Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kpachara Anya Ka Ị Ghara Iji Baịbụl Mere Ọtụmọkpọ

Kpachara Anya Ka Ị Ghara Iji Baịbụl Mere Ọtụmọkpọ

Kpachara Anya Ka Ị Ghara Iji Baịbụl Mere Ọtụmọkpọ

PỌL onyeozi dere, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.” (Hib. 4:12) Ihe a o kwuru gosiri na okwu Chineke na-eru ndị mmadụ n’obi, na-agbanwekwa ndụ ha.

Ma, mgbe ndịozi Jizọs nwụchara, ụfọdụ ndị malitere ịkụzi ozizi ụgha. N’ihi ya, ndị mmadụ malitere ile ike Baịbụl na-akpa anya otú na-ekwesịghị ekwesị. (2 Pita 2:1-3) Ka oge na-aga, ndị isi chọọchị malitere ikwu na Okwu Chineke na-akpa ike ka ọtụmọkpọ. Prọfesọ Harry Y. Gamble dere na “e nwere ike iji ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ Ndị Kraịst mere ọtụmọkpọ.” O kwuru ihe Orijen, bụ́ onye so ná ndị nna chọọchị n’oge ochie, kwuru ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asaa gara aga. Orijen kwuru na ebe ọ bụ na okwu e ji eme anwansi na-akpa ike, okwu ndị e si n’ike mmụọ nsọ Chineke dee kwesịrị ịkpa ike karịa ya. Otu nwoke aha ya bụ Jọn Krisọstọm (John Chrysostom), bụ́ onye dịrị ndụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asatọ gara aga, dere na Ekwensu ‘agaghị anwa anwa bịa nso n’ụlọ ebe Baịbụl dị.’ O kwukwara na ụfọdụ ndị na-ede amaokwu Baịbụl ná mpempe akwụkwọ, nyara ya n’olu ka ọ bụrụ ọtụmọkpọ na-akpa ike. Prọfesọ Gamble kwukwara na Ọgọstịn, bụ́ onye na-akụzi ozizi ndị Katọlik n’oge ochie, kụziri na ọ dị mma ka onye isi na-awa tinye Oziọma Jọn n’okpuru ihe o ji ehiwe isi iji gwọọ ya. N’ihi ya, ndị mmadụ malitere iji ihe e dere na Baịbụl na-eme ka ọ̀ bụ ọtụmọkpọ. Ì chere na Baịbụl bụ ọtụmọkpọ ị ga-eji na-echebe onwe gị ma ọ bụ ihe ga-ewetara gị ihu ọma?

E nwere ụzọ ọzọ ọtụtụ ndị si eji Baịbụl eme ihe na-ekwesịghị ekwesị. Olee otú ha si eme ya? Ha na-ebu n’obi na ọ bụrụ na ha emeghee Baịbụl ha, amaokwu ọ bụla ha bu ụzọ hụ ga-agwa ha ihe ha kwesịrị ime. Dị ka ihe atụ, Prọfesọ Gamble kwuru na e nwere otu mgbe Ọgọstịn nụrụ olu nwa onye agbata obi ya ka ọ na-asị: “Were gụọ, were gụọ.” Ọgọstịn kwetara na ọ bụ Chineke na-agwa ya ka o meghee Baịbụl ma gụọ amaokwu ọ bụla o bu ụzọ hụ.

Ị̀ nụtụla ebe ihe siiri mmadụ ike, ya ekpee ekpere ka Chineke nyere ya aka, o wee meghee ebe ọ bụla ọ hụrụ na Baịbụl, buru n’obi na amaokwu ọ bụla o bu ụzọ hụ ga-enyere ya aka imeri nsogbu ya? N’eziokwu, ọ dị mma na onye ahụ na-agbalị inweta enyemaka si na Baịbụl. Ma ọ bụghị otú ahụ ka o kwesịrị isi eme ya.

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ọ ga-ezitere ha ‘ihe inyeaka, bụ́ mmụọ nsọ.’ Ọ gwakwara ha, sị: “[Ọ] ga-akụziri unu ihe niile ma chetara unu ihe niile m gwara unu.” (Jọn 14:26) Ihe anyị ga-eme ka Baịbụl nyere anyị aka bụ ime ihe anyị mụtara na ya, ọ bụghị ịgụ ebe ọ bụla anyị bu ụzọ sapeta.

Ọtụtụ ndị na-eji Baịbụl emere ọtụmọkpọ, buru n’obi na ọ ga-echebe ha, nyere ha aka igbo mkpa ha, ma ọ bụ ịmata ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ma, Baịbụl kwuru na ịchọ ihe mgbaàmà maka ọdịnihu adịghị mma. (Lev. 19:26; Diut. 18:9-12; Ọrụ 19:19) “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.” Ma anyị kwesịrị iji ya na-eme ihe kwesịrị ekwesị. Ọ bụ ịmụ Baịbụl ga-eme ka ndụ ndị mmadụ ka mma, ọ bụghị iji Baịbụl mere ọtụmọkpọ. Eziokwu Baịbụl enyerela ọtụtụ ndị aka ịna-akpa àgwà ọma, ịkwụsị omume ọjọọ, ime ka ezinụlọ ha na-enwe obi ụtọ, meekwa ka ha na Chineke, bụ́ Onye nyere anyị Baịbụl, dị ná mma.