Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ka Ee Unu Kwuru Bụrụ Ee

Ka Ee Unu Kwuru Bụrụ Ee

Ka Ee Unu Kwuru Bụrụ Ee

“Naanị ka Ee unu kwuru bụrụ Ee, ka Ee e unu kwuru bụrụ Ee e.”—MAT. 5:37.

LEE MA Ị̀ GA-AZALI AJỤJỤ NDỊ A:

Gịnị ka Jizọs kwuru banyere ịṅụ iyi?

Gịnị mere Jizọs ji bụrụ onye anyị kwesịrị iṅomi n’otú o si mezuo ihe o kwuru?

Olee ebe ndị anyị kwesịrị ime ka Ee anyị kwuru bụrụ Ee?

1. Gịnị ka Jizọs kwuru banyere ịṅụ iyi, gịnịkwa mere o ji kwuo ya?

ỌTỤTỤ mgbe, ọ naghị adị mkpa ka ezi Ndị Kraịst ṅụọ iyi. Ọ bụ n’ihi na ha na-erubere Jizọs isi, bụ́ onye kwuru, sị: “Naanị ka Ee unu kwuru bụrụ Ee.” Ihe ahụ o kwuru pụtara na mmadụ kwesịrị imezu ihe ọ bụla o kwuru. Tupu Jizọs enye iwu ahụ, o kwuru, sị: “Aṅụla iyi ma ọlị.” Ihe mere o ji kwuo ya bụ na ọ kwadoghị otú ndị mmadụ si na-aṅụ iyi mgbe ọ bụla ha na-ekwu okwu, n’ebughị n’obi imezu ihe ha kwuru. Ọ bụrụ na mmadụ ekwuo “ihe karịrị” naanị Ee ma ọ bụ Ee e mgbe ọ na-ekwu ihe ọ chọrọ ime, o nwere ike igosi na e kwesịghị ịtụkwasị ya obi, gosikwa na ọ bụ “ajọ onye ahụ” na-achị ya.—Gụọ Matiu 5:33-37.

2. Kọwaa ihe mere na ọ bụghị mgbe niile ka ịṅụ iyi dị njọ.

2 Ihe ahụ Jizọs kwuru ò gosiri na ọ bụ mgbe niile ka ịṅụ iyi dị njọ? Ọ bụghị ihe o bu n’obi. Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, Jehova Chineke na ohu ya Ebreham, bụ́ onye ezi omume, ṅụrụ iyi mgbe ha na-ekwu ihe dị mkpa. Iwu Chineke kwukwara na ndị Izrel ga-aṅụ iyi mgbe a na-edozi okwu ụfọdụ. (Ọpụ. 22:10, 11; Ọnụ Ọgụ. 5:21, 22) N’ihi ya, o nwere ike ịdị mkpa ka Onye Kraịst ṅụọ iyi na ya ga-ekwu eziokwu mgbe ọ na-ekwu okwu n’ụlọikpe. Ma ọ bụkwanụ, mgbe ụfọdụ, Onye Kraịst nwere ike iche na ọ dị mkpa ka ya ṅụọ iyi iji mee ka ndị ọzọ kweta na ya ga-emezu nkwa ya ma ọ bụ na ya na-ekwu eziokwu. N’eziokwu, mgbe nnukwu onye nchụàjà chọrọ ka Jizọs ṅụọ iyi, Jizọs ajụghị, kama ọ gwara Ụlọikpe Sanhedrin eziokwu. (Mat. 26:63, 64) Ọ dịghị mkpa ka Jizọs ṅụọrọ onye ọ bụla iyi. Ma, ọ na-ekwukarị: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu,” iji mee ka o doo ndị ọzọ anya na ihe ọ na-akụzi bụ eziokwu. (Jọn 1:51; 13:16, 20, 21, 38) Ka anyị hụ ihe ọzọ anyị nwere ike ịmụta n’otú Jizọs, Pọl, na ndị ọzọ si mee ka Ee ha kwuru bụrụ Ee.

JIZỌS MERE KA EE O KWURU BỤRỤ EE

3. Olee nkwa Jizọs kwere Chineke n’ekpere, gịnịkwa ka Nna ya nke eluigwe mere mgbe o kpechara ekpere ahụ?

3 “Lee! Abịawo m ime uche gị, Chineke.” (Hib. 10:7) Jizọs kwuru ihe a mgbe ọ na-agwa Chineke na ya ewepụtala onwe ya ime ihe niile e buru n’amụma banyere Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa nakwa na ya ga-ekwe ka Setan ‘merụọ ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.’ (Jen. 3:15) E nwetụbeghị mmadụ ọ bụla kwetara ịrụ ọrụ siri ike otú ahụ. Jehova si n’eluigwe kwuo ihe gosiri na ọ tụkwasịrị Ọkpara ya obi kpamkpam, n’agbanyeghị na ọ gwaghị Jizọs ka ọ ṅụọ iyi na ọ ga-emezu ihe o kwuru.—Luk 3:21, 22.

4. Olee otú Jizọs meruru ka Ee o kwuru bụrụ Ee?

4 Jizọs mere ka Ee ọ bụla o kwuru bụrụ Ee. O si otú ahụ gosi na o mere ihe ọ gwara ndị ọzọ mee. O kweghị ka ihe ọ bụla mee ka ọ ghara ịrụ ọrụ Nna ya nyere ya, nke bụ́ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na ime ka ndị niile Chineke dọtara n’ebe ọ nọ ghọọ ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 6:44) Iji gosi otú Jizọs kwesịruru ntụkwasị obi, Baịbụl kwuru, sị: “N’agbanyeghị ole nkwa Chineke dị, ha abụrụwo Ee site na ya.” (2 Kọr. 1:20) N’eziokwu, Jizọs mere ka Ee o kwuru bụrụ Ee n’ihi na o mezuru nkwa o kwere Nna ya. Ka anyị tụlezie banyere onye gbasiri mbọ ike iṅomi Jizọs.

PỌL MERE KA EE O KWURU BỤRỤ EE

5. Gịnị ka Pọl onyeozi mere nke anyị kwesịrị iṅomi?

5 “Gịnị ka m ga-eme, Onyenwe m?” (Ọrụ 22:10) Ihe a bụ ihe Sọl ji obi ya niile jụọ Onyenwe anyị Jizọs mgbe ọ hụrụ ya n’ọhụụ. Jizọs chọrọ ka Sọl kwụsị ịkpagbu Ndị Kraịst. N’ihi ya, Sọl ji obi umeala chegharịa, e mee ya baptizim, ya ekwetakwa ịrụ ọrụ pụrụ iche e nyere ya, nke bụ́ ikwusara mba dị iche iche ozi ọma banyere Jizọs. Malite mgbe ahụ, Pọl nọgidere na-akpọ Jizọs “Onyenwe” ya, na-emekwa ihe gosiri na Jizọs bụ Onyenwe ya ruo mgbe o jechara ozi ya n’ụwa. (Ọrụ 22:6-16; 2 Kọr. 4:5; 2 Tim. 4:8) Pọl emeghị ka ndị ọzọ Jizọs kwuru banyere ha, sị: “Gịnịzi mere unu ji akpọ m ‘Onyenwe anyị! Onyenwe anyị!’ ma unu adịghị eme ihe ndị m na-ekwu?” (Luk 6:46) N’eziokwu, Jizọs na-atụ anya ka ndị niile na-akpọ ya Onyenwe ha na-emezu ihe ha kwuru, otú ahụ Pọl onyeozi mere.

6, 7. (a) Gịnị mere Pọl ji gbanwee mgbe ọ chọrọ ịgaghachi Kọrịnt, gịnịkwa mere na ndị na-akatọ ya ekwesịghị ikwu na o kwesịghị ntụkwasị obi? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị a họpụtara idu ndú n’etiti anyị anya?

6 Pọl ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’Eshia Maịnọ, banyekwa na Yurop. Ọ malitere ọtụtụ ọgbakọ ma na-eleta ha. Mgbe ụfọdụ, ọ chọpụtara na ọ dị mkpa ka ọ ṅụọ iyi iji gosi na ihe o dere bụ eziokwu. (Gal. 1:20) Mgbe ndị ụfọdụ nọ na Kọrịnt boro Pọl ebubo na o kwesịghị ntụkwasị obi, ọ zaara ọnụ ya, sị: “A pụrụ ịdabere n’ebe Chineke nọ na okwu anyị na-agwa unu abụghị Ee ma bụrụ Ee e.” (2 Kọr. 1:18) Mgbe Pọl na-edegara ha akwụkwọ ahụ, ọ pụọla n’Efesọs, si Masedonia na-aga Kọrịnt. O bubu n’obi ịgaghachi Kọrịnt tupu ya agawa Masedonia. (2 Kọr. 1:15, 16) Ma, mgbe ụfọdụ, mmadụ nwere ike ịgbanwe ihe ọ chọrọ ime. Dị ka ihe atụ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nwere ike ịgbanwe mgbe ha chọrọ ileta ọgbakọ. Ha anaghị agbanwe ya n’ihi ihe na-enweghị isi ma ọ bụ uru nke onwe ha, kama ọ bụ n’ihi ihe dapụtara na mberede. Ihe mere Pọl ji gbutụ oge tupu ya agawa Kọrịnt bụ ka o mee ihe ga-abara ọgbakọ ahụ uru. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

7 Mgbe Pọl mechara atụmatụ ịga Kọrịnt, ọ nụrụ na ndị nọ n’ọgbakọ Kọrịnt adịghị n’otu nakwa na ha gbachiri onye nọ n’ọgbakọ nkịtị ka ọ na-akwa iko. (1 Kọr. 1:11; 5:1) O dere ndụmọdụ kpụ ọkụ n’ọnụ n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọrịnt iji nyere ha aka idozi nsogbu ahụ. Kama isi n’Efesọs banye n’ụgbọ mmiri gawa Kọrịnt ozugbo, Pọl kpebiri inyetụ ụmụnna ya oge ka ha mee ihe ọ dụrụ ha n’ọdụ tupu ya agaa hụ ha, nke ga-eme ka nleta ya gbakwuo ha ume. N’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara ha, ọ gwara ha na ọ bụ ihe mere ya ji gbanwee mgbe ya chọrọ ịbịa leta ha. O kwuru, sị: “Chineke bụ onye akaebe megide mkpụrụ obi m na ọ bụ iji zọọ unu mere na abịabeghị m Kọrịnt.” (2 Kọr. 1:23) Ka anyị ghara ime ka ndị ahụ na-akatọ Pọl; kama, ka anyị na-akwanyere ndị a họpụtara idu ndú n’etiti anyị ùgwù. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị kwesịrị iṅomi Pọl, otú ahụ o ṅomiri Kraịst.—1 Kọr. 11:1; Hib. 13:7.

NDỊ ỌZỌ MERE KA EE HA KWURU BỤRỤ EE

8. Olee àgwà ọma Ribeka kpara nke anyị kwesịrị iṅomi?

8 “Achọrọ m iso ya laa.” (Jen. 24:58) Ihe a bụ ihe Ribeka kwuru mgbe nne ya na nwanne ya nwoke jụrụ ya ma ọ̀ chọrọ ịga bụrụ nwunye Aịzik, bụ́ nwa Ebreham. Ọ pụtara na ọ ga-ahapụ ụlọ ha n’ụbọchị ahụ, soro onye ọ na-amabughị gaa ihe karịrị narị kilomita asatọ. (Jen. 24:50-58) Ee Ribeka kwuru bụ Ee. O mechara bụrụ ezigbo nwunye Aịzik, jirikwa obi ya niile fee Chineke. O biri n’ụlọikwuu ma bụrụ onye ọbịa n’Ala Nkwa ahụ ruo mgbe ọ nwụrụ. Chineke gọziri ya n’ihi otú o si kwesị ntụkwasị obi. Ọ ghọrọ nne ochie Jizọs Kraịst, bụ́ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa.—Hib. 11:9, 13.

9. Olee otú Rut si mezuo ihe o kwuru?

9 “Ee e, anyị ga-eso gị laghachikwuru ndị gị.” (Rut 1:10) Ihe a bụ ihe Rut na Ọpa, bụ́ ụmụ nwaanyị Moab di ha nwụrụ, nọ na-agwa nne di ha Neomi, bụ́kwa nwaanyị di ya nwụrụ, mgbe ọ chọrọ isi n’ala Moab laghachi Betlehem. N’ikpeazụ, mgbe Neomi gwasiri ha ike ka ha lawa, Ọpa laghachiri obodo ha. Ma Ee e Rut kwuru bụ Ee e. (Gụọ Rut 1:16, 17.) O ji obi ya niile sosie Neomi ike, hapụ ezinụlọ ha kpamkpam nakwa okpukpe ụgha ndị Moab na-ekpe. O ji obi ya niile fee Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ. Chineke gọzikwara ya, mee ka o soro n’ụmụ nwaanyị ise a kpọrọ aha ha na Baịbụl, ndị bụ́ nne ochie Kraịst.—Mat. 1:1, 3, 5, 6, 16.

10. Gịnị mere anyị ga-eji ṅomie Aịzaya?

10 “Lee m! Ziga m.” (Aịza. 6:8) Tupu Aịzaya ekwuo ihe ahụ, ọ hụrụ otu ọhụụ dị ebube ebe Jehova nọ n’ocheeze ya dị elu n’ụlọ nsọ Izrel. N’ọhụụ ahụ, Aịzaya nụrụ ka Jehova kwuru, sị: “Ònye ka m ga-eziga, ònye ga-ejekwara anyị?” Jehova ji ajụjụ ahụ na-achọ onye ga-abụ ọnụ na-ekwuru ya, nke ga-aga zie ndị ya bụ́ ndị nnupụisi ozi ya. Aịzaya mezuru ihe o kwuru. Ee o kwuru bụ Ee. Ruo ihe karịrị iri afọ anọ na isii, o ji obi ya niile na-ebu amụma na Chineke ga-ata ndị Izrel na-enupụrụ ya isi ahụhụ nakwa na ọ ga-emecha mee ka ha laghachi n’ebe ọ chọrọ ka ha nọrọ na-efe ya.

11. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-emezu ihe anyị kwuru? (b) Olee ndị na-emeghị ka Ee ha kwuru bụrụ Ee?

11 Gịnị mere Jehova ji mee ka e dee ihe atụ ndị a n’Okwu ya? Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka Ee anyị kwuru bụrụ Ee? Baịbụl kwuru hoo haa na onye “na-emebi nkwekọrịta” so ná ndị “kwesịrị ọnwụ.” (Rom 1:31, 32) Fero Ijipt, Eze Zedekaya nke Juda, na Ananayas na Safaịra so ná ndị Baịbụl gosiri na ha emeghị ka Ee ha kwuru bụrụ Ee. Ihe agazighịrị onye ọ bụla n’ime ha, anyị ekwesịghịkwa iṅomi ha.—Ọpụ. 9:27, 28, 34, 35; Ezik. 17:13-15, 19, 20; Ọrụ 5:1-10.

12. Olee ihe ga-enyere anyị aka ime ka Ee anyị kwuru bụrụ Ee?

12 Ebe anyị bi “n’oge ikpeazụ,” ndị “na-adịghị eguzosi ike n’ihe” na “ndị na-eme ka hà nwere nsọpụrụ Chineke ma na-agọnahụ ike ya” gbara anyị gburugburu. (2 Tim. 3:1-5) Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị na ndị ọjọọ ghara ịna-akpa. Kama nke ahụ, ndị anyị na ha kwesịrị ịna-ezukọ bụ ndị na-agbalịsi ike mgbe niile ime ka Ee ha kwuru bụrụ Ee.—Hib. 10:24, 25.

EE KACHA MKPA I KWURU

13. Olee Ee kacha mkpa onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst na-ekwu?

13 Nkwa kacha mkpa mmadụ nwere ike ikwe bụ nke o kwere n’ụbọchị ọ raara onwe ya nye Chineke. Ugboro atọ, a na-ajụ ndị chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ma hà ji obi ha niile chọọ ime ihe ha kwesịrị ime. (Mat. 16:24) Mgbe ndị okenye abụọ na-agba onye chọrọ ịghọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim ajụjụ ọnụ, ha na-ajụ ya, sị: “Ị̀ chọrọ n’ezie ịbụ Onyeàmà Jehova?” Mgbe onye ahụ mechara nwekwuo ọganihu ma chọọ ka e mee ya baptizim, ya na ndị okenye ga-anọkọ, ha ajụọ ya, sị, “Ì kpeela ekpere, rara onwe gị nye Jehova?” N’ikpeazụ, n’ụbọchị a na-eme ndị mmadụ baptizim, a na-ajụ onye nke ọ bụla, sị, “N’ihi àjà Jizọs Kraịst chụrụ, ì chegharịala, hapụ mmehie gị, rarakwa onwe gị nye Jehova ime uche ya?” N’ihi ya, ndị ọhụrụ a na-anọ n’ihu ndị akaebe zaa Ee, ya bụ, kwe nkwa ife Chineke ruo mgbe ebighị ebi.

14. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịna-ajụ onwe anyị?

14 Ma è mere gị baptizim ọhụrụ ma ì feela Chineke ọtụtụ afọ, i kwesịrị ịna-ajụ onwe gị ajụjụ ndị dị ka: ‘M̀ na-eme ka Ee m kwuru bụrụ Ee otú ahụ Jizọs Kraịst mere? M̀ na-erubere Jizọs isi, na-eme ka ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ bụrụ ọrụ kacha mkpa ná ndụ m?’—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 13:5.

15. Olee ihe ndị dị mkpa anyị kwesịrị ime ka Ee anyị kwuru bụrụ Ee?

15 Imezu nkwa ahụ anyị kwere Chineke mgbe anyị raara onwe anyị nye ya pụtakwara na anyị ga na-ekwu eziokwu n’ihe ndị ọzọ dị mkpa anyị na-eme. Dị ka ihe atụ: Ị̀ lụọla di ma ọ bụ nwunye? Na-eme ihe gosiri na i ji nkwa i kwere di gị ma ọ bụ nwunye gị kpọrọ ihe, ya bụ, ịhụ ya n’anya ma na-elekọta ya. Ị̀ bịanyere aka n’akwụkwọ na ị ga-arụrụ mmadụ ọrụ ma ọ bụ dejupụta akwụkwọ na ị ga-arụ ọrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ ná nzukọ Jehova? Ejila nkwekọrịta ahụ gwurie egwu. Mezuokwa nkwa ahụ i kwere. Onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ọ̀ kpọrọ gị ka ị bịa n’ụlọ ya, gị ekweta ịga? I kwesịrị imezu nkwa gị, ọ bụrụgodị na onye ọzọ nke ka onye ahụ akpọọkwa gị n’otu mgbe ahụ. Ọ bụrụkwa na ị gara ozi ụlọ n’ụlọ hụ onye nwere mmasị ma kwe ya nkwa na ị ga-abịa ọzọ kụziere ya Okwu Chineke, i kwesịrị ime ka Ee i kwuru bụrụ Ee. Jehova ga-agọzi ozi gị.—Gụọ Luk 16:10.

IRITE URU N’AKA NNUKWU ONYE NCHỤÀJÀ ANYỊ NA EZE ANYỊ

16. Ọ bụrụ na anyị emezughị nkwa anyị kwere, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

16 Baịbụl kwuru na ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, “anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro,” karịchaa n’ihe anyị na-eji ire anyị ekwu. (Jems 3:2) Ọ bụrụ na anyị amata na anyị emezughị ihe anyị kwuru, gịnị ka anyị kwesịrị ime? N’Iwu Chineke nyere ndị Izrel, ọ bụrụ na mmadụ ‘ejiri egbugbere ọnụ ya kwuo okwu n’echeghị echiche,’ Chineke nwere ike imere onye ahụ ebere. (Lev. 5:4-7, 11) Chineke nwekwara ike ịgbaghara Onye Kraịst ma ọ bụrụ na o meghị ihe o kwuru ọ ga-eme. Ọ bụrụ na anyị ekwupụtara Jehova mmehie anyị, ọ ga-emere anyị ebere ma gbaghara anyị. Jizọs Kraịst bụ Nnukwu Onye Nchụàjà ga-enyere anyị aka ka anyị na Chineke dịkwa ná mma. (1 Jọn 2:1, 2) Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Chineke na-adị ná mma, anyị kwesịrị igosi na anyị ji obi anyị niile chegharịa. Dị ka ihe atụ, anyị ekwesịghị ịbụ o kwe nkwa eme eme. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike imezi ihe ọ bụla mebirinụ n’ihi nkwa anyị na-emezughị. (Ilu 6:2, 3) N’eziokwu, ọ kacha mma ka anyị buru ụzọ chee echiche nke ọma tupu anyị ekwewe nkwa, ka anyị ghara ikwe nke anyị na-agaghị emezu.—Gụọ Ekliziastis 5:2.

17, 18. N’ọdịnihu, olee ihe ọma na-enweghị atụ nke ga-emere ndị niile na-agbalịsi ike ka Ee ha kwuru bụrụ Ee?

17 Ndị niile na-efe Jehova, bụ́ ndị na-agbalịsi ike ka Ee ha kwuru bụrụ Ee, ga-enwe obi ụtọ na-enweghị atụ n’ọdịnihu! Ndị e tere mmanụ, bụ́ otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ, ga-aga eluigwe, bụ́ ebe ha na-agaghị anwụ anwụ. Ha ga-eso Jizọs bụrụ ndị eze n’Alaeze ya, ‘sorokwa ya chịa otu puku afọ.’ (Mkpu. 20:6) A ga-enwe ọtụtụ nde ndị ga-ebi na Paradaịs n’elu ụwa. N’oge ahụ Kraịst ga na-achị, a ga-enyere ha aka inwe ahụ́ zuru okè na uche zuru okè.—Mkpu. 21:3-5.

18 Mgbe Jizọs ga-achịcha otu puku afọ, a ga-ele ndị mmadụ ule ikpeazụ. Ọ bụ naanị ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ahụ ga-ebi na Paradaịs, bụ́ ebe ha ga na-atụkwasị ihe ndị ọzọ kwuru obi mgbe niile. (Mkpu. 20:7-10) Ee ọ bụla mmadụ kwuru mgbe ahụ ga-abụ Ee, Ee e ọ bụla e kwuru ga-abụkwa Ee e. Ndị niile ga-adị ndụ mgbe ahụ ga na-eṅomi Jehova, bụ́ Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya, bụ́ “Chineke nke eziokwu.”—Ọma 31:5.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 28]

Malite mgbe e mere Jizọs baptizim ruo mgbe ọ nwụrụ, o mezuru nkwa o kwere Nna ya

[Foto dị na peeji nke 30]

Ị̀ na-emezu Ee kacha mkpa i kwuru?