihe ha na-eme. Ọ baghị uru ichewe na anyị nwere ike izoro Jehova ihe anyị na-eme! (Ilu 15:3; gụọ Ndị Hibru 4:13.) Chineke chọrọ inyere ndị dị otú ahụ aka. Ọ na-esikwa n’aka ndị na-anọchite anya ya agbalị inyere ha aka. (Gal. 6:1) Ma, ndị ọchịchị nwere ike ịnapụ mmadụ ikike ịbụ nwa amaala ha. Otú ahụkwa ka Jehova nwere ike ịnapụ mmadụ ikike ịbụ nwa amaala Alaeze ya ma ọ bụrụ na onye ahụ na-emebi iwu ya ma jụ ichegharị. * (1 Kọr. 5:11-13) Ma, Jehova dị ebere. Ọ na-anabata ndị chegharịrịnụ ma gbanwee omume ha. Ọ na-ekwekwa ka ha ka bụrụ ụmụ amaala Alaeze ya. (2 Kọr. 2:5-8) Ọ bụụrụ anyị ezigbo ihe ùgwù ijere ụdị Eze ahụ hụrụ anyị n’anya ozi!

ỤMỤ AMAALA ALAEZE CHINEKE NA-EJI IHE A NA-AKỤZIRI HA AKPỌRỌ IHE

13. Olee otú ụmụ amaala Alaeze Chineke si egosi na ha ji ihe a na-akụziri ha kpọrọ ihe?

13 Ọtụtụ ndị ọchịchị na-agbalịsi ike ịkụziri ụmụ amaala ha ihe. Ha na-arụ ụlọ akwụkwọ ebe a ga-anọ na-akụziri ndị mmadụ ịgụ ihe na ide ihe nakwa ọrụ aka. Ụmụ amaala Alaeze Chineke anaghị eji ụlọ akwụkwọ ndị ahụ egwuri egwu. Ha na-agbalịsi ike ịmụta ịgụ ihe, ide ihe, na ihe ga-enyere ha aka ịna-egboro onwe ha mkpa ha. Ma ihe na-akacha eme ụmụ amaala Alaeze Chineke obi ụtọ bụ ihe Jehova na-akụziri ha. N’ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ na-akụziri ha ịgụ ihe na ide ihe. A na-agba ndị nne na nna ume ka ha na-agụrụ ụmụaka ha ihe. Kwa ọnwa, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ebipụta Ụlọ Nche na Teta! Ọ bụrụ na ị na-agụ peeji ole na ole kwa ụbọchị, ị ga-agụcha ha niile n’otu ọnwa. Ị ga na-eritekwa uru n’ihe dị ezigbo mkpa Jehova na-akụziri ụmụ amaala Alaeze ya.

14. (a) Olee otú e si akụziri anyị ihe? (b) Olee ihe ndị a tụrụ aro ha maka Ofufe Ezinụlọ unu merela n’ezinụlọ unu?

14 Kwa izu, a na-akụziri ụmụ amaala Alaeze Chineke ihe n’ọmụmụ ihe ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, kemgbe ihe karịrị iri afọ isii, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke enyerela ndị na-aga ya aka ịmụta otú e si akụzi Okwu Chineke nke ọma. Ì denyela aha n’ụlọ akwụkwọ ahụ? N’oge na-adịbeghị anya, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi agwasiela anyị ike ka anyị na-enwe Ofufe Ezinụlọ kwa izu. Ọmụmụ ihe ahụ na-eme ka ezinụlọ dị n’otu. Ì meela ihe ndị ahụ a tụrụ aro ha n’akwụkwọ anyị? *

15. Gịnị bụ otu n’ime ihe ùgwù kachanụ anyị nwere?

15 Ọtụtụ ụmụ amaala na-agbalị ime ka ndị ọzọ kwado òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ha. Ụfọdụ na-agadị n’ụlọ n’ụlọ na-agwa ndị ọzọ ka ha kwado ha. N’otu aka ahụ, ụmụ amaala Alaeze Chineke na-akwadosi Alaeze Chineke ike, ma n’okporo ámá ma n’ụlọ n’ụlọ. Dị ka ihe atụ, ihe mere e ji ebi Ụlọ Nche bụ ikwusa Alaeze Jehova. Dịkwa ka e kwuru n’isiokwu anyị bu ụzọ mụọ, Ụlọ Nche bụ magazin a kacha ekesa n’ụwa niile! Ịgwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke so n’ihe ùgwù kachanụ anyị nwere. Ị̀ na-ekwusasi ozi ọma ike?—Mat. 28:19, 20.

16. Olee otú i nwere ike isi gosi na ị bụ ezigbo nwa amaala Alaeze Chineke?

16 N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-abụ naanị ọchịchị na-achị ụwa. Ọ bụ naanị iwu Alaeze Chineke ga na-achị ụmụ mmadụ n’ihe niile ha na-eme. Ị̀ ga-abụ ezigbo nwa amaala Alaeze Chineke n’oge ahụ? Ọ bụ ugbu a ka ị ga-egosi na ị ga-abụ ezigbo nwa amaala. N’ihe niile ị na-ekpebi ime kwa ụbọchị, na-eme ha iji nye Jehova otuto. Ime otú ahụ ga-egosi na ị na-akpa àgwà ka ezigbo nwa amaala Alaeze Chineke.—1 Kọr. 10:31.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Dị ka ihe atụ, gụọ Teta! Jenụwarị-Mach 2012, peeji nke 16-19 na nke 26-29, nakwa Teta! (Bekee) nke Febụwarị 2012, peeji nke 3-9.

^ par. 14 Gụọ Ụlọ Nche Ọgọst 15, 2011, peeji nke 6-7 na Ozi Alaeze Anyị nke Jenụwarị 2011, peeji nke 3-6.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]

Ị̀ na-anabata ndụmọdụ e ji Baịbụl enye anyị banyere Ịntanet?

[Foto dị na peeji nke 12]

Ezi ofufe na akụkọ banyere ya ọ̀ na-atọ gị ụtọ dị ka ọ tọrọ ụmụ Kora?

[Foto dị na peeji nke 15]

Inwe Ofufe Ezinụlọ nwere ike inyere gị na ndị ị hụrụ n’anya aka ịbụ ezigbo ụmụ amaala Alaeze Chineke