Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Unu Ga-enweta Ụgwọ Ọrụ Maka Ọrụ Unu”

“Unu Ga-enweta Ụgwọ Ọrụ Maka Ọrụ Unu”

“Unu Ga-enweta Ụgwọ Ọrụ Maka Ọrụ Unu”

EZE ESA du ndị agha ya na-agbada n’otu ndagwurugwu. Ha si n’ugwu ndị dị na Juda na-aga n’ụsọ oké osimiri. Mgbe ha ruru ebe sara mbara, ihe Esa hụrụ juru ya anya, o wee kwụsị. Ndị agha Itiopia, bụ́ ndị iro ha, juru na ndagwurugwu ahụ. Ha ruru otu nde, ma ndị agha Esa ji naanị obere ihe karịa narị puku ise.

Mgbe Esa hụrụ na agha na-aga ịmalite, olee ihe kacha ya mkpa? Ọ̀ bụ ịgwa ndị ọchịagha ya ihe ha ga-eme? Ọ̀ bụ ịgba ndị agha ya ume, ka ọ̀ bụ idegara ndị ezinụlọ ya akwụkwọ ozi? Mbanụ! N’oge a ihe siiri Esa ike, ihe o mere bụ ikpe ekpere.

Tupu anyị atụlee ekpere ahụ na ihe mechara mee, ka anyị buru ụzọ tụlee ụdị onye Esa bụ. Gịnị mere o ji mee ihe ahụ o mere? Ò kwesịrị ịrịọ Chineke ka o nyere ya aka? Gịnị ka akụkọ Esa na-akụziri anyị banyere otú Jehova si agọzi ihe ndị ohu ya na-eme?

ỤDỊ ONYE ESA BỤ

N’ime afọ iri abụọ e kechara alaeze Izrel abụọ, ikpere arụsị riri ndị Juda isi. Mgbe Esa ghọrọ eze n’afọ 977 tupu a mụọ Kraịst, ọbụna ndị isi amalitela ife chi ihe ubi ndị Kenan. Ma ihe e dere na Baịbụl banyere Esa bụ na ‘o mere ihe dị mma na ihe ziri ezi n’anya Jehova bụ́ Chineke ya.’ Esa ‘wepụsịrị ebe ịchụàjà ndị mba ọzọ na ebe ndị dị elu ma kụtusịa ogidi nsọ dị iche iche, gbutusịakwa ogwe osisi ndị dị nsọ.’ (2 Ihe 14:2, 3) Esa chụpụkwara “ndị ikom bụ́ ndị akwụna ụlọ arụsị” n’alaeze Juda, ya bụ, ụmụ nwoke ndị na-edina ụmụ nwoke ibe ha mgbe ha na-efe arụsị. Ihe Esa mere abụghị naanị iwepụ arụsị. Ọ gbakwara ndị mmadụ ume ka ha “chọọ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha nakwa ka ha debe iwu ya na ntụziaka ya.”—1 Eze 15:12, 13; 2 Ihe 14:4.

Otú Esa si jiri ịnụ ọkụ n’obi kwado ezi ofufe tọrọ Jehova ezigbo ụtọ, o wee mee ka udo dịrị na Juda ruo ọtụtụ afọ. N’ihi ya, eze kwuru, sị: “Anyị achọwo Jehova bụ́ Chineke anyị. Anyị achọwo ya, o wee nye anyị ezumike gbaa gburugburu.” Ha ji oge udo ahụ mee ka mgbidi ndị gbara Juda gburugburu sikwuo ike. Baịbụl kwuru, sị: “Ha wee na-ewu ihe owuwu ma na-enwe ihe ịga nke ọma.”—2 Ihe 14:1, 6, 7.

MGBE ESA NỌ N’ỌGBỌ AGHA

Anyị cheta ụdị onye Esa bụ, o kwesịghị iju anyị anya na o kpere ekpere mgbe ndị agha kachanụ Baịbụl kọrọ akụkọ ha bịara ịlụso ya agha. Esa ma na Chineke na-agọzi ndị tụkwasịrị ya obi. Eze ahụ kpere ekpere, rịọ Jehova ka o nyere ya aka. Ọ ma na ọ bụrụ na ya atụkwasị Chineke obi, Chineke enyekwara ya aka, ụjọ ekwesịghị ịtụ ya n’agbanyeghị otú ndị iro ya dịruru ọtụtụ ma ọ bụ otú ha siruru ike. Agha ahụ gbasara aha Jehova. Ọ bụ ya mere Esa ji kpee ekpere, sị: “Jehova bụ́ Chineke anyị, biko, nyere anyị aka n’ihi na anyị dabeere n’ebe ị nọ, anyị jikwa aha gị na-ebuso ìgwè mmadụ a agha. Jehova, ọ bụ gị bụ Chineke anyị. Ekwela ka mmadụ efu kara gị ike.” (2 Ihe 14:11) Ọ dị ka ịsị: ‘Jehova, ọ bụ gị ka ndị Itiopia bịara ịlụso agha. Ekwela ka ụmụ mmadụ na-adịghị ike merie ndị a kpọkwasịrị aha gị, kọchaakwa aha gị.’ N’ihi ya, ‘Jehova meriri ndị Itiopia n’ihu Esa nakwa n’ihu Juda. Ndị Itiopia wee gbaa ọsọ.’—2 Ihe 14:12.

Taa, ndị Jehova nwere ọtụtụ ndị iro dị ike. Anyị agaghị eji ngwá agha nkịtị alụso ha ọgụ. Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-eme ka ndị niile tụkwasịrị ya obi merie n’agha ha na-alụrụ aha ya. Ọgụ anyị na-alụ nwere ike ịbụ ịgbasi mbọ ike izere àgwà ndị ụwa nke bụ́ onye ọ bụla mewe otú masịrị ya, imeri adịghị ike anyị, ma ọ bụ inyere ezinụlọ anyị aka ka ha ghara ịmụta àgwà ọjọọ. N’agbanyeghị ụdị nsogbu bịaara anyị, ekpere Esa nwere ike ịgba anyị ume. Ọ bụ Jehova mere ka o merie n’agha ahụ. Mmeri ahụ mere ka anyị mata ihe ndị niile tụkwasịrị Chineke obi kwesịrị ịtụ anya ya. O nweghị mmadụ ọ bụla ga-emerili Jehova.

A GBARA YA UME MA DỌỌ YA AKA NÁ NTỊ

Mgbe Esa si agha ahụ lọta, Azaraya onye amụma bịakwutere ya. Ọ gbara Esa ume, dọọkwa ya aka ná ntị, sị: “Geenụ m ntị, Esa na Juda na Benjamin dum! Jehova ga-anọnyere unu ma ọ bụrụhaala na unu adịnyere ya; ọ bụrụ na unu achọọ ya, ọ ga-ekwe ka unu chọta ya, ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya, ọ ga-ahapụ unu. . . . Nweenụ obi ike, unu enwela nkụda aka, n’ihi na unu ga-enweta ụgwọ ọrụ maka ọrụ unu.”—2 Ihe 15:1, 2, 7.

Ihe a ọ gwara ha nwere ike ime ka okwukwe anyị sie ike. O gosiri na Jehova ga-anọnyere anyị ma ọ bụrụhaala na anyị ji obi anyị niile na-ejere ya ozi. Anyị kpọkuo ya ka o nyere anyị aka, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ na-anụ olu anyị. Azaraya kwuru, sị: “Nweenụ obi ike.” Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe ziri ezi, anyị kwesịrị inwe obi ike, ma anyị maara na anyị ga-emeli ya ma Jehova nyere anyị aka.

Nne nne Esa, bụ́ Meaka, “meere ogwe osisi dị nsọ arụsị jọgburu onwe ya.” N’ihi ya, Esa chụturu ya ka ọ ghara ịbụkwa “nnukwu nwaanyị” n’agbanyeghị na ọ dịrịghị ya mfe ime otú ahụ. Ọ kpọkwara arụsị ya ọkụ. (1 Eze 15:13) Chineke gọziri Esa maka ihe o kpebiri ime nakwa obi ike ya. Anyịnwa kwesịrị iji obi anyị niile na-erubere Jehova na iwu ya isi ma ndị ikwu anyị hà na-erubere Chineke isi ma ọ bụ na ha anaghị erubere ya isi. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, Jehova ga-agọzi anyị.

Otu ụzọ Chineke si gọzie Esa bụ na ọ hụrụ ka ọtụtụ ndị Izrel si n’alaeze ebe ugwu ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi bịa biri na Juda mgbe ha matara na Jehova nọnyeere ya. N’ihi otú ha si jiri ezi ofufe kpọrọ ihe, ha kpebiri ịhapụ ụlọ ha ka ha nwee ike ibi n’etiti ndị na-efe Jehova. Esa na ndị Juda niile ji obi ụtọ ‘gbaa ndụ na ha ga-eji obi ha dum na mkpụrụ obi ha dum chọọ Jehova.’ Gịnị si na ya pụta? Chineke ‘kwere ka ha chọta ya; Jehova nọkwa na-enye ha ezumike gbaa gburugburu.’ (2 Ihe 15:9-15) Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ịhụ ka ndị hụrụ ezi omume n’anya na-amalite ife Jehova!

Ma, Azaraya onye amụma dọsikwara Esa aka ná ntị ike, sị: ‘Ọ bụrụ na ị hapụ Jehova, ọ ga-ahapụ gị.’ Anyị achọghị ka ụdị ihe ahụ mee anyị, n’ihi na ọ ga-ajọgbu onwe ya! (2 Pita 2:20-22) Akwụkwọ Nsọ agwaghị anyị ihe mere Jehova ji dọọ Esa aka ná ntị, ma eze emeghị ihe a gwara ya.

“I ZUZURU NZUZU”

N’afọ nke iri atọ na isii nke ọchịchị Esa, eze Izrel bụ́ Beasha malitere ịlụso Juda agha. Beasha malitere ime ka mgbidi Rema sie ike, ya bụ, obodo dị n’agbata Izrel na Juda. Ọ dị naanị kilomita asatọ site n’ebe ugwu Jeruselem. O nwere ike ịbụ na ihe mere o ji mee ya bụ na ọ chọghị ka ndị ọ na-achị na-aga Juda ife Jehova na ijere Eze Esa ozi. Kama Esa ga-arịọ Chineke ka o nyere ya aka otú ahụ o mere mgbe ndị Itiopia bịara ịlụso ya agha, ọ chọwara enyemaka mmadụ. O zigaara eze Siria onyinye, rịọ ya ka ọ gaa lụso alaeze ebe ugwu Izrel agha. Mgbe ndị Siria malitere ịlụso Izrel agha, Beasha kwụsịrị iwu mgbidi Rema.—2 Ihe 16:1-5.

Obi adịghị Jehova mma n’ihe ahụ Esa mere. O zigakwara Hanenaị ka ọ gaa gwa ya. Ebe Esa ma ihe Chineke mere ndị Itiopia, o kwesịrị ịghọta “na anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.” O nwere ike ịbụ na e nyere Esa ndụmọdụ ọjọọ ma ọ bụ na o chere na Beasha na ndị agha ya esichaghị ike nakwa na ya ga-emerili ha. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, Esa tụkwasịrị mmadụ obi kama ịtụkwasị Jehova obi. Hanenaị gwara ya, sị: “I zuzuru nzuzu n’ihe a i mere, n’ihi ya, malite ugbu a gaa n’ihu, a ga na-ebuso gị agha.”—2 Ihe 16:7-9.

Okwu ahụ were Esa ezigbo iwe, o wee tụkpuo Hanenaị onye amụma n’ụlọ ọtọsị. (2 Ihe 16:10) Ò nwere ike ịbụ na Esa chere, sị, ‘Ebe ọ bụ na m na-atụkwasị Chineke obi kemgbe ọtụtụ afọ, è kwesịrị ịbara m mba?’ Ugbu a ọ katawarala ahụ́, ọ̀ ga-abụ na ọ naghịzi eche echiche nke ọma? Baịbụl ekwughị.

N’afọ nke iri atọ na itoolu nke ọchịchị Esa, ihe mere ya n’ụkwụ. Baịbụl kwuru na “ọbụna mgbe ọ nọ n’ọrịa, ọ chọghị Jehova, kama ọ chọrọ ndị na-agwọ ọrịa.” N’oge ahụ, o yiri ka Esa na Jehova adịghịzi ná mma otú ha dịbu. Ọ dịkwa ka ò megidere otú ahụ ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ nke iri anọ na otu nke ọchịchị ya.—2 Ihe 16:12-14.

N’agbanyeghị ihe ndị ahụ, o yiri ka àgwà ọma ya na ịnụ ọkụ n’obi o ji na-efe Chineke karịrị ihe ndị o mejọrọ. O nweghị mgbe ọ kwụsịrị ife Jehova. (2 Ihe 15:17) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Esa? O nwere ike inyere anyị aka ịghọta na anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche n’otú Jehova si nyere anyị aka n’oge gara aga, n’ihi na icheta ụdị ihe ahụ nwere ike ime ka anyị rịọ Jehova ka o nyere anyị aka mgbe ọnwụnwa bịaara anyị. Ma, anyị ekwesịghị iche na e kwesịghị iji Baịbụl dụọ anyị ọdụ n’ihi na anyị ji obi anyị niile na-ejere Chineke ozi kemgbe ọtụtụ afọ. N’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova, ọ ga-adọ anyị aka ná ntị ma anyị mehie. Anyị kwesịrị iji obiọma nabata ya ka o wee baara anyị uru. Ihe kacha mkpa anyị mụtara bụ na Nna anyị nke eluigwe ga-anọnyere anyị ma ọ bụrụhaala na anyị adịnyere ya. Anya Jehova na-ahụzu ụwa niile ka ọ mata ndị ji obi ha niile na-efe ya. Ọ na-eji ike ya enyere ha aka. Ọ bụ ihe Jehova meere Esa, ọ ga-emekwara anyị otú ahụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

Jehova na-agọzi ndị ji obi ha niile na-alụrụ ofufe ya agha

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe ziri ezi n’anya Jehova, anyị kwesịrị inwe obi ike