Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:

Olee otú anyị nwere ike isi kwụsị ikwu okwu n’echeghị echiche?

Anyị kwesịrị inyocha obi anyị. Kama ịkatọ nwanna, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ihe mere anyị ji chọọ ịkatọ ya. Ọ̀ bụ n’ihi na anyị chọrọ igosi na anyị ka onye ọ bụla mma? Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, ịkatọ ndị ọzọ nwere ike ime ka nsogbu ka njọ.—8/15, peeji nke 21.

Olee otú Iwu Chineke si gosi otú o si ele ụmụ nwaanyị anya?

E nwere ọtụtụ ihe ụmụ nwaanyị ndị Izrel nweere onwe ha ime. Ha so ná ndị a na-akụziri iwu Chineke. A na-akwanyere ha ùgwù, a naghịkwa anapụ ha ihe ruuru ha.—9/1, peeji nke 5-7.

Olee ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, bụ́ ihe ndị gbasara ụbọchị Jehova?

A ga-eti mkpu “Udo na obi iru ala!” Mba dị iche iche ga-alụso Babịlọn Ukwu ahụ ọgụ, bibiekwa ya. A ga-ebusokwa ndị Chineke agha. A ga-alụkwa agha Amagedọn. E mechaa, a ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis.—9/15, peeji nke 4.

Olee uru ndị anyị na-erite n’ihi na anyị amaghị mgbe ọgwụgwụ ga-abịa?

Anyị ga-enwe ike igosi ihe dị anyị n’obi n’ihi na anyị amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọ ga-abụ. Ọ na-enye anyị ohere ime ka obi Chineke ṅụrịa. Ọ na-agba anyị ume iji ndụ anyị niile na-ejere Chineke ozi, meekwa ka anyị na-atụkwasịkwu ya obi ma na-erubere Okwu ya isi. Ọ na-emekwa ka okwukwe anyị sikwuo ike n’ihi na anyị na-edi ihe isi ike ndị na-abịara anyị.—9/15, peeji nke 24-25.

Olee otú anyị nwere ike isi jiri Jenesis 3:19 mee ka onye kweere n’ọkụ ala mmụọ tụgharịa uche?

Amaokwu ahụ kwuru na Adam nwụọ, ọ ga-alaghachi n’ájá, o kwughị na ọ ga-aga ọkụ ala mmụọ.—10/1, peeji nke 13.

Ole ndị ka “kpakpando asaa” ahụ Jizọs chị n’aka nri ya ná Mkpughe 1:16, 20 nọchiri anya ha?

“Kpakpando” ndị ahụ nọchiri anya ndị okenye e tere mmanụ. Ma ihe e kwuru ebe ahụ gbasakwara ndị okenye niile e nwere n’ọgbakọ taa.—10/15, peeji nke 14.

Gịnị ka di na nwunye nwere ike ime ma ọ bụrụ na ha echee na ha agaghị akwụchali ụgwọ ha ji?

Di na nwunye kwesịrị ikwurịta okwu banyere ụgwọ ha ji. Ọ ga-abara ha uru ma ọ bụrụ na ha achọpụta ego ole ha na-emefu. Hà nwere ike ịna-akpatakwu ego ma ọ bụ selata aka n’ego ha na-emefu? Ha kwesịrị ikpebi ụgwọ ndị ha ga-ebu ụzọ akwụ. Ha nwere ike ịgakwuru ndị ha ji ụgwọ ka ha na ha kwurịta ihe ọzọ ha ga-eme. Ma, ha ekwesịghị ịtụ anya ihe ha na-agaghị emeli. Ha ekwesịghịkwa ikwe ka ego na-atụrụ ha ụka. (1 Tim. 6:8)—11/1, peeji nke 19-21.

Olee otú Jizọs si gosi na ya dị obi umeala dị ka e buru n’amụma n’Aịzaya 50:4, 5?

Amaokwu ndị ahụ kwuru na onye nwere “ire nke ndị a kụziiri ihe” anaghị ‘atụgharị gawa n’ebe ọzọ.’ Jizọs dị umeala n’obi ma gee ntị nke ọma n’ihe Nna ya kụziiri ya. Ọ chọsiri ike ịmụta ihe n’aka Jehova, leruokwa anya n’otú Chineke si jiri obi umeala na-emere ụmụ mmadụ na-ezughị okè ebere!—11/15, peeji nke 11.

Olee otú stampụ ndị Estonia si gosi na Ndịàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi?

N’afọ 2007, ụlọ ọrụ na-ezipụ akwụkwọ ozi ná mba Estonia wepụtara stampụ ọhụrụ a ga-eji na-echeta ọtụtụ ndị Estonia e gburu n’oge Stalin na-achị. Nọmba e dere na ya bụ 382, nke bụ́ Ndịàmà Jehova ole a chụpụrụ n’Estonia n’afọ 1951, ha na ụmụ ha, ma buga ha n’ebe dị n’ime ime Rọshịa, bụ́ ebe a tara ha ahụhụ.—12/1, peeji nke 27-28.