Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-akpọkọta Ndị Ya, Bụ́ Ndị Obi Dị Ụtọ

Jehova Na-akpọkọta Ndị Ya, Bụ́ Ndị Obi Dị Ụtọ

Jehova Na-akpọkọta Ndị Ya, Bụ́ Ndị Obi Dị Ụtọ

“Kpọkọta ụmụ Izrel, ndị ikom na ndị inyom na ụmụntakịrị na onye mbịarambịa nke nọ n’ime obodo gị.”​—DIUT. 31:12.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na mgbakọ so n’ihe ndị dị mkpa ndị Jehova na-eme kemgbe ọtụtụ afọ?

Olee mbọ ọtụtụ ndị Izrel oge ochie na-agba iji gaa ememme ndị ha na-eme na Jeruselem?

Gịnị mere na i kwesịghị ikwe ka mgbakọ ọ bụla kwaa gị?

1, 2. Olee ihe ndị anyị ga-atụle banyere mgbakọ ndị Chineke na-enwe?

KEMGBE ọtụtụ afọ, Ndịàmà Jehova na-aga mgbakọ mba niile na mgbakọ distrikti. Ọtụtụ n’ime anyị agaala mgbakọ ndị a, o nwekwara ike ịbụ na anyị agaala ọtụtụ n’ime ha kemgbe ọtụtụ afọ.

2 Ọtụtụ puku afọ gara aga, ndị Chineke na-enwekwa mgbakọ ndị dị nsọ. Anyị ga-atụle ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere mgbakọ ndị e nwere n’oge ochie na otú ha si yie ndị a na-enwe n’oge a, hụkwa uru ịga ha bara.—Ọma 44:1; Rom 15:4.

MGBAKỌ NDỊ DỊ MKPA E NWERELA, MA N’OGE OCHIE MA N’OGE A

3. (a) Gịnị mere ná mgbakọ mbụ e dere na Baịbụl ndị Jehova nwere? (b) Olee otú e si akpọ ndị Izrel ka ha gbakọta?

3 Mgbakọ ahụ e nwere n’ala ala Ugwu Saịnaị bụ nnukwu mgbakọ mbụ e dere na Baịbụl ndị Chineke nwere iji nụrụ Okwu ya. Ọ bụ mgbakọ pụrụ iche n’ofufe Chineke. Ná mgbakọ ahụ pụrụ iche, Jehova mere ka ndị Izrel hụ ike ya mgbe o nyere ha Iwu ya. O doro anya na ndị gara mgbakọ ahụ echefughị ya echefu. (Ọpụ. 19:2-9, 16-19; gụọ Ọpụpụ 20:18; Diuterọnọmi 4:9, 10.) Ihe mere n’ụbọchị ahụ dị ezigbo mkpa n’ihe niile Chineke na ndị Izrel mechara mekọọ. N’oge na-adịghị anya, Jehova wepụtara ihe a ga na-eji akpọkọta ndị ya. O nyere Mozis iwu ka o mee opi ọlaọcha abụọ a ga-eji na-akpọ “nzukọ ahụ dum” ka ha gbakọta “n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.” (Ọnụ Ọgụ. 10:1-4) Chegodị ụdị ọṅụ ndị Izrel na-enwe ná mgbakọ ndị ahụ!

4, 5. Gịnị mere mgbakọ ndị e nwere n’oge Mozis na Jọshụa ji pụọ iche?

4 Mgbe ndị Izrel nọrọla ihe dị ka afọ iri anọ n’ọzara, Mozis kpọkọtara ndị Izrel ibe ya. Ọ bụ oge dị ezigbo mkpa n’akụkọ mba ọhụrụ ahụ. Ha na-achọ ịbanye n’Ala Nkwa ahụ. Oge eruola ka Mozis chetara ndị Izrel ihe niile Jehova meere ha nakwa ihe ndị ọ ka ga-emere ha.—Diut. 29:1-15; 30:15-20; 31:30.

5 O nwere ike ịbụ n’otu mgbakọ ahụ ka Mozis gwara ndị Izrel na a ga na-enwe mgbakọ pụrụ iche maka ịkụziri ndị Chineke ihe. N’afọ asaa ọ bụla, mgbe a na-eme Ememme Ụlọ Ndò, ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, ụmụaka, na ndị mbịarambịa n’Izrel na-ezukọ n’ebe Jehova họọrọ ‘ka ha wee gee ntị, ka ha mụtakwa ihe, ka ha tụọ egwu Jehova ma lezie anya idebe ihe niile e kwuru n’iwu ya.’ (Gụọ Diuterọnọmi 31:1, 10-12.) N’ihi ya, malite mgbe Izrel ghọrọ mba, Jehova mere ka ha mara na ha ga na-ezukọ ugboro ugboro ka ha mụọ iwu Jehova na nzube ya. Mgbe ndị Izrel nwetachara Ala Nkwa ahụ, Jọshụa kpọkọtara ndị Izrel niile. N’oge ahụ, mba ndị na-ekpere arụsị ka gbara ha gburugburu. N’ihi ya, Jọshụa ma na e kwesịrị ịgba ndị Izrel ume ka ha kpebisikwuo ike ịna-erubere Jehova isi. N’ụbọchị ahụ, ndị Izrel ṅụrụ iyi na ha ga na-efe Chineke.—Jọsh. 23:1, 2; 24:1, 15, 21-24.

6, 7. Gịnị mere a ga-eji kwuo na mgbakọ ndị Jehova nwere n’oge anyị a dị ezigbo mkpa?

6 N’afọ ndị na-adịbeghị anya, e nweekwala mgbakọ ndị dị ezigbo mkpa. Ná mgbakọ ndị ahụ, a mara ọkwa mgbanwe ndị e mere ná nzukọ Jehova nakwa ihe ndị a ghọtakwuru banyere ụfọdụ amaokwu Baịbụl. (Ilu 4:18) Mgbe a lụchara Agha Ụwa Mbụ, Ndị Mmụta Baịbụl nwere nnukwu mgbakọ mbụ ha n’afọ 1919. Ebe e mere ya bụ na Sida Pọịnt, Ohayo, dị n’Amerịka. Ndị bịara ya dị puku asaa. Ná mgbakọ ahụ, a mara ọkwa na ndị Chineke ga-agbasi mbọ ike ikwusa ozi ọma n’ụwa niile. N’afọ 1922, ha nwere mgbakọ ụbọchị itoolu n’otu ebe ahụ. Nwanna Joseph F. Rutherford kwuru okwu dara ụda ma gbaa ndị bịara mgbakọ ahụ ume ka ha na-ekwusa ozi ọma n’ebe niile ruo mgbe a ga-ebibi Babịlọn Ukwu ahụ. O kwuru, sị: “A ga-emerịrị ka ụwa mata na Jehova bụ Chineke nakwa na Jizọs Kraịst bụ Eze ndị eze na Onyenwenụ kacha ndị nwenụ niile. Taa bụ ụbọchị kacha ụbọchị niile. Lee, Eze ahụ na-achị achị! Unu bụ ndị na-ekwusa ozi ya. N’ihi ya, kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na alaeze ya.” Ndị bịara mgbakọ ahụ na ndị Chineke n’ụwa niile ji ịnụ ọkụ n’obi malite ikwusa ozi ọma.

7 Ná mgbakọ e nwere na Kolọmbọs, Ohayo, n’afọ 1931, Ndị Mmụta Baịbụl ji obi ụtọ malite ịza Ndịàmà Jehova. N’afọ 1935, na Wọshịntịn, D.C., Nwanna Rutherford mere ka a mata ndị bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ahụ akwụkwọ Mkpughe kwuru na ha “guzo n’ihu ocheeze ahụ nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpu. 7:9-17) N’afọ 1942, mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, Nathan H. Knorr kwuru okwu tọrọ onye ọ bụla ụtọ, nke isiokwu ya bụ “Udo—Ọ̀ Ga-adịgide?” O mere ka a mata ihe ‘anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie’ e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi 17 pụtara, kwuokwa na ndị Chineke ka ga-ekwusasi ozi ọma ike ma a lụchaa agha ahụ.

8, 9. Gịnị mere mgbakọ ụfọdụ e nwere n’afọ ndị gara aga ji tọọ ndị Chineke ezigbo ụtọ?

8 N’afọ 1946, e nwere mgbakọ na Klivland, Ohayo, nke isiokwu ya bụ “Mba Ndị Nwere Ọṅụ.” Nwanna Knorr kwuru okwu tọrọ ụtọ nke isiokwu ya bụ “Nsogbu Ndị A Na-enwe n’Iwugharị Ihe na n’Iwusakwu Ihe.” Otu nwanna nke nọ n’ikpo okwu mgbe a na-ekwu okwu ahụ dere banyere ihe ndị bịara mgbakọ ahụ mere. O kwuru na mgbe Nwanna Knorr kwuru otú a ga-esi wusakwuo ụlọ obibi na ebe a na-ebi akwụkwọ na Betel dị na Bruklin, ndị bịara mgbakọ ahụ kụsiri aka ike ugboro ugboro. Mmadụ nọrọgodị n’ebe dị anya, ọ gaghị esiri ya ike ịmata na obi dị onye ọ bụla ezigbo ụtọ. Ná mgbakọ mba niile e nwere n’afọ 1950 na Niu Yọk Siti, obi dị ndị bịara mgbakọ ahụ ụtọ inweta Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst (nke Bekee). Ọ bụ nkebi nke mbụ na Baịbụl e ji Bekee a na-asụ ugbu a sụgharịa, nke tinyere aha Chineke n’ebe niile o kwesịrị ịdị n’Okwu ya.—Jere. 16:21.

9 E nwekwara mgbakọ ná mba ụfọdụ ebe a na-emegidebu Ndịàmà Jehova ma ọ bụ machibido ozi ọma ha iwu. Mgbakọ ndị ahụ tọrọ ndị bịara ha ezigbo ụtọ. Dị ka ihe atụ, Adolf Hitler kwuru na ya ga-ekpochapụ Ndịàmà Jehova na Jamanị. Ma n’afọ 1955, otu narị puku Ndịàmà Jehova na puku asaa gara mgbakọ e nwere na Nurembeg, bụ́ ebe Hitler na ndị òtù ya na-ezukọbu. Obi ụtọ ọtụtụ ndị bịara mgbakọ ahụ nwere mere ka anya mmiri gbaa ha! N’afọ 1989, otu narị puku ụmụnna na iri puku isii na isii, narị ise na iri na asatọ gara Mgbakọ Distrikti “Nsọpụrụ Chineke,” nke e nwere n’ụzọ ebe atọ na Poland. Ọtụtụ n’ime ha si n’ebe bụbu Sọviet Yuniọn na Chekoslovakia, nakwa ná mba ndị ọzọ dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop. Nke ahụ bụ nke mbụ ụfọdụ n’ime ha na-aga mgbakọ ndị bịara ya karịrị mmadụ iri na ise ma ọ bụ iri abụọ. Chegodị ụdị ọṅụ ụmụnna nwere ná Mgbakọ Mba Niile e nwere na Kiev, dị na Yukren, n’afọ 1993, nke isiokwu ya bụ “Izi Ihe Chineke.” Ndị e mere baptizim ná mgbakọ ahụ dị puku asaa, narị anọ na abụọ. Ọ bụ ọnụ ọgụgụ kacha ukwuu anyị maara e metụrụla baptizim n’otu ụbọchị ná mgbakọ Ndịàmà Jehova.—Aịza. 60:22; Hag. 2:7.

10. Olee mgbakọ ndị ị na-anaghị echefu echefu, n’ihi gịnịkwa?

10 O nwere ike ịbụ na e nwere mgbakọ distrikti ma ọ bụ mgbakọ mba niile ị kacha echeta. Ì chetara mgbakọ distrikti mbụ ị gara ma ọ bụkwanụ mgbakọ e mere gị baptizim na ya? Ọ bụ mgbakọ dị ezigbo mkpa n’ofufe ị na-efe Jehova. I kwesịghị ichefu ya echefu!—Ọma 42:4.

OGE OBI ỤTỌ

11. Olee ememme ụfọdụ Chineke nyere ndị Izrel oge ochie iwu ka ha na-aga kwa afọ?

11 Jehova nyere ndị Izrel iwu ka ha na-ezukọ na Jeruselem maka ememme atọ a na-eme kwa afọ. Ememme ndị ahụ bụ Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko, Ememme Izu, (nke e mechara kpọwa Pentikọst), nakwa Ememme Ụlọ Ndò. Chineke nyere ha iwu banyere ememme ndị ahụ, sị: “Ugboro atọ n’afọ, nwoke ọ bụla n’ime unu ga-abịa n’ihu ezi Onyenwe unu, bụ́ Jehova.” (Ọpụ. 23:14-17) Ọtụtụ ndị isi ezinụlọ ghọtara na ememme ndị ahụ dị ezigbo mkpa n’ofufe ha na-efe Jehova. Ọ bụ ya mere ha ji akpọ ndị ezinụlọ ha niile aga ememme ndị ahụ.—1 Sam. 1:1-7; Luk 2:41, 42.

12, 13. Gịnị ka ọtụtụ ndị Izrel na-eme iji gaa ememme ndị a na-enwe kwa afọ?

12 Chegodị ihe ọ na-ewe ezinụlọ ndị Izrel ịga ememme ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, Josef na Meri na-aga ihe dị ka otu narị kilomita, si Nazaret gaa Jeruselem. Ụbọchị ole ka i chere ọ ga-ewe gị ịkpọ obere ụmụaka jiri ụkwụ gaa Jeruselem? Ihe Baịbụl kwuru banyere otú Jizọs si gaa Jeruselem mgbe ọ bụ obere nwa gosiri na mmadụ na ndị ikwu na ibe ya nwere ike iso gaa. Ọ ga-abụrịrị na ọ naghị adị mfe ime ụdị njem ahụ, sikọọ nri ọnụ, chọtakwa ebe dị mma ha ga-arahụ n’ebe ha na-amaghị nke ọma. Ma, Baịbụl kwuru na Josef na Meri hapụrụ Jizọs ka o soro ndị ọzọ n’agbanyeghị na ọ dị afọ iri na abụọ, nke gosiri na ụjọ atụghị ha na ihe ga-eme ya. Chegodị banyere ememme ndị ahụ. Ọ ga-abụrịrị na ndị gara ha echefughị ha echefu, karịchaa ụmụaka!—Luk 2:44-46.

13 Mgbe ndị Izrel bicha n’ebe dị iche iche n’ụwa, ndị na-abịa ememme ndị ahụ na-esi ọtụtụ mba. N’ụbọchị Pentikọst afọ 33, ndị Juu na ndị ha tọghatara, bụ́ ndị ji ememme ndị ahụ kpọrọ ihe, si ebe dị iche iche dị ka Ịtali, Libia, Krit, Eshia Maịnọ, na Mesopotemia bịa Jeruselem.—Ọrụ 2:5-11; 20:16.

14. Olee otú obi na-adị ndị Izrel mgbe ha gara ememme ndị ha na-eme kwa afọ?

14 Ihe kacha atọ ndị Izrel kwesịrị ntụkwasị obi ụtọ n’ememme ndị ahụ bụ na ọ na-eme ka ha nwee ike iso ọtụtụ ndị ọzọ ji ememme ahụ kpọrọ ihe fee Jehova. Olee otú obi na-adị ndị bịara ememme ndị ahụ? Anyị nwere ike inweta azịza ya n’iwu Jehova nyere ndị ya banyere Ememme Ụlọ Ndò. Ọ gwara ha, sị: “Ị ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’oge ememme gị, gị na nwa gị nwoke na nwa gị nwaanyị na ohu gị nwoke na ohu gị nwaanyị na onye Livaị na onye mbịarambịa na nwa na-enweghị nna nakwa nwaanyị di ya nwụrụ, bụ́ ndị bi n’obodo gị. Ụbọchị asaa ka ị ga-emere Jehova bụ́ Chineke gị ememme n’ebe Jehova ga-ahọrọ, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị ga-agọzi mkpụrụ niile ị kụrụ nakwa ihe niile aka gị na-eme, ị ga na-aṅụrịkwa naanị ọṅụ.”—Diut. 16:14, 15; gụọ Matiu 5:3.

GỊNỊ MERE ANYỊ GA-EJI JIRI MGBAKỌ NDỊ A NA-ENWE N’OGE A KPỌRỌ IHE?

15, 16. Olee ihe ndị ị hapụrụla iji gaa mgbakọ distrikti? Gịnị mere mbọ ahụ ị gbara ji baara gị uru?

15 Mgbakọ ndị ahụ ndị Chineke nwere n’oge ochie bụụrụ ndị Chineke n’oge a ezigbo ihe nlereanya! Ọ bụ ezie na ọtụtụ ihe agbanweela kemgbe e mere mgbakọ ndị nke oge ochie ahụ, ihe bụ́ isi mere e ji aga mgbakọ agbanwebeghị. N’oge Baịbụl, ndị na-aga mgbakọ na-ahapụ ihe ụfọdụ iji gaa ha. Ọtụtụ ndị na-emekwa otú ahụ taa. N’agbanyeghị nke ahụ, uru anyị na-erite na-akarị mbọ ọ bụla anyị gbara iji gaa. Mgbakọ ndị e nwere n’oge ochie nyeere ndị Chineke aka ịbịarukwu ya nso, ọ bụkwa otu ihe ahụ taa. Ha na-eme ka anyị ghọta ihe ndị dị mkpa ga-enyere anyị aka ime ka anyị na Chineke dị ná mma. Mgbakọ na-eme ka anyị kpebisie ike ime ihe ndị anyị mụtara, izere nsogbu, na-agbakwa anyị ume iji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ha na-enyekwara anyị aka ime ihe ndị ga-eme anyị obi ụtọ kama ime ihe ndị ga-akpatara anyị nchegbu.—Ọma 122:1-4.

16 Ndị gara mgbakọ na-enwe ọṅụ. A kọrọ banyere otu nnukwu mgbakọ e nwere n’afọ 1946, sị: “Obi dị onye ọ bụla ụtọ ịhụ ka ọtụtụ puku ụmụnna nọkọtara ọnụ. Ihe kadị enye ọṅụ bụ ịnụ egwú a na-akụ na abụ Alaeze ìgwè ndị bịara mgbakọ ahụ na-abụ iji too Jehova.” A kọkwara, sị: “Ọtụtụ ndị bịara mgbakọ ahụ denyere aha ha ná Ngalaba Na-ahụ Maka Ozi Afọ Ofufo ma wepụta onwe ha ịrụ ọrụ ná ngalaba dị iche iche, n’ihi na obi dị ha ụtọ ijere Jehova na ụmụnna ha ozi.” Ì nwetụla ụdị ọṅụ ahụ mgbe ị gara mgbakọ distrikti ma ọ bụ mgbakọ mba niile?—Ọma 110:3; Aịza. 42:10-12.

17. Olee ihe ndị a gbanwere n’oge na-adịbeghị anya n’otú e si enwe mgbakọ?

17 Ihe ụfọdụ agbanweela n’otú e si ahazi mgbakọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị Chineke na-echeta mgbe a na-anọrucha abalị asatọ ná mgbakọ! A na-enwe nnọkọ ụtụtụ, nke ehihie, na nke mgbede. A na-agakwa ozi ọma ma a gaa mgbakọ. Mgbe ụfọdụ, ihe omume na-amalite n’elekere itoolu nke ụtụtụ, e nwekwara ike imere ihe omume ruo n’elekere itoolu nke abalị. Ndị wepụtara onwe ha ịrụ ọrụ ná mgbakọ na-arụsi ọrụ ike isiri ndị bịara mgbakọ nri ụtụtụ, nke ehihie, na nke abalị. Ugbu a, mgbakọ anaghị adịru ogologo otú ahụ, ndị mmadụ na ezinụlọ dị iche iche na-esikwa nri ha ga-eri tupu ha abịa mgbakọ. Nke a na-eme ka ha nwee ike ige ntị nke ọma n’ihe e si na Baịbụl na-akụziri ha ná mgbakọ.

18, 19. Olee ihe ndị ị na-akacha atụ anya ha ná mgbakọ, n’ihi gịnịkwa?

18 Ná mgbakọ ọ bụla, anyị na-atụ anya ihe ụfọdụ a na-eme ná mgbakọ kemgbe ọtụtụ afọ. Anyị na-enweta nri ime mmụọ a na-enye anyị “n’oge kwesịrị ekwesị,” nke na-eme ka anyị ghọtakwuo amụma na ozizi Baịbụl n’okwu ndị a na-ekwu ná mgbakọ nakwa n’akwụkwọ ọhụrụ ndị a na-ewepụta. (Mat. 24:45) Akwụkwọ ọhụrụ ndị ahụ na-enyekarịrị ndị nwere ezi obi aka ịghọta eziokwu si n’Akwụkwọ Nsọ. Ihe nkiri ndị si na Baịbụl na-agba ma nwata ma okenye ume ịtụle ihe ha bu n’obi na-efe Chineke, meekwa ka ha ghara ikwe ka e jiri echiche na-ezighị ezi juru n’ụwa duhie ha. Okwu baptizim na-enyere anyị niile aka iche echiche banyere ihe ndị anyị na-ewere ka ihe ndị kacha mkpa, meekwa ka anyị nwee ọṅụ ka anyị na-ahụ ndị a na-eme baptizim iji gosi na ha ararala onwe ha nye Jehova.

19 Kemgbe ọtụtụ afọ, mgbakọ so n’otú e si efe Jehova ezi ofufe. Ọ na-eme ka anyị na-enwe ọṅụ, meekwa ka anyị jiri obi anyị niile na-efe Chineke n’oge ihe siri ike. Mgbakọ ndị ahụ na-eme ka anyị meta ndị enyi ọhụrụ, mee ka anyị jirikwuo ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile kpọrọ ihe, o sokwa n’otú Jehova si agọzi ndị ya ma na-elekọta ha. N’eziokwu, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịhazi ihe ọ na-eme ka o nwee ike ịnọ mgbe a na-eme ihe omume niile ma rite uru na ha.—Ilu 10:22.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 30]

Mgbakọ mba niile e nwere na Niu Yọk Siti n’afọ 1950

[Foto dị na peeji nke 32]

MOZAMBIK

[Foto ndị dị na peeji nke 32]

SAỤT KORIA