Ị Bụ Onye A Tụkwasịrị Obi Nke Na-elekọta Ụlọ!
Ị Bụ Onye A Tụkwasịrị Obi Nke Na-elekọta Ụlọ!
‘Ọ bụghị unu nwe onwe unu.’—1 KỌR. 6:19.
GỊNỊ KA Ị GA-AZA?
Gịnị ka ndị na-elekọta ụlọ na-arụ n’oge ochie?
Olee ọrụ ndị niile bụ́ ndị ohu Chineke na-arụ?
Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ọrụ Chineke nyere anyị anya?
1. E kwute okwu ịgba ohu, gịnị na-abata ndị mmadụ n’obi?
IHE dị ka puku afọ abụọ na narị ise gara aga, otu onye Grik na-ede akwụkwọ kwuru na e nweghị onye chọrọ ịbụ ohu. Ọtụtụ ndị taa kwetara ihe ahụ o kwuru. E kwute okwu ịgba ohu, ihe na-abata ndị mmadụ n’obi bụ ndị e kere agbụ, ndị a na-emegbu emegbu na ndị a manyere ịrụ ọrụ ga-abara naanị ndị nwe ha uru.
2, 3. (a) Olee otú Jizọs si emeso ndị ohu ya, bụ́ ndị na-arụrụ ya ọrụ? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle banyere ọrụ Chineke nyere anyị?
2 Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-abụ ndị ohu dị umeala n’obi. N’agbanyeghị na ezi Ndị Kraịst bụ ndị ohu, Jizọs anaghị emegbu ha emegbu. Ọ tụkwasịrị ha obi, na-akwanyekwara ha ùgwù. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe Jizọs kwuru banyere otu “ohu.” Mgbe ọ fọrọ obere ka e gbuo Kraịst, o kwuru na ya ga-enye “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ọrụ.—Mat. 24:45-47.
3 N’ihe Luk dere, nke yiri ihe ahụ Matiu dere, a kpọrọ ohu ahụ ‘onye na-elekọta ụlọ.’ (Gụọ Luk 12:42-44.) Ọtụtụ ezi Ndị Kraịst taa esoghị ná ndị ahụ Jizọs kpọrọ ‘onye na-elekọta ụlọ, bụ́ onye kwesịrị ntụkwasị obi.’ Ma, ihe Baịbụl kwuru gosiri na e nwere ike ikwu na ndị ohu Chineke niile bụ ndị na-elekọta ụlọ. Olee ọrụ anyị na-arụ n’ozi Chineke? Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ya anya? Iji zaa ajụjụ ndị a, ka anyị tụlee ihe onye na-elekọta ụlọ na-arụ n’oge ochie.
ỌRỤ ONYE NA-ELEKỌTA ỤLỌ
4, 5. Gịnị bụ ọrụ ndị na-elekọta ụlọ n’oge ochie? Nye ihe atụ.
4 N’oge ochie, ọ na-abụkarị ohu nna ya ukwu tụkwasịrị obi ka ọ na-eme onye na-elekọta ụlọ ya na ọrụ ya. Ọ bụ ohu ahụ na-elekọta ihe niile nna ya ukwu nwere, ma ụlọ ya ma ego ya ma ndị ohu ibe ya. Jen. 13:2; 15:2; 24:2-4.
Ihe Baịbụl kwuru banyere Elịiza mere ka ihe a doo anya. Ọ bụ ya na-elekọta ihe niile Ebreham nwere. O nwere ike ịbụ ya ka Ebreham zigara Mesopotemia ka ọ gaa chọtara Aịzik nwaanyị. Ọrụ ahụ e nyere ya bụ nnukwu ọrụ!—5 Nwa nwa Ebreham, bụ́ Josef, bụ onye na-elekọta ụlọ Pọtịfa. (Jen. 39:1, 2) Baịbụl kwuru na Josef mechara nwee onye na-elekọtara ya ụlọ, a kpọkwara ya “nwoke ahụ na-elekọta ụlọ Josef.” Ọ bụ onye ahụ na-elekọta ụlọ Josef nabatara ụmụnne Josef iri ma lee ha ọbịa. Ọ rụrụ ọrụ dị mkpa mgbe Josef ji iko ọlaọcha ya lee ụmụnne ya ule. N’eziokwu, a tụkwasịrị ụdị ohu ahụ obi.—Jen. 43:19-25; 44:1-12.
6. Gịnị ka ndị okenye dị iche iche na-arụ?
6 Ka ọtụtụ narị afọ gachara, Pọl onyeozi dere na ndị okenye ọgbakọ bụ ‘ndị na-elekọta ezinụlọ Chineke.’ (Taị. 1:7) Ebe e nyere ndị okenye ọrụ ịzụ “ìgwè atụrụ Chineke,” ọ bụ ha na-elekọta ọgbakọ. (1 Pita 5:1, 2) N’eziokwu, ihe ndị okenye na-arụ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị okenye taa na-elekọta otu ọgbakọ. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-elekọta ọtụtụ ọgbakọ. Ndị so na Kọmitii Alaka na-elekọta ọgbakọ niile dị ná mba. Ma, ndị okenye niile kwesịrị ịna-arụ ọrụ ha nke ọma. Ha niile ‘ga-aza Chineke ajụjụ.’—Hib. 13:17.
7. Olee otú anyị si mata na e nwere ike ikwu na Ndị Kraịst niile bụ ndị na-elekọta ụlọ?
7 Olee otú anyị si mara na Ndị Kraịst ndị ọzọ na-abụghị ndị okenye so ná ndị na-elekọta ụlọ? Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst niile akwụkwọ ozi, sị: “Dị ka onye ọ bụla natara onyinye, jirinụ ya na-ejere ibe unu ozi dị ka ezi ndị nlekọta ụlọ n’ihe banyere obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ, nke a na-egosi n’ụzọ dị iche iche.” (1 Pita 1:1; 4:10) Chineke meere anyị obiọma ma nye anyị niile onyinye, ike, na nkà ndị anyị nwere ike iji nyere ụmụnna anyị aka. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ndị niile na-efe Chineke bụ ndị na-elekọta ụlọ. Ọ tụkwasịrị anyị obi, na-akwanyere anyị ùgwù, na-atụkwa anya na anyị ga-eji ihe o nyere anyị na-eme ihe bara uru.
Ọ BỤ CHINEKE NWE ANYỊ
8. Gịnị bụ ihe dị mkpa anyị kwesịrị icheta?
8 Anyị ga-atụlezi ihe atọ dị mkpa anyị kwesịrị ichebara echiche ebe ọ bụ na anyị bụ ndị na-elekọta ụlọ. Nke mbụ: Ọ bụ Chineke nwe anyị niile, anyị ga-azakwa ya ajụjụ. Pọl dere, sị: ‘Ọ bụghị unu nwe onwe unu, n’ihi na e ji ihe dị oké ọnụ ahịa zụta unu,’ ya bụ, ọbara Kraịst ji chụọ àjà. (1 Kọr. 6:19, 20) Ebe ọ bụ Jehova nwe anyị, anyị kwesịrị ịna-erubere iwu ya isi. Iwu ya adịghị arọ. (Rom 14:8; 1 Jọn 5:3) Anyị bụkwa ndị ohu Kraịst. Dị ka ndị na-elekọta ụlọ n’oge ochie, anyị nweere onwe anyị, ma ọ pụtaghị na anyị ga na-eme otú masịrị anyị. Anyị kwesịrị irube isi n’ihe ọ bụla a gwara anyị. N’agbanyeghị ihe ùgwù ọ bụla anyị nwere, anyị ka bụ ndị ohu Chineke na Kraịst.
9. Olee otú Jizọs si kọwaa ihe nna ukwu chọrọ ka ohu ya na-eme?
9 Ihe Jizọs kwuru ga-enyere anyị aka ịghọta ihe nna ukwu chọrọ ka ohu ya na-eme. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya banyere ohu nke lọtara mgbe ọ rụchara ọrụ n’ubi si n’ụtụtụ ruo n’abalị. Nna ya ukwu ọ̀ sịrị ya: “Bịa ebe a ozugbo, nọdụ ala rie ihe na tebụl”? Mbanụ. Ọ gwara ohu ya, sị: “Kwadebere m ihe ka m rie nri anyasị m, yirikwa uwe eprọn jeere m ozi ruo mgbe m richara ihe oriri ma ṅụchaa ihe ọṅụṅụ, e mesịakwa, i nwere ike iri ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ.” Gịnị ka Jizọs ji ihe a o kwuru na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya? Ọ gwara ha, sị: “Ya mere, unu onwe unu, mgbe unu mere ihe niile e kenyere unu, sịnụ, ‘Anyị bụ ndị ohu na-abaghị uru ọ bụla. Luk 17:7-10.
Ihe anyị mere bụ ihe anyị kwesịrị ime.’”—10. Gịnị gosiri na Jehova ji mbọ anyị na-agba ife ya kpọrọ ihe?
10 N’eziokwu, Jehova ji mbọ ọ bụla anyị na-agba ife ya kpọrọ ihe. Baịbụl gbara anyị ume, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.” (Hib. 6:10) Ihe ọ bụla Jehova gwara anyị mee bụ ihe anyị ga-emeli na ihe ga-abara anyị uru, ọ bụghịkwa ibu arọ. Ma, dị ka Jizọs kwuru, ohu anaghị eme ihe masịrị ya. Ọ na-ebu ụzọ eme ihe nna ya ukwu chọrọ. N’ihi ya, mgbe anyị raara onwe anyị nye Chineke, anyị kpebiri ibu ụzọ na-eme ihe dị ya mma. Ọ̀ bụ na i kwetaghị?
IHE JEHOVA CHỌRỌ KA ANYỊ NIILE MEE
11, 12. Olee ụdị àgwà anyị kwesịrị ịna-akpa? Oleekwa àgwà ndị anyị kwesịrị izere?
11 Ihe nke abụọ anyị kwesịrị icheta bụ: Ebe anyị niile bụ ndị na-elekọta ụlọ, ọ bụ otu iwu ka anyị niile na-erubere isi. Ọ bụ eziokwu na n’ọgbakọ, e nwere ndị na-arụ ụfọdụ ọrụ ndị ọzọ na-adịghị arụ. Ma, ọtụtụ n’ime ihe Chineke chọrọ ka anyị mee bụ otu ihe. Dị ka ihe atụ, ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, bụrụkwa ndị na-eso ụzọ Kraịst, e nyere anyị niile iwu ka anyị hụ ibe anyị n’anya. Jizọs kwuru na ọ bụ ịhụnanya ka e ji ama ezi Ndị Kraịst. (Jọn 13:35) Ma, ọ bụghị naanị ụmụnna anyị ka anyị hụrụ n’anya. Anyị na-agbalị ịhụkwa ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova n’anya. Ọ bụ ihe anyị niile ga-emeli. Anyị kwesịkwara ime ya.
12 Chineke chọrọ ka anyị na-akpa àgwà ọma, na-ezerekwa omume ndị Baịbụl kwuru na ha adịghị mma. Pọl dere, sị: “Ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ma ọ bụ ndị ikom ndị na-ekwe ka ndị ikom dinaa ha, ma ọ bụ ndị ikom na-edina ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị aṅụrụma, ma ọ bụ ndị na-ekwujọ mmadụ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Kọr. 6:9, 10) N’eziokwu, ọ naghị adịcha mfe ime ihe dị mma n’anya Chineke. Ma, anyị na-erite ọtụtụ uru ma anyị mee ihe dị Chineke mma. Dị ka ihe atụ, otú anyị si ebi ndụ anaghị akpatara anyị ọrịa, anyị na ndị ọzọ na-adị n’udo, anyị na Chineke na-adịkwa ná mma.—Gụọ Aịzaya 48:17, 18.
13, 14. Olee ọrụ e nyere Ndị Kraịst niile, oleekwa otú anyị kwesịrị isi na-ele ya anya?
13 Chetakwa na onye na-elekọta ụlọ nwere ọrụ ọ na-arụ. Anyị nwekwara ọrụ anyị na-arụ. Chineke nyere anyị ihe bara ezigbo uru, ya bụ, eziokwu ọ kụziiri anyị. Ọ chọrọ ka anyị na-agwa ndị ọzọ banyere ya. (Mat. 28:19, 20) Pọl dere, sị: “Ka mmadụ were anyị dị ka ndị nọ n’okpuru Kraịst na ndị na-elekọta ihe nzuzo dị nsọ nke Chineke.” (1 Kọr. 4:1) Pọl ghọtara na ọrụ ya bụ ilekọta “ihe nzuzo dị nsọ,” ya bụ, eziokwu dị na Baịbụl, nakwa ịkụziri ya ndị ọzọ. Ọ bụ ihe nna ya ukwu, bụ́ Jizọs Kraịst, chọrọ ka ọ na-eme.—1 Kọr. 9:16.
14 Izi ndị ọzọ ozi ọma gosiri na anyị hụrụ ha n’anya. N’eziokwu, ọnọdụ Ndị Kraịst niile dị iche iche. N’ihi ya, awa ole anyị ji eje ozi ọma nwere ike ọ gaghị aha ka nke ụmụnna ndị ọzọ. Jehova ghọtakwara ya otú ahụ. Ihe kacha mkpa bụ ka anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime. Anyị ga-esi otú ahụ gosi na anyị hụrụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya n’eziokwu.
IHE MERE IKWESỊ NTỤKWASỊ OBI JI DỊ MKPA
15-17. (a) Gịnị mere onye na-elekọta ụlọ kwesịrị iji kwesị ntụkwasị obi? (b) Olee ihe atụ Jizọs ji gosi na ekwesịghị ntụkwasị obi na-akpata nsogbu?
15 Ihe nke atọ anyị kwesịrị icheta bụ: Anyị kwesịrị ikwesị ntụkwasị obi 1 Kọr. 4:2.
ma na-erube isi. Onye na-elekọta ụlọ nwere ike inwe ezigbo nkà na amamihe. Ma ihe ndị ahụ agaghị aba uru ma ọ bụrụ na ọ naghị arụ ọrụ nna ya ukwu nyere ya ma ọ bụ na-agba ya mgba okpuru. Onye na-elekọta ụlọ ga-ekwesị ntụkwasị obi ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịrụ ọrụ ya nke ọma, meekwa nna ya ukwu obi ụtọ. Cheta na Pọl dere, sị: “Ihe a na-achọkwa n’aka ndị na-elekọta ụlọ bụ ka ha bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.”—16 O doro anya na Chineke ga-agọzi anyị ma anyị kwesị ntụkwasị obi. Ma ọ bụrụ na anyị ekwesịghị ntụkwasị obi, anyị na Chineke agaghịzi adị ná mma. Ọ bụ ihe anyị kwesịrị ịghọta n’ihe Jizọs kọrọ banyere ndị ohu e nyere talent. Nna ha ukwu jara ndị kwesịrị ntụkwasị obi mma n’ihi na ha ji ego o nyere ha “zụọ ahịa.” Ọ kwụkwara ha ezigbo ụgwọ. Ma, otu ohu ejighị ihe nna ya ukwu nyere ya mee ihe ọ gwara ya. N’ihi ya, nna ya ukwu kpọrọ ya “ajọ ohu dị umengwụ” nke “na-abaghị uru ọ bụla.” A naara ya talent e nyere ya, tụpụkwa yanwa n’èzí.—Gụọ Matiu 25:14-18, 23, 26, 28-30.
17 E nwere mgbe ọzọ Jizọs gosiri na ekwesịghị ntụkwasị obi na-akpata nsogbu. O kwuru, sị: “Otu nwoke bara ọgaranya, o nwekwara onye na-elekọtara ya ụlọ. E bokwara onye a ebubo n’ihu nna ya ukwu na ọ na-emefusị akụ̀ ya. Ya mere, ọ kpọrọ ya, sị ya, ‘Gịnị bụ ihe a m na-anụ banyere gị? Weta akwụkwọ ị na-edekọ otú i si arụ ọrụ nlekọta gị, n’ihi na ị gakwaghị elekọta ụlọ m.’” (Luk 16:1, 2) Onye ahụ na-elekọta ụlọ mefusịrị ihe nna ya ukwu nwere. N’ihi ya, nna ya ukwu chụrụ ya n’ọrụ. Ihe a Jizọs kọrọ na-akụziri anyị ihe dị ezigbo mkpa! Anyị kwesịrị ikwesị ntụkwasị obi mgbe niile, na-eme ihe ọ bụla Chineke chọrọ ka anyị mee.
ÀNYỊ KWESỊRỊ IJI ONWE ANYỊ NA-ATỤNYERE NDỊ ỌZỌ?
18. Gịnị mere na anyị ekwesịghị iji onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ?
18 Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘Olee otú m si ele ọrụ Chineke nyere m anya?’ Ọ bụrụ na anyị ejiri onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ, ọ ga-akpata nsogbu. Baịbụl dụrụ anyị ọdụ, sị: “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ ya, mgbe ahụkwa ọ ga-enwe aṅụrị n’ọrụ ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye ọzọ.” (Gal. 6:4) Kama iji ihe anyị na-arụ na-atụnyere ihe ndị ọzọ na-arụ, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ihe anyị ga-emeli. Ọ ga-eme ka anyị ghara ịdị mpako ma ọ bụ daa mbà. Ọ bụrụ na anyị na-eleru onwe anyị anya, anyị kwesịrị ịmata mgbe ọnọdụ anyị gbanwere. Ọrịa, nká, ma ọ bụ ihe ndị anyị kwesịrị ime nwere ike ime ka anyị ghara ịna-eme ihe niile anyị na-emebu. O nwekwara ike ịbụ na ọnọdụ anyị ga-ekwe anyị rụọ ihe karịrị ihe anyị na-arụ ugbu a. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ́ gaghị adị mma ka anyị wepụtakwuo oge na-eje ozi Chineke?
19. Ọ bụrụ na e nyeghị anyị ihe ùgwù anyị chọrọ, gịnị mere na anyị ekwesịghị ịda mbà?
19 Ihe ọzọ anyị kwesịrị ichebara echiche bụ ụdị ọrụ e nyere anyị ma ọ bụ ụdị ọrụ anyị chọrọ ịna-arụ. Dị ka ihe atụ, nwanna nwere ike ịchọ ịbụ okenye n’ọgbakọ ma ọ bụ chọọ ka e nye ya ihe omume ná mgbakọ. Ọ dị mma ka onye ahụ na-agbalịsi ike iru eru maka ụdị ihe ùgwù ndị ahụ. Ma obi ekwesịghị ịda anyị mbà ma ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ erughị anyị aka mgbe anyị tụrụ anya ya. N’ihi ihe ụfọdụ anyị na-enweghị ike ịghọta ozugbo, e nwere ike a gaghị enye anyị ihe ùgwù anyị chọrọ mgbe anyị tụrụ anya ya. Cheta na ọ dị ka Mozis ò chere na ya ejikerela ịkpọpụta ndị Izrel n’ala Ijipt, ma o cheere ruo iri afọ anọ tupu ya akpọpụta ha. O ji afọ ahụ niile mụta àgwà ndị mechara nyere ya aka idu ndị isi ike, ndị na-akpọ ekwo nkụ.—Ọrụ 7:22-25, 30-34.
20. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe Jọnatan mere?
20 Mgbe ụfọdụ, a gaghị enye anyị ihe ùgwù anyị chọrọ. Ọ bụ ihe mere Jọnatan nwa Sọl. Ọ gaara abụ eze Izrel niile ma nna ya chịchaa. Ma onye Chineke họọrọ ka ọ bụrụ eze bụ Devid, bụ́ nwatakịrị Jọnatan mụrụ amụ. Gịnị ka Jọnatan mere? O kwetara ihe Chineke kwuru ma kwado Devid n’agbanyeghị na Sọl chọkwara igbu yanwa. Jọnatan gwara Devid, sị: “Gị onwe gị ga-abụ eze Izrel, mụ onwe m ga-abụkwa osote gị.” (1 Sam. 23:17) Ị̀ ghọtara ihe anyị kwesịrị ịmụta n’aka Jọnatan? Ọ kwaghị ụwa n’ihi ọnọdụ ya. O meghị ka nna ya, nwewere Devid anyaụfụ. Kama ịtajiri ndị ọzọ anya n’ihi ọrụ e nyere ha, anyị niile kwesịrị ịgbalịsi ike na-arụ nke ọ bụla e nyere anyị. Obi kwesịrị isi anyị ike na n’ụwa ọhụrụ, Jehova ga-eme ka ndị niile na-efe ya nweta ihe ọ bụla ziri ezi nke na-agụ ha agụụ.
21. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ọrụ Chineke nyere anyị anya?
21 Ka anyị cheta mgbe niile na ebe anyị bụ ndị ohu Chineke tụkwasịrị obi, ọ naghị echi anyị ọnụ n’ala. Kama, Jehova nyere anyị nnukwu ihe ùgwù, nke bụ́ ikwusara ndị ọzọ ozi ọma n’oge ikpeazụ a. Ọ bụ ọrụ a na-agaghị arụ ọzọ. Jehova hapụrụ anyị ka anyị jiri aka anyị kpebie ihe ụfọdụ gbasara otú anyị ga-esi na-arụ ọrụ o nyere anyị. N’ihi ya, ka anyị bụrụ ndị a tụkwasịrị obi na-elekọta ụlọ. Ka anyị gharakwa ichefu na ife Jehova, bụ́ Onye kacha ihe niile elu, bụ ihe ùgwù.
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 12]
Ka anyị jiri obi anyị niile na-arụ ọrụ e nyere anyị