Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ọ Bụ Ozi Kacha Mma A Nụtụrụla’

‘Ọ Bụ Ozi Kacha Mma A Nụtụrụla’

Ihe Si N’ebe Anyị Na-edebe Ihe Ochie

‘Ọ Bụ Ozi Kacha Mma A Nụtụrụla’

E NWERE osisi ndị e kposara n’ebe e debere ihe ndị e ji lụọ agha n’obodo Saskatun nke dị na Saskachewan, Kanada. Mgbe otu nwanna nwoke aha ya bụ George Naish hụrụ na osisi ndị ahụ ruru amaụkwụ iri isii n’ogologo, ọ jụrụ, sị: “Gịnị ka e ji ihe a niile eme?” A gwara ya na e ji osisi ndị ahụ rụọ tọwa na-eme ka e nweta ozi mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ. Nwanna Naish mechara kwuo, sị: “Ọ gbatara m n’obi na anyị nwere ike iji ha rụọ tọwa redio. Otú ahụ ka anyị si malite iche otú anyị ga-esi rụọ ụlọ ọrụ redio anyị ga-eji na-agbasa ozi ọma.” Ka naanị otu afọ gachara, ụlọ ọrụ redio anyị malitere ịgbasa ozi n’afọ 1924. O so n’ụlọ ọrụ redio mbụ e ji gbasaa ozi gbasara okpukpe na Kanada.

Ọ fọrọ obere ka Kanada buruo ibu ka Yurop. N’ihi ya, ọ dị mma iji redio gbasaa ozi ọma n’ebe ahụ. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Florence Johnson, bụ́ onye so rụọ ọrụ n’ụlọ ọrụ redio ahụ, kwuru, sị: “Ozi anyị na-agbasa n’ụlọ ọrụ redio anyị mere ka ọtụtụ ndị nụ eziokwu Baịbụl, ya bụ, ndị anyị na-agaraghị aga zie ozi ọma. Ebe ọ bụ na redio ka pụtara ọhụrụ mgbe ahụ, ndị mmadụ na-achọ ịnụ ihe ọ bụla a na-ekwu na ya.” Tupu afọ 1926 agwụchaa, Ndị Mmụta Baịbụl enweela ụlọ ọrụ redio n’obodo anọ dị na Kanada. * Ọ bụ Ndị Mmụta Baịbụl ka Ndịàmà Jehova na-aza mgbe ahụ.

A sị na ị gbanyere redio gị mgbe a na-agbasa ozi ndị ahụ, gịnị ka ị gaara anụ? Ị gaara anụ abụ ụmụnna ji ngwá egwú bụọ, na okwu ndị si na Baịbụl, na amaokwu Baịbụl ndị a kọwara. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Amy Jones, bụ́ onye na-eso ekwu okwu ndị ahụ na redio, kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ anyị gaa ozi ọma, m kwuo aha m, onye nwe ụlọ asị, ‘Ehee, anụrụ m olu gị na redio.’”

Ndị Mmụta Baịbụl ndị nọ Halifaks dị n’obodo Nova Skoshịa mere ka nke ha pụọ iche. Ha na-anọkọ n’ụlọ ọrụ redio, na-ekwurịta ihe gbasara Baịbụl, gwa ndị mmadụ ka ha jiri telefon kpọọ ha jụọ ha ajụjụ ndị si na Baịbụl. Otu nwanna dere, sị: “Ọtụtụ ndị na-ege ntị nke ọma n’ozi anyị n’oge ahụ. Anyị anaghị azacha ndị niile kpọrọ anyị na telefon n’ihi na ha karịrị akarị.”

Otú ahụ e mere n’oge Pọl onyeozi, ụfọdụ gere Ndị Mmụta Baịbụl ntị, ma ụfọdụ egeghị ntị. (Ọrụ 17:1-5) Ozi ahụ tọrọ ụfọdụ ndị ụtọ. Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwoke aha ya bụ Hector Marshall nụrụ ka Ndị Mmụta Baịbụl kwuru banyere akwụkwọ bụ́ Studies in the Scriptures na redio, ọ tụrụ ọda ha isii. O mechara dee, sị: “Echere m na akwụkwọ ndị ahụ ga-enyere m aka ịna-akụzi ihe na Sọnde skul.” Ma, mgbe Hector gụchara nke mbụ n’akwụkwọ isii ahụ, o kpebiri ịkwụsị ịga chọọchị. O ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, jirikwa obi ya niile na-efe Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 1998. N’ebe ọwụwa anyanwụ Nova Skoshịa, e kwuru otu okwu na redio, nke isiokwu ya bụ “Alaeze Chineke bụ Olileanya Ụwa Niile.” N’echi ya, otu nwoke aha ya bụ J. A. MacDonald gwara otu nwanna, sị: “Ụnyaahụ, ndị bi n’Agwaetiti Kep Bretin nụrụ ozi kacha mma ha nụtụrụla n’ebe a kemgbe ụwa.”

Ma, iwe were ndị ụkọchukwu. Ụfọdụ ndị Katọlik bi na Halifaks kwuru na ha ga-agba ụlọ ọrụ redio ahụ na-agbasara Ndị Mmụta Baịbụl ozi ọkụ. N’afọ 1928, ndị ndú okpukpe mere ka ndị ọchịchị maa ọkwa na ha ga-anapụ Ndị Mmụta Baịbụl ikike ịgbasa ozi n’ụlọ ọrụ redio ha. N’ihi ya, ụmụnna kesara otu obere akwụkwọ ha biri n’asụsụ Bekee, nke isiokwu ya bụ “Ònye Nwe Ikike E Ji Agbasa Ozi?” Ihe e kwuru n’akwụkwọ ahụ gosiri na ihe ahụ ndị ọchịchị mere adịghị mma. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ọchịchị ekweghị enye Ndị Mmụta Baịbụl ikike ịgbasa ozi n’ụlọ ọrụ redio ha.

Ihe ahụ ò mere ka ndị ohu Jehova ole na ole nọ na Kanada daa mbà? Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Isabel Wainwright kwuru, sị: “Na mbụ, o yiri ka ndị iro hà emeriela anyị. Ma, ama m na Jehova agaraghị ekwe ka ha mee ihe ahụ ma a sị na ọ ka chọrọ ka anyị jiri redio na-agbasa ozi ọma. N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na anyị kwesịrị isi n’ụzọ ọzọ ka mma na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke.” Kama iji redio na-ekwusa ozi ọma, Ndị Mmụta Baịbụl nọ na Kanada lekwasịziri anya n’ịga n’ụlọ ndị mmadụ na-ezi ha ozi ọma. Ma, n’oge ahụ ha na-ekwusa ozi ọma na redio, o nyere aka mee ka ndị mmadụ nụ ‘ozi kacha mma a nụtụrụla.’—O si n’ebe anyị na-edebe ihe ochie na Kanada.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ụmụnna ndị nọ na Kanada kwụkwara ụlọ ọrụ redio ndị ọzọ ụgwọ ka ha na-agbasara ha ozi ọma.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 32]

“Anyị anaghị azacha ndị niile kpọrọ anyị na telefon n’ihi na ha karịrị akarị”

[Foto ndị dị na peeji nke 32]

(1) Ụlọ ọrụ redio nke dị n’Edmọntịn, Albeta (2) Ebe otu nwanna na-apị aka n’ígwè n’ụlọ ọrụ redio dị na Toronto, Ọnterio (3) Ebe a na-anọ agbasa ozi n’ụlọ ọrụ redio dị na Saskatun n’obodo Saskachewan