Otú A Ga-esi Bibie Ụwa A
Otú A Ga-esi Bibie Ụwa A
“Unu . . . anọghị n’ọchịchịrị, nke mere ụbọchị ahụ ga-eji bịakwasị unu na mberede dị ka chi ọbụbọ si abịakwasị ndị ohi.”—1 TESA. 5:4.
Ì NWERE IKE ỊKỌWA?
Olee ihe ndị a na-adịghị ahụ anya e kwuru okwu ha n’amaokwu ndị a?
1. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-eche nche ma merie ọnwụnwa?
IHE ndị dị egwu ga-eme n’oge na-adịghị anya. Otú amụma ndị e buru na Baịbụl si na-emezu gosiri na nke a bụ eziokwu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-eche nche. Olee ihe ga-enyere anyị aka ime otú ahụ? Pọl onyeozi gbara anyị ume ka anyị ‘lekwasị anya n’ihe a na-adịghị ahụ anya.’ Anyị kwesịrị iburu n’obi na Chineke ga-enye anyị ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa. Ihe ndị ọzọ Pọl dere n’ebe ahụ na-egosi na o dere okwu ndị a iji gbaa ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha lekwasị anya n’ihe ọma ha ga-enweta ma ọ bụrụ na ha ekwesị ntụkwasị obi. Ime otú ahụ ga-enyere ha aka imeri ọnwụnwa na mkpagbu.—2 Kọr. 4:8, 9, 16-18; 5:7.
2. (a) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka olileanya anyị sie ike mgbe niile, gịnị ka anyị ga-eme? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a nakwa na nke so ya?
2 Otu ihe dị mkpa anyị ga-amụta na ndụmọdụ Pọl bụ: Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka olileanya anyị sie ike mgbe niile, anyị agaghị elekwasị anya naanị n’ihe ndị anyị na-ahụ ugbu a. Anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ anyị na-anaghị ahụ anya ugbu a. (Hib. 11:1; 12:1, 2) N’ihi ya, n’isiokwu a nakwa na nke so ya, anyị ga-atụle ihe iri ga-eme n’ọdịnihu, bụ́ ndị gbasara olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi.
OLEE IHE GA-EME MGBE Ọ FỌRỌ OBERE KA E BIBIE ỤWA?
3. (a) Gịnị ka e kwuru ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:2, 3 nke ga-eme n’ọdịnihu? (b) Gịnị ka ndị ọchịchị ga-eme n’oge ahụ, oleekwa ndị nwere ike isonyere ha?
3 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Tesalonaịka, o kwuru otu ihe ga-eme n’ọdịnihu. (Gụọ 1 Ndị .) O kwuru banyere “ụbọchị Jehova.” “Ụbọchị Jehova” ga-amalite mgbe a ga-ebibi okpukpe ụgha ma gwụ mgbe a ga-alụ agha Amagedọn. Ma, obere oge tupu ụbọchị Jehova amalite, ndị na-achị ụwa ga na-ekwu, sị, “Udo na obi iru ala!” O nwere ike ịbụ ihe a ga-ekwu otu ugboro ma ọ bụ ugboro ugboro. Mba dị iche iche nwere ike iche na ha edoziela ụfọdụ nnukwu nsogbu ndị ha nwere. Gịnị ka ndị ndú okpukpe ga-eme? Ha so n’ụwa a. N’ihi ya, ha nwere ike iso ndị ọchịchị tie mkpu ahụ. ( Tesalonaịka 5:2, 3Mkpu. 17:1, 2) Ndị ụkọchukwu ga-esi otú ahụ gosi na ha na-eme ka ndị amụma ụgha e nwere na Juda oge ochie. Jehova kwuru banyere ha, sị: “Ha . . . na-asị, ‘Udo dị! Udo dị!’ mgbe udo na-adịghị.”—Jere. 6:14; 23:16, 17.
4. Olee ihe anyị ghọtara nke ndị ọzọ na-aghọtaghị?
4 N’agbanyeghị ndị ga-eso tie “Udo na obi iru ala!” mkpu ahụ ga-egosi na ụbọchị Jehova achọwala ịmalite. Ọ bụ ya mere Pọl ji kwuo, sị: “Unu onwe unu, ụmụnna anyị, anọghị n’ọchịchịrị, nke mere ụbọchị ahụ ga-eji bịakwasị unu na mberede dị ka chi ọbụbọ si abịakwasị ndị ohi, n’ihi na unu niile bụ ụmụ nke ìhè.” (1 Tesa. 5:4, 5) Anyị adịghị ka ndị ọzọ n’ihi na anyị ghọtara ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ihe ndị na-eme ugbu a pụtara. Olee kpọmkwem otú amụma “Udo na obi iru ala!” ahụ ga-esi mezuo? Anyị amabeghị. N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ‘ịmụrụ anya ma nwee uche ziri ezi.’—1 Tesa. 5:6; Zef. 3:8.
“EZE NWAANYỊ” NKE NA-AMAGHỊ NA A NA-AGA IBIBI YA
5. (a) Olee otú “oké mkpagbu” ahụ ga-esi amalite? (b) Ònye bụ “eze nwaanyị” nke na-amaghị na a na-aga ibibi ya?
5 Olee ihe ọzọ ga-emenụ, nke anyị na-anaghị ahụ anya ugbu a? Pọl kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla ha na-asị: ‘Udo na obi iru ala!’ mgbe ahụ ka mbibi mberede ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya.” Otú “mbibi mberede” ahụ ga-esi malite bụ ibibi “Babịlọn Ukwu ahụ,” bụ́ alaeze okpukpe ụgha nke zuru ụwa ọnụ, nke a kpọkwara “nwaanyị akwụna.” (Mkpu. 17:5, 6, 15) Mbibi ahụ a ga-ebibi ụdị okpukpe ụgha niile, ma Krisendọm, ga-abụ otú “oké mkpagbu” ahụ ga-esi malite. (Mat. 24:21; 2 Tesa. 2:8) Ihe a ga-eju ọtụtụ ndị anya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ruo mgbe ahụ, obi ga-esi nwaanyị akwụna ahụ ike na ya bụ “eze nwaanyị” nke ‘na-agaghị ahụ iru uju.’ Ma, ọ ga-achọpụta na mberede na ọdachi na-aga ịdakwasị ya. A ga-ebibi ya ọsọ ọsọ nke na ọ ga-adị ka è bibiri ya “n’otu ụbọchị.”—Mkpu. 18:7, 8.
6. Olee ndị ga-ebibi okpukpe ụgha?
6 Baịbụl gwara anyị na ọ bụ “anụ ọhịa” ahụ nwere “mpi iri” ga-ebibi nwaanyị akwụna ahụ. N’akwụkwọ Mkpughe, anyị mụtara na anụ ọhịa ahụ bụ Òtù Mba Ụwa. “Mpi iri” ahụ nọchiri anya ọchịchị niile e nwere taa, bụ́ ndị na-akwado “anụ ọhịa [ahụ] nke na-acha uhie uhie.” * (Mkpu. 17:3, 5, 11, 12) Olee otú a ga-ebibiru nwaanyị akwụna ahụ? Mba ndị so n’Òtù Mba Ụwa ga-akwakọrọ akụ̀ nwaanyị akwụna ahụ, gbaa omume ọjọọ ya n’anwụ, rie anụ ya ma “kpọọ ya ọkụ kpamkpam.” A ga-ebibi ya kpamkpam.—Gụọ Mkpughe 17:16.
7. Olee otú mbibi “anụ ọhịa” ahụ ga-ebibi nwaanyị akwụna ahụ ga-esi malite?
7 Amụma Baịbụl mekwara ka anyị mara otú mbibi ahụ ga-esi malite. Jehova ga-etinye ya n’obi ndị ọchịchị ka ha ‘mezuo echiche ya,’ ya bụ, ibibi nwaanyị akwụna ahụ. (Mkpu. 17:17) Okpukpe ụgha na-akwado agha. Ha ga-anọgide na-akpata ọgba aghara n’ụwa; n’ihi ya, mba dị iche iche nwere ike iche na ibibi nwaanyị akwụna ahụ ga-abara ha uru. N’eziokwu, mgbe ndị ọchịchị ga-ebibi nwaanyị akwụna ahụ, ha ga-eche na ha na-emezu “otu echiche” nke ha. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ha ga-abụ ngwá ọrụ Chineke ga-eji bibie okpukpe ụgha niile. Ihe ọ pụtara bụ na ndị so n’ụwa Setan ga-ebibi ndị ọzọ so n’ụwa Setan, ma Setan agaghị egbochili ya.—Mat. 12:25, 26.
A GA-EBUSO NDỊ CHINEKE AGHA
8. Gịnị bụ agha “Gọg nke ala Megọg”?
8 E bibichaa okpukpe ụgha, ndị Chineke ka ‘ga-ebi n’obi iru ala, n’enweghịkwa mgbidi.’ (Ezik. 38:11, 14) Gịnị ga-eme ndị a na-efe Jehova ma yie ndị na-enweghị onye na-echebe ha? Ọ dị ka “ọtụtụ ndị” hà ga-ebuso ha agha kpụ ọkụ n’ọnụ. Baịbụl kwuru na ọ bụ “Gọg nke ala Megọg” ga-ebuso ha agha ahụ. (Gụọ Ezikiel 38:2, 15, 16.) Olee otú anyị kwesịrị isi lee agha ahụ a ga-ebuso anyị anya?
9. (a) Olee ihe kacha Onye Kraịst mkpa? (b) Olee ihe ndị anyị kwesịrị ịna-eme ugbu a iji mee ka okwukwe anyị sikwuo ike?
9 Anyị ma na a ga-ebuso ndị Chineke Ezik. 6:7) N’ihi ya, anyị na-atụsi anya ike ịhụ mgbe ihe ahụ pụrụ iche e kwuru n’amụma Ezikiel ga-emezu, obi sikwara anyị ike na “Jehova maara otú o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa.” (2 Pita 2:9) Anyị kwesịrị iji ohere ọ bụla anyị nwere ugbu a mee ka okwukwe anyị sikwuo ike ka anyị nwee ike ịna-erubere Jehova isi n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị nwere ike ịbịara anyị. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme? Anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere, na-amụ Okwu Chineke, na-atụgharị uche na ya, na-ezikwa ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, okwukwe anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi ga-esi ike ka “arịlịka.”—Hib. 6:19; Ọma 25:21.
agha. Ma, ọ naghị eme ka anyị chịrị obi n’aka. Kama nke ahụ, ihe kacha anyị mkpa abụghị ka a zọpụta anyị, kama ọ bụ ka e doo aha Jehova nsọ ma gosi na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị ihe ndị o kere eke. N’eziokwu, Jehova kwuru ihe karịrị ugboro iri isii, sị: “Unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.” (MBA DỊ ICHE ICHE GA-AMATA ONYE JEHOVA BỤ
10, 11. Olee otú agha Amagedọn ga-esi malite, oleekwa ihe ga-eme n’agha ahụ?
10 Olee ihe dị egwu ga-eme mgbe e busoro ndị ohu Jehova agha? Jehova ga-eji Jizọs na ndị agha ya si n’eluigwe gbatara ndị Chineke ọsọ enyemaka. (Mkpu. 19:11-16) Ọsọ enyemaka a ọ ga-agbatara ha ga-abụ “agha nke oké ụbọchị nke Chineke,” nke a na-akpọ Amagedọn.—Mkpu. 16:14, 16.
11 Jehova si n’ọnụ Ezikiel kwuo banyere agha ahụ, sị: “‘M ga-emekwa ka mma agha bịakwasị [Gọg] n’ógbè m niile bụ́ ugwu ugwu,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. ‘Mma agha onye nke ọ bụla ga-abịakwasị nwanne ya.’” Ụjọ ga-eme ka ndị na-akwado Setan nọrọ n’ọgba aghara, jirikwa ngwá agha ha gburịta ibe ha. Ma, ọdachi ga-adakwasịkwa Setan. Jehova kwuru, sị: “M ga-emekwa ka . . . ọkụ na sọlfọ zokwasị [Gọg] na ìgwè ndị agha ya na ọtụtụ ndị ga-eso ya.” (Ezik. 38:21, 22) Gịnị ka agha Chineke a ga-arụpụta?
12. Gịnị ka mba dị iche iche ga-amata n’ike?
12 Mba dị iche iche ga-amata na ọ bụ Jehova nyere iwu ka e bibie ha. Mgbe ahụ, ndị agha Setan nwere ike ikwu ụdị ihe ahụ ndị agha Ijipt kwuru mgbe ha chụụrụ ndị Izrel banye n’Oké Osimiri Uhie. Ha tiri mkpu, sị: ‘Jehova na-alụrụ ha ọgụ’! (Ọpụ. 14:25) N’eziokwu, mba dị iche iche ga-amata onye Jehova bụ n’ike. (Gụọ Ezikiel 38:23.) Oge ihe ndị a ga-eme ọ̀ dịla nso?
O NWEGHỊ MBA ỌZỌ GA-ACHỊ ỤWA
13. Olee ihe anyị maara banyere ọchịchị nke ise n’ihe oyiyi ahụ Daniel kọwara?
13 Otu amụma dị n’akwụkwọ Daniel ga-enyere anyị aka ịghọta otú oge gaferurula. Daniel kọwara otu ihe oyiyi nke dị ka mmadụ, nke e ji ọla na ígwè kpụọ. (Dan. 2:28, 31-33) Ihe oyiyi ahụ nọchiri anya alaeze ndị chịrị ụwa ma kpagbuo ndị Chineke n’oge ochie nakwa n’oge a. Ha bụ ọchịchị Babịlọn, Midia na Peshia, Gris, Rom, nakwa ọchịchị ọzọ nke na-achị ụwa n’oge anyị a. Anyị mụtara n’amụma Daniel na ala ala ụkwụ ihe oyiyi ahụ na mkpịsị ụkwụ ya nọchiri anya ọchịchị ikpeazụ a na-achị ụwa. N’Agha Ụwa Mbụ, Briten na Amerịka gbakọrọ aka lụọ ọgụ. N’eziokwu, ọchịchị nke ise n’ihe oyiyi ahụ Daniel kọwara bụ Briten na Amerịka, bụ́ mba abụọ jikọrọ aka na-achị ụwa. Ọ bụ ala ala ụkwụ bụ ebe ikpeazụ n’ihe oyiyi ahụ, nke gosiri na o nweghị mba ọzọ ga-achị ụwa ma Briten na Amerịka chịchaa. Ihe e ji kpụọ ala ala ụkwụ ihe oyiyi ahụ na mkpịsị ụkwụ ya bụ ígwè na ụrọ. Nke ahụ pụtara na ọchịchị Briten na Amerịka esichaghị ike.
14. Olee ọchịchị ga na-achị ụwa mgbe Amagedọn ga-amalite?
14 Amụma ahụ gosiri na n’afọ 1914, e si n’otu ugwu wapụta otu nkume nke nọchiri anya Alaeze Chineke. Ugwu ahụ nọchiri anya ọbụbụeze Jehova. N’oge na-adịghị anya, nkume ahụ ga-akụ ihe oyiyi ahụ n’ala ala ụkwụ. N’agha Amagedọn, nkume ahụ ga-egwepịa ala ala ụkwụ ihe oyiyi ahụ na ahụ́ ya niile. (Gụọ Daniel 2:44, 45.) N’ihi ya, Briten na Amerịka ka ga na-achị ụwa mgbe Amagedọn ga-amalite. Obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ ịhụ ka amụma ahụ ga-emezu kpamkpam! * Gịnịkwanụ ka Jehova ga-eme Setan?
IHE A GA-EME ONYEISI NDỊ IRO CHINEKE
15. A lụchaa agha Amagedọn, gịnị ka a ga-eme Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya?
15 Setan ga-ebu ụzọ hụ ka e kpochapụrụ nzukọ ya kpamkpam n’ụwa. A ga-elebaziri Setan anya. Jọn kọrọ ihe ga-emenụ. (Gụọ Mkpughe 20:1-3.) Jizọs Kraịst, bụ́ “mmụọ ozi . . . ji mkpịsị ugodi nke abis,” ga-ejide Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, tụba ha n’ime abis, hapụkwa ha ebe ahụ ruo otu puku afọ. (Luk 8:30, 31; 1 Jọn 3:8) Ọ bụ otú ahụ ka Jizọs ga-esi malite igwepịa isi agwọ ahụ. *—Jen. 3:15.
16. Olee otú ọ ga-adị Setan mgbe ọ ga-anọ ‘n’abis’?
16 Gịnị bụ “abis ahụ” bụ́ ebe a ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya? Okwu Grik Jọn dere ebe a bụ aʹbys·sos. Ọ pụtara “ebe dị ezigbo omimi.” Otú ọzọ e sikwa asụgharị ya bụ “ebe na-enweghị nsọtụ ma ọ bụ ebe na-enweghị njedebe.” N’ihi ya, ọ bụ ebe onye ọ bụla ọzọ na-agaghị eruli ma e wezụga Jehova na mmụọ ozi ahụ o nyere “mkpịsị ugodi nke abis.” N’ebe ahụ, Setan ga-anọ ka onye nwụrụ anwụ “ka o wee ghara iduhie mba niile ọzọ.” N’eziokwu, a ga-emechi “ọdụm [ahụ] na-ebigbọ ebigbọ” ọnụ!—1 Pita 5:8.
IHE NDỊ GA-EME TUPU E NWEE UDO
17, 18. (a) Olee ihe ndị a na-adịghị ahụ anya anyị tụlerela? (b) Mgbe ihe ndị a mechara, gịnị ga-amalite?
17 Ihe ndị dị mkpa ma dị egwu ga-eme n’oge na-adịghị anya. Anyị na-atụ anya ịhụ otú a ga-esi tie mkpu ahụ bụ́ “Udo na obi iru ala!” Anyị ga-ahụzi mbibi a ga-ebibi Babịlọn Ukwu ahụ, agha Gọg nke Megọg ga-ebuso ndị Chineke, agha Amagedọn, nakwa ntụba a ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis. Mgbe ihe ndị a mechara, ihe ọjọọ agaghịzi adị. Ndụ anyị ga-agbanwe kpamkpam mgbe Ọchịchị Puku Afọ Kraịst ga-amalite. Mgbe ahụ, anyị ga-ahụ “udo nke zuru ebe niile.”—Ọma 37:10, 11.
18 E wezụga ihe ise ahụ anyị tụlere, e nwere ihe ndị ọzọ “a na-adịghị ahụ anya” anyị kwesịrị ‘ilekwasị anya.’ Anyị ga-atụle ha n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Gụọ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! peeji nke 251-258.
^ par. 14 Okwu ahụ dị na Daniel 2:44, nke bụ́ ‘mee ka alaeze ndị a niile ghara ịdịkwa,’ na-ekwu banyere mba ndị chịrị ụwa, bụ́ ndị ihe oyiyi ahụ nọchiri anya ha. Ma, amụma ọzọ dị na Baịbụl nke ya na nke a na-ekwu otu ihe gosiri na “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi” ga-agbakọta ịlụso Jehova ọgụ ‘n’oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.’ (Mkpu. 16:14; 19:19-21) N’ihi ya, ọ bụghị naanị alaeze ndị nke ihe oyiyi ahụ nọchiri anya ha ka a ga-ebibi n’Amagedọn, a ga-ebibikwa alaeze niile nke ụwa.
^ par. 15 Mgbe a ga-egwepịacha isi agwọ ahụ bụ mgbe otu puku afọ ahụ ga-agwụ, a tụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ime “ọdọ ọkụ na sọlfọ ahụ.”—Mkpu. 20:7-10; Mat. 25:41.
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 4, 5]
IHE ISE KA GA-EMENỤ:
1 A ga-eti mkpu “Udo na obi iru ala!”
2 Mba dị iche iche ga-ebibi “Babịlọn Ukwu ahụ”
3 A ga-ebuso ndị Jehova agha
4 A ga-alụ agha Amagedọn
5 A ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis