Ka Anyị Kpebisie Ike Ịbụ “Ndị Bi Nwa Oge”
Ka Anyị Kpebisie Ike Ịbụ “Ndị Bi Nwa Oge”
“Ana m agba unu ume dị ka ndị ala ọzọ na ndị bi nwa oge ka unu na-ezere ọchịchọ anụ ahụ́.”—1 PITA 2:11.
GỊNỊ KA Ị GA-AZA?
Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na ndị e tere mmanụ bụ ndị bi nwa oge?
Olee otú ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ si bụrụ ndị bi nwa oge?
Gịnị ka ị na-atụ anya ya n’ọdịnihu?
1, 2. Ole ndị ka Pita kpọrọ “ndị a họọrọ”? Gịnịkwa mere o ji kpọọ ha ndị “bi nwa oge”?
MGBE Jizọs laghachiri eluigwe, ihe dị ka iri afọ atọ agaa, Pita onyeozi degaara ndị bi “n’ebe dị iche iche n’ime Pọntọs, Galeshia, Kapadoshia, Eshia, na Bitinia” akwụkwọ ozi. Ọ kpọrọ ha “ndị bi nwa oge” na “ndị a họọrọ.” (1 Pita 1:1) O doro anya na ndị Pita kpọrọ “ndị a họọrọ” bụ ndị ibe ya e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ndị ‘a mụrụ ọzọ ka ha nwee olileanya dị ndụ,’ nke bụ́ iso Kraịst chịa n’eluigwe. (Gụọ 1 Pita 1:3, 4.) Ma gịnị mere o ji mechaa kpọọ ndị ahụ a họọrọ “ndị ala ọzọ na ndị bi nwa oge”? (1 Pita 2:11) Gịnịkwa mere ihe ahụ o kwuru ji gbasa anyị ebe ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova ole na ole n’ụwa niile na-ekwu na ha bụ ndị e tere mmanụ?
2 Otú ahụ a kpọrọ ndị e tere mmanụ “ndị bi nwa oge” n’oge ndịozi Jizọs dabara adaba. Dị ka ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ taa, ha agaghị ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Pọl onyeozi, bụ́ onye so ‘n’ìgwè atụrụ nta’ e tere mmanụ, kwuru, sị: “Ma ikike anyị nwere dị ka ndị amaala dị n’eluigwe, bụ́ ebe onye nzọpụta, bụ́ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, onye anyị na-echeresi ike, ga-esi bịa.” (Luk 12:32; Fil. 3:20) Ebe ọ bụ na ndị e tere mmanụ ga-abụ ụmụ amaala n’eluigwe, ha nwụọ, ha ga-ahapụ ụwa a gaa n’eluigwe, bụ́ ebe ha na-agaghị anwụ anwụ. (Gụọ Ndị Filipaị 1:21-23.) N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ha bụ “ndị bi nwa oge” n’ụwa a Setan na-achị.
3. Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ banyere ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’?
3 Gịnịkwanụ ka e nwere ike ikwu banyere ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’? (Jọn 10:16) Ọ̀ bụ na Baịbụl ekwughị na ha ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi? Baịbụl kwuru otú ahụ! Ma, e nwere ike ikwu na ha bụ ndị bi nwa oge ugbu a. Maka gịnị?
‘IHE NIILE E KERE EKE NA-ASỤ UDE’
4. Gịnị ka ndị ọchịchị na-enweghị ike ịkwụsị?
4 Ọ bụrụhaala na Jehova ekwe ka ụwa ọjọọ a ka dịrị, mmadụ niile, ma Ndị Kraịst ma ndị ọzọ, ga na-ata ahụhụ n’ihi nsogbu nnupụisi Setan kpatara. Ndị Rom 8:22 kwuru, sị: “Anyị maara na ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.” N’agbanyeghị na ụfọdụ ndị ọchịchị, ndị ọkà mmụta sayensị, na ndị ọrụ ebere ji obi ha niile na-enyere ndị mmadụ aka, ha enweghị ike ime ka ụmụ mmadụ kwụsị ịta ahụhụ.
5. Kemgbe 1914, gịnị ka ọtụtụ nde mmadụ kpebirila ime, maka gịnị?
5 Kemgbe Chineke mere Jizọs Kraịst Eze n’afọ 1914, ọtụtụ nde mmadụ ekpebiela ịbụ ndị Jizọs ga-achị. Ha achọghị ịbụ ndị Setan na-achị. Ha anaghị ekwe akwado ụwa Setan. Kama, ha ji ndụ ha na ihe ha nwere na-akwado Alaeze Chineke.—Rom 14:7, 8.
6. Gịnị mere e nwere ike iji kpọọ Ndịàmà Jehova ndị ala ọzọ?
6 Ndịàmà Jehova bi n’ihe karịrị narị mba abụọ. Ha na-erubere iwu obodo isi. Ma n’agbanyeghị ebe ha bi, ha dị ka ndị ala ọzọ. Ha anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’esemokwu ndị e nwere n’ebe ha bi. Ha ghọtara na ha bụ ụmụ amaala ụwa ọhụrụ, nke Chineke kwere ná nkwa. Obi dị ha ụtọ na ọ bụ naanị obere oge ka ha ga-abụ ndị bi nwa oge n’ụwa ọjọọ a.
7. Olee otú a ga-esi mee ka ndị na-efe Chineke bụrụ ndị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi? Ebeekwa ka ha ga-ebi?
7 N’oge na-adịghị anya, Kraịst ga-ebibi ụwa ọjọọ Setan. Ọchịchị Kraịst ga-abụ ọchịchị zuru okè, nke ga-ewepụ mmehie na ahụhụ. Ọ ga-ewepụkwa ndị niile na-enupụrụ ọchịchị Jehova isi, ma n’ụwa ma n’eluigwe. Ndị ji obi ha niile na-efe Chineke ga-enwezi ike ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs ga-adị n’ụwa. (Gụọ Mkpughe 21:1-5.) N’oge ahụ, a ga-ewepụ ihe niile na-eme ka ihe e kere eke na-ata ahụhụ, mmadụ niile ‘enwetakwa nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.’—Rom 8:21.
OLEE ỤDỊ ÀGWÀ EZI NDỊ KRAỊST KWESỊRỊ ỊNA-AKPA?
8, 9. Kọwaa ihe Pita bu n’obi mgbe o kwuru banyere ‘izere ọchịchọ anụ ahụ́.’
8 Pita kọwara otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-akpa àgwà. O kwuru, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ana m agba unu ume dị ka ndị ala ọzọ na ndị bi nwa oge ka unu na-ezere ọchịchọ anụ ahụ́, nke bụ́ ihe ndị ahụ na-alụso mkpụrụ obi ọgụ.” (1 Pita 2:11) Ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ka o nyere ndụmọdụ ahụ, ma ọ bakwaara ndị so n’atụrụ ọzọ Jizọs uru.
9 Ụfọdụ ihe ndị na-agụ anyị adịghị njọ ma ọ bụrụ na anyị emee ha otú Chineke chọrọ. N’eziokwu, ha na-eso eme anyị obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, iri ezigbo nri, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, ịtụrụ ndụ na iso ezigbo ndị enyi nọrịa so n’ihe ndị nwere ike ịgụ mmadụ agụụ. Mmadụ ịchọ ka ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya nwee mmekọahụ abụghịkwa ihe ọjọọ. (1 Kọr. 7:3-5) Ma ihe Pita kwuru banyere ya bụ ‘ọchịchọ anụ ahụ́, nke na-alụso mkpụrụ obi ọgụ.’ Otú e si kwuo ya na Baịbụl ụfọdụ mere ka a ghọtakwuo ihe e kwuru. Dị ka ihe atụ, e nwere Baịbụl kpọrọ ya “ihe ọjọọ dị iche iche na-agụ anụ ahụ́.” (Bible Nsọ nke Union Version). Jehova agwala anyị otú ọ chọrọ ka anyị si na-ebi ndụ ma na-eme ihe ndị ziri ezi na-agụ anyị. Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla na-agụ ahụ́ anyị mee ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ọjọọ ndị na-agụ ahụ́ anyị, o nwere ike ịkpatara anyị ọnwụ.
10. Olee ụzọ ụfọdụ Setan si anwa Ndị Kraịst ka ha kpawa àgwà ka ndị ụwa?
10 Setan chọrọ ka ezi Ndị Kraịst chefuo na ha bụ “ndị bi nwa oge” n’ụwa ochie a. Ọ chọrọ ka anyị na-achụ ego ọnwụ ọnwụ, na-eme omume rụrụ arụ, na-agba mbọ ịbụ ndị a ma ama, na-achọ naanị ọdịmma onwe anyị, jirikwa mba anyị na-anya isi. Ma, anyị kwesịrị ịghọta na ihe ndị a niile bụ ọnyà Setan. Ọ bụrụ na anyị ekpebisie ike izere omume ọjọọ ndị a, anyị ga-egosi na anyị achọghị ka e nwee ihe jikọrọ anyị na ụwa Setan. Anyị ga-egosikwa na anyị bi naanị nwa oge n’ụwa a. Ihe anyị chọrọ bụ ka anyị bụrụ ndị ga-ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke ruo mgbe ebighị ebi. Anyị na-agbasikwa mbọ ike ime otú ahụ.
NA-EME OMUME ỌMA
11, 12. Olee otú e si ele ndị mba ọzọ anya mgbe ụfọdụ? Gịnịkwa ka ụfọdụ ndị na-ekwu banyere Ndịàmà Jehova?
11 Na 1 Pita 2:12, Pita kọwakwuru ihe Ndị Kraịst kwesịrị ịna-eme, ebe ha bụ “ndị bi nwa oge.” O kwuru, sị: “Na-emenụ omume dị mma n’etiti ndị mba ọzọ, ka o wee bụrụ na n’ihe ndị ahụ ha na-ekwugide unu, na-asị na unu bụ ndị ajọ omume, ha ga-enye Chineke otuto n’ụbọchị nleta ya n’ihi ọrụ ọma unu nke ha ji anya ha na-ahụ.” Ndị bi nwa oge bụ ndị mbịarambịa ma ọ bụ ndị bi n’obodo na-abụghị nke ha. A na-akatọkarị ha ná mba ha bi n’ihi na ha anaghị eme ka ndị agbata obi ha. E nwekwara ike ịna-ele ha anya ka ndị ọjọọ. Otú ha si ekwu okwu, omume ha, ejiji ha, na otú ha dị nwedịrị ike ịdị iche na nke ndị mba ebe ha bi. Ma, ọ bụrụ na ha na-arụ ọrụ ọma, ya bụ, na-eme omume ọma, o nwere ike ime ka ndị ọzọ ghọta na ha abụghị ndị ọjọọ.
12 N’otu aka ahụ, ezi Ndị Kraịst anaghị akpa àgwà ka ọtụtụ ndị agbata obi ha. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịna-ekwu banyere ihe dị iche ma ọ bụ họrọ ụdị ntụrụndụ dị iche. Uwe ha na ejiji ha na-eme ka ndị agbata obi ha mara na ha dị iche. Mgbe ụfọdụ, ihe ndị a emeela ka ndị mmadụ sị na Ndịàmà Jehova bụ ndị
ọjọọ. Ma, ndị ọzọ nwere ike ịja ha mma maka omume ọma ha.13, 14. Gịnị mere Jizọs ji kwuo na “a na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya”? Nye ihe atụ.
13 N’eziokwu, omume ọma anyị nwere ike ime ka ndị mmadụ ghọta na e kwesịghị ịna-ekwujọ anyị. Ọ bụ naanị Jizọs bụ onye biri n’ụwa n’emejọghị Chineke. Ma ndị mmadụ boro ya ebubo ụgha. Ụfọdụ kpọrọ ya “onye oké nri, nke na-aṅụkwa oké mmanya, enyi ndị ọnaụtụ na ndị mmehie.” Ma nke bụ́ eziokwu bụ na otú o si jiri amamihe na-ejere Chineke ozi mere ka o doo anya na ihe ahụ ha kwuru abụghị eziokwu. Jizọs kwuru, sị: “A na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.” (Mat. 11:19) Ụdị ihe ahụ na-emekwa taa. Dị ka ihe atụ, otú ụmụnna nọ na Betel dị na Jamanị si ebi ndụ edochaghị ụfọdụ ndị agbata obi ha anya. Ma onyeisi obodo n’ebe ahụ kwuchiteere ụmụnna anyị ọnụ ha, sị: “Otú Ndịàmà Jehova ndị na-eje ozi na Betel si ebi ndụ dị iche, ma ha anaghị enye ndị agbata obi ha nsogbu.”
14 N’oge na-adịbeghị anya, e kwuru ụdị ihe ahụ banyere Ndịàmà Jehova bi na Mọsko, bụ́ obodo dị na Rọshịa. E boro ha ebubo ụgha na ha na-eme ihe ọjọọ dị iche iche. Ma n’ọnwa isii n’afọ 2010, Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop, nke dị na Strasbọg, na Frans, kpebiri, sị: “Ụlọikpe a achọpụtala na otú [ọchịchị Mọsko] si gbalịa igbochi Ndịàmà Jehova ikpe okpukpe ha na ịga ọmụmụ ihe ha bụ ịda iwu. Ụlọikpe ndị dị na Rọshịa ekwughị ‘ihe doro anya’ gosiri na Ndịàmà Jehova na-etisa ezinụlọ, na-eme ka ndị mmadụ gbuo onwe ha, ma ọ bụ na ha anaghị ekwe aga ụlọ ọgwụ. N’ihi ya, ụlọikpe ahụ kwuru na “iwu ụlọikpe ndị dị na Rọshịa machibidoro ha bụ mmegbu ebe ọ bụ na iwu obodo ahụ na-emegide okpukpe Ndịàmà Jehova, kwuokwa na iwu a machibidoro ha adabaghị adaba n’agbanyeghị ihe mere e ji mee ya.”
ANYỊ KWESỊRỊ ỊNA-ERUBERE NDỊ ỌCHỊCHỊ ISI
15. Gịnị ka Baịbụl kwuru, nke ezi Ndị Kraịst n’ụwa niile na-eme?
15 Ndịàmà Jehova ndị nọ na Mọsko na n’ebe ndị ọzọ n’ụwa na-emekwa ihe ọzọ Pita kwuru na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-eme. O dere, sị: “N’ihi Onyenwe anyị, doonụ onwe unu n’okpuru ihe niile mmadụ guzobere: ma ọ̀ bụ eze, dị ka onye dị elu, ma ọ̀ bụ ndị ọchịchị.” (1 Pita 2:13, 14) O nweghị ihe jikọrọ ezi Ndị Kraịst na ụwa ọjọọ a. Ma dị ka Pọl gwara anyị, anyị ji obi anyị niile na-edo onwe anyị n’okpuru ndị ọchịchị mgbe ọ bụla iwu ha nyere na-emegideghị iwu Chineke.—Gụọ Ndị Rom 13:1, 5-7.
16, 17. (a) Gịnị na-egosi na anyị anaghị emegide ndị ọchịchị? (b) Gịnị ka ụfọdụ ndị ọchịchị kwurula banyere Ndịàmà Jehova?
16 Ndịàmà Jehova na-akpa àgwà ka “ndị bi nwa oge” n’ụwa a, ma ọ pụtaghị
na ha chọrọ imegide ndị ọchịchị ma ọ bụ chọọ ịkatọ ndị ọzọ. Ha anaghị emegide ndị ọzọ ma ọ bụ na-egbochi ha ikpebi ndị ga-achị ha ma ọ bụ otú ha chere a ga-esi dozie nsogbu e nwere n’obodo. Ụfọdụ okpukpe na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma Ndịàmà Jehova anaghị eme otú ahụ. Ha anaghị agbalị ịgwa ndị ọchịchị otú ha kwesịrị isi na-achị ndị mmadụ. O nweghị ihe mere a ga-eji chee na Ndịàmà Jehova ga-achọ ịgba ọchịchị mgba okpuru ma ọ bụ mee ka e nwee ọgba aghara n’obodo.17 Pita gwara anyị ka anyị ‘na-asọpụrụ eze anyị.’ N’ihi ya, Ndị Kraịst na-erubere ndị ọchịchị isi iji gosi na ha na-akwanyere ha ùgwù, na-asọpụkwara ha. (1 Pita 2:17) Ndị ọchịchị ekwuola mgbe ụfọdụ na e kwesịghị iche na Ndịàmà Jehova bụ ndị ọjọọ. Dị ka ihe atụ, e nwere otu onye ọchịchị na steeti Brandenbọg dị na Jamanị. Aha ya bụ Steffen Reiche. O mechara soro ná ndị omeiwu na Jamanị. O kwuru na àgwà ọma Ndịàmà Jehova kpara n’ụlọ mkpọrọ nakwa n’ebe ndị ọzọ a tara ha ahụhụ n’oge Hitler bara uru taa n’obodo ọ bụla ebe e nwere ọchịchị onye kwuo uche ya otú ahụ ọ bara n’oge gara aga. O kwuru na Ndịàmà Jehova agbanweghị ihe ha kweere mgbe a na-akpagbu ha, na ha jikwa obiọma na-emeso ndị mkpọrọ ibe ha omume. O kwukwara na ndị obodo ha kwesịrị ịna-akpa ụdị àgwà ọma ahụ, karịchaa ebe ọ bụ na ụfọdụ na-akpọ ndị si mba ọzọ asị, ma ọ bụ ndị kweere ihe dị iche ma ọ bụ ndị nọ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ.
ANYỊ KWESỊRỊ ỊHỤ ỤMỤNNA ANYỊ N’ANYA
18. (a) Gịnị mere anyị ji hụ ụmụnna anyị niile n’anya? (b) Gịnị ka ụfọdụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova kwurula banyere ha?
18 Pita onyeozi dere, sị: “Hụnụ òtù ụmụnna dum n’anya, tụọnụ egwu Chineke.” (1 Pita 2:17) Ndịàmà Jehova na-atụ egwu Chineke, ya bụ, ha anaghị achọ ime ihe ga-akpasu ya iwe. N’ihi ya, ha na-akwanyere ya ùgwù, na-emekwa uche ya. Obi dị ha ụtọ na ha ji otu obi soro ụmụnna ha ndị nọ n’ụwa niile na-efe Jehova. Ha ‘hụrụ ụmụnna ha’ nọ n’ụwa niile n’anya. Ụdị ịhụnanya ahụ dị ụkọ n’ụwa taa. Ọ bụ ya mere o ji eju ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova anya mgbe ha hụrụ otú anyị si hụ ụmụnna anyị n’anya. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwaanyị na-arụrụ otu ụlọ ọrụ Amerịka nke na-ahụ maka ndị njem na Jamanị ọrụ. Ọrụ nwaanyị ahụ bụ idugharị ndị njem. O juru ya anya mgbe ọ hụrụ otú ụmụnna anyị nọ na Jamanị si gosi na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya ma nyere ha aka, ya bụ, ụmụnna ndị si mba ọzọ bịa mgbakọ mba niile na Jamanị n’afọ 2009. Nwaanyị ahụ kwuru na kemgbe ya rụwara ọrụ ahụ, na ya ahụtụbeghị ndị na-akpa àgwà ọma ka Ndịàmà Jehova. Otu nwanna nwoke mechara kwuo, sị: “Olu o ji kwuo ihe niile o kwuru banyere anyị gosiri na ihe ọ hụrụ juru ya anya.” Ná mgbakọ ndị ị garala, ị̀ nụtụla ebe ndị mmadụ kwuru ụdị ihe ahụ mgbe ha hụrụ otú Ndịàmà Jehova si hụ ibe ha n’anya?
19. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime, n’ihi gịnịkwa?
19 Ihe ndị anyị mụtara n’isiokwu a egosila na Ndịàmà Jehova na-esi n’ụzọ dị iche iche egosi n’eziokwu na ha bụ “ndị bi nwa oge” n’ụwa a Setan na-achị. Ha ji obi ụtọ kpebisie ike ịbụ ndị bi nwa oge. Ha nwere ezigbo olileanya nke siri ike na n’oge na-adịghị anya, ha ga-ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ ebe ndị ezi omume ga-ebi. Ọ̀ bụ na ị naghị atụ anya ibi n’ụwa ọhụrụ ahụ?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 20]
Anyị anaghị agba mbọ ịkwado ụwa Setan
[Foto dị na peeji nke 20]
Anyị na-akwado ụwa ọhụrụ Chineke
[Foto dị na peeji nke 22]
Eziokwu Baịbụl emeela ka ezinụlọ a bụ́ ndị Rọshịa dị n’otu