Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Kụziere M Ime Uche Gị”

“Kụziere M Ime Uche Gị”

“Kụziere M Ime Uche Gị”

“Kụziere m ime uche gị, n’ihi na ị bụ Chineke m.”​—ỌMA 143:10.

IHE NDỊ I KWESỊRỊ ICHETA

Gịnị ka Devid mere, nke gosiri na o lere ihe anya otú Jehova si ele ya?

Olee ihe nyeere Devid aka ịmata ihe bụ́ uche Chineke?

Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-eme uche Jehova?

1, 2. Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị na-ele ihe anya otú Chineke si ele ya, gịnịkwa ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Eze Devid mere?

KA E were ya na ị na-aga ebe ị na-agatụbeghị, gị ahụ ebe ụzọ gbara abụọ. Olee nke ị ga-eso? I nwere ike ịjụ onye ma ebe ahụ nke ọma ka o nyere gị aka. Ime otú ahụ nwere ike inyere anyị aka mgbe anyị na-ekpebi ihe ndị dị mkpa. Jehova ma ihe niile. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ajụọ ya, ọ ga-enyere anyị aka ‘ije ije n’ụzọ’ ọ chọrọ ka anyị soro.—Aịza. 30:21.

2 Ọtụtụ mgbe, Eze Devid nke chịrị Izrel n’oge ochie gbalịrị ile ihe anya otú Chineke si ele ya. O si otú ahụ mee uche Chineke. Obi ya niile dịkwa n’ebe Jehova Chineke nọ. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmụta ihe n’ihe Devid mere mgbe ọ nọ ná nnukwu nsogbu.—1 Eze 11:4.

DEVID SỌPỤỤRỤ AHA JEHOVA

3, 4. (a) Gịnị mere Devid ji gaa lụso Golayat ọgụ? (b) Olee otú Devid si were aha Chineke?

3 Chegodị ihe mere mgbe Devid gara ịlụso Golayat, bụ́ dike ndị Filistia, agha. N’oge ahụ, Devid ka na-eto eto. Ma, Golayat bụ dike dị ihe karịrị amaụkwụ itoolu n’ogologo. Gịnị mere obi ji kaa Devid ịga lụso ya ọgụ? (1 Sam. 17:4) Ọ̀ bụ n’ihi na o nwere obi ike? Ka ọ̀ bụ n’ihi na o nwere okwukwe na Chineke? Obi ike na okwukwe nyeere ya aka imeri Golayat. Ma, ihe kacha mkpa nke mere ka ọ gaa lụso dike ahụ ọgụ bụ na ọ sọpụụrụ Jehova na aha ukwu ya. Iwe wekwara ya n’ihi na Golayat kwutọrọ ndị Chineke. Devid jụrụ, sị: “Ònye bụ onye Filistia nke a a na-ebighị úgwù nke na ọ ga-ama ndị agha nke Chineke dị ndụ aka?”—1 Sam. 17:26.

4 Devid gwara Golayat, sị: “I ji mma agha na ube na árọ̀ na-abịa izute m, ma m ji aha Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke nke ndị agha Izrel, onye ị maworo aka, na-abịa izute gị.” (1 Sam. 17:45) Devid tụkwasịrị ezi Chineke obi ma jiri otu nkume gbatuo dike ndị Filistia ahụ. Ọ bụghị naanị n’oge ahụ ka Devid tụkwasịrị Jehova obi ma sọpụrụ aha nsọ ya, kama o mere otú ahụ n’oge ndị ọzọ. N’eziokwu, Devid gbara ndị Izrel ibe ya ume ka ha ‘jiri aha nsọ Jehova na-anya isi.’—Gụọ 1 Ihe E Mere 16:8-10.

5. Olee otú ndị mmadụ si akparị Jehova otú ahụ Golayat mere?

5 Ị̀ na-anya isi na Jehova bụ Chineke gị? (Jere. 9:24) Gịnị ka ị na-eme mgbe ndị agbata obi gị, ndị ọrụ ibe gị, ụmụ akwụkwọ ibe gị ma ọ bụ ndị ikwu gị na-ekwutọ Jehova ma jiri Ndịàmà ya na-eme ihe ọchị? E kwutọwa aha Jehova, ị̀ na-agbachitere ya ma nwee okwukwe na ọ ga-akwado gị? N’eziokwu, e nwere “oge ịgbachi nkịtị,” ma ihere ekwesịghị ịna-eme anyị na anyị bụ Ndịàmà Jehova na ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Ekli. 3:1, 7; Mak 8:38) Anyị kwesịrị ịdị akọ ma jiri ọnụ ọma na-agwa ndị na-adịghị asọpụrụ Jehova na ozi ya okwu. Ma anyị ekwesịghị ime ka ndị Izrel, bụ́ ndị ‘ụjọ jidere, egwu atụọkwa ha nke ukwuu’ mgbe ha nụrụ ihe Golayat na-ekwu. (1 Sam. 17:11) Kama ime otú ahụ, anyị kwesịrị ikwu okwu ozugbo ma gbachitere aha nsọ Jehova Chineke. Anyị chọrọ ịna-enyere ndị mmadụ aka ịmata ụdị onye Jehova Chineke bụ. N’ihi ya, anyị na-eji Baịbụl enyere ha aka ịghọta ihe mere ha ji kwesị ịbịaru Chineke nso.—Jems 4:8.

6. Gịnị bụ ihe kacha Devid mkpa, nke mere o ji gaa lụso Golayat ọgụ? Gịnị kwesịrị ịbụ ihe kacha anyị mkpa?

6 E nwere ihe ọzọ dị mkpa anyị kwesịrị ịmụta n’akụkọ Devid na Golayat. Mgbe Devid gbaruru n’ọgbọ agha, ọ jụrụ, sị: “Gịnị ka a ga-emere onye ọ bụla nke gburu onye Filistia ahụ ma wepụ nkọcha a na-akọcha Izrel?” Ndị agha ahụ gwara ya ihe ha kwuru na mbụ, sị: “Onye ọ bụla nke ga-egbu ya, eze ga-eme ka ọ baa ọgaranya site n’inye ya akụnụba dị ukwuu, ọ ga-akpọnyekwa ya nwa ya nwaanyị.” (1 Sam. 17:25-27) Ma ihe dị Devid mkpa abụghị ihe a ga-enye ya. E nwere ihe ọzọ dị ya ezigbo mkpa. Devid chọrọ inye ezi Chineke otuto. (Gụọ 1 Samuel 17:46, 47.) Gịnị kacha anyịnwa mkpa? Ọ̀ bụ ịkpakọba akụ̀ ma meere onwe anyị aha, meekwa ka a mara anyị amara n’ụwa? N’eziokwu, anyị kwesịrị ime ka Devid, bụ́ onye bụrụ abụ, sị: “Soronụ m too Jehova, ka anyị niile bulie aha ya elu.” (Ọma 34:3) N’ihi ya, ka anyị tụkwasị Chineke obi ma gbalịsie ike ịna-asọpụrụ aha ya karịa ịsọpụrụ aha anyị.—Mat. 6:9.

7. Olee otú anyị ga-esi enwe okwukwe siri ike nke ga-enyere anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma ọ bụrụgodị na ndị mmadụ achọghị ige anyị ntị?

7 Otú Devid si jiri obi ike lụso Golayat ọgụ gosiri na ọ tụkwasịrị Jehova obi ya niile. Mgbe Devid na-eto eto, okwukwe o nwere na Jehova siri ike. Otu ụzọ o si mee ka okwukwe ya sie ike bụ ịtụkwasị Chineke obi mgbe ọ na-azụ atụrụ. (1 Sam. 17:34-37) Anyịnwa kwesịrị inwe okwukwe siri ike iji nọgide n’ozi anyị, karịsịa mgbe anyị na-ezi ndị na-achọghị ige anyị ntị ozi ọma. Otú anyị ga-esi enwe ụdị okwukwe ahụ bụ ịtụkwasị Chineke obi n’ihe niile anyị na-eme kwa ụbọchị. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị nọ n’ụgbọala, anyị nwere ike ịmalite ịgwa ndị nọ anyị n’akụkụ ihe Baịbụl kwuru. Mgbe anyị na-aga ozi ụlọ n’ụlọ, anyị kwesịkwara izi ndị anyị hụrụ n’okporo ụzọ ozi ọma.—Ọrụ 20:20, 21.

DEVID CHEERE JEHOVA

8, 9. Mgbe Eze Sọl na-achụgharị Devid, olee otú Devid si gosi na ọ ghọtara na ọ bụ uche Jehova bụ ihe kacha mkpa?

8 Ihe ọzọ gosiri na Devid tụkwasịrị Jehova obi bụ otú o si lee Sọl, bụ́ eze mbụ chịrị Izrel, anya. Sọl nweere Devid anyaụfụ. Ọ gbalịrị ugboro atọ iji ube tụgide Devid n’ahụ́ ájá. Ma, Devid zeere ya, o kweghị emegwara. O mechara si n’ebe Sọl nọ gbapụ. (1 Sam. 18:7-11; 19:10) Sọl kpọọrọ puku ndị ikom atọ a họrọ ahọ n’Izrel dum, gaa na-achọgharị Devid n’ala ịkpa. (1 Sam. 24:2) Otu ụbọchị, Sọl banyere n’otu ọgba, ma ọ maghị na Devid na ndị ikom ya zoro n’ebe ahụ. Devid gaara egbu eze Sọl n’oge ahụ. A sị ka e kwuwe, Chineke chọrọ ka Devid bụrụ eze ga-anọchi Sọl. (1 Sam. 16:1, 13) N’eziokwu, ọ bụrụ na Devid gere ndị ikom ya ntị, ọ gaara egbu Eze Sọl. Ma, Devid kwuru, sị: “Tụfịakwa! Dị ka Jehova si ele ihe anya, agaghị m eme onyenwe m ihe a, bụ́ onye Jehova tere mmanụ.” (Gụọ 1 Samuel 24:4-7.) Sọl ka bụ eze Chineke tere mmanụ. Devid achọghị ịnara Sọl ọchịchị ebe ọ bụ na Jehova hapụrụ Sọl ka ọ ka na-achị. Naanị ihe Devid mere bụ ibekara ala ala uwe elu Sọl, nke gosiri na ọ chọghị igbu ya.—1 Sam. 24:11.

9 Mgbe ikpeazụ Devid hụrụ Sọl, ọ kwanyeere ya ùgwù n’ihi na Sọl ka bụ “onye Jehova tere mmanụ.” N’oge ahụ, Devid na Abishaị rutere ebe Sọl mara ụlọikwuu, hụ na Sọl na-ehi ụra. Abishaị gwara Devid na Chineke enyefeela onye iro ya n’aka ya, gwakwa Devid ka ọ hapụ ya ka ya jiri ube magide ya n’ala. Ma, Devid ekweghị. (1 Sam. 26:8-11) Ebe ọ bụ na Devid kwere ka Chineke na-edu ya, o kpebisiri ike ime uche Jehova n’agbanyeghị ihe Abishaị gwara ya mee.

10. Olee nsogbu nwere ike ịbịara anyị, oleekwa ihe ga-enyere anyị aka ime uche Jehova?

10 Nsogbu nke nwere ike ịbịara anyị mgbe ụfọdụ bụ na ndị ọzọ nwere ike ịchọ ka anyị mee ihe ha chere kacha mma kama ịkwado anyị ka anyị mee uche Jehova. Ụfọdụ nwedịrị ike ime ka Abishaị, gwa anyị mee ihe ụfọdụ n’echebaraghị ihe bụ́ uche Chineke echiche. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime uche Jehova, anyị ga-echeta nke ọma otú o si ele ihe ahụ anya, kpebisiekwa ike ime ya.

11. Gịnị ka ị mụtara n’otú Devid si gosi na ime uche Chineke bụ ihe kacha mkpa?

11 Devid kpere ekpere, rịọ Jehova Chineke, sị: “Kụziere m ime uche gị.” (Gụọ Abụ Ọma 143:5, 8, 10.) Devid chọsiri ike ka Chineke kụziere ya ihe kama ime uche nke ya ma ọ bụ ime ihe onye ọzọ gwara ya. Ọ ‘tụgharịrị uche n’ọrụ Jehova, jirikwa obi ya dum na-echebara ọrụ aka Chineke echiche.’ Anyị nwekwara ike ịmata ihe bụ́ uche Chineke ma ọ bụrụ na anyị na-amụ Okwu Chineke nke ọma ma na-atụgharị uche n’otú Jehova si duzie ndị mmadụ n’oge gara aga.

DEVID GHỌTARA IHE MERE CHINEKE JI NYE IWU

12, 13. Gịnị mere Devid ji wụpụ mmiri ndị ikom atọ ahụ setaara ya n’ala?

12 E nwere ihe ọzọ anyị nwere ike ịmụta n’ihe Devid mere. Devid ghọtara ihe mere Chineke ji nye Iwu, chọsiekwa ike irubere ya isi. Chegodị ihe mere mgbe Devid kwuru na ya chọrọ ịṅụ “mmiri si n’olulu mmiri Betlehem.” N’oge ahụ, ndị Filistia mara ụlọikwuu na Betlehem. Mmadụ atọ bụ́ ndị ikom Devid siri ọnwụ banye n’obodo ahụ, setara Devid mmiri n’olulu mmiri ahụ. Ma, “Devid ekweghị ịṅụ ya, kama ọ wụpụụrụ ya Jehova.” N’ihi gịnị? Devid kwuru, sị: “Tụfịakwa! Dị ka Chineke m si ele ihe anya, agaghị m eme ihe a. Ọ̀ bụ ọbara ndị ikom a, bụ́ ndị tinyere mkpụrụ obi ha n’ihe ize ndụ, ka m ga-aṅụ? N’ihi na ha tinyere mkpụrụ obi ha n’ihe ize ndụ wee bute ya.”—1 Ihe 11:15-19.

13 Devid ma na Iwu Chineke kwuru na e kwesịghị iri ọbara, kama na e kwesịrị ịwụpụrụ ya Jehova. Ọ ghọtakwara ihe mere e ji kwesị ime otú ahụ. Devid ma na “mkpụrụ obi nke anụ ahụ́ dị n’ọbara ya.” Ma, ihe ha setara bụ mmiri, ọ bụghị ọbara. Gịnị mere Devid ji jụ ịṅụ mmiri ahụ? Ọ ghọtara ihe mere Chineke ji nye iwu ahụ gbasara ọbara, ghọtakwa na Jehova weere ọbara ka ihe bara ezigbo uru. Ebe ọ bụ na e nwere ike igbu ndị ikom atọ ahụ mgbe ha gara iseta mmiri ahụ, Devid kpebiri na ịṅụ mmiri ahụ ga-egosi na o nweghị ihe o ji ọbara ha kpọrọ. Kama ịṅụ mmiri ahụ, o kpebiri ịwụpụ ya n’ala.—Lev. 17:11; Diut. 12:23, 24.

14. Gịnị nyeere Devid aka ile ihe anya otú Jehova si ele ya?

14 Devid gbalịrị irubere Iwu Chineke isi mgbe niile. Ọ bụrụ abụ, sị: “Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ, iwu gị dịkwa n’ime obi m.” (Ọma 40:8) Devid mụrụ iwu Chineke ma tụgharịa uche nke ọma na ya. Obi siri ya ike na ọ ga-erite uru ma o rubere iwu Jehova isi. N’ihi ya, ihe dị Devid mkpa abụghị naanị irubere Iwu Mozis isi, kama ọ bụ ime ihe mere Chineke ji nye iwu ndị ahụ. Mgbe anyị na-amụ Baịbụl, anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche n’ihe anyị na-agụ, burukwa ya n’obi ka anyị nwee ike ikpebisi ike ịna-eme ihe Jehova chọrọ kwa ụbọchị.

15. Olee otú Sọlọmọn si leghara Iwu Chineke anya?

15 Jehova gọziri nwa Devid, bụ́ Sọlọmọn, nke ukwuu. Ma, Sọlọmọn mechara leghara Iwu Chineke anya. O rubeghị isi n’iwu Jehova nyere, ya bụ, ka ndị eze Izrel ghara ‘ịlụ ọtụtụ ndị inyom.’ (Diut. 17:17) N’eziokwu, Sọlọmọn lụrụ ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị mba ọzọ. Mgbe o mere agadi, “ndị nwunye ya mere ka obi ya chigharịa soro chi ọzọ dị iche iche.” Ihe ọ sọkwara ya bụrụ ihe mere Sọlọmọn ji mee otú ahụ, ọ malitere “ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, o soghịkwa Jehova n’ụzọ zuru ezu dị ka Devid bụ́ nna ya soro.” (1 Eze 11:1-6) Anyị kwesịrị ịna-erubere iwu Chineke na ụkpụrụ ya ndị dị na Baịbụl isi! Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ime otú ahụ mgbe anyị na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye.

16. Gịnị ka ndị chọrọ ịlụ di ma ọ bu nwunye ga-eme ma ọ bụrụ na ha ghọtara ihe mere Jehova ji nye iwu ka ha lụọ “naanị n’ime Onyenwe anyị”?

16 Ọ bụrụ na onye na-anaghị efe Jehova emee ihe gosiri na ọ chọrọ ka anyị na ya lụọ, gịnị ka anyị ga-eme? Ànyị ga-eme ka Devid, ka ànyị ga-eme ka Sọlọmọn? A gwara ezi Ndị Kraịst ka ha lụọ “naanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Kọr. 7:39) Ọ bụrụ na Onye Kraịst ekpebie ịlụ di ma ọ bụ nwunye, o kwesịrị ịlụ Onye Kraịst ibe ya. Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe mere Jehova ji nye iwu ahụ, ọ bụghị naanị na anyị agaghị alụ onye na-abụghị Onye Kraịst, anyị agaghịkwa ekwe ka onye na-abụghị Onye Kraịst kpawa anyị nso.

17. Gịnị ga-enyere anyị aka izere ile ndị gba ọtọ?

17 Devid gbalịsiri ike ime ihe Chineke kwuru. Chegodị otú ihe ahụ o mere nwere ike isi nyere anyị aka izere ile ndị gba ọtọ. Gụọ amaokwu ndị a e dere ebe a, chee ihe mere Chineke ji nye iwu ndị ahụ, gbalịakwa ịghọta otú Jehova si ele okwu a anya. (Gụọ Abụ Ọma 119:37; Matiu 5:28, 29; Ndị Kọlọsi 3:5.) Ịtụgharị uche n’iwu Jehova ga-enyere anyị aka izere ile ndị gba ọtọ.

BURU UCHE CHINEKE N’OBI MGBE NIILE

18, 19. (a) N’agbanyeghị na Devid ezughị okè, gịnị nyeere ya aka ime uche Chineke? (b) Gịnị ka i kpebiri ime?

18 N’agbanyeghị na Devid mere ezi ihe ọtụtụ mgbe, o nwekwara mgbe o mere mmehie ndị dị oké njọ. (2 Sam. 11:2-4, 14, 15, 22-27; 1 Ihe 21:1, 7) Ma, Devid chegharịrị mgbe ọ bụla o mehiere. O ji obi ya niile jeere Chineke ozi. (1 Eze 9:4) Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na Devid gbalịrị ime uche Jehova.

19 N’agbanyeghị na anyị ezughị okè, anyị nwere ike ime uche Jehova. Anyị kwesịrị ịna-amụ Baịbụl, na-atụgharị uche n’ihe anyị mụtara ma na-eme ya ozugbo. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-adị ka ọbụ abụ ahụ, bụ́ onye rịọrọ Jehova, sị: “Kụziere m ime uche gị.”

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 5]

Gịnị mere na Devid egbughị Sọl mgbe o nwere ohere igbu ya?

[Foto dị na peeji nke 6]

Mgbe ndị ikom Devid setaara ya mmiri, o kweghị aṅụ ya. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ o mere?