Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere E Ji Malite Ibipụta Ụlọ Nche E Ji Bekee Dị Mfe Nghọta Dee?

Gịnị Mere E Ji Malite Ibipụta Ụlọ Nche E Ji Bekee Dị Mfe Nghọta Dee?

Gịnị Mere E Ji Malite Ibipụta Ụlọ Nche E Ji Bekee Dị Mfe Nghọta Dee?

KEMGBE ọtụtụ afọ, ndị mmadụ n’ụwa niile na-erite uru n’ihe a na-ebipụta n’Ụlọ Nche, jirikwa ya kpọrọ ihe. Na Julaị afọ 2011, a malitere ibipụta Ụlọ Nche a na-amụ amụ nke e ji Bekee dị mfe nghọta dee. Ụlọ Nche ahụ kwuru, sị: “A ga-ebipụta ya otú a ruo otu afọ. Ọ bụrụ na ọ bara uru, a ga na-ebipụtazi ya otú ahụ.”

Ugbu a, obi dị anyị ụtọ ikwu na anyị ekpebiela ka a na-ebipụtazi ya otú ahụ. Ka oge na-aga, a ga-amalitekwa ibipụta nke French, Pọchugiiz, na Spanish.

IHE MERE O JI AMASỊ ỌTỤTỤ NDỊ

Mgbe ụmụnna bi n’Ebe Ndịda Pasifik nwetara Ụlọ Nche ahụ e ji Bekee dị mfe nghọta dee, ha kwuru, sị: “Ugbu a, ụmụnna na-aghọta nke ọma ihe a na-amụ n’Ụlọ Nche.” Otu nwanna nwaanyị si n’ebe ọzọ dere, sị: “Anyị na-ejibu oge buru ibu achọ ihe okwu pụtara, na-akọwakwa ihe e kwuru. Ma ugbu a, anyị na-eji oge ahụ aghọtakwu amaokwu Baịbụl ndị e dere nakwa otú ha si gbasa ihe a na-amụ.”

Otu nwanna nwaanyị bi n’Amerịka, bụ́ onye gara mahadum kwuru, sị: “Eji m afọ iri na asatọ na-asụ ma na-ede ụdị Bekee nke naanị ndị gụrụ oké akwụkwọ na-aghọta. Ihe m na-echepụta na ihe m na-ekwu na-agbagwoju ụfọdụ ndị anya. Aghọtara m na m kwesịrị ịgbanwe otú m si eche echiche na otú m si ekwu okwu.” Ugbu a, nwanna nwaanyị ahụ na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl nke ọma. O dere, sị: “Ụlọ Nche ahụ enyerela m ezigbo aka. Otú e si dee ya na-enyere m aka ịmụta otú m ga-esi na-ekwu ihe mmadụ niile ga-aghọta.”

Nwanna nwaanyị ọzọ bi n’Ingland, bụ́ onye e mere baptizim n’afọ 1972, dere banyere Ụlọ Nche ahụ, sị: “Mgbe m gụrụ nke mbụ e bipụtara, ọ dị m ka Jehova ọ̀ nọ m n’akụkụ, tụkwasị m aka n’olu, anyị ana-agụkọ ya ọnụ. Ọ dị m ka ebe nna na-agụrụ nwa ya akụkọ tupu ha alakpuo.”

Otu nwanna nwaanyị nọ na Betel dị n’Amerịka, bụ́ onye e mere baptizim kemgbe iri afọ anọ, kwuru na Ụlọ Nche ahụ enyerela ya aka mgbe ụfọdụ ịghọtakwu ihe Baịbụl kwuru. Dị ka ihe atụ, n’Ụlọ Nche Septemba 15, 2011, nke e ji Bekee dị mfe nghọta dee, igbe bụ́ “Okwu Ụfọdụ A Kọwara” kwuru banyere “oké ìgwè ndị àmà” e kwuru okwu ha ná Ndị Hibru 12:1, sị: “Ha karịrị akarị nke na e nweghị ike ịgụta ha ọnụ.” Nwanna nwaanyị ahụ kwuru, sị: “Ihe ahụ a kọwara nyeere m aka ịghọtakwu amaokwu ahụ.” O kwukwara banyere Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche a na-enwe kwa izu, sị: “Ọ bụrụgodị na nwatakịrị agụpụta ihe e dere n’Ụlọ Nche ahụ mgbe ọ na-aza ajụjụ, ihe ọ zara ga-adị iche n’otú e si kwuo ya n’Ụlọ Nche nke ọzọ ọtụtụ ndị ji. N’ihi ya, ihe nwatakịrị ahụ zara agaghị ada ndị ọzọ ka ihe a gụpụtara n’akwụkwọ.”

Nwanna nwaanyị ọzọ nke nọkwa na Betel dere, sị: “Ana m atụsi anya ike ịnụ ihe ụmụaka ga-aza n’ọgbakọ anyị. Ụlọ Nche ahụ e ji Bekee dị mfe nghọta dee na-enyere ha aka ikwu okwu ka ndị ihe doro anya mgbe ha na-aza ajụjụ. Ihe ha na-aza na-agba m ume.”

Otu nwanna nwaanyị e mere baptizim n’afọ 1984 kwuru na Ụlọ Nche ahụ na-atọ ya ụtọ. O kwuru, sị: “Ọ na-adị m ka ọ̀ bụ m ka e deere ya. Ọ na-eme ka ọ dịrị m mfe ịghọta ihe m na-agụ. Obi esiela m ike ugbu a na m ga-aza ajụjụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche.

Ọ BAARA NDỊ NNE NA NNA EZIGBO URU

Otu nne nke nwa ya nwoke dị afọ asaa kwuru na n’oge gara aga, inyere nwa ya aka ịkwado Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na-agwụ ya ike n’ihi na ọ na-eji ọtụtụ awa akọwara ya ihe a na-amụ. Olee otú Ụlọ Nche ọhụrụ a si nyere ya aka? O dere, sị: “Ọ na-eju m anya na nwa m nwoke na-agụpụta paragraf ma na-aghọta ihe a na-amụ. Ebe ọ bụ na okwu ndị a na-ede na ya dị mfe, ha anaghịkwa eto ogologo, ọ na-aghọta ihe a na-amụ, ihe a na-amụ na-atọkwa ya ụtọ. Ọ malitela iji aka ya akwado Ụlọ Nche ya. Uche ya na-adịkwa n’ihe a na-amụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche.”

Nne ọzọ nke nwa ya nwaanyị dị afọ itoolu dere, sị: “Anyị na-enyeburu ya aka ịkwado ihe ọ ga-aza. Ugbu a, ọ na-eji aka ya akwado ihe ọ ga-aza. Ọ bụghị mgbe niile ka anyị na-ewepụta oge na-akọwara ya ihe e kwuru n’Ụlọ Nche. Ebe ọ bụ na ọ na-aghọta ihe a na-amụ, Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na-atọzi ya ụtọ.”

GỊNỊ KA ỤMỤAKA KWURU?

Ọtụtụ ụmụaka kwuru na ọ bụ ha ka e bipụtaara Ụlọ Nche ahụ e ji Bekee dị mfe nghọta dee. Otu nwata nwaanyị dị afọ iri na abụọ aha ya bụ Rebecca dere, sị: “Biko, unu akwụsịla ibipụta ya!” O kwukwara, sị: “Igbe ahụ bụ́ ‘Okwu Ụfọdụ A Kọwara’ na-atọ m ụtọ. Ọ dịịrị ụmụaka mfe.”

Otu nwata nwaanyị dị afọ asaa aha ya bụ Nicolette chekwara otú ahụ. O kwuru, sị: “Ụlọ Nche na-esiburu m ike nghọta. Ma ugbu a, m na-eji aka m amata ihe m ga-aza n’ọmụmụ ihe.” Nwata nwaanyị ọzọ dị afọ itoolu aha ya bụ Emma dere, sị: “O nyerela mụ na nwanne m nwoke dị afọ isii ezigbo aka. Anyị na-aghọtakwu ihe a na-amụ n’Ụlọ Nche! Unu emeela!”

O doro anya na ọtụtụ ndị na-erite uru n’Ụlọ Nche e ji Bekee dị mfe nghọta dee. Ọ na-enyere ọtụtụ ndị aka ịghọtakwu Baịbụl. A ga na-ebipụtakwa ya na Ụlọ Nche nke ọzọ, nke na-enyere ọtụtụ ndị aka kemgbe afọ 1879.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 30]

“Anyị na-ejibu oge buru ibu achọ ihe okwu pụtara, na-akọwakwa ihe e kwuru. Ma ugbu a, anyị na-eji oge ahụ aghọtakwu amaokwu Baịbụl ndị e dere nakwa otú ha si gbasa ihe a na-amụ”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 31]

“Ọ na-eju m anya na nwa m nwoke na-agụpụta paragraf ma na-aghọta ihe a na-amụ”