Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Obi Ike Na-edi Nsogbu Ndị E Nwere Taa

Iji Obi Ike Na-edi Nsogbu Ndị E Nwere Taa

Iji Obi Ike Na-edi Nsogbu Ndị E Nwere Taa

“Chineke bụ ebe mgbaba anyị na ike anyị, onye dị njikere inyere anyị aka n’oge nsogbu.”—ỌMA 46:1.

Ị̀ GA-AZALI AJỤJỤ NDỊ A?

Olee otú anyị nwere ike isi mee ka nsogbu ndị bịaara anyị ghara ime ka anyị daa mbà?

Olee ihe ndị kwesịrị ime ka anyị nwee obi ike?

Olee ụfọdụ ụzọ Jehova si enyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị?

1, 2. Olee ụdị nsogbu ọtụtụ ndị nwerela, gịnịkwa ka ndị ohu Chineke chọrọ ime?

ANYỊ bi n’oge nsogbu. Ọdachi dị iche iche akpaala ụwa aka ọjọọ. Ala ọma jijiji, ọkụ ọgbụgba, idei mmiri, ugwu na-agbọ ọkụ, na oké ifufe emesiela ndị mmadụ ike. Nsogbu ezinụlọ na nsogbu ndị ọzọ akpatakwarala ụmụ mmadụ ụjọ na iru uju. Ọ bụ nnọọ eziokwu na “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya” na-abịakwasị anyị niile.​—Ekli. 9:11.

2 Ndị ohu Chineke ediela ụdị nsogbu ndị ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị chọrọ ịdị njikere idi ụdị nsogbu ọ bụla ka ga-abịara anyị ka ọgwụgwụ ajọ ụwa a na-eru nso. Olee otú anyị nwere ike isi die ụdị nsogbu ndị a ma ka na-enwe obi ụtọ? Gịnị ga-enyere anyị aka iji obi ike na-edi nsogbu ndị e nwere taa?

MỤTA IHE N’AKA NDỊ JI OBI IKE DIE NSOGBU

3. Dị ka Ndị Rom 15:4 kwuru, olee ihe nwere ike ịkasi anyị obi mgbe nnukwu nsogbu bịaara anyị?

3 Ọ bụ ezie na ihe na-esikwu ike kwa ụbọchị, ọ bụghị taa ka ụmụ mmadụ hụwara nsogbu. Ka anyị hụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ndị ohu Chineke, bụ́ ndị ji obi ike die nsogbu ndị bịaara ha n’oge ochie.—Rom 15:4.

4. Olee nsogbu ndị Devid diri, gịnịkwa nyeere ya aka?

4 Chegodị banyere Devid. O diri ọtụtụ nsogbu. Dị ka ihe atụ, Eze Sọl chọrọ igbu ya, ndị iro busoro ya agha, dọrọkwa ndị nwunye ya n’agha, ụfọdụ ndị enyi ya na ndị ezinụlọ ya gbara ya mgba okpuru, o nwekwara mgbe obi dara ya mbà. (1 Sam. 18:8, 9; 30:1-5; 2 Sam. 17:1-3; 24:15, 17; Ọma 38:4-8) Ihe Baịbụl kọrọ banyere Devid mere ka anyị ghọta otú ihe ndị a si wute ya. Ma, nsogbu ndị ahụ emeghị ka ọ kwụsị ịtụkwasị Chineke obi. O ji okwukwe siri ike kwuo, sị: “Jehova bụ idé ji ndụ m. Ònye ka m ga-atụ ụjọ?”—Ọma 27:1; gụọ Abụ Ọma 27:5, 10.

5. Gịnị nyeere Ebreham na Sera aka idi ihe isi ike?

5 Ebreham na Sera biri ọtụtụ afọ n’ụlọikwuu. Ha bụ ndị ọbịa n’ebe ha na-amachaghị. Ihe siiri ha ike mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, ha tara ahụhụ n’ihi ụnwụ nri nakwa egwu mba ndị gbara ha gburugburu na-eyi ha. Ma, ha ji obi ike die nsogbu ahụ niile. (Jen. 12:10; 14:14-16) Gịnị nyeere ha aka idi nsogbu a niile? Baịbụl gwara anyị na Ebreham “nọ na-echere obodo ahụ nke nwere ezi ntọala, bụ́ obodo nke ọ bụ Chineke bụ onye wuru ma mee ya.” (Hib. 11:8-10) Ebreham na Sera lekwasịrị anya n’ọdịnihu, ha ekweghịkwa ka ihe isi ike mee ha obi ọjọọ.

6. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Job?

6 Job tara ọtụtụ ahụhụ. Chegodị otú obi dị ya mgbe nsogbu zuru ya ahụ́. (Job 3:3, 11) Nke ka njọ bụ na ọ maghị ihe mere ihe ndị ahụ ji na-eme ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ daghị mbà. O guzosiri ike n’ezi ihe, nweekwa okwukwe na Chineke. (Gụọ Job 27:5.) Anyị kwesịrị iṅomi ya!

7. Gịnị mere Pọl mgbe ọ na-ejere Chineke ozi, ma gịnị nyeere ya aka iji obi ike nọgide n’ozi ya?

7 Cheekwa banyere Pọl onyeozi. Ọ nọrọ ‘n’ihe ize ndụ n’obodo ukwu, n’ala ịkpa, nakwa n’oké osimiri.’ O kwuru banyere ‘agụụ, akpịrị ịkpọ nkụ, oyi, na ịgba ọtọ.’ Pọl kwukwara na e nwere ụfọdụ oge ụgbọ ọ nọ na ya kpuru. N’ihi ya, ọ nọrọ ‘otu ụbọchị n’ogbu mmiri, ehihie na abalị.’ (2 Kọr. 11:23-27) Ọ daghị mbà n’agbanyeghị nsogbu ahụ niile. Mgbe ọ fọrọ obere ka e gbuo ya n’ihi ozi ọ na-ejere Chineke, o kwuru, sị: “Ihe mere anyị ji chee otú a bụ ka anyị ghara ịtụkwasị onwe anyị obi, kama ka anyị tụkwasị Chineke obi, bụ́ onye na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ọ napụtara anyị n’oké ihe dị otú ahụ nke bụ́ ọnwụ, ọ ga-anapụtakwa anyị.” (2 Kọr. 1:8-10) Ọtụtụ ihe ndị ahụ mere Pọl emebeghị ọtụtụ ndị. Ma, obi na-adị ọtụtụ n’ime anyị otú ọ dị ya. N’ihi ya, obi ike o ji die nsogbu ndị ahụ nwere ike ịkasi anyị obi.

EKWELA KA NSOGBU MEE KA Ị DAA MBÀ

8. Olee otú nsogbu ndị e nwere taa nwere ike ime ka obi dị anyị? Nye ihe atụ.

8 N’ụwa taa, ọdachi na ụdị nsogbu ndị ọzọ na-eme ka isi na-agba ọtụtụ ndị ghara ghara. Ụdị ihe ahụ na-emedị ụfọdụ Ndị Kraịst. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Lani, * onye ya na di ya bụ ndị ọsụ ụzọ n’Ọstrelia, kwuru na mgbe a chọpụtara na ya na-arịa kansa ara, obi gbawara ya. O kwuru, sị, “Ọgwụ a na-enye m kpaghasịrị m ahụ́, ya adịkwa m ka abaghịzi m uru.” N’otu mgbe ahụ, ọ nọkwa na-elekọta di ya, bụ́ onye a wara ahụ́ n’ihi ihe mere ya n’ọkpụkpụ azụ. Ụdị ihe ahụ mee anyị, gịnị ka anyị ga-eme?

9, 10. (a) Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ikwe ka Setan mee? (b) Olee otú anyị nwere ike isi die nsogbu ahụ e kwuru okwu ya n’Ọrụ Ndịozi 14:22?

9 Anyị kwesịrị icheta na Setan chọrọ iji nsogbu ndị na-abịara anyị mee ka okwukwe anyị ghara isi ike. Ma, anyị ekwesịghị ikwe ka o si otú ahụ mee ka anyị ghara ịna-enwe ọṅụ. Ilu 24:10 kwuru, sị: “Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ? Ike gị ga-adị ntakịrị.” Ọ bụrụ na anyị atụgharịa uche n’ihe ndị ahụ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl mere, ọ ga-enyere anyị aka inwe obi ike mgbe nsogbu bịaara anyị.

10 Anyị kwesịkwara iburu n’obi na anyị enweghị ike iwepụ nsogbu niile. N’eziokwu, anyị kwesịrị ịtụ anya na nsogbu ga-abịara anyị. (2 Tim. 3:12) Ọrụ Ndịozi 14:22 gwara anyị, sị: “Anyị aghaghị ịbanye n’alaeze Chineke site n’ọtụtụ mkpagbu.” Kama ịda mbà, ọ́ gaghị aka mma ka ị ghọta na i kwesịrị iji ohere ahụ gosi na i nwere okwukwe na Chineke ga-enyere gị aka?

11. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka nsogbu ndị bịaara anyị ghara ime ka anyị daa mbà?

11 Anyị kwesịrị ịna-eche banyere ihe ọma ndị na-emere anyị. Baịbụl gwara anyị, sị: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma, ma a na-enwe ịda mbà na mmụọ n’ihi ihe na-ewute obi.” (Ilu 15:13) O teela ndị dọkịta ghọtara na iche ihe dị mma nwere ike ime ka onye ọrịa gbakee. Ọtụtụ mgbe, ọ bụrụ na e nye onye ọrịa ihe o chere na ọ bụ ọgwụ, ma obi esie ya ike na ọ ga-enyere ya aka, ahụ́ ga na-adị ya mma. Ma, ọ bụrụ na onye ọrịa echee na ọgwụ a na-enye ya na-akpatakwuru ya ọrịa, ọrịa ya ga na-aka njọ. Ihe atụ a gosiri na ọ bụrụ na ihe anyị na-eche mgbe niile bụ nsogbu ndị anyị na-enweghị ike iwepụ, obi ga-ada anyị mbà. Anyị na-ekele Jehova na ọ na-enyere anyị ezigbo aka. Ọ bụrụgodị na nsogbu abịara anyị, ọ ga-eji Okwu ya, ụmụnna anyị, na mmụọ nsọ ya gbaa anyị ume. Ịtụgharị uche n’ihe ndị a ga-eme ka obi dị anyị ụtọ. Kama iche banyere nsogbu ndị bịaara gị, mee ihe i nwere ike ime iji die nsogbu nke ọ bụla ma na-eche banyere ihe ọma ndị na-emere gị.—Ilu 17:22.

12, 13. (a) Olee ihe nyeere ndị ohu Chineke aka idi nsogbu ndị ọdachi kpatara? Nye ihe atụ. (b) Olee otú ọdachi nwere ike isi mee ka anyị mata ihe kacha mkpa ná ndụ?

12 Nnukwu ọdachi akpaala ụfọdụ mba aka ọjọọ n’afọ ndị na-adịbeghị anya. O doro anya na ọtụtụ ụmụnna anyị ndị bi ná mba ndị ahụ ejirila obi ike die nsogbu ndị ahụ. Ma ọ dịrịghị ha mfe. N’ọnwa Febụwarị 2010, nnukwu ala ọma jijiji mere na Chili ma bibie ụlọ ọtụtụ ụmụnna anyị na ngwongwo ha nakwa ihe ha ji akpata ego. N’agbanyeghị nsogbu ahụ, ụmụnna anyị nọsiri ike n’ozi Jehova. Samuel, bụ́ onye ala ọma jijiji ahụ bibiri ụlọ ya kpamkpam, kwuru, sị: “N’agbanyeghị nsogbu ndị ahụ, mụ na nwunye m akwụsịghị ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Obi siri m ike na ihe ndị ahụ so mee ka obi ghara ịda anyị mbà.” Ha na ọtụtụ ndị ọzọ echefuola ọdachi ahụ ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi.

13 Na Septemba 2009, oké mmiri ozuzo mere ka idei mmiri tochie ọtụtụ obodo na Manịla, Filipins. Otu ọgaranya ọtụtụ ihe ya mebiri kwuru, sị, “Idei mmiri ahụ mere ka mmadụ niile hara, mee ka ihe siere ma ọgaranya ma ogbenye ike.” Ihe a na-echetara anyị ezigbo ndụmọdụ Jizọs nyere, nke bụ́: “Na-akpakọbaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe, ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ ihe, ebe ndị ohi na-adịghịkwa awaba zuo ohi.” (Mat. 6:20) Ịtụkwasị akụnụba obi na-akpatakarị nsogbu, n’ihi na akụnụba nwere ike ịla n’iyi na mberede. Ọ́ gaghị akara anyị mma iwere ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa ná ndụ anyị n’ihi na anyị na Jehova ka nwere ike ịbụ enyi n’agbanyeghị ihe mere gburugburu anyị?—Gụọ Ndị Hibru 13:5, 6.

IHE NDỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ INWE OBI IKE

14. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe obi ike?

14 Jizọs kwuru na a ga-enwe nsogbu n’oge ọnụnọ ya, ma o kwuru, sị: “Unu atụla ụjọ.” (Luk 21:9) Anyị kwesịrị inwe obi ike n’ihi na Eze anyị, bụ́ Jizọs Kraịst, na Jehova, bụ́ Onye kere eluigwe na ụwa, na-akwado anyị. Pọl gbara Timoti ume, sị: “Chineke nyere anyị, ọ bụghị mmụọ nke ụjọ, kama nke ike na nke ịhụnanya na nke uche zuru okè.”—2 Tim. 1:7.

15. Olee ụfọdụ ihe ndị ohu Chineke kwuru banyere obi ha tụkwasịrị Chineke? Olee otú anyị nwere ike isi nwee ụdị obi ike ahụ?

15 Baịbụl gwara anyị ụfọdụ ihe ndị ohu Chineke kwuru banyere otú ha si tụkwasị Chineke obi. Devid kwuru, sị: “Jehova bụ ike m na ọta m. Ọ bụ ya ka m tụkwasịrị obi, e nyewokwara m aka, nke mere na obi m na-enwe aṅụrị.” (Ọma 28:7) Pọl kwuru na ya nwere ezigbo obi ike, sị: “N’ihe ndị a niile, anyị na-enwe mmeri n’ụzọ zuru ezu site n’aka onye ahụ nke hụrụ anyị n’anya.” (Rom 8:37) N’otu aka ahụ, mgbe Jizọs ma na a ga-egbu ya n’oge na-adịghị anya, o kwuru ihe mere ka o doo anya na ya na Chineke dị ná mma. Ọ gwara ndịozi ya, sị: “Anọghị m naanị m, n’ihi na Nna m nọnyeere m.” (Jọn 16:32) Gịnị ka ihe ndị ahụ ha kwuru gosiri? O gosiri na onye ọ bụla n’ime ha tụkwasịrị Jehova obi ya niile. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Chineke obi otú ahụ, o nwere ike ime ka obi sie anyị ike idi ụdị nsogbu ọ bụla bịaara anyị.—Gụọ Abụ Ọma 46:1-3.

RITE URU N’OTÚ CHINEKE SI EME KA ANYỊ NWEE OBI IKE

16. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-amụ Okwu Chineke?

16 Inwe obi ike apụtaghị na Onye Kraịst ga-atụkwasị onwe ya obi. Kama nke ahụ, ọ bụ ịma Chineke na ịtụkwasị ya obi ga-eme ka anyị nwee obi ike. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-amụ Okwu ya, bụ́ Baịbụl. Otu nwanna nwaanyị nke dara mbà n’obi kwuru ihe na-enyere ya aka, sị, “Agụrụ m amaokwu Baịbụl ụfọdụ ugboro ugboro, bụ́ ndị kasiri m obi.” Ànyị na-enwe ofufe ezinụlọ kwa izu, dị ka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi kwuru ka anyị na-eme? Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka inwe ụdị echiche ahụ ọbụ abụ nwere. O kwuru, sị: “Lee ka m si hụ iwu gị n’anya! Ọ bụ ihe m na-atụgharị n’uche ogologo ụbọchị dum.”—Ọma 119:97.

17. (a) Olee ihe ga-enyere anyị aka ịtụkwasịkwu Jehovah obi? (b) Olee otú akụkọ ndụ ị gụrụ n’akwụkwọ anyị si nyere gị aka?

17 Anyị nwekwara akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, bụ́ ndị na-enyere anyị aka ịtụkwasịkwu Jehova obi. Dị ka ihe atụ, akụkọ ndụ ndị a na-ebi n’Ụlọ Nche enyerela ọtụtụ ụmụnna aka. E nwere otu nwanna nwaanyị n’Eshia, bụ́ onye ihe na-emetụ n’isi mgbe ụfọdụ. Obi dị ya ụtọ mgbe ọ gụrụ akụkọ ndụ otu nwanna bụ́bu onye ozi ala ọzọ, nke nwere ụdị nsogbu ahụ. O dere, sị, “O nyeere m aka ịghọta ihe na-eme m, meekwa ka m nwee olileanya.”

18. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekpe ekpere mgbe niile?

18 Ekpere nwekwara ike inyere anyị aka n’udị nsogbu ọ bula. Pọl onyeozi gosiri otú ekpere si dị mkpa ma kwuo, sị: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.” (Fil. 4:6, 7) Ànyị na-ekpe ekpere mgbe niile iji nwee ike idi nsogbu ndị na-abịara anyị? Otu nwanna bi na Briten aha ya bụ Alex, bụ́ onye ọrịa mere ka ọ daa mbà n’obi ruo ọtụtụ afọ, kwuru, sị: “Ihe kacha enyere m aka bụ ịgwa Jehova okwu n’ekpere na ịgụ Okwu ya, si otú ahụ na-ege ya ntị.”

19. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ịga ọmụmụ ihe anya?

19 Ọmụmụ ihe bụ ọzọ dị mkpa Jehova ji enyere anyị aka. Ọbụ abụ dere, sị: “Agụụ ogige ụlọ Jehova agụkatala mkpụrụ obi m ike gwụ ya.” (Ọma 84:2) Ọ̀ na-adị anyị otú ahụ? Lani, bụ́ onye anyị kwuru banyere ya ná mmalite, kwuru otú o si ele ịga ọmụmụ ihe anya, sị: “Ịga ọmụmụ ihe dị m ezigbo mkpa. Ama m na ọ bụrụ na m chọrọ ka Jehova nyere m aka, m ga-anọrịrị ebe ahụ.”

20. Olee otú ịga ozi ọma si enyere anyị aka?

20 Ijesi ozi ọma ike na-enyere anyị aka inwe obi ike. (1 Tim. 4:16) Otu nwanna nwaanyị bi n’Ọstrelia, bụ́ onye ọtụtụ nsogbu bịaara, kwuru, sị: “N’oge ahụ, anaghị m achọ ịga ozi ọma, ma otu okenye gwara m ka mụ na ya soro gaa. Agara m. Ọ ga-abụrịrị na Jehova nọ na-enyere m aka; mgbe ọ bụla m gara ozi ọma, obi na-adị m ezigbo ụtọ.” (Ilu 16:20) Ọtụtụ ndị achọpụtala na inyere ndị ọzọ aka inwe okwukwe na Jehova na-eme ka okwukwe nke ha na-esikwu ike. Ime otú ahụ na-eme ka ha chefuo nsogbu nke ha ma lekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa.—Fil. 1:10, 11.

21. Olee obi ike anyị kwesịrị inwe mgbe nsogbu bịaara anyị?

21 Jehova enyela anyị ọtụtụ ihe nwere ike inyere anyị aka iji obi ike na-edi nsogbu ndị na-abịara anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-erite uru n’ihe ndị ahụ, na-atụgharịkwa uche n’otú ndị ohu Chineke si nwee obi ike ma na-eṅomi ha, obi kwesịrị isi anyị ike na anyị nwere ike idi nsogbu ndị na-abịara anyị. N’agbanyeghị na ọtụtụ nsogbu nwere ike ịbịara anyị ka ọgwụgwụ ụwa ochie a na-eru nso, obi kwesịrị ịdị anyị otú ọ dị Pọl, bụ́ onye kwuru, sị: “A na-akwada anyị, ma a dịghị ebibi anyị. . . . Anyị adịghị ada mbà.” (2 Kọr. 4:9, 16) Jehova ga-enyere anyị aka iji obi ike na-edi nsogbu ndị na-abịara anyị.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:17, 18.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 10, 11]

Mgbe nsogbu bịaara gị, kwe ka Jehova nyere gị aka