Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Tupu mụ na nwunye m aghọọ Ndịàmà Jehova, anyị kwetara ka e were àkwá si n’ahụ́ nwunye m na ọbara ọcha si n’ahụ́ m, gwakọta ha n’ihi na anyị chọrọ ịmụta nwa. Ọ bụghị ha niile ka e tinyere n’ahụ́ nwunye m; e tinyere ụfọdụ na friji. Ànyị nwere ike ịwụfu ha, ka ànyị kwesịrị ịka dewe ha?

▪ Nke a bụ otu n’ime ihe ndị dị mkpa gbasara omume ọma di na nwunye kwesịrị ikpebi ma ọ bụrụ na ha kpebiri ka e jiri nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ nyere nke nwaanyị aka ịtụrụ ime. Ọ bụ di na nwunye kwesịrị iji aka ha kpebie ime ihe ga-adị Jehova mma. Ma ọ ga-adị mma ka anyị buru ụzọ tụlee otú e si eji nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ enyere nwaanyị aka ịtụrụ ime.

N’afọ 1978, otu nwaanyị bi n’Ingland bụ onye mbụ e si otú ahụ nyere aka ka ọ mụta nwa. O nweghị ike ịtụrụ ime n’ihi na e nwere ihe sụchiri ebe àkwá si abanye n’akpa nwa ya, nke mere ka ọbara ọcha di ya ghara ịna-eru ebe àkwá ya dị. Ndị dọkịta si n’ahụ́ nwaanyị ahụ wepụta àkwá, tinye ya n’ihe yiri efere nkụwa, gwakọtakwa ya na ọbara ọcha si n’ahụ́ di ya. Mgbe ọ ghọwara nwa, e tinyere ya n’ihe ndị ga-eme ka ọ na-eto, tinyezie ya n’akpa nwa nwaanyị ahụ, ka ọ nọrọ ebe ahụ too. Mgbe oge ruru, nwaanyị ahụ mụrụ nwa nwaanyị. Ihe e meere nwaanyị ahụ bụ otu ụzọ e si eji nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ enyere nwaanyị aka ịmụta nwa.

Ọ bụ eziokwu na mba ọ bụla nwere ike inwe otú ha si eme ya, otú a na-esikarị eme ya bụ ibu ụzọ na-enye nwaanyị ọgwụ ruo ọtụtụ izu iji mee ka ahụ́ ya mepụta ọtụtụ àkwá. E nwere ike ịgwa di ya ka o weta ọbara ọcha ya. A ga-anọ n’ụlọ ọgwụ saa àkwá ahụ na ọbara ọcha ahụ ma gwakọta ha. E nwere ike ịgwakọta ọtụtụ àkwá, ha amalite ikewa, nke ọ bụla n’ime ha ejiri nwayọọ nwayọọ na-aghọ nwa. Ihe dị ka otu ụbọchị gachaa, ndị dọkịta na-eleru nke ọ bụla anya iji mata ndị nke na-adịghị mma na ndị yiri ka hà gbasiri ike, ndị nwekwara ike ịnọgide n’afọ nwaanyị ma too n’ebe ahụ. N’ihe dị ka ụbọchị nke atọ, a ga-ewere abụọ ma ọ bụ atọ n’ime ndị kacha mma ma tinye ha n’akpa nwa nwaanyị ahụ ka o nwee ike ịdị ime. Ọ bụrụ na otu ma ọ bụ karịa anọgide n’akpa nwa ya, ọ pụtara na ọ dịla ime, a ga-atụkwa anya na ọ ga-emecha mụọ nwa.

Gịnịkwanụ ka a ga-eme ndị nke a na-etinyeghị n’akpa nwa, ma ndị nke ahụ yiri ka hà agbasighị ike ma ọ bụkwanụ na ha adịghị mma? A hapụ ha, ha ga-eji nwayọọ nwayọọ nwụọ. Tupu ha anwụọ, e nwere ike iwere ha tinye n’ime ọgwụ ga-eme ka ha ghara ịnwụ, tinyezie ha n’ime friji. N’ihi gịnị? Ọ bụrụ na ndị mbụ ahụ e tinyere n’akpa nwa nwaanyị ahụ anwụọ, e nwere ike iwere ndị ahụ e tinyere na friji, tinyekwa ha n’akpa nwa ya. Ọ ga-eme ka ụgwọ ha ga-akwụ dị obere. Ma, ihe a niile mere ka e nwee ajụjụ ndị dị mkpa gbasara omume ọma. Dị ka di na nwunye ahụ anyị kwuru okwu ha ná mmalite, ọ na-esiri ọtụtụ di na nwunye ike ikpebi ihe ha ga-eme ndị ahụ fọrọ afọ e tinyere na friji. O nwere ike ha achọghị ịmụtakwu ụmụ. O nwere ike isiri di na nwunye ahụ ike isi otú ahụ mụta nwa ọzọ n’ihi na ha akaala nká ma ọ bụ n’ihi na ha enweghịzi ego. Ụjọ nwere ike ịna-atụ ha n’ihi nsogbu ndị a na-enwe n’ịmụ ejima abụọ ma ọ bụ karịa. * Di ma ọ bụ nwunye nwere ike ịnwụ. Otu n’ime ha ma ọ bụ ha abụọ nwekwara ike ịlụ onye ọzọ. N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịna-echegbu di na nwunye. N’ihi ya, ụfọdụ na-akwụ ụgwọ maka ndị nke ahụ e tinyere na friji ruo ọtụtụ afọ.

N’afọ 2008, otu ọkachamara n’ihe banyere ụmụ e bu n’afọ kwuru n’otu akwụkwọ akụkọ na o siiri ọtụtụ nne na nna ike ikpebi ihe a ga-eme ndị nke ahụ fọrọ afọ e tinyere na friji. Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru, sị: “N’Amerịka, ọbara ọcha na àkwá a gwakọtara ma tinye na friji eruola narị puku anọ ma ọ dịkarịa ala. A na-etinyekwa ndị ọhụrụ kwa ụbọchị . . . Ha ka nwere ike ịdị mma ruo afọ iri ma ọ bụ karịa ma ọ bụrụ na e tinyere ha n’ezigbo friji. Ma ọ bụghị ha niile ga-emecha ghọọ nwa ma e wepụta ha na friji ka ha gbazee.” Ihe a e kwuru emeela ka ụfọdụ Ndị Kraịst kwụsịtụ ma chee echiche. N’ihi gịnị?

Ọ bụrụ na di na nwunye achọọ ikpebi ihe ndị gbasara iji nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ eme ka nwaanyị tụrụ ime, o nwere ike ịdị mma ka ha chebara nsogbu ọzọ yiri nke ha echiche. Ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike ịgbake n’ọrịa ya, e jirikwa ígwè na-enyere ya aka iku ume, o nwere ike ịdị mkpa ka Onye Kraịst kpebie ihe ọ ga-eme banyere onye ahụ, bụ́ onye ọ hụrụ n’anya. Ezi Ndị Kraịst anaghị ajụ ịṅụ ọgwụ; dị ka e kwuru n’Ọpụpụ 20:13 nakwa n’Abụ Ọma 36:9, ha ji ndụ kpọrọ ihe. Teta! (Bekee) nke May 8, 1974, kwuru, sị: “Ndị chọrọ ibi ndụ otú Baịbụl kwuru na-eji ndụ akpọrọ ihe n’ihi na ọ dị nsọ n’anya Chineke. Ha anaghị eme ihe ga-enye akọnuche ha nsogbu. Ha na-erubekwara iwu ndị ọchịchị isi. N’ihi ya, ha agaghị akwado ka a gbaa onye ọrịa ọgwụ ga-egbu ya,” nke bụ́ ịkpachara anya gbuo onye ahụ. Ma mgbe ụfọdụ, naanị ihe ji onye ahụ ndụ bụ ígwè na-enyere ya aka iku ume. Ọ bụ ndị ezinụlọ onye ahụ ga-ekpebi ma hà ga-ewepụ ígwè ahụ ka hà ga-ahapụ ya.

N’eziokwu, ihe a a kọrọ dị iche ná nsogbu di na nwunye ga-enwe ma ọ bụrụ na ha kwetara ka e were àkwá si n’ahụ́ nke nwaanyị na ọbara ọcha si n’ahụ́ nke nwoke, gwakọta ha abụọ, ma tinye ndị nke fọrọ afọ na friji. Otu ihe e nwere ike ịgwa ha bụ ka e wepụta ihe ahụ na friji, hapụ ya ka ọ gbazee. E wepụta ihe ahụ na friji, o nwere ike ịnwụ n’oge na-adịghị anya. Di na nwunye ahụ ga-ekpebi ma hà ga-ekwe ka e mee otú ahụ.—Gal. 6:7.

Ebe ọ bụ na di na nwunye ahụ kwetara ka e jiri nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ nyere nke nwaanyị aka ịdị ime nakwa ma eleghị anya mụta nwa, ha nwere ike ikpebi ka ha kwụwa ụgwọ maka ebe e dewere nke fọrọ afọ ma ọ bụ maka iji ha mụta nwa n’ọdịnihu. Ma, di na nwunye ọzọ nwere ike ikpebi ịkwụsị ịkwụ ụgwọ maka ebe e dewere nke fọrọ afọ n’ihi na ha na-ele ya anya na ọ bụ ígwè ji ya ndụ. Ndị Kraịst ndị chọrọ ikpebi ụdị ihe a kwesịrị iji akọnuche ha e ji Baịbụl zụọ kpebie ihe ga-ewetara Chineke otuto. Ihe ha kwesịrị iburu n’obi bụ ka akọnuche ha ghara ịna-ama ha ikpe, ma ha agaghị eleghara akọnuche ndị ọzọ anya.—1 Tim. 1:19.

Otu ọkachamara n’ihe banyere ịtụrụ ime chọpụtara na ọtụtụ di na nwunye “amaghị ihe ha ga-eme banyere ihe ndị ahụ fọrọ afọ e tinyere na friji. Ha na-echegbukwa onwe ha banyere ya.” O kwuru, sị: “Ọ na-adị ọtụtụ di na nwunye ka o nweghị ihe ha kpebiri ime nke ga-akacha mma.”

O doro anya na ezi Ndị Kraịst ndị chọrọ ka e jiri nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ nyere nwunye ha aka ịtụrụ ime kwesịrị iche echiche nke ọma banyere nsogbu niile o nwere ike ịkpata. Baịbụl dụrụ anyị ọdụ, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.”—Ilu 22:3.

Ka e were ya na nwoke na nwaanyị bi n’alụghị alụ. Ha amụwa Baịbụl ma chọọ ịlụ ka e nwee ike ime ha baptizim. Ma nwoke ahụ enweghị akwụkwọ ikike ibi ná mba ahụ. N’ihi ya, ndị ọchịchị agaghị ekwe ka ọ lụọ nwaanyị n’obodo ha. Ha abụọ hà nwere ike idejupụta akwụkwọ ma kwe nkwa na ha ga-ekwesị ntụkwasị obi, bịanye aka n’akwụkwọ ahụ ka e nwee ike ime ha baptizim?

▪ N’agbanyeghị na o yiri ka hà kwesịrị ime otú ahụ, Baịbụl akwadoghị ka e si otú ahụ dozie ụdị nsogbu ahụ. Iji mee ka anyị ghọta ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ, ka anyị burugodị ụzọ tụlee ihe mere e ji edejupụta ụdị akwụkwọ ahụ ma bịanye aka na ya, nakwa mgbe e nwere ike ime ya.

Nwoke na nwaanyị nwere ike ịnọ n’ihu ndị akaebe dejupụta akwụkwọ ma bịanye aka na ya ma ọ bụrụ na iwu obodo ekweghị ka ha abụọ lụọ n’ihi ihe ndị e kwuru na paragraf ndị dị n’okpuru ebe a. Mgbe ha na-abịanye aka n’akwụkwọ ahụ, ha ga-anọ n’ihu Chineke na ndị akaebe kwe nkwa na ha abụọ ga-ekwesị ntụkwasị obi nakwa na ha ga-edeba alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ ndị ọchịchị mgbe ọ bụla ha ga-emeli ya. Ọgbakọ Ndị Kraịst ga na-ele mmadụ abụọ ahụ anya ka ndị lụrụ di na nwunye nke iwu kwadoro.

Olee mgbe nwoke na nwaanyị nwere ike idejupụta ụdị akwụkwọ ahụ ma bịanye aka na ya? Ọ bụ Jehova malitere alụmdi na nwunye, o jikwa ya kpọrọ ihe nke ukwuu. Ọkpara ya kwuru, sị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Mat. 19:5, 6; Jen. 2:22-24) Jizọs kwukwara, sị: “Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko, wee lụọ nwunye ọzọ, na-akwa iko.” (Mat. 19:9) N’ihi ya, ọ bụ naanị “ịkwa iko” ka Baịbụl kwuru nwere ike ime ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwoke akwaa iko, nwunye ya aka ya dị ọcha nwere ike ikpebi ma ọ̀ ga-agba di ya alụkwaghịm ka ọ̀ ga-agbaghara ya. Ọ bụrụ na ọ gbaa di ya alụkwaghịm, o nwere ike ịlụ nwoke ọzọ.

Ma, karịchaa n’oge gara aga, okpukpe a kacha ekpe ná mba ụfọdụ ekwetaghị ihe Baịbụl kwuru banyere ịgba alụkwaghịm. Kama, ha na-akụzi na o nweghị ihe ga-eme ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm. N’ihi ya, ná mba ụfọdụ ebe ọ bụ ndị ndú okpukpe na-ekwu ihe a ga-eme, iwu obodo anaghị ekwe ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm ọ bụrụgodị na otu onye n’ime ha akwaa iko. Ná mba ndị ọzọ, iwu obodo kwuru na mmadụ nwere ike ịgba alụkwaghịm, ma ọ na-esi ezigbo ike, ihe a na-agwakwa onye ahụ mee karịrị akarị. O nwere ike iwe ọtụtụ afọ tupu mmadụ enweta akwụkwọ ịgba alụkwaghịm. E nwere ike ikwu na ndị okpukpe ahụ ma ọ bụ na ndị ọchịchị ahụ ‘na-egbochi’ ndị mmadụ ime ihe Chineke kwuru na ha nwere ike ime.—Ọrụ 11:17.

Dị ka ihe atụ, nwoke na nwaanyị ndị chọrọ ịlụ nwere ike ibi ná mba ebe a na-anaghị ekwe enye mmadụ akwụkwọ ịgba alụkwaghịm ma ọ bụ na inweta ya na-ewe ọtụtụ afọ. Ọ bụrụ na ha emeela ihe niile ha nwere ike ime ka otu n’ime ha nke lụburu di ma ọ bụ nwunye nweta akwụkwọ ịgba alụkwaghịm ma e kweghị enye ya, ọ bụrụkwa na ha ruru eru n’anya Chineke ịlụ, ha nwere ike idejupụta akwụkwọ ma bịanye aka na ya. Ọ bụ ndokwa nzukọ Jehova ji obiọma meere ụmụnna ndị bi ná mba ndị ọ na-esi ike inweta akwụkwọ ịgba alụkwaghịm. Ma, e meghị ndokwa ahụ maka mba ebe ndị mmadụ nwere ike inweta akwụkwọ ịgba alụkwaghịm, ọ bụrụgodị na inweta ya dị oké ọnụ ma ọ bụ sie ike.

E nwere ụfọdụ ndị bi ná mba ebe ndị mmadụ nwere ike inweta akwụkwọ ịgba alụkwaghịm, ma ha achọọ idejupụta akwụkwọ ma bịanye aka na ya, nke ga-eme ka ha zere nsogbu ndị dị n’inweta akwụkwọ ịgba alụkwaghịm. Ma, ọ bụghị ihe kwesịrị ime ka e dejupụta ụdị akwụkwọ ahụ.

Ka anyị gaghachi n’ajụjụ ahụ a jụrụ ná mmalite. Nwoke ahụ na nwaanyị ahụ bi, ma ugbu a ha chọrọ ịlụ. O nweghị onye n’ime ha lụtụrụla onye ọzọ. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ha abụọ nwere ike ịlụ. Ma, nke nwoke enweghị akwụkwọ ikike ibi ná mba ahụ. Ndị ọchịchị agaghịkwa ekwe ka ụdị onye ahụ lụọ nwaanyị n’obodo ha. (N’ọtụtụ mba, ndị ọchịchị na-ekwe ka nwoke na nwaanyị lụọ ọ bụrụgodị na otu n’ime ha ma ọ bụ ha abụọ enweghị akwụkwọ ikike ibi n’obodo ahụ.) N’ihe gbasara ndị ahụ anyị na-ekwu okwu ha, iwu mba ebe ha bi kwuru na mmadụ nwere ike ịgba alụkwaghịm. N’ihi ya, ihe ha kwesịrị ime abụghị idejupụta akwụkwọ na ha ga-ekwesị ntụkwasị obi ma bịanye aka na ya. Cheta na nsogbu ha abụghị na otu n’ime ha chọrọ ịgba onye ọ lụburu alụkwaghịm ma e kweghị ya. Ha nwere ike ịlụ onye dị ha mma. Ma olee otú ha ga-esi lụọ ebe ọ bụ na nke nwoke enweghị akwụkwọ ikike ibi ná mba ahụ? Ha nwere ike ịga ná mba ọzọ, bụ́ ebe ha abụọ ga-enwe ike ịlụ n’adaghị iwu obodo. Ha abụọ nwekwara ike ịlụ ná mba ebe ahụ ha bi ma ọ bụrụ na nke nwoke emee ihe o kwesịrị ime iji nweta akwụkwọ ikike ibi ná mba ahụ.

N’eziokwu, mmadụ abụọ ahụ nwere ike ime ihe ha kwesịrị ime iji rubere iwu Chineke na iwu Siza isi. (Mak 12:17; Rom 13:1) Ọ bụrụ na ha alụọ otú iwu obodo kwuru, ha nwere ike iru eru ka e mee ha baptizim.—Hib. 13:4.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ọ́ bụrụkwanụ na o yiri ka nwa ahụ ò nwere nkwarụ ma ọ bụ na ọtụtụ n’ime ndị ahụ e tinyere n’akpa nwa nwaanyị ahụ towere? Ịkpachara anya gbuo nke ọ bụla bụ ite ime. Ụmụ nwaanyị ndị e ji nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ mee ka ha tụrụ ime na-atụkarị ime ejima abụọ, atọ, ma ọ bụ karịa, nke nwere ike ime ka nwaanyị mụọ nwa na-akaghị aka ma ọ bụ mee ka ọbara na-agba ya. Ọ bụrụ na ụmụ nwaanyị bu n’afọ dị ọtụtụ, dọkịta nwere ike ịgba ya ume ka o kwe ka e gbuo otu ma ọ bụ karịa. Ọ ga-abụ ịkpachara anya tee ime, nke bụ́ igbu ọchụ.—Ọpụ. 21:22, 23; Ọma 139:16.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]

Ndị Kraịst ndị chọrọ ikpebi ụdị ihe a kwesịrị iji akọnuche ha e ji Baịbụl zụọ kpebie ihe ga-ewetara Chineke otuto

[Igbe dị na peeji nke 15]

ỤZỌ NDỊ ỌZỌ E SI ENYERE NWAANYỊ AKA ỊTỤRỤ IME

Iji nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ enyere nwaanyị aka ịtụrụ ime emeela ka e wepụta ụzọ dị iche iche megidere ihe Chineke kwuru na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, e nwere ike ịgwakọta àkwá nwaanyị na ọbara ọcha nwoke na-abụghị di ya. Nwaanyị ahụ nweziri ike ikwe ka e tinye àkwá na ọbara ọcha ahụ a gwakọtara n’akpa nwa ya. (Ụmụ nwaanyị ndị na-alụ ụmụ nwaanyị ibe ha na-emekarị otú ahụ.) E nwere ike ịgwakọta ọbara ọcha nwoke na àkwá nwaanyị na-abụghị nwunye ya. Nwunye nwoke ahụ nwere ike ikwe ka e tinye ya n’akpa nwa yanwa.

Mgbe ụfọdụ, di nwere ike ikwe ka a gwakọta àkwá nwaanyị ọzọ na ọbara ọcha nwoke ọzọ ma tinye ya n’akpa nwa nwunye ya. N’oge ụfọdụkwa, e nwere ike iji nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ gwakọta àkwá nwaanyị na ọbara ọcha di ya. E mechaa, e tinye ya n’akpa nwa nwaanyị ọzọ, ya eburu nwa ahụ n’afọ ruo mgbe ọ ga-amụrụ ha ya. *

Ndị ohu Chineke anaghị eme nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ e kwuru n’ihi na ha na-erubere iwu Chineke isi, nke bụ́: “Gị na nwunye mmadụ ibe gị enwela mmekọahụ [ma ọ bụ, ‘enyela nwunye mmadụ ibe gị ọbara ọcha gị’] wee bụrụ onye na-adịghị ọcha site n’ime otú ahụ.” (Lev. 18:20, 29; Ilu 6:29) Ọ bụrụ na a gwakọta ọbara ọcha nwoke na àkwá nwaanyị na-abụghị nwunye ya, ụdị omume ahụ bụ ihe Baịbụl kpọrọ por·neiʹa, ya bụ, ịkwa iko. Ime otú ahụ bụ iji ahụ́ nwoke na ahụ́ nwaanyị eme ihe jọgburu onwe ya.—Mat. 5:32; 1 Kọr. 5:11; 6:9, 18; Hib. 13:4.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 29 A kọwara ihe gbasara ụmụ nwaanyị ndị na-eburu ndị ọzọ afọ ime na Teta! July 8, 1993, peeji nke 28-29.